Tottenham vs Arsenal: Tottenham echiela Arsenal ọnụ na 'korota' ụzọ Nsukka.

Ebe foto si, Getty Images
Tottenham egosila ndị otu Arsenal na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ.
Ọ bụ dịka ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Premier League ka ikuku kuru were gosi ụwa niile otule Arsenal.
Ọ bụ na nkeji nke iri na atọ ka Son Heung-Min nke Tottenham gbanyere goolu n'elu aka ekpe ọnụ postu ndị Arsenal.

Ebe foto si, Getty Images
Goolu Son nyere dịka ọ kpalitere mụọ ndị otu ya.
Ebe mbọ niile Arsenal gbara ịsa ya bu goolu lara n'efu.
Dịka ọ nọ na nkeji iri anọ na ise kpọmkwem ka Giovani Lo Celso wetere bọọlụ, gbapụ ya ọso were nye Son Heung-Min onye nyere ya Harry Kane.
Harry Kane chiri onwe ya eze dịka ọ gbakara netị ndị Arsenal were mee ya goolu abụọ tupou egbochie agba nke mbụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mbọ niile Arsenal nyere ịsa goolu abụọ gbara ọnyụpa dịka ndị Tottenham jiri ya mee ha oji n'ụlo ha.













