Onye
bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan arịọla ndị ọchịchị Nịajirịa ka ha gbaa mbọ chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya ka ọ ghara ịghọ ọchịchị akaike.
Jonathan kwuru nke a n'ọgbakọ Bishop Hassan Kuka jiri mee emume ncheta ọmụmụ afọ iri asaa ya n'ụbọchi Wenezde n'Abuja.
O kwuru na ihe a bụ mgbe onye ọbụla bụ onye ndọrọndọrọ ọchị ji eke nkwucha ịhụ na ọchịchị onye kwuo uche ya agharịpụghị ghọzịa ọchịchị akaike.
O kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ọchịchị kacha mma iji chekwa ma jikọta ọtụtụ agbụrụ dị na Naịjirịa.
Jonathan sị na "o doro anya na ọtụtụ ndị ntorobia enweghịzị okwukwe na ọnọdụ ndorondoro ọchịchị nakwa ọchịchị onyekwuo uche ya na Naịjiria".
"Agbanyeghị nke a, anyị ga-agba mbọ ihu na anyị adapụghị n'ụzọ ọchịchị onye kwuo uche ya maka na ọ bụ ya bụ ọzụ kacha mma, doro anya iji chịkọta Naịjiria".
Ọ sị, "ọ bụrụ na anyị lezie anya na steeti ụfọdụ, anyị ga-ahụ na anyị echipuwala nwa ntịị nwa ntịị na-achọzị ịghọ ọchịchị akaike"
Jonathan kwukwara maka abụbụ ọrụ ndị ASUU na ka gọọmentị ya siri kwụsị ya bụ abụbụ ọrụ a gbara ọnwa anọ n'otu abalị..
Ọ kọwara ka ya na onwe ya na ndị Minista ya nakwa ndị ASUU si nogide ya bụ okwu ala, kpebie ya otu abalị.
Ndị ọzọ bịara ya bụ emume bụ Onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala, bụ Tola Ahmed Tinubu, ndị Gọvanọ nakwa ndị isi otu ndọrọndọrọ ọchịchị.