Obasanjo ewepụtala ozi nye Buhari na Inec maka ntuliaka 2023
Aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo agwala Inec ka ha hazie mehie aka ndị so mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa a.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị pati na-anọghị n’ọchịchị dịka Labour party na People Democractic Party etiela mkpu nye etu ngụkọ mpụtara ntuliaka a si aga ugbua.
Obasanjo kwuru na “Ọ bụrụ na onyeisi ụlọọrụ Inec nwereike ime ka e yigharia ntuliaka gaa ụbọchị anọ gafee oge e hibeburu ya, ọ nwereike ihazi mehie aka ndị so ngụkọ ntuliaka a n’abalị abụo gara aga.”
“Ọ bụrụ na ejighi Bvas eme ngụkọ, enweghị mpụtara ntuliaka a na-akpọpụta a ga-anabata, ọ bụrụ na Inec agbaghị mpụtara ntuliaka si steeti n’anwụ n’ọba ozi ha site n’Server’ a gaghị anabata mpụtara ntuliaka ọbụla.”
Ozi Obasanjo zipụtara kwuru na agwa Onyeisiala Muhammadu Buhari gosiri na ọ chọrọ ka ụkpụrụ ọ ga-ahapụrụ Naịjịrịa bụrụ nke ntuliaka kwụ aka ọtọ ma soro usoro doro anya mana na etu Inec si eme n’oge na-awụnye aja na garị ya bụ atụmatụ.
Ọ gara n’ihu rịọ Buhari ka akagbuo ma megharịa ntuliaka n’ebe ndị usoro ya akwụghị aka ọtọ ma kwụsị iji aka na-edebanye vootu ma jiri tekụnzụ Bvas etu Inec siri kwuo na mbụ.