E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndị uweojii ekwuola okwu maka ihe dịka ogbunigwe gbara na Mbieri gbarie ụlọ mmadụ

    Foto Aboki Danjuma bụ Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti

    Ebe foto si, BBC/Nigeria Police

    Nkọwa foto, Kọmịshọna ndị uweojii imo steeti ekwuola okwu maka ihe gbara n'Umuneke Mbieri

    Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuputara nke a oge ya na onye ntaakụkọ BBC News Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị.

    Okoye kwuru na ndị uweojii enwetala mkpesa banyere ihe ahụ gbara n'ụbọchị Sọnde ma garuokwa n'obodo ahụ.

  2. Ndị uweojii egbuola ndị omekome ise n’Ufuma, Anambra Steeti

    Akụrụngwa e wetara n'aka ndị omekome ahụ

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Akụrụngwa e wetara n'aka ndị omekome ahụ

    Otu ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha na ndị ọzọ nọrọ ụbọchị Tuzde 14 Jenụwarị 2025 wakpo otu ndị omekome n’ụzọ Umugem, Ufuma dị n’okpuru ọchịchị Orumba Nọt Anambra steeti ma gbuo ndị omekome ise ebe ụfọdụ n’ime ha bu oya mgbọ egbe gbaa ọsọ.

    Akwụkwọozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii gbara ogige ndị omekome ahụ ọkụ ma weta ogbunigwe (IED), egbe dị iche iche gụnyere AK47 abụọ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ikenga kwuru na mwakpo ahụ mịtara mkpụrụ maka ezi mmeko dị n’etiti ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, Kọmishọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam enyela iwu ka a malite ịchọ ma nwụchie ndị omekome ahụ gbara ọsọ ma rịọ enyemaka ọhanaeze iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala na Anambra steeti.

  3. E duola Daniel Chapo n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala Mozambik

    Oge a na-edu Daniel Chapo n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Oge a na-edu Daniel Chapo n'iyi ọrụ

    A nọrọ taa Wenezde Jenụwarị 15, 2025 duo Daniel Chapo n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Mozambik.

    Idu n’iyi ọrụ ya na-abịa dịka a na-enwe ọgbaọghara rugoro ọtụtụ ọnwa nke ụlọọrụ na-ahụ maka nnyocha ntuliaka bụ Plataforma Decide kwuru na mmadụ 300 nwụrụ na ya.

    E duru Daniel Chapo n’iyi na mmemme e mere na Independence Square dị n’isi obodo Mozambik bụ Maputo.

    N’okwu nnabata ya, Daniel Chapo kwere nkwa iweta mgbanwe, ịdị n’otu na mmepe mba Mozambik.

    Cheta na Daniel Chapo gbara afọ 48 nke pati FRELIMO wetara vootu dị pasenti 65 na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere na mba ahụ n'ọnwa Ọktoba 2024 nke ọtụtụ ndị na-enyocha ntuliaka kwuru na mpụtara ya akwụghị ọtọ.

    Ọ bụ mpụtara ntuliaka ahụ kpalitere ọtụtụ ngagharịiwe nke butere mmebi na ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

    Onye na-ehere Chapo aka mgba bụ Venâncio Mondlane si mba Saụt Afrịka bata n’izuụka gara aga ma kpọọ oku ka ndị mba Mozambik malite ngagharịiwe ma gbochie idu n’iyi ọrụ Chapo.

    Otu pati Renamo na MDM kwuru na ha anaghị ahụta Daniel Chapo dịka Onyeisiala maka na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere na mba ahụ.

    Ndịagha nọ n'ogige Independence Square ebe a nọ duo Daniel Chapo n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala Mozambik

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha nọ n'ogige Independence Square ebe a nọ duo Daniel Chapo n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala Mozambik
    Ndị nkwado Daniel Chapo bịara oge e duru n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Mozambik

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị nkwado Daniel Chapo bịara oge e duru n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Mozambik
  4. A nwụchiela Onyeisiala Saụt Koria bụ Yoon Suk-Yeol

    Onyeisiala Saụt Koria Yoon Suk-Yeol

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Saụt Koria Yoon Suk-Yeol

    Yoon Suk Yeol abụrụla Onyeisiala mba Saụt Koria mbụ a nwụchiri maka nnyocha dịka ndị na-eme nnyocha nwụchiri ya n’ụlọ ya n’agbanyeghị mbọ niile ọ gbara igbochi nwụchi ya.

    A na-enyoch Yoon gbara afọ 64 maka ebubo inyefe ọchịchị n’aka ndịagha ụbọchị Tuzde 3 Disemba 2024 nke e kwuru na ọ tinyere ọgbaaghara na mba ahụ.

    Ọ bụ eziokwu na ndị ụlọomeiwu Saụt Koria chụpụrụ Yoon n’ọkwa dịka Onyeisiala mana Yoon ga-anọ n’ọkwa dịka Onyeisiala ruo oge ụlọikpe iwu Saụt Koria ga-ekpebi ikpe banyere nchụpụ ya.

    Nwụchi Yoon enwetela na njedebe mbọ niile ndị na-eme na-agba kamgbe ịnwụchi ya n’agbanyeghị na ndị ọrụ nchekwa Yoon chọrọ igbochi ha.

    Cheta na ụlọọrụ Corruption Investigation Office (CIO) gbara mbọ ịnwụchi Yoon ụbọchị Fraịde 3 Jenụwarị, 2025 mana ndị ọrụ nchekwa Yoon ji ụgbọala na eriri waya gbochie ha.

    Mana ụbọchị Wenezde 15 Jenụwarị 2025, ndị ọrụ nnyocha ji akụrụngwa e ji arịelu wuchie n’ụlọ Yoon ma nwụchie ya.

    Ndị nnyocha na-arị elu aja ụlọ Yoon iji nwụchie ya

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị nnyocha na-arị elu aja ụlọ Yoon iji nwụchie ya
  5. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị abịala n'ọgbakọ BBC News Igbi iji wetara gị akụkọ si mbaụwa.

    Gaa n'ihu sonyere anyị taa.

    Ndewo.

  6. Ihe ndị uweojii Anambra steeti kwuru maka akụkọ kwuru na a tọhapụla ndị ‘Sister’ abụọ

    Ihe ndị uweojii Anambra steeti kwuru maka akụkọ kwuru na a tọhapụla ndị ‘Sister’ abụọ

    Ebe foto si, Anambra Police Command, Getty

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuputala njikere ha dị ịgbakọọrọ ndị nweere onwe ha n’aka ndị ntọrị aka iji mara ihe ha kwesịrị ime.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị Tuzde 14 Jenụwarị 2025.

    Ọ sịrị na atụmatụ ahụ bụ iji mee ka o siere ndị omekome ike ịkpa ụdị arụ ọbụla na steeti ahụ.

    Ikenga kwuru nke a dịka ọ na-azaghachi ozi e bipụtara n’ọbaozi sọshal midịa banyere ntọhapụ ndị ‘Reverend Sister’ abụọ a tọọrọ n’okporoụzọ Ufuma dị n’Okpuru ọchịchị Orumba North n’Anambra steeti tinyekwara onyonyoo na-egosi ebe a sị na Maazị Onyebuchi Okocha a maara nke ọma dịka Onyeze Jesus riri mbọmbọ n’aka ndị omekome.

    Dịka o siri kwuo, ndị uweojii na-eche ka mmadụ ndị ahụ nwetechaa onwe ha iji nwee ike kọwaara ndị uweojii na-eme nnyocha ka ha na ije siri gaa.

    Ọ gara n’ihu kwe nkwa na ndị uweojii Anambra steeti na-agbasi mbọ ike imemila ndị omekome ma hụkwa na e nyere onye niile nchekwa gburugburu steeti ahụ.

  7. Otu nwoke egbuola enyi ya nwaanyị, bepụ ya isi

    Foto Salome Adaidu na Timileyin Ajayi

    Ebe foto si, Salome Adaidu/Facebook/Nigeria Police

    Nkọwa foto, Foto Salome Adaidu na Timileyin Ajayi

    Ndị uweojii Nasarawa steeti anwụchiela onye otiegwu aha ya bụ Timileyi Ajayi si Kogi steeti maka ebubo igbu enyi ya nwaanyị aha ya bụ Salome Adaidu ma gbukasịa ahụ ya.

    Akụkọ si n’aka ndị uweojii kwuru na oge ha nwụchiri Timileyi, n’akụkụ ogige otu ụlọụka dị na mpaghara Orozo ụbọchị Sọnde 12 Jenwụwarị, ha chọpụtara na o bu isi Salome n’akpa.

    Ihe onyonyo pụtara ihe na sohal midia, gosiri oge Timileyin na-akọwa etu o si gbua Salome.

    Enyi Salome Adaidu bụ Abby Simon gwara BBC na ọnwụ Salome bụ ihe mwute nye ndị enyi na ezinaụlọ ya.

    Abby kọwara na oge nwanne Salome gara n’ụlọ ebe o bi, ọ chọpụtara na ụlọ ya ghasara aghasa ma hụọ ka ọbara juru ebe niile.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ onye ọgbaatumtum bu Timileyin si Orozo gawa Oke chọpụtara na ọbara si n’akpa ya na-apụta. Ọ bụ oge ahụ ka ọ kpọkuru ọhanaeze ndị malitere ịjụ ya ajụjụ ihe o bu n’akpa.

    E kwuru na ndị mmadụ malitere iti Timileyin ihe tupu ha kpọọ ndị uweojii bịara nwụchie ya.

    Abby kwuru na Timileyin abụghị enyi nwoke Salome Adaidu. “Anyị niile maara onwe anyị maka na anyị bụ obere obodo, enweghị onye ma onye Timileyin bụ, ọ bụghị enyi nwoke Salome”.

    Nke a abụghị oge mbụ a na-enwe akụkọ dị etu. Cheta na n’ọnwa Disemba 2022, ndị uweojii Ogun steeti nwụchiri otu nwoke gbara afọ 27 tigburu enyi ya nwaanyị na mpaghara Eredu Ishara steeti ahụ.

  8. E bibiela akpụrụakpụ onyeisiala Ghana pụrụ apụ bụ Akufo-Addo

    E bibiela akpụrụakpụ onyeisiala Ghana pụrụ apụ bụ Akufo-Addo

    Ebe foto si, Joseph Amuah

    Akwatuola akpụrụakpụ Onyeisiala Gana pụrụ apụ bụ Nana Akufo-Addo, bụ nke ọ kpụrụ na ngwụcha afọ gara aga.

    Ndị mmadụ katọrọ Akufo-Addo oge o kpughere akpụrụakpụ onwe ya na mpaghara ọdịda anyanwụ Gana n'ime ọnwa Nọvemba afọ gara aga, ma kọwaa nke ahụ dịka mmadụ iji aka aja onwe mma.

    N'ụbọchị Mọnde ka ụlọmgbasaozi dị na mba Gana kesara foto na-egosi na akwatuola akpụrụakpụ ahụ ma tụsa isi ya n'ala.

    Amatabeghị onye kwaturu akpụrụakpụ ahụ maọbụ ihe bụ ebumnobi ya dịkwa ka ndị uweojii na-ekwubeghị okwu gbasara ya.

    Akufo-Addo pụrụ n'ọkwa onyeisiala n'izuụka gara aga dịka ọ chịchara ọchịchị nke ugboro abụọ. E meriri onye pati ya họpụtara ịnọchi anya ya na ntuliaka a haziri n'ọnwa Disemba afọ 2024.

    E bibiela akpụrụakpụ onyeisiala Ghana pụrụ apụ bụ Akufo-Addo

    Ebe foto si, Citi Newsroom

  9. A na-atụ anya n’oke ikuku nwereike ịkpalite ọkụ ọzọ na Los Angeles

    Onye ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ na Los Angeles ekwuola na dịka ha na-agba mbọ ịgbanyụ ọkụ abụọ na-agba na mpaghara ahụ, a na-atụ anya n’oke ikuku nwereike ịkpalite nnukwu ọkụ ọzọ ebe ahụ.

    Ọkụ Palisades bụ nke kachasị, agbaala ala ruru acre 23,000 ebe ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ nwereike ịgbanyụ ọkụ na naanị ala pasenti 14 n’ime ya.

    Ndị na-enyocha ihu igwe kwuru na oke ikuku ruru 70mph nwereike ịkpalite oke ọkụ ọzọ n’ebe ahụ.

    Onyeisi Los Angeles bụ Karen Bass kọwara na ha amalitela ịrụrụ ọrụ iji belata mmetụta oke ikuku a na-ekwu na ọ dị ka hurricane.

    Ihe ruru mmadụ 24 anwụọla kemgbe ọkụ ahụ malitere n’izuụka gara aga ebe a na-achọ mmadụ 23 achọ. Ka ọ dị ugbua, a na-agba mbọ ime ka ihe ruru mmadụ 90,000 si ebe ahụ pụọ.

    Ụlọ na-agba ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụlọ na-agba ọkụ
    Onye ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye ọrụ na-agbanyụ ọkụ
  10. Igbo ndị ọma unu assala chi

    Anyị na-asị gị nnọọ dịka ị na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Anyị ga-aga n'ihu iwetara gị akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ si mbaụwa taa.

    Nnọọ.

  11. E wepụla onyeisioche ụlọ omeiwu Legọs Steeti bụ Obasa n’ọkwa

    E wepụla onyeisioche ụlọ omeiwu Legọs Steeti bụ Obasa n’ọkwa

    Ebe foto si, LSHA

    Ndị omeiwu Legọs steeti ewepụla onyeisioche ụlọ omeiwu ha bụ Mudashiru Obasa n’ọkwa.

    Obasa nọ n’ọchịchị nke ugboro atọ dịka onyeisioche bụ onye a na-enyo enyo maka ajọ omume na mmegbu.

    Ndị omeiwu ahọpụtala osote onyeisioche bụ Mojisola Meranda dịka onyeisioche nke Legọs Steeti.

    E wepụrụ Mudashiru Obasa n’ụbọchị Monde 13 Jenụwarị 2025 n’ọgbakọ e nwere n’ụlọ omeiwu Legọs steeti nọ na ndịda ọdịda anyanwụ Naijirịa, ebe ihe ruru 90 pecet ndị omeiwu kwekọrịtara ka ewepụ ya n’ọkwa.

    O nweghị onye ma ajọ omume e ji maka ya wepụ onyeisioche a maka na ndị omeiwu Legọs steeti ewepụtabeghị ozi banyere akụkọ a,ọ bụnadịghị Obasa ekwubeghị okwu banyere ihe mere.

  12. Biden na Netanyahu enweela mkparịtaụka maka ịkwụsị ọgụ dị n’etiti Izrel na Gaza

    Biden na Netanyahu enweela mkparịtaụka maka ịkwụsị ọgụ dị n’etiti Izrel na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na Prịam Minista mba Izrel bụ Netanyahu akparịtala ụka n’ekwentị dịka okwu ịkwụsị ọgụ ndị Izrel na Gaza nakwa ịtọhapụ ndị eji eji na-aga n’ihu.

    Mkparịtaụka ahụ mere n’izuụka ikpeazụ onyeisiala Biden ga-anọ n’ọkwa dịka onyeisiala nke mba Amerịka.

    A ghọtara na mba Izrel na Hamas na-aga n’ihu n’okwu banyere ịkwụsị ọgụ mana o nwere ọtụtụ ebe mba abụọ ahụ enwebeghị nkwekọrịta.

    Ụlọọrụ isi ọchịchị mba Amerịka kwuru na Biden na Netanyahu kpara maka ọnọdụ mpaghara gbanwere ntọala dịka Izrel kwụsịrị ọgụ Hezbollah na Lebanọn, otu esi kwatuo Assad na Syria ya na ibelata ikike Ịran na mpaghara ahụ.

    Ụlọọrụ Netanyahu kwuru na ọ gwara Biden na ihe banyere ntuziaka o nyere ndị isi mkparitaụka na Doha iji kwalite ntọhapụ nke ndị eji eji.

    Mgbe ha na-enwe mkparịtaụka n’ubọchị Sọnde nke bụ mkparịtaụka nke mbụ ha na enwe kemgbe ọnwa Ọktoba afọ 2024, Biden rụtụrụ aka na mkpa ọ dị ịkwụsị ọgụ na ịkpọlata ndị e ji eji ya na iwelite aka a na-enyere ndị mmadụ na ikwekọrịta ịkwụsị ọgụ.

  13. AfD anabatala ịgbara ndị mbịarambịa na Germany ụgbọ nwamkpi

    AfD anabatala ịgbara ndị mbịarambịa na Germany ụgbọ nwamkpi

    Ebe foto si, EPA

    Dịka ntuliaka nke mba Jamini na-abịa nso, otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Alternative für Deutschland (AfD) ekwuputala ọchịchọ ha imechi okeala obodo ha nakwa ịmalite ịzụ gaasị n’aka mba Rọshịa.

    Ndị mgbasaozi na mba Jamini kwuru na ihe pati ahụ kwekọrịtara gụnyere atụmatụ ịhapụ nkwekọrịta ihu igwe nke Paris, ịpụ n’ego Euro na ihibe ọgbakọ ọhụrụ nke steeti.

    Onyeisi AfD bụ Alice Weidel nabatara mbata na ọpụpụ maọbụ nchụpụ ndị mbịarambịa n’igwe.

    Puku ndị ngagharịiwe na-emegide AfD juru n'okporoụzọ dị na Riesa nọ na Saxony na Satọde na-achọ igbochi ndị na-abanye n'ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ nwere ọgbakọ.

    Mana Alice Weidel kwuru mgbe ọ rịgooro n’ọgbọ na ndị na-eme ngagharịiwe n’ụzọ bụ igwe mmadụ mpaghara aka ekpe.

    O kwuru na eziokwu, ọ bụrụ na a ga-akpọ ya mbata na ọpụpụ, nke ahụ bụ ihe ọ ga-abụ, mbata na ọpụpụ.

  14. Ogbunigwe ndịagha Naịjirịa egbuola mmadụ 16 na-amaghị ama

    Ndịagha Naịjirịa egbuola mmadụ 16 na-amaghị ama

    Ebe foto si, Nigeria Air Force HQ/Facebook

    Ndịagha Naịjirịa egbuola opekatampe mmadụ iri na isii (16) na-amaghị ama site n’ogbunigwe ha siri n’elu tụọ na Zamfara steeti.

    Akụkọ kwuru na ndịagha gburu mmadụ ndị ahụ aka ha dị ọcha chee na ha bụ ndị oyi ndụ egwu na ndị omekome.

    Ụmụafọ obodo ahụ gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ ndị ahụ e gburu egbu bụ ndị nche na mmadụ nkịtị ndị na-echekwa onwe ha n’aka otu ndị na-eyi ndụ egwu.

    Ndị e jiri maka ha tụọ ogbunigwe ahụ bụ ndị oyi ndụ egwu na-akpa mkpamkpa na mpaghara Zurmi na Maradun dị na Zamfara steeti.

    Ka o sinadị, aka na-achị Zamfara steeti bụ Dauda Lawal ezigarala ndị obodo ahụ ozi nkasiobi dịka ndịagha kwetara na ọ bụ ha tụrụ ya bụ ogbunigwe ma kwuo na ha amalitela ime nnyocha maka ndị nche e gburu egbu.

  15. Onye mba Tanzania a tọọrọ na Kenya enwerela onwe ya

    Maria Sarungi Tsehai

    Ebe foto si, Amnesty International/X

    Nkọwa foto, Maria Sarungi Tsehai

    Onye Tanzania a ma ama na-ebuagha megide mmegide bụ Maria Sarungi Tsehai ndị ojiegbe tọọrọ na Kenya enwerela onwe n’ime awa ole na ole a tọọrọ ya.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Amnesty International na Kenya bụ Roland Ebole gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ ji ike gwa ya ka ọ banye n’ụbọala ha ụchọchị Sọnde 12 Jenụwarị 2025 na Nairobi, isi obodo Kenya.

    Ihe oyonyo Nwaada Tsehai mere nke o kesara n’akara X ya, gosiri na a tọhapụla ya ma kwuo ‘Enwerela onwe m’.

    Maria Sarungi Tsehai bụ onye na-akatọ ọchịchị Onyeisiala Samia Suluhu Hassan ma bo gọọmenti ya ebubo ‘ọchịchị aka ike’.

    Onyeisi otu Law Society of Kenya Faith Odhiambo kwuru na ha rụrụ ọrụ iji mee ka a tọhapụ Maria Sarungi Tsehai, onye na onye na-akwado nkwudo okwu na ikike mmadụ.

  16. Ọkụ Los Angeles egbuola mmadụ 24 ebe a na-achọ mmadụ 16 achọ

    Ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ndị na-ahụ maka ihu igwe na California adọọla na nti maka oke ikuku nwereike ịkpalite ọkụ ọzọ na Los Angeles n’izuụka a dịka ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ na-agba mbọ igbochi ma beleta ọkụ ahụ na-efesa n’ike.

    A na-ekwu na oke ikuku Santa Ana nwereike ịmalite ụbọchị Sọnde 12 Jenụwarị ruo Wenezde 15 Jenụwarị, 2025.

    Akụkụ kwuru na ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ agbaala mbọ ịbelata nfesa ọkụ ahụ na Palisades na Eaton site n’eyemaka ndị ọrụ na-agbanyụ si mba Kanada na Mexico.

    Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ ahụike LA County ekwuola na mmadụ 24 anwụọla ebe a na-achọ mmadụ 16 achọ.

  17. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Anyị kwụrụ chịm inwetara gị akụkọ niile si mbaụwa taa.

    Ka izuụka ọhụrụ a mịtara gị mkpụrụọma.

  18. Usoro ọhụrụ mba Kanada weputara maka ndị chọrọ ịbata n’afọ 2025

    Mba Kanada

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mba Kanada

    Mba Kanada chọrọ iweputara usoro ọhụrụ maka ndị chọrọ ịga mba ahụ ga biri n’afọ 2025.

    Usoro ọhụrụ ahụ ga-agbanwe etu ha si anabata ndị ga-abịa rụọ ọlụ na mba ahụ. Ọ metutara ndị na-achọ ọrụ dị icheiche sita na ndị na-achọ ọrụ odibo ruo na ndị were akaọrụ.

    Mgbenwe ọhụrụ ahụ ga-eme ndị na-achọ ọrụ odibo maọbụ ndị na-elekọta ụmụaka ị bụ ụmụ amaala mba Kanada ngwangwa ha na-abata na mba ahụ.

    Mana nke ahụ ga-adị ire na ha nwetachaa ihe niile ha kwesiri ịweta ma bụrụ ndị a zụrụ azụ n’ilekọta ụmụaka maọbụ odibo.

    Ndị ọzọ ọ metutara bụ ndị chọrọ ịbịa mba Kanada rụọọrụ n’ime obodo.

    Ọzọkwa bụ na mba Kanada chọrọ ime ka ndị na-asụ asụsụ French nwee ikike pụrụiche ịbịa mba ha.

    Kanada chọrọ ka ha kwalita mpaghara obere obodo dị icheiche bụ ebe a na-asụ asụsụ French na mba ha ma kwalita ọnọdụ akụnụba ha.

    Mana n’aka nke ọzọ, mba Kanada na-achọ iwetụta ọnụ ọgụgụ ndị na-abata na mba ha ọkachasị ndị na achọ ọrụ. Ha chọrọ isi n’ọnụ ọgụgụ 14,750 gbadata n’ọnụ ọgụgụ 10,920 n’afọ 2025.

  19. E jidela ndị na-ezu ohi n’ebe ọkụ na-agba na Los Angeles, Amerika

    Ọkwa dị mkpa

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọkwa dị mkpa

    E jidela mmadụ ruru iri abụọ maka izu ohi n’ebe ọkụ na-agba na Los Angeles dị n’Amerika.

    Onye uweojii bụ Mike Lorenz kwuru na mmadụ iri abụọ ha jidere gụnyere mmadụ abụọ tiri uwe adịgboroja ma kwadoo dịka ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ.

    Lorenz sị na “izu ihe ndị mmadụ so na nsogbu ha were ugbua. Anyị ejidela ọtụtụ ndị mmadụ.

    Lorenz kwuru nke a mgbe ndị bi na mpaghara ahụ na-enwe ọgbakọ na Palisades n’abalị gara aga.

    Ụlọọrụ mgbasaozi Fox kwuru na ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ na Los Angeles na-akwụ ndị ọrụ nchekwa na-abụghị nke gọọmenti ụgwọ ka ha chekwaara ha ụlọ ha.

    Onye nwe ụlọọrụ nchekwa bụ Sean Ben kwuru na ụlọọrụ ya na-arụ ọrụ ma n'ụtụtụ ma n’abalị na-echekwa ụlọ na ihe ndị mmadụ na mpaghara ahụ.

  20. Ndị ọrụ abụọ anwụọla na Legọs steeti oge ha danyere n’ime...

    Ndị ọrụ abụọ anwụọla na Legọs steeti oge ha danyere n’ime...

    Ebe foto si, Getty Images

    E kwuputala ụmụnwoke abụọ dịka ndị nwụrụ anwụ oge ha danyechara n’ime olulu ụlọorụ ha ji echekwa mmanụ diesel na mpaghara Ikosi Oregun na Legọs steeti.

    N’ozi ha wepụtara, ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata na Legọs steeti bụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) kwuru na njinji ahụ jiri n’ụbọchị Satọde 11 Jenụwarị 2025.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, onye ọrụ nke mbụ danyere n’ime olulu ahụ na-amaghị ama oge ọ na-arụ ọrụ ebe onye ọrụ nke abụọ danyekwara n’ime olulu ahụ oge ọ na-agba mbọ ịzọpụta onye nke mbụ.

    LASEMA kwuru na e buuru mmadụ abụọ ahụ gawa ụlọọgwụ ozugbo bụ ebe ha nọọrọ nwụọ na-agbanyeghị mbọ niile a gbara iji tutegharịa ha.