E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Ndị uweojii awụchiela ndị a na-enyo enyo dịka ndị ohi n’Enugwu Steeti.
Ebe foto si, Nigerian Police
Nkọwa foto, Ndị uweojii awụchiela ndị a na-enyo enyo dịka ndị ohi n’Enugwu Steeti
Ndị uweojii Enugwu Steeti anwụchiela ndị ntorobịa atọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe ezu ohi nakwa ndị otu nzuzo.
Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru na nwụchị anwụchiri ndị ahụ mere ka ha nweta ngwa agha atọ nke gụnyere mgbọ egbe asatọ na ihe ndị ọzọ.
O kwuru na ndị uweojii nwụchiri ndị ntorobịa abụọ aha ha bụ Okorie Israel Nweze dị afọ iri abụọ na ise na Tobechukwu Emmanuel dị afọ iri abụọ n’ụbọchị Tuzde, abalị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2025 na Garriki, Ugwuoba dị n’okpuru ọchịọchị Oji-River, n’Enugwu steeti.
Ndị uweojii napụtara ha egbe abụọ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ahụ a na-enyoenyo kwupụtara na ha na-eji egbe ozi ohi ma na-etinye aka na mpụ ndị ọzọ nke gụnyere ịzụ ahịa ọgwụike n'okporoụzọ Abakaliki nakwa n’Ọka dị n’Anambra Steeti.
Ndukwe gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na-ahụ maka otu nzuzo napụtara ma nwụchie otu nwoke ọzọ a na-akpọ Effia Onyedika John dị afọ iri abụọ na asaa a maama dịka “Fela” n’aka igwe mmadụ chọrọ ịkụgbu ya na mpaghara Ugbo-Paul dị n’Abakpa-Nike n’Enugwu.
Ndị uweojii nwetere egbe abụọ n’aka Fela.
O kwupụtakwara na ya bụ onye otu nzuzo Vikings ma na-eso ezu ohi n’Enugwu.
O kwuru na ndị uweojii ga-akpọpụta ndị ahụ a na-enyo enyo n’ụlọikpe ngwa ngwa e mechara nyocha.
Mana Kọmishọna ndị uweoji n’Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu kwere nkwa na ndị uweojii ga-ahụ na Enugwu agaghị adị ndị na-eme mpụ mma, ma rịọ ndị mmadụ ka ha nyere ndị uweojii aka n’ịlụso mpụ ọgụ.
Ebe foto si, Nigerian Police
Nkọwa foto, Ndị uweojii awụchiela ndị a na-enyo enyo dịka ndị ohi n’Enugwu Steeti
E gbuola mmadụ atọ so n’otu IPOB/ESN n’Imo steeti
Ebe foto si, Nigeria Police
Nkọwa foto, Ihe ndị uweojii nwetere n'aka ndị ESN ha gburu
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi mere ka
a mata nke a n’akwụkwọ ozi o binyere aka n’abalị iri na isi nke ọnwa Jenuwari, afọ
2025.
Dịka akwụkwọ ọzị ahụ si kwuo, e gburu mmadụ atọ ndị
ESN ahụ n'ime oke ọhịa dị n’ihube, n’okpuru ọchịchị Okigwe dị n’Imo steeti.
Adejobi sị na mmadụ atọ ndị ESN ahụ nwụrụ mgbe ha na
ndịagha Naịjirịa na-akwakọrịta mgbọ.
Ọ kwuru na aha mmadụ atọ ndị ahụ bụ Ifeanyi Anayo
a na-akpọ Zuma De Rock dị afọ iri abụọ
na asatọ, Chukwuemeka Odionyenfe a maara dịka Nmimi dị afọ iri abụọ na abụọ
nakwa Kingsley Sunday dị afọ iri abụọ na otu.
Ọ sị na ha wetere ngwaagha dị icheiche dịka egbe AK-47
nakwa ogbunigwe, igwe nzịkọrịta ozi nakwa ọgbatumtum asatọ n’aka ha.
Ọ gara n’ihu kwuo na nyocha ha mere na-egosi na mmadụ
atọ ndị ahụ so na ndị omekome gbara ụlọ ndị uweojii ọkụ n’Arondizogu n’ọnwa
Febuwarị afọ 2022, nakwa ndị wakporo ụlọnga dị n'Owere n’abalị ise nke ọnwa Epril,
2021.
Hamas atọhapụla mmadụ anọ bụ ụmụnwanyị ndịagha mba Izrel
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ụmụnwanyị ndịagha mba Izrel
Otu na-eyi ọha egwu a kpọrọ Hamas atọhapụla ndịagha
mmadụ anọ nke mba Izrel ha tọọrọ.
Obi juputara ndị mmadụ n’aṅụrị na Tel Aviv n’oge ndị
ọrụ gbatagbata Red Cross nyefere ụmụnwanyị atọ ndị ahụ n’aka gọọmenti mba Izrel.
Ọtụtụ ezinaụlọ bụ ndị Hamas tọọrọ ndị nke ha juputara
n’ogige ebe ahụ Red Cross nọ nyefee ụmụnwanyị ndị ahụ n’aka gọọmentị mba Izrel.
Mgbe ha hụrụ ndị nke ha ka ọtụ n'ime ha bidoro na-ebe akwa, ọtụtụ na-enwekwa aṅụrị ma na-ebi
onwe ha ọma.
Nkọwa foto, Mgbe ndị Red Cross na-ebute ụmụnnwanyị ahụ
Cheta na mba Izrel na Hamas nụrụ agha kwụsịrị n'ihe dịka abalị isii garaaga ka ọ gachara ọnwa iri na ise na Gaza Strip nke mere ha abụọ jị nwee nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na ịtọhapụ ndị nọ na nga maọbụ ndị ha tọọrọ.
Ndịagha nnupuisi egbuola Gọvanọ Peter Cirimwami nke mba DR Kongo
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ndị na-agba ọsọ agha na mba DR Kongo
Ndịagha mba DR Kongo ekwuola na ndịagha nnupuisi a na-akpọ M23 egbuola Gọvanọ onyeagha na-achị
mpaghara Nọt Kivu aha ya bụ ọchịagha Peter Cirimwami.
Ha kwuru na mgbọ ndị nnupuisi M23 tụrụ Gọvanọ Peter Cirimwami mgbe a wakporo mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha na DR Kongo bụ Sylvain Ekenge
kwuru na e jiri ụgbọelu buga Gọvanọ Peter Cirimwami ụlọọgwụ dị na Kinshasa bụ
ebe dọkịnta nọ kwuo na ọ nwụọla maka mgbọ tụrụ ya.
Agha dị n’etiti ndị M23 na mba DR Kongo kpụ ọkụ n’ọnụ kemgbe
mbido afọ a.
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Ndị na-agba ọsọ agha na DR Kongo
Otu mba ụwa bụ United Nation (UN) ekwuola na mmadụ karịrị narị puku anọ (400,000) esila n’ụlọ ha gbaa ọsọ agha kemgbe ndị M23 nụrụ agha ruo na mpaghara obodo Goma ma weghaara obodo dịka Maisisi na Mivona.
Ebe ọkụ gbara na Los Angeles dịka “ebe a tụrụ ogbunigwe” – Donald Trump
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Oge Onyeisiala Donald Trump na nwunye ya gara hụta ebe ọkụ ọgbụgba mebiri ihe
Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump agaala hụta etu
ọkụ ọgbụgba si akpa mkpamkpa na California na mpaghara Los Angeles (LA)
n’abalị garaaga.
Trump zutere gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Gavin Newsom
ma kwee nkwa na ya ga-enyere aka kwụsị ọkụ ahụ.
Mgbe Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ọ sị “anyị chọrọ
ịkwụsị ọkụ a” ma kọwa etu ọnọdụ ebe niile ọkụ ahụ gbachara kwụsị dịka “ebe a tụrụ
ogbunigwe”.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mgbe Onyeisiala Donald Trump na Gọvanọ Gavin Newsom zutere
Mana n’oge Gọvanọ Gavin Newsom na-ekwuokwu ka ọ gwara Trump sị na ha “chọrọ enyemaka gọọmenti etiti nakwa ezigbo nkwado”.
Trump na nwunye ya so gaharịa na mpaghara dị icheiche ebe ọkụ ahụ ka na-agba.
Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.
Buru oche gị sonyere anyị maka akụkọ niile si mbaụwa anyị na-enwetara gị.
Ndewo.
Aka akparala ụkọchukwu a hụrụ foto ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọụka ya
Ebe foto si, Victor Ewuukunye
Nke a na-eso akụkọ na-efegharị na soshal midia na a nwụchiri ndị ụkọchukwu adịgboroja na Rumunduru, na ndị a liri igbe ozu n’ime ụlọụka, ma hụkwaa eke n’ụlọụka ahụ.
Iringe kwuru na ndị a si n’Akwa Ibom Steeti, na ihe ndị a hụrụ n’aka ha gụnyere mgbọ egbe, otu mmaagha, akwụkwọ njirimaara ndịagha mmiri adịgboroja, foto ọtụtụ ndị mmadụ, otu akpụkpọụkwụ nwata, ihe ndị e ji achụ aja n’ime ụlọụka ahụ mana ha ahụghị eke maọbụ okpokoro isi mmadụ ọbụla.
Ebe foto si, Victor Ewuukunye
Aka akparala
ndị ụkọchukwu abụọ ji ọkpụkpụ na ọtụtụ foto ndị mmadụ
Ndị uweojii
Rivers Steeti agbaala ndị ụkọchukwu adịgboroja abụọ n’anwụ bụ ndị ntoroọbịa
Rumunduru nwuchiri dị n’okpuruọchịchị Obio/Akpor.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii bụ Grace Iringe kwuru na ndị ntoroọbịa nwụchiri ndị a n’ụbọchị
20 Jenwụarị, 2025 ma nyefee ha n’aka ndị uweojii.
Otu n’ime ụkọchukwu ndị a nwuchiri nke ụlọụka Church of God Apostolic Deliverance dị n’Eneka kwuru na ọ na-eji akụrụngwa ndị ahụ ekpere ndị mmadụ ekpere dịka Chineke si nye ya ntuziaka na o nweghi ihe ọzọ, ma kwuo na ọ bụ ebubo ka e boro ya.
Ebe foto si, Victor Ewuukunye
“Ebiela m n’obodo a afọ 17, na-agwọ ma na-enyere ndị mmadụ aka. Foto ndị unu hụrụ ebe a bụ nke nwa m nakwa nke ụfọdụ ndị na-ekpe n’ụlọụka m.” Ka ọ kọwara.
“Ọ bụ ala na-ese okwu. Aka m nwere izuụka atọ ịkwapụ dịka ụlọikpe nyere n’iwu tupu ihe ndị a emee. Ha mere nke a iji rapụta m. Ọ bụ ndị obodo dosara ọtụtụ ihe ndị ahụ ha kwuru na a hụrụ n’ụlọ m. Ha nyochara ụlọ m na-anataghị ikike.
Ọ gara n’ihu kwuo “Eji m obere ikpe ahụ na mmanụ ihe ndụ ịrịbaama kpeere onye nwere isi mgbaka ekpere, onye ahụ ga-enwere onwe ya n’ime ọnwa atọ. Ana m eji ya enyere ndị obodo aka,” ka o kwuru.
Ebe foto si, Victor Ewuukunye
Onye ọzọ e jidere bụ ụkọchukwu nke ụlọụka Power of God House Ministry kwuru na ọ n’ụlọụka ahụ maka na ya na ụkọchukwu nwere mkparịtaụka, mgbe ndọ ọrụ OSPAC na ndị obodo bịara nwuchie ha.
Onyendu ndị ntoroọbịa obodo ahụ kwuru na ọ bụ Onyeisi ndị ọrụ OSPAC kwuru na ụkọchukwu ahụ na-achụ aja n’okporoụzọ.
Ndị uweojii kwuru na ha ga-aga n’ihu n’ime nnyocha ebe ndị ụkọchukwu a ga-anọ n’ụlọmkpọrọ.
Onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Tinubu ahọpụtala Onyeisioche pati All Progressives Congress (APC)
bụ Abdullahi Ganduje dịka onyeisi bọọdụ na-elekọta ụlọọrụ Federal Airport
Authority of Nigeria (FAAN).
Ọ họpụtakwara
Odeakwụkwọ APC bụ Sịnetọ Bashiru Ajibola dịka Onyeisioche bọọdụ na-elekọta ụlọọrụ
National Sugar Development Council (NSDC).
Onye ndụmọdụ
pụrụiche Onyeisiala maka mgbasaozi bụ Bayo Onanuga kwuputara nke a n’ozi o wepụtara
n’ụbọchị Fraịde 24 Jenụwarị 2025.
Ozi ahụ kọwara
na Onyeisiala Tinubu họpụtara mmadụ iri anọ na abụọ (42) dịka ndị isi bọọdụ
na-elekọta ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche tinyekwara odeakwụkwọ maka bọọdụ
na-elekọta Civil Defence, ụlọọrụ Immigration na ụlọọrụ na-ahụ maka ndị mkpọrọ.
Dịka ozi ahụ
siri kọwaa, Onyeisiala họpụtakwara onyeisi ọhụrụ maka ụlọorụ Nigerian Railway
Corporation nakwa nnukwu onyeisi ọhụrụ maka ụlọọrụ National Board for Technology
Incubation (NBTI).
Onanuga
kwuru na Onyeisiala nyere mmadụ ndị ahụ a họpụtara ndụmọdụ ka ha ghara itinye
anya n’okwu gbasara nlekọta ụlọọrụ ndị ahụ n’ihi na nke ahụ esoghị n’ọrụ ha.
Ebe foto si, Abdullahi Ganduje/X
Nkọwa foto, Abdullahi Umar Ganduje
Aha mmadụ niile Onyeisiala Tinubu họpụtara nakwa ụlọorụ ha
NATIONAL
YOUTH SERVICE CORPS
Hon. Hillard Eta Chairman (Cross River)
NIGERIAN INSTITUTE OF INTERNATIONAL AFFAIRS
Prof. Bolaji Akinyemi, Chairman (Lagos)
FEDERAL AIRPORT AUTHORITY OF NIGERIA
H. E. Abdullahi U. Ganduje, Chairman (Kano)
NATIONAL SUGAR DEVELOPMENT COUNCIL
Sen. Surajudeen Bashiru Ajibola, Chairman (Osun)
NIGERIA BULK ELECTRICITY TRADING COMPANY
H. E. Sulaiman Argungu, Chairman (Kebbi)
NATIONAL AGENCY FOR GREAT GREEN WALL
Sen. Magnus Abe, Chairman (Rivers)
NATIONAL TEACHERS INSTITUTE
Barr. Festus Fuanter, Chairman (Plateau)
NATIONAL BOARD FOR TECHNOLOGY INCUBATION (NBTI)
Raji, Kazeem Kolawole, Director-General (Oyo)
NIGERIAN INSTITUTE OF EDUCATIONAL PLANNING AND ADMINISTRATION
Chief Victor Tombari Giadom, Chairman (Rivers)
TEACHERS REGISTRATION COUNCIL OF NIGERIA
Comrade Mustapha Salihu, Chairman (Adamawa)
INDUSTRIAL TRAINING FUND
Hon. Hamma Adama Ali Kumo, Chairman (Gombe)
NIGERIAN INSTITUTE OF SCIENCE LABORATORY TECHNOLOGY
Donatus Enyinnah Nwankpa, Chairman (Abia)
SHEDA SCIENCE AND TECHNOLOGY COMPLEX
Sen. Abubakar Maikafi, Chairman (Bauchi)
FEDERAL MORTGAGE BANK OF NIGERIA
H. E. Nasiru Gawuna, Chairman (Kano)
NATIONAL OFFICE FOR TECHNOLOGY ACQUISITION AND PROMOTION
Sen. Tokunbo Afikuyomi, Chairman (Lagos)
NIGERIAN POSTAL SERVICE
Chief D. J. Kekemeke, Chairman (Ondo)
NATIONAL INLAND WATERWAYS AUTHORITY
Hon. Musa Sarkin Adar, Chairman (Sokoto)
NATIONAL STEEL COUNCIL
Prof. Abdulkarim Kana Abubakar, Chairman (Nasarawa)
NATIONAL ENVIRONMENTAL STANDARDS AND REGULATIONS ENFORCEMENT AGENCY
Hon. Garba Datti Muhammad, Chairman (Kaduna)
NATIONAL BIO-SAFETY MANAGEMENT AGENCY
Mu’azu Bawa Rijau, Chairman (Niger)
NIGERIAN BUILDING AND ROAD RESEARCH INSTITUTE
Hon. Durosimi Meseko, Chairman (Kogi)
FEDERAL TEACHING HOSPITAL, GOMBE
Hajia Zainab A. Ibrahim, Chairman (Taraba)
NIGERIAN RAILWAY CORPORATION
Dr.Kayode Isiak Opeifa, Managing Director (Lagos)
FEDERAL TEACHING HOSPITAL, IDO-EKITI
Aare (Hon.) Durotolu Oyebode Bankole, Chairman (Ogun)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, ABEOKUTA
Mr Abdullahi Dayo Israel, Chairman (Lagos)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, ASABA
Dr. Mrs. Mary Alile Idele, Chairman (Edo)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, LOKOJA
Nze Chidi Duru (OON), Chairman (Anambra)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, OWERRI
Hon. Emma Eneukwu, Chairman (Enugu)
CIVIL DEFENCE, IMMIGRATION AND PRISONS SERVICES BOARD
Major Gen. Jubril Abdulmalik Rtd, Secretary (Kano)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, UMUAHIA
Mr. Uguru Mathew Ofoke, Chairman (Ebonyi)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, YENAGOA
Barr. Felix Chukwumenoye Morka, Chairman (Delta)
FEDERAL MEDICAL CENTRE, YOLA
Alh. Bashir Usman Gumel, Chairman (Jigawa)
DAVID UMAHI FEDERAL UNIVERSITY TEACHING HOSPITAL, UBUHU, EBONYI
STATE
Dr. Ijeoma Arodiogbu, Chairman (Imo)
NATIONAL OIL SPILL DETECTION AND RESPONSE AGENCY
Chief Edward Omo-Erewa, Chairman (Edo)
NIGERIAN MARITIME ADMINISTRATION AND SAFETY AGENCY (NIMASA)
Yusuf Hamisu Abubakar, Chairman (Kaduna)
NNAMDI AZIKIWE UNIVERSITY TEACHING HOSPITAL, NNEWI, ANAMBRA
STATE
Hon. Ali Bukar Dalori, Chairman (Borno)
AHMADU BELLO UNIVERSITY TEACHING HOSPITAL, SHIKA, ZARIA, KADUNA STATE
Hon. Lawal M. Liman (Chairman)
FEDERAL MEDICAL CENTRE KATSINA
Dr. Abubakar Isa Maiha (Chairman)
RAW MATERIALS RESEARCH AND DEVELOPMENT COUNCIL (RMRDC)
Isa Sadiq Achida, Chairman (Sokoto)
FEDERAL MEDICAL CENTRE BIRNIN KUDU
Dr. Mohammed Gusau Hassan, Chairman Zamfara
NATIONAL BUILDING AND ROAD RESEARCH INSTITUTE
Hon. Yahuza Ado Inuwa, Chairman (Nasarawa)
SOKOTO-RIMA RIVER BASIN DEVELOPMENT AUTHORITY
Amb. Abubakar Shehu Wurno, Chairman (Sokoto)
AMINU KANO TEACHING HOSPITAL
Augustine Chukwu Umahi, Chairman (Ebonyi)
FEDERAL SCHOLARSHIP BOARD
Engr. Babatunde Fakoyede, Chairman (Ekiti)
NIGERIAN SOCIAL INSURANCE TRUST FUND
Hon. Shola Olofin, Chairman (Ekiti)
Gọọmentị Naijirịa amachiela Lakurawa dịka otu na-eyi ọha egwu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Gọọmentị kwuru na ndị otu ahụ na-emebi obi ndị mmadụ ma na-enye ha ndụmọdụ ka ha nnupụisi n’iwu ndị ọchịchị.
Lakurawa bụ otu agha a ma ama mana ndị bi na Sokoto, Zamfara, Kebbi steeti na mpaghara ndị ahụ nwere okeala na mba Nije kwuru na oteela aka ndị otu ahụ na-apụ na-abata.
N’akwụkwọ ikpe gọọmentị tinyere n’ụlọikpe kachasị elu n’Abụja ụbọchị Tọzde 23 Jenụwarị 2025, o kwuru na ndị otu ahụ na-eyi ọha egwu, ezu ohi, atọrọ ndị mmadụ ma na wakpo ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ ọchịchị.
Gọọmentị kwuru na ndị otu ahụ na-emebi obi ndị mmadụ ma na-enye ha ndụmọdụ ka ha nnupụisi n’iwu ndị ọchịchị.
Minista n’ahụ maka ikpe ziri ezi na Naijirịa bụ Leteef Fagbeni kwuru na ndị otu ahụ na-etinye ihe egwu na nchekwa Naijirịa nke mere ka ha rịọ ụlọikpe ka a machie otu ahụ ma kpọọ ha otu na-eyi ọha egwu.
N’ikpe ọkaikpe James Omotosho kpebiri, ọ machiri otu ahụ.
Lee ụfọdụ otu ndị ọzọ gọọmentị Naijirịa machiri dịka otu na-eyi ọha egwu
Ndị otu Boko Haram
Ọ bụ otu ama na Naijiria dịka “Jamaatu Ahlis-Sunna Liddaawati Wal Jihad” nke na-achọ ịkwatu ọchịchị gọọmentị Naijiria ma were ọchịchị dabere na iwu Islam dochie ya.
Boko Haram mere mwakpo mbụ ya megide mmasị ndị ọdịda anyanwụ na 26 Ọgọst 2011, mgbe otu ahụ ji ụgbọala nwere wakpoo isi ụlọọrụ ‘United Nation’ dị n’Abuja, ebe ha gburu opekata mpe mmadụ iri abụọ na atọ ma merụọ ihe karịrị mmadụ iri asatọ ahụ.
Gọọmentị etiti machiri otu a n’afọ 2013 dịka ọ na-agba mbọ ịkwụsị ihe gbasara ụrọ ndị nnupụisi na ndị na-eyi ọha egwu.
Otu a mere ọtụtụ ihe ọjọọ nke gụnyere ịtọrọ ụmụaka ụmụ akwụkwọ narị abụọ na iri asaa na Boronu steeti n’afọ 2014 nke nwetere Naijirịa nkatọ na mba ụwa.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Gọọmentị Naijirịa machibidoro otu a na-akpọ Indigenous People of Biafra (IPOB) n’ọnwa Sepụtemba n’afọ 2017, dịka otu na-eyi ọha egwu
Ndị otu IPOB
Gọọmentị Naijirịa machibidoro otu a na-akpọ Indigenous People of Biafra (IPOB) n’ọnwa Sepụtemba n’afọ 2017, dịka otu na-eyi ọha egwu.
Gọọmentị kwuru na otu a na-etinye aka n'ime, sonye n'ime, kpalite ma kwadoo ime ọtụtụ ihe iyi ọha egwu na Naịjirịa, ọkachasị na ndịda ọwụwa anyanwụ.
Gọọmentị kwuru na otu ahụ na-alụ ọgụ nwere onwe dị Igbo, gburu otu nwaanyị, ụmụ ya anọ na mmadụ isii ndị ọzọ n’Anambra steeti n'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Mee 2022.
Akụkọ kwuru na IPOB bụ ndị na-akpa ike kemgbe ogologo oge ma na-akwado iweta nkewa n’ala.
IPOB na-aga n'ihu na-amachi ihe niile na-eme na mpaghara ọdịda-ọwụwa anyanwụ na-amanye onye ọ bụla ịnọdụ n'ụlọ.
Ndị ojiegbe 'Bandit'
Gọọmentị machibidoro otu ndị ohị a na-kpọọ “Yan Bindiga Group” na “Yan Ta’adda Group” amaama dịka “Bandit” nke na-eyi ọha n’ala Naijirịa.
Otu a bụ ndị a na-ebu ebubo na ha na-ezu ehi, atọrọ mmadụ maka ego mgbapụta, igwupụta ọla edo n’ụzọ iwu akwadoghị, izu ohi ngwa ọgụ, ogbugbu mmadụ, idina mmadụ n'ike na mbibi ihe ubi, anụ ụlọ na ihe onwunwe.
Gọọmentị etiti machiri ịdị adị ma gbochie onye ọ bụla maọbụ otu ndị mmadụ isonye na mmemme nke otu a.
Minista n’ahụ maka ikpe ziri ezi mgbe gọọmentị machiri otu n’afọ 2022 bụ Abubakar Malami bịanyere aka n’akwụkwọ machibido otu ahụ n’abalị ise n’ụbọchị Wenezde Jenụwarị, 2022.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Gọọmentị etiti machibidoro otu a na-akpọ ‘Shiite Movement’ dịka otu na-eyi ọha egwu n’afọ 2019
Ndị otu Shiite
Gọọmentị etiti machibidoro otu a na-akpọ ‘Shiite Movement’ dịka otu na-eyi ọha egwu n’afọ 2019.
Ụlọikpe kachasị elu n’Abuja nyere gọọmentị etiti ikike ịmachibido otu a ma nye ikike etinye otu a n’akwụkwọ akụkọ.
Onye ọkaikpe
gọomentị etiti na Seattle dị na Washington egbochiela mbọ Onyeisiala Donald Trump ịkwụsị ụmụaka
a mụrụ na mba Amerịka ị bụ nwaamaala mba Ahụ.
Onye ọkaikpe
mpaghara a bụ John Coughenour kwuru n’usoro iwu ọhụrụ Trump “akwụyeghị n’usoro
iwu” mba Amerịka ma nye iwu ga-egbochi Onyeisiala Trump ịmalite ya ka a nụchara okwu a n’ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde 23 Jenụwarị.
Dịka nkọwa
nke ndozigharị na Iwu ‘14th Amendment to the Constitution,’ ọ fọrọ nke nta ka ọ
bụrụ onye ọ bụla a mụrụ n'ime US ka a na-enye nwa amaala na-akpaghị aka.
Trump chọrọ
ịkwụsị iwu ahụ ebe ụmụaka amụrụ na mba Amerịka ndị nne na nna ha nọ n’Amerịka
n'ụzọ iwu na-akwadoghị maọbụ nwa oge.
Steeti anọ
nke gụnyere Washington, Arizona, Illinois na Oregon - rịọrọ ka akwụsịtụ iwu ahụ
ka ụlọikpe gọọmentị etiti na-atụle.
A
ga-ejigide usoro iwu ahụ mkpụrụ ụbọchị iri na anọ ruo mgbe ụlọikpe ga-aga n'ihu
ịtụle usoro iwu ọhụrụ ahụ.
Otu onye ọkaikpe
bụ Sumi Somaskanda gwara BBC okwu, katọrọ usoro iwu ọhụrụ Trump chọrọ ịkwụsị ụmụaka
amụrụ na mba Amerịka ịbụ nwaamala, ma sị na o megidere usoro iwu mba Amerịka.
Onye ọkaikpe
n’obodo Michigan bụ Dana Nessel, kwuru na ọ tụghị ya n’anya n’onye ọkaikpe nke
gọọmentị etiiti gbochiri ebumnaobi Trump ahụ nwa oge.
White House
kwuru na ọ ga-agbagha mkpebi ikpe ahụ.
Donald Trump ekwuola na ya agaghị ebuli ọnụego azụmahịa na ngwaahịa si mba Chaịna
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Amerịka Donald Trump na Onyeisiala Chaịna Xi Jinping
Donald
Trump ekwuola na ya agaghị ebuli ọnụego azụmahịa “tarifu” dị n’etiti mba Amerịka
na Chaịna, mgbe o yichara egwu na ya ga- amalite ime ihe megịde mba ahụ bụ nke
abụọ akụnaụba ya kachasị n'ụwa.
Onyeisiala
mba Amerịka gwupụtara nke a mgbe Fox News na-agba ya ajụjụ ọnụ gbanyere ọnụahịa
azụmahịa mba Amerịka na Beijing.
Mana ozi si
n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ n’ahụ maka mba ofesi na Chaịna bụ Mao Ning, rụtara
aka na nkwado akụnaụba na azụmahịa n'etiti mba abụọ ahụ ga-eme ka ha reti uru
na mmeri.
O kwuru
na-enweghị onye ọ bụla ga-enwe mmeri na agha azụmaahịa na agha tarifu, maka na ọ
bụ maka ọdịmma nke akụkụ ọ bụla na nke ụwa.
Mao kwuru
na ọ dịbeghị mgbe Chaịna kpachapụrụ anya nweta ego azụmaahịa wee rụtụ aka na
enwere "nnukwu oghere" maka imekọ n'etiti Chaịna na US.
Agaghị m anabata ka Ọkaikpe Binta Nyako kpee ikpe m ọzọ - Nnamdi Kanu
Ebe foto si, Getty Images
Nnamdi Kanu
bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agwala ndị ọkaiwu ya ka ha
gbaa mbọ hụụ na ọ bụghị Ọkaikpe Binta Murtala-Nyako ga-ekpe ya ikpe.
Kanu kwuru
nke a n’ụbọchị Wenezde 22 Jenụwarị, 2025 mgbe ndị ọkaiwu ya gara ileta ya n’ụlọ
mkpọrọ ndị DSS dị n’Abuja.
N’ozi si n’aka
Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Kanu, o kwuru na Ọkaikpe Murtala-Nyako adịla na mbụ
wezuga onwe ya n’ikpe ahụ na ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ bụrụ ụlọikpe mee
nke a.
Kanu gara
na ha dị njikere ịpụta n’ụlọikpe n’ụbọchị 10 Febụwarị 2025 ma ọ bụrụ na Ọkaikpe
ọzọ si n’ụlọikpe Ukwu ga-ewere ikpe ahụ.
Ọ gara n’ihu
kwuo na ọ bụrụ na o nweghi Ọkaikpe ọbụla nọ n’Abuja chọrọ ikpe ikpe ahụ, na
Onyeisi ndị Ọkaikpe na Naịjirịa nwere ohere ibute ikpe ahụ na mpaghara Ọwụwa
Anyanwụ gụnyere Umuahia, Awka, Enugwu, Asaba, Port Harcourt bụ ebe a sị na Kanu
nọ mee mpụ ndị ahụ.
Otu WTO adọọla aka na ntị na agha azụmaahịa mbaụwa ga-ebuta nnukwu nsogbu
Ebe foto si, Ngozi Okonjo Iweala / X
Nkọwa foto, Onyeisi otu World Trade Union (WTO) bụ Ngozi Okonjo Iweala
Onyeisi otu World
Trade Union (WTO) bụ Ngozi Okonjo Iweala ekwuola na agha azụmahịa dị n’etiti
mba ụwa dị icheiche ga-ebuta nnukwu nsogbu.
Okonjo Iweala
dọrọ aka na ntị sị na atụtụmatụ iwu mba ụwa na-enweputa ịji na-ama onwe ha aka
ma na-ata ibe ha ahụhụ ga-abụ ihe iche aka mgba na mmepe ụwa niile.
Iweala na-ekwu
nke a dịka onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump kwuru na ya ga-amanye ụtụ isi
ruru pasentị iri na ngwa ahịa sị na mba China bata Amerika ma manye ka nke e si
mba Mexico, Kanada ruo pasentị iri abụọ na ise.
“Ọ bụrụ na
anyị bido ịma aka, onye mee nwanne ya emegwara, manye ụtụisi 25% maọbụ 60%, ụwa
niile ga-ata ahụhụ ya”.
Donald Trump ekwuola na TikTok agaghị akwụsị ọrụ n'Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump na njirimara TikTok
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na TikTok agaghị akwụsị ọrụ na mba Amerịka
Ọ gwara
onye ntaakụkọ Fox News bụ Sean Hannity mgbe ọ na-agba ya ajụjụ ọnụ na-agaghị
ewepụ ngwa ịntanetị ahụ maka ọbughị eziokwu ndị Chaịna nwere ike iji ya maọbụ
ihe mmepụta ndị ọzọ mee nyocha mba Amerịka.
Cheta na
ngwa ịntanetị bụ TikTok gbara ọchịchịrị na mba Amerịka n’ụbọchị Sonde 19 Jenụwarị
2025, dịka ụlọikpe kachasị elu kwadoro mkpebi ka amachi TikTok na mba Amerịka.
Trump gara
n’ihu binye aka n’akwụkwọ iwu ọhụrụ nke yere TikTok mkpụrụ ụbọchị iri asaa na
ise ka omezu ihe dị n’iwu mmachi ngwa ịntanetị ahụ ma ọbụrụ na-ereghị ya.
Trump gwara
Hannity “E chere m na TikTok ga-anọ”.
Mgbe a jụrụ
ya ajụjụ banyere mba Chaịna iji ngwa ịntanetị ahụ enyocha mba Amerịka na nzuzo,
o kwuru “a ga-ekwu otu ihe ahụ banyere ihe niile mba Chaịna mmepụtara” ebe ọ bụ
ndị Chaịna na-emepụta ekwe ntị”.
O kwuru na
ndị ọrụ TikTok bụ karịrị ndị na-eto eto, o nwere jụọ ajụjụ sị ma e nwere ike ị
na-enyocha ndị na-eto eto na nzuzo ọ kachasị ụmụaka na-ele ihe onyonyo n’ịntanetị.
Trump kwuru
na Chaịna na-emepụta ekwe ntị na kọmputa. Ọ jụọ ma nke ahụ ọbụghị nnukwu ihe
iyi egwu?
A kpọpụla ọtụtụ mmadụ dịka ọkụ ọhụrụ malitere ịgba na Los Angeles
Ọkụ ọhụrụ amalitela ịgba ma na-efesa na Los
Angeles nke mere ka ọtụtụ puku mmadụ bi na mpaghara kwapụ.
Ọkụ Hughes Fire malitere na
mpaghara ugwu Los Angeles n’ụtụtụ Wenezde 22 Jenụwarị, 2025 n’akụkụ Castaic
Lake nke dị n’okeala ụlọ obibi na ụlọ akwụkwọ.
Nnukwu ikuku mere ka ọkụ
ahụ gba ala ruru acre 10, mana akụkọ kwuru na enweghị ụlọ ọbụla ọkụ ahụ
mebigoro ugbua ebe ndị ọrụ na-abanyụ ọkụ nwere olileanya na ha ga-agbanyụ ọkụ
ahụ ma gbochie ya ifesa.
Otu onye ụlọọrụ Cal Fire bụ
Ed Fletcher, gwara BBC na ọtụtụ mmadụ ebighị na mpaghara ma kwuo na oke ikuku nwereike
ifesa ọkụ ahụ na Castaic ebe a na-ekwu na ihe ruru mmadụ 20,000 bi.
Onyeisiala Trump agwala Putin ka ọ kwụsị ịwakpo Yukren maọbụ chere mmachi ọhụrụ
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump na Putin na-ekwu n'ọgbakọ ha gara n'afọ 2017
Onyeisiala mba Amerịka bụ
Donald Trump dọrọ aka na ntị na ọ ga-amanye ọnụ ahịa dị elu na mmachi ndị ọzọ
na mba Rọshịa ma ọ bụrụ na Onyeisiala mba Roshịa bụ Vladimir Putin akwụsịghị
agha dị n’etiti ha na mba Yukren.
Ozi Onyeisiala Trump wepụtara
n’akara soshal midia ya bụ Truth Social, kwuru na oku ọ na-akpọ ka akwụsị agha dị
n’etiti Roshịa na Yukren bụ imere mba Rọshịa na Onyeisiala ya nnukwu
amara.
Cheta na Trump kwuru n’oge
gara aga na ya ga-agba mgbọ ka akwụsị agha ahụ malitere mgbe mba Roshịa wakporo
Yukren n’ọnwa Febụwarị 2022.
Rọshịa ekwubeghị ihe ọbụla
banyere okwu Donald Trump mana ndị isi ọchịchị ekwuola na Moscow nwere obere
ohere iji mesoo ma lebanye anya n’ọchịchị ọhụrụ mba Amerịka.
Putin ekwuola ọtụtụ oge na
ya dị njikere inwe mkparịtaụka maka ịkwụsị agha ahụ nke malitere ‘afọ 2014,
mana mba Yukren ga-anabata eziokwu dị n’ihe banyere okeala mba Rọshịa, nke bụ
ihe ruru 20 pasenti ala Ukrine. Putin gara n’ihu machie mba Yukren isonye n’otu
Nato.
Ka ọ dị ugbua, Kyiv achọghị
inyefe mba Rọshịa okeala ya mana Onyeisiala Volodymyr Zelensky ekwuola na ya
agaghị enyefe ọtụtụ ala mba Yukren nwere.
Ụtụtụ ọma oooo
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.
Sonyere anyị maka akụkọ si mbaụwa anyị na-enwetara gị.
Nkọwa foto, Louis Akpojotor a nwụchiri maka idina nwa ya nwaanyị n'ike
Aka ndị uweoji Akwa Ibom steeti akparala otu ụkọchukwu
aha ya bụ Louis Akpojotor dinara nwa ya nwaanyị n’ike ihe ruru ọtụtụ afọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii Akwa
ibom steeti bụ Timfon John, kwuru na ụkọchụkwu
Akpojotor malitere idina nwa ya nwaanyi n’ike oge ọ gbara afọ iri na abụọ, rue
ugbua nwata ahụ ruru afọ iri na asatọ.
Timfon John kwuru na ọ bụ n’ọnwa Disemba ka nwata nwaanyị ahụ tiri mkpu oge nna ya bịara ịkwaso ya iko dịka o si
emebu na mbụ.
Louis Akpojotor bụ onye okpuru
ọchịchị Ughelli Nọt nke Delta state, mana o bi na Akwa Ibom steeti ebe ọ na-arụ
ọrụ.
Timfon John kwuru na a
ga-akpụpụ nwoke ahụ n’ụlọ Ikpe ngwa ngwa ha mechere nnyocha.
NNPC ebuliela ọnụego mmanụ ụgbọala na Legọs na Abuja
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Nwoke nọ n'ọdọ mmanụ ụgbọala NNPCL na-ele anya na mita e ji ere mmanụ ụgbọala
Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPCL)
ebuliela ọnụego mmanụ ụgbọala n’ọdọ ha niile dị na Legọs na Abuja.
N’ọdọ mmanụ ụgbọala
NNPCL anyị gara n’Abuja na Legos, anyị
chọpụtara ọnụego otu lita arịala
site na N960 ruo N990 ugbua ebe ọdọ mmanụ ụgbọala ndị ọzọ na-ere otu lita
N1,030.
Mbulie a pụtara na ọnụego
mmanụ ụgbọala si n’ụlọọrụ mmanụ agbidi Dangote etinyela N20.
Cheta na ụbọchị Fraide
17 Jenụwarị, 2025, ụlọọrụ Dangote kwuru na ha ebuliela ọnụego mmanụ ụgbọala ha RUO
N955.
Nchọpụta kwuru na mmanụ
ụgbọala n’ọdọ mmanụ ụgbọala NNPCL esila na N925 ruo N960.
Onyeisiala Donald Trump ekwuola ihe mere o ji gbaghara ndị wakporo 'Capitol Building' mba Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump na-achị mba Amerịka
Onyeisiala
Donald Trump na-achị mba Amerịka apụtala kwado mgbaghara ọ gbaghara ihe ruru
mmadụ 1,600 wakporo ‘Capitol Building’ na Jenụwarị 6, 2021.
N’okwu ya,
Onyeisiala Trump kwuru na ndị mkpọchi a kpọchiri ndị ahụ n’ụlọ mkpọrọ ‘emebiela
ndụ ha’.
Nke a na-abịa
dịka Onyeisiala Trump binyere aka n’iwu dị iche iche ngwa ngwa e duru n’iyi ọrụ
ụbọchị Mọnde 20 Jenụwarị, 2025.
Ụfọdụ iwu o
binyere aka gụnyere iwepụ mba AmerỊka n’otu World Health Organization, iwu metụtara
mbata na ọpụpụ, ịgbaghara ndị ahụ wakporo Capitol Building nakwa ọtụtụ iwu ndị ọzọ.