Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ndị ntọ atọrọla onyeisioche APC na Nasarawa Steetị
Ebe foto si, Philips Shekwo/Facebook
Ndị uweojii Nasarawa Steeti kwuru na ndị ntọ atọrọla onyisioche pati APC
na steetị ahụ bụ Philip Shekwo.
Komishọna uweojii bụ Bola Longe sị na a tọọrọ Shekwo n’ụlọ ya n’elekere
iri na otu nke abalị Satọde.
Longe sị na a matabeghi ndị tọọrọ ya kama na o zipu ndị uweojii ka ha sie imi n'ala chọpụta ebe ndị ntọrị a nọ.
Ka ọ dị ugbua ntọrị, ohi na mwakpo na-arị ibe ya elu, ọkachasị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.
Ọkaikpe awụọla Trump n'ala na mkpesa o mere na Pennsylvania
Ọkaikpe na Pennsylvania akachapụla akwụkwọ Trump gbara
sị ka akagbuo ọtụtụ nde vootu e zitere n’ozi na Steetị ahụ n’oge ntuliaka.
Ọkaikpe a bụ Mathew Brann sị na mkpesa a Trump
nyere gbakwasịrị ụkwụ n’ebubo achịtaghị aja.
Nke a ga-eme ka nkwupụta mmeri Biden meriri Trump na Steetị ahụ gbaa mgbọrọgwụ n'izuụka na-abịa dịka o ji ihe karịrị vootu puku iri asatọ akarị Trump.
Ọ bụ ezigbo nsogbu nye Donald Trump, bụ onye na-achọ ịgbanwe mmeri e meriri ya na ntuliaka onyeisiala e mere n'ụbọchị atọ nke ọnwa Nọvemba.
Ọ jụla ịnabata mmeri ma bo ọtụtụ ebubo metụtara nrụrụaka na ntuliaka, na-enweghi ihe akaebe.
Isi akwara ọ na-agba ịnabata mmeri e meriri ya emetụtala usoro ihe na-eso ntuliaka mba Amerịka.
Mmadụ 246 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Coronavirus ka dịkwa ire dịka ọnụọgụgụ ndị butere ya
na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde dị narị abụọ iri anọ na isii site n’ozi ụlọọrụ
mgbochi ọrịa bụ NCDC wepụtara.
Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a kamgbe ọ batara Naịjirịa
ji karịa puku iri isii na puku isii, ebe ndị nwụrụ dị otu puku na otu narị na iri isii na isii.
Ndị gbakwara akarịala puku iri isii na otu puku.
Igbo ndị ọma anyị ekele ooo
Obi sara mbara ka anyị ji asị unu nnọọ n'isonyere anyị taa.
Olileanya Trump amawala afọ n'ala ka Biden merikwara na Michigan ọzọ
Donald Trump enweela ndọghachị azụ ọhụrụ na mbọ ọ na-agba ịgbanwe mmeri e meriri ya na ntuliaka Amerịka dịka ndị omeiwu Michigan jụrụ ịkatọ mmeri Joe Biden.
Ndị omeiwu abụọ si na pati Repọblikan kwuru na ha ga-eso usoro kwesiri ekwesị iji hụ na vootu ndị a bụ ezi dịka ha.
N'ụbọchị Fraịde ka steetị Georgia wụrụ onyeisiala mba Amerịka n'ala site n'ịkwado obere ihe Joe Biden ji merie Trump.
A na-atụ anya na Biden bụ onye Demokrat ga-ewere ọchịchị n'ụbọchị 20 Jenụwarị, dịka onyeisiala nke 46.
Ndị 'electoral college' na-ekpebi onye meriri nyere Biden na Trump vootu dị 306 na 232 - Nke Biden karịrị vootu ole a chọrọ iji merie nke bụ 270. Ebe vootu o nwetere n'ọha karịrị nde 5.9.
Trump bụ onye na-apụtachabeghi ezi kamgbe e mere ntuliaka na Nọvemba a, pụtara na Fraịde ọzọ kwuo na o meriri. "E meriri m", o kwuru, dịka ọ na-agbasaozi maka ọnụego ọgwụ.
O bola ọtụtụ ebubo maka nrụrụaka na ntuliaka mana o gosibeghi akaebe.
Onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Kayleigh McEnany boro ndị ntaakụkọ na ndị Demokratz ebubo inwe ihu abụọ.
Naịjirịa abanyela n'ọnọdụ ọtanisi
Ngalaba na-ahụ maka mgbakọ na Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ National Bureau of Statistics (NBC) ekwuola na mba ahụ abnyela n'ọnọdụ ọtanisi Bekee kpọrọ "recession'.
NBC kwuru nke a taa dịka akụnaụba ya bụ mba gbadara ruo pacenti 3.62 n'agba nke atọ nke afọ 2020 n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "contraction".
Nke a bụ ugboro abụọ n'ime afọ ise.
Kedụ etu recession si abịa?
Recession na-eme oge akụnụba a kpọrọ "Gross Domestic Product" (GDP) gbara ọnnọdụ negative na-agba nke agba abụọ.
NBS kwuputere ọnọdụ a Naịjirịa nọ n'akwụkwo ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ọtụtụ ogbunigwe agbaala na Kabul, isiobodo Afghanistan
Ebe foto si, Reuters
Ọtụtụ ogbunigwe agbaala na n'etiti obodo Kabul, Afghanistan gụnyere nke metụtara n'akụkụ ebe ọtụtụ isiụlọọrụ mba ndị ọzọ dị a kpọrọ Green Zone ka ndị ọrụ mere ka a mata
A mabeghi ndị merụrụ ahụ maọbụ nwụrụ anwụ mana ogbunigwe a gbara ọtụtụ mmadụ na-ejukarị n'Afghan.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ferdawz Faramarz kwuru na a gbara ọtụtụ ogbunigwe ebe foto si na soshal midia na-egosi ọtụtụ ihe ogbunigwe a mebiri.
Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo sị obere ogbunigwe abụọ gbara n'isi ụtụtụ Satọde nke otu gbara ụgbọala ndị uweojii gbuo otu onye uweojii ma merụọ atọ ahụ.
O nwebeghi ndị pụtarala kwuo na aka ha dị n'ogbunigwe a nke na-abịa dịka ọgụ na ọgbaghara na-eme n'Aghanistan na nso nso a.
Ndị ọgba ọsọ na-achịpụ ya na Kaduna ugbua
Ndị ọgba ọsọ no Kaduna steeti ugbua dịka asọmụpị ọsọ a kpọrọ Kaduna Marathon malitere n'ụtụtụ Satọde.
Ndị ọgba ọsọ si mba 23 sọ achụ ọla na ya bu emume nke na-abịa dịka ndi ntọrị na ndị na-emekpa obodo ahụ na-enye nsogbu na ya bụ steeti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
DSS ekwuola ọ bụ onye otu ha gburu Ifeanyi Okereke n'Abuja
Ngalaba nchekwa Bekee kpọrọ "Department of State Service" (DSS) ekwuola aha onye otu ha gbagburu ore akwụkwọ akụkọ Ifeanyi Okereke n'Abuja n'ụbọchị Tụụzde n'Abuja.
Ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya si na onye mere ihe bụ onye ọrụ ha no ọrụ nchekwa n'ogige Onyeisi Ndị Omeiwu Obele nke Naịjirịa.
Maazị Afunanya sị na ha amalitela inyocha ihe mere dịka ha ji ya bụ nwoke.
DSS gawa n'ihu kwee nkwa na ha ga-eme nyocha n'ụzọ kwụ ọtọ ma gbaa ihe niile n'anwụ.
Ha gara n'ihu tie ezinaulọ Okereke aka n'obi ma sị ka ha diwe ihe mere.
Donald Trump Jr ebutela coronavirus
Ebe foto si, Getty Images
Ọkpara onyeisiala Amerịka Donald Trump ebutela coronavirus, dịka ọnụ na-ekwuru ya siri kwuo.
Ọ sị na nyocha chọpụtara na Donald Trump Jr, dị afọ 42, butere coronavirus na mbido izu ụka ma banye ịnọdụ iche na ulọ nta ya kemgbe ahụ.
N'ime akwụkwọ ozi o wepụtara, ọ sị : "O nweghi ama ọrịa ọbụla dịka ọ na-eso usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ọrịa a."
Don Jr bụ onye abuọ n'ụmụ onyeisala Amerịka butere ọrịa a.
Barron Trump, dị afọ 14, butere ọrịa a n'ime ọnwa gara aga, mana ọ gbakere ọsịsọ.
Don Jr sọ na ndi ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya nọ n'ime ya.
A na-echekwe na Don Jr n'onwe ya nwere ebumnuche ịzọ oche onyeisiala Amerịka, mana ọ na-ekwuda ya bụ atụmatụ.
Enyi nwaanyi Don Jr bụ Kimberly Guilfoyle, bụbu onye ntaakụkọ na Fox News, butere coronavirus na Jụlaị ma gbakee.
Don Jr ebuteghi ya n'oge ahụ.
Ndị ohi ịntanet wakporo tekịnụzụ otu Manchester United
Ebe foto si, Getty Images
Otu
egwuregwu bọọlụ
Manchester United ekwuola na ndị omekome wakporo ngwa tekịnụzụ ha.
Otu a kwuru na ndị ọkachamara n’ihe
banyere ịntanetị ewerela ọnọdụ ma sị na o nweghi ihe ha ọbụla e mebiri.
Ha sị na ngwa tekịnụzụ ha dịka websaịt, soshal midia na appụ ka kwụ chịm na o nweghi ihe mere ha.
Manchester United na-akwado ịnabata Westbrom n'asọmpi Premier League n'ọgbọegwuregwu Old Trafford n'ụbọchị Satọde.
Ha sị na mwakpo agaghị emetụtaghị asọmpi ahụ.
Biko ka a gbatara ndị ọgụ na-ada na Tigray, Ethiopia metụtara ọsọ enyemaka - Guiterres
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu United Nations
bụ Antonio Guterres arịọla ka e mepee ọnụụzọ enyemaka iji nyere ndị mmadụ ọgụ
na-eme na mpaghara Tigray nke Ethiopia metụtara aka.
Guterres bụ onye kwuru nke a na New York sị na gọọmentị
mba Ethiopia ajụla ịnabata arịrịọ ka e mee udo nke mere ọgụ e gburula ọtụtụ mmadụ ka ji na-aga n’ihu.
Otu United Nations na-akwado ịnabata ndị gbara ọsọ ndụ ruru puku narị abụọ na mba dị ha n'akụkọ bụ Sudan n'ime ọnwa ndị na-abịa - mmadụ puku iri atọ abatalarịị.
Mba Saụt Afrịka bụ ndịisi otu jikọtara mba Afrịka (African Union) sị na ọ na-ezipu ndị okpe udo mmadụ atọ na mpaghara ahụ.
Praịm mịnịsta mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed malitere iji ndịagha awakpo Tigray n'izuụka abụọ gara aga iji chutuo pati nọ n'ọchịchị, nke ọ sị na-enupuru gọọmentị etiti isi.
ASỤỤ Strike: Gọọmenti ekwetala ịgwụ ASUU ijeri naira 65
Ebe foto si, Chris Ngige/Facebook
Gọọmenti
Etiti ekwetala inye otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum a kpọrọ ASUU n'ịchafụ ijeri Naira 65 maka ụgwọ e ji
ha eji nakwa ịhazigharị ọnọdụ agụmakwụwọ.
Nke a so na nkwekọrịta ha nwere na ọgbakọ ASUU na Gọọmenti nwere ụbọchị Fraide.
Nkwa na na-abịa dịka ụmụakwụkwọ mahadum mere ngagharịịwe maka mmechi e mechiri ụlọakwụkwọ mahadum nke gọọmenti na Naijiria kemgbe ọnwa asatọ n'ihi nghọtahịe dapụtara n'etiti ndị nkuzi ha na gọọmenti etiti n'ihe gbasara ọdịmma ndị nkuzi nakwa agụmakwụkwọ.
Gọọmenti kwetakwara iji usoro 'Integrated Financial Management Information System' ganye mgbe a kwadochara usoro nke ASUU chọrọ bụ 'University Transparency and Accountability Solution' (UTAS ).
Guardiola na-eme na ọgbasaghị ya ma Messi nọrọ na Barcelona laa ezumike
Ebe foto si, Press Association
N'egwuregwu, onye nkuzi Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na ya
enweghị nsogbu ma Lionel Messi nọrọ na Barcelona laa ezumike nka.
Messi gbara afọ iri atọ na atọ chọbụrụ ịbanye Man. City n'Ọgụstụ, mana
onyeisi ha na Barcelona kpachiri ya.
Ndị uweojii achụsaala ndị ngagharịiwe na Saụt Afrịka
Ebe foto si, Reuters
N'Afrịka, ndị uweojii Saụt Afrịka achụsalaa ndị na-eme ngagharịiwe ụbọchị
Fraide maka ịkpaoke agbụrụ ha na-ekwu na ndị ọcha mere n'otu ụlọakwụkwọ ebe ha
na-eme oriri maka ụmụakwụkwọ na-apụ apụ n'ọnwa Oktoba.
Ndị uweojii sị na ọ bụ naanị mmadụ otu narị ka ha ga-ahapụ ịba na ya bụ ụlọakwụkwọ
ga kọwaa iwe ha.
WHO ekwuola na Remdesivir abụghị ekwu eme na ọkwụkwọ coronavirus
Ebe foto si, re
WHO adọọla aka na ntị naọgwụ a
kpọrọ Remdesivir ewepụtara maka ịgwọ nje coronavirus abụghị ekwueme.
Otu ahụike mbaụwa a kwuru na nchọpụta ha mere gosiri na ya bụ ọgwụ anaghị
eme ihe o turu ọnụ na ya ga-eme.
Nkeji Coronavirus
Isi gbara m 'pop-corn' mgbe nwa m nwaanyị gwara na ọ bụ 'lesbian' - Charly Boy, Na nwa gị bụ gay apụtaghị na ịdaala n'ọrụ gị dịka
Ebe foto si, Charly Boy/Facebook
Charles Oputa a ma dịka Charly Boy ekwuola ka Naijiria siri dị ya ka Gana oge nwa ya nwaanyị bụ Dewy gbuwara ya akụoyibo Nsugbe na ya bụ nwanwaanyị ihe naanị nwaanyị na-amasị nke Bekee kpọrọ 'Lesbian'.
N'ozi o wepụtara n'akara ya na soshal midia, Charly Boy sị na " Amaghị m ka ọbị m adị."
"Ọtụtụ ihe gbatara m n'uche:'Kedụ ihe mere mejọọ?' 'Nwa m m che na m ma ma ahụnanya anọghịzịkwa ya',' ọ bụ na ndị mmadụ agaghị ebido kpapụwa nwa m?' ' Ọ bụ na nwa agaghị ebi n'ọkụ ala mụọ?'.
O kwuru na dịka echiche ndị a na-aga njem n'ime obi ya, ya nọ na-atụ onwe ya mbọiji jide onwe ya aka.
O kwuru na ihe a bịara ya dịka ọnwụwa n'ihi na onwe ole na ole tupu nwa ya a kpọrọ okwu aha, na ya na-ekwuchitere ndị mmasị ha bụ nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha.
O kwuru na ịnabata ọnọdụ nwa ya bụụ ya "ịnabata eziokwu dịka ịwa afọ., Ọ na-afụ ụfụ mana ọ na-agwọ ọrịa. Asị dịka ọgwụ ahụ mkpu, ịṅụ ya, ei nweta onwe gị ozigbo mana ihe so ya na-adigide."
Ebe foto si, Charly Boy/Facebook
Belatanụ ndị uweojii nọ na EFCC - Ọkaikpe Salami
Ebe foto si, Presidency
Nkọwa foto, Ọkaikpe Salami na-enye onyeisiala Muhammadu Buhari mpụtara nnyocha ha nyochara onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu
Ọkaikpe Ayo Salami enyela onyeisiala Muhammadu Buhari ndụmọdụ ka o belata ndị uweojii so ndị ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC arụ ọrụ.
Salami kwukwara ka Buhari si n'otu ọrụ nchekwa ọzọ na-abụghị ndị uweojii wee họpụta onye isi ọzọ ga-achị EFCC.
Cheta na Ọkaikpe Salami bụ onyeisi otu Buhari hibere ka ha nyochaa Ibrahim Magu bụbu onyeisi EFCC maka ebubo nrụrụaka e boro ya.
Ọkaikpe ahụ kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde n'Abuja, oge kọmiti ya hafere onyeisiala Buhari mpụtara nnyocha ahu ha mere gbasara Ibrahim Magu.
Salami gwara Buhari sị: "Mmadụ anọ bụrụla ndị isi EFCC n'oge gara aga bụcha ndị uweojii."
"Ya mere, ọ bụrụ na ị chọọ ịhọpụta onyeisi ọzọ maka EFCC, ọ ga-adị mma ma i lee anya n'otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ dịka iwu hibere EFCC si kwadoo."
Salami kwuru na ọtụtụ ndị uweojii nọ na EFCC na-akpata nghọtahie n'etiti ndị ọrụ EFCC na ndị uweojii.
Gbasara ebubo e boro Ibrahim Magu, Salami kwuru na ha gbara Magu nakwa ndị akaebe ruru otu narị na iri na atọ ajụjụọnụ.
N'okwu ya, Buhari sị na ọ bụ ihe mwute na nrụrụaka karịrị akarị na Naịjirịa ọkachasị n'ime ọchịchị.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina, onyeisiala gara n'ihu kwuo na ebumnobi ya bụ ime ka Naịjirịa bụrụ mba a ma ama na-anaghị anabata nrụrụaka.
Buhari kwuru sị: "Ọ dị mkpa ka onye ọbụla mata na agha anyị na-ebuso mpụ na nrụrụaka anaghị ele anya n'ihu. Onweghị otu onye karịrị Naịjirịa niile."
Enyefela m onye nche m gbagburu Ifeanyị Okeke n'aka ndị uweojii - Gbajabiamila
Ebe foto si, @femigbaja
Onyeisi Ụlọnnọchiteanya bụ Femi Gbajabiamila ekwuola na ya enyefela Abdullahi Hassan bụ onye DSS na-eche ya nche e boro ebubo ịgbagbu onye na-ere akwụkwọ akụkọ n'aka ndị ọrụ nchekwa maka nnyocha nakwa ịkpụpụ ụlọikpe.
A gbagburu Ifeanyị Okereke bụ onye na-ere akwụkwọ akụkọ n'Abuja ụbọchị Tozde dịka Gbajabiamila kwụsịtụrụ ebe a na-ere akwụkwọ akụkọ.
N' ozi Gbajabiamila wepụtara n'ehihie Friaide, o kwuru na ọnweụ Okereke n'aka otu n'ime ndị na-eche ya nche "gbawara m obi nke ukwu."
Gbajabiamila onye kwuru na ya akasiela ezinaụlọ Okere okjke obi, gara n'ihu kwuo na ya na-ele anya na ezinaụlọ nwaamadi ga-enweta ikpemkwụmọtọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Nkọwa Gbajabiamila nyeburu maka ọdachi ahụ ụbọchị Tozde were ọtụtụ ụmụ Naijiria gụnyere ndị ọnụ na-eru n'okwu iwe.
Ha katọrọ Gbajiamila maka ikwu na ọ bụ egbe a gbaliri elu iji chụsasị ndị a maghị bịara nochie ụgbọala ya bụ ihe tụrụ nwa amadị ahụ gbuo ya.
Ndị na-ere akwụkwọ akụkọ mere ngagharịiwe maka ogbugbu onye otu ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.