E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa dịka anyị na-ewetara gị akụkọ niile si mbaụwa.

    Biko gaa n'ihu sọnyere anyị.

  2. Liverpool 2 - 2 Man. United; etu okwe si gbaa n’ama egwuregwu Anfield

    Mgbe Cody Gakpo nyere goolu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe Cody Gakpo nyere goolu

    Asọmpị English Premier League dị n'etiti Liverpool na Manchester United n’ama egwuregwu Anfield kpụ ọkụ n’ọnụ taata.

    Otu egwu bọọlụ abụọ ahụ wara ike ha ka ha nweta mmeri mana ọ mịtaghị ezi mkpụrụ na nkeje 45 nke mbụ.

    Ugboro asatọ ka Liverpool gbara mbọ inye goolu, ebe Man. Utd nwere ohere ugboro isii.

    N’etiti Liverpool na Man Utd naanị pasenti anọ bụ ihe puruiche na ị tulee ndị kacha eme nke ọma na nkeji 45’ nke mbụ.

    Liverpool wetere pasenti 56 ebe Man Utd wetere Pasenti 44.

    Mana na ngwụcha asọmpị ahụ ka goolu bịara ahara ahara.

    Mgbe Lisandro Martinez  na agbara Man Utd nyere Liverpool goolu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe Lisandro Martinez na agbara Man Utd nyere Liverpool goolu

    Lisandro Martinez na-agbara Manchester United bu ụzọ nye Liverpool goolu na nkeji 52' ebe Cody Gakpo na-agbara Liverpool sara goolu ahụ na nkeji 59’.

    Ka ọ na-eru nkeji 70’ ka Mohamed Salah na-agbara Liverpool ji asụwa agbaa nye goolu nke abụọ, ebe Amad Diallo na-agbara Man Utd sara ya na nkeji nke 80’.

    Liverpool na Mancester United gbara onwe ha naanị ọkpụ abụọ, ọkpụ abụọ.

    Mana ohere niile Manchester United were ịmerị Liverpool amịtaghị ezigbo mkpụrụ na ngwụcha asọmpị ahụ.

  3. Aka akparala nwaanyị a ma ama na onye Nollywood maka ọgwụike na Legọs

    Aishat Feyisara Ajoke Elediye  na ndị ọzọ

    Ebe foto si, NDLEA

    Nkọwa foto, Aishat Feyisara Ajoke Elediye na ndị ọzọ

    Ndị ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela nwaanyị a ma ama na Legọs nakwa onye na-eme ejije Nollywood maka ebubo ọgwụike na Legọs steeti.

    Ụlọọrụ NDLEA mere ka a mata nke a n’ozi ha zipụrụ n’akara mgbasaozi ha n’ịntanet nke Femi Babafemi bụ onyeisi na ngalaba mgbasaozi ha binyere aka.

    N’akwụkwọ ozi ahụ, NDLEA kwuru na ha jidere nwaanyị dị afọ iri isii na otu a ma ama na Legọs dịka Alhaja Aishat Feyisara Ajoke Elediye n’ụlọ ya dị na na mpaghara Okota n’ime Legọs steeti n’abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2025.

    Ha kwuru na ọ bụ mgbe ha nwetere nnukwu ọgwụike n’aka onye ọrụ nwaanyị ahụ ka ha ji gaa n’ụlọ ya kpụrụ ya.

    NDLEA kwuru na aha nwaanyị ahụ na-aza n’etiti ndị na-azụ ahịa ọgwụike bụ “Iya Ruka” mana ndi mmadụ na-akpọ ya Alhaja Ajoke.

    N’akụkọ nke ọzọ, NDLEA kọwara ka ha si nwụchie onye na-eme ejije Nollywood a ma ama na Legọs steeti aha ya bụ Emeka Emmanuel Mbadiwe nke ndị mmadụ maara dịka onye na-ekwu okwu mgbamume.

    NDLEA kwuru na ọ bụ na Disemba 27 2024 ka ha nwụchiri Emeka ka ha jidechara onye o zigara “ka ọ gaa wetere ya ọgwụike o bubatara”.

    Ha jidere Emeka n’ụlọ oriri na nkwarị dị na Lekki Legọs steeti.

    Ha sị na Emeka sitere n'ụlọọrụ njem ụgbọelu Delta Airline si mba Amerịka bubata ọgwụike ahụ n’ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, MMIA dị n’Ikeja, ebe ha si bugaa ya n’ụlọ dị na Ajoa Estate bụ ebe a na-echekwa ngwaahịa.

    Ha kwuru na ọ bụ n’Ajoa Estate ka ha nwụchiri onye Emeka zigara ka ọ butere ya ọgwụ ahụ ma jidekwa Emeka.

  4. SERAP agwala NNPCL ka ha nye nkọwa maka N825bn na $2.5bn na-efu efu

    SERAP agwala NNPCL ka ha nye nkọwa maka N825bn na $2.5bn na-efu efu

    Ebe foto si, SERAP/X

    Otu Social Economic Rights and Accountability Project bụ SERAP n’ịchafụ Bekee agwala nnukwu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL), Mele Kyari ka o nye nkọwa maka narị ijeri naịra asatọ na iri abụọ na ise (825bn) nakwa ijeri dọla abụọ na ụma ise ($2.5bn) na-efu efu.

    N’ozi SERAP bipụtara n’ọbaozi X ha n’ụbọchị Sọnde 5 Jenụwarị 2025, ha kọwara na ego ndị ahụ bụ maka iji rụzigharịa ụlọorụ mmanụ agbịdị ndị e nwere na Naịjirịa.

    Ha gwara Kyari ka ọ chọpụta ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’ego ndị ahụ na-efu efu ma nyefee ha n’aka ụlọorụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ ICPC na EFCC.

    SERAP gara n’ihu gwa Kyari ka ọ kpọọ onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo nakwa ụlọorụ EFCC na ICPC oku ka ha gaa njem nlegharịanya n’ụlọorụ mmanụ dị na Warri na Pọtakọt.

    Dịka ha siri kwuo, nke ahụ bụ “iji chọpụta ego ole e mefuru maka ịrụzigharị ha nakwa iji chọpụta ogogo ha ji arụ ọrụ.”

  5. Joe Biden na-akwado izigara Izrel ngwaagha

    Joe Biden na-akwado izigara Izrel ngwaagha

    Ebe foto si, EPA

    Gọọmenti Amerịka emeela ka ụlọ omeiwu mba ahụ mata banyere atụmatụ ya iresị mba Izrel ngwaagha ọnụahịa ya dị ijeri dọla asatọ ($8bn).

    Ọ bụ onye ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti Amerịka mere ka BBC mata nke a.

    Ngwaagha ndị ahụ chọrọ nkwado nke kọmitii ụlọ omeiwu mba Amerịka gụnyere ogbunigwe [missile, shell] nakwa ngwaagha ndị ọzọ.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ọ fọdụrụ naanị izuụka abụọ ka onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden pụọ n’ọchịchị.

    Cheta na Washington ajụla ịnabata oku a na-akpọ ka ha kwụsị nkwado ha na-enye ndịagha Izrel n’ihi ọnụọgụ mmadụ nkịtị e gburula kemgbe agha malitere na Gaza.

    Chetakwa na ọ bụ n’ime ọnwa Ọgọst, afọ 2024 ka Amerịka nyere nkwado ka e resị mba Izrel ụgbọelu e ji ebu agha na akụrụngwa ndịagha ndị ọzọ ọnụahịa ya dị ijeri dọla iri abụọ ($20).

  6. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi eee, Ụbọchị ụka ọma nụ ooo!

    Ọfọ anyị bụ ka Chukwu gbooro onye niile mkpa ya taa.

    Iseee!!!

    Ọ bụ Chinonso Ugorji nọ ebe a n'ụtụtụ a iwetaara gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Michael Ilediagu ga-esonyere ya ma e mesịa.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị...

  7. Ndị uweojii ekposaala ogige ndị ntọrị mmadụ n’Imo Steeti

    Ndị uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Imo Steeti kwuru na ha ekposaala ogige ebe ndị ntọrị na-akpa ike na steetị ahụ, gbuo ndị ntọ abụọ ma zọpụta mmadụ anọ ha tọọrọ n’ụbọchị Satọde 4 Jenụwarị 2025.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye wepụtara, o kwuru na ndị ọrụ ha natara ozi n’ekwentị n’ehihie na ndị ntọrị tọọrọ ụmụnwaanyị atọ na otu nwoke n’obodo Umuokanne dị n’okpuruọchịchị Ohaji Egbema.

    Site n’ozi nakwa nnyocha ha mere, ha chọpụtara ma wụchie n’ogige ndị ntọrị ahụ - ngwa ngwa ha na ndị ntọrị ahụ malitere ịgba onwe ha egbe, nke e mere ha jiri gbagbuo ndị ntọrị abụọ ma zọpụta mmadụ anọ ha tọọrọ.

    Okoye kwuru na ndị uweojii kpachikwara ọtụtụ egbe na ngwaọrụ ndị ọzọ ndị ntọrị a ji akpa ike ma kwuo na a gbatara mmadụ abụọ n’ime anọ ahụ a tọọrọ egbe, kama na ha na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na-ekwentị ndị Imo Steeti nkwa ka ha na-aga mkpa dịịrị ha na ha dị njikere ịchekwa ndụ na akụnaụba ha. O kwuru ka ha gbaa ama nye ndị uweojii banyere agwa dị aṅaa mmadụ ọbụla kpara n’obodo.

  8. Onye kachasị mee okenye n'ụwa anwụọla ka ọ gbachara afọ 116

    Tomiko Itooka mere emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke 116  n'ụbọchị 23 Mee, 2024

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Tomiko Itooka mere emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke 116 n'ụbọchị 23 Mee, 2024

    Nwaanyị mba Japan a hụtara dịka onye kachasị mee okenye n’ụwa dịka ndekọ ‘Guinness World Record’ si kwuo anwụọla ka ọ gbachara afọ otu narị na iri na isii (116yrs).

    Nwada a bụ Tomiko Itooka nwụrụ n’ụlọ ebe a na-elekọta ndị okenye, nke dị n’obodo Ashiya na mpaghara Hyogo.

    Ọ bụ onye kachasị mee okenye n’ụwa mgbe nwafọ mba Spen jibu ọkwa ahụ bụ Maria Branyas Morera nwụrụ n’ọnwa Ọgọst ka ọ gbachara afọ 117.

    “Nwada Itooka nyere anyị agbamume na olileanya n’ogologo nke ndụ ya,” ka onyeisioche obodo Ashiya bụ Ryosuke Takashima kwuru.

    “Anyị kelere ya maka nke a.”

    A mụrụ nwada Itooka n’ọnwa Mee afọ 1908 – afọ isii tupu alụọ agha zuru ụwa ọnụ nke abụọ, bụkwa afọ a rụpụtara ụgbọala Ford Model T na mba Amerịka.

    E nyochara ma kpọpụta ya dịka onye kachasị mee okenye n’ụwa n’ọnwa Sepụtemba afọ 2024 ma nyekwa ya asambodo na-egosi nke n’ụbọchị ncheta ndị okenye bụ ụbọchị ezumike pụrụiche a na-eme na Japan kwa afọ iji kwanyere ndị okenye ugwu.

    Ọ lụrụ di mgbe ọ dị afọ 20 ma mụọ ụmụ anọ, nwaanyị abụọ na nwoke abụọ dịka ndekọ Guinness si kwuo.

    N’oge agha, o lekọtara ụlọọrụ di ya bụ ebe a na-arụpụta akwa. Naanị ya bi n’ebe a kpọrọ Nara mgbe di ya nwụchara n’afọ 1979.

    Ugbua ọ nwụrụ, ndị na-eru uju ya bụ otu nwa ya nwoke, otu nwa ya nwaanyị na ụmụ ụmụ ya ise. A kwaala ozu ya n’etiti ezinaụlọ na ndị enyi ya.

    N’ọnwa Sepụtemba, mba Japan gụpụtara mmadụ 95,000 bụ ndị okenye ruru afọ otu narị maọbụ karịa – pasentị 88% n’ime ha bụ ụmụnwaanyị.

    Ugbua nwafọ mba Brazil bụ Inah Canabarro Lucas a mụrụ n’ụbọchị iri na isii a mụchara Itooka bụzi onye e chere kachasị mee okenye n’ụwa dịka ọ dị afọ otu narị na iri na isii (116yrs).

  9. Ndị Itiopịa agbapụla n’obodo maka ugwu mgbawa

    Ndị Itiopịa agbapụla n’obodo maka ugwu mgbawa

    Ebe foto si, Sultan Kemil

    Ọtụtụ mmadụ nọ n’ime obodo dị na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ nke isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa ebidola ịgbapụ n’ulọ dịka ugwu dị ebe ahụ na-egosị ihe iribaama na o nwere ike ịgbawa n’oge na-adịghị anya.

    Otu onyeisi obodo bụ Sultan Kemil gwara Afaan Oromoo service nke BBC na anwụrụ ọkụ amalitela ịpụta n’ugwu Dofan ihe dịka elekere ise nke ubọchị Tọzde 2 Jenụwarị 2025.

    O kwuru na anwụrụ ahụ na-acha ọkụ ma dịkwa elu nke ukwuu.

    Otu ihe onyonyoo ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ ụwa bụ Ethiopian Geological Institute tinyere n’ọbaozi Facebook gosipụtara etu ụzụọkụ na irighiri ihe si apụta n’ugwu ahụ.

    N'ime izuụka ndị na-adịbeghị anya, enweela ọtụtụ ihe omume seismic na gburugburu Awash Fentale – mpaghara ejiri ala ọmajijiji mara na mpaghara Afar nke dị n’Itiopia.

    Abdu Ali, otu onyeisi nchịkwa nke mpaghara Afar n’Itiopịa gwara ndị ntaakụkọ FBC nke mba Itiopịa na a ga-ebido ịchụpụ ndị mmadụ iji gbochie ndi bi ebe ahụ imerụ ahụ site na nsogbu ahu.

    O kwuru na e nweela ala ọmajijiji ogogo ya dị elu ma na-akpakwa ike.

  10. Ụlọikpe etinyela ikpe maka ebubo nrụrụakaego Donald Trump na 10 Jenuwarị

    Ụlọikpe etinyela ikpe maka ebubo nrụrụakaego Donald Trump na 10 Jenuwarị

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye Ọkaikpe ekwuola na 10 Jenuwarị ga-abụ ụbọchị a ga-ama onyeisiala ọhurụ mba Amerịka bụ Donald Trump ikpe maka nrụrụaka nke a sị ụlọ azụmahịa ya mere.

    Ọnọdụ a ga-adị ihe dịka izuụka abụọ tupu e duo Donald Trump n’iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Amerika.

    Onye Ọkaikpe nke New York bụ Juan Merchan kwuru na ya agaghị atụ Trump mkpọrọ maọbụ kwuo ka ọ kwụọ ụgwọ mana ya ga-enye ya mgbapụta na-enweghị atụ.

    Onye Ọkaikpe ahụ dere iwu na Donald Trump nwereike ịbịa amamịikpe ahụ n’onwe ya maọbụ sonye n’ịntaneetị.

    Dika e siri kwuo, Trump agbabuola mbọ ka o were mmeri o meriri na ntuliaka dịka onyeisiala mba Amerịka kwụsị ikpe ahụ.

    Mana Trump gara n’akara soshia midịa ya kwuo na iwu onye Ọkaikpe ahụ bụ mbuso agha ndọrọ ndọrọ ọchịchị ezighị ezi.

    Ọ kọwara ikpe ahụ dịka ihe enweghị ihe ọbụla dị na ya maọbụ omume aghụghọ.

    Cheta na a mara Trump ikpe na Mee maka mpụ ruru iri atọ na anọ gbasara nrụrụakaego ruru otu narị puku dọla na iri atọ ($130,000) nke ụlọ azụmahịa ya nyere otu onye ejije bụ Stormy Daniels.

  11. Igbo nwe mmadụ, ụnụ asaala chi

    Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ!

    N'ụtụtụ a, ndị ga na-ewetara gị akụkọ dị iche iche dịka ha si akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche bụ Amaka Ewuzie na Chinonso Ugorji mana Ikechukwu Kalu ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  12. Ụlọọrụ nziritaozi n’ekwentị na Naịjirịa na-achọ ibuli ọnụego e ji eziritaozi n’ekwentị

    Ụlọọrụ nziritaozi n'ekwentị na Naịjirịa

    Ebe foto si, MTN/Airtel/Glo/9mobile

    Onyeisi ụlọọrụ MTN na Naịjirịa bụ Karl Toriola ekwuola na ụlọọrụ ndị na-agbasaozi n’ekwentị ekwerikọtala ma tụọ arọ ka e were ihe ruru pasentị 100% bulie ego nziritaozi n’ekwentị.

    Mana o kwuru na ụlọọrụ ndị a ka na-arịọ gọọmentị Naịjirịa ka e nye ha ikike ime mbuli ahụ.

    O kwuru na arọ a na-abịa n’ihi nnukwu ego ha na-emefu ugbua iji nye ndị mmadụ ihe ha na-achọ - nke ihe butere ya bụ mbulie ọnụego ngwaahịa nakwa mbudata naịra ma a tụnyere ya dọla.

    Mgbe ọ na-ekwu okwu n’ụlọọrụ mgbasaozi Channels TV, Toriola kwuru na o dobeghi ha anya na gọọmentị Naịjirịa ga-ekwe ka ha jiri pasentị 100% bulie ọnụego ahụ mana ha nwere olileanya na ha ga-ebuli ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọtụtụ ụlọọrụ ndị ọzọ nọ na Naịjirịa ebulichaala ọnụego ha ji enye ndị Naịjirịa ihe na-emepụta mana ndị na ngalaba nziritaozi n’ekwentị emebeghi nke a.

    O kwuru na ọ bụrụ na e mee nke a, na ọ ga-enyere ụlọọrụ ndị a aka irụ ọrụ ọfụma na-enweghi nsogbu ọbụla.

  13. Etu nwoke si were mma sugbuo ụkọchụkwu ọ hụrụ n'ụlọ nwunye ya n'Osun Steeti

    Ugbua nwoke mere arụ a nọ n'aka ndị uweojii

    Ebe foto si, BBC/Osun Police

    The Osun State Police Command has arrested a couple for allegedly stabbing a Bishop on Wednesday, January 1, 2025.

    Osun State Police Spokesperson, Yemi Opelola, told the BBC that this was indeed the case.

    The 52-year-old pastor, Shina Olaribigbe, is the leader of Rapture Empowerment International Inc. in Osogbo.

    Reports say the couple was having arguments which led them to live separately.

    The pastor intervened in the couple's case to make peace between them before they separated.

    Reports say the man stabbed the priest when he found him at his wife's house on Thursday morning.

    "We were told that the priest was at the man's wife's house on Thursday when her husband arrived. We were told that the man stabbed the priest. We were also told that the priest was on the woman's bed when this happened."

    "Her husband stabbed her several times before she died. Reports say the man intended for the priest to have sex with his wife," Opalola said.

    The Dugbe Division Police rushed to the scene, arrested the man and seized the knife he used to commit the crime.

    As of now, the priest's body has been deposited at the Osun State University Hospital morgue for post-mortem.

  14. Obi Trent Alexander-Arnold dị na Liverpool - Arne Slot

    Trent Alexander-Arnold

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Trent Alexander-Arnold

    Onye nkụzi etu egwu bọọlụ Liverpool bụ Arne Slot ekwuola na Trent Alexander-Arnold chọrọ ịnọ na Liverpool n’agbanyeghị akụkọ na-ekwu na o nwereike ịpụ.

    Nkwekọrịta dị n’etiti Alexander-Arnold na Liverpool abịala na njedebe, ebe BBC chọpụtara na Real Madrid chọrọ ịzụrụ ya mana Liverpool kwuru na ọ bụghị eziokwu.

    Nchọpụta BBC kwuru na Real Madrid mba spen chọrọ ịzụrụ Alexander-Arnold gbara afọ 26 n’ọnwa, mana Slot kwuru obi siri ya ike na nwaamadị agaghị ahapụ Liverpool ma kwuo na ọ ga-eso sọọ mpi dị n’etiti Liverpool na Manchester United ụbọchị Sọnde, 5 Jenụwarị, 2025.

    N’aka nke ọzọ, e nwere akụkọ banyere Mohamed Salah na Virgil van Dijk ndị ọ bụ naanị ọnwa isii fọdụrụ na nkwekọrịta ha Liverpool nwere.

  15. Apple ga-akwụ £77m maka ikpe na Siri na-egeta asịrị

    Ekwenti iPhone
    Nkọwa foto, Ekwenti iPhone nwere ojeozi 'Siri' dịka akọrọngwa enyemaka

    Ụlọọrụ Apple ekwetala ịkwụ ego dị 122,838,100,000 (£77m) iji bie okwu metụtara akwụkwọ a gbara ha nke na-ebo ebubo na ekwentị ha na-ege asịrị ndị mmadụ na anataghị ha ikike.

    E boro Apple ebubo ji ojeozi ekwentị ha bụ Siri ege nkata ndị mmadụ na-anataghị ha ikike.

    Ndị gbara akwụkwọ ahụ kwuru na Apple ji siri amịkọrọ nkata ha kpara ma resi ndị na-agbsa ozi mgbere ahịa(advertisers.)

    Apple gọrọ na aka ha dị ọcha.

    Ndị ọkaiwu Apple kwuru na Apple kagburu "ozi nile a mitara tupu Oktoba 2019".

    But the claimants say the tech firm recorded people who activated the virtual assistant unintentionally - without using the phrase "Hey, Siri" to wake it.

    Otu nwaanyị a kpọrọ Fumiko Lopezna-ebo ebubo na a mịrị nkata ya na nwaa ya nwaanyị na anataghị ha ikike.

    O kwuru na e zitere ha ozi mgbere ahịa na-ekwu maka 'Air Jordan dịka ha kpachara nkata maka ya.

    A gbaala Apple ọtụtụ akwụkwọ n'ụlọikpe na nsonso a.

    N'ọnwa Jenụwarị 2024, Apple malitere ịkwụ ego dị nde paụn 500( $500m)maka ebubo na ha mma maa ama mee ka iPhones ha na mba Amerịca na-aga nwayọọ nwa yọọ.

    N'ọnwa Maach, ha nwetara ịkwụ nde paụns 490($490m) maka akwụkwọ mpaghara Norfolk County Council gbara ha na mba Briten.

    N'ọnwa Novemba, a gbara ha akwụkwọ na- ha ji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego site na akọrọngwa ha e ji edowe ozi a kpọrọ, "iCloud service".

    Otu ụlọọrụ ahụ na-agbakwa Google akwụkwọ maka ebubo na- ha na-ege ihe ndị na-azụ ha ahịa na-ekwu.

    Ikpe nke ahụ ka na-aga n'ihu na mpaghara ugwu California dị na mba Amerịka.

  16. Ndị ọrụ nchekwa egbochiela atụmatụ inwụchi Onyeisiala Saụt Korịa

    Ndị nkwado Yoon Suk Yeol na-eme ngagharịiwe n'ihu ụlọ ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị nkwado Yoon Suk Yeol na-eme ngagharịiwe n'ihu ụlọ ya

    Atụmatụ inwụchi Onyeisiala Saụt Korịa bụ Yoon Suk Yeol akpụọla afọ n’ala dịka e nwere obere ọgbaaghara dị n’etiti ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa Yoon.

    Ndịagha na ndị nchekwa Yoon gbochiri ndị uweojii bịara ịnwụchi Yoon onye ụlọomeiwu chụpụrụ n’ọkwa dịka Onyeisiala n’ọnwa Disemba 2024.

    Cheta na a na-enyocha Yoon maja imeto ọkwa ọchịchị nakwa ebubo inyefe ikike ọchịchị n’aka ndịagha mba ahụ.

    Ụlọikpe Saụt Korịa dị na Seoul nyere mkpebi ka a nwụchie Yoon na mmalite izuụka ka ọ gbara isi akwara banyere akwụkwọ oku ụlọikpe zigaara ya ọtụtụ oge.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụgbọala ndị uweojii juputara n’ụzọ e si aga ụlọ Yoon dị na mpaghara etiti Seoul.

  17. Ihe anyị ma maka ụgbọala Cybertruck gbara ọkụ n’ụlọ nkwari Donald Trump

    Ndị uweojii na-ekwu okwu maka nwaamadị ahụ butere ụgbọala ahụ gbara ọkụ
    Nkọwa foto, Ndị uweojii na-ekwu okwu maka nwaamadị ahụ butere ụgbọala ahụ gbara ọkụ

    Akụkọ kwuru na ọkwọụgbọala Cybertruck ahụ gbara ọkụ n’ogige ụlọ nkwari Donald Trump dị na Las Vegas bụ onyeagha mba Amerịka gburu onwe tupu ụgbọala ahụ enwuru ọkụ.

    Ndị uweoji Las Vegas kwuru na aha nwaamadị bụ Matthew Alan Livelsberger gbara afọ 37 si mpaghara Colorado Springs, Colorado steeti. E kwuru na ọ gbaziri ụgbọala Cybertruck ahụ n’aka ndị na-agbazinye ụgbọala.

    Ụlọọrụ ndị uweojii Clark County Coroner kwuru na Livelsberger ji aka ya gbuo onwe ya.

    Mmadụ asaa ndị ọzọ meruru ahụ oge ụgbọala ahụ wuru ọkụ.

    Ka ọ di ugbua, ndị uweojii na-eme nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachi a.

    Ụgbọala Cybertruck ahụ gbara ọkụ
    Nkọwa foto, Ụgbọala Cybertruck ahụ gbara ọkụ
    Ogige ụlọ nkwri Trump ebe ụgbọala ahụ kpọkara
    Nkọwa foto, Ogige ụlọ nkwri Trump ebe ụgbọala ahụ kpọkara
  18. Mmadụ abụọ anwụọla dịka ụgbọelu kpọkara na California

    Ogige ụgbọelu ahụ kụkpọrọ

    Ebe foto si, KABC

    Nkọwa foto, Ogige ụgbọelu ahụ kụkpọrọ

    Ndị uweojii mba AmerỊka ekwuola na mmadụ abuọ anwụọla ebe mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka otu obere ụgbọelu kpọkara n’ime ulọọru dị na ọdịda anyanwụ California.

    Ụlọọru ndị uweojii Fullerton kwuru n’akara X ha na e bugara mmadụ iri merụrụ ahụ ụlọọgwụ ebe a tọhapụrụ mmadụ asatọ ndị ọzọ n'enweghị nnukwu ihe mere ha.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu kwuru na ugbọelu ahụ nwere otu injin Van's RV-10, kpọkara oge o ji nkeji iri na ise gafee elekere abụọ nke ehihie ụbọchị Tọzde 2 Jenụwarị, 2025.

    Enweghị ihe ndi ọchịchị enyeghị kọwara butere nkpọka ụgbọelu ahụ.

    N'aka nke ọzọ, odoghị anya ka mmadụ abụọ ahụ nwụrụ a bụ ndị ọrụ n’ụgbọelu maọbụ ndị na-eme njem.

    Ndị uweojii nyere iwu ka mmadụ niile nọ n'ogige ebe ihe ahụ mere ka ha pụọ.

    Ogige ụgbọelu ahụ kụkpọrọ

    Ebe foto si, KABC

    Nkọwa foto, Ogige ụgbọelu ahụ kụkpọrọ
  19. Onye uweojii Zambịa ṅụrụ mmanya atọhapụla mmadụ 13

    Onye uweojii Zambịa ṅụrụ mmanya atọhapụla mmadụ 13

    Ebe foto si, AFP

    Ndị ọchịchị kwuru na otu onye uweojii mmanya na-egbu tọhapụrụ mmadụ iri na atọ (13) e ji eji ka ha gaa mee emume afọ ọhụrụ.

    A nwụchiri Detective Titus Phiri oge ọ tọhapụchara ndị e ji eji n’ụlọọrụ ndị uweojii Leenard Cheelo dị n’isi obodo Zambịa bụ Lusaka ma rie mbọmbọ.

    Mmadụ iri na atọ ahụ bụ ndị a na-ebo ebubo mmetọ, iji egbe ezu ohi na itika ụlọ ndị mmadụ.

    Ha niile agbafuola ka ọ dị ugbua mana ndị uweojii na-agbasi mbọ ike iji hụ na a nwụchigharịrị ha niile.

    Ọ nụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Rae Hamoonga kwuru na Phiri jiiri ike napụ Constable Serah Banda igodo ụlọnga dịka mmanya na-egbu ya n’ụbọchị a chụrụ afọ.

    Ọ sịrị na Phiri gara kpọghee ụlọnga nke ndị nwoke na nke ndị nwaanyị ma nye iwu ka ndị niile e ji eji gbapụ, ma kwuo na nke ahụ bụ iji nye ha ohere ka ha gaa chụọ afọ.

    N’ime mmadụ iri na ise (15) ndị e ji eji, iri na atọ riri mbọmbọ tinyekwara onye uweojii ahụ n’onwe ya.

  20. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi!

    Anyị sị ka ụbọchị taa maara onye niile mma.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Amaka Ewuzie, Chinonso Ugorji na Michael Ngene ga na-ewetara gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Ikechukwu Kalu ga-esonyere anyị ma e mesịa.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị taa...