A tụghị vootu na wọọdụ Amuzi/Ihenworie nke Ahiazu Mbaise n’ihi ndehịe ndị ọrụ Inec
Ndị pụtara n’igwe ịtụ vootu n’akụkụ Obodo Ahiazu Mbaise n’Imo steeti ji iwe laa dịka ndị ọrụ Inec ebe ahụ mere ọtụtụ mmehie aka.
Ndehie nke mbụ bụ na onye ọrụ ha ji naanị akwụkwọ e ji a tụrụ ndị ụlọomeiwu vootu were bịa ebe ahụ ebe ọ sị na o chefuru nke ọkwa onyeisiala.
Ndị nọ ebe ahụ ji iwe chughachie ya azụ ma gwaa ya gaa weta akwụkwọ e ji atụrụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala vootu.
Awa ole m ole gachara tupu ya bụ nwaamadị alọghachite mana o jighikwa akwụkwọ e ji edebanya mpụtara ntuliaka were pụta.
Ihe a mere n’ebe elekere anọ bụ oge Inec kwuru na ntuliaka nke taa ga-akwụsị.
Ndahie ndị a mere ka ọgbaghara dapụta ebe ahụ dịka ọgụ dara ebe ahụ.
Ndị uweojii wujuru ebe ahụ ịdajuu iwe ndị mmadụ mana ya bụ ọgbaghara mere ka a ghara ịtụ vootu ebe ahụ.