Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Amerịka ahụtala ọnụọgụgụ coronavirus kachasị kwa ụbọchị (131,000)

    Ndị na-agba tụsasịa maka mgbochi coronavirus

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị butere coronavirus n’Amerịka n’ụbọchị Tusde dị puku narị na puku iri atọ na otu bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.

    Ọrị a gbukwara mmadụ ruru otu puku, narị atọ na iri anọ na asaa n’ime otu ụbọchị ahụ, nke kachasị kamgbe ọnwa Ọgọstụ.

    Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa na mba Amerịka kamgbe ọ batara karịa nde iri na ụma abụọ, ebe ndị nwụrụla dị puku abụọ narị abụọ na puku iri atọ na itoolu, narị isii na iri asatọ na atọ.

    Nke a dị n'ozi nyocha ngalaba ahụike mahadum John Hopkins wepụtara.

  2. Ụlọikpe dị n'Abuja enyela onye ọkaiwu ikike ịgba Onyeisiala Buhari akwụkwọ

    Ndị ọkaiwu

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akwadola otu ọkaiwu a kpọrọ Oladimeji Ekengba ka ọ kpụpụ onyeisiala Buhari n'ụlọikpe maka ọjụjụ ọ jụrụ idu ndị ọkaikpe mmadụ iri atọ na atọ n'iyi ọrụ na-agbanyeghi na ọ bụ otu jikọtara ndị ọkaiwu họpụtara ha.

    Akwụkwọ ọkaiwu a gbara nke a kpọrọ 'order of mandamus' ga-amagide onyeisiala n'ike ka o duo ndị ọkaikpe a n'iyi dịka ndị otu NJC si họpụta ha.

    Onyeisiala adịla na mbụ nye mmadụ iri na otu so ndị NJC họpụtara ọrụ ma hapụ mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ.

    N'ikpe ọ chabiri n'ụbọchị Wenesde, ọkaikpe Inyang Ekwo sị na ọkaiwu Ekengba wepụtara akwụkwọ zuru oke n'ihu ụlọikpe nke mere e ji nye ya ikike a.

    Kama ọ sị na inye ya ọkaiwu a ikike ịgba onyeisiala akwụkwọ apụtaghị na o meriela n'ikpe ahụ.

    Ndị ọ gbara akwụkwọ gụnyere Onyeisiala na ọkaiwu gọọmentị etiti.

    Cheta na ọkaikpe Ekwo na Sepụtemba chabiri ikpe ọzọ na Onyeisiala ji dara iwu site n'iziga aha mmadụ iri na otu ahụ n'ụlọomeiwu maka nyocha.

    Ọkaikpe a sị na ọ bụ naanị nhọpụta onyeisi ọkaikpe ka a na-enye ndị omeiwu ka ha nyochaa.

  3. Akpọpụla Kabiru Mohammed onye wepụtara ihe onyonyo adigboroja maka onyeisiala Naịjirịa ụlọikpe

    Aisha Buhari na onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba nchekwa Naijirịa bụ State Services akpọpụla Kabiru Mohammed ụlọikpe maka ebubo na ọ wepụrụ ihe onyonyo adigboroja gosiri agbamakwụkwọ onyeisiala Naijirịa na Sadiya Umar Farouq bụ mịnista na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa.

    Ngalaba a nwuchiri kabiru kamgbe ọnwa Jenuarị kwukwara na Mohammed ejirila ọnụ ya kweta na ọ bụ ya wepụtara ihe onyonyo adigboroja ahụ.

    Ụlọikpe nụrụ na ya bụ ihe onyonyo metọrọ ndị nọ na ya ma bute nsogbu n'etiti ha na ndị ezinụlọ ha.

    Ngalaba a gwara ụlọikpe ka ha hapụ inye Kabiru ohere ịpụta n'aka ndị uweojii ka ha nwee ike mecha nyocha ha nke ọma .

    Kama ụloikpe tọhapụru ya n'aka ndị uweojii dịka ọkaiwu ya kwuru na ihe ọ mere nyere ohere n'iwu ka atọhapụ ya n'aka ndị uweojii.

    Eyiharịrị ya bụ ikpe n'ụbọchi ise nke ọnwa febụarị afọ 2021.

  4. Abdulkadir Balarabe Musa anwụọla n'afọ 84

    Abdulkadir Balarabe Musa

    Ebe foto si, Omeiwu Shehu Sani

    Abdulkadir Balarabe Musa, onye rụburu ọrụ dịka gọvanọ mbụ Kaduna Steeti dịka onye nkịtị anwụọla. Ọ nwụrụ na Kaduna steeti dịka ọ dị afọ iri asatọ na anọ.

    Ọ nwụru dịka o rịara ọrịa.

    Musa bụ gọvanọ Kaduna steeti n'afọ 1979 kama emechara wepụ ya n'ọrụ.

    O soro na ndị gbara mbọ ka-ewepụ ndị agha n'ọchịchi na Naijirịa.

    Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

    Skip X post, 6

    End of X post, 6

    Skip X post, 7

    End of X post, 7

  5. Ndị aghaelu enwetela ụgbọelu agha mmadụ anaghị anọ n'ime ya abụọ

    ụgbọelu agha mmadụ anaghi anọ n'ime ya

    Ebe foto si, Nigerian Air Force/Twitter

    Ndị aghaelu Naijirịa enwetela ụgbọelu agha mmadụ anaghị anọ n'ime ya abụọ.

    Ya bụ ụgbọelu agha aha ya bụ WingLoong 11 Unmanned Combat Aerial Vehicle (UCAV).

    Ya bụ ụgbọelu agha nwereike ị nọ n'elu awa iri atọ na otu ma ọ bụrụ na ọ na-eme nchọpụta ma nwee ike ịnọ n'elu awa iri abụọ na isii ma ọ bụrụ na ọ na-alụ ọgụ.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha elu bụ Ibikunle Daramola depụtara n'akwụkwọ ozi na ya bụ ụgbọleu agha ga-enyere aka lusuo ndị oyiegbu na ndị omekome ọzọ agha na Naijirịa.

    Daramola kwukwara na Naijirịa enwetela ụgbọele iri abụọ na abụo ma na-atụanya ịnweta iri na itolu ọzọ n'ọnwa Jun afọ 2021.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  6. Gọọmentị ebidola ngalaba ga-enye ndị ntoroọbịa enyemaka n'ọrụ ubi

    Nzụkọ ndị mmadụ na onyeisiala Naijirịa

    Ebe foto si, Presidency Nigeria/Twitter

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị ebidola atụmatụ nke ga-akwado ma nye ndị ntoroọbịa ohere i banye ọrụ ugbo.

    Atụmatụ a nke ngalaba National Agricultural Land Development Authority (NALDA) bu n'isi nke ha kpọrọ National Young Farmers Scheme ga-enye ndị ntoroọbịa otu puku n'ime okpuru ọchịchị narị asaa na iri asaa na anọ dị na Naijirịa nkwado ọrụ ugbo kwa afọ.

    Ya bụ atụmatụ ga-ebido n'okpuru ọchịchị atọ n'ime steeti iri na isii n'otu n'otu.

    Ha na-atụanya na ọ bụ mmadụ puku anọ na narị asatọ ga ha ga-eji tulee ya bụ atụmatụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site n'aka Coronavirus na Naijirịa

    ọnụ ọgụgụ coronavirus na Naijirịa

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri ise na abụọ ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa, ebe mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site n'aka ya bu ọrịa.

    Ọnụ ọgụgu ha gosiri na mmadụ narị abụọ na iri isii na anọ esila na ya bụ ọrịa gbakee.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. 'Abụbọ ọrụ ndị PENGASSAN agaghị ebute ụkọ mmanụ ụgbọala' - Mele Kyari

    Ọdọ a na-ere mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, BBC Sport

    Ọnụ na-ekwuchitere onyisiala Naijirịa na soshal Midịa bụ Bashir Ahmed ekwuola na-enwere mmanụ ụgbọala karịrị lita ijeri abụọ na ụma gọọmentị dopụrụ iche na Naijirịa.

    O kwuru na ọ bụ onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroluem Corporation bụ Mele Kyari kwuru nke a .

    Bashir depụtara na akara Twitter ya na Kyari kọwara na abụbọ ọrụ ndị otu Petroluem and Natural Gas Senior Staff Association na-agba agaghị eme ka mmanụ ụgbọala kọọ n'oge mmemme.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Unu asaala chi!

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  10. Gọvanọ Legọs akwadola ịwepu ụgwọ ezumike nka maka ndị chịburu dịka Gọvanọ

    Aka na-achị Legọs steeti

    Ebe foto si, @Mr_JAGs/Twitter

    Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo Olu ewepụtala atụmatụ ga-akwụsị ụgwọ ezumike nka nyere ndị niile chịburu dịka Gọvanọ nakwa osote gọvanọ na steeti ya.

    Ọ kọwara na nke a bụ iji belata ego a na-emefu n'ọchịcị ma tinye ya ebe ọ dị mkpa.

    Nke a pụtara ihe mgbe ọ bugaara ndị omeiwu Legọs steeti bọjetị steeti ahụ nke afọ 2021.

    Bọọjetị ahụ ga-ewe ihe ruru otu tarịị naira na ụma ise n'uju ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Ụkọ mmanụ ụgbọala adịghị n'Enugwu

    Ebe a na-ere mmanụ ụgbọala

    Dịka ndị otu PENGASSON kpọrọ oku ka ndị otu ha malite abụbọ ọrụ na ebe dị iche iche na-ala anyị, ya bụ oku amịtabeghị mkpụrụ n'Enugwu.

    Ụlọọrụ niile ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu ka na-erekwa mmanụ ụgbọala dịka ọ dị na mbụ. BBC gagharịrị ebe niile n'ime Enugwu dịka New haven, Obiagu, Asata, Abakpa nakwa Gariki were hụ na ndị na-ere mmanụ ụgbọala ka na erekwa ya ka ọ dị n'mbụ.

  12. Onyeisiala Buhari egosila obi aṅụrị maka ọgwụ coronavirus ọhụrụ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Bashir/Ahmed

    Onyeisiala Muhammadu Buhari anabatala ọgwụ coronavirus ọhụrụ e wepụtara nke gosiri ikike ọrụ ya ruo pasentị iri itoolu.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi bụ Garba Shehu wepụtara.

    Buharị sị na nke a bụ oke ihe nye ndị ọrụ ahụike na mbaụwa ma kpọọ oku ha mbaụwa gbakọọ aka ọnụ n'ịhụ na ọgwụ a ruru mba niile aka etu kwesịrị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Amadou Toumani Toure bụbu onyeisiala mba Mali anwụọla

    Amadou Toumani Tourịe

    Ebe foto si, Getty Images

    Amadou Toumani Tourịe bụbu onyeisiala mba Mali anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri asaa na abụọ.

    Ọ nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị tuzde na mba Turkey ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

    Ọ wuchiri na Istanbul bụ isi obodo Turkey n'ụbọchị ole na ole gara aga.

    Tupu ọ hapụ Mali, a wara ya obi n'isi obodo ha bụ Bamako.

    Tounami chịrị mba Mali site n'afọ 2002 ruo afọ 2012 mgbe ndịagha nke ọchịagha Amadou Haya Sanogo nọ n'isi ya ji aka ikike chụpụ ya n'ọkwa.

    A na-etu Touré aha n'ihi etu o si na-apụ ndịagha ikike ma were nye ndị nkịtị site n'ịhazi ntuliaka n'afọ 1992.

    A na-akpọ ya "onye agha ọchịchị onye kwuo uche ya".

  14. Mahmood Yakubu enyefela ọkwa onyeisi Inec n'aka Mu'azu

    Yakubu nyefere Mu'azu ọkwa onyeisi Inec

    Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu enyefela ọrụ ya n'akaAhmed Mu'azu ruo mgbe ndị ụlọomeiwu ga-emecha nyochama nyegharịa ya ọkwa ahụ.

    O mere nke a n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja n'ụbọchị Mọnde dịka o nyefere Mu'azu bụ otu n'ime ndị kọmishọna ụlọọrụ Inec nwere.

    Yakubu sị na nke dị n'ihu na ọ ga-arịtu mgbe oge ya gwụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba, 2020. Mana ọ ga na-eche ruo mgbe ndị omeiwu ga-akwado ya.

    Cheta n’ọnwa Ọktoba ka Onyeisiala Buhari họpụgharịrị Yakubu ịbụ onyeisi ụlọọrụ Inec nke ugboro abụọ.

  15. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ

    Unu abọọla chi? Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ nke taa.

  16. Ndewonụ, ka ọ dị echi

    Anyị abịala n'isi njedebe nke mgbasa ozi taa.

    Biko sonyekwara anyị ọzọ echi.

    Ndewo.

  17. Ndị Naịjirịa isii nọ n'ụlọ mkpọrọ maka ịnyere Boko Haram aka

    Mmadụ Naịjirịa isii nọ n’ụlọ mkpọrọ na mba United Arab Emirates dịka amara ha ikpe ịzịgara otu Boko Haram ego enyemaka.

    A mara ha ikpe a n’afọ 2019 mana ezinaụlọ ha gwara ụlọ ntaakụkọ Daily Trust na aka ụmụ nwoke ahụ dị ọcha.

    Ikpe ahụ mara ha kwuru na ha zigaara otu ahụ na-eyi ndụ egwu ihe ruru dọlla puku narị iri asaa na iri asatọ na abụọ.

  18. Lee ihe na-ewu maka Coronavirus n'Afrịka taa

  19. A chọtala ọgwụ mgbochi coronavirus rụrụ ọrụ ruo pasentị 90

    Ọgwụ mgbochi

    Ebe foto si, Getty Images

    Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi mbụ e mepụtara maka ọrịa Coronavirus na-arụ ọrụ ruo pasentị iri itoolu (90%).

    Ụlọọrụ Pfizer na BioNTech, bụ ndị mepụtara ọgwụ mgbochi a, kwuru na nke a bụ nnukwu ihe aṅụrị maka mmụta sayensị nakwa ụwa niile gbaa gburugburu.

    E nyochara ọgwụ mgbochi ahụ n'ahụ mmadụ 43,500 ndị nọ na mba isii, mana onwebeghị mkpesa ọbụla ha wetara.

    Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ọgwụ mgbochi bụ ụzọ a ga-esi pụta n'ọrịa coronavirus nke ndị otu ahike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kpọpụtara dịka ọrịa ozuruụwa ọnụ.

    Ka ọ dị ugbua a na-enyocha ọgwụ mgbochi ruru iri na abụọ n'akụkụ ụwa niile maka ọrịa coronavirus, mana nke a bụ nke mbụ gosiri mpụtara dị mma.

  20. Etu Samuel Eto'o si gbanahụ ọnwụ n'ihe mberede okporoụzọ

    Samuel gbaara Barcelona, Inter Milan na Chelsea, Real Madrid na ndị ọzọ bọọlụ.

    Onye bụbu onye ndu otu egwu bọọlụ Kameruun bụ Samuel Eto'o agbanahụla ọnwụ na mmerụ ahụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na Sọnde.

    Nwamadị a gbara afọ 39 si na Douala na-aga Bafoussam dịcha n'ime Kameruun mgbe ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze ya na ụgbọala bus sọkatara isi.

    Ihu ụgbọala ya mebiri ebe ọ dị ukwuu mana o nweghj onye merụrụ ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru Eto'o bụ Frank De Happi gwara BBC na o nweghi ihe mere Eto'o na ọ gaala nyocha ahụ n'ụlọọgwụ.

    Eto'o kpebiri ka ọ ghara ịkpọpụ ọkwọ ụgbọala ahụ n'ụlọikpe bụ onye chọburu ịgbaọsọ mgbe ihe ahụ mere tupu ndị uweojii anwụchie ya.

    Ihe onyonyo siri ka Eto'o na-asị ọkwọ ụgbọala ahụ ka o jiri nwayọọ na-agba n'ụzọ ma ndụ ya na ndị o bu.