Ndị Naịjirịa
ga-awụchi n’ọgbọ ebe a na-atụ vootu n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023 ịhọpụta onyeisiala
ọhụrụ ga-anọchị anya Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa ndị nnọchịteanya n’ụlọomeiwu.
Esoghi usoro
ntuliaka ndị ọzọ a na-emebu, e nwere mmadụ atọ kachasị gbapụta ihe n’ịzọ ọkwa a,
ha gụnyere; Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) na-achị ugbua,
Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) na Peter Obi nke Labour Party
(LP).
Iji merie na
ntuliaka a, onye ahụ ga-enwete vootu kachasị n’ọnụọgụgụ ma nwetekwa vootu ruru
pasentị 25 n’opekatampe steeti 24 n’ime steeti 36 sị na Naịjirịa.
Ụlọorụ na-ahazi ntuliaka a bụ Independent National Electoral Commission (Inec) sị na mmadụ karịrị nde 93 (93,469,008) debanyere aha iso tụọ vootu.
E nwere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị 18 so na-azọ ọkwa a, ebe ọgbọ ebe a ga-atụ vootu (polling unit) dị 176,606.
Nke a bụ mbụ a ga-eji igwe tekịnụzụ a kpọrọ Bimodal Voter Accreditation System (BIVAS) eme ntuliaka ọkwa onyeisiala. A ga-eji igwe a chọpụta onye tozuruoke ịtụ vootu site na akara mkpịsị aka maọbụ ihu onye ahụ.
Inec sị na ngwa ngwa e nyochara mmadụ na igwe a ga-ezipụ ozi ọnụọgụgụ mmadụ ole e nyocharala nke mere na ọ ga-arụ ka aghụghọ dị na ya.