Dịka ọ fọrọ
naanị awa ole m ole ka e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu Naịjirịa,
kọmịshọna ntuliaka n’Anambra bụ Dr Queen-Elizabeth Agwu nakwa ndị uweojii na
steeti ahụ agwaala ọha ndị mmadụ ka ha pụta tụọ vootu ha ma ghara ịtụ ụjọ ma
ncha.
Ndị uweojii
kwuru nke a ma gwaa ọha na ha apụtala n’uju ma nọrọ n’ọrụ ịchekwa ndụ ndị mmadụ
n’oge ntuliaka a.
Agwu kwuru
nke a n’ọgbakọ mkpọku ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n’isi ụlọọrụ Inec n’Awka, Anambra
steeti.
O kwuru na
ntuliaka a ga-aga n’ihu n’akụkụ Anambra niile ma bụrụ ihe okwu enweghi nchekwa
agaghi egbochi.
Inec kwuru
na ha adịla njikere ma nọrọ n’ihu ọrụ dịka Agwu kwuru na akụrụngwa niileaga eji mee ya bụ ntuliaka eruola ha aka.
N’okwu akwụkwọ
ikike ịtụ vootu a sị a hụrụ n’otu akụkụ steeti ahụ, Agwu kwuru na ha na ndị
uweojii amalite nnyocha n’okwu a ma kọwa na ọ bụ ihe ịtụ n’anya na akwụkwọ
ikike itu vootu a sị a hụrụ bịara karịa nchịkọta akwụkwọ ikike itu vootu ebipụtara
n’Anambra steeti niile.
N’otu aka
ahụ , osote onye isi ndị uweojii n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ John Amadi dọrọ
ọha aka na ntị ọkachasị ndị omekome maọbụ ndị ọbụla ga-achọ ikpalite ọgbaghara
n’akụkụ steeti ahụ ọbụla n’oge ntuliaka a dịka o kwuru na ndị uweojii agaghị
anabata agwa dị etu.
Amadi kwuru
nke a n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Amawbia dịka ya na ndị ntaakụkọ zutere.
Ọ gara n’ihu
dọọ ndị uweojii aka na ntị ma kwuo na onye otu ha ọbụla a hụrụ na-eri meperi n’ọrụ
ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.