Akụkọ pụtara na-ekwu na gọvanọ Abia Steetị bụ gọvanọ Okezie Ikpeazụ na ndịisi ọchịchị ya ewezugala onwe ha iche maka coronavirus.
Ọ bụ mgbe a chọpụtara na ezinaụlọ Solomon Ogunji bụbu kọmishịọna gburugburu ebe obibi nwụrụ anwụ butere ọrịa a.
Nke a mere gọvanọ Ikpeazu site n'ọnụ kọmishọna mgbasaozi bụ John Okiyi ji sị ndị ọrụ ya ha na Ogunji nwere mmekọ gaa nyocha onwe ma wepụ onwe ha site n'ọha.
Mana ozi gọọmentị wepụtara sị na Ogunji nwụrụ site n'ọbara mgbalielu n'ụbọchị 24 ọnwa Mee n'ụlọọgwụ Mahadum Abia Steetị dị n'Aba.
Ndịisi ọchịchị Abia Steeti ole ka a sị nọpụiche?
A mabeghi mmadụ ole n'ime ndịisi ọchịchị Abia steetị gọvanọ Ikpeazu gwara wezuga onwe ha.
Mana Okiyi bụ kọmishọna mgbasaozi wepụtara sị na o nyela onwe ya maka nyocha ma wezugakwa onwe n'ọha.
BBC Igbo gbara mbọ ị nụta n'ọnụ ya, etu ihe si kwụrụ, mana Okiyi azaghị ekwentị maọbụ ozi e zigaara ya.
Kedụ etu ihe si kwụrụ n'Abia ugbua?
Odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka sị na onweghi nsogbu ọbụla dị n'Abia Steetị.
Ọ sị na ọrụ ga na-aga etu o si na aga na mbụ na-agbanyeghi na ozi si n'aka Okiyi pụta na ụfọdụ ndịisi ọrụ n'Abia wezugara onwe ha iche.
Ọ gara n'ihu rụtụaka na mgbe gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai na nke Oyo Steetị bụ Seyi Makinde mere nke ha, na o gbochighị ọchịchị ị ga n'ihu.
Ememanka sị na ọ bụrụgodi na gọvanọ wezugara onwe ya iche, na ọ gaghị egbochi ya inye ntuziaka ọbụla.
O kwuru na ụlọọrụ gọọmentị niile n'Abia Steeti mepechara emepe na ọrụ n'aga nke ọma.
Ọ sị na nchịkọta ihe niile komishọna kwuru bụ ka onye ọbụla kee nkwụcha maka ọrịa coronavirus.