Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ
'Ana m agbaburu egwuregwu ọsọ, mana ejirila m ya ritere Naịjiria ọlaedo' - Lauritta Onye
Exercises: Ị ma na o nwere mgbe 'exercise' nwereike idula gị mmụọ?
Etu m si bụrụ ọkaibe n'ịlụ ọgụ 'Martial art' ka awụchara m 'acid' - Lovethpatra Young
"Ị chọrọ ime ọfụma dịka onye na-agba bọọlụ, mee ihe ndị a" - Henry Onyekuru
Man City agwọọla Chelsea ka nkwọbi e ji tụọrọ afọ ọhụrụ aja
Onye dọkịnta nwụrụ n'ime mmiri na họtelụ dị n'Abakaliki

Ebe foto si, European Pressphoto Agency
Nwa Dọkịnta ka si n'ụlọakwụkwọ pụta na-eme ọzụzụ aka isiike n'ọrụ Bekee kpọrọ Housemanship n Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital, Abakaliki, Ebonyi StEETI anwụọla ebe ọ gara igwu mmiri n'ụlọ oriri na nkwarị dị n'Abakaliki.
ThankGod Odo bụ onye Okpuruọchịchị Ohaukwu dị n'Ebonyi steeti gara ịnwete onwe ya ya na ndị otu ya mgbe ya bụ ụgbatauhie dakwasara ya ụbọchị Tọzde.
Onyeisi ya bụ ụlọ oriri na nkwarị achọghị ka a kpọọ aha ya ịs na "mgbe anyị kpọrọ ihe onyonyo nchekwa dị na-ebe ahụ, anyị chọpụtara na ya bụ nwaamadị tukwu na nkọ olulu mmiri ahụ, nọkete mikpuo n'ala mmiri ebe ndị ibe ya chere na ọ bụ mmiri ka ọ na-egwu".
Akụkọ anyị nụrụ bụ na ọ na-akuziri ibe ya ka esị egwu mmiri ụbọchị ya bụ ihe mere ya. Mgbe anyị jụrụ onyenchịkọta ụlọ nkwarị ahụ ma ya bụ nwaaadị ọ ṅụrụ mmanya, ọ sị na "ọnweghị mmanya ọ ṅụrụ, kama ya na ndị otu ya bụkwa dọkịnta so bịa igwu mmiri mgbe ya bụ ihe mere" Ọ sị na ha ha dekwara ya mado n'ahụ aja ebe ahụ ka onye obula ṅụrụ mmanya ghara igwu mmiri.
Ndị otu ya ahụ gbalịkwara ịzọ ya ndụ mana achọpụtara n'ọnwụrụ mgbe ha luru ụlọọgwụ.
O bụ onyeisi kọmiti ndụmọdụ nke ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Ewa Richard bụ onye kpebiri na ya bụ nwaamadị ahapụla.
Richard sị na "Odo bụ ezigbo nwa maara ọrụ nke ọma, bụ onye kwesiri ịmeche "Housemanship" ya ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba 2020".
A machiela ịpịa ụmụaka ụtalị na Saụt Afrịka
Ndị uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay

Ebe foto si, Twitter/OmahLay
Ndị Uweojii na Yuganda anwụchiela otiegwu OmahLay na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ịda iwu covid-19.
Ha kwuputara nke a n'ozi ha ziputere n'ụbọchị Sọnde.
"Anyị nwuchiri mmadụ atọ maka mmemme egwu ha mere n'ogige Ddungu n'isi obodo mba ahụ bụ Kampal" ka ha kwuru.
Ndị ọzọ anwụchikwuru bụ: Ivan Ddungu na-elekọta ogige ebe ọ bịara ti egwu nakwa Prim Kasana hibere ya bụ mmemme.
Seun Kuti akọwaala ihe mere o ji mịpụta egbe n'abalị ụnyaahụ

Ebe foto si, BBC/Seun Kuti
Seun Anikulapo Kuti bụ otiegwu a ma ama na Naịjiria ekwetala na a gbapụrụ mgbọ egbe mgbe ọgbaghara dapụtara mgbe eji ụgbọala dochie ihu be ya n’abalị Satọde.
Mana o kwughi maọbụ ya gbapụrụ ya bụ egbe dịka ebubo mmadụ boro ya n’elu soshal midia si kwuo.
N'ihe onyonyo dị na peeji instagram ya, o kwetara sị "eeee agbapụrụ egbe na ya bụ ihe... ị chọrọ ị me nzuzu ma chee na agaghị a nụ ụda egbe?"
Okwu a malitere mgbe otu onye bụ Temitayo Ayetoto kọwara etu Kuti si malite iwe iwe mgbe e ji ụgbọala nọchie ihu be ya n'Allen Avenue, Ikeja dị na Legọs.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Skip Instagram postHapụ Instagram ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Onyeisiala Buhari kpọpụtara Effiong Okon Akwa dịka onyeisi ọhụrụ NDDC

Ebe foto si, Twitter Page/Bashir Ahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwetela ka ahọpụta onyeisi ọhụrụ nwa mgbe nta ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) aha ya bụ Effiong Okon Akwa.
Effiong Okon Akwa bụ onyeisi ndewe ego NDDC ga-ewere ọkwa onyeisi ngalaba ahụ ruo mgbe e mechara nyocha ebubo nrụrụaka na mpụ eboro ndị na-achịbu ngalaba ahụ.
Mba Amerịka ga-ebido inye ọgwụ mgbochi Pfizer coronavirus bido na mọnde

Ebe foto si, John Cairns/University of Oxford/PA
Ndị mba US ga-ebido ịnata ọgwụ mgbochi Pfizer/BioNTech maka coronavirus bido na mọnde bụ December iri na anọ dịka e kpebichara ị ji ya rụọ ọrụ.
Ihe ruru ọgwụ mgbochị a nde atọ ka a ga-eburu kesaa na steeti niile dị na mba Amerịka na ngwụcha izu ụka a dịka Gustave Perna na-ahụ maka nkesa ya si kwu.
Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ebe foto si, MARK ROBINSON/MATCHROOM
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ 'Unified world heavyweight champion' ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Ọkụ ọkpọ onye mba Britein a emeghịri mwa amadị a ebere dịka ọ na-akụ Pulev ji ihu ọchị a nara ọkpọ niile Joshua na-ebi ya.
Ndị nso nso ruru otu puku bata n'ọgbọ egwuregwu Wembley Arena hụr u ka Joshua si jiri akọ n'uche na ọkpọ na-abịagbu mmadụ wee merie egwuregwu ahụ nke mere ka na-eto ya.
Ọkpọ Joshua kụrụ Pulev n'agba itoolu n'ime agba iri na otu ha kụrụ ọkpọ bụ ihe mere ka Joshua ka jide ọkwa WBA, IBF, IBO na WBO n'ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị satọde bụ Disemba iri na atọ(13,2020).
AJ meriri ọkwa anọ a n'afọ 2016 ma mechaa gbajọọ atọ n'ime ọkwa oge Andy Ruiz Jr meriri ya mana o mechara ritekwa ha anọ n'ọnwa Jun nke afọ 2019.
Igbo ndị oma anyị ekele ụnụ!
Soro anyị taa ka ịmata nke ekwe n'akụ gbasara akụkọ ụwa dị ọkụ.
Ka ọ dị echi
Rahụkwanụ nke ọma ma nọnyere anyị n'utụtụ.
Ndeewo
Tinyenu gbatagbata maka ọnọdụ ihuigwe - UN

Ebe foto si, UN
Ngalaba mbaụwa bụ United Nations akpọọla oku ka mba niile tinye ọnọdụ gbatagbata maka ihe gbasara ọnọdụ ihuigwe.
António Guterres bụ onyeisi ngalaba a kpọrọ oku a n’ụbọchị Satọde ka a na-eme nzukọ gbasara nkwekọrịta a kpọrọ 'Paris climate agreement' nke afọ ise.
O kwuru na mba 38 etinyela ya bụ ọnọdụ gbatagbata, mana ọ na-akpọku mba ndị ọzọ ka ha sonye ibe ha mee ya bụ ihe.
Ndị otu ọgbakọ niile ọdịmma mbara eligwe na-amasị n’ụwa niile na-eti mkpu n’arịọ ka gọọmentị mejuputa ya bụ nkwekọrịta nke enwere na Paris bụ nke ha kpọrọ “Paris Agreement”.
Ndị a bụ nne na nna, ụmụaka nakwa ndị ajọọ ọnọdụ mbara elụgwe na-ewute maka ọdịmma ọdịnihu ụwa site na otu okpomọkụ sị adị.
Onyeisi ndị otu na-abụghị nke ndị gọọmentị bụ ndị ọnọdụ mbara eligwe na-anụ ọkụ n’obi bụ Amuche Nnabueze bụkwa onye nkuzi na mahadun Nịjirịa na Nsukka sị na “Nkwekọrịta nke Paris bụ olileanya nke mmadụ nwere maka ịme ka okpomọkụ beleta bụ nke na-ebute oke ntaramahụhụ n’ụwa”.
Nnabueze bụkwa onyeisi ndị Parents for Futuresị na ya bụ okpomọkụ egosiwala n’ọrụ ugbo ugbua nke nwereike ibute ụkọ nrị.
Nnabụeze riọkwara nne na nna na ndị ọnụ na-erụ n’okwu ka ha soro ndị mbaụwa ndị ọzọ tinye ọnụ rịọwa ndị ọchịchị ka ha tinye ya bụ nkwekọrịta nke Paris n’ọrụ.
Ọ sị na ọ bụ oke na ọrụ ndị obodo ịkwanye ndị ọchịchị ọkụ n’ike ka ha mejuputa ya bụ mkwa maka ọ dị mma ọdịnaihu anyị.
'Abanyela m ekpere ugbua' - Nne otu n'ime ụmụakwụkwọ 600 a tọrọla na Katsịna

Ebe foto si, Mustapha Kankara
Nkọwa foto, Foto Zainab Isa ebe ọ na-ebe akwa nwa ya Zainab Isa bụ nne otu n’ime ọtụtụ ụmụakwụkwọ Government Science sekọndịrị atọrọla n’obodo Kankara dị na Katsina steeti, agwala BBC na ọ bụ naanị ekpere ka ọ na-ekpe ugbua.
Zainab kwuru na ikpeazụ ọ hụrụ Kabir nwa ya bụ n’ụbọchị ụka gara aga mgbe ya na ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya gara leta ya na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ n’ụlọakwụkwọ.
"Ikpeazụ m hụrụ Kabir bụ n'ụbọchị ụka mgbe anyị gara leta ya na ụmụnne ya abụọ nọkwa n'ụlọakwụkwọ ahụ. Nkata ikpeazụ anyị kpara ka anyị na-achọ ịla bụ arịrịọ ọ na-arịọ m na ọ chọrọ ịlọta na ngwụcha izu a ka o nwee ike gaa otu agbamakwụkwọ."

Nkọwa foto, Ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ agbakọọla "Ụmụnne ya abụọ ndị ọzọ a na-atọrọghị alọtala n'ụlọ ugbua, mana ezigbo ekpere ka anyị na-ekpezi n'isi Kabir, na-arịọ Chukwu ka ọ lọghachịta n'udo."
Zainab kwuru na ndị si n'obodo ndị dị nso ụlọakwụkwọ ahụ gwara ha na ha nụrụ mgbe ndị oji egbe ahụ na-edubanye ụmụakwụkwọ ahụ n'ime ọhịa.
Cheta na BBC na Gambo Isah bụ onye uweojii na Katsịna steeti kwuru, ebe ọ sị na a na-ama imi n'ala ịmata ihe merenu dịka ndị bi nso ebe ahụ na-akọwa na ọtụtụ ụmụakwụkwụ na-efu.
Onyeisi uweojii Naịjiria bụ Mohammed Adamu tinyekwara ọnụ n'okwu ma nye iwu ka a maa ya bụ imi n'ala.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Iran egbuola onye ntaakụkọ Ruhollah Zam

Ebe foto si, Reuters
Mba Iran egbuola onye ntaakụkọ Ruholla Zam maka ebubo na ọ na-eji igwe mgbasa ozi dịka Telegram agbasa ozi na-ebute nnupu isi ebe gọọmentị mba ahụ nọ.
E gburu Ruhollah Zam n'ụbọchị satụde dịka ụlọikpe kwadoro ikpe ọnwụ a mara ya na mbụ.
Odoghị anya etu Zam onye bi na mba FRansị ebe ọ gbara ọsụ siri bata n;aka ndị gọọmentị mba Iran.Akụkọ na-ekwu na anwụchiri ya na mba Iraq afọ gara aga.
Zam bụ onye nwa Websaịt akpọrọ Amadnews nke na-ekwu megide gọọmentị mba Iran.
Gọọmentị Iran boro Zam ebubo na o ji websait ya kpalie ma bido ngagharịiwe zuru mba ahụ ọnụ site n'afọ 2017 ruo afọ 2018.
Ngalaba Na-ahụ maka ikike dịrị onye aha ya bụ Amnesty International kwuru sị, "Ike e ekpere zam abụghị ikpe ziri ezi n'ihi na ọtụtụ ndị gbara ama abụghị obi ha ka ha jiri gbaa ama".
Akukọ ụwa ụtụtụ n'otu nkeji
