E gbuola mmadu abụọ n'Ebonyi n'ime esemokwu 'ndọrọndọrọ ọchịchị na otu nzuzo'

Ebe foto si, Nwablack Tallest
Onye oji egbe gburu otu nwoke aha ya bụ Shedrak Chinedu Nwode bụ onye Umuezoka na otu nwaanyị a sị bụ enyi ya nwaanyị n'obodo Oriuzo dị n'okpuru ọchịchị Ezza Nọt nke Ebonyi steeti.
Ihe a mere n'ụbọchị ụka dịka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị nan'otu nzuzo butere esemokwu.
Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ha ma aha ya ka a na-eche na ọ bụ ya gbara egbe gburu Maazị Nwode na enyi ya nwaanyị.
Onye a nọ n'oge ihe a mere sị na nsogbu malitere oge Nwode Oriuzo ruru ebe otu Kancilọ si Ezza Nọt na-eme emume "thanksgiving" ndị mmadụ were na-eti "APC, APC" nke pụtara (All Progressive Congress).
Ọ sị: "Nwode sị na ya abụghị onye APC kama ya bụ onye PDP (Peoples Democratic Party), nke mere otu onye jiri si ya kwụsị ikwu etu ahụ."
Onye hụru ihe mere sị: "Nwode jụrụ ihe mere ya agaghị ekwu okwu e were malite ịgwọ ọnụ tupu Onyeisi okpuru ọchịchị Ezza pụtara ka ya na onye nwụrụ kpaa nkata ma mechaa see foto."
Ọ sị: "Ka nkeji iri gachara, nwode na enyi ya nwaanyị pụrụ. Dị ka ha na-apụ a nọchịrị ha ụzọ nwere gba ya egbe n'isi. Ọ bụ mgbọ egbe ahụ tụrụ enyi ya nwaanyị were gbukwaa ya."
Onye ọzọ ma maka ihe gwara BBC na ọ bụ esemokwu dị n'etiti ndị otu nzozu a kpọrọ Baggers na Aye butere ihe a.
Onye an-akọwa na Nwode na-akwado ịlụ nwaanyị tupu ihe a eme.
Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndi uweojii n'Ebonyi maka okwu a mana Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Loveth Odah sị na ya enwetebeghi ozi banyere ya bụ okwu.
Agbanyeghị nke a, kepu kepu BBC na-anụ bụ na anwụchiela otu onye maka ogbugbu Maazị Nwode.























