Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Patrice Motsepe so n'ide ji Afrịka chọrọ ịbụ onyeisi CAF

    Patrice Motsepe

    Otu n’ime ndị kachasị baa ụba n’Afrịka bụ Patrice Motsepe nke Saụt Afrịka sị na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisi otu egwuregwu bọọlụ n’Afrịca bụ Confederation of African Football.

    Motsepe bụ onyeisi otu egwuregwu Mamelodi Sundowns nke Saụt Afrịka bụ onye nke atọ ga-etinye uche n'ịzọ ọkwa, dịka Ahmed ji ọkwa ugbua na acques Anouma nke Ivory Coast.

    Motsepe bụ onye nke iri kachasị enwe ego na mba Afrịka dịka ụlọọrụ Forbes si depụta na ego ya ruru ijeri dọla 2.4.

    Onyeisi otu egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Danny Jordaan sị na Motsepe bụ onye ha ma kachasị tozuo oke inwete ọkwa idu ndị Caf.

  2. Coronavirus eselitewala isi ọzọ n'Afrịka

    Ndị na-azụ mkpuchi ihu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọ dịka a ga-asị na ọrịa coronavirus eselitewala isi n'Afrịka ọzọ dịka o si eme na mba Yurope dị iche iche.

    Nke a bụ maka na ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na mpaghara ụfọdụ kwa ụbọchị arịwakwala ọrụ ọzọ.

    Na Naịjirịa ndị butere ọrịa a n'ụbọchị Sọnde abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba bụ narị atọ.

    N'otu aka ahụ ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus agbagoola elu na Gana site na mmadụ iri abụọ na ise ruo otu narị na iri atọ.

    Onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo sị na gọọmentị ga-eke nkwụcha iji belata mfesasị ya ọzọ.

    Ọ sị na nyocha ahụ ga-amalitekwa n'uju, ebe a ga-agba mbọ chọpụta mmadụ niile ha na ndị bu ya nwere mmekọ

  3. Igbo ndị ọma anyị na-ekele unu

    Anyị ji aka na unu hiri ụra nke ọma?

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'ụbọchị taa.

  4. Ka chi foo nu

    Daal dịka ị nọnyere anyị taa...ka ọ dị echi

  5. Agaghị emechi ogige ọzụzụ NYSC ma achọpụta otu onye bu Coronavirus na ya

    Ndị na-efe ala nna ha

    Ebe foto si, NYSC Twitter

    Adenike Adeyemi bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ngalaba na-ahụ maka ndị na-efe ala nna ha bụ Nigerian Youth Service Corps ekwuola na ha agaghị emechi ogige ọzụzụ NYSC ọbụla ha chọpụtara otu onye bu Coronavirus na ya.

    O kwuru na ọ bụ dịka onyeisi ngalaba NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru nke a dịka ha mere nzụko n'ihe onyonyo maka ndị ntoroọbịa na-akwado ife ala nna ha.

    O kwuru na ha dị njikere dịka NYSC na NCDC ga-etiko aka ọnụ hụ na enweghi onye ga-ebu ọrịa coronavirus ga-abata ogige ọzụzụ ahụ.

  6. Buhari kwesịrị ịkpọ ndị Ipob ka ya na ha nwee ọgbakọ - T.A Orji

    T.A Orji

    Aka chịburu Abia steeti bụ Theodore Orji ekwuola na Onyeisiala Muhammadu buhari kwesịrị ịkpọ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' ka ya na ha nwee ọgbakọ gbasara ihe bụ iwe ha na Naịjirịa.

    Dịka ụlọntaakụkọ Punch si depụta, Orji kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Sọnde n'Abuja.

    O kwuru na ihe ga-eme ka iwe dị ndị mmadụ n'obi dajụọ bụ ma ọ bụrụ na gọọmentị kpọọ ha ka a nọrọ ala kpazie ihe bụ iwe ha.

    O kwuru sị: "Ọ bụrụ na e nwere ndị iwe dị n'obi, onyeisiala kwesịrị ịkpọ ha ka ya na ha kpaa."

    "O kwesịrị ịchọpụta ihe bụ iwe ha ma gbaa mbọ etu ọ ga-esi mezie ya."

    "Ọ bụghị ihe ọjọọ ma onyeisiala kpọọ ndị Ipob ka ha nwee ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọ kpọghị ha, ha ga-aga n'ihu na-awa ya isi."

    "Obi adịghị anyị (ndị Igbo) mma na mpaghara ndị ọzọ nwechara steeti isii, anyị enwee naanị ise. O gosiri na a na-emegbu anyị emegbu. Ọ bụ ya na-akpata esemokwu na-adapụta na mpaghara anyị."

  7. 'Gọọmetí agbatarala anyị ọsọ enyemaka' - Eze Obodo Yellow Fever gburu mmadụ 15

    Nwatakịrị a na-agba ọgwụ mgbochi Yellow Fever

    Ebe foto si, Reuters

    Eze Obi Chukwuka nke mbụ bụ eze obodo Ute-Okpu nke dị n'okpuru ọchịchị Ika North East nke Delta steeti ekwuola na ọ bụ ọrịa ịba ọchananya, nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever', gburu ihe ruru mmadụ iri na ise n'obodo ya.

    Chukwuka kwuru na ndị a nwụrụ n'ime ụbọchi abụọ ma gosikwa njirimara ọrịa ahụ nke gụnyere ọgbụgbọ tupu ha anwụọ

    O kwuru na gọọmentị ga-ezitere ha ọgwụ mgbochi a n'ụbọchị Tuzde.

    O kwukwara na ha na-ebuga ndị butere ya bu ọrịa n'ụloọgwụ dị n'Agbọ maọbụ ụloọgwu gọọmentị etiti nke dị n'Asaba.

    BBC Igbo kpọtụụrụ kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ Ononye Mordi ka o tinye ọnụ na ya bụ okwu.

    Moord kwuru sị " Eee ọ bụ ọrịa yellow Fever gburu ihe dịka mmadụ iri atọ n'ụfọdụ obodo na Delta steeti"

    O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Oktoba ka ha nwetara mkpesa maka ya bụ ọrịa.

    Mordi kwukwara na gọọmentị Delta steeti ga-agba ọgwụ mgbochi ọrịa a n'ebe ọ dị ukwu na anaghị ndị mmadụ ego ọbụla.

  8. Gọvanọ ndị ọwụwa anywanwụ enweela nzụkọ gbasara ọdịmma Ndị Igbo

    Nzụkọ ndị nnukwu mmadụ gbasara ọdịmma ndị Igbo n'Enugwu

    Ebe foto si, Imo State New Media

    Ndị Gọvanọ ọwụwa anywanụ Naịjirịa, onyeisi ndị uweojii bụ Muhammad Adamu na ndị ọzọ ónú na-eru n'okwu na Naíjiría enweela nzụkọ gbasara ọdịmma ndị Igbo niile.

    Onyeisi ndị ọrụ onyeisiala bụ Ibrahim Gambari nọchịrị anya onyeisiala sokwa na ndị gara nzụkọ ahụ.

    Na nzụkọ ahụ nke ha nwere n’obi gọọmentị n’Enugwu, ha kpọrọ oku ka ewepụta atụmatụ ga-ekpochapụ ndị omekome na ndị Fulani bu egbe ejegharị n’ala Igbo niile.

    Ha kelekwara onyeisiala maka ọrụ na-aga n'ihu n'akwammiri Niger nke abụọ, ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dí n'Enugwu, okporoụzọ awarawara si Enugwu gawa Porthacourt nakwa ọrụ ndị ọzọ na-aga n'ihu na mpaghara Ọwụwa Anywanwụ.

  9. Tanka bụ mmanụ ụgbọala adachiela ụzọ

    Otụ ụgbọala tanka adachiela ụzọ n'akwa mmiri Festac.

    Ndị ọrụ nchekwa ụzọ ekwuola na otu tanka bụ mmanụ ụgbọala adachiela ụzọ na Festac.

    Ha kwuru na ha agbachiela ụzọ ebe ahụ ma nye ndị mmadụ ndụmọdụ ịkee nkwụcha.

    N'ozi ahụ ha kwukwara na agwaala ndị ọrụ mmenyụọkụ na ndị ọrụ gbatagbata maka ọnọdụ ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Unu apụtala ụtụtụ?

    Onye meriri ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba Amerịka?

    Asịsa ya na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa ka anyị nwere ịwetara unu taa.

    Jisinu ike.

  11. Daalụ dịka i nọnyere anyị taa, ka ọ dị echi

    Ka chi foo

  12. Sheffield a ga-ahụkwa ụzọ laa be ha? Chelsea akụnyela ha ajụ n'anya

    Chelsea na ndị Sheffield

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị otu Chelsea ezila na ebe onye bi ka ọ na-awachiri dịka ha ji ọkpụ goolu anọ asatara nanị otu were mee ndị otu Sheffield United ọbia na be ha.

    Ọ bụ na nkeji itolu ka ndị otu Sheffield gbalịrị nye otu goolu nke mere ka ndị mmadụ chee na ndị Chelsea alaala na mgbuka.

    Ọ bụ David McGoldrick nyere ya bu goolu dịka a gbara kọna nke oji ụkwụ ya gbakaa neti ndị otu Chelsea.

    David McGoldrick

    Ebe foto si, Reuters

    Na nkeji iri abụọ na ato ka Chelsea sara ya bu goolu site n'aka Tammy Abraham.

    Tammy Abraham

    Ebe foto si, Getty Images

    Na nkeji iri atọ na anọ ka ndị chelsea gbara kọna nke Ben Chilwel were ohere onye na-agba azụ ndị Sheffield bụ Max Lowe nyere were nye goolu nke abụọ.

    Ben Chilwell

    Ebe foto si, Getty Images

    N'agba nke abụọ na keji iri asaa na saa ka Thiago Silva mezuru ya atọ.

    Thiago Silva

    Ebe foto si, Getty Images

    Max Lowe mekwara nghọtahe ọzọ nke nyere Timo Werner ohere ịnye goolu nke anọ na nkeji iri asatọ na ya bu asompi.

    Timo Werner

    Ebe foto si, Getty Images

  13. ManUnited adọsịsịala ajị afụọnụ ndị Everton

    Bruno Fernades

    Ebe foto si, Getty Images

    Manchester United ejirila ọkpụ goolu atọ asatra otu merie ndị otu Everton n'asọmpị Premier League n'ụbọchị Satụde.

    Ya bụ asọmpị bidoro nke ọma dịka Bernard nke Everton nyere goolu mbụ na nkeji iri na itolu ya bụ asompi bidoro.

    Bernard

    Ebe foto si, Getty Images

    Kama na nkeji iri abụọ na ise ka Bruno Fernades ji isi takaa netị ndị Everton nke mere ka ha jiri ọtụ goolu otu goolu.

    Bruno Fernandes

    Ebe foto si, Getty Images

    Fernandes gosiri na ọ naghị achị dịka ọ chọkwara iji Freekick nye golu ọzo kama ochee bọolụ ndị Everton fooro ntụntu taa na ya bụ bọọlụ agaghị abanye na neeti ha.

    Mbọ Bruno Fernandes mụtara mkpụru dịka o nyere goolu ọzọ na nkeji iri atọ na abụọ nke mere ka manunited jiri otu goolu karịa ndị Everton.

    Manunited na ndi Everton

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka ọ fọrọ nkeji ole na ole ga-egbuchie ya bụ asọmpị ka Edinson Cavani onye ewebatara n'agba nke abụọ gosiri na agadi nwanyị anaghị aka nka n'egwu ọ maara agba dịka ọ nyere goolu mbụ ya kamgbe o bidoro ị gbara ndị Manunited,

    Nke a mere ka ọ bụrụ goolu atọ ka manunited jiri si ndị Everton...Ka ọ dị mbọsị ọzọ.

  14. 'Ọ bụ Yellow Fever na-egbu ndị mmadụ n'Enugwu steeti' - Gọọmentị Enugwu steeti

    Anwụnta

    Ebe foto si, Science Photo Library

    Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ọrịa ahụ gbara ndị mmadụ gharị nke na-egbu ndị mmadụ nsonso a na steeti ahụ bụ ọrịa Yellow Fever.

    Ya bụ ọrịa wakporo obodo Ette Uno na Umuopu nke dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North na steeti ahụ.

    Ọ bụ kọmịshọna ahụike steeti ahụ bụ Emmanuel Ikechukwu Obi kwuru nkea n'akwụkwo ọ depụtara.

    O kwuru na Yellow Fever abụghị ọrịa ọhụrụ ma kọwaa na njirimara ya bụ ọrịa gụnyere anya ịcha mmemme na ahụọkụ.

    Obị kwuru na ngalaba gọọmentị Enugwu steeti na-ahụ maka ọrịa na ngalaba Nigerian Centre for Disease Control na ngalaba ndị ọzọ enweela nzụkọ n'ụtụtụ Satụde n'elekere iri iji mara ụzọ ha ga-esi chụọ ya bụ ọria ọsọ kpamkpam n'okpuru ọchịchi Igboeze.

    Ọ mara ọkwa ka mmadụ niile rubere iwu ịdị ọchọa nke so ọrịa coronavirus ma tinye kwa neti iji gbochie anwụnta ịbata n'ụlo.

    O kwukwara ka ndị mmadụ debe mbara ha ọcha, kpochapụ akwa mmiri ha, ma na-eyi kwa uwe na-egbochi anwụnta ịta mmadụ.

    Obị kwukwara na onye ọbụla hụtara njirimara ya bụ ọrịa n'ahụ ya maọbụ n'ahụ onye ọzọ, ka ha were ọsọ gaa n'ụlọọgwụ.

  15. Gọvanọ Ikpeazu akwala arịrị maka okporoụzọ Abia steeti

    Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu akwaala arịrị n'akara Twitter ya maka ọnọdụ okporoụzọ gọọmentị etiti dị n'Abia steeti.

    O kwuru na o nwere ọtụtụ ụzọ dị na steeti ahụ bụ nke gọọmentị etiti mana n'ihi ọnọdụ ha, ndị Abia steeti ji ya eme njem azụ ahịa na-ata ahụhụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ụzọ ndị ọ metụtara gụnyere pkporouzo Aba - PH, Aba - Ikot Ekpene, Umahia - Ikot Ekpene, Umahia-Ohafia-Arochukwu.

  16. Unu abọọla chi?

    Akụkọ kachasị dị mkpa n'ụwa niile bụ ihe ndị anyị ga-ewetara unu taa.

    Jisinu ike sonye anyị na Facebook nakwa Instagram anyị maka omenala Igbo n'uju ya.

  17. E bugharịala ụbọchị e kwesịrị ịhọpụta onyeisi WTO

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala

    Onyeisi nzụkọ na-ahụ maka nhopụta onyeisi otu ' World Trade Organisation' ekwuola na ha ebugharịala ụbọchi e kwesiri ịhọpụta onyeisi ngalaba ahụ nke Ngozi Okonjo-Iweala nke Naijirịa na Yoo Myung-Hee nke mba Saụt Kọrịa na-azọ.

    E kwesịrị ịme ya bụ nhọputa n'abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 kama e higharịrị ya mana ha ekwughi ụbọchi ọzọ a ga-eme ya bụ nhọpụta.

    Ha kwuru na e tinyebeghị ụbọchi ọzọ maka ya bụ nhọpụta ma sịkwa na ọ bu maka etu ọnọdụ ihe siri dị na etu ahụike mba ụwa dị mere ha ji higharịa ya bụ nhọpụta.

    Ọ bụ naanị mba Amerịka kwadoro Mung-Hee ebe mba ndị ọzọ kwadoro Okonjo-Iweala.

    Ọ bụkwa ọnodu a mere ka ehiyarịa ya bụ nhopụta.

  18. Nwoke gara ije ogologo ụbọchị iji kwado Buhari na 2015 na-arịọzi enyemaka ụmụ Naịjirịa

    Dahiru Buba

    Ebe foto si, Daily Trust

    Nkọwa foto, Dahiru Buba ji abalị iri na ise were ụkwụ si Gombe gaa Abuja iji ṅụrịa maka mmeri onyeisiala Buharị meriri na ntuliaka 2015

    Dahiru Buba, nwoke ahụ ji ụkwụ si Gombe gaa Abuja iji ṅụrịa maka mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari n'afọ 2015, na-arịọzi enyemaka ugbua dịka ụkwụ mgbu ekweghị ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

    Dịka ụlọntaakụkọ Daily Trust si depụta, nwoke a na-ebegara gọvanọ Gombe steeti akwa maka enyemaka.

    Nwoke a kwuru na naanị ihe o ritere kamgbe ọ gara ije ahụ tụrụ Naịjirịa niile n'anya bụ naanị asambodo.

    O were Buba abalị iri na ise iji si Gombe bịaruo Abuja n'oge ahụ, mana ugbua, agwọ na ihe o loro atọgbọrọla.

    O kwuru sị: “Kamgbe m gachara ije ahụ, ụkwụ mgbu a na-akawanye njọ kwa ụbọchị."

    "Ana m arịọ gọvanọ m bụ Inuwa Yahaya nke Gombe Steeti nakwa ndị isi pati anyị ka ha gbatara m ọsọ enyemaka ka m wee nwee ike inweta ezigbo ọgwụgwọ."

    Buba gara n'ihu kwuo na ahụ ụfụ akarịala ya ahụ n'ihi ụdị ụfụ njikọ ọkpụkpụ ya na-afụ ya.

    Nke ka njọ bụ na o nwezighị ike ịkwụnwu ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.

  19. Imo North Senatorial seat: Ụlọikpe enyela Ararume mmeri n'ikpe onye ga-anọchị Uwajumogu

    Ifeanyi Ararume na Frank Ibezim

    Ebe foto si, Ifeanyi Ararume/ Frank Ibezim

    Ụlọikpe akagbuola mmeri Frank Ibezim merịri na ntuliaka imeụlọ otu APC ma nye Ifeanyị Ararume ikike ịnọchite pati ahụ na ntuilaka maka ọkwa onye na-anọchite mpaghara Imo-North n' Ụlọomeiwu Ukwu.

    Ọkwa ahụ ghere oghe kemgbe Senetọ Benjamin Uwajumogu bụ onye nọbu n'ọkwa ahụ nwụrụ n'afọ 2019.

    Jọstịs Garba Ringim, onye nyere mkpebi ahụ ụbọchị Fraide kwuru Ibezi esonyeghị na ntuliaka otu APC mere n'abalị atọ nke ọnwa Septemba afọ 2020 dịka kọmiti nyochara ndị tinyere akwụkwọ ịzọ ọkwa ahụ gụpụrụ Ibezim na mmadụ ise ndị ọzọ sị na ha etozughị.

    Ringim ,onye kwupụtara na ọkwa onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ahụ bụ nke Ararume, gara n'ihu nye Inec iwu ka ha were aha Ararume tichie nke Ibezim ozigbo.

  20. 'Enweghị mgbe m jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe' - Omeiwu Samuel Akinfolarin

    Ndị FRSC

    Ebe foto si, Facebook/FRSC

    Samuel Akinfolarin, bụ onye omeiwu nta ma bụrụkwa onyeisi ngalaba omeiwu na-ahụ maka ndị ọrụ okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ekwuola na onweghị mgbe o ji kwuo ka e nye ndị ọrụ FRSC egbe ka ha were na-echekwa onwe ha.

    Akinfolarin gwara BBC Igbo na ihe ọ rụtụru aka bụ na iwu hiwere ndị ọrụ nchekwa n'afọ 2007 nyere ha ikike iji egbe chekwa onwe ha.

    O kwukwara sị "Dịka ngaghariiwe End SARS na-ewu, o nweghị onye isi dị mma ga-ebido ikwu okwu maka inye ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ egbe".

    SAMUEL AKINFOLARIN

    Ebe foto si, Nassnig.org

    Nkọwa foto, Samuel Akinfolarin bụ onyeisi ngalaba ụlọ omeiwu nta na-ahụ maka ndịọrụ FRSC

    Akinfolarin kwuru na ndị nzụkọ ụlọomeiwu na ndị otu FRSC nwere nzụko ebe ndị FRSC kwuru na ndị mmadụ na-awakpo ndị otu ha ọtụtụ oge n'ụzọ ebe ha na-arụ ọrụ ha.

    O kwuru na a ga-enwe nzụko n'etiti ndị omeiwu, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ na ngalaba ndị ọzọ okwu nchekwa ndị ọrụ FRSC metụtara ka ha mara etu ha ga-esi chekwa ha mgbe ha na-arụ ọrụ ha.

    Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-egosipụta iwe ha dịka akụkọ pụtara n'ụfọdụ akwụkwọ mgbasa ozi na-ekwu na ndị ọrụ FRSC ga-ebido buwe egbe.

    Boboye Oyeyemi

    Ebe foto si, Facebook/FRSC

    Nkọwa foto, Boboye Oyeyemi bụ onyeisi ndị FRSC na Naịjirịa

    N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ FRSC nke onye kwuchitere ha bụ Bisi Kazeem kwuru na ọ bụ nghọtahie.

    Kazeem kọwara na Akinfolarin kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị FRSC na-ebu egbe, mwakpo a na-awakpo ha agaghị adị nke ukwu".

    Kazeem kwuru na ndị otu FRSC ga-eme ihe ọbụla gọọmentị si ha mee ma kwukwaa sị: "Anyị kpọtụrụ ndi ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ha na-agbatara anyị ọsọ enyemaka ndi dịka ndị uweojii, ndị 'Civil Defense' maọbụ ụfọdu mgbe ndịagha".

    O kwuru na e nwere ọtụtu ihe ha ga-etinye uche ma ọ bụru na a chọrọ inye ha egbe, nke gụnyere iwepụta ego maka ya, ikuziri ha maka egbe na ihe ndị ọzọ.

    Kazeem kwuru na onweghị mgbe onye omeiwu jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe kama ọ rụtụru aka na e nwere iwu nke nyere ndị ọrụ ha ikike ibu egbe maka nchekwa ha.

    Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal Midịa

    N'aka nke ọzọ ọtụtu ndi Naijirịa apụtala katọọ atụmatụ ọbụla nke ga-enye ndị ọru nchekwa okporoụzọ ikike ibu egbe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3