You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Unu abọọla chi e!

    Ụbọchị taa makwara gị mma o!

    Chineke ga-azachapụ ihe ọjọọ ọbụla ga-achọ ịbịakwute gị. Iseeee!

    Ka Chineke mezie okwu. Iseeee!

    Daalụ maka isonye anyị taa.

  2. Ka chi foonụ

  3. Ikpeazu na ndị gọvanọ ọzọ buterela coronavirus na Naịjrịa, Gọvanọ Ikpeazu, El-rufai, Mohammed na Makinde

    Gọvanọ Okezie Ikpeazu esorola na ndị gọvanọ buterela coronavirus na Naịjirịa

    Nyocha mbụ o mere n'ụbọchị Satọde 30, Mee gosiri na o bughi ya mana nke abụọ o mere n'ụbọchị 4 Juun gosiri na o bu ọrịa a.

    Ikpeazu adịla na mbụ wezuga onwe ya iche ngwa ngwa nyocha a pụtara ebe ndị dọkịta na-elekọta ya ma nye iwu ka osote were ọchịchị.

    Ndị gọvanọ ọzọ buterela ọrịa gụnyere;

    Gọvanọ Bauchi Steeti bụ Bala Mohammed

    Gọvanọ Bala Mohammed nke Bauchi Steetị butere coronavirus n'ihe dịka ọnwa Maachị 2020.

    Ọnụ na-ekwuru ya bụ Muktar Gidado sị na ụlọọrụ NCDC nyochara Mohammed ahụ ugboro isii tupu ahụ coronavirus n'ahụ ya.

    N'ihe dịka n'ụbọchị 9 ọnwa Eprelụ, gọvanọ Bala Mohammed dere n'akara twitter ya na ọ gbakeela.

    Gọvanọ Kaduna Steetị bụ Nasir El RufaiI

    N'ụbọchị 29 ọnwa Maachị ka gọvanọ Ahmed Nasir El-Rufai kwupụtara na o butela coronavirus.

    O kwukwara na o dopula onwe ya iche dịka ntuziaka ụlọorụ NCDC si kwuo maka ndị na-egosi njirimara ọrị a.

    N'ụbọchị 23 ọnwa Eprelụ ka gọvanọ El-Rufai pụtara kwuo na ọ gbakeela dịka ọ nọchara izuụka anọ na nlekọta ndị ọrụ ahụike.

    Gọvanọ Oyo Steetị bụ Seyi Makinde

    Gọvanọ Oyo Steetị bụ Seyi Makinde kwupụtara n'akara twitter ya na o butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị 30 ọnwa Maachị.

    Ọ sị na ọ naghị egosi njirimara ọrịa a mana o dopuru onwe ya iche.

    Ọ teeghi aka n'ihe dịka ụbọchị 5 ọnwa Eprelụ ka gọvanọ a kwuru na ọ gbakeela ma keele ndị mmadụ na ndị na-ebuagha megide coronavirus.

    Nke a gosiri na coronavirus achọghị ịma onye ji ego na onye na-ejighi ego, ọ maghị onye na-achịchị maọbụ onye a na-achị.

    Ọ ka na-akpa ike na Naịjirịa, dịka ọ dị n'ụbọchị taa, ndị buterela ya dị 12,486 ebe ndị nwụrụ anwụ dị 354.

  4. Ọ bụ nyocha ndị e mere agụkọghi n'oge mere ọnụọgụgụ Abia steeti ji rịa elu - Osuji

      • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

    Kọmịshọna ahụike nke Abia steeti bụ Joe Osuji, akọwaala ihe mere ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Covid-19 ji rịa oke elu n'ụbọchị Sunde.

    Ọ kọwara na ọ bụ nyocha ndị e zipuru n'izuụka gara aga (nke iri ise n'ime ihe karịrị narị abụọ bu ọrịa ahụ) ka eweputara n'otu ụbọchị.

    O kwukwara na o nwere mmadụ iri na asaa ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ ugbua NCDC gụnyere na ọnụọgụgụ ha kpọpụtara n'abalị ụbọchị ụka.

    "Anyị ka na-edebe usoro NCDC wepụtara maka nchekwa onwe n'ihu ọrịa a ma jisike na-ezipu ozi gbasara ya bụ ọrịa n'Abia steeti niile" ka o kwuru.

    Cheta na Abia steeti nwere ọnụọgụgụ iri isii na asaa nke gafere steeti dị ka Legọs, Kano nakwa Abuja nke tụrụ ndị mmadụ n'anya

  5. 'Oge imepe ụlọụka erubeghi' - Tunde Bakare

    Tunde Bakare bụ onyeisi ụlọụka Citadel Global Community Church amabu dịka Latter Rain Assembly, ekwuola na ọ dịbeghi nkwadebe imepe ụlọụka ya.

    O kwuru na ọ baghị uru itinye ndị na-aga ụka ya n’ọnọdụ ize ndụ maka ọrịa coronavirus, ma kwuo na oge erubeghi imepe ụlọụka na nke alakụba.

    O kwuru na ebere ya na-emere Naịjirịa n'ihi na ụfọdụ ndị ndu ụlọụka nakwa ndị nke alakụba na-akwanye gọọmentị ọkụ n'ike ka ha mepee ụlọekpere.

    O kwuru nke a oge ọ na-edo ụka site n'ịntanetị n'ụbọchị ụka bụ asaa nke ọnwa Juun.

    Bakare ji mkpamkpa coronavirus a tụnyere mgbe Chineke ji oke idemmiri mebie ụwa n'Akwụkwọ Nsọ, kwuru sị na "Noah amapụtaghị n'ụgbọmmiri; o bu ụzọ zipu nnụnụ ka ọ gaa mara etu ihe si aga.

    Nnụnụ ahụ alaghachiteghi. O zipukwara ọbọgwụ ugboro abụọ; na nke ugboro atọ, ọ lọghachịtaghị.

    Ọ ma na ọ dịla mma ịpụta ezi, mana ọ pụtaghị ruo mgbe Chineke kwuru sị 'Noah, pụta!'

    Chineke kpọchiri ya ma kpọpụtakwa ya. Ka anyị nwee ndidi. Ugbua ha chọrọ ị na-ebuga ndị mmadụ n'ili ha ma na-ekpere ezinaụlọ ha ekpere.

    Ka anyị nọrọ n'ime ruo mgbe ahụ mkpamkpa a ga-ebi."

  6. Mmadụ 67 ebutela coronavirus n'Abịa steeti

    Mmadụ iri isii na asaa ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus n’Abịa steeti dịka ọnụọgụgụ ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Naịjirịa bụ NCDC si kwuo.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri asatọ na atọ ebutela ya bụ ọrịa na steeti ahụ.

    Tinyekwuo mmadụ itoolu ọhụrụ butere ya n’Imo steeti, ọnụọgụgụ ndị e wepụtara butere ya ọhụrụ na Naịjirịa ụnyaahụ bụ narị abụọ na iri isii.

  7. Na Akpọtụ Ugbu A, Aka na-achị Abia steeti ebutela Coronavirus

    Gọvanọ na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ebutela ọrịa Coronavirus.

    Onye bụ ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị.

    O kwuru na dịka ọ dị ugbua, Ikpeazu edopula onwe ya iche ma na-anata ọgwụgwọ site n'usoro NCDC wepụtara.

  8. Gịnị mere #schoolreopening ji ewu?

    Taa bụ ụbọchị mba Sawụt Afrịka hiwere maka mmepe ụlọakwụkwọ dị icheiche.

    Nke a mere ka #schoolreopening na-ewu na Twitter dịka ụfọdụ ndị ụmụakwụkwọ na-egosi onwe ha ebe ha kwadoro maka ị ga akwụkwọ.

    Ndị ọzọ jikwa ohere ahụ akatọ atụmatụ gọọmentị ịmepe ụlọakwụkwọ na-ekwu na ude coronavirus ka na-ede.

    Cheta na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ na mba Kamerun riri elu dịka agbapere ụlọakwụkwọ n'izuụka gara aga.

  9. Nnọọnụ na peeji anyị taa

    Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo!

    Anyị amalitela n'izu ọhụrụ ọzọ ịwetara gị ihe niile dị mkpa maka Coronavirus

    Ị ma mba ebe agbapere ụlọakwụkwọ pramarị na ndị ọzọ? Chọpụta ya ebe a

  10. Etu ndị ụka ji kaa ụka taa n'ihi coronavirus, Gọọmentị asịla ụlọụka na ebe okpukperechi ndị ọzọ mepee

    Ụlọụka n'Abuja nakwa steetị ndị ọzọ na Naịjirịa amalite ofufe dịka ọnwa atọ gachara emechiri ha n'ihi coronavirus.

    Mana gọọmentị nọrọ n'ụbọchị Tuzde nye iwu ọhụrụ ga-achekwa usoro e ji aka ụka.

    Nke a mere ọtụtụ ndị gara ụka, tupu ha baa n'ime ụlọụka sara aka ha mmiri ma yiri mkpuchi

    Ụfọdụ ndị debanyere aha n'akwụkwọ mana ọ bụghị ụlọụka niile mere nke a

    Iwu ndị na-echekwa usoro e ji aka ụka

    • A gaghị ekwe n'aka, ebi ọma maọbụ mmetuta ahụ n'ụdị ọbụla
    • Ọnụọgụgụ ndị bịara ịka ụka ga-adị obere
    • A ga-ede akara n'ala ga-ahazi nnọpụ iche
    • Ndị si n'otu ezinaụlọ ga-anọkọ ọnụ
    • Oge ikpe ekpere kwesịrị ịgba agbasa
    • A ga-enye ọtụtụ ọnụụzọ e ji abata maọbụ pụọ n'ụlọụka.
    • Azụmaahịa ọbụla agaghị adị n'ụlọụka
    • Ọnụ mpio niile ga-eghere oghe
    • Ebe ọbụla ga-adị ọche n'oge niile
    • A ga na-asa ma na-efe tụsasịa mgbe niile
  11. Mmadụ karịrị 400,000 anwụọla site na coronavirus

    N'ofesi, ndị nwụrụla site n’ọrịa coronavirus agafeela puku narị anọ dịka ụlọọrụ mpịkọ John Hopkins si depụta.

    Ụlọọrụ ahụ nke malitere ịpịkọ ogo gbasara coronavirus kamgbe ọrịa a pụtara kwuru na mmadụ karịrị nde isii na ụma buterela ya bụ ọrịa n'ụwa niile.

    Mba Amerịka kacha nwe ndị bu ọrịa, Ha kacha nwekwa ndị nwụrụlanụ site n'ọrịa a, Uk na-eso, ebe Brazil bụ nọ n'ogo nke atọ.

    Europe, Italy, France nakwa Spain ketere oke ha ebe mmadụ karịrị puku anọ nwụrụla na Chaina n'ime mmadụ puku iri asatọ butere coronavirus ebe ahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ekwu na ha echeghị na Chaina na-ekwu eziokwu.

    Ka ọ dị ugbua, Brazil

  12. Mmadụ 23 butere coronavirus ọhụrụ a n’Ebonyi steeti,17 n'Anambra

    Mmadụ iri abụọ na atọ butere coronavirus ọhụrụ a n’Ebonyi steeti ebe iri na asaa butere ya n’Anambra steeti.

    Nke a pụtara ihe n’ọnụọgụ Nigeria Center For Disease Control wepụtara n’abalị isii nke Junu nke gosiri na mmadụ narị atọ,iri asatọ na itoolu na nchịkọta butere ọrịa ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ gafere puku iri na abụọ ebutelara ọrịa a na Naịjirịa, mmadụ gafere puku atọ gbakerela ebe narị atọ na ụma nwụrụla.

    Na mpaghara ọwụwa anyanwụ

  13. Ndewonu Igbo ndị ọma!

    Anyị na-anabata ụnụ n'ụtụtu a ka anyị malite iwetere ụnụ akụkọ gbasara etu coronavirus si akpa mkpa mkpa n'akụkụ ụwa niile.

  14. AfDB etinyela aka n'akwụkwọ maka ibinye Naịjirịa nde $288.5, Etinyela aka n'akwụkwọ maka ibinye Naịjirịa nde $288.5

    African Development Bank etinyela aka n’akwụkwọ maka ịgbazinye Naịjriịa nde narị Naịra abụọ, iri asatọ na asatọ n’ụma ise maka agha coronavirus.

    Otu onyeisi na ụlọọrụ ahụ bụ Ebrima Faal sị na ya bụ ego ga-enyere Naịjirịa aka ibuso ya bụ ọrịa agha ka o kwesiri.

    Faal n'ekwu na-ewezụga nke ọkụ ọkụ aga eme ugbua, na ha ndị gọọmentị etiti Naịjirịa na-etinye ọnụ n'okwu maka ihe a ga-eme ka ego ha na-akpata niile Naịjirịa mụbawanye n'ọdị n'ihu.

    Ndị ụlọakụ Afrịka a sị na ha na-etinye anya ịhụ na eji ego ahụ mee ihe ekwesiri iji ya mee.

    Ha sị na ha nyere Naịjirịa afọ iri iji kwụcha ya bụ ụgwọ bụ nke ha sị ga-eweta ezigbo ndụ nye ndị Naịjirịa.

  15. Anyị ga na-agbachi ọnụụzọ akwammiri Naịja - Gọọmentị Anambra

    Gọọmentị Anambra sị malite n’ụbọchị ise nke ọnwa Juun na ha ga na-emechi akwammiri Naịja site n’elekere asaa nke abalị.

    Akwukwọ ozi odeakwụkwọ gọọmentị bụ Solo Chukwulobelu wepụtara, sị na ọ bụ nkwekọrịta ha na gọọmentị Delta Steetị.

    Ọ sị na mmachi ngagharị na Delta na-amalite n'elekere asaa nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ mana nke Anambra bụ n'elekere iri ruo elekere anọ nke ụtụtụ.

    Chukwulobelu sị ka uche onye ọbụla dị na ya.

  16. Etu coronavirus si metụta ala Igbo n'ime ọnwa isii

    Ihe onyonyo a bụ nchịkọta etu coronavirus si bata nakwa metụta ala Igbo n'ime ọnwa isii ọ pụtara.

    Ọ rụtụkwara aka etu gọọmentị steetị ndị dị n'Ọwụwanyanwụ si kee nkwụcha maka ọrịa a.

    Nke gụnyere Abia, Anambra, Ebonyi, Enugwu nakwa Imo Steetị.

  17. WHO sị ka onye ọbụla na-eyi mkpuchi ihu n'etiti ọha

    Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwugharịala sị ka onye ọbụla gbalịa na-eyi ihe mkpuchi imi na ọnụ ọkachasị mgbe ị nọ n’etiti ọha.

    Ha sị na nyocha ọhụrụ gosiri na nke a ga-enye aka igbochi mbute ọrịa coronavirus.

    Tupu ha ekwuo nke a ọtụtụ mbaụwa gụnyere Naịjirịa adịla na mbụ nye ihu ka ndị mmadụ na-eyi mkpuchi ihu n'ọha.

    Na mbụ WHO rụrụ ụka na onwegjhi nyocha sị ka ndị ahụ dị na-eyi mkpuchi ihu mana ugbua ha ekwugharịala

    Dọkịta Maria Van Kerkhove, onye ndu n'agha megide coronavirus gwara ndị ntaakụkọ na a sị ka ndị mmadụ malite iyi mkpuchi n'ebe mmadụ nwereike ibute ọrịa a ọsịsọ.

  18. BBC Nkeji, Nchịkọta akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji.

  19. Ọrịa coronavirus ji nwayọọ arị elu ọrji n'Ọwụwanyanwụ, Ndị bu ya na Steetị dị iche iche

    Mmadụ isii n'ime mmadụ narị atọ na iri abụọ na asatọ ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa si n'Enugwu Steeti.

    Nke a dị n'ozi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ wepụtara n'abalị ụnyaahụ.

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a n'Enugwu agbagoola ruo iri atọ, Ebonyi dị iri asatọ, Imo dị iri anọ na asaa, Abia dị iri na ise, ebe Anambra dị iri na abụọ,

    Ihe nke na-aegosi bụ na ndị buterela coronavirus na mpaghara ọwụwanyanwụ ji nwayọọ na-arị elu ọrji.

  20. Mmadụ 328 ọhụrụ ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ụlọọrụ NCDC ekwuola na mmadụ narị atọ, iri abụọ na asatọ ọhụrụ ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa nke mere ndị buterela ọrịa ji na-achụ puku iri na abụọ (11844).

    Ndị ọrịa a gburula dị narị atọ na iri atọ na atọ ebe ndị gbakerela dị puku atọ, narị isii na iri itoolu na isii.

    Nke a na-abịa n'ime ụbọchị ole na ole gọọmentị etiti welatakwuru aka na mmachi ha tinyere n'obodo maka ọrịa coronavirus site n'elekere iri nke abalị ruo elekere anọ nke ụtụtụ.