Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etinyela ụtụisi ọhụrụ
na ngwaahịa niile e si na mba atọ gụnyere Chaịna, Meziko na Kanada bụ ha na ha kachasị
azụkọ ahịa.
Trump kwuru
na ụtụisi ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Tuzde, nke bụ pasentị 25% n’isi mba
Kanada na Meziko, tinyekwuru pasentị 10% n’isi mba Chaịna.
O kwuru na ụtụisi
ọhụrụ a ga-adị ire ma ọ bụrụ na mba atọ ndị a elebeghị anya na mkpesa ya
banyere ịbata Amerịka n’ụzọ iwu na-akwadoghi nakwa ihe banyere ịtụ mgbere ọgwụike.
Mba Kanada
na Meziko kwuru na ha na-akwado itinye ụtụisi n’elu ngwaahịa ndị si Amerịka abata
obodo ha.
N’afọ gara
aga, ngwaahịa ndị si mba ndị a mejupụtara pasentị 40% na ngwaahịa ndị e
bubatara na mba Amerịka.
Trump hụtara
ntụkwasị ụtụisi a dịka ụzọ ọ ga-eji wulite akụnaụba mba Amerịka, chekwaa ọrụ ma
wulite ego a na-anata n’ụtụisi si n’aka mba ndị agbataobi ha.
Ndị ọkachamaara n’akụnaụba kwuru na nke a nwereike itinye akụnaụba
mba Kanada na Mexico na nsogbu nke nwereike imetụta mba azụmaahịa mbaụwa.
Onyeisiala mba Meziko bụ Claudia Sheinbaum sị na ọ gwala minister
na-ahụ maka akụnaụba ka o were otu aka ahụ tinyekwa ụtụisi na ngwaahịa si Amerịka
abata mba ha.
Praịm minister mba Kanada bụ Justin Trudeau azaghachịla site
n’iti ụtụisi pasentị 25% na ngwaahịa ndị si mba Amerịka abata na Kanada.
Trudeau onye kwuru n’ọnwa gara aga na ọ ga-agba arụkwaghịm,
sị na Trump ekewaala mba abụọ a nwere ezi mmekọ kamgbe ọtụtụ afọ.
N’otu aka ahụ ụfọdụ ndị bi na Toronto dị na Kanada kwuru na
Trump na-eleghara mmekọrịta dị n’etiti Amerịka na Kanada anya.
N’ime izuụka abụọ Trump banyere n’ọchịchị nke ugboro abụọ, ọ
na-agbanwegharị atụmatụ akụnaụba mba Amerịka na mmekọrịta ha na mb ndị ọzọ.