You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. A na-eche ndị ọrụ Inec n’akụkụ Ojodu, Legọs steeti

    Ndị mmadụ apụtala na-echezi ndị ọrụ Inec n’ime ụlọakwụkwọ Ojodu Grammar School nke Legọs steeti.

    Onye ntaakụkọ BBC na Legọs gara ebe ahụ kwuru na ndị Inec abịarubeghi n’ebe ihe ji nkeji atọ fọ ka elekere 10 kụọ.

    Lee ka ndị na-eche ndị Inec siri nọrọ na-eche.

  2. Lee ka ihe si aga n’akụkụ Ebonyi steeti dị iche iche.

    N’ebe elekere asatọ nke n’ọkara, onye ntaakụkụ BBC n’Ebonyi mere njem gaa akụkụ steeti ahgụ dị iche iche. Dịka o siri hụ, ndị ọrụ Inec apụtabeghị n’oge ahụ n’akụkụ ụfọdụ dịka ụlọakwụkwọ Ebsu primary school ebe ha ndị ọrụ ha pụtakwara n’akụkụ ụka Azumnini Azugwu, Assembly of God.

    Inec kwuru na ntulaika ga-amalite n’ebe elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ nke mere ndị mmadụ jiri pụta na-echezi ha.

  3. Ndị ọrụ Inec ka na-ahazi onwe ha maka ịtụ vootu n'Ikoyi, Legos

    Ndị ọrụ Inec na ndị chọrọ ịtụ vootu awụchiela n'ụfọdụ polling unit dị n'Ikoyi Legọs steeti.

    Ndị mmadụ malitere ile ma aha ha ọ dị n'akwụkwọ ndị ga-eso tụọ vootu ebe ahụ dịka ndị ọrụ Inec na-ahazi ụlọ ebe a ga-atụ vootu bụ 'cubicle'.

    E nwere ụfọdụ ndị ọrụ Inec ka na-achọ ebe ha kwesịrị ịnọ kpọmkwem hazie ọrụ ntuliaka nke ha.

  4. Ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu n’akụkụ Abịa nakwa Imo na-echezi ndị ọrụ Inec

    BBC Igbo emeela njem gaa n’akụkụ Ugba nke Abịa steeti nakwa Owerre, Imo steeti mana ndị ọrụ Inec abịabeghị.

    Otu nwoke onye okenya kwuru na obi adịghị ya mma n’ihi ha mara ụzọ pụta.

    Lee ihe ndị mmadụ nọ ebe na-ekwu n’ihe onyonyo a.

  5. A na-eche ndị ọrụ Inec n’akụkụ Uyo dị iche iche

    BBC emeela njem gaa ọtụtụ akụkụ n’Uyo dịka a na-eche ndị ọrụ Inec ka ha pụta ọrụ ugbua.

    Ndị pụtara n’akụkụ Etoi nke okpuruọchịchị Uyo kwuru na obi adighị ha mma na ndị ọrụ Inec abịbeghị n’ihi na ha mara ụzọ kemgbe ebe elekere isii nke ụtụtụ pụta maka ịtụ vootu ha.

    Inec kwuru na a ga-amalite ntuliaka n’elekere asatọ, ndị mmadụ apụtala mana ndị ọrụ Inec apụtabeghị ebe a.

  6. Ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ụfọdụ ebe a na-eme ntuliaka n'Enugwu

    Na-agbanyeghi na ntuliaka amalitela n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa, ndị ọrụ Inec erutebeghi ụfọdụ ebe dịka na polling units ndị dị na Nike Umunwene, Enugwu steeti n’ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ a (9:12am).

    Mana ọtụtụ ndị debanyerela aha ịtụ vootu nwere olileanya na ọnụnụ ọkụ n’obi ibinye aka n’akwụkwọ.

    Nke a bụ dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ si kọwaa.

  7. Atiku Abubakar na-azọrọ PDP ọkwa apụtala tụọ vootu ya

    Atiku Abubakar na-azọrọ pati People’s Democratic Party (PDP) ọkwa onyeisiala Naijirịa 2023 awụchiela ugbua n’ọgbo ntuliaka Ajiya 12 dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.

    E meela ya nnyocha dịka ọ na-atụ vootu nke ya ugbua.

    Inec amalitela ime ntuliaka ebe ahụ dịka ndị mmadụ amalitela ịwuchi na ya bụ ọgbọ.

    Ndị ọrụ nchekwa nọkwa nso n'ọrụ ha dịka ndị ntaakụkọ juru ebe niile ebe ahụ.

  8. Amalitela ịtụ vootu n'ọgbọ ntuliaka Amantutu, Agulu, Anambra

    A malitere ịtụ vootu n’akụụ ọgbọ ntuliaka 019, Wọọd nke abụọ n'Amantutu, nke Agulu Anambra steeti. Ihe a bụ ebe a na-atụ anya na Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa ga-atụ vootu ya taa.

    Onye mbụ tụrụ vootu ya taa bụ nwoke okenya gbara afọ 81 dịka ọ mara ụzọ pụta ime ya bụ ihe.

    Ndị mmadụ amalitela ịpụta n’uju dịka ndị ọrụ Inec malitere inabata ha.

    Ndị ọrụ nchekwa jupụtakwa dịka ha awụchiela ịrụ ọrụ ha.

  9. Ndị na-ere nri sokwa pụta ọgbọ n’akụkụ Angwa Sarki wọọdụ, Kaduna

    Ndị mmadụ na-ere nrị n’akụkụ Angwa Sarki wọọdụ, bụ ebe a na-atụ anya na Gọvanọ Kaduna Steetị bụ Nasiru el-Rufai ga-atụ vootu ya taa.

    Ndị na-ere nrị na ndị na-ere mmeri nakwa ihe ndị ọzọ agbakọtala na-eche dịka ndị Inec ga-amalite ntuliaka n’oge adịghị anya ebe ahụ.

  10. Nigeria Elections Results: Mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa

  11. Amalitebeghị ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka a na-atụ anya na Bola Tinubu ga-atụ vootu ya

    Nke a bụ ogige ntuliaka nke Shoprite dị n'Ikeja, Legos steeti. A na-atu anya na Bola Ahmed Tinubu ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naijiria ga-atụ vootu ya. Ntuliaka kwesịrị ibido n'elekere asatọ nke ụtụtụ. Kama dịka ọ sịrị dị ugbua, ahubeghi ndị ọrụ Inec ebe a.

    Ndị ntaakụkọ juru ebe niile dịka ndị mmadụ chọrọ ịtụ vootu na-agbakọta ugbua.

  12. Oge Peter Obi pụtara zute ndị mmadụ gbakọrọ ikele ya

    Ọha ndị mmadụ pụtara n'isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị ntuliaka zute Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala.

    N'obodo ya bụ Ama ntụtụ nke Agulu, ndị ntaakụkọ jupụtara dịka ọ kelere ha.

    Lee ka ya bụ ihe siri gaa.

  13. A malitela ikesa akụrụngwa ntuliaka n’Abor Mbaise, Imo steeti

    Ndị ọrụ Inec awụchiela n’akụkụ Abor Mbaise, Imo steeti dịka ha na-ekesa akụrụngwa ntuliaka. Ndị ọrụ Inec ga-arụ n’ọgbọ ntuliaka dị iche iche awụchiela iburu ya bụ Akụrụngwa.

    Ntuliaka ga-amalite n’oge adịghị anya.

  14. Inec awụchịela n’ọgbọ ntuliaka a na-atụ anya na Atiku Abubakar ga-atụ vootu

    Ndị ụlọọrụ Inec eburula nkụrụngwa ha wụchie n’ọgbo ntuliaka Ajiya 12 dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.

    Ihe a bụ ebe a ana-atụ anya na Atiku Abubukar na-azọrọ People’s Democractic Party (PDP) ọkwa onyeisiala ga-atụ vootu ya taa.

    Onye bụbụ ụlọomeiwu Naịjriịa bụ Awwal Tukur nọkwa ebe ahụ dịka o kwuru na kwa afọ, ọ na-anọ na ya bụ ọgbọ atụ vootu.

    O kwuru “Na ntuliaka ndị ọzọ, ndị mmadụ ekwesila iju ebe a ugbua.” “Ahụghịkwa m ụmụnwaanyị ọbụla ebe a”

    Ọtụtụ ndị ntaakụkọ juru ebe a dịka ndị obodo ahụ na-apụta ugbua isonye mee ntuliaka nke taa.

  15. Ndị ọrụ Inec apụtala n’okpuruọchịchị Osisioma, Anambra steeti

    Ndị ọrụ nhazị ntuliaka Inec apụtala ihu ọrụ n’okpụrụochịchị Osisioma, Anambra steeti dịka a na-ekesa akrụrụngwa ntuliaka.

    BBC Igbo nọ ugbua n’ime ọgbọ ntuliaka nke Abayi Girls Secondary school.

    Ọha ndị mmadụ amalitela ịgbakọta maka atụmatụ ịtụ vootu ha ugbua.

    A ga-amalite ịtụ vootu n’elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ taa.

  16. Ndị mmadụ amalitela ịpụta n’Ama ntụtụ, Agulu

    Ndị obodo ahụ amalitela ịpụta maka atụmatụ ịtụ vootu ha taa n'Ama ntụtụ, nke Agulu, Anambra steeti.

    N’ọgbọ ntuliaka ya bụ obodo, Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa awụchiela dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ pụtara zute ya ma na-agba ya ajụjụ ọnụ.

    Ọ fọrọ nkeji 30 ka amalite ntuliaka nke afọ a.

  17. A dịla njikere ikesa akụrụngwa ntuliaka n’isi ụlọọrụ Inec na Yaba

    Ndị ọrụ nhazi ntuliaka n’isi ụlọọrụ Inec na Yaba, Legọs steeti apụtala dịka ha kwuru na ha dị njikere ikesa akụrụngwa.

    Ndị ọrụ ngo nakwa ndị na-efe ala nna ha otu afọ apụtakwala.

  18. Ndị mmadụ apụtala n’ọgbọ ntuliaka ebe a na-atụ anya na Peter Obi ga-atụ vootu n’Agulu

    N’ọgbọ ntuliaka nke Ama ntụtụ, Agulu, Anambra steeti bụ ebe a na-atụ anya na Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala 2023 ga-atụ vootu ya taa, mmadụ abụọ awụchiela ebe ahụ n’ebe elekere asaa nke ụtụtụ a dịka otu nwaamadị ebe ahụ kwuru na ụra ekweghị tụọ ya n’ihi na echieche maka ntuliaka afọ a juru ya obi.

    Otu n’ime mmadụ abụọ a hụrụ ebe ahụ bụ nwoke okenya kwuru na ọ pụtara n’ihi ọ chọrọ ka ntuliaka a gaa nke ọma ma mịtara Naịjriịa ezi mkpụrụ.

  19. Wọọdụ ebe Gọvanọ Kaduna steeti ga-atụ vootu amalitela ikesa ngwa ọrụ

    Ndị ọrụ Inec amalitela ikesa akụrụngwa e ji atụ vootu na wọodụ Sarki dị na Kaduna steeti bụ ebe gọvanọ Kaduna bụ Nasir el-Rufai ga-anọ tụọ vootu.

    Ndị niile ga-anọ na polling unite dị na wọọdụ ndị a arụ ọrụ gụnyere ndị uweojii na ndị nchekwa dị iche iche awụchiela ebe ịrụ ọrụ dịịrị ha.

  20. Lee etu okporoụzọ Owerri dị n'ụtụtụ ka ndị mmadụ na-akwado ntuliaka

    Okporoụzọ dị n'Owerri Imo steeti tọgbọọ chakooo dịka ọtụtụ ndị steeti ahụ na ndị ọzọ na-akwado maka ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa.

    Onyeisi ndị uweojii nyere iwu ka ụgbọala ghara ịgba n'ụzọ malite n'elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ ruo n'elekere isii nke mgbede.