Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Wizkid na Burna Boy eturula ugo na MOBO Awards 2020

    Wizkid na Burna Boy

    Ebe foto si, Wizkid/Burna Boy Instagram

    Ụmụ Naịjirịa na-eti egwu dịka Wizkid na Burna Boy azakọrọla nturuugo a kpọrọ 'Music of Black Origin Award' (MOBO) nke afọ 2020.

    N'emume ndị otiegwu a ma ama dịka Davido na Tiwa gụrụ egwu ha ndị gbapụtara ihe n'afọ 2020, Davido gụrụ 'Fem' nke si n'ọbaegwu ọhụrụ ya ebe Tiwa Savage gụrụ 'Koroba' na 'Dangerous Love' nke si kwa n'ọbaegwu ọhụrụ ya.

    Lee aha ndị turuugo n'emume MOBO Awards nke afọ 2020

    Nwoke kacha agụ egwu n'ụwa - Headie one

    Nwaanyị kacha agụ egwu n'ụwa - Mahalia

    Ọbaegwu kacha mma n'afọ 2020 - Nines (Crabs in a bucket)

    Egwu kachasị ụtọ n'ụwa n'afọ 2020 - Young T & Budsey Feat. Headie One (Don't rush)

    Oti egwu ọgbara ọhụrụ kacha mma - Aitch

    Ihe onyonyo egwu kachas mma n'afọ 2020 - NSG (Lupita)

    Egwu RnB kacha mma - Mahalia

    Egwu Hip Hop kacha mma - Nine

    Ọkacha agụ n'egwu Grime - JME

    Ọkacha agụ na mbaụwa gbaa gburu gburu - Burna Boy

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ọkacha agụ n'emume ihe onyonyo - Micheal Wardas Marco (Blue story)

    Ọkacha n'ọrụ mgbasaozi - Chunkz

    Ọbaegwu kacha mma site n'afọ 2017 ruo 2019 - Ella Mai

    Ọkacha agụ egwu n'Afrịka - Wizkid

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ọkacha agụ n'egwu Raggae - Buju Banton

    Ọkacha agụ n'egwu ụka - Calledout Music

    Ọkacha agụ n'egwu Jazz - Ego Ella May

    Ọkacha emepụta egwu - Jae 5

    Nturuugo mkpalite mmụọ - Steve Mcqueen

    Cheta na Davido ritere nturuugo ọkacha agụ n'Afrịka nke afọ 2017 bụ nke Wizkid ritere n'afọ a.’.

  2. Unu asaala chí?

    Anyị na-ekele unu dịka chi bọrọ taa.

    N'ogige a ka anyị ga-esi wetere unu akụkọ si ụwa dum.

    Daalụ nụ!

  3. Ka chi fo!

    Soro nụ anyị ụbọchị ọzọ maka akụkọ ndị dị mkpa n'ogbe gị.

  4. Lee ebe coronavirus kwụ n'Afrịka taa

  5. Buhari eduola Mahmood Yakubu iyiọrụ maka agba nke abụọ

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari eduola Mahmood Yakubu n'iyi ọrụ dịka onyeisi Ịnec.

    Nke a mere n'ụbọchị Wenzde n'obi gọọmentị dị n' Abuja.

    Cheta na Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa nyeburu nkwado ka onyeisi ngalaba INEC bụ Mahmood Yakubu ka ọ laghachite nke ugboro abụọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Gọọmentị etiti akwụsịla orure 'SIM' ekwentị

    Ngalaba na-elekọta ozi na mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ bụ NCC enyela iwu ka akwụsị ọrụre SIM eji agbanye ekwentị.

    Nke a na-abịa dịka a na-enyocha ndekọ aha ndị niile tinyere aha maka ịnweta SIM eji agbanye ekwentị.

    Ikechukwu Adinde bụ onye na-ekwuchitere ngalaba ahụ kwuru na ọ ga-adị etu a rue mgbe emechara ya bụ nyocha.

    O kwuru na ọ bụ Minista na-ahụ maka Mkparịtaụka na akụnaụba nke ịnatentị nyere iwu ka e mee nke a.

    O kwukwara na a ga-anapụ ụlọọrụ mkparịtaụka ọbụla edebeghi iwu a ikike ọrụ ha.

  7. Praịm Mịnịsta mba Etiopia agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalịa abụọ

    Abiy Ahmed

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalị abụọ kemgbe okwuru na agha ndị npuisi na Tigray ebiela.

    Onyeisi mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta nabatara ya na ya bụ nje ha ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ịwete udo na mba abụọ ahụ.

  8. 'Onweghị mgbe anyị ji kwe nkwa ịkwụcha ndị ọrụ ụgwọ tupu ha ebido ọrụ' - Ngige

    Chris Ngige

    Ebe foto si, Chris Ngige/Fb

    Mịnịsta okwu ọrụ dị n'aka bụ Chris Ngige ekwusiela ike na onweghị mgbe ha jiri kweta ndị ọrụ na ha ga-akwụcha ha ụgwọ e ji ha tupu ha amalite ọrụ.

    Akwụkwọ akụkọ Guardian kwuru na Ngige sị na ọ bụ akụkọ ụgha na ya kwetere ịkwụcha ụgwọ ndị ọrụ gọọmentị jichiri tupu ha amalite ọrụ,

    Ngige kwuru ụbọchị Tuzde n'Abuja na "nkwekọrịta nwoke na ibe ya ka anyị kwekọrịtara mgbe anyị gwara ASUU n'ọgbakọ ịkpeazụ anyị nwer, bụ ebe anyị nọ sị ndị ASUU ha jisike kwusi ya bụ abụbụ ọrụ tupu ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba 2020, ka anyị were nwe ike ịrịọ onyeisiala ka ọ kwụọ ha ụkwọ ọnwa ya gọọmentị jichiri".

    Ngige sị na ya na Minista agụmakwụkwọ akpaala maka ịwezụga ya bụ iwu 'onye rụọ orlie' ha ji nọdo ụgwọọnwa ndị nkuzi n'elu maka ya bụ abụbụ ọrụ ha na-agba.

    Cheta na ndị nkuzi mahadum malitere abụbụ ọrụ na uju ya na ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị dịka ha mechere nke ịdọ aka na ntọ n'ụbọchị itoolu nke otu ọnwa ahụ.

  9. Ihere emegbuola Manchester United ebe RB Leipzig kwopuru ha nkụ na Champions League

    Manchester United vs RB Leipzig

    Ebe foto si, Getty Images

    N'egwuregwu, RB Leipzig ji ọkpụ goola atọ asatara abụọ gbaara Manchester United ụgbọ nwamkpị n'asọmpị Champions League.

    Ihe Manchester United chọrọ iji gaa n'ihu bụ ọnọdụ onye nawa onye nawa mana nke ahụ enweghị isi maka ya bụ njọ ahịa RB Leipzig mere ha.

    Paul Pogba na Bruno Fernandes ji otu ọkpụ otụ ọkpụ gbara isi onwe ha na ya bụ asọmpị.

    Ihe ahụụfụ kacha mme Man Utd bụ na onye onyere ha goolu mbụ nakwa onye nyere aka na nke abụọ bụ Angelino si Manchester City gaa mbibi na Jamani ebe ọ na-agbara Leipzig.

  10. 'Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu'

  11. Ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ. ISWAP egbuola ndị agha iri ma kpara otu laa.

    Ndị agha Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    N'ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ bụ Islamic State West Africa Province (ISWAP) na ndị agha Naịjirịa na obodo Alagarno n'ime Distrikti Damboa dị na Borno steeti ataala isi ndị agha Naịjirịa iri ebe ha ji otu onye gbalaga.

    Mmadụ abụọ gbaara AFP izu sị na ya bụ ọgbaaghara dara ụbọchị Mọnde mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ogige ha n'obodo ahụ.

    Otu onye agha takwụnyere AFP ya bụ ihe na ntị kwuru na " agbagburu mmadụ iri ndị otu anyị ebe ha ji otu onye eji".

    Otu onye ahụ ha jidere na-agba ọsọ ndụ ya mgbe ya bụ ogụ karịrị ha aka.

    Onye nke ọzọ kwuru na "ya bụ ọgụ abụghị ogụ ụmụazị. Anyị nyụkwara ndị omekome ahụ anya, mana ha mechere lọghachita kpawazịa ike".

    Ndị omekatara ihe pụọ ụjọ a mechere jide ụgbọala ndị agha anọ dịka ndị ahụ kwuru.

  12. Igbo bụ Igbo ụnụ asaala chie! Ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala, ma azụ anwụla.

  13. Ka chi fo!

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Chọtakwa anyị n'ụtụtụ ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.

  14. Oha na eze na ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohaneze ga-enwe nzukọ

    Njirimara Ohaneze

    Ebe foto si, Ohaneze

    Otu Igbo dị iche iche ga-agbakọ ụbọchịụka maka nzuko ọha na ndị na-azọ ọkwa onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.

    Dịka ndị na-ahazị ọgbakọ ahụ si kwuo, ọgbakọ ahụ nke a ga-eme n'elekere anọ nke ehihie n'igwe okwu 'Zoom' bụ oge mmadụ anọ ndị na-azọ ọkwa ahụ nke bụ oke Imo steeti ga-agwa ndị mmadụ okwu maka ebunobi ha.

    Ndị a gụnyere Chidi Osuagwu, Joe Nwaorgu, Chris Asoluka, Goddy Uwazurike na George Obiozor.

    N'ọnwa Jenụwary afọ 2021 ka a ga-enwe ntuliaka otu ahụ jikọrọ ndị Igbosi na steeti asaa ebe a na-asụ Igbo ;Abia, Anambara, Delta(Anioma), Ebonyi, Enugu, Imo na Rivers(Ikwerre).

  15. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  16. 'Ọnụọgụgụ ndị Naijirịa eruola ihe dịka mmadụ 206,000,000' - NPC

    National Population Commission

    Ebe foto si, National Population Commission/Twitter

    Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ mmadụ na Naịjiria bụ Nigerian Population Commission bụ NPC n’ịchafụ ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụ Naịjiria esila n’otu nde narị na iri itoolu na asatọ ruo nde narị abụọ na isii ugbua.

    Onyeisi ngalaba a bụ Nasir Kwarra kwuru n'ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tuzde kwuru na dịka Naijirịa agụbeghị ndị Naijirịa n'isi n'isi kamgbe afọ iri na anọ, na ọ ga-esi ike ịmata ọnụ ọgụgụ mmadụ ole kpọmkwem.

    O kwuru sị, "Ọ bụ onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ga-ekwu mgbe ọzọ a ga-eme ọnụọgụgu mmadụ na Naijirịa".

  17. Gọọmentị amịpụla naịra ise n'ego mmanụ ụgbọala

    Onye na-ere mmanụ agbidi

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị Naịjirịa amịpụla naịra ise n'elu N168 a na-akwụbu maka mmanụ ụgbọala.

    Ha kwuru na site n'ụbọchị 14 nke Disemba gawa n'ihu, na a ga na-akwụzị N162.44 n'elu otu lita mmanụ ụgbọala.

    Mkpebi a bịara ka gọọmentị etiti na ndị ọrụ mechara nzukọ nke bidoro n'elekere itoolu nke abalị Mọnde ruo elekere otu nke isi ụtụtụ Tuzde.

  18. Nwaanyị dị afọ 91 abụrụla onye mbụ natara ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụwa

    Margaret Keenan

    Ebe foto si, Reuters

    Otu nwaanyị gbara afọ iri itoolu abụrụla onye mbụ a gbara ọgwụ mgbochi maka Coronavirus na mba Briten.

    Margaret Keenan, si n'obodo Enniskillen, natara ọgwụ mgbochi ya n'ụlọogwụ dị na Mahadum Coventry, n'ụbọchị Tuzde.

    Ọ pụtara na mba ahụ amalitela iji ọgwụ mgbochi nke ụlọorụ Pfizer na BioNTech egbochi ọrịa ahụ.

  19. Otu SERAP akwadowela ịkpụpụ onyeisiala na ndị gọvanọ ụlọikpe

    Otu na-ahụ maka ikike ruru mmadụ akpọrọ SERAP n’ịchafụ ekwuola na ha na-akwado ịkpụpụ onyeisiala nakwa gọvanọ steeti niile dị na Naịjirịa ụlọikpe.

    Iwe ha bụ na atụmatụ nke ewepụtara iji gbazite ego n’ime ụgwọ ezumike ndị mmadụ abụghị nke iwu kwadoro nke mere na ha chọrọ ịkwụsị ya.

    Ha kpọrọ oku ka ndị ọzọ chọrọ ịsonye na ya bụ akwụkwọ ha na-akwado ịgba n'izuụka abụọ zitere ha ozi

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Unu abọọla chi?

    Nnọọnụ na peeji anyị taa.

    Ihe niile dị mkpa mere na Naịjirịa ka unu ga-achọta ebe a.

    Udo!