Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ 250,000 anwụọla site na coronavirus na mba Amerịka

    Ngụkọ ọrịa coronavirus n'Amerịka

    Ọrịa coronavirus ka na-akwanye njọ dịka ọ pụtara ihe na ihe karịrị mmadụ puku narị abụo na iri ise anwụọla site na ya na mba Amerịka.

    Ọ bụ Mahadum John Hopkins na-agụkọ mpụtara nakwa ọnụọgụgụ gbasara ọrịa a kemgbe o selitere isi bụ ndị gbara ama a.

    N'otu aka ahụ ihe ruru mmadụ otu nde na otu puku narị bụ ndị buterela ya bụ ọrịa na mba ahụ.

    Nke a ga-eme ka mba Amerịka bụrụ mba ebe ọrịa ahụ kachasị gbu ndị mmadụ na mba ụwa niile.

    Dịka o dị ugbua, steeti New York bụ ebe ọ kachasị metụta agbachiela ụlọ akwụkwọ dịka ọnụọgụgụ ka jisike arị elu.

  2. Unu abọọla chi

    Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa

  3. Anwụchiela ndị ọrụ ahụike mmadụ atọ ana enyo enyo maka ịre ụmụaka na mba kenya

    Ndị ọrụ ahụike eche na aka ha dị na orire ụmụaka na Kenya

    N'Afrịka, a kpụla mmadụ atọ a na-enyo enyo ụlọikpe mba kenya maka ebubo ịtọrọ ma ree ụmụaka dịka nnyocha "BBC Africa Eye" gbara n'anwụ n'eme n'ụlọọgwụ gọọmentị na Nairobi n'akụkọ ha wepụtara na nsonso a.

  4. "Ụlọ anyị kuturu abụghị ụlọọgwụ kama ọ bụ ụlọ a gbahapụrụ ndị omekaome bizi"

    Okorocha na Uzodinma

    Ebe foto si, Rochas Okorocha/Hope Uzodinma/Facebook

    Odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Ogwuwike Nwachukwu gwara BBC na ihe ha kuturu bụ ụlọ alawaaghara ndị omekome were mere ebe ozuzo ha.

    Ọ sị na o nweghi ụlọọgwụ ọbụla Okorocha rụrụ nke gọọmentị Uzodinma ha kuturu kama na ọ bụ ụlọ a na-arụchabeghi n'ọdọahịa Ekeukwu ọ kụturu wee na-arụ.

    Ogwubike sị na gọọmentị Uzodinma chọrọ iweghachite ahịa Ekeukwu n'ebe ahụ ọ nọ tupu Okorocha akụtuo ya.

    Mgbe a jụrụ ya maka okporoụzọ ọjọọ dị n'Imo Steetị, ọ sị na ọ bụ maka gọọmentị na-eche ka udummiri laa, ka ha nwee ike malite ọrụ n'ọkọchị.

    Na dị ka ọ na-ekwu ugbua, na ọrụ amalitela n'ọtụtụ okporoụzọ dị n'Imo Steetị ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam onwuamaedo sị na obi adịghị Okorocha mma maka ụlọọgwụ Uzodinma kuturu chọrọ ịrụ ihe ọzọ.

    Ọ sị na ọtụtụ ọrụ gọọmentị Okorocha ji ego ọhanaeze ndị Imo rụọ, gọọmentị ọzọ abata bịa na-akutusi ya.

    Na o nweghi onye ọ ga-adị mma n'obi chaa chaa.

  5. Onyeisi PDP n'Ebonyi steeti sị na ya agaghị ekwe ka akpapụ ya

    Onyekachi Nwebonyi

    Ebe foto si, Onyekachi Nwebonyi/FB

    Nsogbu adaala dịka Onyeisioche PDP n'Ebonyi steeti jụrụ ịhapụ oche ya.

    Ọkaiwu Onyekachi Nwebonyi kwuru na ya ga-agbagha mkposa ndị isi PDP etiti kposara kọmịtị ndị isi pati ahụ dịka Gọvanọ Dave Umahi hapụrụ pati ha gawa APC n'ụlọikpe, sị na o megidere iwu. Gọọmentị Imo steeti agọọla na ha kuturu ụlọgwụ Rochas Okorocha rụrụ n'Owere.

  6. Ndị gọvanọ APC atọ zochiri Abakaliki maka ịnabata Umahi

    Ndị gọvanọ APC

    Ebe foto si, Eze Collins

    Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Abakaliki,isiobodo Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi n'ime otu.Nke a na-abịa dịka Umahi nakwado emume mwụfe ya site na PDP banye APC n'ụbọchị Tọsde 19 ọnwa Nọvemba, afọ 2020.

    Ndị gọvanọ ahụ gụnyere Mai Mala Bala nke Yobe Steetị, Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi nakwa Mohammed Badaru nke Jigawa Steetị.Osote gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Kelechi Igwe na onyisi ụlọomeiwu Ebonyi bụ Francis Nwifuru nabatara ndị a n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

    A na-atụ anya na ndị gọvanọ abụọ ọzọ ka ga-awuchi n'Ebonyi maka emume a.

    Ndị isi gọọmenti Ebonyi gara nabata ndị Gọvanọ APC

    Ebe foto si, Eze Collins

  7. PDP abaala ọgbakọ n'Abuja

    Ndị isi PDP

    Ebe foto si, @Official PDP

    Ndị isi otu PDP abanyeela ọgbakọ.

    A mabeghị ihe ha na-akpa na ya bụ nzuko mana ọgbakọ ahụ na-abịa ka ọ gachara otu abalị Dave Umahi bụ Gọvanọ Ebonyi steeti ma bụrụkwa onye isi ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hapụrụ pati ha gawa otu APC.

    Umahi gwara ndị ntaakụkọ na ihe mere ya pụọ bụ na ndị PDP na-emegbu ndị Igbo kemgbe afọ 1998 e hiwere pati ahụ na agbanyeghị ihe ndị Igbo tụnyerela iji kwado ya bụ pati.

    Ndị isi PDP

    Ebe foto si, @Official PDP

  8. Ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba Jamini achụọla otu nwoke dinara nwaanyị maka akwụkwọ njem

    Nwoke ahụ n'ime ihe onyonyo

    Ebe foto si, Screenshot/Twitter

    Ụlọọrụ Nigerian Embassy dị na Germany akụsịtụla otu onye ọrụ ha ma kwe nkwa na ọ ga-agabiga ntaramahụhụ iwu nyere ma a chọpụta na ọ wakporo nwaanyị dịka ebubo kwuru.

    Nke a na-eme dịka onyonyo fegharịrị n'elu soshal midia na-egosi nwoke ahụ ndị mmadụ na-akpọ (Chief Security Officer of Nigerian Embassy in Berlin Germany) na-arịọ ka ọ dịna nwaanyị tupu ọ rụọ ọrụ kwesiriịrụ.

    Chief Security Officer nke German Nigeria Embassy abanyela ofeọkụ maka ebubo mwakpo nwaanyịỤlọọrụ German Nigerian Embassy akwụsịtụla onyeisi ọrụ nchekwa ha bụ Martins ọrụ maka ebubo na ọ kwasoro nwaanyị iko maka inye ya akwụkwọ ikike njem.

    Dịka ọ dị ugbua, amalite nyocha banyere ihe mere na ya bụ onyonyo.

  9. International Flights: Ewepụla mmachị amachiri ụgbọelu Lufthansa na ndị ọzọ' - Hadi Sirika

    Ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam

    Ebe foto si, Hadi SIrika / Twitter

    Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bu Hadi Sirika edepụtala n'akara Twitter ya na ha na mịnịstry na-ahụ maka ahụike, CACOVID na ngalaba PTF na-agba mbọ ịhụ ma ha e nwereike ịmpepe ọdọ ụgbọelu Kano. Enugwu na nke Pọthakọt tupu afọ a agaa.

    N'otu aka ahụ ọ kwukwara na ha enyela ụlọọru ụgbọelu Lufthansa, Air France/KLM ikike ka ha bido ọrụ na Naijirịa.

    Ha nyekwara Qatar Airways ikike ka ha bido ọrụ n'ọdọ ụgbọleu nke dị n'Abuja.

  10. Unu asaala chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  11. Super Eagles agaala Sierra Leone kpọrọ ụkwụ ọcha lọta

    Ndị Super Eagles

    Ebe foto si, Super Eagles/Twitter

    Isi apụtaraghị ndị Super Eagles nke Naịjirịa na njem ha mere na Free Town, Sierra Leone maka ịgba asọmpi itozuoke Iko Mba Ụwa.

    Nke a bụ dịka onweghi onye ike dị nye ibe ya goolu ka ọfọdụzie imeri n'asọmpi a dị n'etiti Super Eagles na ndị Sierra Leone.

    Ebumnobi ndị Super Eagles bụ ka ha merie iji mejụọ ndị Naịjirịa obi maka ọnyụpa ha gbara na mbụ mana nke a kụrụ afọ n'ala.

    Cheta na otu egwuregwu abụọ ndị a ji ọkpụ anọ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa n'izuụka gara aga na Naịjirịa.

    Ugbua olileanya Super Eagles itozuoke n'asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) nke afọ 2021 ka dị obere.

  12. Gọvanọ Dave Umahi sị na onweghi mwute ọbụla ịhapụ PDP banye APC

    Umahi na Buhari

    Ebe foto si, Presidency/Twitter

    Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steetị sị na onweghi mwute ọbụla maka ịhapụ Peoples Democratic Party mabanye n'All Progressive Congress.

    O kwuru nke a mgbe ọ na-agba ndị ntaakụkọ okwu n'Abakaliki ma sị na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwanyanwụ.

    Ọ sị na mkpebi a abụghị maka na o nwere nkwa APC kwere ya kama ọ bụ ụzọ o nwereike iji gosi iwe ya na mmegbu PDP na-emegbu ndị Ọwụwanyanwụ kamgbe afọ 1998.

    Ọ sị na mwụfe ya a ga-eme ka anya mepee ndị PDP ka ha mara ọbụla naanị otu onye nwere ikike ime ihe ọbụla ọ chọrọ.

    Ọ katọkwara akụkọ na-ekwu na ọ bụ maka PDP jụrụ inye ya ohere ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 na-abịa abịa.

    Gọvanọ Umahi bụ onyeisi ndị govanọ Owụwanyanwụ sị na afọ juru ya n'ogogo o rurula na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọ ga-alaghachị n'azụmaahịa ya ma ọ rịtuo n'ọkwa n'afọ 2023.

  13. Gịnị na-esere ndị Ọkada, ndị agboro na ndị ọrụ nchekwa na Festac, Legọs?

    Ndị ọkwọ ọgbatumtum

    Ebe foto si, Getty Images

    N’ehihie a ka akụkọ ọgbaghara dapụtara n’ebe a na-akpọ Apple Junction dị Festac nke Legọs Steetị.

    A malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara, ịmụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ nke mere ka ndị bi n’ogbe ahụ ji na-azọ isi onwe ha.

    Okporoụzọ e mechiri emechi

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo bi nso n’ogbe ahụ sị kepu kepu ọ nụrụ bụ na ọgbaghara a bụ n’etiti ndị uweojii na ndị ọkwọ ụgbatumtum bụ Ọkada.

    Ọ sị na ọ nụrụ ụda egbe ma hụkwa dịka a mụnyere ọtụtụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ.

    Ọ sị na ọ hụkwara ka ndị ọgbatumtum bucha ngwa ọgụ dị iche iche na-agba n’okporoụzọ.

    Ndị ọgbatumtum nọ n'okporoụzọ

    Akụkọ kwuru na ndị uweojii jichiri ọgbatumtum otu nwoke, nke mere ndị ọgbatumtum ọzọ na-eti mkpu sị ka e mechie uweojii “end police”.

    Na ndị a chọkwara ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ nke mere ndị uweojii ji na-agba egbe iji chụsasịa ha.

    Ndị uweojii a mechisiri ụzọ e si abata maọbụ agafe n’ụlọọrụ ha.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo mekwara ka anyị mata na ndịagha ejupụtalan’ụzọ niile gbara ebe ahụ gburu gburu.

    Ọ sị na ụgbọala niile na-agbafe ebe ahụ tinyechara akwụkwọ ahịhịa ndụ ndụ n’ihu ụgbọala ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Olumuyiwa Adejobi azaghị ekwentị ya mgbe BBC Igbo kpọrọ ya.

  14. Gọọmentị Legọs adọọla ndị isi ụka aka na ntị ka ha gbochie coronavirus ịlọghachi ọzọ

    Ndị Ụka

    Gọọmentị Legọs steeti adọọla ndị ndu otu okpukperechi dị icheiche aka na ntị ka ha kpachapụ anya iji gbochie ọrịa coronavirus ịmalite ifesa ọzọ.

    Ọkwa a gọọmentị mara bụ ka ndị isi ụka gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ na-edebe iwu niile etinyere maka mgbochi mfesa coronavirus.

    Kọmịshọna na-ahụ maka okwu gbasara ezinụlo na Legọs steeti bụ Anofiu Elegushi kwuru nke a ma sịkwa na gọọmentị Legọs ga-eri ndị ọbụla na-erubeghi isi n’usoro nchekwa ha hibere iwu.

    Elegushi kwuru sị: “Anyị niile ma nke ọma ihe mba dịka Amerịka, Fransi na Briten na-agabiga dịka coronavirus na-akpa mkpamkpa nke abụọ, anyị achọghị ka o mee ebe a”.

    Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha na-eyi mkpuchi imi ha, na-akwọ aka ha ma na-enye mmadụ ibe ha ohere ziri ezi iji gbochie mkpamkpa ọrịa coronavirus.

  15. Biden agbaala afa maka coronavirus

    Biden na Trump

    N'ofesi, Onye ana atụanya na ọ ga-abụ onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ bụrụ na Donald Trump nke nọ n'ọchịchị ugbua ka jisike na-akpụ ụkwụ n'ala maka ịnyefe ya ọchịchị, na nje coronavirus nwereike Igbu ọtụtụ mmadụ.

    Biden sị na ya bụ ọrịa kwesiri ijikọ aka ọnụ, ọ bụghị ntisa Trump na ewete.

  16. NLC agbaala egbe ọnụ maka ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu

    Nigeria Labour Congress (NLC) bụ otu jikọtara ndị ọrụ niile na Naịjirịa adọọla gọọmentị aka na ntị ka ha were ọsọ were ije wechie ọnụego mmanụ ụgbọala ha buliri.

    Onyeisioche otu a bụ Ayuba Wabba katọrọ ya bụ mbuli mana onweghị ihe okwuru ga-eme ma gọọmenti ebudaghị ya.

    NLC

    Ebe foto si, Getty Images

  17. 'Ọnụahịa mmadụ ụgbọala ririelu ga-amara ndị mmadụ ahụ mgbe adịghị anya' - Timipre Sylva

    Mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Reuters

    N'onu nke ya Minista na ahụ mmaka mmanụ agbidi nke nta bụ Timipre Sylva ekwuola na ya bụ ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu ga-amara ndị mmadụ ahụ mgbe adịghị anya.

    Sylva sị na ọ bụ ọnụahịa mmanụ agbidi na-ebute ọnụahịa mmanụ ụgbala ji arị elu.

  18. Unu asaala chie e! Taa bụ afọ. Afọ biko wetere anyị ihe ọma taa. Iseeee!

  19. Ka chi fo

    N'ebe a ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Echi ga-ewetara anyị ihe ọma.

    Ka emesịa.

  20. A chọrọ m ịzụ Arsenal tie ha ịgba m tiri Enyimba - Orji Uzor Kalu

    Orji Uzor Kalu

    Ebe foto si, Facebook/Orji Uzor Kalu

    Nkọwa foto, Orji Uzor Kalu

    Aka chịburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu ekwuola na anya ya dị n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal nke mba Ịngland.

    Kalu kwuru nke a n'akara Facebook ya na mgbede Mọnde.

    O kwuru na ya chọrọ imere Arsenal ihe o meere otu egwuregwu bọọlụ Enyimba nke Aba oge ọ nọ n'ọchịchị.

    Cheta na Enyimba chakere nnọọ ka ọnwa oge Orji Uzor Kalu bụ gọvanọ Abia steeti.

    Kalu kwuru sị: "Ihe ọma niile anyị mere n'otu egwuregwu bọọlụ Enyimba malite n'afọ 2000 ruo 2007 mere ka mmasị m n'ebe egwuregwu bọọlụ nọ gbalie."

    "Dịka ide nke egwuregwu n'Afrịka, ana m eche echiche ịzụrụ oke pasentị iri atọ na ise (35%) n'Arsenal."

    "Ebumnobi anyị bụ ibuli iko Champions League nakwa iko Premier Legue dịka anyị si mee n'Enyimba."

    Malite n'afọ 2000 ruo 2007, Enyimba buru iko asọmpi bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Premier League' ugboro ise: 2001, 2002, 2003, 2005, 2007.

    Ha bukwara iko 'Super cup' abụọ (2001 na 2003), iko 'Champions League' nke Afrịka abụọ (2003 na 2004) nakwa iko 'Super Cup' nke Afrịka abụọ (2004 na 2005)

    Orji Uzor Kalu abụghị onye Naịjirịa mbụ chọrọ ịzụta oke n'Arsenal.

    Ide ego bụ Aliko Dangote ekwukwaala ugboro ugboro na ya chọrọ ịzụrụ otu egwuregwu ahụ, mana o nwebeghị isi.

    Ka anyị lewenụ anya ma Orji Uzor Kalu ọ ga-etinye ego ya ebe o tinyere ọnụ ya.