Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ị bọọla chi?

    I meela nke ọma wee sonye anyị n'ụtụtụ a.

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

    Isee!

  2. Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa...Ka chi foo

    Rahụ nụ duu

  3. Arik Air achụọla mmadụ 300 n'ọrụ, Arik Air amalitela ọrụ ọzọ dịka ndị ọrụ ha gbachiri ụịloọrụ ha maka ụgwọ eji ha.

    Ụgbọelu

    Ebe foto si, Arik Air Instagram

    Ndị ụlọọrụ Arịk Air edepụtala akwụkwọ ozi na ha achụọla ndị ọrụ ha mmadụ narị atọ n'ọrụ dịka ihe isiike dakwasịrị ha maka mmachi ngagharị sitere n'ọrịa coronavirus.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Adebanji Ola depụtara n'ụbọchị Frịde ka ha kwuru nke a ma kọwaa na ọ ibu iruzi ụgbọelu ha, akpataghị ego na ịkwụ ndị ọrụ ha ụgwọ butere ya.

    Ha kwukwara na ha akpọọla ndị isi otu ọrụ ha nzụkọ ka ha kwekọrịta maka ego ha ga-akwụ ndị a na-anọghịzị n'ọrụ.

    Akwụkwọ ozi ha kwuru na ndị ọrụ ha passenti iri ise n'ime mmadụ otu puku na narị isii anatabeghị ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa isii.

    Mata kwa na ndị ụlọọrụ Arik Air gbara abụbọ ọrụ were mechie ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tụzde nke ha sị na iwe ha bụ akwụghị ha ụgwọ ọnwa na ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya were na arụ ọrụ ha.

    N'otu aka ahụ ka Adebanji depụtara akwụkwọ ozi ọzo were gwa ohaneze na ha ebidola ọrụ ọzọ dịka ndị ọrụ mechiri ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tụzde.

    Ha kwuru na ha na otu National Association of Air Transport Employees enweela nghọta ma gwa ndị mmadụ na-eme njem abụbọ ọrụ a metụtara ka iwe ha hara ịdị ọkụ.

    Ma sị na ndị na-emeghị njem maka ya bụ abụbọ ọrụ nwereike ịgbanwe tiketị ha were ya mee njem oge ọzọ.

  4. Atiku, Buhari na-atụ arịrị ọnwụ Domkat Bali, Mịnista nchekwa oge Buhari chiburu

    Generalụ Dọmkat Bali bụ Mịnịsta Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọchịchị ya dịka onyeagha(1984 -1985), anwụọla.

    Bali, onye Langtang dị na Plateau steeti, nwụrụ taa bụ Fraide ka ọ gbachara afọ 80.

    Bali bụkwa Mịnịsta nchekwa n'ọge ọchchị Ịbrahim Babangida.

    Tupu o tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onye agha n'afọ 1990Ọ jiri ọtụtụ nnukwu ọkwa n'amịị gụnyere GOC nke First Infantry Division, Kaduna," Commandant" kọleji ndị agha "Nigerian Armed Forces Command and Staff College" malite n'afọ 1981 rue 1983.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ Bali na steeti ya aka n'obi maka ọnwụ ya.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu binyere aka, Buhari kwuru na ike Bali kpara ndịka onye agha nakwa ịhụnanya o nwere na ANaijiria ga na-aga n'ihu ịkpalite ndị agha ndị ka na-etolite etolite.

    N'ozi iti aka n'obi nke Atiku Abubakar zigara ezinaụlọ ya na Twitter, o kwuru na nnukwu onye agha kajara akaja furu Naijiria ma kpee ekpere ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Nkeji Coronavirus

  6. Imo-North Bye Election: Ụlọikpe mkpegharị ewepụla Ararume dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC

    Ifeanyi Araraume

    Ebe foto si, Ifeanyi Araraume/Facebook

    Ụlọikpe Mkpegharị dị n’Owere nọrọ n’ehihie Fraide kụpụ aha Senetọ Ifeanyị Araraume dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka mmeju a ga-eme ụbọchị Satọde maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-North(Okigwe Zone) n' Ụlọomeiwu Ukwu.

    Jọstis Uchechukwu Onyemenamma bụ ọkaikpe kpere ya bụ ikpe kpọpụtara aha Frank Ibezim dịka onye a ga-eji dochie Araraume.

    Nke a na-eme dịka Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja kagburu aha Frank Ibezim sị na o tozughị ịzọ ọkwa ọchịchị n’aha APC.

    Jọstịs Inyang Ekwo bụ ọkaikpe nyere mkpebi ahụ kwuru na asambodo na ihe akaebe nke Ibezim nyere pati APC nakwa Inec bụ akwụkwọ ụgha na asambodo adigboroja.

    Ekwo kwuru na aha Ibezim zara dị iche, ebe o wetara asambodo ule Waec atọ bụ adịgboroja.

    Ihe ndị a niile na-abịa dịka ọ fọrọ naanị otu abalị tupu e mee ya bụ ntuliaka iji họpụta onye ga-anọchị ọkwa Senetọ Benjamin Uwajumogu nọ na ya tupu ọ nwụọ n'afọ 2019.

  7. Lee ebe ndị a ga-emegharị ntuliaka ndị omeiwu n'ụbọchị ise nke Disemba

    Ntuliaka

    Ụlọọrụ Inec ga-ahazigharị ụfọdụ ntuliaka ndị ụlọomeiwu a kpọrọ by-election na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa na Satọde ụbọchị ise nke ọnwa Disemba.

    Ntuliaka a ga-abụ maka ndị ụlọomeiwu ukwu isii na ndị omeiwu nta itoolu na steetị iri na otu dị na Naịjirịa.

    Ụfọdụ ebe ndị a gụnyere; Imo North, Legọs East, Bayelsa West na Central Disrict, Cross River North na Plateau South.

    Mpaghara Nganzai na Bayo dị na Borno Steetị, Obudu nke Cross River Steetị, Bakura nke Zamfara na Ibaji nke Kogi Steetị na ndị ọzọ.

  8. Ụlọikpe enyela iwu ka e tinye Abdulrasheed Maina na nga Kuje dị n'Abuja

    Abdulrasheed Maina

    Ebe foto si, NPF

    Ọkaiwu Okon Abang nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja asịla ka a tukpuo Abdulrasheed Maina na nga Kuje ruo mgbe ọzọ a ga-achabi ikpe ya.

    O nyere iwu a ka ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC kpụpụgharịrị Maina bụbu onyeisi otu 'Pension Taskforce' n'ụlọikpe dị n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

    Ọkaikpe Abang bugharịrị ụbọchị ikpe ya ruo abalị asatọ nke ọnwa Disemba, 2020.

    Maina bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo mpụ ego dị ijeri abụọ gbasara ọsọ ma gbaaga na mba Niger Repọblik mgbe ụlọikpe tọhapụrụ ya n'akaebe.

    A nwuchiri ya ma kpọlata Naịjirịa n'ụbọchị Tọsde n'ime izuụka abụọ ụlọikpe kagbuchara ntọhapụ e nyere ma sị ka a nwuchie ya.

    A gbara ya n'anwụ n'ụlọikpe dị n'Abuja n'elekere asatọ nke ụtụtụ Fraịde a.

    Mgbe ikpeazụ Maina pụtara n'ụlọikpe bụ n'ọnwa Julaị dịka ọ gbajọọla ikpe ugboro isii kamgbe ụbọchị 29 ọnwa Sepụtemba.

  9. Ihe karịrị mmadụ narị atọ ka a hụrụ nje covid-19 n'ahụ ha n'ụbọchị Tọzde

    Ọnụọgụgụ coronavirus

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba National Centrr for Disease Control kwuru na ọ bụ mmadụ narị atọ na iri anọ na atọ ka a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde.

    Nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ọnwa Ọgọst, nke mere ka ha dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ na-echekwasi onwe ha ike.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Gọọmentị etiti adọọla aka na ntị ugboro ugboro ka ndị mmadụ na-akpachapụ anya ka ọrịa coronavirus ghara ịmalitekwa ịrị elu ọzọ.

    Ha kwuru na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa agaghị ebuli mmechi obodo ọzọ n'ihi ọrịa a.

  10. Mba Itali amachiela ndị mmadụ ime njem ekeresimesi n'ihi coronavirus

    Mba Itali

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Itali ga-amachi ndị mmadụ ime njem ekeresimesi na mpaghara di iche iche nke mba ahụ malite n'ụbọchị 21 ọnwa Disemba maka coronavirus.

    A ga-etinyekwa ọnọdụ onye apụla n'ezi malite n'elekere iri nke abali ruo elekere ise nke ụtụtụ.

    Praịm minista ha bụ Guiseppe Conte gwara ndị ntaakụkọ na ha agaghị anọ na mmiri ncha abaa ha n'anya.

    Ụlọ ebe a na-ere nri ga na-emepe n'ụfọdụ ebe ruo elekere isii nke ehihie maka ndị na-azụrụ ala n'ụlọ ha.

    Ntuziaka ọhụrụ a na-abịa dịka mmadụ 993 nwụrụ n'ọrịa coronavirus bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.

    Joe Biden

    Ebe foto si, Reuters

    Joe Biden sị ndị Amerịka ga na-eyi mkpuchi ma ọ banye n'ọchịchị

    Onye a họpụtara dịka onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ ga-asị ndị mba ahụ yiwe mkpuchi imi ruo ụbọchị otu narị ọ banyere n’ọchịchị.

    Biden mgbe ọ na-aza ajụjụ na CNN sị na o kwenyere na ọrịa a ga-agbatu ma ọ bụrụ ndị Amerịka yiwe ihe mkpuchi imi a.

    Ọ sị na ọ ga-enye iwu ka a na-enyi mkpuchi imi n'ụlọọrụ niile gọọmentị Amerịka nwe.

    Ugbua mba Amerịka enwetela mmadụ nde iri na anọ na ụma buterela coronavirus, mmadụ puku narị abụọ na puku iri asaa na puku isii anwụọla.

    Mana iwu mba Amerịka sị na onyeisiala ha enweghi ikike ịmagide ndị Amerịka iyi mkpuchi imi mana Biden sị ya na osote ya bụ Kamala Harris ga-eji onwe ha maa atụ site n'iyi mkpuchi imi.

  11. 'Ihe nwereike ime ka mba ofesi machie ndị Naịjirịa ịbata obodo ha'

    Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa

    Ebe foto si, Nigerian Senate

    Ndị Sịnetị adọọla aka na ntị na mba ndị ọzọ nwereike ịmachi ndị Naịjirịa ịbata n’obodo ha ma ọ bụrụ na gọọmentị agbaghị ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Onyeisioche kọmitii ahụike bụ Ibrahim Oloriegbe sị na ọgwụ mgbochi ọrịa a nke kwere Naịjirịa na nkwa agaghị ezu.

    Cheta na otu a kpọrọ Global Alliance for Vaccine Initiative kwere nkwa inye Naịjirịa naanị pasenti iri abụọ n'ime ọgwụ mgbochi ọrịa coronavirus ha chọrọ.

    Mana Oloriegbe kwara arịrị sị na gọọmentị kwesịrị ịchọ ụzọ ọzọ ha ga-enwete, kesaa ma gbaa ndị Naịjirịa ọgwụ a ebe o zuruoke.

    Ọ sị na iji gbanarị mmachị n'ụwa niile, na Naịjirịa kwesịrị ịmawapụta ego banyere nke n'akwụkwọ mkpata na mmefu.

    Sịnetọ gakwara n'ihu sị na ndị mmadụ anaghizi idosa iwu na-achịkwa mgbochi mfesasị coronavirus nke gụnyere ịsa aka, ikpuchi imi nakwa ịnọsa anọsa.

  12. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Obi ọma ka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ nke taa.

  13. Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa

    Ka chi foo

  14. Gịnị na-eme n'ụlọọrụ ụgbọelu Arik Air?

    Kepukepu si n'ọdọụgbọelu apụta na-akọwa na ndị njem gbatara akwụkwọ ikike iji ụgbọelu Arik mee njem atọkịrịla ebe ahụ.

    Akụkọ kwuru na gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma n'ihi na ndị ụlọọrụ a gbara abụbụọrụ.

    Otu a kpọrọ National Union of Air Transport Employees, nọ na-egosi iwe ha n'ihi ihe ha kpọrọ mmegbu ndị ụlọọrụ Arik na-emegbu ha bụ ndị na-arụrụ ha ọrụ.

    Ha kwukwara na e ji ụfọdụ n'ime ha ụgwọ gụnyere ụgwọ ezumiike nka, ma gbaa ndị ọzọ arụkwaghịm.

    Ihe nkiri si n'ụlọntakụkọ HipTv gosiri ebe ụfọdụ ndị ọrụ a na-eme ya bụ ngagharịiwe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ụfọdụ ndị na-eme njem gara na soshal midia na-egosi iwe ha maka etu abụbụọrụ a si metụta ha na njem ha.

    Lee ụfọdụ ihe ha kwuru:

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 5

  15. Onye ntaakụkọ Naijiria eritela nzere 'Kurt Schork Awards'

    Fisayo Soyombo

    Ebe foto si, @fisayosoyombo

    Otu onye ntakụkọ Naijiria bụ Fisayo Soyombo eritela nturuugo "Kurt Schork Awards' maka akụkọ nnyocha o mere maka nrụrụaka dị n' ikpe ikpe na Naijiria.

    Soyombo dere akụkọ gbara n'anwụ mpụ na aghụghọ dị na inweta ikpenkkwụmọtọ na Naijiria.

    Iji mee ya bụ akụkọ, Soyombo danyere n'aka ndị uweojii ebe ọ nọrọ abali ise ma nọkwaa na mkpọrọ Ikoyi abali asato ebe o mere nchọpụta etu nrụrụaka si eweghachi aka elekere azụ na inweta ikpemkwụmọtọ na Naijiria.

    Na ịnwụrị maka nrịte ahụ o nwetara Soyombo kwuru na akara Twitter ya na nke a bụ ya afọ isii ọ gbaliwara irite nzere ahụ ma bụụkwa nke ugboro ise o tinyere akwụkwọ maka nzere ahụ, ebe aha ya soro na ndị a kpọpụtara ugboro atọ tupu ya enweta nke afọ a.

  16. Nkeji Coronavirus

  17. A kpọlatala Maina na Naijiria

    A kpọlatala onye bụbu Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ego ndị lara ezumike a kpọrọ bụ Abdulrasheed Maina na Naijiria.

    Ndị uweojii Nijie nwụchiburu Maina na mba ha maka inyefe ya n'aka ndị ogbo ha na Naijiria abali ole na ole gara aga.

    Dịka akụkọ siri kwuo, ụgbọelu bubatara Maina feturu n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n'Elekere 2:30 nke ehihie.

    Cheta na e jichiburu Senetọ Ali Ndume bụ onye bụ onye akaebe Maina n'ihi na Maina gbara ọsọ mana e mechara tọhapụ ya.

    Abdulrasheed Maina

    Ebe foto si, APC UK

  18. 'Ndị otu oyi egwu nwereike ịnọ Naijirịa ruo afo iri abụọ' - Tukur Yusuf Buratai

    Tukur Yusuf Buratai

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi ndị agha Naijirịa ekwuola na mkpamkpa ndị otu oyi egwu nwereike ịnọgide na Naijirịa ruo afọ iri abụọ.

    Ọ bụ na Facebook ka ọ depụtara nke a dịkka ndị omekome gburu mmadụ iri anọ na atọ ndị na-akọ osikapa na Borno steeti n'ụbọchị satụde.

    Mkpamkpa a mere ka ndị Gọvanọ ugwu kwuo ka a chụọ Buratai n'ọrụ ma kpọta ndi agha na abụghi ndi Naijirịa a na-akwụ ụgwọ ka ha lụso ndị oyiegwu a ọgụ.

    Mana Buratai na-ekwu na ndị mmadụ ahọtaghị ihe gbasara ndị otu oyi egwu.

    O kwuru sị " Ka mmadụ niile tịkọọ aka ọnụ maka enweghị nchekwa na Naijirịa. Ka ọ bụrụ ọrụ dịịrị mmadụ niile"

  19. Fransi na-eru uju ọnwụ Giscard d'Estaing

    Valéry Giscard d'Estaing
    Nkọwa foto, Valéry Giscard d'Estaing chịrị Fransi site n'afọ 1974 rue 1981

    Ndị Fransi nọ n'iru ujụ dịka aka chịbụrụ mba ahụ site n'afọ 1974 rue afọ 1981 bụ Valéry Giscard d'Estaing, lara mụọ ka ọ gbachara afọ 94.

    Ọ bụ ọrịa coronavirus gburu ya n'ụlọ ya na mba ahụ.

    A ma Giscard d'Estaing dịka onye gbapere ụzọ dịka o si metụta iwu maka ikposa alụmdinanwunye, iwepụ ime na ọgwụ mgbochi ịtụ ime n'afọ asaa ọ nọrọ n'ọchịchị.

    N'okwu ya, onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwuru na ọchịchị Giscard d'Estaing gbanwere mba ahụ ma ka na-edu mba ahụ .

    "Ọ bụ odibo ala anyị, onye na-adọm ndọrọndọrọ ọganihu na nnwereonwe. Ọnwụ ya etinyela Fransi n'iru uju."

    Ndị Ezinaụlọ Giscard d'Estaing kwuru na akwamozu ya ka bụ 'kpomkpem maka naanị ndị imeụlọ ha.

  20. 'Onyeisiala a daala iwu ma ọ chụghị ndị isi ọrụ ya n'ọrụ' - Omeiwu Shekarau

    Shekarau

    Ebe foto si, Senator ibrahim Shekarau/Twitter

    Omeiwu Ibrahim Shekarau ekwuola na onyeisiala Naijirịa dara iwu obodo ma ọ bụrụ na ọ chụghị ndị isi ọrụ ya n'ọrụ.

    Shekarau kwuru nke a dịka ya na ndị ntaakụko Channels nwere mkparịta ụka taa bụ ụbọchi Tụzde.

    Ọ kọwara na iwu Naijirịa kwuru na onye ọrụ gọọmentị ruru afọ iri isii ekwesịla ịpụta n'ọrụ.

    Shekarau kọwara na onye rụgoro ọrụ afọ iri atọ na ise ekwesịla ịkwụsi ọrụ.