Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Buhari ebinyeela aka akwụkwọ maka ụlọakụ
Ebe foto si, Ahmad Bashir
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu ọhụ nke nke a ga-eji hiwe ụlọikpe pụrụ iche maka ikpe metụtara ego nakwa ụlọakụ nke a kpọrọ 'Banks and Other Financial Institutions Act 2020' na Bekee.
Dịka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu siri kọwaa, iwu a bụ nhazigharị iwu nke dịbụ mbụ iji were gboo mkpa ndị dapụtara n' ihe gbasara ụlọakụ na ihe so ya n'afọ iri abụọ gara aga.
INEC sị ha ga-emegharị ntuliaka ndị fọrọ afọ n'ụbọchị ise ọnwa Disemba
Ebe foto si, INEC
Ụlọọrụ Inec ekwuola na ha ga-emegharị ntuliaka iri na ise fọrọ afọ na Naịjirịa n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2020.
Nke a dị n'ozi onye ọrụ ha na-ahụ maka nkuzi usoro ntuliaka bụ Festus Okoye deegara ụlọọrụ ntaakụkọ 'Leadership' na Fraịde.
Cheta na ụlọọrụ a kagburu ụbọchị ha kwesịrị ime ntuliaka ndị a maka ọgbaghara dapụtara na Naịjirịa mana site na nzuko ndịisi ha nwere ka e ji hiwe ya.
Okoye sị na ụlọọrụ Inec kelere ndị gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa, otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ndị Naịjirịa maka nkwado e nyere ha.
Ha rịọkwara ndị mmadụ ka ha kwanyere onwe ha ugwu dịka a na-eme ntuliaka ndị a fọrọ afọ.
Lee nụ etu Super Eagles si kwọọ aka tiere ndị Sierra Leone akị
Ebe foto si, Super Eagles/Twitter
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa ji gara agara bata n'asọmpi ha ndị Sierra Leone gbara taa mana Sierra Leone gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola.
Asọmpi a biri n'ọkpụ goolu anọ anọ nke otu egwuregwu abụọ ndị a nyeritara onwe ha.
N'ụzọ ụtụtụ nkeji 4' ka Alex Iwobi ji inye goolu gbapere ọnụụzọ neetị ndị Sierra Leone.
Victor Osimhem sochiri ya azụ mgbe o nyere goolu na nkeji 21', ebe Alex Iwobi nyekwara goolu ọzọ na nkeji 27'.
Goolu zokwara ka mmiri ọzọ, mgbe Samuel Chukwueze mezuru ya goolu anọ nke Naịjirịa na-enye n'ime nkeji 29'.
Super Eagles chere na ụka ebiela mana ndị Sierra Leone gwara ha na e jighi ụtụtụ ama njọ ahịa ka ha malitere ịsa goolu ndị a na nkeji 41' site n'aka Kwame Quee.
Ebe foto si, Super Eagles/Twitter
Ka Super Eagles ka na-agba ọnyụpa ọnyụpa, ndị Sierra Leone sara goolu atọ fọrọ afọ nkeji 72', 80' na 86' site n'aka Al-Hadji Kamara, Mustapha Bundu na Al-Hadji Kamara ọzọ.
Nke a mere pụtara na ụzọ ka dị anya ka Naịjirịa itozu oke n'asọmpi Iko Mba Afrịka afọ 2021.
Naịjirịa ga-ezute Sierra Leone ọzọ n'ọgbọegwuregwu Siaka Stevens dị na Freetown n'ụbọchị 17 ọnwa Nọvemba, afọ 2020.
Nkeji Coronavirus
Gere akụkọ gbasara Coronavirus ka o si dị n'Afrịka taa.
Ndị uweojji si na ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ụkọchukwu Umunze
Ebe foto si, Mbonu Watson
Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na akụkọ kwuru na e jidere otu ụkọchụkwu a hụrụ isi mmadụ n'aka ya n'ụmunze dị n'Anambara steeti abụchaghị eziokwu.
Ha kwuru na ya bụ onye a na-enyo enyo abụghị ụkọchụkwu nke e ji ahụ isi mmadụ n'aka ya.
Ndị ntorobia Umunze wakporo Rev Bishop Elijah Chukwuebuka nke ụlọụka, "God of Light Ministry' bụ ụkọchukwu na-ewu ewu na Umunze nke a ma ama maka ibu amụma na ịrụ ọrụ ebube, tie ya ihe ma kpụrụ ya ya na ngwogwo na ngwongwo ha hụrụ n'ogige ya kpụga be eze obodo ha maka ebubo ịhụ isi mmadụ n'aka ya.
Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na "Ndị ntorobịa hụrụ ya ka ọ na-agba aja. A hụrụ isi mmadụ, ọtụtụ ọkpụkpụ, foto ndị mmadụ e kere eke nakwa Akwụkwọ Nso e kere eke."
"Ihe a bụ ụkọchukwu a ma ama n'Ihite Umunze dịka onye amụma na-ahụ ụzọ."
Mana Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru ya bụ okwu metụtara "ebubo ịgwọ ọgwụ".
O sị na " ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ya, ọ bụ isi ewu nke e ji akwa mmemme kee."
Mohammed gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ bụ dịbịa na-ezo onwe ya dịka ụkọchụkwụ nke ndị ntorobịa wakporo ma mebie okwu arụsị ya, kpụrụ ya gawa be Igwe ha ebe ha bụ ndị uweojii bịara gbapụtara ya.
Ka ọ dị ugbua, Igwe obodo ahụ enyela ya bụ nwoke iwu ka o si n'ala ha pụọ.
Ndị omeiwu Imo Steetị achụpụla onyeisi ha bụ Chiji Collins
Ebe foto si, Hon Chiji Collins/Facebook
A chụtuola onyeisi ndị omeiwu Imo Steetị bụ Chiji Collins n'ọkwa ya.
Ọ bụ ndị omeiwu ibe ya chụpụrụ ya n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba, 2020 dịka ha na-eme nzukọ n'ụlọomeiwu dị n'Owere.
Mgbe okwu i chutu ya dapụtara n'ụlọomeiwu, mmadụ 23 n'ime 27 kwadoro ka a chụọ ya.
Akụkọ sị na ha chụpụrụ Collins maka ebubo mpụ na mmebi ego, aka ike nakwa agwa ọjọọ na ihe ndị ọzọ.
N'ihi nchụpụ a, Paul Emeziem nke na-anọchiteanya okpuruọchịchị Onuimo ga-abụ onyeisi ndị omeiwu dịka ha họpụtara ya.
Mana ọnụ na-ekwuru Chiji Collins bụ Mike Ohaka sị na ọ bụghị eziokwu na a chụọla Collins.
Ọ sị na ndị omeiwu anaghị enwe nzukọ taa na ọ bụ n'izuụka na-abịa abịa.
Ohaka gara n'ihu kwuo na okwu banyere nke a ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu.
'Ego mmanụ ụgbọala ga-agbago ruo N168 - N170 otu lita'
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ ntaakụkọ Punch ekwuola na ụlọ ọrụ Petroluem Products Marketing Company (PPMC) bụ ngalaba na Nigerian National Petroleum Corporation ebuliela ego a na-ere mmanụ ụgbọala na depo ha site Naịra otu narị na iri anọ na ụma (N147.67) ruo Naira otu narị na iri ise na ise na ụma (N155.17).
Ha kwuru na ọ bụ n'akwụkwọ ozi maka nanị ndị ụlọọrụ PPMC nke Tijjani Ali binyere aka nke bu akara PPMC/C/MK/003 n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ka ya bụ ozi dị.
Ha kwuru na PPMC kwukwara na ego mmanụ ụgbọala n'ebe a na-ere ya na pụmpụ ga-abụ Naịra otu narị na iri isii na otu na ụma (N161.36).
Kama akụkọ ha kwukwara na onyeisi otu Indepndent Petroluem Marketers Association of Nigeria bụ Mike Osatuyi kwuru na ihe ọ pụtara bụ na ego mmanụ ụgbọala ga-agbago ruo ihe dịka N168 ruo N170.
Nkea na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na gọọmentị Naijirịa ewepụla aka kpamkpam n'ihe gbasara ịhazị ego mmanụ agbidi.
Mmadụ 212 ọzọ ebutela coronavirus na Naijirịa
Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ narị abụọ na iri na abụọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa. Mmadụ iri abụọ na isii n'ime ha si Imo steeti ebe mmadụ itolu si Rivas steeti.
E nweghị onye nwụru ọhụru site na ya bụ ọrịa.
Unu asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Etu ajụ si butuo onye uweojii kwụ Gọvanọ Obaseki n'azụ
Ebe foto si, Screengrab
Taa ka e duru Gọvanọ Godwin Obaseki n'iyi ọrụ ka ọ malite ọchịchị agba nke abụọ ya dị gọvanọ Edo steeti.
Mana dịka ya bụ emume na-aga n'ihu, ajụ buturu onye uweojii na-akwụ Obaseki n'azụ nke Bekee na-akpọ 'Aide de-camp' (ADC).
Ọ bụ oge Obaseki na-agụpụta ozi ekele ya ka onye uweojii ahụ malitere ịsọ ganịganị ma gharịpụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Mana ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ nso ebe ahụ gbataara ya ọsọ enyemaka ma were nwayọọ dọba ya ọdụ n'oche.
Dịka ụlọorụ ntaakụkọ Premium Times si kwuo, Patrick Okundia, onye bụbu Kọmishọna ahụike n'Edo steeti, bịakwara nyere nwoke ahụ aka tupu a kpọrọ ya gaa n'ụgbọala ahụike dị nso ebe ahụ.
Otu onye welitere isi na ndị uweojii Edo steeti mechara gwa ndị ntaakụkọ na nwoke ahụ adịla nnọọ mma.
Ọ kọwara na o nwere ike ịbụ ike ọgwụgwụ mere nwoke ahụ ji gharịpụ.
Ụlọikpe asịla Toke Makinwa kwụọ onye bụbu di ya otu nde naịra maka imetọ aha ya
Ebe foto si, Tokemakinwa/Instagram
Ụlọikpe ukwu dị na Legọs asịla onye ọrụ mgbasaozi na Redio bụ Omotoke Makinwa ka ọ kwụọ onye bụbu di ya Maje Ayida otu nde naịra maka imetọ aha ya.
N'ụlọikpe a, ọkaikpe Olukayode Ogunjobi sị na Makinwa na onye bipụtaara ya akwụkwọ a kpọrọ "On Becoming" bụ ebe ọ metọrọ aha Ayida, ga-akwụ puku narị naịra ise n'otu n'otu.
Ọkaikpe a sị Makinwa na ụlọọrụ Kachifo kwụọ ego a n'aka ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka nke Ayida chọrọ.
O nyere ha otu ọnwa ịkwụ ụgwọ a malite ụbọchị o kpere ikpe a ma wepu ebe ahụ o metọrọ aha Ayida n'ime akwụkwọ "On Becoming".
Ọkaikpe sị na nke a nọ peegi 54, akara 11 ruo 16 nakwa peegi 83 akara 1 n'ime akwụkwọ a.
Mkpebi ikpe a na-abịa n'ime afọ atọ Ayida kpụpụchara Makinwa na ụlọọrụ Kachifo n'ụlọikpe.
Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ egbuola Kingsley Obasi, bụ onye enyemaka osote onyeisi ndị omeiwu Ebonyi steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah gwara BBC na ya bụ ihe mere na mgbede abalị ụbọchị Wenezde.
Odah kwuru na ya bụ nwa amadi eruwela nso na be ya oge ụmụokorobịa abụọ nọ n'elu ọgbatumtum wakporo ya, nara ya akpa ya ma gbaa ya egbe.
Oge a kpọtụụrụ ndị uweojii nọ nso ebe ahụ, ha gbatara ma buru ya gawa ụlọọgwụ ụlọọgwụ 'Federal Teaching Hospital' dị n'Abakiliki, ebe dọkịta gwara ha na ọ nwụọla.
Onye uweojii ahụ kwuru na ụdị ihe a anaghị emekarị oge ọbụla n'ihi na Ebonyi steeti bụ ebe dara jụụ.
O kwukwara na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ enyela iwu ka amalite nnyocha miri emi iji chọta ma nwụchie ndị kpara ya bụ arụ.
Isiụlọọrụ okpuruọchịchị Isiala Ngwa Saụt nke Abia Steetị agbaala ọkụ.
Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na isiụlọọrụ okpuruọchịchị ime obodo Isiala Ngwa Saụt dị n'Omoba, Abia Steetị agbaala ọkụ.
Onye na-arụ ọrụ n'ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ọkụ a malitere n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọsde.
O kwuru na a mabeghị ihe kpatara ọkụ a ji malite n'isiụlọọrụ ahụ.
Mana gọọmentị Abia Steeti akatọọla ọkụ a gbara isiụlọọrụ a ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka e nyocha, nwuchie ma taa ndị kpara arụ a ahụhụ.
Nke a dị n'ozi odeakwụkwọ gọọmentị a bụ Chris Ezem wepụtara.
Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ gaara n'ihu kwuo na onyeisi ọrụ Gọvanọ Abia Steetị bụ ACB Agbazuoere abịala ebe ahụ ma hụ ka ọkụ a si gbaa na ihe ndị ọzọ o mebiri.
Agbazuere si n'okpuruọchịchị a ma bụrụkwa onyeisioche ya n'afọ ole na ole gara aga.
Ndị agha Naijirịa na-ekwu na Abubakar Shekau,Maman Al-Barnawi bụ ndị isi otu oyiegwu na mmadụ iri asatọ na anọ ọzọ abụrụla ndị ha chọrọ ịnwuchi nke taa nke echi.
Ọ bụ gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum na onyeisi ndịagha Naijirịa bụ Tukur Buratai kpughere aha ndịa.
Ebe foto si, Governor Borno/Twitter
Ha mere nkea dịka ha na na-edu ndị agha nkiti bụ Civilian Joint Task Force n'iyi ọrụ.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ode akwụkwọ mba Amerịka bụ Michael Pompeo ekelela mba dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ọkachasị Naijirịa maka nzụkọ ha nwere maka imeri otu oyi egwu bụ ISIS na mpaghara ọdịda anywanwụ Afrịka.
Ebe foto si, The Governor of Borno state/Facebook
Mmadụ 180 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa
Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri asatọ ọzọ anwụọla site n'ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ọnụ ọgụgụ ha gosikwara na mmadụ narị anọ na anọ esila n'aka ya bụ rọia gbakee ebe mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site na ya.
Ha gosiri na mmadụ anọ n'ime ha si Rivas steeti ebe abụọ sị Crossriver.
Unu asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Unu emeela n'ịnọnyere anyị taa.
Hie ma teta ụra nke ọma.
A kpụpụla Ohakim ụlọikpe maka ebubo ịgba ama asị
Ebe foto si, Ikedi Ohakim/Facebook
A kpụla aka chịbụrụ Imo steeti bụ Ikedi Ohakim Ụlọikpe Ukwu dị n' Abuja ụbọchị Wenezde maka ebubo ịnye ndị uweojii ozi asị megide otu nwaanyị a kpọrọ Chinyere Amuchienwa.
N'akwụkwọ ahụ nke ọ bụ onyeisi ndị uweojii Naijiria gbara, a na-ebo Ohakim ebubo ịghara ndị uweojii ụgha na Chinyere Amuchienwa ji egbe were maja ya.
E bokwara ya ebubo ikwu na ya nwere ala ya chọrọ ire na Legọs nke bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola nwe ya.
Mana Ohakim kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị a.
Dịka ụlọakụkọ Nation siri kwuo, Ọkaiwu Ohakim bụ Ken Njemanze rịọrọ ka a tọhapụ Ohakim n'ogige ndị uweojii, ebe ọkaiwu wetara ikpe ahụ bụ Stanley Nwodo,jụrụ si na a hapụ Ohakim na ọ ga-enye dịka ndị uweojii kpọrọla ya oku ọtụtụ oge mana ọ zaghị ya.
Na mkpebi ya, ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstịs Samira Bature gwara Ohakim ka ọ kwụọ nde naira iri ma kpọtakwa onye ga-ana ya n'akaebe ga-abụ onye nwere agba ma birikwa n'Abuja.
E higharịrị ikpe ahụ buga ya n'abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.