You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. UK nwereike ịkpachi ụgbọelụ ndị Russia batara na be ha

    UK ekwuola na aha nwereike ijichi ụgbọelụ ndị Russia febatara be ha maọbụ kwusi iresi ha akụrụngwa ụgbọelu maọbụ teknụzụ eji aga n'urukpuru bụ "space na aviation".

    Iwu ọhụrụ a ga-enye Uk ikike ijichi ụgbọelụ ndị Russia batara be ha ma mee ya ka ọbụrụ arụ ịbata ebe ahụ dịka ọdeakwụkwọ mba ofesi ndị UK bụ Liz Truss kwuru.

    Truss sị na nke a ga-emekpekwu Russia na ndị otu ha ahụ, mee ka akụnaụba gbuo ikpere ala.

    Odeakwụkwọ ụgbọala mba ahụ bụ Grant Shapps sị na ha ga-aga n'ihu ịme ka ọ bụrụ arụ ụgbọelụ Russia ịbata UK.

    Editor na-ahụ maka nọrọndọrọ ọchịchị na BBC bụ Nick Watt sị na UK ebughị Russia n'obi tie iwu makana ha machiburu Russia ịbata UK.

    Ha sịkwa na ha ga-elebe anya n'ihe ụfọdụ gbasara ụgbọelụ ndị oji ego achụ ego Russia nwe.

  2. Ọrụ ngo ndị agha chọrọ ịga ọgụ n'Ukraine dịzị gbanwụụ

    Anachọ ndị ọrụ nchekwa na-asụsụ ole maọbụ ole nwereike izoba n'Ukraine ga zọpụta ndị mmadụ ebe ahụ.

    A ga-akwụ ha ọkpụrụkpụ ego dị $2,000 (£1,500) kwa ụbọchị, nke gụnyere ihe nrita ndị ọzọ ga-eso ya.

    Ọ bụ eziokwu na ọkwa a dịka nke enwepụtara n'ihe onyonyo mana ọ bụ eziokwu sị n'ọbaozi ndị Silent Professionals, maka ndị na-arụ ọrụ nchekwa pụrụiche na-esoghị na nke ndị gọọmentị maọbụ ndị agha ha.

    A sị na ụdịrị ọrụ ndị a dị gbanwụụ ugbua.

    Ndị nọ na ụdị ọrụ a na Europe na US bụ ndị nọ n'ọrụchekwa abụghị nke ndị gọọmentị mba ahụ sị na anya ha dị n'ọrụ ndị a nke gụnyere ịzọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ihu agha maọbụ nyere ndị agha aka dị iche iche.

  3. Ndị a bụ ihe ọhụrụ megoro n'awa iri abụọ na anọ (24) gara aga, ụbọchị iri na anọ amalitere agha a

    • Mba Amerịka amachiela ị go mmanụ agbidi na Russia ozugbo ozugbo, ebe UK sị na ha ga-eji nwanyọ kwusicha nke ha tupu afọ 2022 agwụ.
    • Russia naonwe ha chọrọ ịbọrọ ụbọ site na ịgwụsị ahịa ụfọdụ ha na-eresi ndị UK. Ha sịkwa na ha ga-akwụsị ịresị ha gasị.
    • Poland sị na ụgbọelụ agha ha adịla njikere ị ga ọdọụgbọelụ ndị agha ndị US dị na Germany. Mana US sị na ha akpabeghị ya akpa, na ọ gaghị ekwe omume.
    • Ụlọọrụ ndị ahụ a na-akwanye ọkụ n'ike ka ha kwụsị ịzụ ahịa na Russia ekwetela ịpụta ebe ahụ. Ndị dịka McDonald's, Starbucks, Coca-Cola na Pepsi.
    • Onyeisiala mba Ukraine Volodymyr Zelensky na ndị omeiwu UK enwela mkparịtaụka n'ihe onyonyo ụnyaahụ.
    • Ọgbakọ United Nations ekwola na ihe karịrị mmadụ nde abụọ gbapụla na Ukraine kemgbe agha a bidoro.
  4. Unu abọọla chi ee! Taa bụ Nkwo. Nkwo kwotara anyị ihe ọma ooo! Iseee!

  5. Ọkpụrụkpụ ihe Zelensky gwara ndị ụlọomeeiwu Uk

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky gwara ndị ulọomeiwu okwu maka agha ha na Rọshịa.

    Zelensky gwara ha ihe mba ya na-agabiga n'aka ndị Rọshịa kamgbe ha bidoro nwakpo ha a mechara bụrụ agha.

    O kwuru maka etu o si wee kwado maka agha nakwa mkpebi ya ibuso ha agha n'ọhịa, n'ala ma n'osimiri. Ihe ndi o kwuru mere ka ufodu n'ime ha bewezi akwa maka na ha huru ebumnuche ya maka etu agha a ga-adi.

    Ka o kwuchara ha niile akụọrọ ya nnukwu aka.

  6. Mpaghara ndịda anyanwụ ụwa etinyela mmachi mmanụ n'isi Russia

    Mba Amerịka na UK amachiela mmanụ Russia ebe European Union (EU) na-akwụsị ntụkwasị obi ha nwere n'elu gaasị Russia, nke so n'atụmatụ ụfọdụ mba ji ekechi akpịrị Russia maka iwakpo Ukraine.

    Joe Biden bụ onyeisiala mba Amerịka kwuru na nke a bụ ụzọ ha na-achọ iji enweta "akwara nke dị oke mkpa n'akụnaụba mba Russia".

    O kwuru okwu ozugbo otu European Commission kwuchara na ha ga-eji ihe ruru ụzọ abụọ n'ime atọ belata ọchịchọ a na-achọ mmanụ Russia, - EU na-esi n'aka Russia enweta pasentị 40 gaasị ha.

    Nke a pụtara na ego mmanụ ụgbọala na ọkụ a mụrụ n'ụlọ nwereike ịdị ngala ọnụ nye ndị na-eji ya emere ihe.

    Akụnaụba mba Russia dabesiri ike n'elu mmanụ. Ọ bụ mba nke atọ kacha emepụta mmanụ agbịdị n'ụwa - Saudi Arabia na mba Amerịka ka ha emepụta.

    Tupu EU ekwuputa atụmatụ a, Russia dọrọ aka na ntị maka ihe ga-eme akụnaụba mbaụwa, ma kwuo na o nwereike imechi okpo mmanụ gaasị ha na-aga Germany.

  7. Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ebinyela aka n'ịnye Ukraine ego ruru $700m

    Ụlọakụ mbụwa bụ World Bank ebinyela aka n'akwụkwọ maka ịnye ndị Ukraine ọkpụrụkpụ ego dị nde dọla narị asaa ($700m) maka iji kwụọ ndị ọrụ na ndị lara ezumike nka ụgwọ ọnwa.

    ụlọakụ a sị na ego gụnyere ego ndị UK, Netherlands, Sweden, Japan, Denmark, Latvia, Lithuania na Iceland nyere ha.

    Ha sịkwa na ha ga-enyekwa ha na ndị agbataobi ha ego ọzọ ruru ijeri dọịa atọ ($3bn (£2.3bn) n'izuụka na-abịanụ.

  8. Ndị a bụ ihe ọhụrụ megoro n'awa iri abụọ na anọ (24) gara aga.

    Ukraine na-eti mkpu na agha Russia na-ebuso ha anaghị ekwe ndị mmadụ gbapụ.

    Ọtụtụ mmadụ enweghị ọkụ latrik n'Ukraine ọkachasị n'obodo Mariupol ebe ụkọ nri na mmiri ka njọ.

    Mbọ nke atọ Russia na Ukraine gbara eweta udo n'ime ha kpụrụ afọ n'ala.Nke anọ ka ga-abịa ụbọchị Tuzde.

    Ndị US, France, Germany na UK eforola ntụtụ taa ịhụ na ha mere ka ihe siwanyere Russia ike maka ihe ha hụru dịka agha na-enweghị isi ha na-ebuso Ukraine.

    Russia sị na ha agaghịzị eresi Europe mmanụ agbidi iji bọọ ubọ ahuhụ ha na ata ha.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky sị na ya ga-egwụnye na Kyiv ruọ mgbe ya meriri agha a.

    Coca-Cola na McDonalds so n'ụlọọrụ ndị a na-akpachapụ maka na ha achọghị ịpụ na Russia.

    Ukraine na etu ọnụ na ha egbuola otu ọchịagha ndị Russia. Mana BBC enwebeghịike ịkọwa ka nke a ọ bụ eziogwu ka ọ bụ ụgha.

  9. Ndí be anyị unu asaala chi ee! Taa bụ Afọ. Afọ biko wetere anyị ihe ọma oo!

  10. Russia ekweghi abịa ụlọikpe mbaụwa

    Russia jụrụ ịza oku a kpọrọ ha n'ụlọikpe mbaụwa bụ International Court of Justice (ICJ), ebe Ukraine na-akpọ oku ka a kwụsị mwakpo a na-eme ha.

    Alexander Shulgin, bụ onye nnọchiteanya mba Russia na The Hague, kwuru na gọọmentị ha ebughidị ya n'uche ịbịa sonye n'ikpe a na-ekpe.

    Ọkaikpe kachasị n'ụlọikpe UN ahụ kwuru na ọ bụ ihe ụta na ndị Russia abịaghị ma ncha.

    Anton Korynevych bụ onye nnọchiteanya mba Ukraine gwara ụlọikpe sị "Na oche ndị Russia tọgbọ chakoo ekwuola ihe niile o nwere ikwu, ha anọghị ebe a, ha nọ n'ihu agha."

    O boro Moscow ebubo imebi iwu Genocide Convention site n'ikwu na e nwere mgbukpọ ebe a na-enweghi, jiri ya mee ihe ha jidere n'aka mee mwakpo ha mere.

    "Putin tụọ asị, ndị mba Ukraine anwụọ," ka o kwuru.

    Ukraine arịọla ka ICJ tinye ọnụ ozugbo ozugbo gwa Russia ka ha were ọsọ were ije kwụsị mwakpo ndị agha ha, gbochie nkwafu ọbara ndị nkịị nakwa mgbukpọ niile maọbụ ihe yiri mgbukpọ ọbụla ha bu n'obi ime.

    Ma Russia ma Ukraine bụ ndị otu ụlọikpe ahụ, ha abụọ so na ndị binyere aka n'iwu Genocide Convention.

  11. Anwụchiela ụkọchụkwụ maka ịkatọ agha Russia

    Na Russia, e nwetere mkpesa na a nwuchiri ụkọchụkwụ maka ịkatọ agha Russia na-ebuso Ukraine n'ụka ya ụnyaahụ, gaa akpụpụ ya ụlọikpe taa.

    Onye ntaakụkọ BBC na Russia bụ Andrey Zakharov sị na-anwụchiri Fada John Burdin ka o zichara ọbere mmadụ oziọma n'ime obodo Karabanovo.

    A sị na ya bụ Fada katọrọ ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ n'Ukraine, kesakwa akwụkwọ katọrọ ya bụ agha ma gbasakwa ozi ya n'ọbaozi ya.

    A na-ekpe ya ikpe ịkatọ ndị agha Russia n'iwu ọhụrụ ha hibere ịzụụaka gara aga.

    Kemgbe ya bụ agha malitere, anwụchiela ọtụtụ mmadụ mere ngagharịiwe maka ịkatọ ya bụ agha.

    Ihe ruru ndị mmadị puku iri na atọ (13,000) nọ na mkpọrọ na-esi rọdụ n'ime nke gụnyere mmadụ 4,600 anwuchiri ụbọchụ ụka dịka otu ụlọọrụ NGO ebe ahụ kwuru.

    Ndị ọrụ Russia ji ihe techie ebe ndị mmadụ dere ihe katọrọ ya bụ agha n'okpooro ụzọ.

  12. Nke a bụ nchịkọta okwu mere nkemgbe awa iri abụọ na anọ gara aga n'agha Ukraine na Russia

    • Ndị agha Uk sị na ike ndị Russia lara n'iyi na mbọ ha gbara n'abalị abụọ gara aga maka otu Ukraine siri buso ha agha nakwa nsogbu nke ha nwere n'ime onwe ha.
    • Mana ndị agha Ukraine na-adọ aka na ntị na-asị na ọ bụ ike ka Russia na-ezụ na nkwado agha ha ga-awakpo Kyiv.
    • Russia ji ogbuigwe na-atụ na obodo niile gbara Kyiv gburugburu, sikwa na Belarus na-ebute mmanụ ụgbọala nakwa ngwa agha ndị ọzọ na nkwado ya bụ agha ha chọrọ ibuso Kyiv, isiobodo Ukraine.
    • Mariupol dị na mpaghara ọnwụwa anyanwụ mba ahụ, Russia ka na-akwasị mgbọ ike, nke mere onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ji adọ ha aka na ntị na onye obụla dara iwu agha nke a kpọrọ "war crime" na Bekee, na ya ga-achụgịde onye ahụ ruo n'ili.
    • Onye omeiwu mba Amerịka dị elu bụ Marco Rubio bụkwa onye otu Republican gwara CNN ụbọchị ụka na itinye iwu anụnụebe bụ "no fly zone" n'Ukraine nọ ọnọdụ ka ịmalite agha mbaụwa nke atọ.
    • Ka nke a na-eme, ụlọọrụ dị iche iche ka na akpachapụ Russia site na-imechi ọrụ maọbụ ahịa ha ebe ahụ. Ndị ikpeazụ mechiri bụ ndị dị ka Netflix, American Express, KPMG nakwa PricewaterhouseCoopers.
  13. Ụmụ nne anyị ụnụ asaala chi ee!

    Ọ ga-adịrị onye ọbụla mma taa bụ Orie.

  14. Ihe ruru ndị nkịtị 364 anwụọla na mba Ukraine - UN

    Ụlọọrụ United Nations Human Rights (UNHR) kwuru na ihe ruru ndị nkịtị 364 anwụọla na mba Ukraine kemgbe Russia wakporo ha n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị 2022.

    Dịka ha si kwuo, 25 n'ime ha bụ ụmụaka, ebe mmadụ 759 emerụkwaala ahụ kemgbe ahụ.

    Mana ha kwuru na ọnụọgụgụ ndị agha a gburula nwere ike ịdị ọtụtụ karịa etu a.

    Ha kwuru sị "Ọtụtụ ndị nkịtị a nwụrụ n'ihi ogbunigwe dị iche iche dakwasịrị ha".

  15. Ihe Putin na Macron kpara n'ekwentị n'ụbọchị ụka

    Onyeisiala Vladimir Putin nke Russia na Onyeisiala Emmanuel Macron nke France nwere mkparịtaụka n'ekwentị ụbọchị ụka ebe ha kpara ihe ruru awa abụọ.

    Ndị otu Macron sị na ọ gwara Putin ka ọ kwụsị mwakpo Russia na-eme ma gbaa mbọ hụ na e chekwara ebe ọgbọ nuklia ndị Ukraine, dịka ogbunigwe a tụrụ ebe na nke Zaporizhzhia mụnyere ya ọkụ. Putin gwara Macron na Russia achọghị iwakpo ọgbọ nuklia ọbụla.

    Ụlọọrụ onyeisiala France sị na Putin gwakwara Macron na Russia ga-emezu ebumnobi ha site "na mkparịtaụka maọbụ agha".

    Ozi si n'ụlọọrụ onyeisiala mba Russia kwuru na Putin na-ata ndị Ukraine ụta maka ihe mere n'ọgbọ nuklia ahụ.

    Dịka ha si kwuo, ọ gwara Macron na ọ bụ "ndị nnupuisi Ukraine" ma ụma "mee mkpasu" ahụ. Ukraine na onwe ha ebola ndị agha Russia ebubo ịtụ ya bụ ogbunigwe.

    Ụlọọrụ Kremlin tinyere na ndị Russia na ndị Ukraine jikọrọ aka ọnụ na-echekwa ọgbọ nuklia ahụ, ma kwuo na rediashọn ọ na-ekuputa ka dị "etu o kwesịrị".

    Putin kwukwara na mbọ a gbara isi n'obodo Mariupol na Volnovakha kpọpụ ndị nkịtị na Satọde kpụrụ afọ n'ala n'ihi na "ndị Ukraine nationalists" jụrụ ka ndị mmadụ pụọ, ma jiri ohere nkwụsịlatatụ ịkwa mgbọ wee hazie onwe ha ma kekwuo nkwụcha.

    Ukraine kwuru na Russia gaa n'ihu ka na-atụ ogbunigwe n'oge ha kwekọrịtaburu ịkwụsịlatatu ịkwa mgbọ ma n'ụbọchị Satọde ma na Sọnde.

    N'ụbọchị ụka a ka ụlọọrụ Red Cross kwuru na mba abụọ a jụrụ ikwekọrịta n'usoro ya bụ ịkpọpụta ndị mmadụ ga-esi gaa.

  16. Agbamakwụkwọ mere n'etiti agha

    N'agbanyeghi na ha nọ n'etiti agha, ndị agha abụọ si n'otu agha nchekwa mba Ukraine agbaala akwụkwọ.

    Ha gbara akwụkwọ n'ebe dị nso ọgbọ nchekwa e tinyere nso isiobodo Kyiv.

    Valery na Lesya yikwa uwe ndị agha ha, mere obere emume dịka ndị agha mba Ukraine ndị ọzọ, nakwa aka na-achị Kyiv gbara ha gburugburu.

  17. Agha niile abụghị egbe na mma, lekwa ka teknụzụ si aba uru n'agha

    Mịnịsta kacha nta n'Ukraine bụ nke na-ahụ maka teknụzụ ọgbara ọhụrụ bụ Mykhailo Fedorov ji ihe ọ ma eme were alụ agha nke ya na Ukraine.

    Nwaamadị a na-arịọ ndị ọrụ bụ ọkaibe na ya bụ ọrụ ka ha nyere ha ka site n'ikụpịa ịntanetị ndị Russia.

    Mykhailo Fedorov rịokwara Elon Musk ka ọ lekwasị Ukraine anya nke ebere site n'ime ka Satịlaịtị ya chewa ha ihu.

    Ọtụtụ n'ime ihe ndị ọ na-eme bụ n'ekwentị.

    Ya bụ nwaamadị gbara afọ 31, na ndị ọrụ ya riri amosu n'ọrụ teknụzu nọ n'ime okpuruala n'otu ebe na Kyiv na-apị igwe.

    Ya bụ, ka nwoke ya bụ onyeisiala Volodymyr Zenesky nọ n'elu ala were egbe na mgbọ na-ebu agha nke ya, Fedorov nọ n'okpuru ala na-eme nke ya site n'ịpị igwe na soshal midia.

    Ọ nọ n'ime ala ebe ahụ, ya na ụmụ mmụọ, hibe otu ọ kpọrọ "IT Army of Ukraine" bụ nke na-anabata ndị niile riri amosu n'ọrụ teknụzụ bụ nke o ji awakpo Russia n'ụdị Bekee kpọrọ "Cyber-attack".

    Ọ kwa ị hụla na agha dị n'ụdị na ụdị?

  18. Gịnị bụ iwu anụnụebe Bekee kpọrọ "no fly zone"?

    Dịka anyị gwaburu unu na mbụ, onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky chọrọ ka ndị otu Nato tinye iwu anụnụebe ga-eme ka ha gbatuo ụgbọelu ndị Russia obula fefere n'isi ha.

    Mana Nato jụrụ ajụ, jusie ike. Maka gịnị?

    Iwu a na-eme ka ụgbọelụ agha ghara ịfebata n'ogige a machiri machi iji gbochie ịtụ ha mgbọ n'isi.

    Mana e tie ụdiri iwu a, ekwesiri ịji ike kwado ya ka ọ dị ire.

    Nke a pụtara na ndị agha elu Nato ga-echebiri nke ndị Russia ọbụla febatara n'Ukraine gba ya gwogwo ma ọ dị mkpa.

    Nke ahụ nweziriike ịkụkọ isi na isi ndị Russia na nke ndi Ndịda anyanwu Europe, mee ka ya bụ agha a na-eze daa ozugbo.

  19. Ihe ruru mmadụ 3000 ndị Amerịka ewepụtala onwe ha ịlụ agha n'Ukraine.

    Ihe ruru mmadụ puku atọ (3000) ndị Amerịka ewepụtala onwe ha ịlụ agha n'Ukraine.

    Onye nnọchite anya mba Ukraine n'Amerịka gwara Voice of America n'isiobodo Amerika bụ Washington DC ụnyaahụ.

    Ndị Nato sị na ha agaghị eziga ndị agha ịlụ agha na Ukraine, mana ha na-ezigara ha ngwaagha.

    Ha ewerekwala ịkpa oke azụmahịa na mmekọrịta iji taa Russia ahụhụ n'ụzọ pụrụiche.

    Ha kpachikwara akụnaụba ha dị na mba ofesi yana nke ndị akajiakụ ha.

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky akpọọla oku ka ndị mmadu na mbaụwa gbatara ha ọsọ enyemaka bịa soro ha lụọ agha a dakwasiri ha site n'isonye n'otu ha kpọrọ "international legion" of foreign volunteers.

    Abalị ole maọbụ ole gara aga Zelensky sị na ya agụtala ndị nkịtị mmadụ dị puku iri na isii (16,000) bụ ndị chọrọ ịdọnyere ha ukwu na ya bụ agha. Ụfọdụ n'ime ha akpabeghị egbe aka mbụ.

  20. Nke a bụ nchịkọta okwu megoro n'ọgbaghara ndị Russia na Ukraine n'ime awa iri abụọ na anọ gara aga

    • Onyeisiala ndị Ukraine bụ Volodymyr Zelensky akpọọla oku ọzọ ka Nato tinye ọnọdụ anụnụebe Bekee kpọrọ "no fly zone" nke pụtara na ha ga-agbatu ụgbọelu Russia ọbụla febatara n'ogige nke ha.. Ọ kpọrọ oku a na mkparịtaụka ihe onyonyo nke ndị omeiwu mba Amerịka mmadụ narị atọ (300) so na ya.
    • Nato jusiriike maka na ya bụ ọnọdụ nwereike ime ka ya bụ agha gbasaa Europe niile.
    • Okwu ya biara ka onyeisiala mba Isreal bụ Naftali Bennett na Onyeisiala mba Russian nwechara mkparịtaụka ebe ọ na arịọ ka o kwe ka ya na Volodymyr Zelensky kpee udo nke ya ga-achịkọta.
    • Nke a na-abịa dịka ogbunigwe na-adasiike n'obodo Mariupol, Kharkiv nakwa Sumy dị n'ọwụwa anyanwụ mba Ukraine.
    • Ka a na-ekwu nke a, ọgụ ka na-adasiike n'ukwu mba abụ, n'obodo Hostomel ebe nnukwu ọdọụgbọelụ mba ahụ, dịka Russia na-atụkwa ogbunigwe esepụaka n'Irpin, obere obodo dị nso na Kyiv.
    • Ka ọ dị ugbua, onyeisi ụlọọrụ Visa na Mastercard, ndị e ji mpekele kardị bụ ego e ji azụ ahịa mara, ekwuola na ha ga-esi na Russia pụọ maka ihe ha hụtara ka iwe enweghị isi ndị Russia na-enwesara Ukraine.
    • Onyeisiala mba Uk bụ Nwaamadị Boris Johnson akpokuola ndị isi mbaụwa ka ha hụ na agha a na-enweghiisi ndị Russia na-ebuso Ukraine kpụrụ afọ n'ala.