You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị buterela coronavirus na Naịjirịa akarịala 16,000

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa agafeela puku iri na isii.

    Ndị a chọpụtara nje a n'ahụ ha n'ụbọchị Sọnde bụ mmadụ narị anọ na atọ.

    Na mpaghara ọwụwa anyanwụ, mmadụ iri na ise ka a hụrụ ya bụ nje n'ahụ ha n'Abia steeti.

    Ahụkwara otu onye n'Anambra nakwa Imo steeti

  2. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma ụnụ abọọla chi.

    Ka ụbọchị taa wetara onye ọbụla ihe ọma.

  3. Ndị buterela coronavirus na Naịjirịa eruola 15,682

    Achọpụtala mmadụ narị ise na otu (501) ọhụrụ bụ nje coronavirus na Naịjirịa dịka ụlọrụ NCDC kwuru ụbọchị Satọde.

    N'ime ndị a Imo nwetere mmadụ iri abụọ na otu (21), Enugwu iri na abụọ (12), Anambra iri na otu (11), ebe Ebonyi ji mmadụ iri (10).

  4. Ụnụ asaala chi Igbo ndịọma!

    Anyị na-anabata ụnụ n'ụtụtụ ụbọchị ụka a.

    Ọ ga-adịrị onye ukwu, ma onye nta mma.

    Ngwa ka anyị zọpụ ije n'iwetere ụnụ akụkọ gbasara nje covid-19.

  5. Ahụla mmadụ 627 ọhụrụ bu nje coronavirus na Naịjirịa

    Achọpụtala mmadị narị isii na iri abụọ na asaa (627) ọhụrụ bu nje coronavirus na Naịjirịa.

    N’ime ha Abia chitara mmadụ iri ise na anọ (54) ebe Enugwu ji mmadụ anọ (4) dịka ọnụọgụ ndị NCDC wepụtara ụnyaahụ si gosi. Lee ngosi ha ebe a.

  6. Nwunye onyeisiala mba ukraine ebutela coronavirus

    Olena Zelenska, nwunye onyeisiala mba Ụkraine bụ Volodymyr Zelensky ebutela coronavirus.

    Oriakụ Zelensky onye kwupụtara nke a na ụbọchị Fraide gbara ama na di ya na ụmụ ha abụọ ebughị ya bụ ọrịa.

    "Taa, enwetara mpụtara nnyocha kwuru na e nwere m ọrịa coronavirus."

    "Ọ bụ ozi ntụmadị."

    Vladimir na ụmụaka sokwa mee nnyocha ma na ha ebughị ya.O kwuru na ahụ siri ya ike mana ya ga-anọp.ụ iche dịka o kwesịrị.

    Ndị ọrụ mba Ukraine na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa ahụ na-echuzi ha ụra.

  7. Nwaanyị dị ime anwụọla n'ihi na ụlọọgwụ jụrụ ya

    Nwaanyị dị ime ọnwa asatọ bu coronavirus anwụọla n'ihi na enweghị ụlọọgwụ nabatara ya.

    Neelam Singh, onye Indịa nwụrụ n'ime ụgbọala gbatagbata e ji ebuga ya ụlọọgwụ dịka ụlọọgwụ itoolu jụrụ ịnabata ya.

    Ụfọdụ kwuru na ụlọọgwụ ha ejula kpamkpam, ebe ụfọdụ jụrụ ịnabata ya n'ihi egwu coronavirus.

    Di ya bụ Vihjender Sing sị na, "ihe mere enyeghị m ọnụ okwu."

    Ọrịa coronavirus na-akpa ike n'isiobodo India bụ Delhi dịka ọrịa ahụ jidere ọtụtụ mmadụ.

    Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ihe karịrị ọkara nde mmadụ bụ ihe nwere ike ibute ọrịa ahụ na Delhi ma e rute ọgwụgwụ ọnwa Julai.

  8. Gọọmentị Anambra steeti ga-agbachi ahịa Eke Awka

    Gọomentị Anambra steeti ga-agbachị ahịa Eke Awka dị n'okpuruọchịchị Awka Saụt site n'ụbọchị 15 nke ọnwa Juun.

    Ha kọwara na ọ bụ n'ihi na ndị ahịa ahụ dara iwu gọọmentị gụnyere: ekpuchighị ihu, enweghị mmiri ịkwọ aka nakwa anaghị enye mmadụ efe.

    Ozia si n'aka onye odeeakwụkwọ gọọmentị Anambra steeti bụ Solo Chukwulobelu.

    Ọ kwukwara na a ga-ebido atụmatụ akpọrọ "Curfew" n'okpuruọchịchị ahụ.

    Dịka ha si kọwa ọ bụ n'ihi ọnụgọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na-arị elu n'okpuruọchịchị ahụ.

  9. Nwunye Li Wenliang amụọla nwa ọhụrụ

    Nwunye Li Wenliang bụ onye chọpụtara coronavirus ma nwụọ site na ọrịa ahụ amụọla nwa ọhụrụ.

    Nwaanyị ahụ aha ya bụ Fu Xuejie kpọrọ nwa ahụ onyinye ikpeazụ si n'aka di ya.

    Cheta na ndị uweojii mba Chaịna nwụchiri ma megbuo Li mgbe ọ na-eti mkpu ọrịa coronavirus nke mechara gbuo ya.

    Mgbe ndị mmadụ gbarụrụ ihu maka ihe mere, gọọmentị ahụ tụgharịrị azụ welie ọkwa ya dịka odoguw na mba ahụ mgbe ọ nwụchara.

    Fu dere: "Di m, ị si n'eluigwe ahụ nke a? Ị nyela m onyinye ikpeazụ gị. A ga m ahụ ha n'anya kwanyere ha ugwu."

  10. Ọrụaka ga-efunarị mmadụ nde 39.2 na Naịjirịa maka coronavirus

    Ihe ruru mmadụ nde iri atọ na itoolu na ụma nwere ike itufu ọrụ ha tupu afọ 2020 agwụ n’ihi ihe isi ike so ọrịa covid-19 n’azụ.

    Nke si n’ọnụ kọmiti e hibere maka okwu akụnụba na Naịjirịa nke osote onyeisiala Yemi Osinbajo bụ onye isi ya.

    Kọmịti ahụ kọwara na n'ihi na ọnụ mmadụ agbịdị na-adatụ, ihe ruru nde dọlla narị anọ na ụma ga-efunarị gọọmentị etiti kwa ọnwa.

    Na ndụmọdụ ha dụrụ ha kwuru na ọ ga-adị mma ị wepụta atụmatụ metụtara ịkọ ọrụ ugbo, ịwulite okporoụzọ, nakwa ụlọ obibi nke ga-enyere aka nye ndị mmadụ ọrụ aka.

  11. Coronavirus egbuola ndị uweojii 170

    Ihe ruru ndị uweojii 170 anwụọla na mba Peru site n'ọrịa coronavirus.

    Ihe ruru puku iri na ndị uweojii a butere ya bụ ọrịa mgbe ha na-arụ ọrụ nchekwa na mmecho obodo nke mba ahụ nwere n'izuụka iri na abụọ.

    Minista na-ahụ maka nhazi ime obodo bụ Gaston Rodriguez bụ onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a ma kwuo na ndị uweojii puku anọ ọzọ na-edopu onwe ha iche.

  12. Ihe Buhari kwuru maka Covid-19 n'ozi ya

    N'ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 2020 onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere ọnụ n'okwu metụtara coronavirus.

    Ihe ndị o kwuru gụnyere:

    - O nwere olileanya na n'oge adịghị anya, mkpamkpa ọrịa a na-akpa ga-ebelata na Naịjirịa.

    - Na gọọmentị ya ga-atụgharị ọdachi a ka ọ ghọrọ ihe ọma site n'iwulite ngalaba ahụike ga-enyere aka merie ọrịa covid-19 ma dịrị nkwadobe maka ọrịa ọzọ yiri ya.

    - Ọ gwara ndị nrụpụta na ndị nyocha ha wepụta ụzọ a ga-esi meri ọrịa a.

  13. Ngalaba UN ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụaka na-arụ ọrụ nwereike ịgbali elu

    Ọrịa coronavirus emeela ka nde kwuru nde ụmụaka banye na nsogbu n'ụzọ ị bido ọrụ.

    Ngalaba UN kọwara na ihe nwereike ịbute nke a bụ na ụgwọ ọnwa ezinaụlọ na-ada site na mmebi coronavirus butere, ụmụaka ga-ebido rụwa ọrụ iji nyere ndị nne na nna ha aka.

    Ndị na-ahụ maka akụnaụba obodo kwuru na coronavirus a ga-ebute ntaramahụhụ dị ukwu n'akụnaụba mba ụwa niile.

    Ọnụọgụgụ nke UN wepụtara kọwakwara na ụmụaka na-arụ ọrụ si na nde 246 datuo rue nde 152 kemgbe afọ 2000.

  14. Ndị butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị Tọọzde dị 681

    Dịka ngalaba 'National Centre for Disease Control' si gụpụta, ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị Tọọzde dị 681.

    Nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị a na-achọpụta n'otu ụbọchị kamgbe ọrịa Covid-19 batara na Naịjirịa.

    Lee ka ọnụọgụgụ nke ụbọchị Tọzde si gbata kwụrụ:

    Lagos - 345

    Rivers - 51

    Ogun - 48

    Gombe - 47

    Oyo - 36

    Imo - 31

    Delta - 28

    Kano - 23

    Bauchi - 18

    Edo - 12

    Katsina - 12

    Kaduna - 9

    Anambra - 7

    Jigawa - 5

    Kebbi - 4

    Ondo - 4

    Nasarawa - 1

  15. Ụnụ abọọla Chi

    Igbo ndị ọma ụnụ abọọla chi.

    Daalụ maka isonyere anyị n'ụbọchị taa nke bụ ụbọchị pụrụ iche Naịjirịa na-eme emume ncheta ụbọchị onye kwuo uche ya.

    Ka ụbọchị taa wetara anyị ihe ọma.

  16. Ka ọ dị echinụ. Lahụnụ jụụ

  17. Gọọmentị Cross River ga-agbape ụlọakwụkwọ na Juun 16

    Gọọmentị Cross River steeti ekwuola na ha ga-agbape ụlọakwụkwọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun.

    Ha mee nke a, ha ga-abụ steeti mbụ gbapere ụlọakwụkwọ kemgbe gọọmentị etiti machiri ha niile.

    Dịka nkwuputa NCDC na-eme kwa ụbọchị, e nwebeghi kama otu onye butere ọrịa covid-19 na steeti ahụ.

    Gọvanọ Ayade kwuru na "akụrụngwa nchekwa gụnyere mkpuchi ihu bụ nke a ga-enye ndị ụmụakwụkwọ na-efu"

    O kwuru na nrụpụta akụrụngwa ndị a so na usoro o wepụtara iji buso covid-19 agha na steeti ya.

  18. Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị si mba ofesi abata

    Ministrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị na-achọ ị si mba ofesi bata Naịjirịa.

    Ewepụtara nke a site na mkpebi nke otu na gọọmetị etiti hibere maka covid-19 mere maka njem ofesi.

    Lee ihe ndị dị mkpa dị n'ime ya ga-ebido n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun.

    -Mmadụ niile si mba ofesi abata ga-eme nyocha n'izuụka abụọ tupu ha abata Naịjirịa.

    - Nyocha ha ga-egosiri na ha ebughị ọrịa covid-19

    - Akara ekwentị nakwa ebe obibi nke ndị njem nyere ndị gọọmentị ga-abụrịrị nke ezigbo ya.

    - Ị bata Naịirịa, ị ga-edebanye aha gị nakwa ebe ị na-aga na Naịjirịa.

    - Ị ga-enyefe onwe gị n'aka ndị ọrụ ọdọụgbọelụ maka nyocha ọrịa covid-19.

    - Mmmadụ niile batara Naịjirịa ga-edopu onwe ha iche rue izuụka abụọ.

    - Ndị agaghị anọ n'Abuja nakwa Legọs ga-ala na steeti ebe ha bi maọbụrụ na emechaa ha nyocha chọpụta na ha-ebughi ọrịa a.

  19. Ihe mere m ji asachasị ebe a na-agwọ ndị bu coronavirus

  20. Ọṅụọgụgụ ndị buterela covid-19 n'Amerịka agafeela nde abụọ

    Ọnụọgụgụ nke ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe bụ CDC wepụtara gosiri na ndị bu ọrịa a mba Amerịka agafeela nde abụọ.

    Ha kwuru na ụfọdụ ihe ndị a bụ n'ihi na ụfọdụ steeti wụlitere nyocha ha na-eme ndị mmadụ kwa ụbọchị.

    Steeti ebe ndị ọ kachasị metụta bụ New York, New Jersey, California, Illinois, Massachusetts, Texas, Pennsylvania, Michigan nakwa Florida.