E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Rọshịa awakpoola ma gbuo mmadụ anọ na Kyiv

    Rọshịa awakpoola ma gbuo mmadụ anọ na Kyiv

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọchịchị mba Yukren ekwuola na mmadụ anọ anwụola dịka mba Rọshịa wakporo Kyiv n’abalị Fraịde 17 Jenụwarị 2025.

    Ndị ọchịchị na-adọ aka na ntị maka iyi egwu ogbunigwe ‘ballistic missile’ ma gbaa ndị bi ebe ahụ ume ka ha gaa chekwaa onwe ha

    Onyeisi obodo ahụ bụ Vitali Klitschko kwuru na wido gbariri na mpaghara etiti Shevchenkivskyi nke gụnyere n'ọdọụgbọoloko, na ọkụ gbakwara n'ụlọ mmadụ ebighị.

    O kwuru na o doghị anya ihe e zubere.

    Ihe onyonyoo na-efegharị gosiri etu ụgbọala si agba ọkụ ya na mmiri na-agbada ọsọọsọ n'okporoụzọ idemmiri juru.

    Klitschko kwuru na ndị nchekwa nọ n’ọrụ na mpaghara isi obodo Yukren.

    Nke a bụ mwakpo nke abụọ gburu ndị mmadụ na Kyiv n’ọnwa a, na-esote mwakpo mere n’ime obodo ahụ gburu mmadụ abụọ n’ụbọchị afọ ọhụrụ.

    Ndị ọchịchị kwuru na mmadụ isii merụrụ ahụ dịka mba Rọshịa wakporo obodo Zaporizhzhia dị na ọdịda anyawụ obodo ahụ n’ụbọchị Satọde. E nwere otu nwaanyị e kwuru na ọ nọ n’ọnọdụ siri ike.

    Mwakpo ndị a bụ ndị na-eme ọhụrụ kemgbe agha malitere dịka mba Rọshịa wakporo mba Yukren n’ọnwa Febụwarị n’afọ 2022.

  2. Donald Trump ewepụtala foto ọrụ ya.

    Donald Trump ewepụtala foto ọrụ ya.

    Ebe foto si, TRUMP VANCE TRANSITION TEAM HANDOUT/EPA

    E wepụtala foto ọrụ Onyeisiala Amerịka ọhụrụ bụ Donald Trump na osote ya bụ JD Vance dịka a ga-edu ha n’iyi ọrụ n’ụbọchị Mọnde 20 Jenụwarị 2025.

    Na foto ahụ, Trump fụchiri ihu ma tachie ọnụ ya ebe osote ya gbasapụrụ ihu ma tinyekwa ọchị n'ihu.

    Foto Trump nke ugbua dị iche na nke o jiri rụọ ọrụ n’oge ọchịchị ya nke mbụ n’afọ 2017.

  3. Ndị ọchịchị Izrel akwadola ka ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza malite n’ụbọchị Sọnde

    Ndị ọchịchị Izrel akwadola ka ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza malite n’ụbọchị Sọnde

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọchịchị mba Izrel akwadola nkwekọrịta Izrel na Hamas nwere maka ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza ya na ịtọhapụ ndị e ji eji, gosi na ya bu nkwekọrịta ga-amalite n’ụbọchị Sọnde.

    Ndị ọchịchị Izrel nwere nkwekọrịta inye nkwado a n’abalị dịka ha nwechara mkparịtaụka ebe minista iri abụọ na anọ kwadoro ya ma mmadụ asatọ ekweghị ka akwado nkwekọrịta a.

    Mana dịka nkwado a na-aga n’ihu, ụlọọrụ nchekwa obodo kwuru na ihe ruru mmadụ otu narị na iri isii (160) anwụọla site na mgbọ mba Izrel tụrụ na Gaza kemgbe ụbọchị Wenezde e kwupụtara nkwekọrịta a.

    Dịka ụlọọrụ Prịam Minista Benjamin Netanyahu siri kwuo, ndị ọchịchị nchekwa kwadoro nkwekọrịta a maka na ọ na-akwado ebumnobi agha.

    Ihe mbu a ga-emezu na nkwekọrịta a n’ime izuụka isii na-abịa abịa bụ ịgbanwe mmadụ iri atọ na atọ ndị Hamas ji na Gaza kemgbe ọnwa iri na ise agha ahụ malitere, nye ọtụtụ mmadụ ndị mba Palestine a tụrụ mkpọrọ n’Izrel.

    Ihe ọzọ bụ na ndịagha mba Izrel ga-ewepụ aka ebe ndị nkịtị nọ na Gaza, kwe ka ndị enweghị ụlọ na Mba Palestine laghachi n’ụlọ ha ma kwekwa ọtụtụ narị ụgbọala gwongworo bugara ndị mmadụ nri ụbọchị niile.

    Mkparịtaụka maka etu a ga-esi tọhapụ ndị ọzọ e ji eji, ndịagha mba Izrel ewepụ aka ha niile na mba Gaza ma mee ka udo laghachi, ga amalite n’abalị iri na isii.

    Nke atọ na nke ikpeazụ ga-abụ ịrụgharị Gaza nke ga-abụ ihe ga-ewe ọtụtụ afọ ya na iweghachi ozu ndị e ji eji.

  4. Anyị nwereike ibelata ọnụ ngwaahịa n’afọ a – Gọọmenti Naịjirịa

    Anyị nwereike ibelata ọnụ ngwaahịa n’afọ a – Gọọmenti Naịjirịa

    Minista na-ahụ maka ego bụ Wale Edun agwala ndị Naịjirịa ka ha nyekwuo gọọmenti oge n’ihi na ọnụ ngwaahịa ga-ebelata oge na-adịghị anya.

    Oge BBC na-agba ya ajụjụ, Edun kwuru na obi siri ya ike na ọnụ ngwaahịa nọ 35% ugbua ga-ebelata n’ọkara n’afọ a.

    Ọ kọwara nsogbu akụnaụba Naịjirịa na-agabiga ugbua dịka nke ihe kpatara ya bụ atụmatụ mwogharị ọnọdụ akụnaụba ndị gọọmenti tinyere n’ọrụ na nso nso a mana o kwenyere na ụmụ amaala Naịjirịa ga-ahụta uru ya oge na-adịghị anya.

    Ndị ọkachamara maka okwu akụnaụba ekwuola na ihe mere ọnụ ngwaahịa jiri rịa elu bụ mbudata ikikere ego naịra, mwezuga ego e ji ebelata ọnụahịa mmanụ nakwa etu ndị mmadụ siri chọsie ngwaahịa ike n’oge ezumike ngwụcha afọ.

  5. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi, Anyị sị egbe bere, ugo bere!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo na nke taa bụ Satọde 18 Jenụwarị 2025.

    Amaka Ewuzie na Chinonso Ugorji eburula oche iwetara gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana echefula na Ikechukwu Kalu ga-esonyere anyị ma e mesịa.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  6. Ụlọikpe Kachasị na mba Amerịka akwadola ka a machie TikTok na mba ha

    Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka kwadoro ka a machie TikTok

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọikpe Kachasị na mba Amerịka akwadola iwu sị ka a machie ọbaozi soshal midia TikTok na mba ahụ ma ọ bụrụ na ụlọọrụ nwe ya bụ ByteDance ereghi ya site ugbua ruo n’ụbọchị 19 Jenụwarị.

    Ụlọọrụ ByteDance mara iwu ahụ aka n’ihu ma kwuo na o megidere ikike nkwuwa okwu dịịrị mmadụ karịrị nde narị na nde asaa (170m) na-eji ọbaozi ahụ agbasa ozi.

    Mana ụlọikpe kachasị na mba Amerịka jụrụ mkpesa ahụ ụlọọrụ ByteDance nyere, nke pụtara na TikTok ga-akwakọrọ pụọ na mba Amerịka ma ọ bụrụ na o nweghi ndị a hụrụ ga-azụ ya.

    Ndị gọọmentị mba na ndị omeiwu na mba Amerịka boro ByteDance ebubo na ha na gọọmentị mba Chaịna nwere mmekọ ma kwuo na nke a metụtara nchekwa obodo ha.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ọchịchị ya ga-akwụrụ ọnụ n’ụbọchị Sọnde 19 Jenwụwarị kwuru na ọ gaghị itinye mmachi ahụ n’ọrụ na ọ ga-ahapụrụ ya Donald Trump ga-abanye n’ọchịchị na 20 Jenụwarị.

    Trump kwuru na ọ ga-eleba anya n'okwu ahụ tupu o mee mkpebi ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Trump bụ onye ga-ewere ọchịchị kwuru na ọ hụla mkpebi Ụlọikpe Kachasị banyere mmachi TikTok, na onye ọbụla kwesịrị ịkwanyere mkpebi ahụ ugwu.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-eme mkpebi nke banyere ebubo e boro ụlọọrụ ByteDance nwe TikTok n’ọge na-adịghị anya, kama na ọ ga-enyo ya ọfụma.

    Ọdịla anya isiụlọọrụ mba Chaịna bụ Beijing jiri katọọ atụmatụ ahụ kwuru na TikTok nwereike ịbụ ọgbatauhie na nchekwa mba ọbụla.

    Ndị mgbasaozi na-ekwu na nke a bụ nkata a na-akpa iji gbochie etu TikTok si na-eto na mbaụwa ma kwadoo ọbaozi nke ndị mba Amerịka nwee gụnyere Facebook na X.

    Nke a abụghị mbụ a na-amachie TikTok na mba ọzọ, mba ndị dịka India, Iran, Nepal, Afghanistan na Somalia adịla na mbụ machie TikTok. Ebe mba Briten machiri ndị ọrụ gọọmentị ha ndị omeiwu isonye na TikTok n’afọ 2023.

  7. A hụla igbe ọgwụike 'cocaine' n'ụgbọala ụlọọrụ nnochiteanya Sierra Leone na Guinea

    Ọgwụike 'cocaine'

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Siera Lion akpọchighala onye na-anọchite mba ahụ n'agbataobi ha bụ Gini dịka e nwetara igbe asaa ọgwụike juru na ya n'ụgbọala 'embassy'.

    N'ụbọchị Monde, nndị ọrụ mba Gini jichiri ụgbọala Ụlọọrụ na-anọchite Siera Lion na Gini ma kpochie ndị nọ n'ụgbọaala ahụ maka ebubo iji ihe ha na-enyo na ọ bụ ọgwụike a kpọrọ 'cocaine.

    Mịnịsta mba Siera Lion na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Sierra Leone's Alhaji Musa Timothy Kabba kwuru sị, " n'ihi ihe mere, gọọmentị akpọghachila onye nnọchiteanya Siera Lion na Gini bụ Alimamy Bangura, na Freetown iji kọwa ihe mere n'uju."

    Cheta na onye nnọchiteanya akpọghachiri azụ anọghị n'ụgbọala ahụị nke ọ na-eso na ndị anwụchiri.

  8. Ọ bụ nnukwu ọrụ ịchọpụta ndị nwụrụ ebe a na-egwupụta ihe – Ndị uweojii Saụt Afrịka

    Ndị uweojii nọ ebe ahụ ihe mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ ebe ahụ ihe mere

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii mba Saụt Afrịka bụ Brig Athlenda Mathe, ekwuola na ọ ga-ọbụ nnukwu ọrụ ịmata ndị a zọpụtara n’ebe a na-egwupụta ihe na mba ahụ n’izu a.

    Brig Athlenda Mathe onye gwara ndị ntaakụkọ okwu n’akụkụ ebe ahụ a na-egwupụta ihe na Stilfontein, kwuru na-ebupụtara, ozu mmadụ iri asaa na asatọ ụbọchị Monde 13 Jenụwarị, 2025, ya na ihe karịrị mmadụ narị abụọ na iri anọ merụrụ ahụ, bụ ndị na-egwupụta ihe n'ụzọ iwu na-akwadoghị dịka a na-arọ ọrụ nnapụta.

    O kwuru na ndị a ebupụtara nọ n’ime ala kemgbe ọnwa Novemba mgbe ndị ọchịchị bidoro ịgba mbọ iji kwụsị ọrụ igwupụta ihe n’ụzọ iwu na-akwadoghị site na-ịgba ụzọ esi a banye ebe ahụ gburugburu ma jụ ikwe ka nri na mmiri gbadaa n’ala.

    Ndị uweojii na-ekwu mgbe ọbụla na ndị ahụ na-egwupụta ihe n’ụzọ iwu akwadoghị nwere ike ịpụta mgbe ha chọrọ, ma kwuo na-ewepụtechala ozu mmadụ na ndị dị ndụ n’ebe ahụ a na-egwupụta ihe.

    Mathe kwuru na ọ bụ sọsọ ozu mmadụ abụọ ka a chọpụtara ndị ha bụ ma kwukwa n’ọtutụ ozu ewepụtara n’ebe ahụ rere ere bụrụ sọ ọkpụkpụ ka ewepụtara ha.

  9. E gbuola ihe ruru mmadụ 100 na Gaza kemgbe Izrel na Hamas nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ

    Ọgụ a achụọla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ha na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọgụ a achụọla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ha na Gaza

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa na Gaza ekwuola na ihe ruru mmadụ 100 anwụọla site n’ogbunigwe mba Izrel tụrụ na Gaza kemgbe e kwuputara nkwekọrịta ịkwa mgbọ ha nwere ụbọchị Wenezde, 15 Jenụwarị 2025.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ nchekwa ahụ bụ Mahmoud Basal, kwuru na mmadụ 101 nke gụnyere ụmụaka 27 na ụmụnwaanyị 31 anwụọla ebe mmadụ 264 ndị ọzọ meruru ahụ.

    O kwuru na e gburu mmadụ 9 oge mba Izrel wakporo otu ụlọ dị n’al-Jurn dị na mpaghara ugwu Gaza ebe mmadụ ise ọzọ ka e gburu oge a wakporo ụlọ dị na mpaghara etiti Gaza.

    N’aka nke ọzọ, ulọọrụ Prịam Minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na mba Izrel ekwenyela na nkwekọrita ha na Hamas ka atọhapụ ndị anwụchiri anwụchi.

    Ozi si n’ụlọọrụ Prịam Minista mba Izrel kwuru na e nyela ụlọọrọ nchekwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị iwu ka ha nwe ọgbakọ n’ụbọchị Frịade 17 Jenụwarị, 2025 tupu ndị ọchịchị agbakọọ maka ịkwado nkwenkọrịta a.

    Ndị ntaakụkọ mba Izrel kwuru na ndị na-anọchita anya mba Izrel, Hamas, mba Amerịka na Kataa ebinyela aka n’akwụkwọ nkwekọrịta a na Doha.

    Prịam Minista mba Kataa bụ Sheikh Mohammed bin Abdul Rahman Al Thani kwuru na a ga-amalite ime ihe dị n’akwụkwọ nkwekọrịta a ụbọchị Sonde 19 Jenụwarị ma ọ bụrụ na mba Izrel kwado ya.

  10. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ka ihu ọma kpọọ gị taa.

    Ndewo.

  11. Nkwụsị ịkwa mgbọ n'etiti Isreal na Hamas nwereike ịmalite n'ụbọchị Sọnde

    Obodo Gaza bụ ebe a na-akwa mgbọ kamgbe ọnwa iri na ise

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọrụ gọọmentị mba Amerịka kwuru na ha nwere olileanya na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n’etiti mba Isreal na Hamas ga-amalite n’ụbọchị Sọnde, na-agbanyeghi na Isreal na-ebo Hamas ebubo ịdọla aka azụ na nkwekọrịta ahụ.

    Mana Hamas ekwuola na ha dị njikere ime ihe ndị dị na nkwekọrịta ahụ. Onye ntaakụkọ BBC bụ Rushdi Abualouf na-anụ kepukepu na ndị otu a chọrọ ka a tọhapụ ndị otu onye maọbụ mmadụ abụọ gbapụtara ihe n’otu ha.

    A na-atụ anya ndị ndị omeiwu mba Isreal ga-enwe nzukọ iji binye aka ma kwadoo ka nkwekọrịta ahụ gaa n’ihu.

    Ụfọdụ ndị omeiwu yiri egwu na ga ga-agbahapụ njikọta aka ha jiri hiwe gọọmentị nọ n’ọchịchị na mba Isreal ma ọ bụrụ ma nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ gaa n’ihu mana nke a agaghị egbochi ya ma ọ bụrụ na praịm mịnịsta Benjamin Netanyahu chọrọ ka ọ gaa n’ihu.

    Na-agbanyeghi nkwupụta nkwekọrịta ahụ mere n’ụbọchị Wenezde, ndị ọrụ nchekwa na Gaza ekwuola na e gbuola ihe ruru mmadụ 20 bụ ndị Palestine site na mwakpo Isreal mere n’ụbọchị ahụ.

  12. Nwada Adewunmi Onanuga ji ọkwa ‘Deputy Chief Whip’ n’ụlọomeiwu nta anwụọla

    Adewunmi Onanuga bụ onye omeiwu Naịjirịa

    Ebe foto si, Dapo Abiodun/Facebook

    Nwada Adewunmi Onanuga ji ọkwa ‘deputy Chief Whip’ n’ụlọomeiwu nta anwụọla

    Onye omeiwu a a mụrụ n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba afọ 1965, dị afọ 59 nwụrụ na Wenezde 15 Jenụwarị, 2025 ka ọ rịachara obere ọrịa.

    Onanuga tupu ọnwụ ya bụ ji ọkwa ‘Deputy Chief Whip’ n’ụlọ nnọchiteanya ebe ọ nịchtereanya mpaghara Ikenne/Sagamu/Remo North nke Ogun Steeti.

    N’ozi si n’ụlọomeiwu nta, ha kwupụtara arịrị ha banyere ọnwụ nwada a bụ ‘onye obi ebere’.

    Pati ya bụ All Progressive Congress (APC) n’akwụkwọ ha wepụtara tiri mkpu akwa n’ọnwụ nwada ahụ.

    N’otu aka ahụ, ndị ọzọ a ma ama gụnyere Gọvanọ Ogun Steeti bụ Dapo Abiodun zigaara ezinaụlọ nwada a ozi iti aka n’obi.

  13. Gọvanọ Anambra Steeti etiela ndị ọdọ ahịa ha gbara ọkụ na Nnewi aka n’obi

    Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra Steeti

    Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra Steeti

    Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra Steeti ezigala ozi iti aka n’obi nye ndị ọkụ ahụ gbara n’ahịa mgbede dị n’akụkụ New Motor Spare Parts dị na Nnewi ụbọchị Tuzde 14 Jenụwarị, 2025.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ngwa ahịa ruru ọtụtụ ijeri naịra gbariri n’ọkụ ahụ.

    Ozi iti aka n’obi ahụ nke odeakwụkwọ Gọvanọ Soludo bụ Chriatian Aburime binyere aka na ya, katọrọ ajọ ọdachi ahụ ma kwe nkwa na gọọmenti ya ga-akwado ndị ọdọ ahịa na ngwa ahịa gbara ọkụ.

    Gọvanọ Soludo gara n’ihu too ndị ọrụ Anambra State Fire Service na ndị ọrụ gbata gbata ndị ọzọ maka mbọ ha gbara ịgbanyụ ọkụ ahụ oge ọ malitere.

    Ọ kpọkuru ndị ahịa ahụ ka ha kpachara anya ma rube isi n’iwu ọbụla ga-egbochi ọkụ iji gbochie ụdịrị ọdachi a n’ọdịnihu

  14. Izrel awakpola Gaza, gbuo mmadụ 20 tupu ndị ọchịchị akwado nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ

    Ogige ebe mwakpo ahụ mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogige ebe mwakpo ahụ mere

    Ụlọọrụ nchekwa obodo Gaza kwuru n’ihe ruru mmadụ iri abụọ si Palentine anwụọla kemgbe e kwupụtara na mba Izrel na Hamas kwekọrịtara ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza ụbọchị Wenezde 15 Jenụwarị, 2025.

    Ozi kwuru na ndị ọchịchị Izrel akwadobeghị nkwekọrịta Izrel na Hamas nwere ka a kwụsị ịkwa mgbọ na Gaza.

    Ntụliaka ndị ọchịchị Izrel nwere banyere nkwekọrịta ahụ egbuola oge ebe ụlọọrụ Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu na-ebo Hamas ebubo ịgharipụ nkwekọrịta ahụ e nwere.

    Prịam Minista Benjamin Netanyahu kwuru na ndị ọchịchị ga-enwe oge tupt ha emee nzukọ iji nwee mkparịtaụka banyere ịkwado nkwekọrịta ahụ.

    Cheta na Hamas wakporo mpaghara ndịda Izrel ụbọchị Satọde 7 Ọktoba 2023, gbuo ihe ruru mmadụ 1,200 ma tọrọ mmadụ 251 tụọ ha mkpọrọ na Gaza.

    Mịnịstrị Hamasa na-ahụ maka ahụike, kwuru na mwakpo ahụ bụ nke mere ka Izrel malite ịwakpo Gaza ma gbuo ndị mba Palestine ruru 46,000

  15. Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer ekwela Yukren nkwa nkwado dịka o mere njem na Kyiv

    Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer na Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer na Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky

    Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer awụchiela Kyiv iji binye aka na nkwekọrịta ga-anọ narị afọ n’etiti mba UK na Yukren.

    Nkwekọrịta a bụ nke ga-akụ ntu n’isi na nkwado akụnaụba na ndịagha mba Briten kwuru na ha ga-enye mba Yukren.

    Njem a bụ njem mbụ Keir Starmer ga-eme na mba Yukren kemgbe ọ rịgoro n’ọkwa dịka Praịm Mịnịsta UK ma bụrụ iji gosi nkwado ya nye Yukren tupu Donald Trump abanye dịka Onyeisiala mba Amerịka.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky na-atụ anya inwe mkparịtaụka iji hụ na ha wetara ezi nkwado ndịagha ha n’aka mba ndị na-akwado ha dịka mba UK. O kwuru na ọ na-eme nke a maka na ọchịchị Donald Trump nwereike ibulite agha ahụ dị n’etiti Yukren na Rọshịa ọzọ.

  16. Joe Biden adọla aka na ntị maka ọchịchị ‘oligarchy’ n'Amerịka n'ozi ikpeazụ ya dịka Onyeisiala

    Onyeisiala Joe Biden na-achị Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Joe Biden na-achị Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka na-apụ apụ bụ Joe Biden adọla aka na ntị banyere ọchịchị ‘oligarchy’ na-enwere ọnọdụ na mba Amerịka ugbua.

    Onyeisiala Biden kwuru nke a n’ozi ikpeazụ ya dịka Onyeisiala ma bụrụ nke na-eweta ọtụtụ afọ iri ya dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi njedebe.

    O kwuru n’ụbọchị Wenezde 15 Jenụwarị, 2025 na ọchịchị oligarchy na-etolite na mba Amerịka, bụ ihe na-echere ọchịchị onyekwuouche ya na ikike ndị Amerịka aka mgba.

    Biden gbara afọ 82, kwuru na ndị bara ọgaranya nke ukwuu n’ụlọọrụ mmepụta ‘teknụzụ'’ nwere ike igosi nnupuisi nye iwu ma malite imekpa ndị mba Amerịka ụfọdụ ahụ.

    Biden bụ onye kwupụtara okwu a n'obi ọchịchị ya bụ 'White House', dọrọ aka na ntị banyere ọnọdụ mgbanwe ihu igwe na mgbasa ozi na-ezighị ezi na soshaị midia.

    Ọ tụlere ihe ndị o mepụtara n'ọchịchị ya nke gụnyere imepụta ọrụ, ịhazi mmefu ego akụrụngwa, ahụike, ịchụ ọrị Covid ọsọ ụkwụ eru ala n'Amerịka ma mee ka mba Amerịka bụrụ ebe e nwere ezi nchekwa.

    O kwuru na ọ ga ewe oge tupu mba Amerịka amalite ịhụ ihe ọchịchị ya mere ma na mkpụrụ ha kụrụ ga-eto ma mịta mkpụrụ nke ga-anọ ọtụtụ afọ.

    Biden kwuru n’ọchụchọ obi ya bụ ka ọchịchị Donald Trump nwee ọganihu, mana ọ dọrọ aka na ntị ma kwuo na ọrụ dị a ga-arụ ugbua.

  17. Ọrịa Marburg ọhụrụ a na-enyo enyo etiwaspụla ma gbuo mmadụ asatọ na Tanzania - WHO

    Ọtụtụ mmadụ n'Afrịka anwụọla site n'ọrịa marburg n'ime afọ ole na ole gara aga

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ n'Afrịka anwụọla site n'ọrịa marburg n'ime afọ ole na ole gara aga

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) a dọọla aka na ntị banyere ntiwapụ ọrịa Marburg e kwuru na o yiri ọrịa Ebuola n’ugwu ọdịda anyanwụ nke mba Tanzania ma gbuo ihe ruru mmadụ asatọ.

    Ụlọọrụ WHO kwuru na ozi ha wetara kwuru na e nwere mmadụ itoolu a na-enyo enyo na ha bu ọrịa Marburg na mpaghara Kagera na mkpụrụ abalị ise gara aga.

    Ozi onyeisi ụlọọrụ WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus wepụtara n’akara X ya kwuru na a na-atụ anya ịchọpụta ndị ozọ bu ọrịa a n'ime ụbọchị ole na ole na-abịa dịka a na-aga n'ihu ime nnyocha ọrịa banyere ọrịa.

    Ọria marburg na-efe efe nke ukwuu dịka Ebola ebe njirimara ya gụnyere ahụ ọkụ, ahụ mgbu, afọ ọsịsa, ịgbọ agbọ, ọnwụ site n'oke imefu ọbara.

    Cheta na Tanzania nwere ntiwapụ nke mbụ ọrịa Marburg n'ọnwa Maachị 2023 na mpaghara Bukoba. O gburu mmadụ isii wee nọọ ihe ruru ọnwa abụọ.

    Ndị ọchịchị Tanzania ewepụtabeghị ozị ọbụla banyere ntiwapụ ọhụrụ ọrịa a.

  18. Unu abọọla chi eee

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 16 Jenụwarị, 2025.

    Ọfọ anyị bụ ije mmiri n'isi onye ọbụla.

    Ndewo nu.

  19. Isreal na Hamas ekwekọrịtala ịkwụsị ịkwa mgbọ n’obodo Gaza.

    Obodo Gaza bụ ebe a malitere ịkwa mgbọ kamgbe ọnwa iri na ise gara aga

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na mba Isreal na ndị otu Hamas nweela nkwekọrịta udo ịkwụsị ịkwakọrịta mgbọ na-aga n’ihu n’obodo Gaza nke Palestine.

    Nke a na-abịa dịka ndị na-ekpe udo n’etiti ndị nwechara mkparịtaụka ikpeazụ banyere nke a dịka ụlọọrụ mgbasaozi CBS si kwuo.

    Otu onye ọnụ na-eru n’okwu n’otu Hamas gwara BBC na ha anabatala mkpebi so mkparịtaụka udo ahụ e mere.

    Ndị na-ekpe udo n’etiti Isreal na Hamas nwere olileanya na nkwekọrịta udo ga-adị iji kwụsị nkwarịta mgbọ na-aga n’ihu n’obodo Gaza, kamgbe ọnwa iri na ise ọgụ ahụ malitere.

    Kepu kepu na-ekwu na otu Hamas anabatala akwụkwọ mkpebi udo nke ndị na-ekpe udo si na mba Qatar, Amerịka na Egypt wepụtara n’ikpeazụ a.

    Ụlọọrụ Praịm mịnịsta mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu agọnarịla akụkọ ahụ ebe o nwebeghi ozi si n’akụkụ ndị Palestine pụta banyere nke a.

    Mana a na-atụ anya na Praịm minista mba Qatar bụ Sheikh Mohammed bin Abdul Rahman Al Thani ga-agbasa ozi banyere nkwekọrịta udo ahụ.

    Mba Qatar na-ahazi mkparịtaụka udo n’etiti Isreal na Hamas n’ihu n’ihu mana ha anaghị agwarịta onwe ha okwu.

    Gịnị nwereike ịdị n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ?

    Nkwekọrịta ahụ ga-eme ka ọgụ na-ada n’obodo Gaza ugbua kwụsị

    O nwereike ime ka a gbanweritaa ndị e ji eji n’etiti mba Isreal na Hamas.

    Hamas kpachiri mmadụ 251 mgbe ha wakporo Isreal n’ọnwa Ọktoba 2023. Ha ka ji mmadụ 94 n’ime ha eji, na-agbanyeghi na Isreal na-ekwu na ọ bụ naanị mmadụ iri isii kafọrọ ndụ.

    A na-atụ anya na Isreal kwesịrị ịtọhapụ mmadụ ruru 1,000 bụ ụmụafọ Palestine ha ji kamgbe ọtụtụ afọ iji gbanwere ụmụafọ ha ndị Hamas ji.

  20. Gịnị mere o ji sie ike inwuchi Onyeisiala South Korea a chuturu n'ọkwa?

    Yoon Suk Yeol

    Ebe foto si, Reuters

    Tupu chi efo ụbọchị Wenezde, ndị uweojii dị puku atọ wuchiri n'ụlọ onyeisiala Saụt Koria a chụturu n'ike bụ Yoon Suk Yeol.

    A na-enyocha Yoon gbara afọ 64 maka ebubo ịkpalite ọgbaghara metụtara iwu e nyere n'abalị atọ nke ọnwa Disemba af o 2024 nke tinyere mba ahụ na-gbagharịa., Ụlọọmeiwu mba ahụ chụturu ya n'ọkwa n'ike mana ọ bụ nanị ma ụlọikpe akwadoro nchutu ahụ ka ọ nchutu ahụ ga-adị ire.

    Ebunmobi ha bụ ịnwuchi ya.

    Ha ji obe rịa ụgbọala ma were igwe bejie waya na ihe nile eji gbochie ha ịbata n'ụlọ ya.

    Nke a bụ nke abụọ ha gbalịrị inwụchi ya. Nke mbụ ha mere bụ na mbido ọnwa Jenụwarị a ebe ndị uweojii dị 150 na ndị nchekwa onyesisial kwatara.

    Mana ndị kwụnyere Yoon karịrị ndị uweojii n'ọnụọgụgụ.

    Ndị na-eche ya nche ji ahụ ha mee ochedo gburugburu ụlọ ya iji gbochie ndị uweojii ime ihe ha bịara.

    Oge ndị uweojii ahụ hụrụ na 'okwu ahụ agaghị enwe isi, ha laa.

    Yoon bụ onye banyere ndọọndọọ ọchịchị ọhụrụ oge o meriri na ntuliaka n'afọ 2022 bụ onye kpere ikpe ebubo nrụrụaka megide Onye bụbụ onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Park Geun-hye n'afọ 2016.

    Ebubo nrụụ aka e ji achụgharị ya metụtara ihe nwunye ya bụ Kim Keon Hee metara nke gụnyere ịnara onye ụkọchukwu onyinye akpa oke ọnụ ahịa a kpọrọ, Dior nakwa wuruwuru n'ọnụ ahịa 'stọck' na mba ahụ.

    Yoon rịọrọ ndị Koria mgbaghara mana ọ jụrụ inye ohere ka e nyochaa nwunye ya maka ebubo nd i e na-ebo ya.