You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gọvanọ Willie Obiano akasiela ndị Anambra obi maka ọnọgụgụ coronavirus

    Aka na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano agwaala ndị Anambra ha atụla ụjọ maka etu ọnụọgụgụ coronavirus si arị elu na steeti ahụ.

    O kwuru na nke a bụ n'ihi nyocha na-arị elu nakwa na o nwegi ihe ọjọọ ọ pụtara.

    Dịka ọ dị ugbua mmadụ itoolu anwụọla site n'ọrịa ahụ ebe mmadụ asaa ka na-anata ọgwụgwọ.

    Ọ dọkwara aka na ntị sị ndị mmadụ ebelatala nchekwa onwe ha site n'ịkwọ aka na ịkpuchi imi n'ọha mmadụ.

    Onye ogbo ya bụ aka na-achị Ogun steeti bụ Dapo Abiodun gwara ndị steeti ya otu ihe ahụ.

    Ọ sị ha na ọnụọgụgụ na-arị elu bụ n'ihi nyocha nke anwụlitere nakwa ọnụọgụgụ nyocha ha welitere elu rue 600 kwa ụbọchị.

    Okwu ya bịara dịka achọpụtara mmadụ 108 bu ọrịa ahụ n'Ogun steeti ebe mmadụ 104 n'ime ha si n'otu ụlọọrụ.

  2. Mba Itiopia adọtịala oge Praịm Minista ha n'ihi coronavirus

    Ụlọomeiwu nke mba Itiopia ekpebiela ịdọtị oge Praịm Minista ha ga-anọ n'ọkwa ọchịchị n'ihi ọrịa coronavirus.

    E tinyebụrụ ntuliaka na mba ahụ n'ọnwa Ọgọst mana ewughariri ya n'ihi ọrịa coronavirus.

    Ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ nwetakwara ndọtị n'oge ha n'ihi otu ọrịa a.

    Ha kpebiri na ha ga-akagharị ntuliaka ndị a n'ihe ruru ọnwa itoolu maọbụ otu afọ rue mgbe mkpamkpa coronavirus ga-ebelata.

  3. Coronavirus egbuola mmadụ 17 ọhụrụ na Naịjirịa

    Ọnọgụgụ nke ngalaba NCDC wepụtara gosiri na mmadụ 17 ọhụrụ ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19.

    Ha kwukwara na mmadụ narị anọ na itoolu ọzọ ebutela ọrịa a.

    Legọs ka bụ kwa steeti ebe ọ na-ekposi ọkụ ike.

    Sọsọ Enugwu steeti bụ steeti ọwụwa anywanwụ achọtara ndị ọhụrụ bu ya bụ ọrịa n'abalị Wenzde.

  4. Anyị amalitela ọzọ

    Nnọọ nụ taa.

    Anyị ji n'aka na unu ga-anọnyere anyị maka akụkọ na-ewu ewu n'ụwa niile.

    Pasa nụ apasa ebe a.

  5. Ka ọ dị echi

    Daalụ maka isonye anyị taa!

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.

  6. Ndị na-eme nnyocha maka coronavirus ebutekwala ya na mba Amerịka

    Ihe karịrị mmadụ 23 n'ime 600 na-arụ n'ụlọọrụ Maine's Abbott Laboratories bụ ebe a na-emepụta ngwa e ji eme nnyocha maka ọrịa coronavirus, ebutela ọrịa Covid-19.

    Ebe mmadụ 23 n'ime ha butere ọrịa a n'ọnwa Epreelụ, ise n'ime ha butere ya ebe ngwụcha ọnwa Mee, mere ka ngalaba Center for Disease Control and Prevention (CDC) malite nnyocha ihe na-eme.

    Nirav Shah bụ onyeisi ngalaba CDC na Maine, kwuru sị na ndị ụlọọrụ Abbott na-enyocha ndị ọrụ ha ahụ maka ọrịa a kwa izu, ma na-enyocha ugbua ịhụ na ọrịa a esighi n'ahụ ndị butere ọrịa a metọọ ngwa nnyocha ndị a.

  7. Ndị 'National Guard' e zipuru maka ngagharịiwe ebutela Covid-19 n'Amerịka

    Ụfọdụ ndị agha pụrụiche so na 1300 e zipuru ka ha hụ na ngagharịiwe a na-eme na steeti Washington dị na mba Amerịka akawanyeghi njọ, ebutela ọrịa Covid-19.

    Ndị agha a so n'ime ihe karịrị 4,000 e zipuru na gburugburu mba Amerịka ka ha nyere aka maka ndị na-eme ngagharịiwe n'ihi ọnwụ George Floyd bụ onye onye uweojii pịgburu.

    Ka ọ dị ugbua, ndị isi ọrụ ha kwuru na ha agaghị akpọpụta ọnụọgụgụ mmadụ ole butere ọrịa a, n’ihi na diochi anaghị akọcha ihe ọ hụrụ n’elu nkwu.

    N'otu aka ahụ, ndị White House a họpụtara maka ibuso ọrịa coronavirus agha, ekwuola na ha na-atụ ụjọ na ọnụọgụgụ ndị ga-ebute ọrịa ọjọo a ga-amụbanye n'ihi igwe mmadụ kwoputara isonye mee ngagharịiwe a.

    Dọkịta Deborah Birx dụrụ ndị gọvanọ ọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na ihe e ji eme nnyocha ọrịa a dị, dịka ndị na-eme ngagharịiwe mebichara ebe 70 a na-emebu ya.

  8. Ndị ọrụ ahụike pụtakwuonu bịa nyere aka - Gọọmentị Anambara

    Gọọmentị Anambara steeti akpọọla oku ka ndị ọrụ ahụike biko jiri aka ha wepụta onwe ha bịa nyere aka maka ibuso ọrịa Covid-19 agha na steeti ahụ.

    N’otu aka ahụ, ha kelekwara ndị ọrụ ahụike na-arụ ọrụ kemgbe iji gbochie mfesa ọrịa ọjọọ a na steeti ahụ kemgbe ọ a batara.

    Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ kesara ozi akpọmoku a.

  9. Gọvanọ Ikpeazu anaghị akawanye njọ n'ahụike

    Onye enyemaka Okezie Ikpeazu n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka agbaghaala akụkọ na-efegharị na Ikpeazu na-akawanye njọ.

    O kwuru na dị ka ọ dị ugbua, gọvanọ Abia steeti dopuru onwe ya iche na-anata ọgwụwgwọ n'ihi ọrịa coronavirus nke ọ na-arịa.

    Ọ gwara ndị mmadụ ha egela ntị n'okwu ụgha na-efegharị gbasara ahụike Ikpeazu.

    "Mgbe o mere nyocha ya, o zoghi mpụtara ya, o ji aka ya gwa ndị mmadụ ihe si na ya pụta"

    "Ihe Abia steeti kwuru bụ na Gọvanọ Ikpeazu dopuru onwe ya iche na-anata ọgwụgwọ...ahụ dị ya ọfụma" ka o kwuru na ngwụcha.

    Mgbe anyị jụrụ ya maka ebe Ikpeazu na-anata ọgwụwgwọ sọsọ ihe ọ gwara anyị bụ na ọ n'ebe ndị mmadụ ne-edopu onwe ha iche.

    Mana mgbe BBC kpọtụrụ kọmịshọna ahụike nke steeti ahụ bụ Joe Osuji, ọ gwara BBC na Gọvanọ Ikpeazu na-anata ọgwụgwọ n'Abuja.

    "Ikpeazu ji aka ya gaa njem n'Abuja, nọrọ ebe ahụ mee nyocha were malite ịnata ọgwụgwọ mgbe a chọpụtara na o bu ọrịa coronavirus" ka o kwuru n'ekwentị.

  10. Gọvanọ Umahi adọọla ndị ntaakụkọ aka na ntị

    Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi adọọla ndị ọrụ nchekwa ya nakwa ndị ntaakụkọ na-eso ya ka ha ga mee nyocha maka ọrịa coronavirus.

    O kwuru na nke a bụ iji kee nkwụcha n'ebe ọrịa ahụ nọ ma nyekwa ndị ahụ ohere ị rụ ọrụ ha ka o si masị ha.

    Umahi kelere ndị ntaakụkọ maka enyemaka ha na-enye n'ịgbasaozi n'oge coronavirus a ma dọrọ ha aka ha hie asaa n'anya n'echekwa onwe ha n'ebe ọrịa a nọ.

  11. Ndị nkuzi Saụt Afrịka na-aṅụrị maka mgbachi ụlọakwụkwọ

    Otu ọgbakọ ndị nkuzi na mba Saut Afrịka aṅụrịala maka mgbachi agbachiri ụfọdụ ụlọakwụkwọ na mba ahụ maka na ụfọdụ ndị nkuzi butere ọrịa coronavirus.

    Cheta na gọọmentị mba ahụ gbapere ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị nwere klasị 7 na 12 n'atụmatụ mmepe obodo nwayọ nwayọ.

    Nke a mere ka ọgbakọ ndị nkuzi ahụ boo mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ ebubo n'ụlọikpe na ha ji ndụ ndị nkuzi nakwa ụmụ akwụkwọ egwu egwu.

    Ụlọakwụkwọ atọ dị n'obodo Durban nakwa Johannesbourg gbachiri dịka achọpụtara otu onye bu ọrịa ahụ.

  12. Naịjirịa enwetela ọnụọgụgụ ndị kachasị bute ọrịa kemgbe ngụkọ bidoro

    Ude coronavirus ka na-ede dịka ọnụọgụgụ NCDC si gosi.

    Nke ewepụtara n'abalị ụbọchị Tuzde gosiri na mmadụ 663 bu ndị butere ọrịa a.

    Ya mere na ọ bụ ọnọgụgụ kachasị kemgbe ngụkọ ọrịa a bidoro.

  13. Ụtụtụ ọma nụ!

    Ọkwa unu bọrọ ọfụma?

    Sonye anyị taa maka akụko niile na-ewu ewu maka coronavirus.

  14. Ndị ọrụ ahụike n'oge coronavirus a ga-amalite iri ụgwọ ize ndụ

    Gọọmentị etiti ekwela ịkwụ ndị ọrụ ahụike nọ n'ihu ọrụ oge coronavirus a ụgwọ ize a kpọrọ 'Hazard Allowance' na Bekee.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige sị na a ga-akwụ ha nke ọnwa Eprelụ na Mee tupu ụbọchị Fraịde ana-eru.

    Mkpebi a bịara na ngwụcha mkparịtaụka gọọmentị etiti na ndị ọrụ ahụike nwere n'ụịbọchị tuuzde.

    Ngige sị na onyeisiala mere nke a iji gosi mmasị na obi ụtọ ya n'ebe ndị ọrụ ahụike maka ọrụ ọma ha na-arụ na Naịjirịa.

  15. Gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile, Akụkọ a ga-amasị gị

  16. Ihe Gọọmenti Etiti kwuru maka oge a ga-ele Waec na Neco

    Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba ekwuola na gọọmenti na-agba mbọ ịhụ na a kpụdebere oge a ga-eme ụle Waec na Neco nso.

    Nwajiuba kwuru nke n'oge otu onyeisiala hiwere maka ọgụ Covid-19 mere mgbasaozi ka ihe siri kwụrụ n'ọgụ coronavirus ụbọchị Monde.

    Ọ sị, "Ọ ga-ewe izuụka isii imecha ule waec na Neco. Anyị na-agba mbọ ịhụ na- a gbụdebere oge a ga-eme ule ndị a nso."

    "Mụ na ndị nnọchite anya Waec na Nabteb nwere nzuko m wee na-aghọta etu ndị nne na nna is atụ uche (maka oge a ga-ele Waec na Neco)ugbua, ụmụaka anyị na-achọkwa ị ma nke ga-eme."

    Cheta na gọọmenti etiti kwuburu n'ọnwa Eprelụ na agaghị ele ụle Waec ganye ma e kpochapụ ọrịa coronavirus na Naijiria.

  17. Saụt Afrịka ga-akwụ ndị dọkịta ha si Kuba kpọbata nde dọla 14

    Mba Saụt Afrịka ekwuola na ha ga-akwụ ndị dọkịta ha si mba Cuba kpọbata maka ibuso coroinavirus agha, nde dọla iri na anọ ($14m).

    Minista ahụike mba Saụt Afrịka bụ Zweli Mkhize kwuru na ndị dọkịta a dị otu narị na iri asatọ na asaa, ga-anọgide ruo afọ 2021.

  18. Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ anaghị e me nnyocha zuru oke

    Onyeisi ngalaba NCDC bụ Chike Ihekweazu ekwuola na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ anaghị eme nnyocha zuru oke dị ka ha si kwesi.

    O kwuru na e meghi nnyocha bụ ihe na-ebute ọnụọgụgụ pere mpe si na mpaghara ahụ apụta.

    Ọnụọgụgụ ndị e nwetara n'abalị ụbọchị ụka bụ:

    Ọdịda Anyanwụ - 6,607

    Ọwụwa anywanwụ- 315

    Etiti ndida - 956

    Odida ugwu- 2,267

    Ọwụwa Ugwu - 976

    Mpaghara etiti ugwu - 4,156 .

    Nnyocha niile e mere bụ:

    Ọdịda Anyanwụ 30,056

    Ọwụwa Anyanwụ - 1,723

    Etiti Ndịda - 4,992

    Ọdịda Ugwu 12,797

    Ọwụwa Ugwu, 6,509

    Mpaghara etiti Ugwu 4,156.

  19. Ebe Afrịka kwụ ugbua

    Na ngụkọ nke ngalaba ahụike bụ WHO mere, o kwur na ihe ruru otu puku narị na puku iri asatọ na asaa bụ ndị buterela ọrịa a.

    Mmadụ puku iri asatọ na abụọ agbakeela ebe mmadụ puku ise bụ ndị nwụrụ anwụ.

    Mba ebe ndị ọrịa a kachasị metụta bụ Saụt Afrịka, Ijipt nakwa Naịjirịa.

  20. Mmadụ 315 ebutela ọrịa Coronavirus na Naịjirịa ọhụrụ

    Ngalaba NCDC ọ bụ ọrụ ha ịnyocha nakwa ịkpọpụta ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ekwuola na mmadụ 315 ọzọ ebutela ọrịa a.

    Nke a mere ka ọnụgọgụgụ ndị niile bu ọrịa ahụ na Naịjirịa buru puku iri na abụọ na narị asatọ na otu.

    Mmadụ narị atọ na iri isii na otu anwụọla site n'ọrịa a kwa.

    Dịka ihe si kwụrụ, Naịjirịa bụ mba anọ ebe mmadụ kachasị nwụọ site n'ọrịa n'Afrịka.

    Ndị ọzọ ebe mmadụ kachasị nwụọ bụ Saụt Afrịka, Aljiria nakwa Sudan.