E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Opekatampe mmadụ 12 anwụọla n’emume ịsa ahụ na mba India

    Opekatampe mmadụ 12 anwụọla n’emume ịsa ahụ na mba India

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị mmadụ na ndị nọ n’ụlọọgwụ agwala BBC na e gburu opekatampe mmadụ iri na abụọ (12) oge egwepịara ndị mmadụ na nnukwu emume okpukperechi a haziri na mpaghara ugwu Indịa.

    Ndị ọnụ na-eru n’okwu ekwupụtabeghị kpọmkwem mmadụ ole e gburu maọbụ ọnụọgụ ndị merụrụ ahụ.

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Samira Hussain kọwara ogige ahụ ya bụ njinji jiri dịka nke "jupụtara n’ọgbaaghara" dịka ndị mmadụ na-agba mbọ iri mbọmbọ.

    Ndị ọchịchị kwuru mgbe gara aga na ihe ruru otu narị nde mmadụ (100,000) bụ ndị a tụrụ anya na ha ga-aga emume ụbọchị ịsa ahụ na Kumbh Mela.

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Vikas Pandey kwuru sị n’agbanyeghị na ndị haziri mmemme ahụ kwụsịtụrụ emume ịsa ahụ, puku kwuru puku ndị mmadụ ka gbakwara mbọ irunye onwe ha na mmiri nsọ.

  2. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke taa.

    Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji awụchiela iwetere gị akụkọ dị iche iche dịka ha si akpọtụ na mbaụwa niile mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  3. Ihe mere m ji nwere mma gbubie nwunye m aka

    Chinonso Echege, onye e bepụrụ aka
    Nkọwa foto, Chinonso Echege, onye e bepụrụ aka

    Ndị uweojii anwuchiela otu nwoke a na-akpọ Sunday Echege maka ebubo iji mma gbubie nwunye ya bụ Chinonso Echege aka.

    Foto Sunday Echege

    Ebe foto si, Nigeria Police, Enugu state Command

    Nkọwa foto, Foto Sunday Echege
  4. A nwụchigharịala onye ọkwọụgbọala maka ịkwọpịa ụmụakwụkwọ abụọ

    A nwụchigharịala onye ọkwọụgbọala maka ịkwọpịa ụmụakwụkwọ abụọ

    Ebe foto si, PA Media

    A nwụchigharịala ọkwọụgbọala maka ịkwọpịa ụmụntakịrị nwaanyị abụọ gbara afọ asatọ oge ọ kpọkara ụlọakwụkwọ ha.

    Nwaanyị ahụ gbara afọ iri anọ na astọ (48) aha ya bụ Claire Freemantle gosipụtara obi mwute ya na mgbe gara aga ma kwuo na ya apụghị icheta ihe mere oge ahụ.

    Freemantle gburu ụmụakwụkwọ abụọ aha ha bụ Nuria Sajjad na Selena Lau na mpaghara Wimbledon dị na Lọndọn n’abalị 6 Julaị 2023.

    Ndị uweojii Met kwuru na ha lebagharịrị anya na nnyocha ha dabere na mkpebi ụlọọrụ Crown Prosecution Services nwere n’ọnwa June gara aga ịkpụpụ onye ọkwọụgbọala ahụ ụlọikpe.

    Ndị mụrụ ụmụaka ahụ nwụrụ anwụ nabatara ya bụ mkpebi ma kwuo na e kwesịrị ime ya iji chọpụta nke bụ eziokwu na etu ọdachi ahụ siri mee.

  5. 2Baba na nwunye ya Annie ekewaala

    2Baba na nwunye ya Annie ekewaala

    Ebe foto si, 2Baba/Facebook, Annie Idibia/Instagram

    Otiegwu a ma ama na Naịjirịa bụ Innocent Idibia, onye aha e ji mara ya bụ 2Baba maọbụ Tuface ekwuola na ya na nwunye ya bụ Annie Idibia ekewaala.

    Di na nwunye ahụ aha ha na-ewu ewu gbara akwụkwọ n’afọ 2012 ma mụtakwa ụmụaka nwaanyị abụọ.

    N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi Instagram ya, nwaamadị ahụ tipụtara ‘African Queen’ kwuru na ya na nwunye ya ekewaala ma na-akwadokwa ịgba alụkwaghịm.

    Ozi ahụ sịrị “mụ na Annie Macauley ekewaala kemgbe ụfọdụ oge, mana ugbua anyị etinyela akwụkwọ maka ịgba alụkwaghịm.”

    E mechara hichapụ ozi ahụ mana 2Baba wepụtara ihe onyonyoo iji kwadoo ihe ọ depụtara oge gara aga.

    Tupu o wepụta ihe onyonyoo ahụ, o dere sị “E nweghị onye banyere n’ọbaozi Instagram m. A kwụ m n’ihe m kwuru na mbụ. Eji m udo wee bịa.”

    Di na nwunye ahụ mere mmemme agbamaakwụkwọ dara ụda na Dubaị n’afọ 2013.

  6. Otu CAF ahaziela mba ga-ezute ibe ha n'asọmpi AFCON 2025

    Iko mba Afrịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu na-ahụ maka egwuregwu n’Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) ahaziela usoro a ga-eji gbaa asọmpi Iko mba Afrịka nke afọ 2025 na mba Moroko.

    Ha mere nke a site n’ịhọpụta mba iri abụọ na anọ ga-eso gbaa asọmpi ahụ ma tinye ha n’otu dị iche iche n’usoro ha ga-esi zuta ibe ha.

    Otu Super Eagles nke Naịjirịa nọ n’otu Ch bụ ebe ha ga-ezute mba Tanzania, Tunisia na Uganda.

    Mba Cote d’Ivoire bụ ndị tuuru ugo n’asọmpi ikpeazụ ga-ezute mba Kameruun, Gabon na Mozambique.

    Tebụlụ na-egosi otu dị iche iche

    Group A: Morocco, Mali, Zambia, Comoros

    Group B: Egypt, South Africa, Angola, Zimbabwe

    Group C: Nigeria, Tunisia, Uganda, Tanzania

    Group D: Senegal, DR Congo, Benin Republic, Botswana

    Group E: Algeria, Burkina Faso, Equatorial Guinea, Sudan

    Group F: Cote d’Ivoire, Cameroon, Gabon, Mozambique

  7. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji obi ọma na-anabata unu n'ụbọchị ọhụrụ a, na-asị ka ọ maara gị na mma.

    Biko nọnyere anyị n'ọgbakọ anyị bụ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  8. Afe Babalola ewezugala akwụkwọ ọ gbara Dele Farotimi n’ụlọikpe

    Afe Babalola na Dele Farotimi

    Ebe foto si, Dele Farotimi/Facebook

    Onye nwee Mahadum Afe Babalola dị n’Ekiti Steeti bụ Aare Afe Babalola ewezugala akwụkwọ niile ọ gbara n’ụlọikpe megide onye ọkaiwu Dele Farotimi site n’arịrịọ Ooni nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi rịọrọ ya.

    Babalola kwuru nke a n’ụbọchị Sọnde, ma kwuo na Ooni nke Ife nakwa ndị ndu ọdịnala ndị ọzọ rịọrọ ya ka ọ hapụ okwu ahụ.

    Cheta na Farotimi bipụtara akwụkwọ ọ kpọrọ “Naịjirịa na mpụ dị na ngalaba ụlọikpe ya”, bụ ebe o boro ebubo na Babalola metọrọ ngalaba ikpe ziri ezi.

    Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Babalola kwuru na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-eme na-abụghị irubr isi n’ihe ndị ndu ọdịnala nyere ma kwuo na okwu ọbụla si n’ọnụ Oba n’ala Yoruba bụ iwu.

    N’okwu ya “Ajụrụ m ịnata ọdọ mmanụ agbidi ma kwuchite ọnụ EFCC ma jụkwa ọkwa mịnịsta ugboro abụọ, sị na ọ tụrụ ya n’anya etu mmadụ ga-esi teta n’ụra ma chọrọ imebi ihe ndị ọ tara ahụhụ rụọ.

    “O nweghi uru m ga-erite n’ịtụ ya mkpọrọ, ana m enwe aṅụrị oge ọbụla m nyere ihe”.

    Ooni nke Ife arịọbuola Babalola arịrịọ ka o lee anya n’ihu ọtụtụ mmadụ gbapụtara ihe tinyerela ọnụ n’okwu ahụ.

  9. Ndị mmadụ agbaala ọsọ dịka ndịagha nnupụisi kwuru na ha ewerela obodo Congo

    Ndị mmadụ agbaala ọsọ dịka ndịagha nnupụisi kwuru na ha ewerela obodo Congo

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha nnupụisi si n’otu M23 kwuru na ha ewerela obodo Goma dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Kongo.

    Ndị bi ebe ahụ kesara ihe onyonyoo na-egosi ebe ndị otu M23 na-akpagharị n’ogbe ndị a ma ama na Goma dịka ha wakpochara ndịagha Kongo n’ụbọchị Sọnde 26 Jenụwarị 2025.

    Ozi ụlọmgbasaozi dị na Kongo wepụtara kwuru na ndị mmadụ riri mbọmbọ oge ha nụchara ụda egbe na ntiwa ogbunigwe.

    Ọnọdụ ahụ bịara oge Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ boro Rụwanda ebubo ịkpọ oku agha site n’iziga ndịagha ha n’okeala ha iji kwado ndịagha nnupụisi M23.

    Rụwanda ekwuola na Kinshasa na-akwado ndịagha nnupụisi chọrọ ka ọchịchị gbanwee na Kigali.

    Ka o sinadị, Kenya akpọọla oku ka a kwụsị nkwarịta mgbọ ma kwuo na ndị isiala mba Kongo na Rụwanda ga-aga ọgbakọ ọdụrụkụọ n’ime ụbọchị abụọ na-abịa abịa.

    N’aka nke ọzọ, odeakwụkwọ otu mbaụwa bụ António Guterres agwala mba Rụwanda ka ha wezuga ndịagha ha n’okeala Kongo ma gwakwa ndịagha nnupụisi M23 ka ha kwụsị mwakpo ha na-eme.

    Ndị mmadụ agbaala ọsọ dịka ndịagha nnupụisi kwuru na ha ewerela obodo Congo

    Ebe foto si, Getty Images

  10. Isreal ekwetela ka ndị Palestine a chụpụrụ lọghachị na mpaghara ugwu Gaza

    Ndị Palestine a chụpụrụ na mpaghara ugwu obodo Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe onyonyo gosiri ka ọtụtụ ụmụafọ Palestine gbara ọsọndụ na-alọghachite na mpaghara ugwu Gaza dịka ha na-agafe mgbochi ndịagha dochiri n’ụzọ kamgbe ụbọchị abụọ gara aga.

    Nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na mgbanwerịta ndị e ji eji malitere ọrụ n’ụbọchị 19 Jenụwarị. E nweela mgbanwerịta abụọ gara nke ọma.

    Na nke atọ, otu Hamas tọhapụrụ Nwada Yehud na mmadụ abụọ ndị ọzọ n’ụbọchị Tọzde, ebe mmadụ atọ sonyere n’ụbọchị Satọde, site nkwekọrịta Netanyahu na nba Qatar nwere.

    Isreal ga-amalite ịhapụ ndị Palestine ka ha banye na mpaghara ugwu Gaza n’ụbọchị Mọnde, ma tọhapụkwa ụfọdụ ndị Palestine ha ji eji n’izuụka a.

    N’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ, e kwesịrị ịhapụ ndị Palestine ka ha banye na mpaghara ugwu Gaza n’ụbọchị Satọde site n’ogologo ụzọ ndịagha Isreal na-eche nche.

    Mana foto si n’ebe ahụ na mbụ gosiri ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọtara n’ọnụụzọ na-eche ka ha gafee.

    Mana Isreal kwuru na ọ ga-ahapụ ka ndị a gafee ma laghachị na mpaghara ugwu Gaza ma ọ kụọ elekere isii nke ụtụtụ Mọnde, na ha ga-ejikwa ụgbọala.

  11. Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala ogbugbu Boko Haram gburu ndị otu ha mmadụ 22 na Borno Steeti

    Ndịagha Naịjirịa nọ n'ihu agha

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

    Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala ogbugbu e gburu ndị otu ha mmadụ iri abụọ na abụọ ebe e merụrụ ọtụtụ ahụ site na mwakpo ndị oyi ndụ egwu Boko Haram mere ha na Borno Steeti.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Edward Buba wepụtara na Sọnde, o kwuru na mwakpo ahụ mere na ngwụcha izuụka mgbe ndịagha wakporo ogige ndị oyi ndụ egwu dị na Timbiktu, n’okeala jikọtara Borno na Yobe Steeti.

    Akụkọ pụtaburu na mbụ kwuru na ọ bụ ndịagha mmadụ iri abụọ na asaa ka ndị Boko Haram gburu na mgbọ ahụ ha ndịagha kwatara.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndịagha ngalaba ‘Operation Unity’ jisiri ike chụpụ ndị oyi ndụ egwu n’ogige ha na mwakpo ha malitere na Jenụwarị 16 ruo 25 – n’atụmatụ ikpochapụ ha.

    Ọchịagha Buba kwuru na ndịagha gburu ndị oyi ndụ egwu ahụ mmadụ iri asaa, nke gụnyere mmadụ atọ bụ ndị ndu ha a ma ama.

    “Na mwakpo ahụ, ndị Boko Haram tinyere ogbunigwe n’ime ụgbọala ma guzobe ọtụtụ ha n’okporoụzọ iji kwụsị ndịagha Naịjirịa,” ka o kwuru.

    Mana o kwuru na kamgbe ndịagha maara nkata ndị Boko Haram na-akpa nke ọma, na gbanarịrị ọtụtụ nkata ndị a, nke gụnyere ịtụ ogbunigwe ‘drone’.

  12. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị na-anabata gị n'izuụka ọhụrụ a ma na-asị nke onye chiri ya zerekwa.

    Gbalịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa maka akụkọ ndị hiri odo.

    Ndewo!

  13. Onyeisiala Bola Tinubu agawala Tanzania maka ọgbakọ African Energy Summit

    Onyeisiala Bola Tinubu na-abanye n'ụgbọelu ya

    Ebe foto si, Nigeria Presidency

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na-abanye n'ụgbọelu ya

    Onyeisiala Bola Tinubu agawala mba Tanzania maka ọgbakọ African Energy Summit a ga-eme n’isi obodo ahụ bụ Dar es Salaam.

    Gọọmenti Tanzania na ụlọakụ African Development Bank na ụlọakụ World Bank jikọrọ aka achịkọba ọgbakọ African Energy Summit afọ a nke ga-amalite n’ụbọchị Mọnde 27 Jenụwarị ruo Tuzde 28 Jenụwarị 2025.

    Atụmatụ a bụ nke chọrọ ịhụ na ihe ruru mmadụ nde narị atọ nwere ọkụ latrik tupu afọ 2030.

    A na-atụ anya na ndị isi mba dị iche iche n’Afrịka na ndị isi azụmahịa ga-eji ohere ọgbakọ tụọ alo ma chepụta atụmatụ African Energy Strategy ga-enweta ọganihu Afrịka ma wulite ọnọdụ ọkụ latrik.

    Ụbọchị mbụ ọgbakọ ga-enye ndị mịnịsta ọkụ latrik n’Afrịka ohere iji nwee nrụrịtaụka banyere ọnọdụ ọkụ latrik n’Afrịka.

  14. Trump chọrọ ka mba Egypt na Jordan nabata ndị gbara ọsọ na Gaza

    Ụfọdụ ndị gbara ọsọndụ n'obodo Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump chọrọ ka mba Ijipt na Jodan nabata ndị Palestine ahụ gbara ọsọndụ n’obodo Gaza.

    Na mkparịtụka ha nwere n’ekwentị, Trump gwara Eze Abdullah nke Jodan “Aga m achọ ka ị nabatakwuo ha maka na m na-ele Gaza anya ugbua, ọ bụ ihe lara n’iyi.” O kwuru na ọ ga-achọ ịgwa onyeisiala mba Ijipt otu ihe ahụ ma ha kpaa nkata n’ụbọchị Sọnde.

    Atụmatụ a “nwereike ịbụ nwa mgbe nta” maọbị “ihe ga-ete anya”, ka o kwuru.

    Otu Hamas aṅụọla iyi na ha agaghị anabata atụmatụ ahụ, ebe o nwereike ibuta nsogbu na Palestine bi na Gaza maka na ha kwenyere n’ebe ahụ bụ ala ndị nna nna ha ochie.

    Ndị obodo anyị bụ Palestine bi na Gaza ediele ọnwụ na ahụhụ niile ahụ kamgbe ọnwa iri na ise rute ugbua...na-esighi n’ala a pụọ. Ya mere ha agaghị anabata atụmatụ dị etu a na-agbanyeghi na Amerịka kwuru na ọ bụ iji wegharịa Gaza,” Bassem Naim, onye otu Hamas gwara BBC.

    Ọtụtụ ndị mmadụ bi na Gaza ọnụọgụgụ ha ruru nde abụọ esila n’obodo gbaa ọsọ kamgbe iri na ise a malitere ịlụ agha ahụ nke mba Izrel gbaturu ọtụtụ ụlọ dị n’obodo ahụ.

    Otu United Nation kwuru na ihe karịrị pasentị 60% n’ime ụlọ ndị dị na Gaza abụrụla ihe agbaturu n’ogbunigwe.

  15. Etu e si kutuo ụlọ ndịna e ji mere ogige ndị ntọrị mmadụ n'Anambra Steetị.

    Ụlọ ndịna e ji mere ogige ndị ntọrị

    Ebe foto si, Anambra State New Media/X

    Ndị ọrụ nchekwa n’Anambra Steeti a kpọrọ ‘Agụnaechemba’ enyochapụtala ma kutuo ụlọ ndịna e ji mere ogige ndị ntọrị mmadụ a kpọrọ ‘Udoka Golden Point Hotel dị n'Oba Idemili South, n’okporoụzọ awarawa si Onitsha gawa Owerri.

    N’ozi ngalaba mba mgbasaozi gọọmentị Anambra bụ Anambra State New Media wepụtara n’akara X, kwuru na e jizi ụlọ ndina ahụ mere ogige a na-ezo ndị a tọọrọ na ebe a na-eme mpụ dị iche iche.

    Ụlọ ndịna e ji mere ogige ndị ntọrị

    Ebe foto si, Anambra State New Media/X

    A sị na n’elu ụlọ ahụ ka a rụrụ ihe ndị dịgaasị ka ọnụ ili mmadụ iri atọ, a hụkwara ebe nchụaja, ite nchụaja nakwa ihe dịka ọbara.

    A hụkwara ụfọdụ mgbọ egbe na abụba ọkụkọ dịka ihe e jiri chụọ aja.

    Nke a na-abịa n’ime ihe dịka otu izuụka gọọmentị Anambra Steeti hiwere ngalaba nchekwa ọhụrụ a bụ ‘Agụnaechemba’ bụ nke a kpọrọ usoro ọrụ ha ‘operation udo ga-achị’ iji buo agha megide nchekwa dị njọọ na steetị ahụ.

    Kamgbe ahụ, ndị ọrụ nchekwa a anwuchiela ọtụtụ ndị ntọrị mmadụ na mpaghara dị iche iche n’Anambra Steetị.

    Ụlọ ndịna e ji mere ogige ndị ntọrị

    Ebe foto si, Anambra State New Media/X

  16. E gbuola ndịagha mmadụ 13 si mba ọzọ gara ime udo na mba DR Congo

    Ndịagha udo si mba ọzọ gaa mba DR Congo ime udo

    Ebe foto si, Reuters

    E gbuola ndịagha mmadụ iri na atọ bịara ịlụagha udo na mba Democratic Republic of Congo mgbe ha ndịagha nnupuisi otu M23 kwata mgbọ.

    Ndịagha mba Saụt Afrịka kwuru na ndịagha ha mmadụ itoolu so nwụrụ mgbe ha na-enye aka ịchụghachị ndịagha nnupuisi ahụ ka ha ghara ịbata n’obodo Goma, ebe ndịagha Malawi atọ na otu onye agha Uruguay so na ndị e gburu.

    Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron kwuru na ọ gwala ndịisiala mba DR Congo nakwa Rwanda ka ọgụ ahụ kwụsị dịka mbaụwa na-ekwukwa.

    Otu United Nation na-ewezuga ụfọdụ ndị ọrụ ha site Goma – obodo nwere ọnụọgụgụ mmadụ karịrị otu nde dịka agha a na-arị elu.

    Ọgbakọ nchekwa banyere ọgbaghara ahụ nke otu United Nation chọburu inwe n’ụbọchị Mọnde, ka e bugaziri n’ụbọchị Sọnde n’ihi ọgbaghara a na-arị ibe ya elu.

    Ndịagha nnupuisi M23 agwala ndịagha mba DR Congo nọ n’obodo Goma ka ha wụsa ngwaagha ha ka e gbochie nkwafu ọbara ebe DR Congo na-ebo ndị agbataobi ha bụ Rwanda ebubo na na-akwado ndịagha nnupuisi a.

    Nke a na-abịa dịka ndịagha nnupuisi gburu otu gọvanọ ọchịagha mba Congo mgbe ọ gara njem nleta n’ihu agha n’ụbọchị Tọzde. N’ọnwa Jenụwarị ndị a kpachikwara ụfọdụ obodo dị mkpa na DR Congo – gụnyere Minova na Masisi.

  17. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo?

    Ndụ mmiri ndụ azụ. Ya gaziere gị n'ụbọchị ụka a.

    Biko echefukwala ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa, Afrịka, Naịjirịa nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Daalụ!

  18. Lee ka ihe mberede jiri rie isi mmadụ n'Enugwu

    Lee ka ihe mberede jiri rie isi mmadụ n'Enugwu
    Nkọwa foto, Lee ka ihe mberede jiri rie isi mmadụ n'Enugwu

    Ihe mberede ahụ mere n'ụbọchị Satọde 25 Janụwarị 2024 oge ụgbọala bu mmanụ dara wee mụnye ọtụtụ ụgbọala ndị nọ ya n'akụkụ ọkụ n'Ugwu Onyeama.

  19. Sineti akwadola Kristi Noem dịka odeakwụkwọ Ngalaba Nchekwa nke mba Amerịka

    Sineti akwadola Kristi Noem dịka odeakwụkwọ ngalaba nchekwa nke mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Sineti akwadola Kristi Noem dịka odeakwụkwọ ngalaba nchekwa nke mba Amerịka

    Ndị Sineti mba Amerịka akwadola Kristi Noem bụ onye Donald Trump họpụtara dịka odeakwụkwọ Ngalaba Nchekwa na mba Amerịka.

    Dịka odeakwụkwọ Ngalaba Nchekwa Obodo, Noem bụbu Gọvanọ South Dakota, ga-ahụ maka ọtụtụ mgbanwe Onyeisiala Donald Trump na-eme banyere okeala na ihe banyere mbata na ọpụpụ n’Amerịka.

    Sineti akwadola Kristi Noem dịka odeakwụkwọ ngalaba nchekwa nke mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Sineti akwadola Kristi Noem dịka odeakwụkwọ ngalaba nchekwa nke mba Amerịka

    Ndị omeiwu nwere ọgbakọ n’ụbọchị Satọde 25 Jenụwarị 2025 ebe ndị pati “Republicans” na-agba mbọ ịhu na-akwadoro ndị ọrụ niile Trump họpụtara.

    Ndị Sineti ekwenyela nhọpụta Kristi Noem ka ọ bụrụ odeakwụkwọ Ngalaba Nchekwa obodo mgbe enwechara ntụliaka votu nke pụtara 59-34.

    Nke a mere Noem dịka onye nke anọ Trump họpụta n’ọkwa nke ndị Sineti kwadoro kemgbe Trump batara n'ọkwa dịka onyisiala mba Amerịka n’ụbọchị Monde, 20 Jenụwarị 2025.

  20. Ihe na-eme ugbu a n’etiti mba Izrel na Hamas

    Ihe na-eme ugbu a n’etiti mba Izrel na Hamas

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe na-eme ugbu a n’etiti mba Izrel na Hamas

    Kemgbe agha Izrel na Hamas kwụsịrị ihe dịka abalị isii garaaga, ha abụọ amalitere ịtọhapụ ndị ha ji na mkpọrọ.

    Dịka Hamas tọhapụrụ ndịagha Izrel mmadụ anọ n’ụbọchị Satọde 25 Jenụwarị 2025 nke soyere ụmụnwaanyị atọ atohapụrụ abalị isii garaaga, Izrel n’aka nke ọzọ tọhapụrụ ndị Palestine mmadụ narị abuọ (200) ha ji na mkpọrọ.

    N’ime mmadụ narị abụọ ndị ahụ Izrel tọhapụrụ, mmadụ iri asaa so na ndị Izrel ga-agbara ụgbọ nwakpi.

    Cheta na ụmụnwaanyị ndịagha Izrel anọ ahụ atọhapụrụ taa, bụ igwe mmadụ nke abụọ ndị Hamas jidere ha tọhapụrụ kemgbe nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza ma bụrụ kwa ndịagha Izrel a kpụụrụ n’ọnwa 7 Ọktoba 2023.

    N’aka nke ọzọ, Gọọmentị Izrel ebula Hamas ebubu imebi nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ site na-atụhapụghị onye nkịtị bụ Arbel Yehud.

    Mana Hamas na-ekwu na Izrel "na-adọkpụ ụkwụ ya" na-egbochi ụzọ ndị Palestine a chụpụrụ achụpụ kwesịrị isi laghachi na mpaghara ha n’ugwu Gaza.

    Ha gara n’ihu kwuo na ha ga-ejide Izrel ma ọ bụrụ na-ahapụ mmejupụta ihe dị na nkwekọrịta na ihe ga-esi na ya pụta.

    Cheta na ndị Izrel kwuru na ha agaghị ekwe ka ndị Palestine achụpụrụ achụpụ laghachite n’ugwu Gaza dịka ekpebiri n’akwụkwọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ.