Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nnọnụ na peeji anyị taa

    Kedụ nke na-akpọtụ n'ogbe gị?

    BBC Igbo ga-aza gị ajụjụ ahụ site n'akụkọ ndị anyị ga-ewetara unu taa.

    Jisinu ike sonye anyị.

  2. Onweghị etu Biden si nweta vootu nde 80 na ntuliaka a - Donald Trump

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ka na-ekwusi ike na nrụrụaka dị nke ukwuu na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Joe Biden, onye pati 'Democrats' meriri na ntuliaka ahụ, mana Trump ekwetebeghị na e meriela ya.

    N'uhuruchị ụbọchị Tọzde ka Trump kwuru na ọ bụ nrụrụ aka ka Biden ji nweta vootu nde iri asatọ (80 million) o ji nweta mmeri.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ugboro ugboro ka Trump na-ekwu na nrụrụaka buru ibu na ntuliaka nke afọ a, mana onwebeghị ihe akaebe ya na ndị otu ya gosiri iji kwado ebubo a.

    Trump mechara kweta ka ndịọrụ ya gaa n'ihu ka ha na ndọrụ Joe Biden rụkọọ ọrụ maka ịhafe ọchịchị n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mana ọ kpọbọghị Biden kelee ya dịka ndị isiala Amerịka n'oge gara aga si eme.

  3. Gọọmentị Imo steeti akagbuola akwụkwọ ikike ala ndị Rochas nyeburu

    Gọọmentị Imo steeti akagbuola akwụkwọ ikike ala niile bụ nke ha kwuru na ọchịchị Rochas Okorocha nyere ndị mmadụ n’ụzọ adabaghị n’iwu.

    Ha kwuru na ọ bụ ọchịchị Emeka Ihedioha hibere kọmiti lebara okwu a anya, mana ọchịchị Hope Uzodimma nabatara mkpebi ha n’ihi na ọ bụ mkpebi ziri ezi.

  4. Jiri otu nkeji gere akụkọ coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka ugbua

  5. Ozo Big Brother esonyerela otu egwu bọọlụ Juventus

    Ozo

    Ebe foto si, Instagram Screen-grab

    Ozo, onye so n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ 2020 esonyerela otu egwuregwu bọọlụ Juventus nke mba Itali

    Nwaokorobịa a ezigbo aha ya bụ Ozoemena Chukwu kwupụtara nke a n'akara soshal midia ya dị iche iche.

    Ọzọ kwuru na ahọrọla ya dịka onye nlekọta azụmahịa (Brand Manager) nke ụlọakwụkwọ ebe ndị Juventus na-azụpụta ndị na-agbara ha bọọlụ na Naịjirịa, nke a kpọrọ Juventus Academy na Bekee.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Kamgbe o sicha n'ụlọ Big Brother Naija pụta, ọnwa Ozo na-etisi nnọọ ike.

    Ụlọọrụ izizi ya na ha nwere nkwekọrịta bụ ụlọọrụ ntaakụkọ egwuregwu bụ Super Sports.

    Ya na ụlọọrụ ekwentị bụ Tecno nwekwara nkwekọrịta azụmahịa.

    Nke ya na Juventus ugbua bụ nke onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua.

  6. Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball' - Zeke Nnaji

  7. Argentina niile ederela jim jim maka olili Diego Maradona

    Igbe ozu Maradona

    Ebe foto si, CASA ROSADA

    Nkọwa foto, Igbe ozu Diego Maradona dịka ndị mmadụ na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ

    Puku kwuru puku mmadụ agbakọọla n'obi onyeisiala Argentina iji kwanyere Diego Maradona ugwu ikpeazụ.

    Ụbọchị Tọzde bụ mmalite abalị atọ nke gọọmentị Argentina wepoụtara iji ruo uju maka Maradona, onye nwụrụ n'ụbọchị Wenezde ka ọ dị afọ iri isii (60 years).

    Ọtụtụ na-ebe akwa, ndị ọzọ na-ekpe ekpere, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-efegharị akwa Maradona dịka ha na-agafe n'ebe a dọtara igbe ozu ya.

    E ji ọkọlọtọ mba Argentina kechie igbe ozu ahụ ma were akwa Maradona ji gbaa bọọlụ wụkwasị n'elu ya.

    A ga ekwe ka ndị mmadụ bịa kwanyere Maradona ugwu ikpeazụ ruo na mgbede Tọzde.

    Ama egwuregwu Napoli

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ama egwuregwu dị na Napoli ebe Maradona gbara bọọlụ oge ọ dị ndụ

    Ndị ezinụlọ Maradona na-eru ụjụ ọnwụ ya gụnyere ụmụ ya ise, na nwunye ya bụ Claudia Vilafane, onye ya na ya kewara n'afọ 2004 dịka ọ gachara afọ iri abụọ ha ji gbaa akwụkwọ.

    Maradona bụ onye ndu ndị otu bọọlụ Argentina buru iko mba ụwa n'afọ 1986.

    Oge Argentina zutere mba England n'agba nke osote ikpeazụ nke asọmpi iko mba ụwa afọ 1986, Maradona nyere goolu site n'iji aka ya kụkpuo bọọlụ na neetị, nke ọ kpọrọ 'Hand of God'.

    Maradona gbakwaara otu 'Napoli' na mba Italy, na otu Barcelona nke mba Spain.

    N'ụbọchị Tọzde, Napoli kwuru na ha ga-akpọzi ama egwuregwu ha aha Maradona.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Mgba okpuru ndị isi Ipob na-agba m agaghị amịta mkpụrụ - Uche Mefor

    Uche Mefor

    Ebe foto si, Uche Mefor/Facebook

    Osote onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Uche Mefor ekwuola na ọtụtụ ndị isi otu ahụ na-agba ya mgba okpuru ma na-emetọkwa aha ya.

    Mefor kwuru nke a n'akara 'Facebook' ya n'ụbọchị Tọzde, ma kwuo na mgba okpuru niile ahụ agaghị amịta mkpụrụ ọbụla.

    O kwuru sị: "Ụnụ na-egbu onwe ụnụ oge. Ọtụtụ ihe onyonyo na mgbasaozi dị icheiche na-aga n'ihu ugbua iji metọọ aha m."

    "Ndị isi IPOB ma maka nke a ma gbachikwa nkịtị ka ọ na-aga n'ihu. Ọ bụghị taa ka ọ malitere."

    "Agaghị m agbachi nkịtị ka a na-atụgide m asị n'ọha, bịa na-arịọ m ka a nọrọ n'ime ụlọ kpaa ya."

    "Ikuku ọjọọ a na-eku ugbua nwere ndị o si n'aka."

    Mefor gara n'ihu kwuo na ụfọdụ na-egosi onwe ha dịka ndị ọma nakwa ndị ji ikike ọnwụ na ndụ, mana omume ha akwụghị ọtọ.

    Ọ bụ eziokwu na onweghị onye Mefor kpọrọ aha, kama ọtụtụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ Nnamdi Kanu ka ọ na-ekwu maka ya.

    N'ọdị nso a, akụkọ na-ekwu na Mefor na ndị isi Ipob, ọkachasị onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu, na-enwe nsogbu.

  9. Ihe bụ iwe ndị dọkịta Imo steeti mere ha ji gbaa abụbụ ọrụ

      • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

    Ndị dọkịta n’Imo steeti nọ na-abụbụ ọrụ kemgbe ụbọchị Monde maka ọnọdụ ụgwọ ọnwa ha na steeti ahụ.

    Iwe ha dị ka onyeisioche ha bụ Okpara Chidiebere gwara BBC bụ na gọọmentị Imo steeti anaghị akwụlite ha ụgwọ ọnwa ọfụma.

    Okpara kwuru na ha bụ ndị dọkịta degaara gọọmentị akwụkwọ ozi ịgwa ha maka ihe ndị bụ mkpa ha mana o nweghi onye zaghachiri ha.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ha nyere gọomentị izuụka iri abụọ iji mee ihe mana o nweghi ihe nwere isi nke mere na ha gbara abụbụ ọrụ.

    Ihe ndị ọ gụkọrọ dịka iwe ha gụnyere:

    • Akwụghị ụgwọ ọna ziri ezi
    • Ịgba ndị dọkịta nọọrọ onwe ha nnukwu ego maka ịnwe igwe okwu, igwe television n'ụlọọgwụ ha nakwa ụgwọ ndị ọzọ.
    • Ị napụ naanị otu ụlọakwụkwọ ahụike ha nwere na steeti ahụ ikike ịzụ ndị chọrọ ịbụ dọkịnta.
  10. Onyeisioche CAF ga-eme mkpesa maka mmachi FIFA machiri ya

    Ahmad Ahmad

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi ngalaba bọolụ n’Afrịka bụ Ahmad Ahmad ekwuola na ọ ga-eme mkpesa gbasara mmachi nke ngalaba bọọlụ n’ụwa niile bụ FIFA machiri ya.

    Ngalaba ahụ machiri Ahmad afọ ise maka ịda iwu ha tinyere site n’afọ 2017 rue afọ 2019.

    Ahmad na-akwado ịzọ ọkwa ya ọzọ na ntuliaka otu CAF na-abịa n'ọnwa Maachị afọ 2021.

  11. Atụọla onye ndọrọndọrọ ọchịchị kpọrọ ndị ọkaipe 'ndị iberibe' na mkpọrọ

    Ụlọikpe ukwu na mba Uganda atụọla otu onye sobu azọ ọkwa onyeisila nga makana ọ ji ha mee akaja site n'ịkpọ ha "ndị iberibe".

    Ivan Samuels Ssebadduka gara mkpọrọ afọ atọ maka imegide ụlọikpe, dịka ndị ntaakụkọ na mba ahụ siri kwuo.

    Maazị Ssebadduka dere mkpesa nye Ụlọikpe Ukwu mba ahụ iji kwụsị atumatu mere ka ndị na-azọ ọchịchị onyeisiala na mba ahụ ịnata ikike n'aka ndị mmadụ site n'ibinye aka tupu ha etinye akwụkwọ.

    Ọ chọkwara na ụlọikpe ahụ chabie atụmatụ mmachị ngagharị ngalaba na-ahụ maka ahụike tinyere n'ogige ndọrọndọrọ ọchịchị maka igbochi coronavirus

    O kwuru ajọ okwu a oge ọ na-eme mkpesa ya n'ihu ụlọikpe a.

    Ọkaikpe Ukwu Alfonso Owinyi-Dollo sị na onye ọbụla chọrọ ikwu maka ndị ọkaikpe kwuo nke mere n'eziokwu.

  12. Ndị uweojii agbaala ulọ ndina Bobi Wine okirikiri

    Ndị uweojii n'Uganda gbara ụlọ ndina ebe onye na-azọ ọchịchị Robert Kyagulanyi e ji Bobi Wine mara okirikiri.

    Ihe a mere n'obodo Hoima di na ọdịda anyanwụ mba ahụ.

    Bobi Wine dere n'akara Twitter ya na ya jiri ụzọ tere aka ga ya bụ obodo dịka ndị agha gbochiri ya.

    Ọ sị, "ha so anyị gawa ụlọ ndina anyị ma gbaa ya okirikiri."

    Ụlọ ntaakụkọ NTV nke Uganda dekwara n'akara Twitter ha "amabeghị ebumnuche ndị uweojii a.

    Bobi Wine kere foto ndị uweojii no n'ihu ụlọ ndina ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Onyeisiala Donald Trump agbagharala Michael Flynn bụbu onye ndụmọdụ nchekwa ya

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Michael Flynn bụbu onye ndụmọdụ gbasara okwu nchekwa onyeisiala Donald Trump eritela mgbaghara zuruoke n'aka ya.

    Nke a pụtara ihe dịka Trump depụtara ya n'akara Twitter ya n'abalị ụbọchị Wenzde.

    N'ozi ahụ, o kwuru na o nwere olileanya na na Flynna na ezinaụlọ ya ga-enwe ezumike 'Thanksgiving' magburu onwe ya.

    Cheta na Flynn so na ndị enyemaka Donald Trump amara ikpe n'afọ 2017 maka ị tụrụ ngalaba FBI asị mgbe a na-enyocha mmekọrịta ha na ndị mba Rọshịa.

  14. Nnọọnụ na peeji anyị taa

    Anyị ji n'aka na unu tetara ọfụma.

    Ebe a bụ ebe akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ na-akpọtụ.

    Jisinu ike sonye anyị.

  15. Foto Diego Maradona: Nlereanya maka ndụ dike a bụ ọkaibe na bọọlụ

  16. Diego Maradona alaala mmụọ

    Diego Maradona

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Diego Maradona alaala mmụọ.

    Maradona nwụrụ n'ehihe Wenezde dịka o nwechara obi mgbawa nke Bekee kpọrọ 'Heart Attack'.

    Ọ nọ n'ụlọọgwụ ebe a wara ya ụbụrụ na mbido ọnwa Nọvemba iji wepụ ọbara kpụkọrọ ya n'ụbụrụ.

    Maradona bụ onye ndu ndị otu bọọlụ mba Argentina oge ha buru iko mba ụwa n'afọ 1966.

    Maradona

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Maradona duuru ndị Argentina bute iko mba ụwa n'afọ 1986

    Maradona gbaara otu egwuregwu Barcelona nke mba Spen na Napoli nke mba Itali.

    Ugboro iri itoolu na otu (91) ọ gbaara mba Ajentịna, o nyetere goolu iri atọ na otu (31).

    E mechara chọpụta na Maradona na-agba anwụrụ ike, nke a mere e ji kwụsịtụ ya ịgba bọọlụ n'afọ 1991.

    Mana n'afọ 1997 ka Maradona wụsara ọwa n'ịgba bọọlụ, wee malite ịkuzi akụzi.

    Maradona

    Ebe foto si, Getty Images

    E mere ya onye nkuzi bọọlụ ndị Argentịna n'afọ 2008, mana ọ pụrụ n'afọ 2010 oge mba Jamani meriri ha n'asọmpi iko mba ụwa nke afọ ahụ.

    Ọ kụzikwara bọọlụ na mba United Arab Emirates nakwa Mexico tupu ọ laghachi n'Ajentina.

    Lee ihe ọtụtụ na-ekwu banyere ya:

    Zatarra kwuru na agaghị echefu Maradona echefu:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Kanu Nwankwo kpọrọ ya Odogwu:

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  17. A ga-emepe okeala Naịjirịa n'oge adịghị anya - Zainab Ahmed

    Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed ekwuola na gọọmentị Naịjirịaga-emepe okeala Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge adịghị anya.

    Ahmed kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n'Abuja n'ụbọchị Wenezde.

    O kwuru na kọmiti na-eleba ya bụ okwu anya ekwetala ka e mepee okeala ahụ ọzọ, ha ezigala akwụkwọ ozi ha na nke onyeisiala Muhammadu Buhari, mana ọ bụzi onyeisiala ga-ekwu kpọmkwem ụbọchị a ga-emepe ya.

    Cheta na gọọmentị mechiri okeala Naịjirịa kamgbe ọnwa Ọgọstụ afọ 2019, n'ihi na ha sị na ọtụtụ na-esi ebe ahụ ebubata ọtụtụ ngwaahịa adigboroja, ọgwụ ike nakwa ngwa ọgụ dị icheiche.

  18. Mba Scotland ga-amalite ịnye ụmụnwaanyị ngwa nsọ n'efu

    Ngwa nsọ nwaanyị dị oke ọnụ na mba dị icheiche.

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba scotland abụrụla mba mbụ ga-amalite ịnye ngwa nsọ nwaanyị na-efu.

    Ndị ụlọomeiwu mba ahụ kpebiri nke a na nzụkọ ha nwere n’ụbọchị Tuzde ma kwuo na ọ bụ okpuruọchịchị niile na mba ahụ ka ọ dịrị ịhụ na nke a bịara na mmezu.

    Iwu a bụ nke ha malitere ịkpa maka ya kemgbe afọ 2016 mana ọ bụ ugbua ka ndị omeiwu niile nwere nkwekọrịta maka ya.

    Ọ bụ onye omeiwu otu Labour bụ Monica Lennon bụ onye tụrụ atụmatụ a dịka ọ na-achọ ka "ngwa nsọ rute mmadụ niile aka".

  19. Onye bụ 'Chika' ritere nhọpụta Grammy?

    Chika Jane Oranika

    Ebe foto si, @oranicuhh/Twitter

    Ọ bụ n'ụbọchị Tuuzde ka ewepụtara aha ndị ahọpụtara nwereike ịrịte ntụrụugo 'Grammy' n'afọ 2021 na-abịa.

    Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa nọ na aha ndị ahụ agụpụtara mana okwu ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ma na-ajụ onye ọ bụ bụ Chika.

    Chika Oranika na nne ya na nna ya

    Ebe foto si, @oranicuhh/Twitter

    Onye bụ Chika?

    - Chika Jane Oranika bụ nwa ada Igbo nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa mụrụ n'obodo Alabama mba Amerịka.

    - Ọ dị afọ 23

    - Ọ bụ onye hụrụ egwu n'anya dịka ọ gbahapụrụ Mahadum South Alabama ka o nweike tinye uchu n'ihe gbasara egwu.

    - O bụ ọdụdụ nwa n'etiti ụmụ nwaanyị atọ nne na nna ya mụrụ.

    - Chika bụkwa onye na-eyi akwa ịgosi ndị mmadụ nke bụ 'Model' na Bekee

  20. Nnọnụ na peeji anyị taa.

    Unu abọọla chi?

    Chebiri anyị maka akụkọ ndị dị mkpa si na mba ụwa niile apụta taa.