Ụtụtụ ọma ndị be anyị
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo ụbọchị taa bụ Wenezde, 22, Jenụwarị, 2025.
Ọfọ anyị taa bụ ije awele n'isi onye ọbụla.
Ndewo.
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.
Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo ụbọchị taa bụ Wenezde, 22, Jenụwarị, 2025.
Ọfọ anyị taa bụ ije awele n'isi onye ọbụla.
Ndewo.

Ebe foto si, Getty Images
Nsogbu dara n’etiti ndị ntorobịa obodo Omege Agalagu na Ukwuinyima dị n’Okpuru ọchịchị Ikwo n’Ebonyi steeti eriela isi otu onye dịka ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, kọmịshọna mgbasaozi n’Ebonyi steeti bụ Jude Chikadibia Okpor kwuru na gọọmenti maara gbasara ya bụ njinji dịka ha na-agba mbọ igbo ya bụ nsogbu.
Ọ sịrị na ọ bụ “nghọtahie dapụtara n’etiti ndị ntorobịa abụọ sitere n’obodo Omege Agalagu na Ukwuinyima kpatara ya bụ ọgụ “họrọ onye ị ga-egbu”.
N’okwu nke ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na e gburu otu onye oge ya bụ ọgụ dara ma kwuo na ha azọbanyela ụkwụ na ya bụ nsogbu.
Dịka o siri kọwaa, oge ndị ntorobịa abụọ ahụ na-enwe nghọtahie, a sụrụ onye nke bụ nwaafọ Omege mma nke mere o ji nwụọ n’ụlọọgwụ. Ọ bụ ọnọdụ ahụ mere ka ndị ntorobịa obodo ya wakpoo Ukwuinyima ma malite ịgba ụlọ ha ọkụ.
Ukandu kwuru na anwụchiela nwaokorobịa ahụ sụgburu mmadụ ma jichie ya dịka nnyocha na-aga n’ihu ugbua.

Ebe foto si, NCC, Getty
Ụlọọrụ Nigerian Communications Commission (NCC) akwadola arịrịọ ụlọọrụ ndị na-enye ikuku nziritaozi ka e bulie ego oku ekwentị ruo pasenti iri ise (50%).
Mana Nnaemeka Obiaraeri onye maara ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnaụba kwuru na mbuli ego ahụ NCC buliri abụghị ihe ha kwesịrị ime.
N'okwu ya "Ebe ụlọọrụ NCC kwesịrị itinye uche ha bụ ịhụ na ụlọọrụ ndị na-enye ikuku nziritaozi na-arụ ọrụ etu o kwesịrị iji hụ na ụmụafọ Naịjirịa nwereike ezi ohere mgbasaozi".
Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ ndị na-enye ikuku nziritaozi na Naịjirịa abụghị nke gọọmenti na-achịkọta, nke a bụ ihe mere e ji nwee ọtụtụ ụlọọrụ ndị na-enye ikuku nziritaozi na Naịjirịa. Ha niile na-achọ irita uru maka na ọ bụ ya bụ ihe azụmahịa bụ maka ya.
"Ọ bụ ọrụ ụlọọrụ ndị na-enye ikuku nziritaozi ịchọpụta ma kwuo ego ole ha ga-ana maka ịkpọ oku ekwentị na Naịjirịa, enweghị ihe gbasara ụlọọrụ NCC na ya".
Maka ụmụafọ Naịjirịa, Nnaemeka Obiaraeri dụrụ ọdụ ka onye ọbụla chọpụta ụzọ nziritaozi ga-adị onye mma ma ọ bụrụ na ọnụego oku ekwentị rịa elu karịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ngwa ngwa e duru ya n’iyi ọrụ dịka Onyesiala mba Amerịka, Donald Trump ebinyela aka n’akwụkwọ iwu dị iche iche nke gụnyere ịgbaghara ihe ruru mmadụ 1,600 wakporo Capitol Building ụbọchị Wenezde 6 Jenụwarị n’afọ 2021.
Nke a pụtara na a na-atụ anya na ụfọdụ ndị ahụ wakporo Capitol Building nọ na mkpọrọ, ga-enwere onwe n’oge na-adịghị anya.
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo.
Anyị kwadoro akwado inwetara gị akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ si mbaụwa niile taa.
Anyị na-asị gị nnọọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha mba Gana ekwuola na ihe dịka mmadụ asaa anwụọla site na nsogbu ha nwere n’ebe a na-egwupụta ihe na mpaghara etiti Ashanti.
Ndịagha Gana kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii na-egwupụta ihe n’ụzọ iwu akwadoghị banyere n’ebe a na-ewgupụta ihe nke ulọọrụ AngloGold Ashanti nwe n’ike wee malite ịgba ndịagha egbe mgbe a kwụsịrị ha.
Ha kwuputara na ihe a mere ka ndịagha gbawa ha egbe iji nweeike zọpụta onwe ha, nke mere ka ndị mmadụ nwụọ ebe ụfọdụ merụrụ ahụ.
Onye na-anọchịte anya ndị na-egwupụta ihe kwuru na o nweghị egbe ndị na-egwupụta ihe ji.
A malitela ngagharịiwe n’obodo Obuasi ebe a gbara ọtụtụ ugbọala ọkụ dịka akụkọ ndị e gburu egbu malitere ifesa.
Ndị mmadụ iwe ji jupụtara n’ogige ụlọọrụ ahụ na-egwupụta ihe maka ọnwụ ndị e gburu egbu, ma gbaa opekata mpe ụgbọala atọ na akụrụngwa ndị ọzọ nke ụlọọrụ ahụ ọkụ.
Onyeisiala mba Gana bụ John Mahama enyela iwu ka a malite inyocha ihe mere ma kwuo na a ga-ekpe onye ọbụla a chọpụtara na o mere ihe iwu akwadoghị ikpe.
Ozi si n’ụlọọrụ onyeisiala na-egosi na ọ bụ mmadụ asatọ bụ ihe e gburu.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden anabatala Donald Trump na nwunye ya n’obi ọchịchị White House dịka emume idu Trump n’iyi ọrụ na-amalite.
Jill Biden bụ nwunye Onyeisiala Biden so nabata Donala Trump na nwunye ya.
Cheta na Donald Trump achịbuola mba Amerịka site na Jenụwarị 2017 ruo Jenụwarị 2021.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Reuters
Dịka nkwekọrịta ikwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti mba Izrel na Hamas banyere abalị, a tọhapụla mmadụ 90 mba Palestinia a tụrụ mkpọrọ.
Ụlọọrụ na-ahụ mkpọrọ mba Izrel kwuru na ndị ahụ a tọhapụrụ gụnyere ụmụnwaanyị 69 na ụmụ ntorobịa 21.
Cheta na Hamasa tohapụkwara ụmụnwaanyị mba Izrel nakwa otu nwaanyị bụ ji akwụkwọ njirimara mba Briten ndị nọ n’ụlọọgwụ dị na Tel Aviv enweta nleta.
Otu nwaanyị a tọhapụrụ aha ya bụ Hanan Maalwani kwuru na a tara ha afụfụ dị iche iche ma kwuo na obi dị ya aṅụrị ịnakwuru ezinaụlọ ugbua.
Cheta na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ bụ nke malitere ụbọchị Sọnde 19 Jenụwarị 2025.

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Getty Images
A ga-anọ ta duo Donald Trump dịka Onyeisiala mba Amerịka n’isi obodo Washington DC.
Mmemme ahụ bụ nke a na-emekarị n’ogige US Capitol mana ka ọ dị ugbua, a ga-eme mmemme idu n’iyi ọrụ a n’ime ụlọ maka oke oyi.
Ngwa ngwa e duru ya n’iyi ọrụ, Donald Trump ga-ezigara ndị mba ozi tupu ya na nwunye ya agaa obi ọchịchị White House maka emume ndị ọzọ na-eso mmemme idu ya n’iyi ọrụ.
Ndị nkwado Trump ruru mmadụ 200,000 ka a na-ekwu na ha ga-apụta ịbịa sonye n-emume a.
N’okwu ya n’ọgbakọ o mere ubọchị Sọnde 19 Jenụwarị, 2025, Donald Trump kwere nkwa ibinye aka n’iwu dị iche iche n’ụbọchị mbụ ya dịka Onyeisiala.
Cheta na Donald Trump achịbuola mba Amerịka site na Jenụwarị 2017 ruo Jenụwarị 2021.
Daalụ maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.
Anyị na-asị ka izuụka ọhụrụ a mịtara gị n'ezinaụlọ gị ezi mkpụrụ.

Ebe foto si, Enugu state police command
Ndị uweojii n’Imo steeti ekwuola na ha jidere otu nwoke maka ebubo ịji karama magbuo ọgọ ya nwoke na steeti ahụ.
Ha kwuru na aha nwoke ahụ e boro ebubo bụ Uchenna Okpara ebe ọgọ ya nwoke nwụrụ anwụ bụ Uchenna Unakalamba.
Dịka akwụkwọ ozi si n’ụlọọrụ ndị uweojii n’Imo steeti nke Henry Okoye binyere aka si kwuo “mkpamkpa ahụ kpara n’abalị iri na isii nke ọnwa Jenuwarị afọ 2025 n’obodo Ubomiri dị na gọọmenti okpruru ọchịchị Mbaitoli, n’Imo steeti”.
Ọ sị na nsogbu ahụ bidoro mgbe ụmụaka mmadụ abụọ ahụ nwere obere nsogbu nke butere ha abụọ ịnụ ọgụ.
Ndị uweoji kwuru na ọ bụ mgbe ahụ ka Okpara ji karama gbawara agbawa meruo Unakalamba nnukwu ahụ.
Ha sịrị na dọkịnta kwuru na Unakalamba anwụọla anwụ ka ha butere ya n’ụlọọgwụ.
Mana etu ọnọdụ sị dị ugbua, Uchenna Okpara nọ n’aka ndị uweojii, ebe ndi uweojii bidoro ime nyocha maka ihe mere.

Ebe foto si, EPA
Ozi anyị na-enweta ugbua na-ekwu na ndị ọrụ gbatagbata bụ Red Cross nọ na Gaza Strip agawala ịkpọta ụmụnwanyị mba Izrel mmadụ atọ ndị otu na-enyi ọha egwu bụ Hamas tọhapụlụ.
A na-atụ anya na ndị Red Cross ga-enyefe ụmụnwanyị atọ ndị ahụ n’aka gọọmenti mba Izrel.
N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru gọọmenti mba Izrel bụ David Mencer gwara ndị ntaakụkọ na ya enweghị ihe ọhụrụ ya ga-entinye ọnụ maka ya.
Mencer kwuru sị “a ga m ekwu okwu ma ọ bụrụ na ụmụnwanyị ndị ahụ alọta ma nọrọ n’aka gọọmenti mba Izrel”.
Cheta na mmadụ atọ ndị ahụ a na-atụ anya na Hamas tọhapụrụ gunyere Doron Steinbrecher, Emily Damari na Romi Gonen.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Rushdi Abualouf kwuru n’agbanyeghị na ndị mmadụ hụrụ na a kwụsịla ịkwa mgbọ n’etiti mba Izrel na ndị Hamas mana ha echeghị na agha ebiela.

Ebe foto si, Streams of Joy Dallas/Facebook
Dayosis ụka Katọlik na Warri, Delta steeti akwụsịla Rev. Fr Daniel Okanatotor Oghenerukevwe ọrụ n’ihi ebubo ịlụ nwaanyị na mba Amerịka.
E kpughere nke a n’ozi Dayọsis ahụ jiri kwụsị ya ọrụ bụ nke ha bipụtara n’ụbọchị Tọzde 16 Jenụwarị 2025.
Ndị jikọrọ aka tinye aka n’ozi ahụ gụnyere Rt. Rev. Anthony Ovayero Ewherido bụ Bishọpụ ụka Katọlik na Warri nakwa Very Rev. Fr. Clement Abobo bụ Chancellor/Notary.
Dayọsis ahụ boro ebubo na Fada Oghenerukevwe na nwunye ya bụ Dora Chichah gbara akwụkwọ n’ụlọụka Streams of Joy Church dị na Dallas mba Amerịka n’abalị 29 Disemba 2024.
Dịka ya bụ Dayọsis siri kpughee, Fada Oghenerukevwe nọọrọ n’abalị 30 Nọvemba 2024 rịọ ka e wepụ ya n’ọrụ niile dịịrị ndị e chiri Fada.
N’ihi ya, Dayọsis ahụ gwara ya weta akwụkwọ niile kwesịrị ekwesị iji malite usoro iwepụ aha ya, mana nwaamadị ahụ gara n’ihu gbaa akwụkwọ na-emezughị ihe a chọrọ.
Ka o sinadị, Dayọsis ahụ kwuru na Fada Oghenerukevwe nwere ikike itinye akwụkwọ ka a kagbuo maọbụ lebara mkpebi ahụ anya naanị ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ịgbanwe.

Ebe foto si, Catholic Broadcast Commission Nigeria/Facebook

Ebe foto si, EPA
Ọbaozi TikTok akwụsịla ịrụ ọrụ na mba Amerịka dịka ọ fọdụru elekere ole na ole tupu iwu machiri ha na mba ahụ amalite.
Ndị ji ọbaozi TikTok eme ihe n’Amerịka nwetara ozi n’ekwentị ha nke kwuru na TikTok amalitela irube isi n’iwu ahụ machiri ha, nke pụtara na “i nweghị ike iji TikTok eme ihe ugbua”.
“Anyị nwere obiụtọ na Onyeisiala Trump egosila na ọ ga-agbakọrọ anyị aka iji chọpụta ụzọ a ga-esi weghachi TikTok ngwangwa ọ banyere n’ọchịchị,” ka ozi ahụ kwuru.
Ndị mmadụ enyela mkpesa na ụlọọrụ Apple na Google ewepụla ọbaozi ahụ n’ụlọọbaozi ha dị n’Amerịka ebe TikTok.com anaghị egosikwa onyonyoo ọzọ.
Ọnọdụ a na-abịa dịka ọbaozi TikTok kwuru na ha “ga-agba ọchịchịrị” n’ụbọchị Sọnde ewezuga ma ọchịchị Joe Biden na-akwadọ ịpụ n’ọchịchị a ga-ekwe ha nkwa na ha agaghị etinye iwu machiri ọbaozi ahụ n’ọrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọchịchị Niger steeti ekwuola na ụgbọala tanker mmanụ gbara ọkụ n’ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025 gburu mmadụ iri asaa na asaa (77) ma merụọ mmadụ iri abụọ na ise (25) ahụ tinyere ndị ọrụ gbatagbata.
Ozi anyị nwetara kwuru na mmadụ ndị nwụrụ anwụ gụnyere otu nwaanyị dị ime.
Ụgbọala tanker ahụ nwere ihe mberede okporoụzọ mana ọ bụzi oge ndị bi na mpaghara ahụ gara ikuru mmanụ ụgbọala ka ọ gbara ọkụ.
Ngalaba ụlọorụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata ekwuola na mmadụ ndị merụrụ ahụ na-anara ọgwụgwọ ugbua n’ụlọogwụ ndị dị nso ebe ahụ.
Cheta na ụgbọala tanker mmanụ nwere ihe mberede izuụka abụọ gara aga, gbaa ọkụ ma gbuo opekatampe mmadụ ise na Delta steeti.
Ọ bụ n’ọnwa Ọktoba afọ 2024 ka ụgbọala tanker mmanụ gburu mmadụ karịrị otu narị na iri ise (150) oge ọ gbara ọkụ na Jigawa steeti.
N’otu aka ahụ, ụgbọala tanker mmanụ gbakwara ọkụ n’ọnwa Septemba afọ 2024 ma gbuo mmadụ iri anọ na asatọ (48) na Niger steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Praịm Minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na agaghị akwụsị ịkwa mgbọ na Gaza ruo mgbe ndị Hamas ga-ewepụta aha ndị ha ji eji ha na-akwado ịtọhapụ na-agba nke mbụ.
Ozi Hamas wepụtara kwuru na ọ bụ nsogbu teknụzụ na-adọghachi ha azụ ibipụta aha mmadụ ndị ahụ.
Nkwekọrita ịkwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti Izrel na Hamas kwuru na a ga-ebipụta aha mmadụ ndị ahụ n’ime otu mkpụrụ ụbọchị tupu ụbọchị a ga-agbanwerịta ndị e ji eji. Ọ bụ n’ụbọchị taa bụ Sọnde 19 Jenụwarị 2025 ka e kwuru mgbanwerịta ndị e ji eji nke mbụ ga-adị.
Ozi anyị nwetara kwuru na ọ bụ mgbe ọ ga-eji ọkara gaa elekere isii nke uhuruchi taa (06:30 GMT) ka nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ kwesịrị ịmalite.
Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo na nke taa bụ 19 Jenụwarị 2025.
Chinonso Ugorji akwụrụla chịm ụgbụa iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Michael Ilediagu ga-emecha sonyere ya.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị...

Ebe foto si, Getty Images
Otu ụgbọala tanker bu mmanụ agbaala ọkụ, gbuo ọtụtụ mmadụ ma merụọ ndị ọzọ ahụ na Niger steeti.
Njinji ahụ jiri n’ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025 na Dikko Junction dị n’okporoụzọ si Abuja gawa Kaduna.
Ozi anyị nwetara kwuru na ụgbọala tanker ahụ nwere ihe mberede okporoụzọ mana oge ndị bi na mpaghara ahụ gara iku mmanụ ụgbọala ka ọ gbara ọkụ.
Ozi ahụ kwuru na ọkụ gbagburu ọtụtụ mmadụ ebe ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images
TikTok ekwuola na a ga-amanye ya 'ịgba ọchịchịrị' na mba Amerịka n’ụbọchị Sọnde 19 Jenụwarị 2025, ma gọọmentị etinyeghị aka tupu iwu mmachi amalite.
O kwupụtara n’abalị Fraịde na White House na Ngalaba ikpe ziri ezi enyebeghị nkọwa doro anya na mmesi obi ike dị mkpa ime ka TikTok nọrọ.
O kwuru na ọ gwụla ma gọọmentị ọ banyere ozugbo kwee nkwa na TikTok agaghị ata ya ahụhụ maka imebi mmachibido iwu ahụ na-abịa.
Nkwupụta TikTok a na-esote mkpebi ụlọikpe kachasị elu na Fraịde nke kwadoro iwu machibido ahụ na mba Amerịka.

Ebe foto si, Screenshot
Ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha achọtala egbe n’ụlọ ahụ a wakporo ndị ọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ma gbuo otu n’ime ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru nke a n’ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025 n’ozi o mere ka o ruo BBC Igbo aka.
Dịka o siri kwuo, ndị uweojii Anambra steeti wuchiri n’ụlọ ahụ dị na Number 1 Ekwutife Close, Ifite n’ụtụtụ ụbọchị Fraịde 17 Jenụwarị 2025, nwụchie otu onye ma chọta otu egbe pump action.
O kwukwara na adọnyela ozu onye ọrụ EFCC ahụ e gburu egbu n’ọbaozu ebe onye nke ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọogwụ ugbua.
Ka o sinadị, ọ sịrị na ha amalitela ime nnyocha gbasara okwu ahụ dịka ha ga-eme ka anyị mara ihe ndị ha chọpụtara.
Cheta na akụkọ fesara ebe niile n’ụbọchị Fraịde 17 Jenụwarị 2025 gbasara etu ndị a na-enyo enyo na ha bụ ụmụ yahoo yahoo siri gbuo otu onye EFCC ma merụọ ndị ọzọ ahụ oge ha gara ịnwụchi mmadụ n’isi obodo Anambra steeti bụ Awka.