Dkt Osagie Ehanire bụ minista ahụike Naịjirịa kwuru na Naịjiria ga-ebelatanwu etu Covid-19 si egbu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ gbaa mbọ hụ na ha ebunyeghi ndị ruru afọ 50 ọrịa a.
Ehanire kwuru nke a ka ya na otu pụrụiche gọọmentị họpụtara maka ibuso ọrịa coronavirus agha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọọzde, kwuru sị na ọtụtụ ndị ọrịa a gburu na Naịjirịa bụ ndị gaferela afọ 50 nakwa ndị nweburu ọrịa dịka ọrịa shuga, ọrịa akpụ (cancer), ọbara mgbali elu nakwa ndị ọzọ.
Ehanire kwuru sị na ebe ọ bụ ndị a ka ọrịa a kacha egbu, na ọ ga-adị mma ịgba mbọ niile mmadụ pụrụ ime, iji kpuchite ha ma hụ na ha ebuteghi ya bụ ọrịa.
O kwukwara sị na onye ọbụla ruru afọ 50 bute ya bụ ọrịa, na ọ dị ezigbo mkpa na onye ahụ ji ọsọ gawa n'ebe gọọmentị wepụtara maka nlekọta ndị bu ọrịa a.
O kwuru sị ka ndị mmadụ gbaa mbọ hụ na ha apụghị apụ ma ọ bụghị ma e nwere ebe dị oke mkpa ha na-aga, iji belata mbute nakwa mfesa ọrịa a.
Ọ dọkwara aka na ntị ka ndị mmadụ na-eyi mkpuchi imi na-ekpuchi imi na ọnụ ha, karịa iyi ya n'agba ha; ma na-akwọkwa aka, na-anọsapụ anọsapụ nakwa na-edebe onwe ha na gburugburu ha ezigbo ọcha.