Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Umahi bụ onye nkwado ndị Fulani na-achị ehi - Onye ndu PDP

    Dave Umahi

    Otu onye welitere isi na pati PDP, bụ Nwoba Chika Nwoba, ekwuola na Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi bụ onye nkwado ọgbaaghara.

    Nwoba kwuru nke a iji zaghachi ebubo Umahi boro ụfọdụ ndị welitere isi na pati PDP n'Ebonyi steeti, na-ekwu na ọ bụ ha na-akwado ndị otu IPOB nakwa ndị otu nzuzo ndị ọzọ ka ha na-emebisi ihe na steeti ahụ.

    N'ebubo ya, Umahi kpọrọ aha Sam Egwu onye bụbu aka chịburu Ebonyi steeti bụ; Anyim Pius Anyi, onye bụbu ode akwụkwọ gọọmentị etiti, Obinna Ogba na ụfọdụ ndị ọzọ.

    Mana Nwoba kwuru na ọ bụ Umahi bụ onye na-akwado ndị Fulani ọchị ehi na-awakpo Ebonyi steeti kwa mgbe kwa mgbe.

    Nwoba kwukwara na Umahi bụ nna ukwu ndị Miyetti Ala, nke bụ otu jikọrọ ndị na-achị ehi na Naịjirịa.

    Cheta na Nwoba nọbu na pati APC tupu o si ebe ahụ bata na PDP.

    Kamgbe Umahi hapụrụ PDP banye APC, ọtụtụ okwu esila na ya bụ ihe pụta.

    Umahi kwuru na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kpatara o ji pụọ, mana ọtụtụ na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.

    Ha kwuru na Umahi na-achọ ka ndị APC nye ya ọkwa na ntuliaka afọ 2023.

  2. Ndị agha akụsasịala ndị ntọrị wakporo ụzọ si Kaduna gawa Abuja

    Ụzọ si Kaduna gawa Abuja

    Ebe foto si, @samuelaruwan

    Gọọmentị Kaduna ekwuola na ndị agha nọ n'ogige "Operation Thunder Strike" chabịrị nkata ndị ntọrị kpara ịwakpo ụzọ si Abuja gawa Kaduna n'ụbọchị Fraide.

    Ọ bụ Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa na ihe banyere obodo bụ Samuel Aruwan binyere aka n'akwụkwọ mgbasa ozi akụkọ a dị n'ime ya.

    Dịka o siri kọwaa, ndị omekome a gbachiri ụzọ di na mpaghara Kasarami n'okpuru ọchịchị Chikun n'amali elekere asaa na ọkara nke mgbede.

    Ozi ahụ sị na ndị agha meriri ndị ntọrị, dịka ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ n'ahụ gbaa ọsọ.

    Ihe a mere butere ịkwụ n'ahịrị n'ụzọ ahụ n'oge ihe a na-eme. Ọ bụ nke kpatara gọọmentị steeti ahụ jiri riọ ndị nọ njem arịrịọ.

    Ụzọ ahụ si Kaduna gawa Abuja bu ebe ndị ntọrị na-anọkarị ma na-akpa ike gunyere igbu na ịtọrị ndị mmadụ.

    N'izuụka abụo gara aga, ụmụakwụkwọ mahadum Ahmadu Bello itoolu na-aga Legọs zutere ndị ntọrị a kpụrụ ha banye ọhịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Mmadụ 22 anwụọla n'ime ọgụ na-ada n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọkọ ugbo na Chad

    Ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ anwụola site n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị Arab na-achi ehi nakwa ndị ọrụ ugbo na mpaghara ndịda Chad a kpọrọ Kabbia.

    A na-eche na esemokwu a malitere site n'ebubo ohi ehi ndi agbụrụ abụọ a na-ebo onwe ha.

    Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Chad bụ Cherif Mahamat gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na a mụnyere ọtụtụ obodo ọkụ n'ọgbaghara dara na Mọnde na Tuzde.

    A nwụchiri mmadụ 66 dịka mmachị ngagharị na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.

    Ọgbaghara na-ada n'etiti agbụrụ abụọ a mpaghara Sahel kemgbe ọgụ afọ na ụma.

  4. Mmadụ 246 ọhụrụ ebuterela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa Bekee kpọrọ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 246 butere coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa.

    Nke a butere ndị ọrịa a fesarala na Naịjirịa 67,220 kemgbe ọ malitere.

    N'ime ndị a mmadụ 62,686 agbakeela ma laa be ha abe mmadụ 1,171 rara mmụo site na ya bụ ọrịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Mba Iran aṅụọla iyi na ha ga-abọ ọbọ maka ogbugbu Fakhrizadeh

    Mohsen Fakhrizadeh

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mohsen Fakhrizadeh

    Mba Iran aṅụọla iyi na ha ga-abọ ọbọ maka ogbugbu e gburu onye ọkachamara na sayensị nuclear, bụ Mohsen Fakhrizadeh.

    Iran na-ebo ebubo na ọ bụ mba Israel gburu nwa amadị ahụ, mana Israel ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ya.

    Mana otu a kpọrọ Hezbollah kwuru na aka mba Amerịka dịkwa na ya bụ ogbugbu.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Iran na mba ndị ọzọ bụ Mohammad Javad Zarif kwuru na ọ bụ ndị na-eyi ndụ egwu gburu nwanne ha.

    Zarif kpọkwara oku ka mba ụwa dị icheiche tinye okwu a ọnụ ma katọọ ya bụ omume ọjọọ.

    Mana onyeisiala mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei kwuru na ha ga-abọrịrị ọbọ.

    "Anyị ga-agba ha ka egbeigwe," bụ ihe Khamenei kwuru.

  6. Akụnaụba Naịjirịa ga-eji pacentị abụọ ria elu n'afọ 2021 - Emefiele

    Godwin Emefiele

    Onyeisi Ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele ekwuola na akụnaụba Naịjirịa ga-eji pacentị abụọ ria elu n'ime afọ 2021.

    Nke a na-abịa dịka Naịjịrịa banyere n'ọnọdụ ọtanisi dịka kpamkpa covid-19 na-enye mba ụwa nsogbu.

    Mana, Maazị Emefiele kwuru na o cheghị na ọtanisi nke a ga-anọte aka.

    Ọ sị na ya na-ele anya na ego tinyere n'ihe niile na Naịjirịa ga-ebelata na mbido afọ 2021.

    Emefiele gbadokwara ụkwụ na atụmatụ ha ji ahazie ego ofesi na Naịjirịa bụ nke ọ sị na-enye ohere ka gọọmentị jiri nwayọ hapụ naịra ka ọ zọwa isi onwe ya.

    Naira ejirila pacentị 28 daa n'afọ, mana ndi ọkachamara sị na etu Emefiele si agbajọo ọnu ego ofesi na-ada n'ụzọ na-eme ka ụfọdụ na-eche na-ọkwadoghị ka ka naịra zụo etu ahịa siri chọọ.

    Ụkọ dọla n'ahịa okporo ụzo mere ka o tinye ego ruo naịra 500 ịzụ otu dọla n'ụbọchị Fraịde.

  7. Unu asaala chi?

    Anyị na-enye unu nnuku ekele dịka anyị na-amalite iwetere unu akụkọ si ụwa dum.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  8. Ka chi foo nu

    Rahụ ’ọfụma

  9. Umahi ebola Egwu, Anyim ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi Steeti

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook

    Umahi ebola Anyim, Egwu ebubo iji Ipob ekposa Ebonyi steeti

    Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti ebola Sam Egwu chịburu steeti ahụ nakwa Anyim Pius Anyim bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti ahụ ebubo iji otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n’ịchafụ ekposa udo steeti ahụ.

    Ụmahi kwuru nke a ka ọ na-enye ndị igwe atọ ọfọ ọchịchị n’Abakaliki ụbọchị Fraide dịka ọ kpọkukwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na mkposa udo a abịaghị na mmezu.

    Ọ sị: `Achọrọ m ka ndị ntaakụkọ mata na m nyere mkpesa maka ụfọdụ ndị Ebonyi ji ndị otu nzuzo nakwa ụfọdụ ndị Ipob chọọ igbusi ndị mmadụ nakwa ibute ọgbaghara n'Ebonyi steeti n'ụdị ibuso gọomentị Ebọnyị na gọvanọ agha."

    "Onye ndu ha bụ Sen.Anyim Pius Anyim, ebe ndị otu bụ Sen.Sam Egwu,Sen.Obinna Ogba na Ali Odefa na ndị ọzọ."

    Ụmahi, onye kpọkuru ha ka ha sepụ aka enwe n'ofe, gara n'ihu kwuo na o nweghị onye karịrị idobe iwu obodo.

  10. United Nations: Naijiria etoola nhọpụta a họpụtara Linda Thomas-Greenfield maka ịnnochite Amerịka

    Gọọmenti Naijiria anabatala nhọpụta ahọpụtara Ambassador @LindaT_Gdịka onye nnọchite anya mba Amerịka n' otu United Nations..

    N' ozi gọọmenti etiti wepụtara n'akara 'Twitter' ha,Thomas-Greenfield,nnọchịteanya mba Amerịka n'Afrịka nakwa Osote Odeakwụkwọ steeti maka ihe ndị metụtara Afrịka bụ " ezigbo enyi Naijiria nakwa Afrịka" dịka o nyere aka inwetara Afrịka nkwado n'aka mba Amerịka.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  11. Egwu bọọlụ Naịjiria akụọla n'ala na ngụkọ FIFA

    Naịjiria esila n’ogogo iri atọ na abụọ daruo ogogo iri atọ na ise na ngụkọ egwuregwu mbaụwa ndị FIFA wepụtara n’ọnwa Nọvemba.

    Ha sikwa n’ogogo atọ gbadaruo anọ na ngụkọ nke Afrịka.

  12. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  13. E gbuola 'nuclear scientist' ọkwa ya gbagotere na mba Iran

    Mohsen Fakhrizadeh

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mohsen Fakhrizadeh bụbu onyeisi nnyocha na nnchọpụta nke ministrị nchekwa na mba ahụ

    E gbuola Mohsen Fakhrizadeh bụ onye bekee kpọrọ nuclear scientist nke ọkwa ya gbagotere, na mba Iran.

    Mohammed Javad Zarif bụ minista mmekọrịta mba Ịran na mba ndị ọzọ katọrọ ogbugbu a ma kwuo na ọ bụ ogbugbu na-eyi egwu.

    Mịnịstrị nchekwa mba ahụ zisara ozi kwuru na "ndị oyi ndụ egwu bu ngwaagha wakporo ụgbọala bu Mohsen Fakhrizadeh, onyeisi nnyocha na nnchọpụta nke ministrị nchekwa na mba ahụ.

    "Ka ndị nchekwa ya na ndị oyi ndụ egwu a kwakọrịtachara, e merụrụ Fakhrizadeh ahụ ma buga ya ụlọọgwụ, mana mbọ niile a gbara ịzọ ya ndụ enweghi isi, mere ka ọ nwụọ."

    N'etiti afọ 2010 ruo 2012, e gbufuru ndị ọrụ "nuclear scientist" anọ na mba Ịran, dịka Ịran na-ebo mba Izrel ebubo na aka ha dị na ya.

  14. A tụọla onye omeiwu nta Naịjiria nga

    A tụọla Victor Mela bụ onye nnọchiteanya n’ụlọomeiwu nta nga otu ọnwa maka ịtụ asị n’agbanyeghị na ọ ṅụrụ iyi ikwu eziokwu gbasara ntuliaka afọ 2019.

    E nyere Mela na-anọchite anya Biliri na Balanga dị na Gombe steeti ohere ịkwụ nha ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịga nga.

  15. Ndị butere coronavirus na Naịjirịa na-akwado iru 67,000

    Ihe ruru mmadụ otu narị na iri isii na itoolu ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa n’ụbọchị Tọzde.

    Kaduna steeti bụkwa ebe ọnụọgụgụ ndị butere ya kachasị dị elu dịka ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa ahụ kemgbe ọnwa Febụwarị karịrị puku iri isii na isii.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Ipob akagbuola ọkwa Osote Onyeisi dịka nsogbu di n'etiti ha na Uche Mefor na-abawanye

    Dịka okwu dị n'etiti Onyeisi otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na Osote ya bụ Uche Mefor na-abawanye, ogige otu ahụ a kpọrọ "Directorate of State" (DOS) apụtara kwuo na ha akagbuola ọkwa Osote Onyeisi na ya bụ otu.

    N'ime akwụkwọ Maazị Chika Edoziem - bụ onye zara aha ka onyeisi DOS - binyere aka, ha si na ha na-eme nke a makana "onweghi ebe ọbụla a na-eme nwereonwe a na-enwe osote onyeisi".

    Ha gakwara n'ihu kwuo ọtụtụ ihe ha sị Maaazị Mefor mere megide Ipob na onyeisi otu ahụ.

    Ebubo a gunyere ịgba mgba okpuru megide ndị Ipob na-achọ ịbata mba Briten maka ọsọ ndụ nakwa inupuru Nnamdi Kanu isi site na ịgbajọ iwu o tinyere.

    BBC gbara mbọ ịnụta n'ụnụ Maazị Mefor mana ọ saghị ozi eziri n'ekwentị ya.

    Mana Mefor dere n'akara Facebook ya ma kwuo na mgba okpuru niile ndi Ipob na-agba ya agaghị amịta mkpụrụ.

    Mefor kwukwara na ọ bụ onyeisi Ipob na ndị DOS na ebuso ya agha.

    Akwụkwọ ahụ kọwakwara na Ipob wepụrụ onye na-ahazi Mab Aemrịka bụ Obidi Obienu n'ọkwa maka nnupu isi.

  17. Etu ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ si ata ahụhụ na LUTH

    Ndị mmadụ dina n'ala nkịtị n'ụlọọgwụ LUTH ahụ
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ dina n'ala nkịtị n'ụlọọgwụ LUTH ahụ

    Nchọpụta BBC mere n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti bụ Lagos University Teaching Hospital bụ LUTH gosiri na ndị enweghgi ego n'ata ahụhụ ebe ahụ.

    Ndị isi ụlọọgwụ ahụ na-anara ezinaụlọ ndị ahụ adịghị ihe si 300,000 rue 750,000 iji nye ha ohere be ha ga-ehi ụra ma hapụ ịnye ya ndị mụrụ nwa kwesiri ị nọ ebe ahụ.

    BBC gara ebe ahụ mgbe ihe onyonyo dapụtara na soshal midia gbasara ihe ndị mmadụ na-agabiga n'ebe ahụ.

    Ụfọdụ ndị ku nwa n'aka n'ebe ahụ kwuru na n'ezie na ọ bụ n'ala nkịtị ka ha hiri ụra n'abalị foro ụbọchị ahụ.

    Wasiu Adeyemo bụ onyeisi komiti maka ndụmọdụ ahụike gwara BBC na ndị dọkịnta na ndị nọrsụ na-eleta ndị ahụ adịghị nke pụtara na o nweghi ihe ezinaụlọ ndị ahụ kwesiiri ị na-achọ ebe ahụ.

    Mgbe a jụrụ ya ma o nwere ndị ọrụ ahụike zuru ịleta mmadụ niile nọ ebe ahụ ọ sara sị "ebe a bụ Naịjirịa, anyị enweghi ihe niile"

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ebe ndị mmadụ hiri ụra na LUTH
    Nkọwa foto, Ebe ndị mmadụ hiri ụra na LUTH
  18. Donald Trump ekwerela na ya ga-apụ na obi gọọmentị Amerịka na Jenụwarị

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwerela na ya dị njikere ịhapụ obi gọọmentị Amerịka eji "White House" mara ma ya bụrụ na esuru kpọm na ọ bụ Joe Biden meriri ntuliaka Amerịka nke 2020.

    Trump kwuru nke a n'ịza ajụjụ onye ntaakụkọ jụrụ ya.

    Onye ntaakụkọ jụrụ: "Ya bụrụ na ndị tụrụ vootu kpebiri na Onyeisiala nọ na-eche bụ Joe Biden ga-emeri, ọ bụ na ị gaghị ahapụ White House?"

    Trump zara sị: "Ị ma...A ga m apụ, a ga m apụ dịka i makwa. Mana a na m eche na-enwere ọtụtụ ihe ga-eme site ugbua rue ụbọchị 20 nke Jenụwarị."

    Okwu dịka ụdịrị okwu Trump na-ekwu kemgbe e meriri ya na ntuliaka.

    O kwuola na mpụ ndi na ya bụ ntuliaka mana o weteghi akaebe ga-egosi na okwu ya kwụ ọtọ.

    Maazị Trump gakwara n'ihu kwuo na ọ ga-arị ya ahụ ikwu na-emeriri ya, ma gbajọọ ịza ajụjụ ma ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ.

  19. Ndị oji egbe egbuola eze obodo n'Ondo steeti

    Ndị oji egbe gburu otu eze obodo n'Ondo steeti dịka ọ na-ala obi ya.

    Dịka ndị ntaakụkọ siri kwuo, Oba Adegoke Adeusi nọ n'ime ụgbọala ala ya oge ndị oji egbe wakporo ha ma gbanye egbe n'ime ugboala ahụ.

    Oba Adeusi merụrụ ezigbote ahụ ma nwụọ ka ebutere ya n'ụlọ "Federal Medical Centre" di n'Owo.

    Ezinaụlọ Ọba Adeusi na-akọwa na ọ bụ ndi eziri ezi kpara ike a dịka onweghi ihe e zuru n'ime ụgbọala ya.

    Eze si nzukọ ndị eze na-ala ogbe mwakpo a mere.

    Otutu ogbugbu na ịtọrị mmadụ emeela n'ụzọ ahụ.

  20. Tanka bu mmanụ ụgbọala agbaala ọkụ n'ụzọ Agulu, Anambra steeti

    Tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'Agulu

    Otu tanka bu mmanụ ụgbọala agbaala ọkụ n'okporụzọ si Awka gawa Agulu n'Anmabra steeti.

    Nchọpụta nke BBC Igbo mere gosiri na 'brake' ụgbọala ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ nke mere ka ọ kụọ osisi ọkụ latrik bụ 'Transformer' dị nso n'ebe ahụ tupu ha enwuru ọkụ.

    Ọkụ ahụ malitere ịgba mechara gba ọdọ ahịa ndị mmadụ dị n'akụkụ ụzọ.

    O mebikwara ya bụ osisi ọkụ latrik bụ nke na-ebutere ndị obodo ahụ ọkụ ma gbaa ọtụtụ waya ọkụ n'ebe ahụ.

    Otu onye ọkụ gbara ọdọ ahịa ya aha ya bụ Chukwukerue Ezeani kwuru na ngwa ahịa ruru nde naira iri funarịrị ya n'ọkụ ahụ gbara.

    'Transformer' ahụ gbara ọkụ