Dịka akụkọ na ọrịa amaghị ebe o si na-arịa ụfọdụ ndị mmadụ n'Onịcha, Anambara steeti,Komishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dkta Vincent Okpala ekwuola nchọpụta ha mere gosiri na akụkọ ahụ abụghị eziokwu.
Akụkọ na-ewu na social midia na-ekwu na ọtụtụ mmadụ bi na Ọnịcha kwuru na ha na-arịa ịba ekweghị ọgwụgwọ nke mere na ha anaghịkwa anụzi isi ihe maọbụ ụtọ nri.
Mana Dkta Okpala sịrị na O kwuru na ndị a kpọrọ ka a natara ozi ahụ sị na ọ bụghị ha.
,"Anyị kpọrọ ndị kwuru ya, o nweghị onye kwuru na o mere ya."
O kwuru na Anambara nwere ndị ọrụ ahụike ọ bụ ọrụ ha inyocha mpaghara ọbụla na steeti ahụ iji hụ nke na-eme mana "O nwebeghị onye anyị hụrụ nwere ụdị ihe a ahụ."
Ọ rịorọ ka onye ọ bụla na-arịa anụghị isi, anụghị ụtọ nri nakwa ịba anataghị ọgwụ kpọtụrụ ụlọọrụ ahụike gọọmenti sị, "Ugbua abụghị oge onye ọbụla nwere ahụọkụ ọ kpọọ ya ịba nke anwụnta."
O nwere ka o si eme gị maọbụ onye agbataobi gị , kpọọ akara ekwenti gbagbata nke steeti na : 09034728047, 09034668319, 08163594310, 09034663273, +2348145434416, +2348117567363
Whatsapp- 09033805959
SMS - 09074285546.