You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Gburugburu adaala ntuliaka Sineti Enugwu North

    Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi adaala ntuliaka ịnọchite anya mpaghara Enugwu North n'ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa.

    Onye meriri ya bụ ntuliaka bụ Mazi Okechukwu Eze a nke nọ na 'Labour Party'.

    Onye isi ụlọọrụ Inec haziri ntuliaka na mpaghara ahụ bụ Chukwuemeka Ubaka kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Nsukka n'ebe elekere ise na ọkara nke ụtụtụ taa bụ Mọnde.

    Dịka Ubaka si kpọpụta, Eze a nwetara vootu 104,492 iji merie Ugwuanyi onye nwetara naanị vootu 46,948.

    Onye pati Apga gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 6,816

  2. Ikenga Ugochinyere emeriela ntuliaka Ideato North/South

    Ọnụ na-ekwuru otu 'Coalition of United Political Parties' (CUPP), bụ Ikenga Ugochinyere emeriela ntuliaka ịnọchite anya mpaghara Ideato North na South nke Imo Steeti n'ụlọ omeiwu 'Federal House of Representatives'.

    CUPP bụ otu jikọtara ndị ndọrọndọrọ na-anọghị n'ọchịchị.

    Onye isi ụlọọrụ Inec haziri ntuliaka na mpaghara Ideato North na South bụ Onwuachu Chinyere kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ ma kwuo na Ikenga nwetara vootu 13,026 iji merie, ebe onye nke abụọ bụ Obi Paschal nke 'Labour Party' nwetara vootu 5,696.

    Obi Pascal bụ onye na-anọchi anya mpaghara Ideato North na South ugbua n'ụlọ omeiwu nta ugbua.

    N'okwu mmeri ya, Ugochinyere sị na ya na-ehunye mmeri ya maka ncheta nwanne nna ya bụ Daniel Ikegwuonu na mmadụ abụọ ọzọ bụ ndị tufuru ndụ ha oge ndị ojiegbe wakporo ụlọ ya bụ Ugochinyere n'Akokwa, n'ụbọchị 14 nke ọnwa Jenụwarị afọ a.

  3. Ọ gbajuola dọrọ n'Enugwu dịka a na-eche Inec

    Ụlọọrụ Inec dị n'Enugwu steeti bụ ebe ndị ntaakụkọ nakwa ọha mmadụ gbakọrọ ịnụrụ mkpọpụta ntuliaka e mere na steeti ahụ.

    Cheta na Inec na steeti ahụ kwuru na ha ga-amalite ọzọ n'ebe elekere 7 nke ụtụtụ taa mana ha ebidobeghi dịka ọ gafere 8:30 ugbua.

  4. Nkeiruka Onyejeocha adaala ntuliaka ụlọ omeiwu nta

    Onye ji ọkwa Deputy Chief Whip n'ụlọ omeiwu 'Federal House of Representatives', bụ Nkeiruka Onyejeocha adaala ntuliaka ịlaghachi n'ụlọ omeiwu nta.

    Onyejeocha na-anọchibu anya mpaghara Isukwuato na Umunneochi n'ụlọ omeiwu nta, mana dịka Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ n'ụbọchị Sọnde, onye meriri ya bụ Mazi Amobi Godwin Ogah.

    Onyeisi ụlọọrụ Inec chịkọtara ya bụ ntuliaka bụ Ọkaiwu Nneoma Nnochiri, kwuru na Amobi Ogah nwetara vootu 11,769 ebe Nkeiruka Onyejeocha nwetara vootu 8,752.

    "Mụnwa bụ Ọkaiwu Nneoma Nnochiri, bụ onyeisi haziri ntuliaka maka ọkwa ụlọ omeiwu 'Federal House of Representatives' nke Isukwuato/Umunneochi, na-ekwupụta na Amobi Godwin Ogah nwetara vootu kachasị na ntuliaka ahụ ma bụrụkwa onye meriri na onye ahọpụtara," ka onyeisi Inec ahụ kwuru.

    Onye bụ Nkeiruka Onyejeocha?

    • Ọ bụ onye Isuochi dị n'okpuru ọchịchị Umunneochi n'Abia Steeti
    • Ọ gụrụ mahadum na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka
    • Na 2002, ọ rụrụ ọrụ dịka Kọmishọna n'Abia steeti, oge Orji Uzor Kalu bụ Gọvanọ
    • Ọ rụọla ọrụ dịka onyeisioche okpuru ọchịchị Umunneochi n'afọ 2003
    • Oge mbụ o meriri ntuliaka ịnọchite anya mpaghara ahụ n'ụlọ omeiwu nta bụ n'afọ 2007 nke pụtara na ọ rụọla ọrụ ahụ afọ 16
    • Na 2019, ọ zọrọ ọkwa ịbụ onyeisi (Speaker) ụlọ omeiwu nta, mana ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu e mee ntuliaka ahụ, o kwuru na ya agaghịzi eso zọọ ya bụ ọkwa
  5. Umahi emeriela oche Sineti Ebonyi South

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi emeriela ntuliaka ịnọchịte mpaghara Ebonyi South n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ sineti.

    Onyeisi Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ bụ Ọkammụta Augustine Ogugua Egwu nke na-akụzi n'ụlọakwụkwọ Alex Ekwueme Federal University dị na Ndufu Alike Ikwo, Ebonyi Steeti.

    Dịka Inec si kpọpụta, Umahi, onye pati ya bụ 'All Progressives Congress (APC), nwetara vootu 28,378 iji nweta mmeri, ebe onye nke abụọ bụ Linus Abah Okorie nke 'Labour Party' nwetara vootu 25,496.

    N'okwu mmeri ya, Umahi sị na ya na-ekele Chineke nakwa ndị Ebonyi niile maka mmeri ahụ.

  6. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    Anyị ka kwụ chịm iwetara gị etu ngukọ si aga na steeti dị icheiche.

    Gaa n'ihu na-esonyere anyị.

  7. A ga-ebido ịgụpụta mpụtara ntụliaka nke Imo Steeti n'elekere iri nke ụtụtụ taa

    Ngalaba INEC ekwuola na ha ga-ebido ịgụpụta mpụtara ntụliaka nke Imo Steeti n'elekere iri nke ụtụtụ taa.

  8. A ga-ebido ngụpụta vootu nke Onyeisiala n'Enugwu Steeti n'elekere 7:00 nke ụtụtụ

    Ndị ọrụ INEC ekwuola na ha ga-ebido ịgụpụta ọnụ ọgụgụ vootu nke onyeisiala a tụrụ na steeti ahụ n'elekere asaa nke ụtụtụ a.

  9. Lee nchịkọta vootu onyeisiala dịka e siri tụọ ya n'Ogun steeti

    MPỤTARA NTULIAKA NIILE E MERE N'OGUN STEETI DIKA INEC SIRI KPỌPỤTA YA:

    Ndị debanyere aha ha: 2687606

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 612341

    APC : 341554

    LP; 85829

    NNPP : 2200

    PDP : 123831

    SDP: 738

    VOOTU DỊ IRE:

    VOOTU A GỤPỤRỤ:

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE: 611448

  10. Lee ka ngụkọta vootu ọkwa onyeisiala Naịjirịa sị aga na Kaduna steeti

    Ebidola ngụkọta vootu na Kaduna steeti maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Lee ka ha sịrị kwụrụ site n'okpuruọchịchị:

    GIWA LG (KADUNA STATE)

    Ndị debanyere aha ha - 149,456

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 48118

    APC : 19,922

    LP : 565

    NNPP : 3,114

    PDP : 22,302

    VOOTU DỊ IRE : 46,435

    VOOTU A GỤPỤRỤ : 1,662

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE : 48,097

    KAURA LG (KADUNA STATE)

    Ndị debanyere aha ha - 101,665

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu -

    APC : 1,847

    LP : 25,744

    NNPP : 320

    PDP : 7,847

    VOOTU DỊ IRE : 37,222

    VOOTU A GỤPỤRỤ : 694

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE : 36,916

    KAJURU LG (KADUNA STATE)

    Ndị debanyere aha ha - 92,668

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 30,652

    APC : 3,940

    LP : 14,875

    NNPP : 1,221

    PDP : 9,253

    VOOTU DỊ IRE : 29,839

    VOOTU A GỤPỤRỤ : 800

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE : 30,639

  11. Lee ngụkọta vootu sị aga n'Adamawa Steeti

    Lee ngụkọta vootu sị aga n'Adamawa Steeti:

    OKPURUỌCHỊCHỊ NUMAN, ADAMAWA STEETI

    Ndị debanyere aha ha: 92,086

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 26,311

    APC-5,115

    LP- 10,229

    NNPP- 168

    PDP-8,984

    VOOTU DỊ IRE: 25,318

    VOOTU A GỤPỤRỤ: 992

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE: 26,310

    OKPURUỌCHỊCHỊ DEMSA, ADAMAWASTEETI

    Ndị debanyere aha ha: 96,907

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 33,730

    APC-5,746

    LP-7,962

    NNPP-199

    PDP-17,166

    VOOTU DỊ IRE:32,110

    VOOTU A GỤPỤRỤ: 1,609

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE: 33,719

    OKPURUỌCHỊCHỊ SONG, ADAMAWASTEETI

    Ndị debanyere aha ha: 110,706

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 44319

    APC 10,993

    LP-8,506

    NNPP-1223

    PDP 20,406

    VOOTU DỊ IRE:42,193

    VOOTU A GỤPỤRỤ: 2,054

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE: 44,247

    MPỤTARA NTULIAKA OKPURUỌCHỊCHỊ FUFORE, ADAMAWA STEETI

    Ndị debanyere aha ha: 129,513

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu:42,632

    APC-12,633

    LP-897

    NNPP-508

    PDP-26,059

    VOOTU DỊ IRE: 40,712

    VOOTU A GỤPỤRỤ: 1,873

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE: 42,585

    Ha na-ewe obere oge iche mpụtara ndị ọzọ n'ebe dị icheiche n'Adamawa.

  12. Lee ka ngụkọ vootu siri gaa na Gombe Steeti

    Lee ka ngụkọ vootu siri gaa na Gombe Steeti dịka ndị nnọchiteanya nọ n'okpuruọchịchị siri wepụta:

    Okpuruọchịchị Shongom:

    APC : 7,525

    PDP: 13,520

    NNPP: 256

    LP: 2,579

    Okpuruọchịchị Balanga:

    APC: 11,715

    PDP: 23,326

    NNPP: 405

    LP: 3,760

    Okpuruọchịchị Nafada

    APC: 8,242

    PDP:12,339

    NNPP: 344

    LP: 7

    Okpuruọchịchị Funakaye

    APC : 12,672

    PDP : 25,384

    NNPP : 767

    LP: 320

  13. Lee ka ngụkọta vootu ọkwa onyeisiala Naịjirịa sị aga na Bauchi steeti

    Lee ka ngụkọta vootu siri aga na Bauchi steeti:

    Okpuruọchịchị Warji:

    APC : 11,862

    LP : 185

    PDP : 17,732

    NNPP : 424

    Okpuruọchịchị Bogoro:

    APC : 4,850

    LP : 6,866

    NNPP : 798

    PDP : 15,156

    Okpuruọchịchị Dass:

    APC - 10,939

    LP - 705

    NNPP - 397

    PDP - 13,242

    Okpuruọchịchị Jama'are:

    APC : 8,410

    LP : 22

    NNPP : 3,638

    PDP: 12,535

    Okpuruọchịchị Dambam:

    APC : 7,588

    LP : 42

    NNPP : 2,586

    PDP : 12,203

    Okpuruọchịchị Giade:

    APC : 10,382

    LP :17

    NNPP : 4002

    PDP : 11,977

    Okpuruọchịchị Darazo:

    APC : 16,070

    LP : 41

    NNPP : 1,895

    PDP : 17,459

    Okpuruọchịchị Kirfi:

    APC : 9,599

    PDP :13, 431

    NNPP : 1,544

    LP : 33

  14. Lee ka ngụkọta vootu ọkwa onyeisiala Naịjirịa sị aga n'Anambra Steeti

    Dịka o siri dị ugbua, INEC akwụsịtụla ngụkọta Vootu Anambra Steeti tutu elekere 8:00 nke ụtụtụ ụbọchị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

    Lee ngụkọta vootu sị aga n'Anambra Steeti:

    Anyamelum LGA of Anambra state:

    Ndị debanyere aha ha: 89,388

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 18,386

    APC - 145

    LP - 17032

    PDP - 405

    VOOTU DỊ IRE: 17977

    VOOTU A GỤPỤRỤ: 154

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE I8,131

    Dunukofia LG nke Anambra steeti

    Ndị debanyere aha ha:77,138

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 20,406

    APC - 222

    LP - 18,715

    NNPP -

    PDP - 428

    VOOTU DỊ IRE- 19,178

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 170

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 20,198

    Ọgbaghara dapụtara na mpaghara atọ na ogige iri na otu ebe a na-atụ vootu.

  15. Lee ka ngụkọta vootu ọkwa onyeisiala Naịjirịa sị aga na Legọs steeti

    Lee ngụkọta vootu sị aga na Legọs Steeti

    Otu nwaanyị biliri ma sị ka akpọpụta ya bụ vootu site na ward na ward n'ihi na onye nnọchite anya pati ya kwuru na atụdoro ya egbe n'isi ka o binye aka n'akwụkwọ mpụtara ntụliaka nke okpuruọchịchị Badagary.

    BADAGRY LG (LAGOS STATE)

    Ndị debanyere aha ha - 227518

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 53939

    APC - 31903

    LP - 10956

    NNPP - 153

    PDP - 6024

    VOOTU DỊ IRE - 50618

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2952

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 53570

    IKEJA LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 322600

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 57530

    APC - 21276

    LP - 30004

    NNPP - 153

    PDP - 2280

    VOOTU DỊ IRE - 55062

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2468

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 57530

    IBEJU LEKKI (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha -

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu -29808

    APC - 14685

    LP - 10410

    NNPP - 104

    PDP - 2329

    VOOTU DỊ IRE - 28034

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 1725

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 29759

    AGEGE (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 365889

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu -53858

    APC - 29568

    LP - 13270

    NNPP - 1513

    PDP - 4498

    VOOTU DỊ IRE - 50892

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2923

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 53815

    IKORODU LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha -

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 90539

    APC - 50353

    LP - 28951

    NNPP - 400

    PDP - 4508

    VOOTU DỊ IRE - 86647

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 3892

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 90539

    LEGỌS AỊLAND LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 200048

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 34989

    APC - 27760

    LP - 3058

    NNPP - 79

    PDP - 2521

    VOOTU DỊ IRE - 33886

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 1052

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 34938

    EPE LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 160361

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 30683

    APC - 19867

    LP - 3497

    NNPP - 76

    PDP - 5221

    VOOTU DỊ IRE - 29222

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 1356

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 30578

    SHOMOLU LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 316752

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 64348

    APC - 27879

    LP - 28936

    NNPP - 476

    PDP - 3449

    VOOTU DỊ IRE - 62003

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2273

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 64276

    KOSOFE LG (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 474772

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 94838

    APC - 36883

    LP - 46554

    NNPP - 902

    PDP - 4058

    VOOTU DỊ IRE - 90374

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 4098

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 94486

    AMUWO ODOFIN (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 325230

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 75489

    APC - 13318

    LP - 55547

    NNPP - 330

    PDP - 2383

    VOOTU DỊ IRE - 73007

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2397

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 75404

    MUSHIN (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 398385

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 72464

    APC - 40876

    LP - 23066

    NNPP - 397

    PDP - 3403

    VOOTU DỊ IRE - 69743

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2683

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 72426

    SURULERE (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 377131

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 85675

    APC - 39002

    LP - 36923

    NNPP - 442

    PDP - 2651

    VOOTU DỊ IRE - 81009

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 4194

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 85203

    ETIOSA (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 369319

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 65855

    APC - 15317

    LP - 42388

    NNPP - 381

    PDP - 3369

    VOOTU DỊ IRE - 62617

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 3152

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 65769

    APAPA (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 112030

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 29363

    APC - 15471

    LP - 7566

    NNPP - 338

    PDP - 2997

    VOOTU DỊ IRE - 27212

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2151

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 29363

    IFAKO IJAYE (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 395371

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 64304

    APC - 30756

    LP - 25437

    NNPP - 232

    PDP - 3258

    VOOTU DỊ IRE - 61506

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 2573

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 64079

    AJEROMI IFELODUN (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 433120

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 78947

    APC - 25938

    LP - 35663

    NNPP - 436

    PDP - 4680

    VOOTU DỊ IRE - 68590

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 4388

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 72978

    OSHODI - ISOLO (LEGỌS STEETI)

    Ndị debanyere aha ha - 461102

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu - 88623

    APC - 27181

    LP - 51020

    NNPP - 414

    PDP - 3139

    VOOTU DỊ IRE - 83376

    VOOTU A GỤPỤRỤ - 4064

    NCHỊKỌTA VOOTU NIILE - 87440

  16. Amalitela ichikọta mpụtara ntuliaka na-aga n'ihu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ugbua, Inec amalitela ịchịkọta mpụtara ntuliaka 2023 n'akụkụ Naịjirịa.

    Legọs, Enugwu, Abakiliki na ọtụtụ steeti ndị ọzọ amalitela nchịkọta vootu ha ugbua.

  17. Eyigharịala ngụkọ vootu ntuliaka Naịjirịa ruo elekere 11 ụtụtụ Mọnde

    Ụlọọrụ Inec malitere ịgụkọ vootu n’abalị dịka ha yigharịrịburu nkpọpụta mpụtara ntuliaka ndị si n’akụkụ Naijịrịa gaa n’elekere isii nke abalị a mana dịka ọha ndị mmadụ gbakọtara, Inec kpọpụtara mpụtara ntuliaka si naanị otu steeti nke bụ Ekiti steeti.

    Inec mechara kwupụta na ha eyigharị ngụkọ na mkpọpụta mpụtara ntuliaka Naịjirịa ruo elekere 11 ụtụtụ Mọnde.

    Inec kwuru na ha na-eme nke n’ihi na ozi ngụkọ vootu dị iche iche si na ọtụtụ steeti ka na-eru ha aka ugbua.

    Ha kwukwara na Ekiti steeti bụ steeti bụ zitere mpụtara ntuliaka si n'ime ọgbọ ntuliaka ebe ahụ.

    Cheta na Inec zipụtara ozi n’abalị Sọnde rịọ ọha ka e nweere ha ndidi n’ihi etu ọba ozi ha ji ekesa mpụtara ntuliaka ‘ka-o-si-aga’ n’akụkụ Naịjirịa si enwee nsogbu.

    Festus Okoye na-ekwuru ụlọọrụ ahụ gwara ọha ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ maka nrụrụaka ọbụla ga-esi n’ime ihe na-eme pụta.

    Okoye kwusiriike ka ọha nwee ntụkwasị obi n'ebe ngwa teknụzụ Inec IRev nakwa Bvas.

    Anyị ga aga n’ihu na-ewetere ozi ngụkọ vootu si steeti dị iche iche ebe a. Chibiri anyị.

  18. Inec akọwala ihe mere ọba mgbasaozi ntuliaka ka-o-si-aga ji enwe nsogbu

    Ụlọọrụ Inec arịọla ọha ka e nweere ha ndidi n’ihi etu ọba ozi ha ji ekesa mpụtara ntuliaka ka-o-si-aga n’akụkụ Naịjirịa si enwee nsogbu.

    Dịka Inec siri kwuo, ha ahazịghị akụkụ azụ websaịtị a kpọrọ Inec Results Viewing Portal (Irev) ka o nweeike nabatanwuo ụdịrị ozi si akụkụ Naịjirịa niile abata ugbua.

    Ha kwuru na oge ha nwalere ya bụ websaịtị bụ oge anaghị eme ntuliaka n’akụkụ Naịjirịa niile nke mere ha jiri aghara ịtụ anya ibu ozi na-abata ugbua ga-ebu. Ya mere na ozi ndịa na-ebuzịma na-anyigbu ọba ozi ha.

    Agbanyeghi nke a, Inec kwuru na ngalaba teknụzụ ha na-ahazighịrị websaịtị ha ngwa ngwa ịhụ na ha wepụrụ nsogbu ahụ.

    Festus Okoye na-ekwuru ụlọọrụ ahụ gwara ọha ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ maka nrụrụaka ọbụla ga-esi n’ime ihe na-eme pụta.

    Okoye kwusiriike ka ọha nwee ntụkwasị obi n’ebe IRev nakwa nkwa Bvas dị.

    Cheta na tupu e mee ntuliaka, Mahmood Yakubu bụ onyeisi ụlọọrụ Inec kwuru ugboro ugboro na ngwaọrụ zuru ka eme n'ọrụ.

  19. Ihe na-eme n'ọgbọ ngụkọ ntuliaka Anambra ugbua., Onye ntaakụkọ BBC awụchiela n'ọgbọ ngụkọ ntuliaka nke Anambra iwetere gị ozi ka ya bụ ihe si aga ngwa ngwa.

    Kọmishọna ntuliaka Anambra steeti bụ Queen-Elizabeth Agwu na ụfọdụ ndị ọrụ nlekọta Inec ndị ọzọ nke abatala n’ọgbọ ngụkọ dị n'ime ụlọọrụ Inec n'Awka, Anambra steeti. A ga-amalite ngụkọ n'oge adịghị anya.

    Ozi vootu si n'akụkụ ọgbọ ntuliaka dị iche iche bụ ndị a tụrụ n'ụbọchị Satọdee ga na-abata n'oge na-adịghị anya.

    Onye ntaakụkọ BBC awụchiela n'ọgbọ ahụ dịka anya ga na-ewetere gị ozi ngwa ngwa ka ya bụ ihe si aga.

  20. A na-eche ka amalite ngụkọ vootu n’Anambra steeti

    A na-eche ka amalite nchịkọta mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjriịa e mere ụnyahụ n’Anambra steeti. Ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ nchekwa agbakọọla n'isi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, (Inec) dị n'Awka.

    Ndị ọrụ Inec steeti ahụ na-ekwu na ha enwetabeghị ozi vootu si n’ọgbọ ntuliaka dị iche iche na steeti ahụ. Ya mere, ha ka na-eche.

    Kọmishọna ntuliaka steeti ahụ bụ Queen-Elizabeth Agwu na ụfọdụ ndị ọrụ nlekọta Inec ndị ọzọ nke abatala n’ọgbọ ngụkọ ahụ ugbua.