E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Photo etu ọkụ si gbaa ngwaahịa ndị mmadụ n’ahịa Katamanto dị na Ghana

    A maara ahịa Katamanto dịka ahịa a na-ere ihe ndị e gburu na ntụ nakwa akụrụngwa ndị ọzọ dị mkpa.

    Ọkụ ahụ malitere ịgba n’etiti abalị, ma laa ngwahịa karịrị ọtụtụ nde dọla n’iyi.

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ọkụ ahụ malitere ịgba n’etiti abalị, ma laa ngwahịa karịrị ọtụtụ nde dọla n’iyi.
    Ndị mmadụ na-abọchasị ntụ iji lee ma o nwere ihe ha ga-ahụ.

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-abọchasị ntụ iji lee ma o nwere ihe ha ga-ahụ.
    Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-abọchasị ụfọdụ ihe ndị gbara ọkụ n’ụlọ ahịa.

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-abọchasị ụfọdụ ihe ndị gbara ọkụ n’ụlọ ahịa.
    Ọkara ime ahịa niile ahụ rere ọkụ pịapịa.

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ọkara ime ahịa niile ahụ rere ọkụ pịapịa.
    Ọtụtụ mmadụ na-achọ ịmata ihe ndị fọrọ n’ime ngwaahịa ha gbara ọkụ

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ na-achọ ịmata ihe ndị fọrọ n’ime ngwaahịa ha gbara ọkụ
    Ọtụtụ azụmaahịa alaala n’iyi nke bụ na naanị ime nnyocha ga-achọpụta ihe mere.

    Ebe foto si, Arewa Textiles Gh

    Nkọwa foto, Ọtụtụ azụmaahịa alaala n’iyi nke bụ na naanị ime nnyocha ga-achọpụta ihe mere.
  2. A zọpụtala nwata dị afọ asatọ ka ọ nọchara abalị ise n’ọma ọdụm

    Nwa ahụ nọrọ abalị ise n'ọma ọdụm

    Ebe foto si, Mutsa Murombedzi/Twitter

    Nkọwa foto, Nwa ahụ nọrọ abalị ise n'ọma ọdụm

    A zọpụtara nwata dị afọ asatọ ka ọ nọchara abalị ise n’ọma ọdụm maọbụ ọdụ ụmụ anụmanụ dị na mba Zimbabwe.

    Ọdụ ụmụ anụmanụ ahụ bụ ụbara ala gọọmeti mba Zimbabwe hapụrụ maka ụmụ anụmanụ dị icheiche.

    Otu onye omeiwu na mba ahụ bụ Mutsa Murombedzi kwuru n’akara X na nwatakiri ahụ bụ Tinotenda Pudu ji ụkwụ ya abụọ gaa njem ruru kilomita iri abụọ na atọ (14miles) nke mere o ji gafee ọma ọdụm ahụ a kpọrọ Matusadona Game Park.

    Ọ sị na “nwatakiri ahụ gafere n’ọhịa ebe ọdụm bi, na-anụ ka ọdụm na-agbọ ụja. Nwata ahụ gafekwara enyi na ụmụ anụmanụ dị iche iche dịka ọ na-eme njem ahụ"

    Ọ kwuru na nwata ahụ na-eri mkpụrụosisi dị iche iche ọ hụrụ n’ime ọhịa n’ime abalị ise o gara njem ahụ”.

    Nwatakịrị ahụ kọwara na ọ bụ maka na ya mara etu e si ebi ndụ n’ime ọhịa nyeere ya aka ịdị ndụ ruo abalị ise ahụ.

    Ọ sị dịka onye a mụrụ na mpaghara ebe mmịrị na-akọ na mba Zimbabwe ha na-eji mkpara osisi na-egwuputa mmịrị n’ala n’ime ọhịa.

    Omeiwu Mutsa kwuru na ọ bụ n’ụbọchị nke ise ka nwatakiri ahụ nụrụ mkpọtụ ụgbọala na-agbafe agbafe ma wee tie mkpu nke mere ndị nọ n’ụgbọala ahụ jiri mara na mmadụ nọ n’ọma ọdụm ahụ ma lọghachita azụ gaa kpọrọ ya.

    Cheta na ogige ụmụanụmanụ ahụ nwere ọdụm ọnụọgụgụ ha ruru iri anọ nakwa anụmanụ dị iche iche.

  3. A tọhapụla Bishop Anglikan a tọọrọ

    Achịbishọpụ ụka Anglikan na mpaghara Naija

    Ebe foto si, Anglican Diocese of Awka

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na a tọhapụla nnukwu ụkọchụkwu Ụka anglịkan bụ Achịbishopụ Godwin Okpala.

    Ozi Ụka Anglikan nke Ọka Dayọsis wepụtara n'akara ha na Facebook ụbọchị Tọsde na-ekwu na Achịbishọpụ Okpala na ọkwọụgbọala ya "alọtala n'udo."

    Cheta na a malitere chọwa ụkọchukwu ahụ gbara afọ 75 n'abalị isii nke ọnwa Disemba afọ 2024 dịka ha gara Umuchu maka akwamozu.

    Cheta na ọnọdụ nchekwa akpụọla afọ n'ala dịka ntọ na gbuo-gbuo-gbuo na-aị ibe ya elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kemgbe afọ 2021.

    Nsogbu ahụ atala isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii, ndịagha na ndị nwere agba.

  4. Aka IS dị na mwakpo mere na New Orleans- Ndị uweojii Amerịka

    Ebe ihe mere na New Orleans

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweeojii mba Amerịka ekwuola na ha nwetara ihe akaebe n'ụgbọala 'truck' e jiri mee mwakpo na New Orleans dị na mba ahụ.

    Mmadụ 15 nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ọkwọụgbọala a kpọrọ Shamsud-Din Jabbar, onye bụbu onye Amerịka, nyaara ụgbọala ya tibaa igwe ndị mmadụ na 'French Quarter', ụbọchị afọ ọhụrụ.

    Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden kwuru na ọ bụ otu Islamic State group ka a na-atụ aka mwulitere mmụọ Shamsud-Din Jabbar, ịkpa ajọ agwa ahụ.

    A hụrụ ọkọlọtọ ndịagha nnupụisi ụka Alakụba a kpọrọ 'Islamic State' n'ime azụ ụgbọala ahụ dịka mwakpo ahụ mechara, dịka FBI si kwuo.

    Ha kwuru na ha na-enyocha mwakpo ahụ dịka 'ihe metụtara iyi ndụ egwu."

    A hụkwara ihe yiri ogbunigwe na ụgbọala 'pick up' ahụ nakwa ebe ọzọ n'ogbe 'French Quarter' nke mere ka ha na-eche na ọ bụghị nanị otu onye kpara arụ ahụ.

    Ndị uweojii hụkwara ogologo egbe nakwaa ihe na-egbuchi ya ka ọ ghara ịda ụda.

    A gbagburu Jabbar dịka ya na ndịuweojii kwarịtara mgbọ.

  5. Ndị uweojii ekwupụtala mbọ ha gbara ịnwete nchekwa n’Abuja n'afọ 2024

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Adeolu Egbetokun

    Ebe foto si, Nigeria Police/X

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Adeolu Egbetokun

    Ndị uweojii ekwupụtala mbọ niile ha gbara iji nweta nchekwa n’Abuja, isi obodo Naijirịa nakwa steeti ndị gbara ya gburugburu nke gụnyere Niger, Kaduna, Kogi na Nasarawa steeti.

    Ha kwupụtara na ọtụtụ ihe cheere ọrụ nchekwa ọhaneze aka mgba n'afọ 2024 gara aga nke gụnyere ịtọọ mmadụ, izu ohi di iche iche, ịgbu mmadụ na mpụ ndị ọzọ.

    Akụkọ sitere n’aka ọnu na-ekwuru ndị uweojii Abuja bụ Josephine Adeh, kọwara na ndị uweojii nwụchiri otu puku mmadụ iri asaa na asaa, ebe mmadụ narị abụọ na iri isii n’ime ha bụ ndị a na-enyo n’aka ha dị na ọtịtọ ndị mmadụ ebe otu narị na iri atọ na abụọ bụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị o ji egbe ezu.

    Ozi ahụ kwuru na ndị uweojii jidere mmadụ iri asaa na otu maka izu ohi ‘one-chance’, mmadụ iri na ise maka mpụ igwu chandum n'ịntaneti, mmadụ nari anọ na iri abụọ na abụọ ndị ọzọ maka mpụ nrụrụaka, ndị otu nzuzo, ndị na-ezu ụgbọala, na ndị na-ezu ohị ma na-egbu mmadụ.

    Adeh kwupụtara na ndị uweojii nwetere ego ruru nde narị naịra anọ, puku itoolu na iri itoolu na abụọ (₦409,992,000) n’aka ndị a na-enyo enyo n’aka ha dị na ọtụtụ mpụ dị iche iche.

    O kwuru na ndị uweojii zọpụtara mmadụ iri asatọ na asaa n’aka ndị ntọọ ma nweta ngwa agha ruru narị atọ na iri asaa na isii.

    O kwuputara na ndị uweojii ruru mmadụ otu narị na iri anọ nwụrụ mgbe ha na-arụ ọrụ nchekwa obodo n’afọ 2024 ma kwe nkwa na ndị uweojịị ga-aga n’ihu n’ọrụ ha inweta ezi nchekwa n'ime n’afọ 2025.

  6. Fubara emeela Asari Dokubo eze ọdinala

    Asari Dokubo na Govano Siminalayi Fubara

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook

    Aka na-achị Rivas Steeti bụ Simi Fubara enyela Asari Dokubo asambodo dịka eze ọdịnala na Rịvas Steeti.

    Alhaji Mujahid Dokubo-Asari bụbụ onye ndu otu ndịagha nnupusi na Naija Delta bụ onye bụzị 'Amayanabo nke Torusarama-Piri Elem-Kalabari so na mmadu anọ Fubara nyerre kpara ikike eze na nsonso a.

    Ndị ọzọ gụnyere nwetara nkwado dịka ndị eze obodo ha gụnyere Eze Winston Odiye Alamina ( Oputibeya XII) bụ Amayanabo nke Alaeze Koniju; Eze Noble Friday Uwoh bụ Eze Igbu-Ehuda IV, nakwa Eze Ike Ehie, Eze Igbu Orlukwor.

    N'ozi ya na mmemme ahụ e mere na nsonso a, Fubara rịọrọ ndị eze ahụ ka ha na-akpa udo nakwa idinotu n'etiti ndị ha na-achị.

  7. Ụgbọala cybertruck agbaala ọkụ n’akụkụ ụlọ nkwari Donald Trump dị na Las Vegas

    Ụgbọala ahụ gbara ọkụ

    Ebe foto si, Alcides Antunes

    Nkọwa foto, Ụgbọala ahụ gbara ọkụ

    Ndị uweojii Las Vegas ebidola ime nnyocha dị ka ụgbọala cybertruck gbara ọkụ n’ihu ụlọ nkwari Trump dị na Las Vegas, Nevada.

    Ndị uweojii kwuru na ọkụ ahụ gbagburu ọkwọụgbọala ahụ ma merụo mmadụ asaa ndị ọzọ ahụ, ma na ha akpọghị aha onye ọbụla.

    Ndị ọchịchị kwukwara na ndị mmadụ emerụghị ahụ nke ukwu.

    Ozi ndị uweojii wepụtara kwuru na-agbazigara ụgbọala cybertruck ahụ na Colorado ma bute ya na Las Vegas n’ọtutụ Wenezde.

    Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na amalitela ime nnyocha ịchọpụta ihe mere ebe ndị nchekwa na-ekwu na ha chọrọ ịchọpụta ka enwere ihe jikọrọ ụgbọala ahụ gbara ọkụ na ihe ahụ mere na New Orleans ebe e gburu mmadụ iri na ise ubọchị Wenezde, Jenụwarị, 2025.

    Ụgbọala ahụ gbara ọkụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụgbọala ahụ gbara ọkụ
  8. Montenegro na-eru uju maka ọtụtụ mmadụ e gburu na mba ahụ

    Ndị uweojii nọ ebe ihe mere

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ ebe ihe mere

    Gọọmentị mba Montenegro ewepụtala abalị atọ iru uju nke ga-amalite ụbọchị Tuzde 2 Jenụwarị, 2025 maka ndị e gburu egbu na mba ahụ.

    Ndị uweojii kwuru n’otu onye ji egbe gbagburu mmadụ iri gụnyere ụmụaka na mpaghara ọdịda anyanwụ mba Montenegro ụbọchị Wenezde 1st Jenuwarị 2025.

    Ozi si n’aka ndị uweojii kwuru na e gburu ọtụtụ mmadụ n’ime ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na mpaghara Cetinje oge e nwere esemokwu dị n’etiti ndị ọbịa.

    A chọpụtara na nwaamdị ahụ gburu ndị mmadụ gara n'ihu gbuo onwe ya.

    Praịm Mịnịsta Milojko Spajic kọwara ogbugbu a dị ka ajọ ọdachị.

    Dịka Mịnịsta n’ahụ maka ihe na-eme obodo bụ Danilo Saranovic siri kwuo, onye o ji egbe ahụ gbukwara ndị ezinaụlọ ya, onye nwe ụlọ oriri na ọṅụṅụ ahu na ụmụaka ya abụọ.

    Saranovic kpọrọ ihe mberede ahụ “nsonaazụ nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya” ma kwuo na mmadụ anọ ndị ọzọ meruru ahụ nọ n'ụlọọgwụ enweta nleta.

  9. NLC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụtụisi

    Onyeisi ndị NLC, Joe Ajaero

    Ebe foto si, Joe Ajaero/Facebook

    Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) agwala Onyeisiala Bola Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụtụisi nke o wegara ndị ụlọomeiwu iji nye ohere ka e lebara anya.

    Otu a kpọrọ oku a na mgbasaozi nke afọ ọhụrụ ha bụ nke Joe Ajaero wepụtara na Wenezde.

    Ozi ahụ kwuru “iji hiwe ọchịchị onye kwuo uche ya nke ga-emepe obodo, anyị ga-ehiwe ọchịchị gbadoro ụkwụ na mkparịtaụka, ga-enye ndị ọnụ na-eru n’okwu ohere isonye n’usoro nwulite obodo.”

    “Ya mere anyị ji akpọku gọọmentị etiti ọzo ka ha wezuga atụmatụ iwu inwogharị ụtụisi nọ n’ụlọomeiwu ugbua iji nye ohere ka ndị ọnụ na-eru n’okwu tụnye arọ ha banyere ya.”

    Ozi ahụ kwuru na otu a ga-achọ inye aka ihiwe usoro ụtụisi a ga-anabata n’ebe niile na Naịjirịa.

    Atụmatụ iwu inwogharị ụtụisi so n’otu n’ime iwu ndị kachasị gbapụta ihe nke onyeisiala ọhụrụ tụrụ arọ ya kamgbe ọ banyere ọchịchị n’afọ 2023.

    Mana atụmatụ iwu ahụ enweela ọtụtụ ọgbatauhie site n’aka ụfọdụ mpaghara Naịjirịa, ọkachasị mpaghara ukwu, ụfọdụ ndị gọvanọ nakwa ụfọdụ otu.

    Nke a mere ka ụlọomeiwu Naịjirịa kwụsịtụ nrụrịtaụka ha na-eme banyere ya, ebe Onyeisiala gwara mịnịsta na-ahụ maka ikpe ziri ezi ka ha gbakọọ aka leba anya n’ụfọdụ ihe ndị mere ndị mmadụ jiri gbarụọ ihu n’iwu ahụ.

    Mana na mkparịtaụka Onyeisiala Tinubu na ndị ntaakụkọ nwere na Legọs na nso nso a, ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-agba mbọ hụụ na e mere ka atụmatụ a bụrụ iwu.

  10. Onyeisiala Tinubu ekwela nkwa igbo nsogbu ọgwụ na ihe oriri n’afọ 2025

    Tinubu ekwela nkwa igbo nsogbu ọgwụ na ihe oriri n’afọ 2025

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwela nkwa na ya ga-ezute ihe isiike dị ugbua, ọkachasị ọnụahịa ọgwụ na ihe oriri na-arị elu.

    Ọ sịrị na ya ga-emezu nke a site n’ihibe ụlọorụ a kpọrọ National Credit Guarantee Company.

    Oge ọ na-ekwu okwu na mgbasaozi afọ ọhụrụ ya nye ndị Naịjirịa n’ụbọchị Wenezde 1 Jenụwarị 2025, Tinubu kwuru na atụmatụ ahụ ga-akwalite ịrụpụta ọgwụ ndị dị oke mkpa nakwa ngwa ndị ọzọ e ji elekọta ahụike na Naịjirịa n’ime afọ 2025.

    Dịka onyeisiala siri kwuo, a tụrụ anya na ụlọorụ ọhụrụ ahụ ga-amalite ọrụ tupu ngwụcha nkeji nke abụọ n’afọ 2025.

    Ọ sịkwara na ụlọorụ ahụ bụ mgbakọaka ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche, ndị gụnyere; Bank of Industry (BOI), Nigerian Consumer Credit Corporation, Nigerian Sovereign Investment Agency (NSIA), Mịnịstrị na-ahụ maka ego nakwa ngalaba ndị nkịtị.

  11. Nwaamadị ahụ wakporo ma gbuo mmadụ 10 na mba Amerịka anwụọla - FBI

    Nwaamadị ahụ wakporo ma gbuo mmadụ 10 na mba Amerịka anwụọla - FBI

    Ụlọọrụ FBI amalitela inyocha mwakpo ọjọọ e mere na New Orleans n’ụtụtụ afọ ọhụrụ ma kọwaa ya dịka omume iyi ndụ egwu.

    Ha kwukwara na onye ahụ mere ya bụ mwakpo anwụọla.

    Mmadụ iri nwụụrụ ebe iri atọ (30) ndị nke ọzọ merụrụ ahụ oge ụgbọala kpọkara igwe mmadụ na Bourbon Street dị na New Orleans nke mba Amerịka.

    Njinji ahụ jiri mgbe o jiri ihe dịka nkeji iri na ise gaa elekere atọ (03:15) n’ogige ndị nlegharịanya dị na French Quarter.

    Ndị hụrụ ka ọdachi ahụ siri mee kwara ụlọmgbasaozi CBS na ọkwọụgbọala ahụ pụtara n’ụgbọala ma malite ịgbapụ mgbọ.

    Ka o sinadị, e bugaala ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ dịka ndị ọrụ gbatagbata nọ n’ogige ahụ maka ọrụ nnapụta.

    Ụgbọala akpọkaala igwe mmadụ, gbuo mmadụ 10 na mba Amerịka
  12. Ahụhụ ụmụ Naịjirịa na-ata agahị abụ n’efu – Onyeisiala Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ahụhụ ụmụafọ Naịjirịa na-ata agaghị abụ n’efu.

    Dịka ozi afọ ọhụrụ o wepụtara siri kwuo, Onyeisiala Tinubu kwere nkwa na afọ 2025 ga-enwetara Naịjirịa ebumnobi ya niile.

    N’okwu ya “Ụmụafọ Naịjirịa, mbọ niile, ahụhụ na nkwado unu nyere ọchịchị n’ome ọnwa iri na itoolu gara aga agaghị abụ n’efu”. Gọọmenti m ga-ahụ maka nke a n’ọdinihu.

    Onyeisiala Tinubu kwuru n’ime afọ ọhụrụ a, ọchịchị ya ga-emepụta atụmatụ dị iche iche iji wụlite akụnaụba Naịjirịa.

  13. Lee foto etu e si nabata afọ 2025 na mba dị iche iche

    Dịka a banyere afọ 2025 taa, ọtụtụ ndị mmadụ na mba dị iche iche merubere emume dị iche iche iji nabata afọ ọhụrụ a. Lee foto ụfọdụ anyị hụrụ.

    Emume ịgbapụ ọkụ e ji nabata afọ 2025 n'ogige 'London Eye' dị na London, UK

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Emume ịgbapụ ọkụ e ji nabata afọ 2025 n'ogige 'London Eye' dị na London, UK
    Ndị na-agba ọkụ elu iji nabata afọ ọhụrụ na Victoria Harbour, Hong Kong

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị na-agba ọkụ elu iji nabata afọ ọhụrụ na Victoria Harbour, Hong Kong
    Emume ịgbapụ ọkụ e ji nabata afọ 2025 n'ogige Arc de Triomphe dị na Avenue des Champs-Elysees, Paris mba Frans

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Emume ịgbapụ ọkụ e ji nabata afọ 2025 n'ogige Arc de Triomphe dị na Avenue des Champs-Elysees, Paris mba Frans
    Ndị obodo na-enwe aṅụrị dịka ha nabatara afọ 2025 n'ogige Ancol Beach dị na Jakarta

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị obodo na-enwe aṅụrị dịka ha nabatara afọ 2025 n'ogige Ancol Beach dị na Jakarta
  14. Afọ ọhụrụ ọma ooo!

    Unu abọọla chi?

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa ebe anyị na-ewetere gị akụkọ ndị hiri odo n'ụwa niile.

    Ndewo.