Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ si Sokoto steeti bụ ndị ntọ tọọrọ onye
mba Amerịka n’ugbo ya dị na mba Niger.
Ha kwuru na anwụchiri ndị ahụ dịka ha na-akwado ịbọgwara ọnwụ ndị otu ha
ruru mmadụ isii nke egburu dịka ndị uweojii na-azọpụta ndị ọzọ ha tọọrọ.
'Anyị ga-achụ onye uweojii gbagburu onye Keke n'ọrụ ,kpụpụ ya ụlọikpe'
Kọmishọna ndị uweojii na Rivas steeti bụ Joseph Mukan ekwuola na ha ga-achụ onye otu ha gbagburu otu onye Keke na Pọtakọt n'ụtụtụ Tọzde ma kpụpụ ya ụlọikpe.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni binyere aka, Mukan kwuru na ihe 'inpector' ahụ mere 'dị nnukwu njọ' ma gaa n'ihu kwuo na a malitela ikpe ya ikpe ime ụlọ nke ọ ga-abụ ekpecha, a chụọ ya n'ọrụ ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Ọgara n'ihu tiei ezinaụlọ nwa amadị ahụ nakwa otu jịkọrọ ndị Keke na steeti ahụ aka n'obi.
Akụkọ kwuru na e gburu nwata nwokorobia ahụ a kpọrọ 'Okechukwu' n'ụzọ ụtụtụ Tọzde n'ihi na ọ jụrụ inye onye uweojii otu nari naira ego aka azụ.
Ndiagha ebiela ọgbakọ n'ike dika onye otu ha butere coronavirus
Ebe foto si, Njirimara ndịagha Naijiria
Ndị agha welitere isi ebiela ọgbakọ ọzụzụ ha na-enwe kwa afọ nke na-aga n'ihu n'Abuja n'ike dịka otu onye n'ime nwụrụ site n'ọrịa coronavirus.
A na-atụ uche na Generalụ nwere ike ọ bụrụ na o bufeela ndị ọzọ gara ọgbakọ ahụ nke mere ka ha nye iwu ka ndị sonyere na ọgbakọ ahụ dopu onwe ha iche.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha,Brigadier General Sagir Musa, si kwuo n'ozi o wepụtara, e nyela ndị niile sonyere n'ọgbakọ ahụ gụnyere ya onwe ntuziaka ka ha dopu onwe ha iche dịka iwu gọọmenti etiti nyere maka COVID-19.
Ụlọomeiwu Imo amalitela inyocha 'Speaker' a chụdara n'ọkwa
Ebe foto si, Collins Chiji
Nkọwa foto, Collins Chiji, na anọchite mpaghara Isiala Mbanao n'Ụlọomeiwu Imo banyere ọkwa onyeisi ha n'afọ 2019
Ụlọomeiwu Imo steeti amalitere ịnyocha ọnwa iri na asaa Onyeisi ha a chụturu na nsonso a bụ Collins Chiji nọrọ n'ọchịchị.
Ha nyeburu Chiji ọsọ n'ọnwa Novemba afọ 2020 maka ebubo nrụrụaka, ọchịchị aka ike na ihe ndị ọzọ.
Omeiwu Ekene Nnodimele, bụ onye na-anọchite anya mpaghara Orsu bụ onye kpalitere okwu site na ịkpọ oku ka enyocha Chiji.
Onyeisi ọhụrụ bụ Paul Emeziem na ọtụtụ ndị omeiwu kwadoro ka e mee nnyocha ahụ nke e mechara gụọ ya onyeisi oche kọmiti ga-eme nnyocha ahụ.
Ndị ọzọ nọ na kọmiti ahụ gunyere Frank Ugboma, Uche Ogbuagu, Eddy Obinna, Dominic Ezerioha, Emeka Nduka na Johnson Duru.
Gọọmenti egbubiela ọnụahịa a na-ere 'data'
Ebe foto si, NCC
Gọọmenti etiti agbaala ama na e jirila pasent 50 kpụdaa ego ole a na-ere 'data' dịka ha nyere ngalaba na-ahụ maka 'Nigerian Communications commission'( NCC) ntuziaka ka ha tinye n'ọrụ usoro imezu nke a.
Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka nkwụrịtaụka bụ Isa Ibrahim Pantami bụ onye kwuru nke a n'akwụkwọ mgbasaozi nke ụlọrụ ya wepụtara ụbọchị Tọzde n'Abuja.
Dịka o si dị ugbua, otu GB 'data e sila na otu puku naira( N1000 naira) gbatuo rue narị naira anọ iri asatọ na asaa(N487) kemgbe Novemba afọ gara aga.
Aka akparala onye uweojii gbagburu onye 'keke' na Rivas Steetị
Ebe foto si, ALLWELL ENE
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivas Steetị bụ Nnamdi Omoni sị na ha anwụchiela onye otu ha gburu onye na-akwọ ụgbọala keke na Rukpokwu/Rumuodumaya, Rivas Steetị.
Ọ sị na ha a na-apụla ya egbe ma bido ikpe ya ikpe ime ụlọ na a ga-akpụpụ ya n'ụlọikpe n'ime ụbọchị abụọ.
Ọ gara n'ihu sị na ndị uweojii ga-agba mbọ ime ka udo chịa na mpaghara Rukpokwu/Rumuodumaya ma chọọ ụzọ ga-ahụ ezinaụlọ onye keke ahụ.
Nke a mere ngaghatịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ ji na-eme n'ebe ahụ.
Akụkọ sị na nsogbu a dapụtara mgbe onye keke ahụ jụrụ inye onye uweojii otu narị 100.
Nke a mere onye uwoeojii ahụ ji wepụta egbe ma gbagbuo onye keke ahụ nwunye ya ka mụrụ nwa ọhụrụ
Onye hụrụ mgbe ihe a mere gwara BBC Pidgin na ndị ngagharịwe a buru ozu nwamadị a gawa ụlọọrụ ndị uweojii na Rumuokoro.
Akụkọ ka na-abịa...
Abdulrasheed Maina adaala n'ụlọ ikpe
Onye bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka na Naịjirịa bụ Maazị Abdulrasheed Maina adaala n'ụlọ ikpe dịka a na-ekpe ya ikpe banyere ebubo nrụrụaka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị na-agba aja egbuola udele karịrị 2,000
Ebe foto si, AFP
Nnyocha e mere na Guines-Bissau achọpụtala na aka ndị na-agba aja dị n'ọnwụ udele karịrị 2,000.
Mohammed Henriques, gwala RFI na eji isi, ụkwa na mbọ udele achụ aja na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Ọ sị na udele ndị a hụrụ ozu ha kemgbe Febụwarị enweghi isi.
Henriques gwara RFI na; "Ndị na-achu aja na-eche na isi udele na-eme ka mmadụ baa ụba".
A chọpụtara na ọtụtụ udele riri nsi a na-akpọ methiocarb, bụ ihe a machiri na Yurope.
A na-eme Hunter nwa Joe Biden nnyocha maka ụtụisi
Ebe foto si, Reuters
Nwa onye ga-abụ Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden aha ya bụ Hunter ekwuola na a na-eme ya nnyocha banyere ụtụisi ya.
Ọ bụ ndị ọrụ gọọmentị Amerịka nọ na Delware na-eme nnyocha a.
Hunter Biden sị na ya na-ewe nnyocha dịka ihe mkpa ma ọ na-eche na "nyocha kwụ ọtọ" ga-egosi na ha kpara agwa "n'ụzọ emegideghi iwu":
Ndị na-arụrụ Biden ọrụ sị na Onyeisiala-a-na-ache Biden na-ahụ nwa ya nwoke dịka onye na-enye ya ọṅụ.
Ha sịkwa na ;"Hunter agabigala atamahụhụ, nke gunyere iji ha mee akaja n'ime ọnwa ole ma ole gara ga, ma pụtakwa dịka onye ụkwụ ya siri ike n'ala".
Hunter Biden sị na a na-enyocha ya n'ụbọchị Tuzde. O kwughi ihe ọzọ banyere ya.
Nwoke a dị afọ 50 bụ onye ndị Pati Repọblịkan dịka a na-eme achụmta vootu nke ndọrọndọrọ ọchịchị 2020 site n'itinye uche na eji ego achụ ego nke o mere na Yukraine oge nna ya bụ Osote Onyeisiala Amerịka.
Ndị Omeiwu Obele ji maka okwu Yukrene a chụọ Trump n'ọrụ na Decemba 2019 mana ndi Omeiwu Ukwu kachapụrụ atụmatụ ahụ.
Anyị na gọọmentị enweghi nkwekọrịta ịlaghachị ụlọakwụkwọ na Disemba 9 - ASUU
Ebe foto si, Festus Kenyamo/Twitter
Onyeisi otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum bụ Biodun Ogunyemi sị na onweghi mgbe ha na gọọmentị nwere nkwekọrịta ka ha laghachị n'ụlọakwụkwọ na Disemba 9.
Ogunyemi kwuru na minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige tụrụ asị mgbe ọ gwara mbaụwa na ndị nkuzi ga-alachị n'ụlọakwụkwọ ma ọ bụghị ya na gọọmentị agaghị akwụ ha ụgwọ.
Ọ sị na mkpebi ha nwere bụ ha ga-eji ihe gọọmentị gwara ha gosi ndị otu ha ka a mara ma aga-ekwe n'ihe gọọmentị kwuru.
Ogunyemi sị na gọọmentị kwere nkwa ịkwụ ha ụgwọ ndị e ji ha na Disemba 9 ebe ha kwere nkwa izute ndị otu ha ka e kwuo etu esi akwụsị abụbụọrụ a.
Minista ndị ọrụ bụ Chris Ngige kwuburu na gọọmentị na ndị nkuzi nwere nkwekọrịta na ha ga-alaghachị n'ụlọakwụkwọ na Disemba 9, ebe o kwere nkwa na ọ ga-eme ka onyeisiala kwụọ ọnwa ha ji ndị ọrụ.
Paolo Rossi ejewala ihe ka ọ gbara afọ 64
Ebe foto si, EPA
Onye egwu nyeere ndị mba Italy aka
mabụte iko egwuregwu mba ụwa na 1982 bụ Paolo Rossi anwụọla ka ọ gbara afọ iri
isii na anọ (64).
Nwunye ya bụ
Federica Cappelletti bụ onye kwuru nke a na ọbaozi Instagram ya mana okwughị ihe gburu ya, agbanyeghị na akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọteela ọ rịawara ọrịa.
Rossi pụtara na uju egwubọolụ ya mgbe ọ gbara asọmpị iko mbaụwa ha gbara na Spain bụ ebe ọ nọ nye Brazịl gọọlụ atọ n'otu ahịrị.
Ọfọrọ nwantakịrị ka ọ gbajọọ ya bụ egwụbọọlụ maka mmachị amachịrị ya Ịgbabọọlụ site na ebubo na ọ tinyere ka na nrụrụaka egwubọọlụ.
Ihe mere Buhari agaghị eji zaa oku Ndị Omeiwu - Abubakar Malami
Ebe foto si, Twitter/@MalamiSan
Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami ekwuola na Ndị Omeiwu Naijirịa enweghị ikike ịkpọ Onyeisiala Muhammadu Buhari oku dịka ha si ka ọ bịa zara ọnu ya banyere ihe na-eme na Naịjirịa ugbua.
Nke a na-abịa dịka ndị Boko Haram kwenyere na ọ bụ ha gburu ndị ọrụ ugbo 43 na Zabarmari di na Borno Steeti.
Ndị Omeiwu sibu ka Onyeisiala Buhari zute ha nke Buhari n'onwe ya kwenyere na ya ga-eme etu a.
Mana Malami, site n'akawụkwọ mgbasaozi o binyere aka n'aya n'ụbọchị Tuzde, sị na Ndị Omeiwu enweghi ikike ịkpọ Onyeisiala.
Ọ sị na ọ bụ "na mmasị Onyeisiala Naịjirịa" ka ọ dịrị ị bịa n'ihu Ndị Omeiwu.
Ọ sị site n'iwu Naịjirịa, onweghi ebe ọbụla e dere na ndị omeiwu nwere ikike ịkpọ Onyeisiala oku.
Malami gara n'ihu kwuo na gọọmentị Buhari agbaala nnukwu mbọ ịhụ na oke mwakpo nakwa ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa ebelatala.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na atụmatụ Onyeisiala Buhari ji arụ ọrụ nchekwa abụghị ihe a ga-abịa na-ekwu n'ihu ọha.
Ọ sị na agaghị agbagha na ọ bụ n'ọchịchị Buhari ka anapụrụ Boko Haram okpuru ọchịchi ime obodo 14 nọ ha n'aka.
Wizkid na Burna Boy eturula ugo na MOBO Awards 2020
Ebe foto si, Wizkid/Burna Boy Instagram
Ụmụ Naịjirịa na-eti egwu dịka Wizkid na Burna Boy azakọrọla nturuugo a kpọrọ 'Music of Black Origin Award' (MOBO) nke afọ 2020.
N'emume ndị otiegwu a ma ama dịka Davido na Tiwa gụrụ egwu ha ndị gbapụtara ihe n'afọ 2020, Davido gụrụ 'Fem' nke si n'ọbaegwu ọhụrụ ya ebe Tiwa Savage gụrụ 'Koroba' na 'Dangerous Love' nke si kwa n'ọbaegwu ọhụrụ ya.
Lee aha ndị turuugo n'emume MOBO Awards nke afọ 2020
Nwoke kacha agụ egwu n'ụwa - Headie one
Nwaanyị kacha agụ egwu n'ụwa - Mahalia
Ọbaegwu kacha mma n'afọ 2020 - Nines (Crabs in a bucket)
Egwu kachasị ụtọ n'ụwa n'afọ 2020 - Young T & Budsey Feat. Headie One (Don't rush)
Oti egwu ọgbara ọhụrụ kacha mma - Aitch
Ihe onyonyo egwu kachas mma n'afọ 2020 - NSG (Lupita)
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Ọkacha agụ n'emume ihe onyonyo - Micheal Wardas Marco (Blue story)
Ọkacha n'ọrụ mgbasaozi - Chunkz
Ọbaegwu kacha mma site n'afọ 2017 ruo 2019 - Ella Mai
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Ọkacha agụ n'egwu Raggae - Buju Banton
Ọkacha agụ n'egwu ụka - Calledout Music
Ọkacha agụ n'egwu Jazz - Ego Ella May
Ọkacha emepụta egwu - Jae 5
Nturuugo mkpalite mmụọ - Steve Mcqueen
Cheta na Davido ritere nturuugo ọkacha agụ n'Afrịka nke afọ 2017 bụ nke Wizkid ritere n'afọ a.’.
Unu asaala chí?
Anyị na-ekele unu dịka chi bọrọ taa.
N'ogige a ka anyị ga-esi wetere unu akụkọ si ụwa dum.
Daalụ nụ!
Ka chi fo!
Soro nụ anyị ụbọchị ọzọ maka akụkọ ndị dị mkpa n'ogbe gị.
Lee ebe coronavirus kwụ n'Afrịka taa
Buhari eduola Mahmood Yakubu iyiọrụ maka agba nke abụọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Gọọmentị etiti akwụsịla orure 'SIM' ekwentị
Ngalaba na-elekọta ozi na mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ bụ NCC enyela iwu ka akwụsị ọrụre SIM eji agbanye ekwentị.
Nke a na-abịa dịka a na-enyocha ndekọ aha ndị niile tinyere aha maka ịnweta SIM eji agbanye ekwentị.
Ikechukwu Adinde bụ onye na-ekwuchitere ngalaba ahụ kwuru na ọ ga-adị etu a rue mgbe emechara ya bụ nyocha.
O kwuru na ọ bụ Minista na-ahụ maka Mkparịtaụka na akụnaụba nke ịnatentị nyere iwu ka e mee nke a.
O kwukwara na a ga-anapụ ụlọọrụ mkparịtaụka ọbụla edebeghi iwu a ikike ọrụ ha.
Praịm Mịnịsta mba Etiopia agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalịa abụọ
Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed agbaala ụkwụ na mba Kenya maka njem abalị abụọ kemgbe okwuru na agha ndị npuisi na Tigray ebiela.
Onyeisi mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta nabatara ya na ya bụ nje ha ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ịwete udo na mba abụọ ahụ.
'Onweghị mgbe anyị ji kwe nkwa ịkwụcha ndị ọrụ ụgwọ tupu ha ebido ọrụ' - Ngige
Ebe foto si, Chris Ngige/Fb
Mịnịsta okwu ọrụ dị n'aka bụ Chris Ngige ekwusiela ike na onweghị mgbe ha jiri kweta ndị ọrụ na ha ga-akwụcha ha ụgwọ e ji ha tupu ha amalite ọrụ.
Akwụkwọ akụkọ Guardian kwuru na Ngige sị na ọ bụ akụkọ ụgha na ya kwetere ịkwụcha ụgwọ ndị ọrụ gọọmentị jichiri tupu ha amalite ọrụ,
Ngige kwuru ụbọchị Tuzde n'Abuja na "nkwekọrịta nwoke na ibe ya ka anyị kwekọrịtara mgbe anyị gwara ASUU n'ọgbakọ ịkpeazụ anyị nwer, bụ ebe anyị nọ sị ndị ASUU ha jisike kwusi ya bụ abụbụ ọrụ tupu ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba 2020, ka anyị were nwe ike ịrịọ onyeisiala ka ọ kwụọ ha ụkwọ ọnwa ya gọọmentị jichiri".
Ngige sị na ya na Minista agụmakwụkwọ akpaala maka ịwezụga ya bụ iwu 'onye rụọ orlie' ha ji nọdo ụgwọọnwa ndị nkuzi n'elu maka ya bụ abụbụ ọrụ ha na-agba.
Cheta na ndị nkuzi mahadum malitere abụbụ ọrụ na uju ya na ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị dịka ha mechere nke ịdọ aka na ntọ n'ụbọchị itoolu nke otu ọnwa ahụ.