You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Fifa enyela Russia iwu ka ha hapụ ịgụ egwu mba ha maọbụ fee ọkọlọtọ mba ha n’asọmpị, Ọtụtụ otu nakwa mba na-enye mba Russia mmachị dị ịcheịche maka etu ha si wakpoo mba Ukraine

    Otu na-ahụ maka nhazi egwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fédération Internationale de Football Association (Fifa) enyela mba Russia iwu ka hapụ ife ọkọlọ mba ha n’asọmpị ọbụla ha ga-esonye ma hapụ ịgụ egwu njirimara mba ha n’asọmpị ọbụla.

    Nke a na-abịa dịka mba Russia na-awakpo mba Ukraine.

    Dịka ọtụtụ mba na-agbatara Ukraine ọsọ enyemaka ma na-akatọ mwakpo a, ụfọdụ n’ime ha ekwuola na ha na mba Russia agaghị agbakọ asọmpị ọbụla ruo oge Russia kwụsịrị ịwakpo mba Ukraine.

    Mba ndị mere mkpebi a gụnyere mba England, Poland, Czech Republic na Sweden.

    Nke a na-abịa dịka Fifa hibere ka mba Poland maọbụ Czech Republic maọbụkwanụ Sweden zute Russia n’Iko mba ụwa nke 2022 n’ọnwa Maachị ma otu n’ime ha tozuo.

    Onyeisi otu na-ahazị egwu bọọlụ na mba Poland bụ Cezary Kulesza akatọọla mkpebi Fife na-ekwu:

    “Anyị ka kwụ be anyị kwụ, mba anyị na mba Russia agaghi agbakọ asọmpị ọbụla etu ọbụla esikwa hibe ha”

    Fifa ekwuola na ha na-enwe mkparịtaụka ime ụlọ ugbua ima ma ha aga-achụpụ Russia na ya bụ Asọmpị.

  2. Onyeisala Putin agwala ndị agha mba ya ka ha nọrọ ngwaagha “Nuclear weapon” ha nso, Ndị agha mba Russia anatala ozi pụrụiche n'aka Putin maka etu ha ga-esi buso otu Nato agha ma awakpoo ha

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin agwala ndị agha mba ahụ ka ha kee nkwụcha ma nọrọ ngwaagha pụrụiche eji akpa ike akpọrọ “Nuclear force” nso maka iji ya bọọ ọbọ ma otu Nato nwaa wakpoo ha.

    Agbenyeghi na nke abụghị na Russia ga-eji ya bụ ngwaagha na nso nso a, ndị isi mba Amerịka akatọọla atụmatụ dịka ha kwuru na “ha anabataghị agwa a cha cha” ebe onyeisi otu Nato kwuru na agwaa “dị oke egwu” ma gaa n’ihu kwuo “agwa a ezighi ezi ma ncha”

    Nke a na-abịa dịka ụwa chi obi n’aka n’ọgbaghara nọ n’etiti mba Russia na mba Ukraine.

  3. Mba ndị EU ga-amalitela ibugara mba Ukraine ngwaagha, European Union emela ihe ha emetubeghi na mbụ nye mba Ukraine

    Otu jikọrọ ọtụtụ mba n’Europe a na-akpọ European Union (EU) agbatarala mba Ukraine ọsọ enyemaka dịka ha kwuru n’ụbọchị Sọnde na ha ga-ebugara Ukraine ngwaagha dịka mba Russia na-awakpo ha.

    Nke a bụ mbụ EU ga-eme ihe dị etu a kamgbe ụwa.

    Ursula von der Leyen bụ Onyeisi ngalaba Europen Comission gwara ndị ntaakụkọ na mkpebị a bụ ihe ha emetubeghi na mbụ.

    O kwukwara na EU ga-enye mba Russia na ogbo ha bụ mba Belarus ọtụtụ ntaramahụhụ nke gụnyere na ụgbọelu mba Russia efeghari na mpaghara Europe niile.

  4. Ihe kariri mmadụ 100,000 apụtala mee ngagharịiwe na Berlin na-ekwu ka Russia kwụsị iwakpo Ukraine, Igwe mmadụ na mba ndị nọ n'Europe na-egosi nkwado ha nye Ukraine dịka Russia na-awakpo ha

    Dịka Russia na-awakpo mba Ukraine, ọtụtụ mba na-akwudoro Ukraine ugbua.

    Ndị uweojii mba Germany ekwuola na ihe kariri mmadụ 100,000 pụtara n’isiobodo mba Germany bụ Berlin mee ngagharịiwe n’ụbọchi Sọnde dịka ha na-akatọ mwakpo a Russia na-eme.

    E kwuru na ọtụtụ ndị pụtara yi akwa agwa ya na-acha ka ọkọlọtọ mba Ukraine iji gosi nkwado ha nye mba Ukraine.

  5. Zelensky na ogbo ya nke Belarus enweela mkparịtaụka

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na ogbu ya nke Belarus bụ Alexander Lukashenko enweela mkparịtaụka mana anyị amabeghị ihe ha kpatara.

    Cheta na Rọshịa akpọbuola Ukraine ikpe ma Belaru.

    Ndị nọchiteanya ndị Rọshịa eruolarị Belarus mana Ukraine juru ahụ sị na Minsk kara ịkara ha mma maka ụdị ọgbakọ ahụ ma ọbụrụ na Rọshịa awakpoghị ha.

    Ọ sị na akpọ ya ya bụ ikpe ebe ọzọ na ya ga-aza.

  6. Ndị Ukraine azọpụtala Kharkiv n'aka Rọshịa

    Ndị agha Ukraine azọpụtala obodo Kharkiv bụ nke Rọshịa napụtara ha, dịka Gọvanọ steeti ahụ si kwuo.

    Ya bụ Gọvanọ bụ Oleh Synyehubov dere n'ọba nzikọrịta ozi Telegram sị "ọchịchị Kharkiv alọhachiela anyị n'aka kpam kpam".

    "Ndị agha, ndị uweojii na-agbambọ ịhụ na-ekpochapụrụ ndị iro".

    N'abalị ụnyaahụ bụ Satọde ka ndị agha Rọshịa wakporo ya bụ steeti bụ nke abụọ kacha ibu na mba ahụ.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ebe ndị agha Ukraine na nke ndị Rọshịa na-akwakọrịta mgbe n'ime obodo ahụ.

    Nke bụ eziokwu bụ na ọ dịchaghị nfe ịkọwa ka ọgụ akwụsịtụla n'ime ogbe mana ndị mmadụ sị na ọkwụsịtụla na Kharkiv, na ọchịchị alọhachila n'aka ndị nwe obodo.

  7. Ukraine agbaala Rọshịa akwụkwọ n'ụlọikpe mbaụwa maka enyemaka

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky sị na ha agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe mbaụwa ka Rọshịa haa ha aka ozugbo ozugbo.

    Ọ rịọrọ ndị ọkaipe ụlọikpe ahụ ka ha mee ka Moscow kwusị ya bụ mnwakpo ọ na-awakpo Ukraine.

    Ọrụ ya bụ ụlọikpe nọ na Hague bụ ịnyocha ma chọpụta ma mba ụwa a na-esokwa iwu ha hibere ka o kwesiri.

    Ya bụ ụlọikpe enweghị ikike ịma ndị mbaụwa ikpe ọchụ

  8. A machiela ụlọọrụ ntaakụkọ mba Rọshịa itinye ihe na YouTube

    Ndị nwe YouTube bụ Alphabet ekwuola na ha agaghịzị akwụ ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Rọshịa na-etinye ihe onyonyo n'ọbaozi ha ụgwọ.

    Nke a pụtara na ụlọọrụ dịka Russia Today (RT) na chanelu ndị ọzọ agbaghịzị enweta ego maka ọkwa ha na-etinye na YouTube maọbụ Google.

    Ha kwukwara na ụlọọrụ ndị a ọ bụ gọomentị Rọshịa nwe agaghịzị etinye ozi maọbụ ọkwa azụmahịa na Google maọbụ akụrụngwa mgbasaozi ha ndị ọzọ.

    Ọ na-ekwuru ha sị na ya bụ ihe a ha chọrọ ime bụ n'ihi "ọnọdụ tara oke akpụ" ma kwukwaa na Alphabet "nwekwaraike ime ihe ndị ọzọ mgbe oge ya ruru".

    Nke a na-abịa dịka Minista na-ahụ maka ụzọ ọgbaraọhụru nzikọrịta ọzi bụ Mykhailo Fedorov sị na ya gwara YouTube ka ha machie akụkọ Okokondem Rọshịa ji ebuso Ukraine agha. (Okokondem bụ nwaamadị rụrụ na Radio Biafra na-agbasara ha ozi "Propaganda" mgbe agha).

    Ụlọọrụ ntaakụkọ gọomentị Rọshịa bụ RT na-enweta ego dị nde kwuru nde na'aka YouTube na Google maka ozi ha ji ya agbasa.

    Facebook and Twitter amachielaarị Rọshịa kemgbe.

    Ha anaghịzị enweta ya bụ ọbamgbasa ozi ka ọ dị na mbụ.

  9. 'Agha a dị oke mkpa na ndụ Uropu' - Minista ndị agha Ukraine

    Mịnista ndị agha mba Ukraine bụ Oleksiy Reznikov ekwuola na agha ha na-esuso mba Rọshịa ugbua dị ọke mkpa maka ọdịnihụ mba Urope.

    Reznikov bụ onye depụtara nke a n'ọba nzikọrịta ọzị Facebook ji ohere ahụ na-agba ụmụ Ukraine niile pụtara ibuso Rọshị agha ume.

    Ọ sị na "ịlegharịa anya ebe niile, egwu apụọla ọtụtụ n'anya bụ ndị pụtara ibuso Kremlin agha".

    O turu ọnụ sị, "olee ndị ahụ niile sị na ha ga-anwụchị Kyiv n'otu abalị? Ha gbachaala ọsọ".

    Ọ sị na ọ bụ eziokwu na ọgbatauhie ka dị, mana ndị mbaụwa mụanya na-ekiri ka o sị aga, " ya bụ enyemaka e chere na ọ gaghị abịa abalị atọ gara aga amalitela ịbata".

    Ọ kwuru na, "ọ bụru na ọbụghị ndị agha anyị na ndị be anyị, Uropu enweghị olileanya".

  10. Unu asaalachi e! Ndụ mmiri ndụ azụ. Taa bụ Orie. Orie biko nwtere anyị ihe ọma oo! Iseee!

  11. Germany ekwela nkwa izigara Ukraine ọtụtụ ngwa agha, Ọtụtụ mba n'Europe agbatarala Ukraine ọsọ enyemaka dịka Russia na-awakpoo ha nke gụnyere Germany

    Mba Germany ga-ezigara Ukraine ngwa agha pụrụiche a na-agaghi awakponwụ na mfe ruru 1000 nakwa ụgbọelụ agha pụrụiche ruru 500 dịka gọọmenti ha si kwuo.

    Mkpebi a gosipụtara nnukwu mgbanwe n’iwu machịrị iziga ngwa aga na mba nakwa mpaghara ebe agha na-ada.

    Onyeisiala ha bụ Olof Scholz kwuru na ha ga-adọnyere Ukraine ukwu etu ọbụla ha nwere ike ya.

    N’okwu ya ọ sị:

    "N'ọnọdụ a, ọ bụ ọrụ anyị ịkwado mba Ukraine ruo ike anyị dịka anyị na-adọnyere ha ukwu na-ichekwawa onye ha n’aka ndị agha onyeisiala Vladimir Putin na-awakpo,"

  12. Ihe kariri mmadụ 115,000 na-agba ọsọ ndụ ha n'Ukraine agbabala mba Poland, Ụjọ ji ndị bi n'Ukraine dịka ọtụtụ na-agbapụ izere ọnwụ n'aka mwakpo ndị agha Russia

    Pawel Szefernaker bụ minista na-ahụ maka mba na mba na Poland ekwuola na ihe kariri otu nari puku bụ ndị na-agba ọsọ ndụ ha maka agha na-ada n’Ukraine agbabatala mba ha kamgbe mwakpo mba Russia na-eme na Ukraine malitere.

    Szefernaker kwuru na mmadụ puku iri na ise gbabatara mba ha na naanị awa anọ.

    Poland bụ otu mba ndị agbataobi Ukraine, ya mere ndị mmadụ ji agbaba ebe ahụ maka izere ọnwụ maọbụ mwakpo n'aka ndị agha Russia ugbua.

  13. Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla dịka ogbunigwe tụrụ otu ụlọ na Kyiv, Ndị agha Russia ka na-agba mbọ iwakposi Kyiv bụ isi obodo mba Ukraine n'ike

    Mwakpo ka na-aga n’ihu n’isiobodo Ukraine bụ Kyiv nke a bụ dịka ogbunigwe ndị agha mba Russia dara ebe ahụ ma tụọ otu ụlọ dị nso ọdụ ụgbọelu Zhuliany nke Kyiv n'isi ụtụtụ Satọde.

    Ihe onyonyo na foto esere ebe ahụ na-egosi na ogbunigwe a tụrụ n’ụlọ ahụ mebere akụkụ ụlọ ahụ ma gbawaa ogogo ihe ruru ise n’ụlọ ahụ.

    Gọọmentị mba ahụ ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe a mere, ebe ndị ọrụ gbatagbata kwuru na mmadụ isii merụrụ ezigbo ahụ.

    E kwuru n’ụbọchị Satọdee na e nwere oge ọgụ dara n'okporoụzọ Ukraine dịka ndị agha Rọshịa nwara iwakpoo ndị agha obodo ahụ, mana atụmatụ abịaghị na mmezu.

  14. Poland agaghị agba asọmpi ha na Russia n'ọnwa Maach

    Otu bọọlụ nke mba Poland ekwuola na ha agaghị apụta ịgba asọmpi itozu oke maka iko mba ụwa afọ 2022, bụ nke gaara ịdị n'etiti ha na mba Rọshịa n'ụbọchị 25 nke ọnwa Maach.

    Ndị meriri n'asọmpi a ga-ezute mba Sweden maọbụ Czech Republic iji mata kpọmkwem ndị ga-etozu oke isonye n'iko mba ụwa a ga-agba na Qatara n'ọnwa Nọvemba afọ a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị otu bọọlụ Poland gwara ndị ntaakụkọ sị: "Ọ baghị uru ikwu naanị okwu ọnụ, ugbua bụ oge i ji mee ihe a hụrụ anya."

    "Anyị agaghị agba asọmpi bọọlụ anyị na Russia. Nke a bụ ihe kwesịrị ekwesị ime."

    Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ n'ụwa bụ FIFA kwuru na ha ka na-eleba okwu a anya.

    Ọgba bọọlụ Poland bụ Robert Lewandowaski kwuru na mkpebi a ziri ezi.

    "Ahụghị m onwe m ka mụ na ndị Rọshịa na-agbakọ bọọlụ, ebe ọ bụ na ha gara n'ihu na-aluso Ukraine agha," Lewandowski kwuru.

    "Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị bọọlụ Rọshịa maọbụ ndị nkwado ha kpatara nke a, mana anyị agaghị agbachi nkịtị ka a ga-asị na onweghị ihe na-emenụ."

    N'otu aka ahụ kwa, mba Poland agwala mba Ukraine ka ha bute asọmpi bọọlụ ha niile na mba ha, dịka agaghị enwe ike ịgba bọọlụ na Ukraine ugbua, maka agha na-ada ebe ahụ.

    Ukraine ga-ezute Scotland n'ụbọchị 24 nke ọnwa Maachị. Ndị meriri asọmpi ahụ ga-ezute mba Wales maọbụ Austria iji tozuo maka iko mba ụwa 2022.

  15. Ụda ogbunigwe bụ etu m si mara na agwọ nọ n'akịrịka - ndị bi na Ukraine

    Ndị mba Russia na Ukraine akọọla akụkọ maka mwakpo na-aga ihu na mba Ukraine ugbua.

    Ụfọdụ n'ime ha gwara BBC etu ha si mara na ọgbaghara a na-ede kemgbe ụbọchị ebidola.

    Otu n'ime ha kwuru sị "Ihe m nụrụ bụụda ogbunigwe dara ezigbo ụda, m gbara pụta n'ezi".

    Gee ihe ha kwuru n'uju n'ihe onyonyo a.

  16. Agha Russia na Ukraine ga-ete aka, anyị ga-adị njikere - Onyeisiala France

    Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron ekwuola na mba Yurop ga-adị njikere maka na agha a dara n’etiti mba Rọshịa na mba Ukraine ga-anọte aka.

    Macron ezigakwala ngwaọgụ na ihe enyemaka ndị ọzọ gaa Ukraine iji nyere ha aka n'agha a.

    Onyeisiala mba Ukraine n'onwe ya bụ Volodomir Zelinsky dere n'akara Twitter ya na nke a bụ eziokwu.

    N'aka nke ọzọ Onyeisiala Zelensky ekwuola na akụkọ na-ekwu na ya agbapụla na Ukraine bụ akụkọ ụgha.

    O kwukwara na ọ bụghị eziokwu na ọ gwara ndị agha Ukraine ka ha chịlie aka elu.

    Ọ gara n'ihu kwuo sị: "Anyị agaghị edebe ngwaagha anyị chilie aka elu. Anyị ga-echekwa obodo anyị."

    Akụkọ kwukwara na mba Amerịka gwara Zelensky na ha ga-enyere ya aka kpọụ ya na Ukraine ka agha ghara ịta isi ya, mana ọ jụrụ ajụ.

    Zelensky gwara Amerịka sị: "Ebe a ka agha dara. Ihe dị mụ mkpa ugbua bụ ngwaọgụ, ọ bụghị ịga mkpagharị."

  17. Ụmụ Naịjirịa na-agba ọsọ ndụ na Ukraine na-ahusi anya ugbua

    Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa bi na Ukraine na-ata nnukwu ahụhụ ugbua dịka ha gbapụrụ ọsọ ndụ na mba ahụ maka mwakpo ndịagha ndị Russia.

    Ọnụọgụgụ gosiri na ihe karịrị ụmụ naịjirịa puku anọ bi na Ukraine, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ.

    Ụfọdụ n'ime ha akọọla etu mba Poland si achụghachi ha azụ ịbanye n'obodo ha, dịka ọtụtụ ndị Ukraine na-agba Poland, bụ obodo ka dịrị ha nso.

    Ndị ọzọkwa na-ekwu na ha nọzi n'ụlọ nzuzo a rụrụ n'ime ala iji zere ndụ.

    Mana gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ngwangwa e mepere ọdọụgbọelu dị na mba Ukraine, ha ga-eweta ụgbọelu ga-ebulata ụmụ Naịjirịa tọrọ na mba ahụ.

    Otu onye aha ya na Twitter bụ @JohnNetworQ kwuru na enyi ya bi na mba Ukraine gwara ya na ha apụọla n'obodo Kyiv ugbua.

    O kwuru na ha na-aga n'oke ala Ukraine na Slovakia; na ha ruru ụmụ Naịjiria iri abụọ n'ọnụọgụgụ.

    Enyi ya ahụ kwukwara na ha enwetebeghị enyemaka ọbụla n'aka gọọmentị Naịjirịa

    Ndị na-agbata ọsọ ndụ na Poland ga-enwe ohere ịnọ abalị iri na ise

    Onye nnọchite anya mba Poland na Naịjirịa bụ Joanna Tarnawska kwuru na ha ga-anabata ndị Naịjirịa na-agbaba na mba ha.

    Mana o kwuru na ndị ahụ ga-enwe ohere ịnọ naanị ụbọchi iri na ise na mba ahụ.

    Ọ kọwara na ọ bụghị naanị maka ndị Naijirịa ka ha na-emere otu a, kama ọ bụ ma ndị mba Afrịka niile na-enweghị akwụkwọ ikike ịnọ na Poland.

    Mba Romania ekwuola na ha ga-anabata ụmụ Naịjirịa gbabatara na mba ha

    Akụkọ na-ekwu na ụmụ Naịjirịa chọrọ ịgbaga ọsọ ndụ na mba Romania ga-enwe ike ime nke a.

    Gọọmentị Romania ekwela nkwa ịnabata ụmụ Naịjirịa gbatara ọsọ ndụ na mba ha.

  18. Anyị ga-eburu egbe banye n'ọgbọ agha - Wladmir na Vitali Klitschko

    Wladmir na Vitali Klitschko, ụmụnne abụọ a ma ama na mba ụwa dịka ọkaibe n'egwuregwu ịkụ ọkpọ, ekwuola na ha ga-ebu egbe banye n'ọgbọ agha ichekwa mba ha bụ Ukraine.

    Vitali Klitschko n'onwe ya bụ onye na-achị mpaghara obodo Kyiv dịka 'Mayor' dịka o meriri ntuliaka n'afọ 2014.

    Ọ gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Fraịde sị: "Onweghị ihe ọzọ m nwere ike ime. Aga m alụ ọgụ."

    Nna Wladmir na Vitali Klitscho bụbu onye agha mana ha abụọ bụ ịkụ ọkpọ ka e ji mara ha.

    Cheta na ọ bụ n'afọ 2017 ka Anthony Joshua nwa Naịjirịa meriri Wladmir Klitscko iji bụrụ ọkaibe n'egwuregwu ọkpọ.

  19. Kpọpụnụ ndị agha ụnụ na Ukraine - Nigeria gwara Russia

    Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnụ n'ịkatọ mwakpo Russia mere n Ukraine.

    Dịka ụlọntakụkọ 'News Agency of Nigeria' (NAN) si depụta, ọ bụ n'ụbọchị Fraịde, Febrụwarị 25 2022, ka gọọmentị etiti kpọrọ ọgbakọ ndị nnọchite anya mba a kpọrọ G7 na Naịjirịa, ebe ha nọrọ katọọ mwakpo a.

    Onye kpọrọ ọgbakọ ahụ bụ Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama.

    Na ya bụ ọgbakọ, Onyeama kwuru na Naịjirịa akwadoghị atụmatụ mmekpa ahụ mba Russia na-emekpa Ukraine, ma rịọ ha ka kpọpụ ndị agha ha.

    "Udo na mkparịtaụka ka mma iji kwụsị ọdachi a," Onyema kwuru.

    "Anyị na-akwado mbọ niile a na-agba iji hụ na Russia kwụsịrị mwakpo a ma nye ndị agha ha iwu ka ha si na Ukraine pụọ."

    N'okwu nke ya, onye nnọchite anya mba Germany na Naịjirịa bụ Birgitt Ory, kelere Naịjirịa maka ịkwụnyere mba Ukraine, ma kwuo na Naịjirịa bụ olu dị mkpa ụwa niile kwesịrị ịnụ.

    Ory kwuru na nzukọ na-aga n'ihu ugbua na ngalaba dị icheiche n'otu 'United Nations', ebe a ga-anọ nwee ụfọdụ mkpebi gbasara ọnọdụ a.

    Ndị sonyere n'ọgbakọ a gụnyere: Onye nnọchite anya mba Amerịka bụ Mary Beth Leonard, onye nnọchite anya mba Briten bụ Catriona Laing, onye nnọchite anya mba Japan bụ Matsunaga Kazuyoshin, na onye nnọchiteanya mba Kanada bụ Kevin Tokar.

    Otu G7 bụ mba ndị ọnọdụ akụnụba ha kacha gbalite elu n'ụwa dịka ụlọọrụ 'International Monetary Fund' si ahazi ya.

    Ndị nọ n'otu a gụnyere: Amerịka, Canada,France,Germany, Italy, Japan, na United Kingdom.

  20. Kachifoonụ