Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Otu onye ebutela ọrịa Coronavirus n'otu Tottenham
Otu onye ebutela ọrịa Coronavirus n'otu Tottenham dịka ha mechara nyocha.
Onye ahụ ga-ebido ịdopu onwe ya rue abalị asaa.
Ha kwuru na ha agaghị akpọpụta aha onye ahụ maka iwu kpuchiri ahụike na mba Briten.
Sọsọ otu onye ahụ ka achọpụtara bu coronavirus dịke enyochara mmadụ 1,197.
Njem ụgbọelu n'etiti Naijirịa ga-ebido n'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun
Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijirịa bụ " Nigeria Aviation Authority" ekwuola na a ga-emepe ọdọ igboelu ise na Naijirịa maka njem ụgbọelu n'ime Naijirịa.
Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun ka ha ga-ebido ọrụ.
Ọdọ ụgbọelu ndị a bụ nke Abuja, Legọs, Port Harcourt, Kano na Imo steeti.
Onyeisi ngalaba a bụ Musa Nuhu kwuru na dịka oge na-aga na ha ga-eji nwayo mepee ọdọ ụgbọelu ndị ọzọ.
Kama Nuhu kwuru na mmachị njem ụgboelu na-abata maọbụ efepụ na Naijirịa ka nọ kwa na mmachi tupu ụbọchị e hiwere ka ha bido.
Kama ụgbọelu na akpọlata ndị Naijirịa tọrọ na mba ọzọ na nke ndị ọrụ nchekwa ka nwere ohere ifegharị.
Nke a na-apụta ihe dịka ọnụọgụgụ ndị na-ebute Coronavirus ka na-agbago ụbọchi niile na Naijirịa.
Dịka nga;aba NCDC si depụta n'akara twitter ha, mmadụ narị atọ na iri anọ na asatọ ọzọ ebutela ya bụ ọrịa ebe mmadụ iri abụọ na atọ n'ime ha si Ebonyi steeti, isii sị Enugwu,asatọ si Delta ebe Legọs steeti ji nwere mmadụ otu nari na iri isii na atọ bu ya bụ ọrịa.
Ụgbụ a, ọnụọgụgụ ndị bu ya na Naijirịa bụ puku iri na otu, otu narị na iri isii na isii.
Ụtụtụ Ọma !!
Ọnye bọrọ chi kelee Chi ya.
Ka anyị zọpụ njem akụko niile maka Covid-19 dịka o si amasị gị.
Ihe ruru 75% ndị bu nje COVID-19 amaghị eme ha sị bute ya
Ndị Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ọtụtụ ndị achọpụtara bụ nje coronavirus amaghị ebe ha siri bute ya. Ha sịkwa na agwa ahụ bụ njirimara ọrịa na aga n'ikuku nke gosiri na o sizi n'aka fere aka ugbua.
'Uka nwereike ịso usoro mgbochi nje coronavirus karịa ndị ahịa na ndịọrụ ọzọ' - Most Rev Alfred Adewale
Onye bụ Achịbishọp ndị ụka Katọlik na Legọs steeti bụ Most Rev Alfred Adewale agbarụọla ihu na mkpebi Gọọmenti Legos kpebiri ị ga n'ihu na mmachi ụlọụka na ebe okpukperechi ndị ọzọ sị na imeghe ahịa hapụ ụka maka agha coronavirus adabachaghị.
Adewale kpọkụrụ gọọmentị Legọs ka ọ mee Nweke ka ọ mere Okafo.
O kwuru na ndị ụka nwere ohere ịso usoro mgbochi nje coronavirus karịa ndị ahịa na ndị ọzọ.
Achịbishọp kwuru nke a maka okwu Kọmishọna ndozi obodo Legọs steeti bụ Anofiu Elegushi bụ onye kwuru na ụka agaghị amalite na steeti ahụ ugbua.
N'ozi onye mgbasa ozi ndị ụka bụ Rev. Fr. Anthony Godonu zigaara ndị ntaakụkọ, onyeisi ụka ahụ sị na " Ọ dị mwute na ọnụọgụ ndị bu nje COVID-19 na-arị nke gosiri na ọ bụ eziokwu. Anyị makwa n'ezie na ya bụ nje ga-anọteaka dịka nelele ga-achọpụtakwa ndị ọzọ bụ ya, mana agbanyeghị,ndụ gana aga n'ihu. Anyị kwenyere na ọgbakọ ụka ka nwee ike na ohere ịso usoro ịgbochi ya bụ nje karịa ndị ọrụ na ndị ahịa ndị ọzọ".
Ndị ọrụ ahụike 812 ebutela ọrịa coronavirus
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na naijiriaa kpọrọ Nigerian Centre for Disease Control(NCDC na Bekee ekwuola na opekata mpe ndị ọrụ ahụike 812 ebutela ọrịa coronavirus.
Onyeisi NCDC bụ Chikwe Ihekweazu bụ onye gbara ama a ụbọchị Tuzde kwuru na mmadụ 29 n'ime ha bụ ndị ọrụ NCDC.
Naijiria nwere mmadụ 10,819 nwere ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 314 nwụrụla deaths.
A na-atụ uche na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike nọ n'egwudịka otu jịkọrọ ndị dọkịta na-ateti mkpu na ndị ọrụakụ ike nọ n'ihu ọgụ a enweghị ngwaọrụ nchekwa ahụ zuru oke(PPE).
Mana Ihekweazu kwuru na ha nyere ndị ọụ ha nngwa nchekwa ahụ zuru oke.
Na nsonso otu jịkọro ndị ọrụ ahụike n'ụfọdụ steeti na-eti mkpu na ha ga-agba abụbụọrụ n'ihi enweghị ngwa nchekwa ahụ zuru oke.
Coronavirus ebutela ndị na-awakpo ụmụaka ịchọha n'Intaneti na mba Kenya
Ndị uweojii mba Kenya etiela mkpụ na ndị na-awakpo ụmụaka ebidola ịde ha n'Intanetị dịka ha na-aga ebe ahụ agụ akwụkwọ maka mmechi ụloakwụkwọ.
Onyeisi ndị ngalaba na-eme nyocha nke kenya kwuru na ndị omekome a na-eto ụmụaka a tupu ha a gwa ha ka ha ziye ihe onyonyo ebe ha gba ọtọ.
Ngalaba a rịro nne na nna ka ha mara ihe ụmụ ha na-eme n'Intanetị ma rịọ ha ka ha kwa ndị uweojii ma ha chọpụta na enwere onye omekome na-ede nwa ha.
Mmadụ 25 nọ otu bọọlụ Karpaty na mba Ukraine ebutela coronavirus
Mmadụ iri abụọ na ise ndị na-agba bọolu na ndị ọrụ otu bọọlụ FC Karpaty Lviv ebutela ọrịa coronavirus.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mmadụ iri abụọ na ise n'ime mmadụ iri isii na ise butere ya bụ ọrịa.
Dịka ọ dị ugbu a edopụla ndị otu ahụ niile iche maka ọgwụgwo coronavirus.
Otu Karpaty kwuru na ha ga-ebido kwa asọmpị oge ndopu ha gwụsịrị ma rịo ndị na-aghazị asọmpị bọọlụ na mba ahụ ka ha hapụ iwkụsị asọmpị bọolụ ha maka ihe dakwasara otu ha.
Kedụ akụkọ ndị na-ewu n'ụtụtụ a?
Ọ bụ asị na anyị ezighị WHO ozi maka Coronavirus n'oge
Mba Chaịna ekwuola na nchọpụta na-ekwu na ha agwaghị ngalaba WHO maka ọrịa coronavirus n'oge abụghị eziokwu.
Onye na-ekwuchitere ngalaba na-ahụ maka mmekọ mba ụwa bụ Zhao Lijian kwuru na ihe ndị Associated Press depụtara na ha gburu oge nke ukwu ma mee ka o siere ndị ọrụ WHO ị mata ihe na-eme bụ asị ọcha.
Ndị AP depụtara akụko na ndị mba Chaịna gburu oge tupu ha ewepụta ozi maka ọrịa coronavirus.
Ka nke a na-eme ka ndị ngalaba WHO na-eto mba Chaịna maka etu ha si alụso coronavirus ọgụ ya na etu ha si eke ozi maka ya bụ ọrịa n'oge.
Ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na Kamerun agbagoola dịka ha mepere ụlọakwụkwọ ha.
Ndị bu Coronavirus na mba Kamerun arịala elu nke ukwu kamgbe ha mepere ụloakwụkwọ ha n'ụbọchị mbụ nke Juun.
Mba Kamerun kwuru na mmadụ 254 ọzọ butere ya n'ụbọchị Monde ebe mmadụ 188 ọzọ butere ya n'ụbọchị Tuzde.
Gọọmentị Kamerun kwuru na ha etinyela usoro nchekwa nke gụnyere ihicha ụlo akwụkwọ, mkpuchi imi na ihe eji ehicha aka.
Ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba ahụ ekwuola na iwe ha ga-adakwasị onye nkuzi ọbụla na achọghị ịbịa ọrụ maka ụjọ coronavirus.
Ugbua mmadụ puku isii, na narị ise na iri asatọ na ise ebe mmadụ narị abụọ anwụọla.
Ụlọikpe Sawụt Afrịka atụgharịala iwu machiri obodo maka coronavirus
Otu ụlọikpe na mba Sawụt Afrịka ekpebiela na iwu gọọmentị jiri machi
obodo iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus dara iwu.
Ha kọwara na iwu ndị ahụ siri ike gafee etu o si kwesi ma kwu kwa na o nweghi ihe akaebe gosiri na ọ ziri ezi n'igbochi ọrịa ahụ.
Ha nyekwara gọọmentị ụbọchị iri na
anọ iji gbanwee ma wepu iwu ndị a.
Gọọmentị ahụ ekwuola na onwe ha na ha ga-enyocha ma ṅogharịa iwu ahụ ha tinyere maka mmachi obodo.
Equatorial Guinea enyela onye nnọchiteanya WHO ọsọ na mba ha
Mba Equatorial Guinea asịla ndị ngalaba WHO ha kwara si mba ha pụo maka ebubo maka ibipụta ọnụọgụgu ụgha maka ndị bu ọrịa coronavirus na mba ha.
Ọ bụ onye nnọchite anya ngalaba ahụ bụ Triphonie Nkurunziza ka ha na-ebo ebubo a.
Praịm Mịnịsta Equatorial Guinea bụ Pascual Obama Asue kwuru sị "Anyị na WHO enweghị nsogbu kama ọ bụ onye nnọchite anya ha nọ Malabo".
Dịka ọ dị ugbu a, Nkurunziza ka nọ dịka amachịrị njem ụgbọelu kama ọnụ ọgụgụ ndị WHOI depụtara ugbu a na nke ndị gọọmentị deputara abụrụla otu.
Osote Gọvanọ Bauchi steeti ebutela coronavirus
Osote Gọvanọ Bauchi steeti bụ Baba Tela ebutela ọrịa coronavirus.
Tela bụ kwa onyeisi ngalaba steeti ya hiwere maka coronavirus.
Akwụkwọ gọọmentị steeti ahụ depụtara na-ekwu na ọ bụ mgbe Mazi Tela na-arụ ọrụ ya ka o butere ọrịa coronavirus.
Dịka ọ dị ugbu a, edopula ya iche maka ọgwụgwọ ma nweta kwa ndị niile ha na Tela nwere mmekọ sị ha dopụ onwe ha iche tupu mgbe nyocha ha ga-apụta.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Bala A. Mohammed rịọrọ ndị steeti ya ka ha rubere usoro gọọmentị wepụtara isi maka nchekwa coronavirus.
Ụlọọrụ Nigerian Centre for Disease Control edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ narị abụọ na iri anọ na otu ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ puku iri, na narị asatọ na iri na itolu (10,819) bụ ya bụ ọrịa na Naijirịa ebe mmadụ puku atọ na narị abụọ na iri atọ na itolu.
Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo
Taa bụ ụbọchị ọma
Igbo ndị anyị ji eme ọnụ, ka chi foo nụ
Onye ji ihe nwata welie ya elu...
A na-eyi ndị bu coronavirus egwu na mba Mozambique
Ndị ọrụ ahụike mba Mozambique etiela mkpu na ndị mmadụ
na-akpa oke megide ndị bu coronavirus.
N’ụfọdụ obodo dịka Beira a na-eyi ndị bu ya bụ ọrịa
egwu si na aga e ti ha ihe.
Nke a mere ka ndị na-egosi njirimara ya bụ ọrịa anaghizi ekwe abia ụlọọgwụ.
Nke a mere ka ndị ahụike na mba ahụ na-agba mbọ ịnye ndị bị n'ime obodo ndụmọdụ ka ha bia ụlọọgwụ ma ọ bụrụ na ahụ adịghị ha.
Ndị ọrụ ahụike kwukwara na nke a mere ka ha welata aka n'etu ha sị ewepụta ozi maka ọrịa coronavirus ọkachasị ihe dịka obodo enwetere ndị bu ọrịa coronavirus.