Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. E gbuola mmadu abụọ n'Ebonyi n'ime esemokwu 'ndọrọndọrọ ọchịchị na otu nzuzo'

    Shedrak Chinedu Nwode

    Ebe foto si, Nwablack Tallest

    Nkọwa foto, A na-akọwa na Shedrak Chinedu Nwode na-akwado ịlụ nwaanyị tupu ọnwu ezute ha n'ike

    Onye oji egbe gburu otu nwoke aha ya bụ Shedrak Chinedu Nwode bụ onye Umuezoka na otu nwaanyị a sị bụ enyi ya nwaanyị n'obodo Oriuzo dị n'okpuru ọchịchị Ezza Nọt nke Ebonyi steeti.

    Ihe a mere n'ụbọchị ụka dịka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị nan'otu nzuzo butere esemokwu.

    Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ha ma aha ya ka a na-eche na ọ bụ ya gbara egbe gburu Maazị Nwode na enyi ya nwaanyị.

    Onye a nọ n'oge ihe a mere sị na nsogbu malitere oge Nwode Oriuzo ruru ebe otu Kancilọ si Ezza Nọt na-eme emume "thanksgiving" ndị mmadụ were na-eti "APC, APC" nke pụtara (All Progressive Congress).

    Ọ sị: "Nwode sị na ya abụghị onye APC kama ya bụ onye PDP (Peoples Democratic Party), nke mere otu onye jiri si ya kwụsị ikwu etu ahụ."

    Onye hụru ihe mere sị: "Nwode jụrụ ihe mere ya agaghị ekwu okwu e were malite ịgwọ ọnụ tupu Onyeisi okpuru ọchịchị Ezza pụtara ka ya na onye nwụrụ kpaa nkata ma mechaa see foto."

    Ọ sị: "Ka nkeji iri gachara, nwode na enyi ya nwaanyị pụrụ. Dị ka ha na-apụ a nọchịrị ha ụzọ nwere gba ya egbe n'isi. Ọ bụ mgbọ egbe ahụ tụrụ enyi ya nwaanyị were gbukwaa ya."

    Onye ọzọ ma maka ihe gwara BBC na ọ bụ esemokwu dị n'etiti ndị otu nzozu a kpọrọ Baggers na Aye butere ihe a.

    Onye an-akọwa na Nwode na-akwado ịlụ nwaanyị tupu ihe a eme.

    Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndi uweojii n'Ebonyi maka okwu a mana Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Loveth Odah sị na ya enwetebeghi ozi banyere ya bụ okwu.

    Agbanyeghị nke a, kepu kepu BBC na-anụ bụ na anwụchiela otu onye maka ogbugbu Maazị Nwode.

  2. Ndị agha enyebeghi ikike ka amalite ịkọ ugbua n'ebe ndị omekome wakporo

    Ndị egburu na Borno

    Ebe foto si, Dawisu

    Ndị agha Naịjirịa enyebeghi ikike ọrụ ugbo ma kwuo na Boko Haram anọghị na mpaghara ndị omekome wakporo ma gbuo ndị ọrụ ugbo karịrị iri anọ na atọ.

    Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu gwara BBC na ụfọdụ mpahara ugwu Naịjirịa ka nọ n’aka Boko Haram.

    Ọ sị na na ndị nwụru ka nwere ike rịa karịa mmadụ ole ama maka ya ugbua.

    Ọ bụ ụbọchị Sọnde ka elili ndị a nwụrụ.

    Garba Shehu sị: "Ihe a mere na-agbawa gọọmentị obi ... akụkọ ihe a mere ga-agbanwe dịka a na-achọpụta maka ya."

    Ọ sị na a na-achọ ndị kpara ike a ugbua. Ọ sịkwa na a na-eche na ndị a bụ omekome ofufe alakụba.

    He said there was an operation underway to pursue the attackers, suspected to be militant Islamists.

  3. Etu ndị ekperima si bata gbuo ndị be anyị - Onye hụrụ ihe merenụ

    Gọvanọ Borno Steeti bụ Babagana Zulum, gara olili mmadụ iri anọ na atọ ahụ ndị omekome gburu

    Ebe foto si, Borno state government

    Nkọwa foto, Gọvanọ Borno Steeti bụ Babagana Zulum, gara olili mmadụ iri anọ na atọ ahụ ndị omekome gburu

    Okwu a kpụ n'ọnụ n'ụbọchị Sọnde bụ ogbugbu ndị ọrụ ubi karịrị mmadụ iri anọ na atọ na Borno Steeti.

    Otu onye aha ya bụ Usman Ismail, onye hụrụ etu ya bụ ihe si mee, kọọrọ ndị ntaakụkọ ihe merenụ.

    Ismail kwuru na ndị Boko Haram na-abata n'obodo ha kwa mgbe kwa mgbe na-amanye ndị mmadụ amanye inyere ha aka.

    O kwuru sị: "Ọtụtụ oge ka ha na-abịa amanye anyị ka anyị buru ibu ha si n'ebe a baa n'ime ọhịa ebe ha bi."

    "Onweghi ihe anyị ga-emenwu n'ihi na ha bucha egbe, mana ha na-ekwu na onwghị ihe ọbụla ha ga-eme anyị."

    "Ọtụtụ oge, anyị na-arahụ n'ubi anyị n'ime ọhịa n'ihi na onweghị ihe ha na-eme anyị. Ọ bụladị n'abalị ụnyaahụ (Satọde), anyị rahụkwara n'ubi anyị."

    Usman Ismail

    Ebe foto si, Youtube screengrab/Channels TV

    Nkọwa foto, Ojisi ike ka Usman Ismail na ụfọdụ ndị ọzọ ji gbalahụ ọnwụ

    "Oge anyị hụrụ ha ka ha na-akpọkọ ndị mmadụ, anyị chekwa na ọ bụ ka anyị nyere ha aka etu anyị si emebu na mbụ."

    "Ha malitere ịkpọrọ ụfọdụ baa n'ime ọhịa mana ndị ahụ agaghị eso ha apụta. Ha akpọrọkwa ndị ọzọ baa n'ọhịa, ndị ahụ agaghị eso ha pụta."

    "Oge ahụ ka ụfọdụ n'ime anyị ji malite ịtụ egwu wee chọwa ụzọ ịmịpụ ma gbaghachi azụ n'obodo."

    Oge ndị ntaakụkọ jụrụ Ismail ihe kpatara na ha akpọghị ndịagha oge ha hụrụ ndị ekperima ahụ, o kwuru sị:

    "Anyị anaghị eji ekwentị anyị aga ọrụ n'ihi na ha ga-anara gị ya. Ọ bụrụ na ha nara gị ekwentị gị, gịnị ka ị ga-eme?"

    Gọvanọ Babagana Zulum

    Ebe foto si, Gọọmentị Borno steeti

    Nkọwa foto, Gọvanọ Babagana Zulum

    Ismail kwuru na mwakpo ahụ malitere n'elekere asaa nke ụtụtụ, mana ọ bụ n'elekere iri na otu ka ha nwetara ohere ịmịpụ ma gbaa ọsọ. Tupu ha erute n'obodo ha, ọ kụọla elekere atọ nke ehihie.

    Ọ gara n'ihu kwuo na osikapa ha kọrọ mere nnọọ nke ọma n'afọ a, mana ha amaghịzi etu ha ga-esi gaghachi n'ubi ha bute ya.

    Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum kwuru na ha ga elebagharị anya n'usoro ha ji ebuso ndị ekperima Boko Haram agha.

  4. Mmadụ 82 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    Ọnụ ọgụgụ ọrịa coronavirus

    Ebe foto si, NCDC Twitter

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ iri asatọ na abụọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Legọs kacha dịka mmadụ iri anọ na asatọ butere ya na steeti ahụ ebe mmadụ asatọ si Rivers state.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ abụọ ọzo anwụọla ebe mmadụ narị abụọ na iri atọ na isii agbakeela n'aka ya bụ ọrịa.

  5. Onye tiri ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs steeti isi aba okpu?

    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ

    Ebe foto si, The Lagos State Govt/Twitter

    Akụkọ na-ekwu na ndị omekome tiri mmadụ atọ bụ ndị ọrụ mmenyu ọku nke Legọs steeti ihe ma mebie ụgbọala ha ji arụ ọrụ dịka ha gara ịmenyụ ọkụ n'ụbọchị Sụnde.

    Onyeisi ha kwuru na ọ bụ ndị uweojii nke Alabo Police division zọpụtara ndịa.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ ato a na-anata ọgwụgwọ n'Agege General Hospital ebe ebidola nyocha maka ihe butere ya bụ mkpamkpa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. 'Ndị Naijirịa nde iri abụọ na ise ga-erite igwe ọkụ solar' - Gọọmentị Naijirịa

    Enyo solar

    Ebe foto si, Science Photo Library

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na mmadụ nde iri abụọ na ise ga-akwụ naira puku anọ kwa ọnwa n'ime afọ atọ iji nweta igwe ji ike anyanwụ emepụta ọkụ latrik n'ụlọ ha.

    Ọ bụ onye ndụmọdụ osote onyeisiala maka mgbasa ozi bụ Laolu Akande kwuru nkea n'ụbọchị sụnde ma sị na gọọmentị ga-ebido itinye igwe ọkụ a n'izuụka na-abịa.

    Atụmatụ a ha kpọrọ Solar Power Naija ga-ebido n'ọnwa Disemba nke afọ 2020.

  7. 'Restructuring' abụghị ihe kacha mkpa ugbua - Chibuike Amaechi

    Chibuike Amaechi

    Ebe foto si, Youtube Screengrab/Channels TV

    Nkọwa foto, Chibuike Amaechi

    Mịnịsta njem bụ Rotimi Amaechi, ekwuola na ịhazigharị ọchịchị obodo Naịjirịa, nke a kpọrọ 'Restructuring' na Bekee, abụghị ya kacha mkpa ugbua.

    Amaechi kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị Channels TV n'abalị Sọnde.

    O kwuru na ihe kacha mkpa ugbua bụ iwulite ọnọdụ nchekwa site n'inye ndị mmadụ ọrụ nakwa ịkwụsị agụụ.

    "Ihe ka onyeisiala Muhammadu Buhari mkpa ugbua bụ etu ọ ga-esi kwụsị ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na Naịjirịa."

    "Ihe na-akpata enweghị ezi nchekwa bụ maka na agụụ na-agụ ndị mmadụ n'ihi enweghị ọrụ."

    "Ọ bụ nke a kacha mkpa ugbua, ọ bụghị 'restructuring."

    Amaechi jụrụ ajụjụ ihe kpatara ndị mmadụ ji ekwu okwu nhazigharị ọchịchị naanị mgbe onye ugwu nọ n'ọchịchị.

    O jụrụ sị: "Obasanjọ chịrị Naịjirịa afọ asatọ, Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa afọ isii, gịnị mere na ha ahazigharịghị ọchịchị Naịjirịa? Gịnị kpatara o ji abụkarị mgbe onye ugwu nọ n'ọchịchị ka a na-ekwu okwu 'restructuring'?"

  8. Unu asaala chi!

    Taa bụ ụbọchị ọma, soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị

  9. Igbo ndị ọma ka chi foo nu

    Anyị na-ekele unu maka ịnọnyere anyị taa.

  10. Ndị uweojii na-enyocha dọkịta lekọtara Maradona ruo oge ọnwụ ya

    Diego Maradona

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Maradona gbara agbaghị agba mgbe Ajentina mabutere Iko Mbaụwa n'afọ 1986

    Ndị uweojii Ajentina na-enyocha ụlọọgwụ na ụlọ onye dọkịta na-agwọ Maradona bụ Leopoldo Luque.

    Ha sị na ha na-eme nke a iji maara ma o nwere etu dọkịta ahụ si leghara Maradona anya nke butere ọnwụ ya.

    Nwamadị a ụkwụ na-aghọ nkọ na bọọlụ nwụrụ ka ọ gbara afọ iri isii site n'obi nkolopu n'ụlọ ya dị na Buenos Aires dị n'Ajentina.

    Ụmụ Maradona ndị nwaanyị sị na chọrọ ịma ọgwụ a nọ na-enye nna ha.

    A wara Maradona ụbụrụ maka nkpụkọta ọbara na mbido ọnwa Nọvemba bụ nke gara nke ọma, ebe a na-achọ ịgwọ ọrịa ịṅụ mmanya.

    Ọ bụ onye ndu otu egwuregwu bọọlụ Ajentina mgbe ha mabutere Iko Mbaụwa n'afọ 1986, ebe o nyere goolu a kpọrọ "Hand of God" n'asọmpi ha ndị Ịngland gbara na-agba anọ nke ikpeazụ.

  11. United Nations sị na ihe ruru mmadụ 110 ka e gburu na Borno Steetị

    Ndị e gburu egbu

    Ebe foto si, Borno State Government

    Otu United Nations akatọọla ogbugbu e gburu ndị Boko Haram gburu ndị mmadụ ruru 110 na Borno Steetị ma merụọ ọtụtụ ahụ.

    Onye nchịkọta otu a na Naịjirịa bụ Edward Kallon kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde dịka ọ na-akatọ ogbugbu ma kpọọ oku ka a tọhapụ ọtụtụ ndị a tọọrọ ngwa ngwa.

    "Anyị natara ozi na ọ dị ka a tọọrọ ọtụtụ ụmụnwaanyị. Ana m akpọ oku ka a tọhapụ ha ngwa ngwa." Ihe onye nchịkọta a kwuru.

    "Nwakpo a bụ ihe ike kachasị ọjọọ a na-eme megide ndị mmadụ n'afọ a. Ana m akpọ oku ka a nwụchie ndị mere ihe ma taa ha ahụhụ."

    Otu United Nations

    Ebe foto si, United Nations/Facebook

    Ọ sị na nwakpo na-egbu mmụọ na olileanya ndị mmadụ nwere isi n'ọnọdụ ọjọọ pụta bụ nke United Nations na-agba mbọ ya ịnapụta ha.

    "Otu United Nations na ndị ọzọ na-arụ ọrụ enyemaka na Borno Steetị na-ewe iwe maka nwakpo a," Ihe o kwuru.

    Cheta na akụkọ pụtaburu na ọ bụ ndị ọrụ ugbo mmadụ iri anọ na atọ ka e gburu n'ụtụtụ Satọde n'obodo Marrabati na Hammayya dị n'okpuruọchịchị Jere nke Steetị ahụ.

    A wakporo ndị ọrụ ugbo a n'ọrụ ugbo osikapa ka ha na-aghọrọ osikapa. Ụfọdụ n'ime ha ka ndị ekperima a kpọọrọ pụọ.

  12. Onweghi APC ọbụla Gọvanọ Ikpeazu na-aga - Abia PDP

    Gọvanọ Ikpeazu

    Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Facebook

    Otu PDP nke Abịa Steetị ekwuola na o nweghi APC ọbụla Gọvanọ Okezie Ikpeazu ji azụ aga.

    Onye odeakwụkwọ pati a bụ Fabian Nwankwo kwuru nke a iji katọọ ihe onye chiburu Abia bụ orji Uzor Kalu kwuru na gọvanọ Ikpeazu chọrọ ịbanye APC.

    Kalu sị na gọvanọ Okezie kwetere ịgafeta n'APC dịka ọnọdụ o ji nwete mmeri n'ụlọikpe kachasị maka ntuliaka 2019.

    Mana Nwankwo ebubo a bụ iji megharịa ndị mmadụ anya ka ha ghara ịhụta ọrụ ọma niile gọvanọ Ikpeazu na-arụ n'Abia Steet.

    Ọ sị ikpe banyere ntuliaka n'ụlọikpe kachasị abụghị ihe a na-ekpe maka na onye ahụ chọrọ isi n'otu pati banye na nke ọzọ.

    Nwankwo gara n'ihu rịọ ndị Abia ka ha ghara ịṅa ntị n'okwu a ma lekwa sị anya n'ịkwado Gọvanọ Ikpeazu iji nwete oke ruru ha n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ozi kwukwara na PDP tụkwasịrị Gọvanọ Ikpeazu obi n'ọrụ ya ma kwuo na onweghi mgbe ọ na-atụle ịhapụ PDP.

  13. E liela ndị ọrụ ugbo ahụ karịrị 40 e che na Boko Haram gburu

    Ozu ndị e gburu egbu

    Ebe foto si, FACEBOOK/GOVERNOR ZULUM

    Gọvanọ Borno Steetị Babagana Zulum du ndịisi obodo na ndị ọzọ gaa n'olili ndị ọrụ ugbo dị mmadụ 43 ahụ e chere na ndị Boko Haram gburu ụnyaahụ.

    Gọvanọ Zulum sị na ọ bụ ihe obi mgbawa na e gburu ndị a n'ime ọrụ ugbo ka ha na-arụ ọrụ.

    "Ndị anyị nọ n'ọnọdụ ọjọọ, ha nọ n'akụkụ abụọ dị njo, ha nọrọ n'ụlọ agụụ egbuo ha mana ha gaa n'ugbo ndị ekperima nwereike gbuo ha."

    Gọvanọ Babagana Zulum nke Borno Steetị

    Ebe foto si, FACEBOOK/GOVERNOR ZULUM

    "Ọ dị mwute na anyị na-arịọ ka gọọmentị etiti tinye ndị ntoroọbịa na ndị dinta n'ọrụ nchekwa iji chekwaa ndị ọrụ ugbo anyị."

    Ha gwara Gọvanọ na nyocha ka na-aga n'ihu ịchọpụta kpọkwem mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo a site n'ọnụ onye enyemaka pụrụiche ya bụ Garba Shehu ma tie ezinaụlọ ndị e gburu aka n'obi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Anyị azọtala ogbe Mekelle dị na Tigray - Praim minista Ethiopia

    Ndị agha Ethiopia

    Ebe foto si, Getty Images

    Praịm mịnista Ethiopia bụ Abiy Ahmed ekwuola na ndị agha gọọmenti ya ewegharala ogbe Mekelle bụ isi obodo ugwu Tigray.

    O kwuru na ndị agha banyere ogbe ahụ n’agba nke ikpeazụ ọgụ ha na Tigray People's Liberation Front- mana a mabeghị akụkọ so okwu a makana ụzọ nkwụkọrịta ụka n’ogbe ahụ mechiri emechi ugbua.

    Mana otu Tigray People's Liberation Front kwuru na ha ga-alụgide ọgu iji zọọ isi ha ma kwụsị mwakpo ndị agha gọọmenti Ethiopia.

    Agha dapụtara n'etiti gọọmenti Ethiopia nakwa Tigray People's Liberation Front atala isi mmadụ narị kwụrụ narị.

  15. Etu e si gba ogbunigwe n'ụlọụka nna gọvanọ Nyesom Wike

    Ụlọụka nna Nyesom Wike

    Ndị uweojii nọ na Rivers steeti anwụchiela mmmadụ a na-eche na ha gbapụrụ ogbunigwe n’ụlọụka nna gọvanọ Nyeson Wike, Christian Universal Church International dị na streeti Azikiwe, Mile 2 Diobu area, Port Harcourt.

    Mgbe BBC gara ebe ahụ , ndị ọrụ nchekwa na-emenyu ogbunigwe nọ n’ụlọụka ahụ nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ juru ebe ahụ.

    Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere n’ụbọchị satọde, Nọvemba 28,2020 nke mere ka ndị ụlọụka ahụ gbapụ na-emerughị ahụ.

    Ọ bụ ndị ntoroọbịa bi n’ogbe ahụ nwụchiri ndị ntoroọbịa abụọ ha chere tụrụ ya bụ ogbunigwe tupu ndị uweojii awuchie.

    Ndị ọrụ nchekwa agbachiela ụzọ ebe ihe a mere nke bụ na ụgbọala maọbụ ndị ji ụkwụ aga anaghị esi ebe ahụ aga ugbua.

    Ụlọụka nna Nyesom Wike
  16. Ogbugbu ndị ọrụ ugbo osikapa 43 na Jere dị na Borno bụ ara ọpụpụ- Buhari

    Onyeisiala Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari egosila nwute ya maka etu ndị omekome si gbu ndị ọrụ ugbo osikapa n’ugbo ha dị na Zabarmari, dị n’okpuruọchịchị Jere dị na Borno Steeti.

    O tikwara ndị bee ha aka n’obi ma na-ekwu na Naịjirịa enyela ndị agha ikike ka ha chetakwa ụmụ Naịjirịa nakwa ogige ha.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari nke ukwu bụ Garba Shehu depụtara ozi a n'akara twitter ya.

    Akụkọ pụtara na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram gburu ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ n’ugbo ha.

    Kedụ ka ọdachị a si mee?

    Ndị ime obodo kwuru na ndị ọrụ ugbo ahụ egburu biara iwere ọsikapa ha karalanụ mgbe a wakporo ha.

    Akụkọ ahụ kwukwara na ndị wakporo ndị ọrụ ugbo a kere ha eriri ma na-ebepu ha isi n'ime ugbo dị na Maiduguri, isi obodo Borno.

    O nwebeghị otu poụtarala kwuo na ọ bụ ha mere mkpa mkpa a.

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ndị Boko Haram na-awakpo ndị ọrụ ugbo makana ha na-eche na ọ bụ ha na-agwa ndị agha maka ebe nzuzo ha.

    N'ọnwa gara aga , Boko Haram gburu ndị ọrụ ugbo ruru iri abụọ na abụọ n'ugbo ha n'ebe abụọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Ndewo ndị be anyị!

    Anyi na-anabata unu taa. Nke onye chiri ya zere ooo!

  18. 'Ndị oji egbe egbuola ndị ọrụ ugbo karịrị 40'

    Ụgbọala ngwaagha

    Ebe foto si, @HQNigerianArmy

    Akụkọ si Borno Steetị na mpaghara ugwu Naịjirịa na-ekwu na ndị e che na ga bụ ndị Boko Haram awakpoola ogige ọrụ ugbo ma gbuo ihe karịrị mmadụ 40.

    Nke a mere n'ụtụtụ Satọde na Kwashebe Zamarmari dị n'okpuruọchịchị Jere dịka ndị bi ebe ahụ gwara BBC.

    Ha sị na ndị a wakporo ndị ụrọ ugbo ka ha na-aghọrọ osikapa ha kụrụ n'ugbo. Akụkọ sị na e kere ndị ọrụ ugbo a eriri ma gbusie ha.

    O nwebeghi ihe ndịagha maọbụ ndị uweojii kwuru maka mwakpo a.

    Otu Boko Haram na ogbo ha ISWAP na-aga n'ihu n'ịwakpo mpaghara ugwu nke Naịjirịa na-agbanyeghi ihe gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ike agwụwala ha.

  19. Gịnị gburu nwata dị afọ iri na anọ n'ụlọakwụkwọ ya? Lee ihe anyị ma

    Bolu nwụrụ anwụ

    Ebe foto si, RIDWAN OYEWUMI

    Nwanne nwata akwụkwọ Elihan dị n’ahịa Agric nke Ikorodu Legọs gwara BBC na o cheghi na nwanne ya nwụrụ ọnwụ chi ya.

    Akụkọ sị na soshal midia sị na Boluwatife Omeleja dị afọ iri na anọ dara n’ụlọakwụkwọ ha ma nwụọ n’ụbọchị Tọsde.

    Ridwan Oyewumi, gwara BBC na ọ bụ nwanne Bola sị na ebulatara ozu Boluwatife si n’ụlọakwụkwọ ha Elihans College, Ikorodu.

    Mana o teghi aka e lie ya dịka okpukperechi ndị alakụba si dị.

    Ridwan sị na nna ha kwuru na ọ gaghị ewepu okwu ọnwụ Bolu n’ụlọikpe mana ọ dị mkpa ka ha mara ihe gburu ya.

    Kedụ etu Bolu si nwụọ?

    Akụkọ sị na a kpọrọ nna Bolu kaọ bịa n’ụlọakwụkwọ na Bolu dara n’ala ma daa mba.

    Dịka nna ya na-aga, ha hụrụ onye nkuzi na nwata akwụkwọ bu Bolu n’ụgbọala mana ọ naghị emegharị ahụ.

    Mgbe ha bu ya gaa n’ụlọọgwụ, dọkịta kwuru na Bolu anwụọla

    Mana ndịisi ụlọakwụkwọ sị na nwata ahụ dara n’ala nwụọ mgbe ọ na-aza ajụjụ.

    Bolu na nwanne ya nwoke

    Ebe foto si, FACEBOOK / OMELAJA BOLUWATIFE TAOFEEK

    Kedụ ihe mgbagwoju anya dị n’ọnwụ Bolu?

    BBC hụrụ ozi Ridwan depụtara na twitter na-ebo otu onye nkuzi a kpọrọ Emmanuel ebubo ikugbu nwanne ya Bolu.

    Ọ sị na nwanne Bolu ọzọ nọ n’ụlọakwụkwọ a bụ Lateef sị na ọ bụ Emmanuel kụrụ Bolu mere o ji daa na-amaghịzi onwe ya.

    Nwanne Bolu chọọrọ onye nkuzi Emmanuel gaa n’ụlọ ya ugboro abụọ mana ahụghị ya.

    BBC Igbo kpọrọ akara ekwentị Oduwole G.A bụ onye ezinaụlọ nyere akara ekwentị ya.

    Ọ sị na ọ nọ n’ụlọọrụ ndị uweojii na ọ gaghị azali ekwentị ya ugbua.

    Ụlọakwụkwọ Bolu na-agụ akwụkwọ

    Ebe foto si, ELIHANSCHOOLS.COM

    Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?

    BBC Yoruba kpọrọ onyeisi ndị uweojii n’Ikorodu mana ọ sị na ọ maghị ihe banyere akụkọa a.

    Ugbua amabeghi ihe gburu Bolu kpọmkwem, ọ ga-adị mma isi imi n’ala chọpụta.

    O nweghi ebe a hụrụ onye nkuzi Emmanuel a na-ebo ebubo ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọnwụ Bolu.

  20. Govanọ Hope Uzodimma ekeela ndị ntoroọbịa 250 n'Imo oke oyibo maka nkwalite ọrụ ugbo

    Dịka ọ na-ekwu ka ndị ntoroọbịa na steeti ya malite itinye anya n'ọrụ ugbo, Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti akwalitela ndị ntoroọbịa 250 oke oyibo n'ogige Bekee kpọrọ Naitional Agricultural Land Development Authority (NALDA).

    Hope Uzodinma na-eke oke oyibo

    Ebe foto si, Hope Uzodinma