Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Anwụchịela ndị a sị na-akpọrọ ụmụaka mee ka afọ too ha ma jiri ha na-arịọ arịọrọ n'ụzọ

    Ndị a na-enyo enyo n'okwu a

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Ndị a na-enyo enyo n'okwu a

    Ndị uweojii na Legọs steeti anwụchịela ụmụnwoke anọ a na-enyo enyo maka ebubo na ha na-esi n’ime obodo kpọrọ ụmụaka ma gbajunye ha ọgwụ ga-eme ka afọ ha too nn'afọ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin siri kwuo, ndị a na-eme nke a maka atụmatụ ịkpọgharị ụmụaka ahụ afọ toro n’ihu ọha dịka ndị ahụ adịghị ma jiri ụzọ agụghọ n’aha ụmụaka ndị a na-anapụ ndị mmadu ego enyemaka.

    Hundeyin kọwara na ndị uweojii ka na-eme nnyocha n’okwu a ugbua.

  2. Ebubeagu anọghị n’Oba Anambra Steeti - Onye ndu ndị Oba

    Ndị ndu n'obodo Oba

    Ebe foto si, Soludo TV

    Otu n’ime ndị ndu obodo Oba dị n’Idemili South Anambra Steeti bụ Noel Ezenwa ekwuola na o nweghi ndị Ebubeagu nọ n’obodo ha dị ka akụkọ si na-efegharị.

    O kwuru nke a n’ihi nghọtahie dị n’etiti ndị nchekwa Anambra Vigilante Group (AVG) na ndị ntoroọbịa obodo ha.

    Ezenwa sị n’akụkọ ahụ na-efegharị bụ akụkọ nduhie ma kwuo hoohaa na ndị Ebubeagu anọghị n’obodo ha.

    Kedụ ihe butere okwu?

    Ndị ntoroọbịa Oba

    Ebe foto si, Soludo TV

    Ezenwa sị na nghọtaghie mgbe ndị nchekwa AVG chọrọ ịmapụta onye otu nwoke bụ, ọ bụrụ na onye ahụ bụ onyeisi ndị ntoroọbịa.

    Mana n’ihi enweghi ezigbo nzirita ozi n’etiti ndị a mere ka nghọtahie dị kama na udo ewerela ọnọdụ ugbua.

    Ọ gakwara n’ihi kelee aka na-achị Anambra bụ Chukwuma Soludo maka iwete nchekwa n’obodo.

    Tony Collins, Kọmishọna na-ahụ maka ndị eze ọdịnala

    Ebe foto si, Soludo TV

    N’aka nke ọzọ, Kọmishọna na-ahụ maka ndị eze ọdịnala bụ Tony Collins sị na mgbe na-adịghị ha gọọmentị ga-ehiwe ndị ọrụ nchekwa AVG n’ime obodo dị iche iche.

    Cheta na ụbọchị ole na ole gara aga akụkọ pụtara kwuru na ndị ntoroọbịa Oba nọ na-ekwu na ha achọghị Ebubeagu mgbe ndị AVG bịara inwuchi mmadụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na nke ahụ bụ nghọtahie dị n’etiti ndị ntoroọbịa na ndị ọrụ nchekwa AVG.

  3. Ndị a ekweghị ịbata Dubai ejighị akwụkwọ njem ziri ezi - Gọọmentị Naijirịa

    Ndị Naijirịa si ofesi abata

    Ebe foto si, Abike Dasbiri/Twitter

    Ụlọọrụ nnọchiteanya Naijirịa na Dubai ekwuola na ihe onyonyo na-egosi ndị Naijirịa tọrọ n’ọdọ ụgbọelu Dubai bụ ndị ji akwụkwọ nkem na-ezịghị ezị egbochiri ịbata mba ahụ.

    N'Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ngalaba na-ahụ maka mmekọ Naijirịa na mba ndị ọzọ bụ Fransisca Omayuli wepụtara ka o kwuru na ndị a ji akwụkwọ njem nke ezịnụlọ ebe ọ bụghị ha na ezinụlọ ha so abịa.

  4. Ikpe nrụrụaka amaghị Jonah Jang - Ụlọikpe

    Hama eji ekpebi ikpe

    Ụlọikpe ukwu nke Plateau steeti akụpụla ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra isii na ụma ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka ego bụ EFCC n'ịchafụ gbara n'isi Jonah Jang onye bụbu gọvanọ Plateau steeti.

    Ọkaikpe bụ Christen Dabup kwuru na ikpe amaghị Jang ebe EFCC na-ekwu na ha ga-eme mkpesa maka mpụtara ya bụ ikpe.

    Ụlọịkpe akụpụkwara akwụkwọ agbara n'isi onye na-ahụ maka njịkọ ego n'ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị Plateau steeti bụ YUsuf Pam bụ onye eboro ya na Jang ebubo a.

  5. Ụnụ abọọla chi

    Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  6. Ndị uweojii Ebonyi steeti anwụchiela nwoke na-awakpokarị ụmụnwaanyị

    Nwoke ahụ eboro ebubo

    Ebe foto si, Ebonyi state Police

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha anwụchiela otu nwoke a ma ama ka onye na-awakpokarị ụmụnwaanyị na steeti ahụ.

    Ha kọwara na ọ gara n'ubi ebe otu nwaanyị na-arụ ọrụ siri n'azụ wakpoo ya ma napụkwa ya ekwentí ya.

    Mgbe nwaanyị ahụ tiwere mkpu, nwoke ahụ gbapụru ọsọ ma mabanye n'ime mmiri dị nso n'ebe ahụ mana ndị uweojii gụpụtara ya n'ime mmiri ahụ ma nwuchie ya.

    A kpọọrọ nwaanyị ahụ nyochaa ya ahụ ma chọpụta n'ezsie na nwoke ahụ wakporo ya.

    Akpụkpula ya ụlọikpe ugbua ikpe ya ikpe dịka ndị uwoejii si kwuo.

  7. Ntuliaka Kenya 2022: E mere wuru wuru n’usoro ntuliaka a dịka Odinga si ekwu?

    William Ruto onye akpọpụtara dịka onye mmeri na ntuliaka ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, William Ruto onye akpọpụtara dịka onye mmeri na ntuliaka ahụ.

    A kpọpụtara aha William Ruto dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Kenya e mere n’ọnwa Ọgọst dịka e kwuru na ọ nwetara vootu pasentị 50.5 mana Raila Odinga so zọọ ọkwa ahụ enweghị na mpụtara ntuliaka dịka o na-ebo ebubo wuru wuru na ya.

    Okaiwu Odinga boro ebubo na n’ọgbọ ntuliaka 40 e mere ntuliaka ahụ na akpara ngọkọ vootu ebe ahụ aka ime ka Ruto nweta vootu gafere pasentị 50 nke mere o jiri merie.

    Na mba Kenya, atụchapụ vootu ma mecha ngụkọ, onye nlekọta ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka ọbụla ga-akpọtara ọha ndị mmadụ ebe ahụ mpụtara ntuliaka ma debanye ya n’ime akwụkwọ a na-akpọ Form 34A.

    Ndị nnọchịteanya pati dị icheiche ga-ebinye aka n’akwụkwọ ahụ tupu ezigara ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka ya bụ site na teknuzu.

    BBC mere nnyocha ima ma akwụkwọ ndị ezigaara ụlọọrụ ntuliaka na nke ndị nnọchiteanya binyereaka ma ha na-ekwu otu ihe.

    A kpọturu ndị nnọchịteanya mmadụ 23 nke gụnyere mmadụ isii ndị otu Odinga. Ha zitere foto 21 n’ime 41.

    Nchọpụta BBC gosiri na ihe e dere n’akwụkwọ ndị nke BBC hụrụ nakwa ihe ụlọọrụ ntuliaka mba ahụ kpọpụtara bụ otu nke bụ na-ahụghị wuru wuru ọbụla n’ime ha.

    Ebumnobi BBC n’akụkọ a bụ ịchọ ihe akaebe ga-egosi mgbadoụwkụ n’ebubo Odinga mana anyị enweghị ike ịhụ nke ọbụla.

    Anyị agakwurula ndị otu Odinga ka ha weta akwụkwọ ga-egosipụta kpọm kwem a na-ebo ebubo ha na-ebo bụ eziokwu mana o nwebeghị nke na-wepụtarala.

    Ụlọikpe Kasị Elu nke Kenya ga-ekpebi akwụkwọ mkpesa ebubo Odinga n’ụbọchị ndị na-abịa abịa.

    Lee ụfọdụ akwụkwọ BBC hụrụ nakwa ndị anyị natarala.

    Akwụkwọ ndị BBC hụrụ nakwa ndị anyị natara nke gosiri na enweghị ihe dị iche n'ihe ụlọọrụ ntuliaka kpụpụtara.
    Nkọwa foto, Akwụkwọ ndị BBC hụrụ nakwa ndị anyị natara nke gosiri na enweghị ihe dị iche n'ihe ụlọọrụ ntuliaka kpụpụtara.
    Akwụkwọ ndị BBC hụrụ nakwa ndị anyị natara nke gosiri na enweghị ihe dị iche n'ihe ụlọọrụ ntuliaka kpụpụtara.
    Nkọwa foto, Akwụkwọ ndị BBC hụrụ nakwa ndị anyị natara nke gosiri na enweghị ihe dị iche n'ihe ụlọọrụ ntuliaka kpụpụtara.
  8. Ọ fọrọ obere ihe ka a gbagbuo osote Onyeisiala mba Argentina

    Cristina Fernandez de Kirchner

    Ebe foto si, Reuters

    Osote onyeisiala mba Argentina agbalahụla ọnwụ mgbe egbe otu nwoke chọrọ iji agbagbuola kuchiri ma jụụ ịgba.

    Cristina Fernandez de Kirchner nọ na-ekele ndị mmadụ n’ihu ezi ọlụ ya mgbe nwoke ahụ si n’igwe mmadụ pụta ma tụọ ya egbe n’ihu.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Alberto Fernandez sị na egbe ahụ nwere mgbọ ise nọ n’ime ya mana ọ jụrụ ịgba.

    Cristina Fernandez sị n’ụlọikpe na-alọta ebe ọ gara zara ọnụ ya maka ebubo ime mpụ ego.

    Ndị uweojii sị na nwoke ahụ gbara afọ iri atọ na ise bụ onye mba Brazil, mana ha nwuchiela ya ugbua.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Wike sị na ya ga-enyere Iyorcha Ayu, onyeisi pati PDP aka kwatuo pati ha na ntuliaka 2023

    Nyesom Wike

    Ebe foto si, Wike

    Ebe Iyorchia Ayu ekwuola hoohaa na ya achọghị ka PDP merie na ntuliaka a na-abịanụ, anyị ga-enyere ya aka.

    Ọ bụ Nyesom Wike, Gọvanọ River steeti mgbe ọ na-azaghachị Ayu bụ onyeisi pati ha ihe ọ gwara ya sị na ndị na-achọ ichụpụ ya n'ọkwa bụụmụazị.

    Wike kwuru nke a mgbe ọ mepere ụzọ ọhụrụ Omerelu dị n'Okpuruọọchịchị Ikwerre dị na Rivers State.

    Ubochi Tuzde ka Ayu nọ na BBC Hausa kwuo na ndị niile na-akpa nkata ịchụpu ya n'ọkwa bụ ụmaaka na-amaghị ka pati ha bụ PDP si ahazi onwe ha.

    Otu n'ime nna Pati ahụ bụ Bode George nọkwa n'otu aka ahụ kwado Wike sị na ha ga-ahụ na Wike ga-apụ dịka onyeisi otu PDP tupu amalite ịchụ nta vootu na ngwụcha ọnwa Septemba.

  10. Nigeria Customs Services ajụọla NNPC ajụjụ enweghị ọsịsa

    Hameed Ali

    Ebe foto si, Nigeria Custom Services?Facebook

    Hammed Ali bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mbubata ngwa ahịa na Naịjirịa bụ Custom akatọọla ihe ụlọọrụ mmanụ agbịdị bụ NNPC kwuru na ndị Naịjirịa na-emefu mmanụụgbọala nde lita iri isii kwa ụbọchị.

    Ali jụrụ sị ebe ọ bụ ha NNPC na-ebubata mmanụ ụgbọala nde lita iri itoolu na asatọ site na mba ofesi ebe ha kwuru na ha (NNPC) ndị Naịjirịa anaghị ego karịa lita puku iri isii kwa ụbọchị, kedụzie mmanụ ụgbọala nke fọrọ afọ na-aga?

    O kwuru nke a na-ọgbakọ ajụjụ ọnụ ndị komitii na-ahụ maka okwu ego kpokobara maka ịhazị akwụkwọ mkpata na mmefu akụ Bekee kpọrọ "Medium Term Expenditure Framework" (2023 – 2025) n'Abuja.

    Ali sị na ọ bụghị ịzụ ahịa iwe mmanụ ụgbọala mere ego nkwado 'subsidy' ji arị elu.

  11. Igbo ndị ọma anyị ekelee unu

    Obi ọma na nke dị ọcha ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Bịa soro anyị n'ọgbakọ anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa ụwa niile.

  12. Lee etu esiri lie onye ọrụ INEC ndị omekome gburu n'Imo Steeti

    Ọkwa olili

    Ebe foto si, INEC/Facebook

    Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijirịa bụ Independent National Electoral Commission bụ INEC n'ịchafụ ewepụtala ozi maka olili onye otu ha bụ Anthony Nwokorie bụ onye ndị omekome gburu n'ụbọchị 14 nke ọnwa Aprel afọ 2022.

    Ọ bụ dịka Nwokorie na-arụ ọrụ ya idebanye aha ndị mmadụ maka ntuliaka ka ndị omekome bịara wakpo ebe ha nọ ma gbuo ya na Nkwo-Ihitte, dị n'Ihitte Uboma, Imo State.

    Nke a mere ka INEC kwụsị ịdebanye aha ndị ntuliaka n'okpuru ọchịchị Ihitte Uboma.

    Ụlọọrụ INEC kwuru na n'afọ 2019, awakporo ụlọọrụ ha ugboro iri anọ na otu.

    Akpati ozu

    Ebe foto si, INEC/Facebook

    Onye bịara olili

    Ebe foto si, INEC/Facebook

    Ndị bịara olili

    Ebe foto si, INEC/Facebook

    Onye na-ekwu okwu n'Olili

    Ebe foto si, INEC/Facebook

  13. Ndị Uweojii si na ha anwuchiela onye ntọ bepụrụ Ọkaikpe Ikechukwu Francis Okoroji isi na 2020

    Ndi ejidere

    Ebe foto si, Imo State Police

    Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ha anwuchiela onye ha sị bụ onye ntọ ha na-achọ achọ n'ọhịa dị n'obodo Ohuba dị n'okpuruọchịchị Ohaji Egbema dị N'Imo Steeti.

    Ọ bụ Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Steeti ahụ kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọdepụtara n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2022.

    Ọ kwuru sị," Ndị uweojii n'ụbọchị 29/08/2022 n'elekere iri na abụọ wakporo ebe ndị omekome a nọ".

    O kọwara sị, " Mgbe ndị omekome a hụrụ ndị uweojii, ha gbasoro ha egbe kama ike ndị uweojii karịrị nke ha nke mere ka a nwuchie Amarachi Amadai eji 'Ishiegburumma' mara, ọ bụ onyeisi otu ndị ntọ ma bụrụkwa onye ndị uweojii na-achọ achọ".

    O kwuru na ndị otu ya ndi ọzọ gbara ọsọ gbaba ọhịa ebe Amadi bu onya mgbọ egbe n'ahụ ya.

    Ọ dere sị, " Ndị uweojii tọhapụrụ otu nwoke ndị ntọ a tọọrọ ma kee ya agbụ ma napụtakwa ha akụrụngwa di iche iche".

    Ihe ndị uweojii sị ha napụtara ndị ntọ a gụnyere :

    • Egbe otu ọnụ na mgbọ egbe isii
    • Egbe ọka nwere ọnụ abụọ
    • Ụgbọala Bus bu akara WER 04 XB
    • otu ọbere mma agha
    • Kaadị ATM
    • Ihe echere bụ Igbo
    • Ọgwụ ọdịnala
    • Ekwentị atọ
    • Kaadị Airtel
    • ụdọ ha ji eke ndị ha jidere.

    Abattam kwuru na mgbe ha gbara onye a ha sị bụ onyeisi ndị ntọ ajụjụ ọnụ ka o kwuru na ọ tọrọla ọtụtụ mmadụ, kama ọ chetara mmadụ asaa ma kwuo kwa na ha bepụrụ Ọkaikpe Ikechukwu Framcis Okoroji isi n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 2020.

    Abattam kwuru na ọ bụ ama Amadi gbara mere ha jiri nwuchie Oriaku Lucky na Peace Victor Sunday maka nyocha ha.

  14. Mbọ ndị ọzọ a na-agba iweta abụbụ ọrụ ASUU na ngwụcha

    ASUU na ndị gọọmentị

    Ebe foto si, ASUU

    Otu jikọrọ ndị nkuzi Mahadum bụ ASUU n'ịchafụ sị na ha dị njikere ịnabata ịkparịta ụka ha na otu kpọrọ onwe ha Progressive Governors.

    Ndị otu a nke Abubakar Bagudu nke Kebbi steeti nọ n'isi ya sị na ha chọrọ ịbanye na ya bụ mkparịtaụka ihu na ha kpebiri esemokwu gọọmentị etiti na ndị ASUU.

    Ka nke a na-eme, gọọmentị etiti akpọọa ọgbakọ ndị isi Mahadum; Vice Chancellor and Pro-chancellor ka ha bịa tinye ọnụ na ya bụ okwu gbasara ASUU na ndị gọọmentị.

    Ya bụ gbakọ nke National University Commission kpọrọ ga-abụ n'ụbọchị isii nke ọnwe September 2022.

  15. UN enyopuola China maka ndị ha sị na a kpagburu

    Uyghur

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọgbakọ United Nations ebola China Ebubo site na nchọpụta ha mere na ọ dịka China akpagburu ndịụka Alakụba agburu kacha nta n'ezie na mpaghara Xinjiang.

    UN agwala China ka ha tọhapụ ndị niile ha ji ebe ahụ ma kwuo na agwa ọjọọ a megidere ikeke dịịrị onye.

    Chine rịọburu UN ka ha ghara ịwepụta ya bụ akwụkwọ nchọpụta maka na ha na-atụ egwu n'aka ndị ọcha dị na ya.

    China agọkwara aka na ukwu na aka na ha emeghị ihe dị otu ahụ.

    UN kwuru na e nwere ihe akaebe na China na-emekpa ndị okpukpere chi Alakuba ndị Uyghur n'ụdị megidere ikeke dịara onye.

    Ya bụ akwụkwọ chọpụta pụtara n'ụbọchị ikpeazụ nke Michelle Bachelet dịka ọ rugoro ka onyeisi na-ahụ maka ikike dịara onye na UN. Bachelet enweela ọtụtụ mkpesa gbasara ndị Uyghur.

  16. Etu e si nwụchie nwoke bụbụ onye agha na-ebunye ndị ‘Bandits’ ngwa ọgụ na Zamfara

    Ndị omekome na-ebu egbe na-akpa ike na Zamfara steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii na Zamfara steeti awụchiela otu nwoke bụbụ onye agha Naịjirịa dịka ọ na-aga ibunye ndị omekome ‘bandits’ egbe na ngwa ọgụ ndị ọzọ.

    Ozi ndị uweojii kwuru na nwoke a na-enyo nọ n’isi mwakpo ndị na-aga n’ihu n’akụkụ Niger, Kaduna, Katsina, Kebbi, na Kaduna steeti.

    Ha kwuru na ya bụ nwoke gbara arụkwaghịm n’ọrụ ịbụ onye agha Naịjirịa n’afọ 2021 mana ọ gara n’ihu na-ebunye ndị omekome ‘bandits’ na-akpa mkpa mkpa na steeti ahụ ngwa ọgụ.

    Dịka ọnụ na-ekwureu ndị uweojii steeti ahụ bụ Mohammed Shehu siri kwuo, a nwụchiri ya n’okporoụzọ Kaduna/Abuja nke gawara Zamfara steeti dịka ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ nchekwa ha ebe ahụ.

    Cheta na Zamfara steeti so na akụkụ Naịjirịa ebe ndị omekome ‘Bandits’ na-akpa ike dịka akụkọ mwakpo, ntọrọ nakwa ogbugbu ndị mmadụ na-arị elu ebe ahụ.

  17. Etu Goodluck Ebele Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa si kwusi abụbụ ọrụ ndị ASUU n'ọchịchị ya

    Goodluck Ebele Jonathan

    Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Twitter

    Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan arịọla ndị ọchịchị Nịajirịa ka ha gbaa mbọ chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya ka ọ ghara ịghọ ọchịchị akaike.

    Jonathan kwuru nke a n'ọgbakọ Bishop Hassan Kuka jiri mee emume ncheta ọmụmụ afọ iri asaa ya n'ụbọchi Wenezde n'Abuja.

    O kwuru na ihe a bụ mgbe onye ọbụla bụ onye ndọrọndọrọ ọchị ji eke nkwucha ịhụ na ọchịchị onye kwuo uche ya agharịpụghị ghọzịa ọchịchị akaike.

    O kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ọchịchị kacha mma iji chekwa ma jikọta ọtụtụ agbụrụ dị na Naịjirịa.

    Jonathan sị na "o doro anya na ọtụtụ ndị ntorobia enweghịzị okwukwe na ọnọdụ ndorondoro ọchịchị nakwa ọchịchị onyekwuo uche ya na Naịjiria".

    "Agbanyeghị nke a, anyị ga-agba mbọ ihu na anyị adapụghị n'ụzọ ọchịchị onye kwuo uche ya maka na ọ bụ ya bụ ọzụ kacha mma, doro anya iji chịkọta Naịjiria".

    Ọ sị, "ọ bụrụ na anyị lezie anya na steeti ụfọdụ, anyị ga-ahụ na anyị echipuwala nwa ntịị nwa ntịị na-achọzị ịghọ ọchịchị akaike"

    Jonathan kwukwara maka abụbụ ọrụ ndị ASUU na ka gọọmentị ya siri kwụsị ya bụ abụbụ ọrụ a gbara ọnwa anọ n'otu abalị..

    Ọ kọwara ka ya na onwe ya na ndị Minista ya nakwa ndị ASUU si nogide ya bụ okwu ala, kpebie ya otu abalị.

    Ndị ọzọ bịara ya bụ emume bụ Onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala, bụ Tola Ahmed Tinubu, ndị Gọvanọ nakwa ndị isi otu ndọrọndọrọ ọchịchị.

  18. Sunday Igboho etinyela ọnụ n'ikpe ya ụlọikpe kagburu

    Sunday Igboho

    Onye kpokọbara otu ndị Yoroba na-achọ mmwereonwe ha akpọrọ 'Yoroba Nation' bụ Sunday Igboho ekwuola okwu dịka ndị ọrụ nchekwa DSS meriri ya n'ụlọikpe.

    Igboho kwuru na ya bụ mkpebi atụghị ya n'anya ma ncha ma kwuo na o nweghi ihe ọ ga-eme n'abụghị ịnabata ya bụ mkpebi.

    Cheta na ụlọikpe tupụrụ akwụkwọ ọ gbara ụlọorụ nchekwa bụ DSS maka ihe ndị ha mebiri mgbe ha wakporo be ya na Jụlaị afọ 2021.

    O kwuru ka akwụọ ya ijeri naira nari ise (₦500bn) mana ụlọikpe ukwu mechara nye ya ₦20bn tupu ụlọikpe Mkpesa dị n'Oyo steeti atụpụ ikpe ya.

    Ọnụ na-ekwuru Igboho bụ Yomi Aliyu kwuru na ha abịabeghi na njedebe okwu ahụ ma gwa ndị mmadụ ka ha nwee ndidi.

    "Anyị ka nwere ọtụtụ ikpe dị icheiche n'ọdịnihu anyi...anyị ga-agabiga ha niile" ka o kwuru.

  19. Emirates ebidola ime njem gaa Legọs ọzọ

    Ụgbọelu

    Ebe foto si, Emirates/IG

    Ụlọọrụ ụgbọelu Emirates ebidola ime njem gaa Legọs steeti ọzọ.

    Ọ bụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Sepụtemba ka ha ga-ebido.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Emirates kwụsịrịime njem na Naijirịa dịka ha si na gọọmentị Naijirịa ekweghị ha wepụta ego ha tọọrọ na Naijirịa.

    Cheta na gọọmentị naijirịa nyere Emirates ohere ka ha were nde dọla narị abụọ na iri isii na ise bụ nke ha nọ n'aka gọọmentị Naijirịa.

  20. Oscar Pistorius a mara ikpe ma tụọ nga afọ 13 chọziri ka a tọhapụ ya ọsịsọ.

    Oscar Pistorius

    Ebe foto si, Reuters

    Onye bụbu onye egwuregwu ndị nwere nkwarụ na Saụt Afrịka bụ Oscar Pistorius a mara ikpe ma tụọ nga chọrọ a tọhapụ ya ọsịsọ.

    A tụrụ nwamadị a nga afọ iri na atọ maka igbu enyi ya nwaanyị n’afọ 2013.

    Pistorius ji egbe gbagbuo Reeve Steenkamp site na mpịọ dị n’ụzọ ụlọmposi, ma sị na o cheere ma ọ bụ onye ohi.

    Ugbua ọ chọrọ ka a tọhapụ ya maka nghọtaghie mgbe ikpe a mara ya malitere.

    Ọtụtụ ikpe mkpegharị nke ụlọikpe kachasị na Saụt Afrịka kpere butere nghọtaghie banyere oge ikpe a mara ya malitere.

    Pistorius sị na ọ nọ teela aka n’ụlọ nga nke bụ na e kwesịla ịtọhapụ ya nwa mgbe nta cherezie oge ikpe a mara ya ga-ebie ma ọ bụrụ ọ kpaa ezigbo agwa.

    N’afọ 2017, ụlọikpe sị na ọ ga-anọ na nga afọ iri na atọ na ọnwa ise maka igbu Steenkamp – nke kpagharịrị nga afọ isii e nyeburu ya.

    Ụlọikpe sị ka nke a malite n’afọ 2014 bụ mgbe a mara ikpe nke mbụ ahụ, ugbua Pistorius sị na ọ bụrụ etu ahụ na oge ntọhapụ ya nwa mgbe nta kwesịrị ịbụ n’ọnwa Febụwarị afọ gara aga.