Nwoke dị afọ 72 ahụ na-adịghị bịara ịtụ vootu
Nwoke dị afọ iri asaa na abụọ pụtara ịtụ vootu na-agbanyeghi na ahụ esichaghị ya ike.
Ọ sị na o mere nke a maka na ọ chọrọ ka Naịjirịa dị mma.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Nwoke dị afọ iri asaa na abụọ pụtara ịtụ vootu na-agbanyeghi na ahụ esichaghị ya ike.
Ọ sị na o mere nke a maka na ọ chọrọ ka Naịjirịa dị mma.
Ndị pụtara ịtụ vootu n’ọgbọ ntuliaka 006, 007 na 008 nke ụlọakwụkwọ Uruokwe Central School, Ozubulu, dị n’okpuru ọchịchị n’Imo steeti ewepụta onwe ha dịka ọrụ ngo nye ndị Inec iji nyere ha n’usoro ntuliaka a.
Nke a bụ dịka otu ndị na-efe ala ha n’otu afọ enyeburu ọzụzụ maka ntuliaka a abịaghị ọrụ.
Naanị ndị ọrụ Inec kpọm kwem bịaruru ebe ahụ.
Nke a mere ndị mmadụ jiri wepụta onwe ha iji nyere ndị Inec aka dịka igwe ndị mmadụ gbakọtara ebe ahụ ịtụ vootu.
Akụkọ pụtara na soshal midia n’ehihe Satọdee a nke na-ekwu na ndị ojiegbe wakporo ogige Uli Ward 2 nke Anambra steeti mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ‘Akụkọ a bụ ezigbo akụkọ ụgha’
‘Enweghị mwakpo ọbụla na-eme n’akụkụ Uli ọbụla.’
Ndi uweojii n’ụbọchị Fraịdee kwuru n’isi ụlọọrụ ha dị n’Akwa na ha ga-eke nkwụcha ịhụ na enweghị mwakpo ọbụla ga-adapụta n’akụkụ steeti ahụ ọbụla.
Ngozi Okonjo Iweala bụ onyeisi World Trade Organisation ekwuola na ọ bịala n'obodo ya bụ Umuda Isingwu dị n'Umuahia, Abia Steetị ịtụ vootu.
Ọ sị na o ruola otu awa ọ bịara mana ọ hụbeghi ndị ọrụ Inec, n'otu aka ahụ ndị mmadụ anọọla ebe ahụ kamgbe elekere asaa nke ụtụtụ.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Simi Jolaoso rigooro n'elu ụgbọala ka o nwee ike sete ebe Tinubu chọrọ ịtụ vootu
Dịka ndị ntorobịa pụtara itu vootu n’uju, otu nwaada dị afọ 22 nwụ nwa nkita ya pụta n’ọgbọ ntuliaka nke Ward 4 dị n’ụlọakwụkwọ, Asagba Secondary School, Umunkwo, Asaba Delta State
Nwaada a kwuru na ọ na-atụ vootu nke mbụ ya na ndụ ya niile na ntuliaka afọ a.
Peter Obi apụtala ịtụ vootu ya ugbua n'ọgbọ ntuliaka Amantutu ward 2 nke Agulu, Anambra.
Ya na nwunye ya bụ Margeret Obi so nọrọ n’ahịrị chere ruo oge ha dịka ndị ọrụ Inec nọ na-eme ihe dịịrị ha ịnụ na atụmatụ ịtụ vootu gara siriri werere.
Ndị mmadụ gbakọtara n’ọgbọ ntuliaka ahụ ugbua sochi ya azụ ma na-atụ vootu nke ha.
Emeka Anyaoku bụbu odeakwụkwọ otu Commonwealth atụọla vootu n’ọgbọ vootu dị na Lugard nke unit 3 Ikoyi, Lagọs.
Ndị ntorobịa n’Agulu, Anambra ejirila ọgba tum tum akpaghari n’ime obodo ha na-akpọte ndị mmadụ ka ha pụta sonye na ntuliaka nke taa.
Lee ya bụ ihe si aga.
Gọvanọ Udom Emmanuel atụọla vootu nke ya taa n’okpuruọchịchị Onna na Akwa Ibom steeti.
Ọ pụtara n’ebe elekere 10 ma tụọ ya bụ vootu.
Ndị ọrụ Inec pụtara malite ọrụ ha n’oge ndị mmadụ na-esonye na-atụ vootu ha ebe ahụ.
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivers Steeti enweghi ike tụọ vootu n’ihia na akụrụngwa BIVAS enweghi ike wepụtanwu njirimaara ya.
Wọodụ ebe Wike kwesịrị ịtụ vootu bụ na wọọdụ 7 unit 9 dị na Rumuekpirikom, Obio Akpor dị na Rivers Steeti.
Ndị ọrụ Inec gwara ya ka ọ laa ma lọghachị azụ na ha akpọọla onye tekịnụzụ ha ga-eleba igwe ahụ anya.
Wike na nwunye ya so bịa ebe ahụ gosiri mwute na afọ ejughi n’etu ya bụ ntuliaka si aga ma nye Inec ndụmọdụ ka ha rụọ igwe ha ọrụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị ntorobịa apụtala n’igwe n’ama Okpara Square, Enugu dịka ha chọrọ itu vootu ha.
Ndị ọrụ Inec awụchiela ebe ahụ imalite ya bụ ihe.
Cheta na n'afọ 2022, n' oge ndebanye aha maka inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ụzọ ndị mmadụ gbakwara ebe a dịka ndị ntorobịa gbara isi akwara n'atụmatụ inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu nke ha ebe ahụ.
Lee ka ụzọ si agba ebe ahụ ugbua.
Ndị ọrụ Inec awụchiela n'ọgbọ atụ m vootu dị na unit 41 dị n'Aba South.
Ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu na-egosipụta iwe ha maka na ndị ọrụ Inec apụtaghị ọsịsọ
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari apụtala tụọ vootu ya na ntuliaka nke taa bụ maka ndị omeiwu nakwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa. Buhari mere nke a na Daura bụ obodo ya na Katsina steeti.
BBC hụrụ na Buhari pụtara sonye na ya bụ ntuliaka n’ihi dịka elekere 9:30 nke ụtụtụ taa dịka ya na nwunye ya bụ Aisha Buhari sọ pụta tụọ vootu.
Muhammadu Buhari na-emecha ọchịchị ya nke afọ asatọ n'afọ a, ebe ọ ga-enyefe ọchịchị na Mee 29, 2023.
Ndị ọchịchị na Naịjirịa amalitela ịpụta igwe ma sonye na ntuliaka nke taa.
N’akụkụ, Ọgbọ ntuliaka nke Iwo Road, Ibadan, Oyo steeti, gọvanọ steeti ahụ bụ Gọvanọ Seyi Makinde apụtala tụọ vootu ya dịka n’akụkụ ụlọakwụkwọ Eghoma Primary school, nke okpuruọchịchị Ika North East Gọvanọ Ifeanyi Okowa bụ osote onye na-azọrọ PDP ọkwa pụtara tụọ vootu nke ya.
Otu ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ụlọọrụ EFCC wuchiri ebe a na-atụ vootu n'Agulu dị n'Anambra Steeti.
Ndị a bịara ịma etu ntuliaka si aga nakwa ma o nwere ndị nwereike ikesa ego n'ọgbọ ntuliaka bụ nke megidere iwu Naịjirịa
Bola Ahmed Tinubu awụchiela n’ogige ntuliaka nke Shoprite dị n'Ikeja, Legos steeti bụ ebe ọ ga-atụ vootu nke ya taa.Tinubu bụ onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naijiria so n’ime ndị welitere isi n’ọsọ ọkwa onyeisiala nke afọ a.
Tinubu bụ Remi Tinubu bụ onye ụlọomeiwu Naịjirịa so pụta ịtụ ya bụ vootu.
Ndị mmadụ jupụtara ebe ahụ dịka ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị ntaakụkọ nọ n’akụkụ ogige ahụ niile.
Ọtụtụ ndị bịara ịtụ vootu n'Ihiagwa Health Center ahụbeghi ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ọgbọ ebe a na-atụ vootu.
N'otu aka ahụ ndị a na-akọwa na etu e si depụta aha ha edochaghị anya ọfụma.
N'ihe dịka nkeji ise ka ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ (09:55am) ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ọgbọ ebe a na-atụ dị n'Umudim Central school, Nnewi Anambra steeti
Ụlọakwụkwọ a nwere ọgbọ ịtụ vootu 'polling unit' atọ.
Ndị chọrọ ịtụ vootu apụtala na-eche ka ndị ọrụ Inec rute ebe ahụ.