Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Tottenham vs Arsenal: Tottenham echiela Arsenal ọnụ na 'korota' ụzọ Nsukka.

    Ndị otu Arsenal

    Ebe foto si, Getty Images

    Tottenham egosila ndị otu Arsenal na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ.

    Ọ bụ dịka ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Premier League ka ikuku kuru were gosi ụwa niile otule Arsenal.

    Ọ bụ na nkeji nke iri na atọ ka Son Heung-Min nke Tottenham gbanyere goolu n'elu aka ekpe ọnụ postu ndị Arsenal.

    Ndị otu Tottenham

    Ebe foto si, Getty Images

    Goolu Son nyere dịka ọ kpalitere mụọ ndị otu ya.

    Ebe mbọ niile Arsenal gbara ịsa ya bu goolu lara n'efu.

    Dịka ọ nọ na nkeji iri anọ na ise kpọmkwem ka Giovani Lo Celso wetere bọọlụ, gbapụ ya ọso were nye Son Heung-Min onye nyere ya Harry Kane.

    Harry Kane chiri onwe ya eze dịka ọ gbakara netị ndị Arsenal were mee ya goolu abụọ tupou egbochie agba nke mbụ.

    Harry Kane ka ọ na-enye goolu abụọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Mbọ niile Arsenal nyere ịsa goolu abụọ gbara ọnyụpa dịka ndị Tottenham jiri ya mee ha oji n'ụlo ha.

  2. Gọvanọ Abia steeti akwụsịla onyeisi ndị ọrụ ya ọrụ

    Dr. ACB Agbazuere na Odumeje

    Ebe foto si, BBC Pidgin

    Akwụkwọ ozi gọọmentị Abia steeti depụtara na-ekwu na Gọvanọ Steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu enyela ikike ka achụọ onyeisi ndị ọrụ nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Dr. ACB Agbazuere n'ọrụ.

    Ọ bụ onye ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Chris Nzem depụtara ya bụ ozi were sị na ọ bụ onye ode akwụkwọ nke obi gọọmentị steeti ahụ bụ Alozie Odoemelam ga na-arụ ọrụ onyeisi ode akwụkwọ dịka o siri dị.

    Akwụkwọ ozi ha ekwughị ihe mere ha jiri chụọ ya n'ọrụ.

    Ọ bụ n'ụbọchi ole gara aga ka ewepụtara ihe onyonyo gosiri ebe Dr. ACB Agbazuere na-abọ onye ụkọ chukwu eji Odumeje mara ego n'ụlọ ọrụ ya.

    Lee ihe onyonyo ahụ ebe a.

  3. NHS ga-amalite inye ndị Briten ọgwụ mgbochi na Tuzde

    Njụoyi ebe a na-etinye ọgwụ mgbochi karịrị puku 80 na UK

    Ebe foto si, PUBLIC HEATH ENGLAND/PA WIRE

    Nkọwa foto, Njụoyi ebe a na-etinye ọgwụ mgbochi karịrị puku 80 na UK

    Ngalaba National Health Service (NHS) nke mba Briten ga-amalite inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus n’ụbọchị Tuzde.

    Ha kwuru na ha ga-esi na ndị agadi gaferela afọ iri asatọ nakwa ndị na-elekọta ha n’ụlọ ebe a na-etinye ha, malite.

  4. A nwụchịrị nọọsụ 12 na Delta steeti? Lekwa ihe anyị chọpụtara

    Ndị nọọsụ

    Ebe foto si, Government of Delta steeti twitter page

    Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ dọkịta Mordi Ononye ekwuola na onweghị ndị nọọsụ ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụbọchị Fraide bụ December 4,2020.

    O kwuru na ndị uweojii kpọpụrụ ndị nọọsụ batara ime ebe ndị nọọsụ ndị ọzọ nọ na-ele ule n'otu ụlọakwụkwọ mana ha anwụchịghị ha kama ha na ha gara inwe mkparịtaụka ka ha wee kwụsị ighasasi ule a na-ele ebe ahụ.

    Mana odeakwụkwụ ndị otu nọọsụ na Delta steeti bụ Chukwuka Ezugwu kwuru na ndị uweojii steeti ahụ nwụchịturu ma hapụkwa ndị otu ha mgbe ha gara ile ma ndị ụlọakwụkwọ nọọsụ ndị ọzọ nọ na steeti ahụ esonyere na abụbụ ọrụ ha kanyere ụbọchị Fraide ahụ.

    Ezugwu kwuru na ndị otu nọọsụ steeti ahụ gbara arụkwaịm maka ihe ha kpọrọ nneni na mmaja gọọmenti na-eme ndị nke ha site n'iwere onye nọọsụ nọ n'obere ọkwa tinye n'ọnọdụ onye nọọsụ nke ukwu kwesiri nọ nakwa mkpa ndị ọzọ.

    Kọmịshọna Ononye kwuru na gọọmenti hibere otu na-elebanya na mkpa ndị a nakwa e nyere ha ruo ngwụcha Jenụwarị iweta ogbugbo nye mkpa ndị ahụ.

  5. Tokunbo Abiru nke APC azọtala oche sineti nke Legọs Ist

    Tokunbo Abiru bụ onye fere ọkọlọtọ pati APC na ntuliaka mmeju onye ga-abụ onye nnọchiteanya ndị Legọs Ist n'ụlọomeiwu ukwu, emeriela.

    Abiru nwetara vootu 89,204 iji zọta oche ahụ, ebe onye na-eso ya bụ Babatunde Gbadamosi nke PDP nwetara vootu 11,257.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. APC azọtala oche sineti n'Imo Nọt, APC meriri ntuliaka mmeju n'Imo Nọt

    Ebe a na-akpọpụta mpụtara ntuliaka n'Ọnụimo dị n'Imo steeti

    Ebe foto si, Inec/Twitter

    Nkọwa foto, Ebe a na-agụkọ akwụkwọ vootu n'Ọnụimo dị n'Imo steeti

    Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec), akpọpụtala APC dịka pati meriri na ntuliaka mmeju e mere iji họpụta onye ga-abụ Sinetọ n’Imo Nọt.

    Hakeem Adikum bụ "Election Returning Officer" kwuru na APC nwetara vootu 36,811 ebe Emmanuel Okewulonu nke PDP nwetara 31,903.

    Francis Ezeonu bụ kọmishọna Inec nọ na steeti ahụ, gwara ndị ntaakụkọ na ọ kpọpụtara pati kama aha mmadụ n’ihi na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi okwu mmadụ abụọ na-azọ onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ.

  7. Ndị Naịjirịa agaghị akwụzị 'reciprocity fee' nke akwụkwọ ikike mba Amerịka

    Mba Amerịka ewepụla ego a na-anabu ndị Naịjiria na-achọ akwụkwọ ikike visa iji abata na mba ha, bụ nke a kpọrọ ‘reciprocity fees’ na Bekee.

    Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjiria wepụkwara ọtụtụ ego ha na-ana ndị mba Amerịka na-achọ akwụkwọ ikike visa ha ji abata Naịjiria.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

  8. Naịjiria enyela AU akwụkwọ nkwekọrịta AfCTA ha binyere aka

    Ụgbọala bu nri

    Ebe foto si, AFP

    Naịjiria enyela ngalaba jikọtara mba ndị dị n’Afrịka bụ African Union maọbụ AU n’ịchafụ, akwụkwọ nkwekọrịta ha na African Continental Free Trade Area (AfCTA).

    Nke a bụ nkwekọrịta na mba ndị dị n’Afrịka ga na-azụkọrịta ahịa nke ga-enyere aka ịkwalite azụmahịa Afrịka na mbaụwa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Ị bọọla chi?

    Udo dịrị gị.

    Nọnyere anyị taa dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa.

  10. Manchester United ejirila ọkpụ goolu atọ asatara otu nyụọ West Ham ịkpakwụ na be ha

    West Ham vs Manchester United

    Ebe foto si, Press Association

    Asọmpi Premier League dị n'etiti Manchester United na West Ham United ebiela na 3 - 1 dịka Manchester United gbajiri West Ham aka na be ha n'abalị Satọde a.

    Ya bụ okwu bidoro dịka West Ham ji goolu nke mbụ kwaara Manchester United ọbịa na be ha.

    Mana ya bụ ọji atụghị Man. Utd ọnụ nke mere iwe jiri wee ha ka alọtachara ezumike, ha were kwopụta ka agụowuru were mee West Ham "many things" agbanyeghị na ha nọ be ha.

    Pogba, Greenwood na Rashford zara aha ha n'aka nke ndị Man.Utd. iji gosi na onye a na-ekwu nwere ihe ọ na-eme, ebe Soucek gbaara isi onwe ya n'aka nke ndị West Ham.

  11. Mmiri eriela ndị uweojii atọ gara ọrụ ntuliaka e mere na Bayelsa steeti

    Ụgbọ kpuru

    Mmiri eriela ndị uweojii mmadụ atọ gara ọrụ nchekwa na ntuliaka mmeju e mere na Bayelsa steeti taa.

    Ndị uweojii ahụ nọ n'ụgbọmmiri na-aga okpuruọchịchị ọdịda anyanwụ dị na Bayelsa Sentral District mgbe ụgbọ ha kpuru n'oke osimiri.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bayelsa bụ Asinim Butswat bụ onye kwuru nke a.

    A matabeghị ndị ndị uweoji ahụ dọ n'ozu bụ ka ọ dị ugbua.

  12. Ndị agha Amerịka ga-esi Sọmalịa laa n'abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị

    Ndị agha Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    N'Afrịka, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela iwu ka ndị agha Amerịka nọ na Somalia kwara ngwongwo ha lata tupu ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị.

    Ndị agha Amerịka nọ na mba ahụ enyere ndị agha ha aka ebuso ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ agha dị narị asaa (700).

    Amerịka sị n'ụfọdụ n'ime ha ga-agafe mba agbata obi ha ndị ọzọ maka ịnye aka chekwaa okeala ha.

    Cheta na nsonso a, na otu ahụ ka Trump sikwa kpọchite ndị agha Amerịka na-enyeaka na mba ndị ọzọ dịka Iraq na Afganistan.

    Ọ bụghị taa ka Trump malitere ịkpọ oku ka ndị agha Amerịka nọ na mba ofesi lọta maka oke ego ha na-akwụfụ n'isi ihe ọ kpọrọ agha na-enweghị isi.

    Iwu a onyere bụ nchigharị n'ihe ọchịagha ya nke puru n'ọnwa agara aga bụ Mark Esper nyeburu, ka ndị agha ahụ nọtụkwuo na Somalia.

  13. Borno massacre: "Ọnweghị ụmụnwaanyị maọbụ ụmụagbọghọ ndị omekome tọọrọ" - Ezeobodo

    Boko Haram

    Ebe foto si, Getty Images

    Ezeobodo ndị Zabarmari na Brono steeti bụ Zanna Bukar ekwuola hoohaa na ọnweghị ụmụnwaanyị maọbụ ụmụagbọghọ ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọọ bịara kpamkpa n'obodo ha izuụka gara aga jidere.

    Ya bụ Ezeobodo mere ka o doo anya na ọ bụ ụmụokorobịa ndị ọrụ ngọ gara ọrụ ebe ahụ ka ha gburu.

    N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ Punch, ụbọchị Fraịde, Bukar kwuru sị, "mbanụ, onweghị otu mkpuru nwaagbọghọ maọbụ nwaanyị na be anyị ha meturu aka. Ndị ya bụ ihe metutere bụ naanị ụmụ ntorobịa dị n'agbata afọ iri na atọ ruo iri atọ. Ụfọdụ n'ime ha nụrụ nwaanyị ọhụru, ebe ụfọdụ ka bụ ụmụakwụkwọ bụ ndị nọ n'ugbo ha kemgbe". Ụfọdụ n'ime ha bụkwa ndị ọrụ ngo bụ ndị na-akpata ihe ha na ezinụlọ ha ga-eri".

    "Anyị nụru asịrị na-efegharị na ndị ajọọ mmadụ ahụ kpokooro ụmụnwaanyị, nke ahụ abụghị eziokwu", Bukar gwara ndị ntaakụkọ.

  14. Etu ntuliaka mmeju si aga na mpaghara Legọs dị iche iche

    Onye na-atụ vootu

    Ntuliaka ebirila ọkụ na mpaghara dị iche iche na Legọs steeti dịka ndị mmadụ pụtara isonye na ya bụ ntuliaka mmeju.

    Na mpaghara Legọs gụnyere Shomolu, Ibeju/Lekki, Kosofe, ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu ha.

    Onye bịara ịtụ vootu

    Ma ndị bịara ịtụ vootu ma ndị na-ahazi ya bụ atụmvootu jikere ọfụma igbochi mfesa ọrịa ozuruụwaọnụ covid-19.

    Foto setere ebe ụfọdụ n'ime ha yi mkpuchi imi ma nọsapụkwa anọsapụ.

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjiria bụ Inec n'ịchafụ gosiri etu ntuliaka si aga na Shomolu:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ka o si aga na mpaghara Ibeju/Lekki:

    N'Imo steeti nakwa Enugwu steeti, ntuliaka na-agakwa dịka e si tụ anya.

    Lee etu o si aga n'Eha-Amufu dị n'Enugwu steeti

  15. A na-atụ vootu n'Eha-Amufu

    A malitela ịtụ vootu na mpaghara Eha Amufu dị n’Isi Uzo n’Enugwu steeti, dịka a na-eme ntuliaka mmeju ebe ahụ.

    Mara na otu ndọrọndọrọ ọchịchị itoolu gụnyere APC na PDP so na ndị na-azọ ọkwa na ntuliaka Isi-Uzo State Constituency Bye-Election.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    N'Imo steeti:

    Ndị na-ahazi ntuliaka yicha mkpuchi imi dịka ha na-ahazi ihe e ji eme ntuliaka n'Isiala Mbano.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  16. 'Anyị agaghị amanye ndị Amerịka ịgba ọgwụ mgbochi' - Joe Biden

    Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Joe Biden bụ onye a họpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ekwuola na a gaghị amanye ndị mba ya ịnara ọgwụ mgbochi Coronavirus mgbe a ga-amalite ikesa ya.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba CDC n’ịchafụ bụ nke na-ahụ maka mgbochi mfesa ọrịa na mba ahụ na-arịọ ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ na-eyi mkpuchi imi maka etu ọrịa a si efesa na mba ahụ.

  17. Messi a na-agafe PSG?

    Lionel Messi

    Ebe foto si, AFP

    Kepukepu na-akọwa na ndị PSG na-atụharị uche ịma ma ha a ga-azụtanwu onye egwu Lionel Messi n’afọ na-abịa.

    Nke a na-abịa dịka Neymar ya na ya gbakọrọ bọọlụ na Barcelona gwara ndị isi PSG na ọ ga-amasị ya ma ọ bụrụ na Messi bịa sonye ya ọzọ.

  18. Mmadụ 324 ebutekwuola Covid-19 na Naịjiria

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ewepụtakwuola ọnụọgụgụ mmadụ 324 bụ ndị butere covid-19 ọhụrụ na Naịjiria.

    Nke a gụnyere mmadụ 115 butere ya na Legọs na 110 na mpaghara Abuja.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Ọrịa ịba ọcha n'anya egbuola ihe karịrị mmadụ 173 na Naịjiria' - WHO

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ọrịa ịba ọcha n'anya egbuola ihe karịrị mmadụ 172 na Naịjiria kemgbe o selitere isi ọzọ n’ọnwa Nọvemba 2020.

    Ha kwuru na nke a ewetakwuola ọgbatauhie dịka Naịjiria ka na-ebuso Covid-19 na ọrịa ndị ọzọ agha nakwa nsogbu gbatagbata dị na mpaghara Ugwu Naịjiria.

    Tarik Jasarevic bụ ọnụ na-ekwuchitere ngalaba WHO ọnụ gwara ndị ntaakụkọ na Geneva, na Naịjiria na-ebuso mwakapụta ọrịa a agha kemgbe 2017.

    O kwuru na a e nyochaaala mmadụ 530 nwereike ibu ya, ebe 48 n'ime ha ebutela ya bụ ọrịa na Delta, Enugwu, Bauchi, Benue na Ebonyi steeti kemgbe ahụ.

    "Mmadụ 172 anwụọla n'ime mmadụ mmadụ 530 ahụ a na-enyo na ha bu ya." ka Jasarevic kwuru.

    Pasentị ndị a gbarala ọgwụ mgbochi maka ọrịa a n'Afrịka ka pere mpe, n'agbanyeghi na ọgwụ mgbochi ya na-arụ ọrụ ya ọfụma ma dị mfe inweta.

    E nweghi ọgwụ e ji agwọ ya bụ ọrịa ịba ọcha n'anya bụ nke anwụnta na-ebute.

  20. Lee ndị ga-eso eme ntuliaka n'Imo Nọt taa

    Dịka a ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchite anya ndị Imo Nọt n'ụlọomeiwu ukwu taa, ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ewepụtala aha ikpeazụ bụ ndị ga-eso zọọ ya bụ oche.

    Inec wepụtara aha mmadụ 14 dịka ndị ga-eme ya bụ ntuliaka, mana anya niile na-ele ihe ga-eme dịka ụlọikpe abụọ dị iche iche kpọpụtara mmadụ abụọ bụ Ifeanyi Araraume na Frank Ibezim dịka ndị ga-efe ọkọlọtọ pati APC (All Progressives Congress).