You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Daalụ maka isonye anyị taa

    Echi ga-abụ echi ọma.

    Ka chi foo!

  2. Coronavirus abanyela steeti niile dị na Naịjirịa - NCDC

    Ngalaba na-ahụ maka ịkwụsị mgbasa ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola sịte n'ọnụ onyeisi ha bụ Chikwe Ihekweazu, na e nweghị steeti coronavirus abanyebeghi na Naijirịa.

    Ọ bụ na nzụko ha na ndị ntaakụkọ na ngalaba onyeisiala họpụtara maka ibuso ọrịa coronavirus agha nwere n'ụbọchị Monde, ka o kwuru nke a.

    Ihekweazu kwuru nke a n'agbanyeghị na Krọs Riva steeti ekwubeghị na ha nwere onye bu ọrịa coronavirus.

    Ọ rịọkwara ndị mmadụ ma sị ha ka ha hapụ itu ụjọ ime nnyocha ma ọ bụrụ na ahụ ha na-egosi njirimara ọrịa coronavirus.

    O kwukwara na ọ fọrọ naanị steeti isii maọbụ asaa bụ ndị na-enweghị ebe nnyocha ọrịa a na Naijirịa ugbua.

  3. Gọvanọ Okezie Ikpeazụ na ha agbake n'ọrịa Coronavirus, Nke a si n'ọnụ Onyebuchi Ememanka bụ ọdeakwụkwọ mgbasaozi gọọmentị Abia

    Ọdeakwụkwọ mgbasaozi gọọmentị Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti na ha agbake site n'ute ọrịa coronavirus.

    Ọ gwara BBC Igbo nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ etu ihe si kwụrụ n'Abia Steeti n'agha gọọmentị na-ebu megide coronavirus.

    Ememanka kwuru "Nna anyị ukwu nọ ya, na-agbake nke ọma site n'amara Chineke.

    O nweghi ihe egwu dị, ọnọdụ ya dị jụụ mana ihe banyere okwu ahụike abụghị ihe e ji ike eme".

    Ememanka gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị Abia enwetela akụrụngwa e ji enyocha iji chọpụta ndị bu coronavirus.

    Ọ sị mgbe gọvanọ Ikpeazu kwuru maka ya na ndị mmadụ chere na ọ bụ itu ọnụ kama ugbua ọ pụtala ihe.

    Na ihe mere o ji gbuo oge iruta ha aka bụ maka mmachi amachiri njem ụgbọelu si mba ofesi n'oge a.

    Ememanja sị na ha amalitela ọrụ itinye ihe ndị a n'ụlọọgwụ ndopu dị n'Umuahia nakwa Aba.

  4. Gọọmentị Naịjirịa sị ha akwụọla ndị ọrụ ahụike ijeri naịra 4.642 maka coronavirus

    Gọọmentị Naịjirịa sị na ha akwụọla ndị ọrụ ahụike ijeri naịra 4.642 dịka ụgwọ izendu n'oge coronavirus a.

    Nke a dị n'ozi ha wepụtara n'akara twitter ha.

    Ha sị na ọ bụ ndị ọrụ ahụike dị mmadụ 55,031 si n'ụlọọrụ ahụike dị 35 ritere ego a ebe ha sị na ndị ọzọ ka na-abịa.

  5. Ndị buterela coronavirus na Naịjirịa akarịala puku iri abụọ

    Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa akarịala puku abụọ dịka mmadụ narị anọ , iri atọ na isii ọhụrụ butere ya na Sọnde.

    Nke a mere ọnụọgụgụ ugbua ji dị puku iri abụọ, narị abụọ na iri anọ na anọ, ndị gbakerela dị puku isii, narị asatọ na iri asaa na itoolu ebe ndị nwụrụla dị narị ise na iri na asatọ.

    N’ime ndị a, mmadụ iri abụọ na itoolu si n’Imo Steeti, iri na asatọ si n’Enugwu ebe otu mmadụ si n’Abia Steeti.

    Nke a dị n'ozi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC n'ịchafụ wepụtara.

  6. Igbo mma mma nụ oooo

    Unu abọọla chi nke taa? Izuụka a ga-adịrị anyị niile na mma

    Ngwa buru oche gị bịa nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ niile gbasara coronavirus.

  7. Ka chi foo nụ ụmụ Igbo

    Echi ga-abụ echi ọma...Ka chi bọọ nụ!

  8. Naịjirịa enwetala nkwado UN na EU maka agha coronavirus

    Nigeria enwetela enyemaka ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m) maka agha ana ebuso nje coronavirus.

    Ihe onyinye ndị a gụnyere akụrụngwa ndị ọrụ ahụilke sị na aka ndị European Union nakwa ndị otu United Nations.

    Ọ bụ n'akpaego ndị mbaụwa tụkọtara ka e sị zụta ihe ndị a nakwa ịhe ndị ka na-abịa n'ọdị n'ihu.

    Akụrụngwa ndị a gụnyere "oxygen concentrator" dị 545, akụrụ ngwa eji eme nlele coronavirus karịrị 100,000, ọtụtụ ihe eji enyichi ahụ na ihe ndị ọzọ ga-enyere agha coronavirus aka na Naịjirịa.

    Otu Unicef kwuru na akụrụngwa ndị a dị mkpa ga-enyere ndị ọrụ ahụike nọ n'ihu agha coronavirus aka nke ukwuu ịhụ na e mere ọtụtụ mmadụ nyocha ka o kwesiri ma hụkwa na e letere ndị nwere nje a anya nke ọma.

    Enyefere Naịjirịa akwụrụngwa ndị a n'aka site n'aka ndị ọrụ National Centre Centre for Disease Control (NCDC) nakwa ndị NPHCDA n'ihu ndị isi European Union, Ministri ahụike nke Naịjriịa nakwa United Nations.

    Onyeisi ndị ọrụ UN na Naịjirịa bụ Edward Kallon sị na "akụrụngwa ndị a ga-enyeaka ịchekwa ndị ọrụ ma mekwaa ka enwe ike inyoche ọtụtụ mmadụ kwa ụbọchị

  9. Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na Delta steeti ebutela ọrịa coronavirus

    Onye na-ahụ maka ntaakụkọ na mgbasa ozi na Delta steeti bụ Olisa Ijeajika ekwuola na kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Charlse Aniagwu na onyeisi ode akwụkwọ Delta steeti bụ Chiedu Ebie ebuitela ọrịa coronavirus.

    Ijeajika kwuru na mmadụ abụọ a gosiri njirimara ọrịa coronavirus nke mere ka ha mee nyocha.

    Nyocha ha gosiri na ha bu ya bụọrịa ma dịka ọ dị ugbu a, ha edopụla onwe ha iche maka ọgwụgwọ.

  10. Ndị dibia oyibo akwụsịla abụbụ ọrụ ha

    Ndị dọkịnta oyibo ga-akwụsị abụbụ ọrụ ha echi bụ ụbọchị Monde.

    Ndị otu National Association of Resident doctors sị na ya bụ mkpebi sitere n'ọgbakọ ndị otu ha karịrị narị atọ (300) mere n'ihe onyonyo.

    Onyeisi ndị otu ahụ bụ Aliyu Sokomba sị na mkpebi a bụ ka ha were nye ndị gọọmenti ohere ịmejuputa nkwa ha kwere.

    Ọ sị na onyeisi ndị ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila, odeakwụkwọ ukwu gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha nakwa onyeisioche ndị otu gọvanọ ndị Naịjirịa bụ Kayode Fayemi rịọrọ ha ka ha gbaa jụụ maka ya bụ abụbụ ọrụ.

    Ndị otu dọkịnta malitere ịgba abụ abụbụ ọrụ a n'ụbochị iri na ise nke ọnwa Juun afọ 2020.

  11. Coronavirus egbuola mmadụ 506 na Naịjirịa kemgbe ọnwa Maachị

    Site n'ọnụọgụgụ ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara n'abalị, ọrịa Covid-19 egbuola mmadụ narị ise na isii (506) kemgbe ọnwa Maachị o rutere Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka NCDC kwukwara na mmadụ narị isii na iri isii na otu ọzọ butere ya n'ọnụọgụgụ ha wepụtara n'abalị.

    Mmadụ iri asatọ na atọ bụ ndị butere ya bụ ọrịa na Delta steeti, ebe narị abụọ na iri atọ butere ya na Legọs.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 6,718 n'ime 19,808 buterela ya esila na ya bụ ọrịa gbakee kemgbe ọnwa Maachị.

  12. Unu abọọla chi?

    Onye kwe chi ya ekwe!

    Daalụ maka isonye anyị taa.

    Ihe ọbụla i tinyere aka taa agaghị aghọ gị ahịa.

    Iseee!

  13. Ka chi foonụ

  14. Ụlọọrụ NCDC amalitela SORMAS n'Imo steeti

    Ụlọọrụ na ahụ maka ịnyocha nje na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) sị na ha amalitela usoro akpọrọ SORMAS-open n'Imo steeti. Nke a bụ akụrụngwa kọmputa na-enyaaka ịchọpụta ma soro nzọụkwụ ndị butere nje coronavirus.

    Nke a ga-enyeaka ịchọpụta ndị niile bu ya bụ nje na steeti ahụ.

    NCDC sị na ebumnobi ha bụ ịme ka ya bụ akụrụngwa ọrụ ruo okpuruọchịchị niile na Naịjirịa tupu afọ a agwụ.

  15. Ihe karịrị mmadụ otu nde ebutela coronavirus na Brazil

    Mba Brazil achụkwudola mba Amerịka na mba ihe karịrị mmadụ otu nde buterela ọrịa coronavirus.

    Nke a na-abịa dịka ministri ahụike ha kwuru na ihe karịrị mmadụ puku iri ise na anọ butere ọrịa a n’otu ụbọchị, ebe ihe karịrị mmadụ puku na narị abụọ nwụrụ n’otu ụbọchị.

  16. Mmadụ 48 ọhụrụ ebutela covid-19 n'Abịa, 31 ebute ya n'Enugwu steeti

    Ọnụọgụgụ si n'aka ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) pụta na-akọwa na mmadụ narị isii na iri isii na asaa butere ọrịa coronavirus ọhụrụ.

    Dịka NCDC si kwuo, mmadụ 48 n'ime ha bụ ndị si Abịa steeti, ebe 31 n'ime ha bụ ndị si Enugwu steeti.

    Na Delta steeti ka a chọtara mmadụ 18 bu ya, ebe mmadụ 18 butekwara ya na Rivas steeti.

    Lee steeti ole a chọtara ndị ọhụrụ butere ọrịa a:

  17. Ị bọọla chi?

    Ka ụbọchị taa mara anyị niile mma.

    Naanị ozi ọma ga-erute anyị aka taa.

    Iseeee!

  18. Gee akụkọ abalị taa n'otu nkeji

  19. Ụmụafọ Naijirịa 300 esila na mba UAE gbalata Naijirịa

    Mmadụ narị atọ ndị tọrọ na mba UAE batara Abuja ụbọchị iri na itolu nke bụ Fride n'ọnwa Juun afo 2020.

    Ha ji ụgbọelu Emirates were bata Abuja.

    Dịka iwu sị were dị, a ga-ewepụ ndị a iche izuụka abụọ maka nchekwa na nyocha maka ọrịa coronavirus.

  20. Ndị Naijirịa 50 tọrọ na mba Pakistanị alọtala Naijirịa

    Ndị Naijirịa iri ise tọrọ na mba Pakistanị alọtala na Naijirịa n'ụbọchị Fride ọnwa Juun.

    Ha ji ụgbọelu Tarco Air bata n'elekere otu nke ehihe.

    Dịka iwu maka Coronavirus siri dị, mmadụ iri ise a ga-edopụ onwe ha iche izuụka abụọ maka nyocha na nchekwa maka coronavirus.