Ndí be anyí unu asaalachi ee!
Ndụ mmiri, ndụ azụ.
Taa bụ Eke.
Eke biko ketere anyị ihe ọma oo! Iseeee!
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.
Ndụ mmiri, ndụ azụ.
Taa bụ Eke.
Eke biko ketere anyị ihe ọma oo! Iseeee!
Ihe ruru mmadụ isii - gụnyere otu nwatakịrị - nwụrụ mgbe Russia tụrụ ogbunigwe n'otu ime obodo dị na mpaghara Kyiv, dịka gọọmentị Ukraine si kwuo.
N'ihe ha dere na Facebook ụnyaahụ, ndị uweojii kwuru na mmadụ anọ (okenye abụọ na ụmụaka abụọ) nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ n'ihi ya bụ ogbunigwe a tụrụ n'obodo Markhalivka, ji kilomita 10 dị nso isiobodo Kyiv.
Lee photo ndị gosiri mmebi na ihe ndị lara n'iyi, dịka ndị obodo ahụ na-amalite mkpocha na nzacha.
Naftali Bennett bụ Praịm minista mba Israel ezutela Vladimir Putin na Kremlin, dịka ụlọọrụ ya si kwuo.
Ha kparuru nkata ihe ruru awa abụọ na ọkara.
Ụlọọrụ Bennett kwuru na ọ gwara mba Amerịka tupu ọ gawa ya bụ mkparịtaụka.
E nweela ọtụtụ nrụrịtaụka banyere ma gọọmentị Israel o nwere ike maọbụ o kwesịrị itinye ọnụ n'esemokwu a dị n'etiti Russia na Ukraine - ejibughi ya kpọrọ ihe na mbido.
Mana ọ dị ka mfega Bennett fegara Moscow n'etiti mkpachapụ ụwa kpachapụrụ ha ebugala atụmatụ a n'ogogo ọzọ.
Volodymyr Zelensky bụ onyeisiala mba Ukraine akatọọla ndị isi otu North Atlantic Treaty Organization (Nato) maka ọjụjụ ha jụrụ itinye mmachi “onye efefela” na mba ahụ.
Zelensky kwuru na ọjụjụ ha jụrụ itinye aka nyere Russia ikike iji gaa n’ihu na-awakpo obodo ndị dị na mba ya bụ Ukraine.
Nato na onwe ha ekwuola na itinye ya bụ mmachi onye efefela ga-akụkọta isi ha na Moscow.
Vladimir Putin bụ onyeisiala mba Russia, kwuru n'ụbọchị Satọde, na ime ụdịrị ihe ahụ bụ "ibu egbe sonye n'agha ka mba ahụ na-eme".
Maka mmachi niile ndị mba ndị ọzọ machiri Russia, Putin kwuru sị "ha dị ka mkpebi ịlụ agha, mana ekele dịrị Chukwu na o rubeghi nke etu ahụ".
N'okwu o si n'isobodo Kyiv kwuo, Zelensky kwuru na o kweghi na ime ụdịrị ihe a nwereike "ikpasu Russia iwe n'ebe Nato nọ."
O ji iwe sị: "...Ndí niile ga-anwụ site taa gawa n'ihu ga-anwụ n'ihi unu. N'ihi esighi ike gị, n'ihi adịghị n'otu gị."
N'ụbọchị Fraịde, Jens Stoltenberg bụ onyeisi otu Nato, dọrọ aka na ntị na itinye mmachi onye efefela nwere ike ibute "nnukwu agha na mpaghara Europe nke ga-emetụta ọtụtụ mba dị iche iche ma tinye ọtụtụ ndị mmadụ n'ahụhụ."
Ụlọọrụ mmekọrịta mba Briten na mba ndị ọzọ eziela ozi sị ka ndị mba ha nọ na Russia (ndị na-agaghị maka ihe dị oke mkpa) mara ma ha a ga-achọwa ụzọ ha si mba ahụ pụọ.
Ha dụrụ ha ọdụ ka ha si ebe ndị njem ọzọ fọrọ afọ gafere.
Ụlọọrụ ahụ kwukwara sị na onye mba Briten ọbụla chọrọ enyemaka kpọturu ụlọọrụ nnọchiteanya Briten dị n'isiobodo Moscow.
Ndị Ukraine ekwuola na ya bụ mkpebi ha na Russia kpebiri maka ịbenata ịkwa mgbọ ka ndị na-agba ọsọ agha nweeike gafee n'ụzọ Mariupol adịghị ire dị ka ndị mmadụ na-ekwu.
Ndị okpuruọchịchị obodo ahụ na-akọwa na ọba nzikọrịta ozi Telegram na a ka na-akpasi mgbọ ike na Zaporizhzhia bụ ebe ụzọ enyemaka kwusiri.
Ya bụ ozi na-asị ndị Russia ka ha kwuo nke bụ eziokwu gbasara ya bụ mkpebi ịkwụsịlatụ ịkwa mgbo na mpaghara ahụ.
Ọlụọrụ ntaakụkọ mba China na-ezisara ha ozi na mba ofesi bụ CCTV akpachiela ozi udo onyeisi ndị International Paralympics Committee bụ Andrew Parsons rịọrọ na okwu malite ya bụ emume o kwuru na Beijing.
Andrew Parsons kpọrọ oku a ka udo chia na mbaụwa n'okwu mmepe ya bụ egwuregwu na-akpọtụ na China ugbua.
Ọ gwara ndị bịara ya bụ meme nke gụnyere onyeisiala China bụ Xi Jinping , " n'abali a, achọrọ m iji okwu gbasara udo malite".
Mana mgbe ụlọọrụ ntaakụkọ ndị China bụ CCTV buru ya bụ akụkọ, ha mere ka olu ya ghara ịda ụda mgbe ọ rịọrọ ya bụ arịrịọ. Ha mekwara ka onye ntapịa ndị ogbi nọ ebe ahụ gbankiti mgbe ha kagburu ya bụ okwu.
Ihe ndị ọzọ ha kagbukwara bụ ebe ọ sị,"dịka onye ndu otu na-anabta ndị mmadụ dị iche iche na-anaghị akpaoke, ọ tụrụ m n'anya ihe na-eme n'ụwa ugbua.
Uwa anyị nọ n'ime ya ugbua bụ mgbe e ji nkata na udo emezi okwu, ọ bụghị mgbe ọgụ, na tigbuo zogbuo.Egwuregwu ndị nkwarụ na nke ndị ahụ dị mma kwadoro arịrịọ udo bụ nke mba dị 193 kwadoro na nzụkọ ha nke 76. Ekwesiri irubere ya isi, ọ bụghị ịmetọ ya".
Mba China ajụla ihu agha na-ada na Ukraine dịka mwakpo ma jụkwa ịtụ vootu megide ya bụ mwakpo Russia na-eme n'Ukraine.
Ndụ nwoke, ndụ nwaanyi. Taa bụ Nkwo nke ga-akwọtara anyị mmiri ọma na ikuku ọma
Dịka Russia wakporo Ukraine, ọtụtụ ndị nkịtị si Afrika, Asia na Middle East malitere ịgbara ọsọ ndụ gbapụ Ukraine.
Ukraine nwere ụmụakwụkwọ si mba ndị ọzọ ruru 76,0000 dịka ozi si n'aka gọọmenti mba ahụ siri kwuo.
Ndị a gụnyere ụmụakwụkwọ na-agụ maka ịbụ dọkịta na injiria.
Ukraine bụ mba ọtụtụ ụmụakwụkwọ si mba ọzọ na-achọ achọ malite oge mba ahụ ka nọ na 'Soviet Union' bụ mgbe ha tinyere ego n' ịkwalite agụmakwụkwọ dị elu bụ oge ha gbara mbọ ịme ka ụmụakwụkwọ sị Afrịka bịawa na mba ha.
Patrick Esugum bụ onye na-arụ ọrụ n'otu na e nyere ụmụakwụkwọ si Ọdịda Anyanwụ Afrịka aka sị, "Asambodo mahadum Ukraine bụ ihe a na-achọ achọ na mba ndị ọzọ dị na Europe n'ihi na ha ma ihe ha na-akuzi."
" Ọ na-amasị ọtụtụ ndị na-agụ maka eme dọkịta n'ihi na ha nwere ezigbo ṅgwaọrụ nlekọta ahụike."
Desmond Chinaza Muokwudo,nwa afọ Naijiria nọ na Dnipro kwuru na ihe dọtara ya na Ukraine bụ maka na ihe a chọrọ n'aka onye ga-aba mahadum ha ataghị akpụ, nakwa na ibi ndụ na mba ahụ dị ọnụ ala ma ijiri ya gbaa obodo ndị ọzọ dị na Europe.
" Ana m arụ ọrụ 'welder' na Naijiria tupu mkpebie ịga gụ akwụkwọ. Ukraine bụ ebe kachara m mma."
Russia akpachiela mgbasaozi BBC Russia na mba ahụ.
Gọọmenti mba ahụ kpachikwara ụlọntaakụkọ ndị ọzọ nwere agba dịka Deutsche Welle, Meduza na Radio Liberty.
Ụlọomeiwu mba Russia binyere aka n'iwu megidere ịgbasa 'akụkọ ụgha" banyere ndị agha ala ha.
Ha kwuru na ihe ha na-eme na Ukraine abụghị 'agha'.
Ọnụ na-ekwuru BBC kwuru na "inweta akụkọ bụ eziokwu bụ ikike dịrị onye nke e kwesịghị ịnapụ ndị Russia bụ ndị nde kwuru nde ha na-esi n'aka BBC enweta akụkọ kwa izuụka."
"Anyị ga na-aga n'ihu ịgba mbọ ịgbasa ozi na Russia nakwa ụwa niile."
Ọtụtụ ndị mmadụ agụọla akụkọ e dere na BBC nke asụsụ Russia kemgbe mwakpoo Ukraine malitere.
N'ụbọchị Tọzde, ụlọọrụ ntaakụkọ Russia bụ TV Rain kwụsịrị mgbasa ozi ha dịka a chara ha ọkụ maka iwepụta akụkọ etu e si wakpoo Ukraine.
Ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ gosiri n'ikuku ka ndị ọrụ ha na-ahapụ ụlọọrụ ha.
Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ezipụlata ozi na ndị agha Russia amụnyela ọkụ n’ebe ha na-edobe ngwa agha ọgwụrụmba (nuclear plant) mba ha dị na mpaghara Zaporizhzhia
Ndị ọrụ gbatagbata mba ha ekwuola na ha emenyụọla ya bụ ọkụ dịka ha kọwara na enweghi onye nwụrụ n’ihe ọdachị a.
E kwuola na ya bụ ebe a na-edobe ngwaagha ọgwụrụ bụ nke kachasi n’Europe niile.
Otu onye ọkamụta n’ihe gbara ngwaagha ọgwụrụ mba n’ebe ahụ bụ Claire Corkhillkwuru na ezigbo egwu dị n’ihe.
Ọtụtụ ndị isi obodo ndị ịcheịche akatọọla ihe mere ebe ahụ dịka egwu ji ndị mmadụ ebe ụfọdụ na-ajụ ma ihe a e nwereike ị dị ka ọnọdụ mwakpo mere na Chernobyl n’afọ 1986?
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebizi n'okpuru ụlọ ha dịka Russia gara n'ihu ịgba ọtụtụ obodo na Ukraine ogbunigwe.
Ụfọdụ agbaala ọsọ ndụ gbapụ n'obodo ndị Russia na-atụ ogbunigwe, ebe ndị ụfọdụ na-ebizi n'ọnụ ha gwuru n'okpuru ala nke Bekee kpọrọ 'bunker' dịga n'okpuru n'ụlọ ha n'ihi ogbunigwe na-ada aghara aghara.
Onye ntaakụkọ BBC si Kharkiv gaa Dnipro taa kwuru na kpachikpachi ụgbọala na-agbaopụ na Khakiv toruru kilomita isii.
O kwuru na ọtụtụ ndị a nọ n'ụgbọala ndị a bụ ndị zoburu n'okpuru ụlọ ha kemgbe ogbunigwe na egbe malitere gbawa izuụka gara aga Russia malite busowe Ukraine agha.
O kwuru na ọtụtụ ndị nọ n'obodo Dnipro edoziela okpuru ụlọ ha, tinye ya akwa, nri ji mmee ka ọ dịtụ mma obibi.
Otu nwaanyị a kpọrọ Anna gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị nkuzi nọ n'obodo ahụ ji igwe okwu zoom akụziri ụmụaka ihe iji kpasaa anya ha n'ihe na-eme.
Onyeisi ụlọikpe mba ụwa International Criminal Court(ICC) bụ Karim Khan ekwuola na nnyocha banyere na Russia ọ na-eme mpụ mkpọchapụ agbụrụ n'agha megideUkraine.
Nke a na-abịa dịka mkpesa si ire ruru mba 39 gụnyere Briten,France, na Germany boro Russia ebubo ịtụ ndị nkịtị ogbunigwe.
Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky boburu Russia ebubo mpụ megide ndụ ndị mmadụ site dịka Russia tụrụ ogbunigwe n'obodo Kharkiv, gbuo ndị nkịtị.
ICC na-ekpe ndị e boro ebubo ịme mpụ megide mba ụwa ihe mba ha nwenwụghị ike ikpe ha ikpe maọbụ achọghị ikpe ha ikpe.
The ICC prosecutes individuals accused of the most serious crimes concerning the international community, where states cannot or are unwilling to do so.
Ogbingwe na-ada n'isiobodo Ukraine bụ Kyiv na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu na chi fotere Tọzde a.
Ndị mmadụ setere ihe dị ka ogbunigwe anọ gbariri n'ime isiobodo ahụ n'isi ụtụtụ taa ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ.
O dobeghị anya ebe ogbunigwe ndị a chewere ihu maọbụ ndị ometutara.
Nke bịara ka a nụchara ụda ogbunigwe dara n'akụkụ ọdọ ugbooloko n'etiti Kyiv ebe ọtụtụ mmadụ na-eze ndụ.
Onye ndụmọdụ Minista na ahụ maka ọdịmma obodo sị na ọ bụ mpekere igwe sị na ya bụ ogbunigwe bụ nke akụrụngwa agha eji echebiri ogbunigwe akpọrọ "air defence system" na Bekee mebiri ihe.
Ọ sị na ọ bụ okporo paịpụ ntụọkụ ka ya bụ ihe mebiri, mana ọnweghị onye meruru ahụ.
Ndị ọrụ European Union na mba Kenya agọọla n'akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na a na-akpa oke megide ndị n' Afrika na-agba ósó ndú site na Ukraine bụ akụkọ.
Ọtụtụ ndí si mpaghara Afríka gúnyere ndí Nigeria, Ghana na Kenya tóró n'ụzọ díka ha na-agba ósó ígbapú n'Ukraine abalí asaa Russia malitere buwe mba ahú agha.
N'ozi EU wepụtara , ha kwuru na mba Poland,Romania na Hungary mepere okeala ha maka ndí niile na-agba ósó ndú na-agbanyeghí agbụrụ
Ọtụtụ ụmụ Afrịka na-agụ akwụkwọ na Ukraine akọrọ akụkọ etu ndị agha mba Ukraine si gbochie ha ịgbapụ na mba ahụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela Mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi na Minista na-ahụ maka ihe mberede na mmekọ mmadụ na ibe ya ọkpụrụkpụ ego dị nde dọla asatọ na ụma ise ($8.5) iji bulata ụmụafọ Naịjirịa tọrọ n'Ukraine ebe ha na Russia na-akwa mgbọ.
E nwere ụmụafọ Naịjriịa dị puku ise (5000) nọ n'Ukraine.
Onye kwuru nke a ụbochị Wenezde bụ osote minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Zubairu Dada bụ onye kwuru nke a n'ọgbakọ ndị isiọchịchị sị na ụgbọelụ ga-ebute ndị a ga-aga na mba anọ gbara Ukraine gburu gburu bụ ebe ndị mmadụ na-agbaje ọsọ ndụ.
Mba ndị a gụnyere Poland, Hungary, Slovakia, na Romania.
Ụgbọelụ abụọ ndị Airpeace nakwa otu nke ndị Max Air ga-eme ya bụ njem.
O kwuru na ụgbọelụ ndị ga-amalite njem ụbọchị Wenezde ga-aga ugboro ugboro were bulatachaa ndị a niile.
Dịka mba Ukraine na mba Russia nọ n’agha, ọnụ ego mmanụ agbidi na-arị elụ na-aga agbanyeghi mbọ ndị ọchịchị mba dị ịcheịche na-agba idaju nke a.
Brent crude bụ akara eji ama ọnụ ego mmanụ agbidi na mba ụwa ekwuola na otu barelụ mmanụ agbidi bụ $113 ugbua. Nke a bụ ọnụ ego ya kachasị elu kamgbe ọnwa Juun 2014.
Marakwa na otu na-ahụ maka mmanụ agbidi na ọtụtụ mba bụ International Energy Agency jịkọrọ aka ọnụ kesaa mmanụ agbidi barelụ ruru nde 60 maka mbọ gbatagbata inye aka n'ihe a na-eme mana ọ dị ka atụmatụ a amịtaghị mkpụrụ.
Russia so na mba kacha emepụta mmanụ agbidi, ya mere agha na-ada ji emetụta ọnụ ego mmanụ agbidi.