Ihe ị maghị maka Yakubu Gowon ọchịagha kachasị obere chịrị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Otu omeiwu na mba UK boro ọchịagha chịburu Naịjirịa bụ Yakubu Gowon ebubo maka npụ ego.
O kwuru nke a mgbe ndị omeiwu UK na-enyoba anya n'ihe mere n'oge ngagharịiwe EndSARS na Naịjirịa ma sị na ha kwesịrị ịta gọọmentị Naịjirịa ahụhụ maka agwa ha kpara.
Nke a mere aha Gowon ji na-ewu ndị mmadụ a na-ajụ kedụ etu o si bie ndụ n'oge ọ na-achị.
Ihe I kwesịrị ịma maka Yakubu Gowon
Yakuku Gowon bụ onye ndu kachasị obere chịrị Naịjirịa ma ndị ọchịchị nkịtị na ndịagha.
Ọ dị afọ 31 mgbe ọ chịrị Naịjirịa dịka ọchịagha site n'afọ 1966 ruo n'afọ 1975 mgbe ndịagha nara ọchịchị n'ike nke gburu Abubakar Tafawa Balewa, praịm minista Naịjirịa, Ahmadu Bello, Sardauna nke Sokoto na primia nke Ugwu, Samuel Akintola, Premia ndị ọdịdanyanwụ, Arthur Unegbe na ndị ọzọ.
Aka Gowon dị na nchutu n'ọchịchị ahụ dịka ọ ka si mba UK ebe ọ gara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ Junior staff college lọta.
Dịka e gbuchara ọchịagha Aguiyi Ironsi bụ onye were ọchịchị mgbe ha napụrụ ndị nkịtị ọchịchị n'ike, Gowon bụ onyeisi ọrụ mgbe ahụ weziri ọkwa ọchịagha Naịjirịa.
Gowon chịrị afọ itoolu tupu a chụpụ n'ọkwa mgbe ọ gara ọgbakọ ndị OAU na Kampala, ndị ahụ were ọchịchị nye Murtala Muhammad dịka ọchịagha ọhụrụ ebe Olusegun Obasanjo bụ osote ya.
A lụrụ agha Biafra nke a kpọrọ 'Nigerian civil war' oge Gowon na-achị mgbe mpaghara Ọwụwanyanwụ chọrọ ikewapụ zawa Biafra n'ihi mkpagbu na ihe ndị ọzọ.
A lụrụ agha Biafra ọnwa iri atọ ruo ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị Obasanjo nabatara nchili aka elu ndịagha Biafra.
Gowon gbara ọsọ gbaga mba United Kingdom, mgbe a chutuchara ya n'ọchịchị n'afọ 1975, ebe ahụ ka ọ nọ nwete agụmakwụkwọ Phd na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mahadum Warwick.
N'ọnwa Febụwarị 1976, onye agha bụ Buka Suka Dimka boro Gowon ebubo sị na aka ya dị n'ogbugbu ọchịagha Murtala Mohammed.
Gọọmentị mechara mere ọchịagha Gowon ebere gbaghara ya tinyekwara onye bụbu onyeisiala Biafra bụ Emeka Ojukwu n'oge ndị nkịtị bara ọchịchị nke Shehu Shagari bụ onyeisiala.
Na Nọveeba 2004, Gowon ritere nzere World Peace Prize site n'aka World Peace Prize Awarding Council maka ime ka udo chịa n'obodo na mwulite akụnaụba nakwa ịhazi ọgbakọ udo n'Afrịka.














