You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. A na-eche ka amalite ngụkọ n’Imo steeti ugbua.

    Ndị ọrụ nsochi ozi so mpụtara ntuliaka metụtara agbakọọla n’isi ụlọọrụ Inec n’Imo dịka a na-eche ka ngụkọ mpụtara ntuliaka malite.

    Ndị ntaakụkọ, ndị ọrụ nlebanya n’usoro ntuliaka, ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị onye nakwa ndị ọzọ okwu ntuliaka Naịjirịa ruuru nọ n’ime ya bụ ụlọọrụ ugbua.

    A na-eche ndị ọrụ Inec ka amalite ngụkọ mpụtara ntuliaka si na steeti ahụ ugbua.

  2. EFCC anwụchiela mmadụ atọ na Benin a hụrụ ‘PVC’ 20 n’aka

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi mpụ na nrụrụaka bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (EFCC) anwụchiela mmadụ atọ na Benin nke Edo steeti dịka a hụrụ akwụkwọ ikike ịtụ vootu (PVC) 20 n’aka ha.

    Ọ bụ ndị ụlọọrụ ha na steeti ahụ bụ ndị wudoro ndị a.

    Ha nwụchiri otu nwaada a na-enyo dịka a hụrụ PVC 20 bụ nke ndị mmadụ n’aka ya.

    Ha nwụchiri nke wọọdụ mbụ nọ n’ime ụlọụka St. Patrick's Catholic Church dị n’Ikpoba Okha, Benin.

    Ya bụ nwaada kwuru na ọ bụ otu nwaanyị dị afo 73 na otu nwoke ọzọ nyere akwụkwọ ikike ịtụ vootu 20 ndị ahụ.

    EFCC kwuru na ọ bụ nwaada ahụ gbaara ha ama nke mere ha jiri nwụchie mmadụ abụọ ndị ahụ.

    Ha kwukwara na nnyocha na-aga n’ihu n’isi ndị a ugbua.

  3. Amalitela ngụkọ mpụtara ntuliaka n’Ebonyi steeti

    Dịka e mechara ntuliaka n’akụkụ dị iche iche n’Ebonyi steeti n’ụbọchị Satọdee, vootu ndị si ọgbọ ntuliaka na steeti ahụ abịaruwela Inec aka.

    Ngụkọ amalitela n’isi ụlọọrụ Inec na steeti nke dị n’Abakaliki bụ isiobodo ya bụ steeti.

    Kọmịshịna ntuliaka steeti ahụ bụ Onyeka Paulin Ugochi, Onyeisi nhazi ntuliaka steeti ahụ bụ Charles Igwe, Kọmịshọna ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ ikike dịịrị onye metụta ntuliaka awụchiela ebe ahụ ugbua dịka ya bụ ihe na-aga n’ihu.

  4. Ntuliaka 2023: E ji akụrụngwa ‘server’ Inec mee nrụrụaka na ngụkọ mpụtara ntuliaka a?

  5. Anyị ga-ebido ngụkọ vootu n'elekere 6:00 nke abalị taa

    Ụlọọrụ Inec ebidola emume ngụkọ vootu a tụrụ na Naịjirịa maka ọkwa Onyeisiala na nke ndị ụlọọmeiwu ukwu na nke steeti.

    Kama onyeisi ngalaba Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na ha ga-ebido mkpọpụta na ngụkọ vootu n'elekere isii nke abalị taa.

    Yakubu ji ohere a dọọ ndị mmadụ ọkachasị ndị ụlọ ntaakụkọ aka na ntị si ha ewepụtala ọnụọgụgụ ọbụla belụsọ maọbụ nke ndị Inec wepụtara.

  6. Nwaanyị ku nwa ọ mụrụ naanị ọnwa abụọ gara aga apụtala ịtụ vootu na Bayelsa

    Oriakụ Harrison Rosaline ku nwa ya ọ ka mụrụ naanị ọnwa abụọ gara aga n’aka wụpụta ọgbọ ntuliaka nke Unit 1 dị na Yenegoa, Bayelsa steeti n’ụtụtụ taa maka atụmatụ ịtụ vootu ya.

    Oge onye ntaakụkọ BBC jụrụ ya ihe mere o jiri kụrụ nwa o ku n'aka pụta, o kwuru:

    “Mmuọ nụrụ oke ọkụ n’ebe ntuliaka nọ n’ihi na a họrọ m ka Naịjiirịa dị mma. Achọrọ m ka obodo a dị mma maka onye ọ bụla gụnyere nwa m. Ya mere m ji maa ụzọ pụta taa. A pụtara m ụnyahụ n’ebe elekere iri nke ụtụtụ.”

    Harrison kwuru na ọ ndị Inec abịa ruo mgbe ọ mechara lawazie be ya.

    “A nọrọ m ruo nkeji ole na ole tupu elekere atọ nke ehihe... E mechara m lawa n'ihi na agụụ malitere ịgụ.”

    Nke a na-abịa dịka Inec yigharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa n’akụkụ ụfọdụ na steeti ahụ n’ihi ọgbaghara dapụtara n’ebe ndị ahụ.

    Ntuliaka amalitela ugbua na steeti ahụ.

  7. Ihe mere amalitebeghị ngụkọ na Legọs - Inec

    Otu onye ụlọọrụ Inec na Legọs na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC n’ụtụtụ Sọnde a na ihe mere ha amalitebe ngụkọ mpụtara ntuliaka bụ na ha amatebeghị ịnata ozi ngụkọ vootu si n’akụkụ ọgbọ ntuliaka si okpuruọchịchị dị iche iche na steeti ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha malite ịnata ozi ngụkọ vootu si n’ụfọdụ ebe na ha ga-amalite ngụkọ mpụtara ntuliaka.

    Ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị ọrụ nchekwa, ndị ọrụ ikike dịịrị onye na ndị otu nlebanya n'usoro ntuliaka agbakọọla na-eche ka ya bụ ihe malite.

    Ụfọdụ steeti ndị ọzọ amalitela ịgụkọ mpụtara ntuliaka nke ha ugbua.

  8. Amalitela ịtụ vootu n’akụkụ Bayelsa Steeti dị iche iche

    Dịka Inec siri kwuo n’ụbọchị Satọdee, ntuliaka amalitela n’akụkụ Bayelsa dị iche iche taa bụ Sọnde.

    Cheta na e yigharịrị ntuliaka n’akụkụ ọgbọ ntuliaka nke mbụ na nke abụọ na wọọdụ Epie dị na steeti ahụ.

    Ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu dịka ndị ọrụ Inec wụchiri n’oge.

    Ntuliaka a na-eme taa bụ nke ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa.

  9. Ebe ndị a ga-emegharị ntuliaka taa

    Amalitela ịgụkọ vootu ndị a tụrụ n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche n’ụbọchị Satọdee taa bụ Sọnde.

    Agbanyeghị na n'akụkọ pụtara ndị ọrụ inec abịaghị n’oge n'ụfọdụ ebe dịka ụfọdụ ndị ọrụ ejighi akụrụngwa ọrụ ha zuruoke nwere bịa. Ihe ndị a metụtara ntuliaka nke afọ 2023. Nke a mere onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu jiri zipụta ozi ma kwee nkwa n’ehihe Satọdee na enweghi onye maọbụ ndị a ga-agụpụ na ntuliaka a.

    Inec pụtakwara n’abalị Satọdee kwuo na n’ihi etu ihe ndị siri metụta ụfọdụ ebe, na a ga-emeghari ntuliaka na Steeti ụfọdụ nakwa ọgbọ ntuliaka ụfọdụ.

    Nke a gụnyere Cross Rivers na Bayelsa steeti. Lee nkọwa ihe mere e ji emegharị ntuliaka n’ebe ndị a.

    Cross River Steeti

    E yigharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala na nke ndị ụlọ omeiwu na steeti a gaa ụbọchị Sọnde 26 nke ọnwa Febụwarị. A malitere ịtụ vootu n’ọgbọ ntuliaka ebe ndị e meghị ntuliaka na steeti ahụ dịka okpuruọchịchị Bakassi, Dayspring 1&2 na Qua island.

    Bayelsa

    Eyigharịrị ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka 141 na steeti a n’ihi ọgbaghara ndị dapụtara ebe ahụ.

    Ihe a metụtara ọgbọ ntuliaka nke ndị wọọd 4, 6, 8, na 14, ma gụnyekwuoro 40 n’ime 141 ngwa ntuliaka ka zuruoke.

    Yakubu kwuru na aga amalite ntuliaka n’elekere10 nke ụtụtụ ruo elekere anọ nke mgbede.

    O kwukwara na ha ahaziela nchekwa zuruoke nye ebe ndị a ugbua.

  10. 'Network' na-enye nsogbu iji ziga mpụtara ntuliaka n'Owerri 'municipal'

    Ndị ọrụ Inec na mpaghara 'Owerri municipal' na-enwe nsogbu iziga mpụtara ntuliaka gaa n'ọba ozi Inec a kpọrọ 'Inec Result Viewing Portal'.

    Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na nsogbu ha bụ na ịntaneetị esighi ike iziga ya bụ mpụtara ntuliaka.

    Ka ọ dị n'ụtụtụ a, ụfọdụ n'ime ha ka na-agba mbọ iziga mpụtara ntuliaka nke ha.

  11. Ngụkọ vootu amalitekwala n'Awka South, Anambra Steeti

    Ndị ọrụ Inec amalitekwala ngụkọ vootu n'ụlọọrụ ha dị n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Awka South dị n'Amawbia, Anambra Steeti.

    Nke a na-abịa dịka a na-atụ anya mpụtara ntuliaka na steeti dị icheiche.

  12. Nchịkọta ihe ndị mere na ntuliaka Naịjirịa 2023

    Dịka Inec siri kwee na nkwa, ha ahaziri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nakwa nke ụlọomeiwu n’ụbọchị Satọde.

    Lee nchịkọta ihe ndị mere na ya bụ ntuliaka ebe a:

    • A malitere ntuliaka n’ebe elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ dịka Inec siri kwuo
    • A nụrụ ozi na ntuliaka amaliteghi n’oge n’ọtụtụ ọgbọ ntuliaka n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
    • E nwere ebe ndị ntuliaka amaliteghi cha cha ruo oge Inec wepụtara maka nkwụsị ya bụ ntuliaka (nke bụ elekere abụọ n’ọkara nke ehihe).
    • Akụkọ mwakpo, ọgbaghara na nkụsa igbe ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka ụfọdụ dapụtara dịka e zurukwara ụfọdụ ngwa ntuliaka n’akụkụ ebe ndị dị iche iche dịka Legọs, Edo na Rịvas steeti.
    • Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahood Yakubu kwupụtara na a wakporo ụfọdụ ebe na Delta na Kastina.
    • Inec yigharịrị ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka 141 na Bayelsa steeti n’ihi ọgbaghara ndị dapụtara ebe ahụ.
    • Yakubu kwuru na ndịagha nnupuisi nke alakụba bụ Boko Haram kwasara ndị ọrụ Inec mgbọ n’elu ugwu nke Gwoza dị na Borno steeti ma merụọ ndị ọrụ ha ahụ.
    • Ntuliaka ga-aga n’ihu n’akụkụ ụfọdụ na Naịjirịa taa.

    Na-esochi anya n'ike n'ike maka akụkọ ntuliaka ndị ga-adapụta taa.

  13. BVAS anabataghị mpụtara ntuliaka e mere n' ọgbọ atụmvootu anyị - Omoni Oboli

    Onye ihe ejije Nollywood,a ma ama bụ Omoni Oboli atụọla arrịrị naha enweghị ike tinye mpụtara ntuliaka e mere n’ọgbọ atụmvootu ya n’na ọbaozi Inec.

    N’ihe onyonyo o mere n’ụzọ ụtụtụ Ụbọchịụka, o kwuru na ọ gbara ya gharịị ihe mere n’igwe ndị ọrụ Inec kwesịrị iji mee nke a anaghị arụ ọrụ dịka ndị pụtara ịtụ vootu n’ebe ahụ tụụrụ vootu rue chi ofufo.

    E bidoghị atụmvootu n'oge n'ebe ahụ nke mere ka a tụọ vootu n'ebe ahụ rue ime ndeli foro Ụbọchịụka.

  14. 'Ihe mere na ebidoghị ntuliaka n'oge n'ebe ụfọdụ - Inec

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka Naijiria a kpọrọ Inec n'ịchafụ bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ọ bụ nsogbu ibugharịị ndị ọrụ ha nakwa akọrọngwa ha ji arụ ọrụ nakwa nsogbu nchekwa mere ka a ghara ibido ntuliaka n'ụfọdụ ebe ụbọchị Satode.

    Yakubu kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja.

    A malitere atụmvootu ka ọ gachara ogologo oge ka Elekere asatọ na ọkara bụ oge Inec kwuburu ntuliaka ga-amalite kụchara n'ọtụtụ ebe na Naijiria 'Ihe mere na ebidoghị ntuliaka n'oge n'ebe ụfọdụ - Inec

  15. Ndeewonụ

    Igbo mma mma!

    Ụnụ asaala chi? Sonyere anyị ebe maka akụkọ ka o si aga dịka o siri metụta ntuliaka Naijiria e mere ụnyaahụ!

  16. Ndị 'Presiding Officers' agbakọwala n'isiụlọọrụ Inec n'Amọọbia

    Ndị 'Presiding Officers' na osote ha amalitela ịgbakọ n'isiụlọrụ Inec dị n'Okpuru Ọchịchị Awka-South LGA, Amọọbịa, Anambara steeti.

    Nchịkọta vootu nke kwesịrị ime na wọọdụ na-emezi n'ụlọọrụ Inec.

    Nke a bụ n'ihi na ntuliaka n'ọtụtụ ọgbọ atụmvootu.

  17. E ji ọkụ 'torch' atụ vootu n'Amufo-Odofin, Legọs

    Ndị mmadụ ji oku 'torch' atụ vootu n' Amuwo Odofin polling unit 53 and 54 dị na Legọs steeti dịka ntuliaka bara abalị.

    Ndị ọrụ Inec abaghị ụfọdụ ọggbọ atụmvootu n'ebe ụfọdụ na Legọs.

  18. Yusuf Datti turu vootu ya na wọọdụ ya

    Onye na-azọ Osote Onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Yusuf Datti Baba-Ahmed, tụrụ vootu ya n'ọgbọ atụmvootu ya na Kaduna n'ebe Elekere 10:10 nke ụtụtụ na-enweghị nsogbu ọbụla.

  19. A ka na-atụ vootu n'ebe ụfọdụ Amuwo Odofin,Legọs

    A tụmvootu ka na-aga n'ọgbọ atụmvootu Amuwo Odofin Polling Unit 53 na 54,Legọs ka ọ gachara awa anọ e kwesịrị ka e mechie ntuliaka.

    Ndị ọrụ Inec na akọrọngwa ntuliaka bịara ebe ndị a n'ehihie taa.

    Cheta na Inec kwuburu na ntuliaka ga-amalite n'Elekere Asatọ nke ụtụtụ.

  20. Ugbua ka ndị Inec bịara na Dowen College, Legọs

    Ndị ọrụ Inec bịara n'ọgbọ atụmvootu na Dowen College, Lekki dị na Legọs ka ọ fọọ nkeji abụọ ka ọ kụọ Elekere ise(5:58pm.)

    Kemgbe ụtụtụ, ndị mmadụ bịara ịtụ vootu ahụghị ndị ọrụ Inec.

    Oge onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ awa isi gara aga, a hụghị ndị ọrụ Inec,a hụghị akarangwa ntuliaka nke e ji ahu ndị ọrụ nchekwa.

    N'ihe onyonyo fegharịịr, otu nwaanyị kwuru sị, "Ọ bụ otu onye bịara ịtụ vootu wepụtara onwe ya gaa bute ha."