Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'O nweghi onye NYSC ọbụla bu coronavirus n'ogige ha n'Abia Steetị'

    Ndị ji otu afọ efe ala nna ha

    Ebe foto si, NYSC/Facebook

    Gọọmentị Abia Steetị ekwuola na o nweghi onye ọbụla butere coronavirus n'ogige ndị ji oru afọ efe ala nna ha na steetị ahụ dịka akụkọ si kwuo n'ụbọchị ole na ole gara aga.

    Kọmishịona mgbasaozi bụ John Okiyi mere ka ndị ntaakụkọ mata nke a n'Umuahia ma kwuo na o bi gọọmentị Abia ụtọ etu ndị ọrụ NYSC si chekwaa ogige ọzụzụ ha dị n'Igbere.

    Okiyi sị na ndị NYSC nille nakwa ndị bịara ha nleta n'ogige ahụ gabigara nyocha ahụ maka coronavirus nakwa iwu na usoro niile na-echekwa ya.

    Ọ sị n'ime mmadụ isii e nyochara ahụ gosituru njirimara ọrịa coronavirus, na mmadụ ise bu ya n'ezi ya mana edopụla ha iche ebe anọ n'ime e nwerela onwe ha.

    John Okiyi

    Ebe foto si, John Okiyi/Facebook

    Ọ sị na o nweghi mgbe mmadụ isii ọbụla bu ọrịa a ji banye n'ime ogige ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

    Okiyi sị na ndị e nyochara ahụ dị otu puku na otu narị na iri na asatọ, mmadụ isii n'ime gosiri njirimara coronavirus ebe ise bu ya kpọmkwem.

    Ọ gara n'ihu kwuo na obi dị gọọmentị Abia Steetị ụtọ etu ndịisi NYSC si rụọ ọrụ iji chekwaa na ọrịa agbasaghị ebe niile.

    Onyeisi NYSC na ngalaba Abia Steetị bụ Bona Fashakin sị na o nweghi ọrịa coronavirus ọbụla nọ n'ogige ha.

  2. Atọhapụla ụkọchukwu ndị ntọ tọọrọ n'Abuja

    Ụkọchukwu Mathew Dajo

    Ebe foto si, Dayọsis ụka Katọlik nke Abuja

    Nkọwa foto, Ụkọchukwu Mathew Dajo

    Ụkọchukwu ụka Katọlik dị n'Abuja aha ya bụ Mathew Dajo, enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ.

    Ndị ntọ wakporo ụlọụka ... n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Nọvemba ma tọrọ ụkọchukwu ahụ.

    Mana ọ bụ n'abalị ụbọchị Wenezde, abalị abụọ nke ọnwa Disemba ka a tọhapụrụ ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ka ọ dị ugbua, o dochabeghị anya etu e si tọhapụ ụkọchukwu a, amabeghị ma a kwụrụ ndị ntọrị ahụ ụgwọ tupu ha atọhapụ ya.

    Mana iwu ndị ụka Katọlik na Naịjirịa machibidoro ịkwụ ụgwọ ma a tọrọ onye ụkọchukwu ha.

    Otu 'Catholic Bishops Conference of Nigeria' kọwara na iwu a bụ iji gbochie ntọrọ ndị ụkọchukwu ha, maka na ha kwụọ ụgwọ iji gbapụta otu onye ụkọchukwu, ndị ntọ ga-amalite ịtọrọ ha kwa mgbe kwa mgbe.

  3. Ndị okenye mpaghara ugwu asịla Onyeisiala Buhari rituo n'ọkwa

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Garba Shehu/Twitter

    Ndị okenye ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ugwu nke Naịjirịa akpọọla oku ka Onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọkwa ya maka na o nweghi ike ichekwa ndị Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a n'ụbọchị Wenesde n'ozi odeakwụkwọ ha bụ Hakeem Baba-Ahmed wepụtara.

    Otu a kpọrọ oku a dịka ndị otu Boko Haram wakporo obodo Zabarmari dị na Borno Steetị ma gbuo ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ.

    E liri ndị a n'ụbọchị Sọnde dịka ndị obdod na-ekwu na ha ka na-achọ ọtụtụ ndị achọ.

    N'otu aka ahụ Sultan nke Sokoto bụ Sa'ad Abubakar bụ onye ndu Jama'atu Nasri Islam agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị ịgba egbe ọnụ n'okwu nchekwa na Naịjirịa.

    Ha kwuru na dịka ọ dị ugbua na Naịjirịa na o nweghizi ebe nchekwa dị.

  4. Ụlọikpe achụpụla Pondei, Joy Nunieh na ndị ọzọ dịka ndị isi NDDC

    Kemebradikumo Pondei

    Ebe foto si, Kemebradikumo Pondei

    Ụlọikpe Ukwu dị n'Abụja achụtuola Kemebradikumo Pondei,Joy Nunieh, Cairo Ojougboh na ndị ọzọ n'oche ụlọọrụ Niger Delta Development Commission, (NDDC).

    Dịka ụlọntakụkọ Daily Trust si kwuo, ọ bụ Jọstis Ahmed Mohammed bụ onye kpere ikpe ahụ nke otu otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ 'Forum for Accountability and Good Governance', wetara nyere iwu ka a kwụsị ịkpọ onwe ha ndị ndu NDDC.

    Cheta kpọrọkpọtọ gbara n'ihu ehi dịka a na-eme nnyocha ihe mere n'ụlọọrụ NDCC na nsonso a.

    Joy Nunieh

    Ebe foto si, Joy Nunieh

  5. 'Ka Buhari chụọ ndị ọrụ ime obi gọọmentị ya' - Rochas Okorocha

    Rochas Okorocha

    Ụlọ ntaakụkọ The Nation edepụtala na onye chịbụrụ dịka gọvanọ Imo steti bụ Rochas Okorocha agwala onyeisiala ka ọ chụọ ndị ime obi gọọmentị ya n'ihi na ha dara n'ọrụ ha.

    Ha dere na ọ bụ mgbe ọ gara mgbaru na nke Gọvanọ Nasarawa steeti bụ Abdullahi Sule n'obi gọọmentị steeti ahụ maka ọnwụ onyeisioche steeti ahụ bụ Philip Shekwo ndị ojiegbe gbagburu.

    O kwuru sị "ka onyeisiala Muhammadu Buhari chụsịa ndị niile na-arụrụ ya ọrụ n'ihi na ha anaghị arụ ọrụ ha dịka etu ọ kwesịrị".

    Ha dere na Okorocha kwuru ka onyeisiala Buhari tinye ndị ma ọrụ n'ọrụ ma kọwaa na ọtụtụ mba na-agabiga ihe Naijirịa na-agabiga tupu ha etoo dịka mba.

  6. Nkeji Coronavirus

  7. Buhari ekwetala ịza ndị ụlọ Nnochiteanya oku ha kpọrọ ya

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, @MBuhari

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwetala na ya na ndị Ụlọomeiwu Nta ga-enwe mkparịtaụka . Dịka Onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila si gbara ndị ntaakụkọ ama ụbọchị Wednezde,e kwekọrịtala ụbọchị ọ ga-abụ nke a ga-agba n'anwụ n'oge na-adịghị anya.

    Gbajabiamila kwuru na ọnọdụ nchekwa ala Naijiria dị Buhari mkpa nke ukwu nke mere ọ ga-eji gwa ụmụ Naijiria okwu site na ndị nnọchiteanya.

    Femi Gbajabiamila

    Ebe foto si, Femi Gbajabiamila/Twitter

  8. 'A na m ekpere Naijirịa ekpere' - Pope Francis

    Pope Francis

    Ebe foto si, Pope Francis/Twitter

    Onyeisi ụka katọlịk bụ Pope Francis etiela ndị Naijirịa aka n'obi maka ogbugbu ndị Boko Haram gburu ndị ọrụ ubi na Borno steeti. O kwuru sị " Ka Chukwu nabata mkpụrụ obi ha na ndukwa, kasie ezinụlo ha obi ma metụ ndị na-eme ihe dị etua na-emegide aha ya aka n'obi".

    Ọ bụ n'akara TWitter ya ka o kwuru nkea, magwakwa ndị Naijirịa na ọ na-ekpere ha ekpere.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. E gbuola Osote Kọmịshọna ndị uweojii na Calabar

    Egbe Eko Edum

    Ebe foto si, CrossRiverWatch

    Ndị a na-amaghị gbukasịala osote kọmịshọna, ACP Egbe Eko Edum bụ onyeisi No.73 PMF Squadron, Magumeri, Borno state na Calabar.

    A wakporo ya taa bụ ụbọchị abụọ nke December 2,2020 n'elekere otu n'ụzụ ụtụtụ n'ụzọ Murtala Mohammed dị n'akụkụ ụlọọrụ Pepsi.

    ụgbọala Edum

    Ebe foto si, CrossRiverWatch

    Osote kọmishọna Egbe Eko Edum na-aga Calabar ị ga leta ndị bee ya mgbe ụgbọala ya mebiri n'okporoụzọ.

    Mgbe ọ na-achọzi ịkpọ ndị bee ya ka ha bia buru ya, a wakpo ya ma were ọgụike gburisie ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị uweojii dị na Calabar bụ DSP Irene Ugbo gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ọdachị mere ma kwuo na ha na-enyocha ihe a merenu.

  10. Afrịka ga-enwete ọgwụ HIV na-atọ ụtọ maka ụmụaka

    Ọgwụ mgbochi HIV

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nke a pụtara na agaghị na-agbari ọgwụ okenye iji nye nwatakịrị

    Ụlọọrụ enyemaka ekwuola na a ga-ebubata ọgwụ na-atọ ụtọ na-agwọ ọrịa HIV maka ụmụaka n'Afrịka n'afọ ọzọ na-abịa abịa.

    Ọ bụ ọgwụ paediatric mbụ dị ezi ọnụala ga-adị maka ụmụaka e ku n'aka.

    Otu United Nations ekwuola na ụmụaka karịrị otu nde na ụma ise n'ụwa bu ọrịa coronavirus mana naanị ọkara n'ime ha na-enwete ọgwụgwọ.

    otu n'ihe mere o ji raa ahụ ụmụaka ịṅụ ọgwụ mgbochi HIV nke ụmụaka bụ maka ilu ahụ ọ na-akụ ọgwụ ndị a na-akụ.

    Ndị ọrụ ahụike sị a ga-enye ụmụaka ọgwụ ọnụ ụtọ a n'ụzọ ga-adị ụmụaka bu ọrịa HIV mma n'ahụ, nke pụtara na agaghị agbarizi ọgwụ okenye iji nye nwata.

    Nsogbu ọzọ bụ oke ọnụahịa ọgwụ HIV na-ada, na-agbanyeghi na ọtụtụ ọgwụ a apụtala ihe.

    N'ọnwa ole na ole na-abịa, ụmụaka bi na Benin, Kenya, Malawi, Naịjirịa na Zimbabwe na-anata ọgwụ ọhụrụ a.

    Kama ọ ga-abụ narị dọla ise kwa afọ, ọ ga-abụzi otu narị dọla na iri abụọ.

  11. Boko Haram ekwuola na ọ bụ gburu ndị ọrụ ugbo na Borno Steetị

    Abubakar Shekau, onyeisi ndị Boko Haram

    Ebe foto si, Getty Images

    Boko Haram ewepụtala ihe onyonyo ọhụrụ bụ ebe ha sị na aka ha dị n'ogbugbu ndị ọrụ ugbo osikapa karịrị iri anọ n'obobo Zabarmari nke Borno Steetị.

    Otu a sị na ha gburu ndị ọrụ ugbo a maka na ha nwuchiri ndị otu ha ma nyefee ha n'aka ndịagha na mpaghara ahụ.

    Mgbe e mechara ogbugbu ahụ, kepukepu pụtara na ọ bụ ndị Boko Haram kpara arụ a.

    Nke a ejughi anya maka na ọ bụ ndị Boko Haram na-akpakaarị ụdị agwa a ọkachasị na mpaghara ahụ.

    N'ụbọchị Satode ka ndị omekome wakporo ọrụ ugbo dị n'obodo Koshebe dị na mpaghara ​​Zabarmari nke okpuruọchịchị Mafa ma gbuo mmadụ karịrị iri anọ.

    Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ebepuru isi.

    Ndị obodo ahụ gwara BBC na ndị a wakporo ndị ọrụ ugbo.

  12. Forbes enyela Okonjo-Iweala nturu ugo onye kachasị n'Afrịka

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, Forbes

    Nkọwa foto, Ngozi Okonjo-Iweala

    Ụlọọrụ ntaakụkọ Forbes enyela Ngozi Okonjo-Iweala nturuugo mmadụ kachasị n'Afrịka nke afọ 2020.

    Nturuugo a so na nke kacha nwee nkwanye ugwu n'ụwa nakwa n'Afrịka.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Okonjo-Iweala bụ nwa afọ Naịjirịa nke abụọ na-enweta nturuugo a n'ime afọ atọ e ji malite ya.

    Onye nke mbụ bụ Akinwumi Adesina, bụbu mịnịsta na-ahụ maka nkọpụta nri na Naịjirịa.

    Adesina bụzi onyeisi ụlọakụ 'African Development Bank' ugbua.

    Onye ọzọkwa ritegoro ntuuruugo a bụ Paul Kagame, onyeisiala mba Rwanda, n'afọ 2018.

    Ngozi Okonjo Iweala

    Ebe foto si, CNBC Africa

    Nkọwa foto, Ngozi Okonjo Iweala

    Ngozi Okonjo-Iweala ji ọtụtụ ọkwa na mba ụwa.

    O so na ndị isioche otu Gavi, bụ ndị na-achịkọta nkesa ọgwụ mgbochi ọrịa n'ụwa.

    Ọ nọkwa n'isi oche ụlọọrụ Twitter.

    Okonjo-Iweala na-azọkwa ọkwa onyeisioche otu 'World Trade Organisation'.

  13. Ndị omeiwu nta ekpebiela ịkpọ Onyeisiala Buhari oku maka nchekwa

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency/Twitter

    Ndị omeiwu nta nke Naịjirịa ekpebiela na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-awuchi n'ihu ha ịbịa kọwaara ha maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    Ha mere mkpebi a n'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị Tusde mgbe ndị otu ha na-anọchiteanya Borno Steeti butere okwu maka ndị ọrụ ugbo karịrị iri anọ Boko Haram gburu na Satọde.

    Oku a ha kpọrọ butere esemokwu n'etiti ha mgbe onyeisi ha bụ Femi Gbajabiamila sị ka ọ dịghị mma ịkpọ onyeisiala ka ọ bịa n'etiti ha kọwaa ọnọdụ nchekwa. Ọ sị na ọ baghị uru.

    Ụfọdụ n'ime ha jụrụ n'ihe onyeisi ha kwuru nke mere nrụrịtaụka ji dapụta, nke mere ndịisi ha ji banye mkparịtaụka imeụlọ iji mezie okwu a.

    Mgbe ha kpachara nkata ime ụlọ a, otu onye omeiwu bụ Jaha ndị kwadoro ka ha kpọọ onyeisiala gara n'ihu sị ka onyeisiala wuchie n'ihu ha.

    Ndị omeiwu gbakọtara aka ọnụ kwee ka a kpọọ onyeisiala Buhari ka ọ bịa n'ihu kọwaa maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    Mana ha ekwubeghi kpọmkwem ụbọchị ọ bịa n'ihu ịza oku a.

  14. Igbo ndị ọma anyị na-eke unu

    Unu emeela n'isonyere anyị taa dịka anyị na-ewetere unu akụkọ banyere ndị Igbo, Naịjirịa na mbaụwa niile.

  15. CAN arịọla udo n'okwu dị n'etiti Umahi, Egwu na Anyim

    Rev Fr Nwali

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Rev Nwali na Dave Umahi

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Otu jịkọrọ ndị ụka Kraisti bụ CAN n'ịchafụ, ngalaba nke Ebonyi steeti arịọla Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave umahi ka ọ minye mma ya n'ọbọ n'esemokwu dabụtara n'etiti ya na ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ ka e were kpee udo.

    Ọ bụ onye nnyemaka gọvanọ n'ihe gbasara okpukperechi bụ Rev Fr Abraham Nwali bụ onye du ndị ndụ CAN na steeti ahụ gaa ya bụ ije n'obi gọọmenti dị na Abakaliki ụbọchị Tuzde ebe ha nọrọ kpọọ ya bụ oku.

    Ha kporo oku kee e kpee udo n'ihi na dịka ha siri kwuo, ebe tigbuo-zọgbuo dị, ọganihu anaghị adị ya.

    Ndi otu CAN n'Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Cheta na nsonso a, Umahi na ndị nwere agba n'Ebonyi steeti gụnyere Anyịm Pius Anyịm, Sam Egwu na Ali Odeifa bụ Osote Onyeisioche PDP na steeti ahụ malitere inwe nghọtahie dịka gọvanọ hapụchara otu PDP banye n'otu APC.

  16. Nkeji Coronavirus

  17. Mmadụ 145 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    ọnụ ọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus

    Ebe foto si, NCDC Twitter

    Mmadụ otu narị na iri anọ na ise ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọ bụ ngalaba NCDC depụtara nkea n'akara Twitter ha were sị na ọ bụ Legọs steeti kachasị dịka mmadụ iri anọ na itolu n''ime ha butere ya bụ ọrịa.

    E nweghị onye ọzọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ narị abụọ na iri abụọ na asaa ọzọ esila na ya bụ ọrịa gbakee.

  18. 'Onye ọbụla zeere 'Christmas carol' nke afọ a maka coronavirus'

    Onyeisi ngalaba NCDC Chikwe Ihekweazu

    Ebe foto si, NCDC/Twitter

    Ngalaba e hiwere maka mgbochi mfesa ọrịa Coronavirus na Naíjiría enyela ndụmọdụ di mkpa maka covid-19 na emume ekeresimesi.

    Ndụmodụ a gụnyere ndị na-aga emume egwu ekeresimesi nke bụ 'Carol' n'okwu bekee, ha kwuru ka ndị na-aga ya kpachapụ anya.

    Onyeisi ụlọorụ 'National Centre for Disease Control' bụ Chikwe Ihekweazu kwuru nke a n'ụbọchị Mọnde.

    O kwuru na emume carol bụ otu ụzọ ya bụ ọrịa nwereike iji gbasaa karịa etu ọ di ugbua.

    Boss Mustapha, ode akwụkwọ gọọmentị etiti nakwa onye na-achikọta otu na-egbochi coronavirus na Naijirịa tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.

    Mustapha kwuru na ha na-eme nche ma nchekwa iji hụ na ọrịa agbasaghị.

    O kwukwara sị ka ndị mmadụ hara ime njem ma ọ bụrụ na ọdịghị mkpa.

    O kwukwara na ha na-agba mbọ iji hụ na ọgwụ mgbochi rutere Naịjirịa aka.

    Mustapha gwara ndị Naijirịa nọ ofesi ka ha hapụ ịlọta n'ihi na ụfọdụ atụmatụ gọọmentị hiwere nwereike mee ka ha nọkarịa etu ha siri tụọ anya.

  19. Joe Biden ahọpụtala nwaafọ Naijirịa Adewale Adeyemo dịka 'Deputy Treasury Sectary'.

    Adeyemo na Obama

    Ebe foto si, Wally Adeyemo/Twitter

    Joe Biden bụ onye ahọpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ahọpụtala nwaafọ Naijirịa bụ Adewale Adeyemo dịka osote onye ode akwụkwọ na-echekwa akụ bụ Deputy Treasury Secretary n'okwu bekee nke mba Amerịka.

    Ọ ga-abụ osote onyeisi ode akwụkwọ maka akụ mba ahụ bụ Janet Yellen.

    Adewale bụ onye amụrụ na Naijirịa ma zụọ na obodo Kalịfonịa gụrụ akwụkwọ dịka onye okaiwu na Mahadum iwu nke Yale.

    Adewale rụkwara ọrụ dịka onyeisi mbụ nke Obama Foundation.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Unu asaala chi!

    Anyị bu n'obi na ị rahụrụ nke ọma. Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa