You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Obasanjo ewepụtala ozi nye Buhari na Inec maka ntuliaka 2023

    Aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo agwala Inec ka ha hazie mehie aka ndị so mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa a.

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị pati na-anọghị n’ọchịchị dịka Labour party na People Democractic Party etiela mkpu nye etu ngụkọ mpụtara ntuliaka a si aga ugbua.

    Obasanjo kwuru na “Ọ bụrụ na onyeisi ụlọọrụ Inec nwereike ime ka e yigharia ntuliaka gaa ụbọchị anọ gafee oge e hibeburu ya, ọ nwereike ihazi mehie aka ndị so ngụkọ ntuliaka a n’abalị abụo gara aga.”

    “Ọ bụrụ na ejighi Bvas eme ngụkọ, enweghị mpụtara ntuliaka a na-akpọpụta a ga-anabata, ọ bụrụ na Inec agbaghị mpụtara ntuliaka si steeti n’anwụ n’ọba ozi ha site n’Server’ a gaghị anabata mpụtara ntuliaka ọbụla.”

    Ozi Obasanjo zipụtara kwuru na agwa Onyeisiala Muhammadu Buhari gosiri na ọ chọrọ ka ụkpụrụ ọ ga-ahapụrụ Naịjịrịa bụrụ nke ntuliaka kwụ aka ọtọ ma soro usoro doro anya mana na etu Inec si eme n’oge na-awụnye aja na garị ya bụ atụmatụ.

    Ọ gara n’ihu rịọ Buhari ka akagbuo ma megharịa ntuliaka n’ebe ndị usoro ya akwụghị aka ọtọ ma kwụsị iji aka na-edebanye vootu ma jiri tekụnzụ Bvas etu Inec siri kwuo na mbụ.

  2. Nyesom Wike ekwuola na aka ya adịghị n’ọgbaghara dapụtara na ntuliaka nke Rịvas

    Dịka ọtụtụ ebubo na-apụta na-arụ gọvanọ Nyesom Wike aka na-ekwu na aka ya dị n’ọgbaghara ndị dapụtara na Rịvas steeti ụbọchi Satọdee e mere ntuliaka ọkwa onyeisiala na nke ụlọomeiwu Naịjirịa, Wike ezipụtala ozi ma gupụ onwe ya na ya bụ ebubo.

    N’ozi Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Chris Finebone zipụtara, Wike kwuru na ebubo ndị a si “n’ime echiche ndị ọjọọ na-agaghị amịta mkpụrụ ọbụla” were pụta.

    Ozi ahụ kwuru na Wike enweghị ndị agha ọbụla na-eso ya ma fọdụzie n’oge ntuliaka a.

    O kwukwara na dịka Wike na nwunye ya tụchara vootu nke ha na ha wụbara n’ime ụlọ ha ma ghara ịpụta ezi ọzọ.

    Cheta na ọgbaghara dapụtara n'akụkụ ụfọdụ na steeti ahụ n'ụbọchị Satọdee dịka e kwuru na e nwere ebe ndị amajara ndị pụtara ịtụ vootu.

  3. Ndị ọrụ nlebanya n'usoro ntuliaka nke Commonwealth ekwuola na ntuliaka a 'gara n'udo"

    Ndị ọrụ nebaanya n’usoro ntuliaka nke otu Commonwealth ewepụtala oz na-ekwu na ntuliaka Naịjirịa 2023 “gara n’udo”.

    Onyeisioche otu ndị nlebanya a bụbụ onyeisiala Saụt Afrịka nke aha ya bụ Thabo Mbeki, kwuru na e nyere ọtụtụ ndị mmadụ ohere ịtụ vootu n'ụzọ iwu kwadoro.

    Mbeki kwuru, "Anyị na-ekele ndị Naijiria niile maka mkpebisiriike, ndidi na nkwụsiike ha gosipụtara n'oge usoro ntuliaka a."

    Agbanyeghị nke a, o kwupụtara ụfọdụ o chere bụ ihe ịma aka nye Inec – dịka etu ụfọdụ ọgbọ ntuliaka si ghara inwe ọkụ zuruoke, ma tụo aro ka Inec mee nwalee usoro ha ma emechaa ntuliaka.

    O kwukwara na ka ndị nwere iwe gbasara ntuliaka a buru okwu ha gaa ụlọikpe.

    Ndị ọrụ nlebanye n’usoro ntuliaka nke Commonwealth a si na Benue, Edo, Kano, Lagos, Ondo, Rivers na Sokoto steeti tinyere Abuja.

    Ahụ ga-apụ n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị, mgbe ha ga-ebipụta akwụkwọ ozi zuru oke maka ihe ndị ha nyochatara.

  4. Ndị nnọchiteanya pati LP, PDP ejirila iwe si n'ọdọ ngụkọ ntuliaka Abuja pụọ

    Otu onyennọchite otu Labour Party (LP) n’ọgbọ ngụkọ mpụtara ntuliaka Naịjirịa n’Abujaekwuola na ha agaghị anabata mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Inec na-eme ugbua ma ọ bụrụ ndị ọrụ Inec etinyeghị nchịkọta vootu si n’akụkụ steeti dị iche iche n’akụkụ ọbaozi ha nke ha ji achịkọta vootu dị n'ịntanetị, tupu ha ekwupụta ya n'isi ụlọọrụ ha dịka ha siri kwuo bụ usoro ha.

    Ndị nnọchianya pati anọ ọzọ ndị PDP - ekwupụtala echiche nyikwara nke ndị LP.

    Agbanyeghị nke a onyennọchianya APC n’ebe ahụ akụchapụla okwu ndị pati ahụ na-ekwu, na-ekwu na ngụkọ kwesịrị ịga n'ihu n’ihi na iwu Naịjirịa kwuru na onye ọbụla na-anabataghị mpụtara ntuliaka nwereike iburu okwu ahụ gaa n’ụlọikpe.

    Ugbua, ndị nnọchianya otu pati Peoples Democratic Party (PDP) na Labour Party (LP), ejirila iwe si n’ime ọgbọ ngụkọ Inec bụ National Collation Centre, were pụọ.

    Dino Melaye nke PDP boro ebubo na ụlọọrụ Inec na-ele pati APC anya n’ihi were arụ ọrụ ma na-ekwu "Anyị nwere ihe akaebe na igwe BVAS arụghị ọrụ n'ọtụtụ steeti, anyị arịọla Inec ka ha bipụta mpụtara ntuliaka si steeti dị iche iche na ‘portal’ ya dịka ha kwere na nkwa mana ha jụrụ,”

    Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na o nwere ntụkwasị obi zuruoke mkpọpụta mpụtara ntuliaka ndị ọrụ Inec si steeti na-ewepụta dịka o kwuru na ngụkọ ga-aga n’ihu.

  5. Labour Party emeriela APGA n'azụụlọ Obiano

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party' eturula ugo na ntuliaka ụlọ omeiwu nta maka mpaghara Anambra East na West nke bụ mpaghara ebe aka chịburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano si pụta.

    Peter Aniekwe nke Labour Party nwetara vootu 14,847 iji merie onye nke Apga bụ Chinedu Obidigwe onye nwetara vootu 13,782.

    Mana Apga nwetara mmeri na ntuliaka ụlọ omeiwu nta nke mpaghara Oyi/Ayamelum, nakwa na mpaghara Aguata.

    N'Aguata, Dom Okafor nke pati APGA nwetara vootu 14,139 iji merie Andy Azike nke 'Labour Party' onye nwetara vootu 10,256 iji gbaa onye nke abụọ.

    Na mpaghara Oyi/Ayamelum, Maureen Gwacham nke APGA nwetara 15, 299 iji turu ugo ebe Vincent Ofumelu nke 'Peoples Democratic Party' (PDP) nwetara naanị 6,912 iji bụrụ onye nke abụọ.

  6. Ndị mmadụ emeela ngagharịiwe n'Ebonyi n'ihi ebubo nrụrụaka na ntuliaka

    Ọtụtụ ndị ntorobịa nuputara n'igwe n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti, n'ụbọchị Mọnde, iji mee ngagharịiwe maka ebubo na e mere nrụrụaka na ntuliaka na steeti ahụ

    Nke a na-abịa dịka Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka ọkwa Sineti na ụlọ omeiwu 'House of Reps'.

    Ndị so mee ngagharịiwe a n'isi ụlọọrụ Inec n'Abakiliki gụnyere ndị nkwado aka chịburu Ebonyi Steeti bụ Sam Egwu; nakwa ndị nkwado ndị ọzọ so zọọ ọkwa dị icheiche dịka Michael Amannachi, Linus Okorie, Laz Nweru Ogbe, na Eze Emmanuel.

    Ha boro ebubo na ntuliaka malitere n'udo mana nrụrụaka mechara bata n'ime ya.

    Ndị a mere ngagharịiwe kpọkuru Inec ka ha mee ngwangwa ma kpọpụta nke bụ ezi mpụtara ntuliaka na mpaghara dị icheiche n'Ebonyi Steeti iji gbochie ọgbaaghara ịdị n'obodo.

    Oriaku Paulin Onyekachi bụ onyeisi ụlọọrụ Inec n'Ebonyi rịọrọ ndị a na-eme ngagharịiwe ka ha hapụ ọgbaaghara ma gbasoo ụzọ udo.

  7. OUK emeriela ntuliaka sineti Abia North

    Aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu emeriela ntuliaka ịga n'ihu na-anọchite anya mpaghara Abia North n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa.

    Kalu onye nọ na pati 'All Progressives Congress' nwetara vootu 30,805 iji merie Nnamdi Iroh nke Labour Party onye nwetara vootu 27,540, na Mao Ohuabunwa nke 'Peoples Democratic Party' onye nwetara vootu 15,175.

    Onye kpọpụtara mpụtara ntuliaka a bụ Mazị Chinedu Nnamdi bụ onyeisi ụlọọrụ Inec haziri na mpaghara Abia North.

  8. Onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti, Chinedum Orji, adaala ntuliaka ụlọomeiwu etiti

    Onye ji ọkwa 'Speaker' n'ụlọ omeiwu Abia Steeti bụ Chinedum Orji, adaala ntuliaka ịga nọchite anya mpaghara Umuahia na Ikwuano n'ụlọ omeiwu 'Federal House of Representatives' n'Abuja.

    Orji, onye e ji 'Ikuku' mara bụkwa nwa aka chịburu Abia Steeti bụ Theodore .A. Orji; ha abụọ nọcha n'otu People Democratic Party (PDP)

    Onyeisi Inec haziri ntuliaka ahụ bụ Uma Oke kpọpụtara na Chinedum Orji nwetara vootu 35,196, iji gbaa onye nke abụọ, ebe onye meriri ya bụ ntuliaka bụ Mazi Obi Aguocha nke Labour Party nwetara vootu 48,199.

  9. Tinubu na Sanwo Olu ezipụtala ozi na-arịọ ka udo chia na Legọs steeti ugbua

    Onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke All Progressives Congress (APC) bụ Bola Ahmed Tinubu, arịọla ndị mmadụ na Legọs steeti ka ha nọrọ jụụ ma ghara ịkpa agwa nwereike ịkpata ọgbaghara na steetu ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Peter Obi nke Labour Party mara Tinubu aka n’ihu ma nweta mmeri na mpụtara ntuliaka nke Legọs bụ steeti Tinubu chibụrụ n’oge gara aga.

    Tinubu kwuru na dịka ọ bụ onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya na ọ ga-anabata mpụtara ntuliaka ahụ ma ọ dabanyere ya ma ọ dabanyereghị ya,

    Ọ gakwara n’ihu katọọ mwakpo megide ụfọdụ agbụrụ megide ndị dapụtarala n’akụkụ steeti ahụ.

    Onye ndọrọndọrọ APC gara n'ihu kwuo na dịka onye kwuo uche ya na ọ ga-anabatarịrị ihe ga-esi na ntuliaka ọ bụla pụta ma ọ dị mma ma ọ bụ na ọ bụghị.

    N’otu aka ahụ Gọvanọ Jide Sanwo-Olu nke Legọs steeti ezipụtala ozi nye ndị Legọs na-arịọ ka ha nọrọ juu ma aghara ịkpa agwa ga-akpalite ọgbaghara ugbua.

    O kwuru nke a dịka ozi so nzọmụkwụ Tokwu inubu ma na-ekwu na ọ gbaala mbọ n’oge ọchịchị n’afọ anọ kwalite udo, ịdịnaotu nakwa ime enyi na enyi ndị mmadụ agbanyeghị okpukperechi ha nakwa agbụrụ ha.

  10. Ngụkọ mpụtara ntuliaka 2023: Nchịkọta ihe ndị merelanụ

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec akpọpụtala mpụtara ntuliaka si steeti anọ n'isi ụlọọrụ ha dị n'isiobodo Naịjirịa bụ Abuja.

    Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala meriri na steeti ndị a kpọpụtarala ugbua bụ:

    • Ekiti steeti - Bola Tinubu meriri
    • Kwara steeti - Tinubu meriri
    • Osun steeti - Atiku Abubakar meriri
    • Ondo steeti - Tinubu meriri

    Ụfọdụ pati ekwukwala na ha agaghị anabata mpụtara ntuliaka ụfọdụ dịka ha na-ebo ebubo nrụrụaka. Pati ndị a gụnyere PDP, Action Alliance na ADC bụ ndị jụrụ ịnabata mpụtara ntuliaka si Ekiti steeti.

    Mpụtara ntuliaka ndị a hụrụla anya si Legọs steeti bụ steeti ndị mmadụ kacha biri n’ime ya na Naịjirịa na-egosi na Peter Obi nke Labour Party emeriela steeti ahụ.

    Nke a bụ nnukwu ihe ịmaka n’ihu nye Bola Tinubu nke APC bụ onye gbasiri mbọ ike inweta mmeri na steeti ahụ ma bụrụkwa aka chibụrụ ya bụ steeti site n’afọ 1999 ruo 2007.

    Mpụtara ntuliaka ndị a hụrụla anya gosikwara na Atiku Abubakar nke PDP emeriela na Katsina, be onyeisiala Muhammadu Buhari. Buhari bụ onye APC, ma bụrụkwa onye gosiri Tinubu nkwado na ntuliaka.

    Inec na-ezumike ugbua dịka ngụkọ ga-amalite ọzọ n’otu elekere na-abịa abịa.

  11. Lee etu Dino Melaye si gosi iwe ya nye Inec n'ama ngụkọ ntuliaka Abuja

    Dino Melaye nọ n'ebe a na-eme ngụkọ vootu n'Abuja na-egosi iwe ya megide mpụtara dị icheiche a kpọpụtara na steeti dị icheiche.

    Melanya kwuru na pati ya bụ PDP ga-eburu mkpesa gaa ụlọikpe n'okwu ihe ọ si Inec na-eme.

    Kirie etu o siri gosi iwe ya ebe a.

  12. E yigharịala ntuliaka n’akụkụ Abia ebe ndị emezughi ya n'ụbọchị Satọdee ruo oge amabeghi

    Ụlọọrụ Inec n’Abia steeti ekwugharịala ihe ha kwuburu banyere imegharị ntuliaka n’akụkụ Abia steeti ebe ndị ha enweghi mezuo ntuliaka na steeti ahụ n’ụbọchị Satọdee n’ihi ọgbaghara nakwa nsogbu ndị ọzọ dapụtara n’ụbọchị ahụ.

    Onyeisi mgbasaozi n’ihe gbasara ntuliaka steeti ahụ bụ Rebecca Jimmy kwuru na ha ga-ezipụta ozi nye ọha ụbọchị aga emegharị ntuliaka n’akụkụ Aba North, Aba South, Arochukwu, Obingwa, Osisioma, Ohafia nakwa okpuruọchịchị Umuahia North bụ ebe ndị emeghị ntuliaka ụbọchị ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Clement Oha bụ odeakwụkwọ ụlọọrụ Inec na steeti ahụ kwuburu n’ime isi ụlọọrụ Ince na a ga-emegharị ntuliaka n’akụkụ ndị ahụ n’ụtụtụ Mọnde malite n’elekere asatọ n’ihi na ha cheere na emegharịghi ya ga-apụta ngụpụ ndị mpaghara ahụ na ntuliaka.

    Ugbua, a na-echezi ụlọọrụ Inec ka ha zipụta ozi maka ụbọchị a ga-emegharị ntuliaka a.

  13. Ihe mere m ji laghachi ga tụọ vootu n'agbanyeghị ndị omekome wakporo m

  14. Gwa ndị nkwado unu ha kwụsị ikesa ozi ga-akpata ọgbaghara – Ndị uweojii Naịjirịa

    Ndị uweojii Naịjịrịa ewepụtala ozi nye ndị na-azọ okwa onyeisiala na-agwa ha ka ha dụọ ndị nkwado ha ndụmọdụ n’okwu mgbasaozi nwereike ikpata ọgbaghara n’oge a.

    Ozi ha kwuru na dịka anya oha na-ele ngụkọ mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjriịa na ndị ụlọomeiwu, na ha emeela nnyocha gosiri na mmụọ ndị mmadụ nwereike ịnụ ọkụ nke ukwuu n’oge, nke bụ na mgbasaozi ịkpa oke maọbụ nwereike ịkpata ọgbaghara ka amụnye ọkụ n’ime obi ndị mmadu ga-akpata ọgbaghara.

    Ha gara n’ihu kwuo: “Dịka anyị na-eche n’oge a, ka ọha gba mbọ gbasoo agwa iwu Naịjirịa kwadoro, ọ bụ ọrụ anyị ime ihe niile dịịrị anyị ịhụ na ọgbaghara adapụtaghị n’oge a.”

    Ndị uweojii zipụtara ozi a nye ndị na-azọ ọkwa na pati APC, PDP, LP nakwa NNPP na chetere ha nbinyeaka n’akwụkwọ udo ha mere tupu amalite ntuliaka a.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ na-ekwu ma na-ebo ibe ha ebubo ndị pati ha kpọkọrọ ndị agboro ha ka mwakpo ndị agburu na ebe ọtụtụ ozi ikpa oke agbụrụ na-awụpụta na soshal midia ugbua.

  15. Na Akpọtụ Ugbu A, PDP, Labour Party, ADC na ndị ọzọ agbajọọla mpụtara ntuliaka Ekiti steeti

    PDP, Action Alliance, ADC, Labour Party na ndị ọzọ agbajọọla mpụtara ntuliaka sị Ekiti steeti.

    Iwe ha bụ na atụfere vootu oke nke pụtara 'over voting' na Bekee.

    Dịka onyeisi Inec na steeti ahụ si kwuputa, ọ bụ APC meriri n'Ekiti.

  16. O nweghi onye awakporo n'ahịa Mandillas - Ndị uweojii

    Ndị uweojii na Legọs ekwuola na o nweghi onye awakporo n'ahịa Mandillas dị na Legọs dịka akụkọ na-efegharị si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC n'ekwentị na o nwere ndị agboro nwara ịwakpo ndị ahịa pụtara ịzụ ahịa n'ụtụtụ ụbọchị taa bụ Monde mana ndị uweojii ruru ebe ahụ ozugbo ozugbo.

    "Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọo kwụ chịm ebe ahụ, o nweghi kama otu onye awakporo" ka o kwuru.

    Okwu ya na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na ndị agboro na-awakpo ụlọahịa na ọdọahịa ebe ndị Igbo juru eju dịka Mandillas nakwa Oyingbo n'ụtụtụ taa.

    Hundeyin kwukwara sị "O nwebeghi ihe m nụrụ maka mwakpo na-aga ahịa Oyingbo".

  17. Lee etu ngụkọ ntuliaka si aga na mpaghara ụfọdụ na Delta Steeti

    Ngụkọ mpụtara ntuliaka amalitekwala na mpaghara dị icheiche na Delta Steeti.

    Ka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mpụtara ntuliaka n'okpuru ọchịchị asatọ n'ime okpuru ọchịchị 25 dị na steeti ahụ.

    Anyị ga-edepụta mpụtara ndị a kpọpụtarala ugbua, mana matakwa na ọ bụ Inec ka ọ dịịrị ikpọpụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka a nakwa onye meriri:

    OKPURU ỌCHỊCHỊ BOMADI:

    APC 2421

    LP 3134

    NNPP 38

    PDP 4429

    OKPURU ỌCHỊCHỊ NDOKWA WEST

    APC 3840

    LP 12889

    NNPP 56

    PDP 8599

    OKPURU ỌCHỊCHỊ IKA SOUTH:

    APC 3290

    LP 17,868

    NNPP 166

    PDP 7,485

    OKPURU ỌCHỊCHỊ WARRI NORTH

    APC:1379

    LP: 2417

    NNPP:52

    PDP: 3411

    OKPURU ỌCHỊCHỊ ETHIOPE EAST

    APC:6314

    LP:10,806

    NNPP:402

    PDP:7,854

    OKPURU ỌCHỊCHỊ ANIOCHA SOUTH

    APC1,686

    LP14,208

    NNPP113

    PDP4,672

  18. Labour Party emeriela APC na Legọs steeti

    Mpụtara ntuliaka nke isi ụlọọrụ Inec dị na Legọs steeti kpọpụtara gosiri na otu Labour Party meriri APC na Legọs steeti.

    Mana Inec nke dị n'Abuja bụ ndị ga-akpọpụta mpụtara a kpam kpam ji gosi na ọ bụ otu ahụ ka ọ dị.

    Lee ka ọnụọgụgụ si ga.

    Ndị zuruoke itụ vootu: 1347152

    APC 572606

    LP 582454

    NNPP 8442

    PDP 75750

  19. "Dọọ Inec aka na ntị" - NLC gwara Buhari

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' (NLC) ekwupụtala mgbagwoju anya ha n'etu ngụkọ ntuliaka si aga, ma kwukwaa na ụjọ na-atụ ha maka ọgbaaghara ya bụ ihe nwere ike ibute na Naịjirịa.

    Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde ebe o kwuru sị: "anyị na-ekwupụta uche anyị maka ihe dịka nrụrụaka a na-eme na mpụtara ntuliaka nke Legọs na Rivers Steeti, ma na-akpọ oku ka amalita itinye mpụtara ntuliaka n'ọbaozi Inec n'egbughị oge ọbụla.

    "Inec kwesịrị ịghọta na ọ bụrụ na ha etinyeghị mpụtara ntuliaka n'ọbaozi 'server', o nwereike ibute ọgbaaghara," Ajaero dere.

    "Anyị na-akpọ oku ka Inec nyochaa otu onye ọrụ ha na ngalaba tekịnụzụ onye aka ya nwereike ịdị n'ihe mere o ji sie ike iziga mpụtara ntuliaka site na BVAS gaa n'ọba ozi 'server''.

    NLC boro ebubo na nwoke na-elekọta ngalaba tekịnụzụ nke Inec "bụbu kọmishọna na Legọs steeti aha ya bụ Femi Odubuyi".

    "Anyị na-akpọ Onyeisiala Muhammdu Buhari ka o bilie ma dọọ Inec aka na ntị ka ha soro usoro niile dị n'akwụkwọ isu ntuliaka na ngụkọ vootu nke na-aga n'ihu ugbua."

    "Naanị ime nke a ka onyeisiala ga eji mee ka ụmụ Naịjirịa mata n'ezie na aka ya adịghị na ejije a na-aga n'ihu ugbua."

  20. Nwa Gọvanọ Ganduje adaala ntuliaka ụlọomeiwu nta

    Umar Ganduje bụ nwa Gọvanọ Kano steeti adaala na ntulika ụlọmeiwu nta o zọrọ.

    Tijani Jobe nke NNPP meriri ya iji zọta ọkwa ịnọchị ndị Tofa/Rimin Gado n'ụlọomeiwu.

    Nna ya bụ Gọvanọ Abdullahi Ganduje achịala Kano steeti afọ asatọ so na ndị ga-arịtu n'ọkwa n'ọnwa Mee.