Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump arụọla ogbo ya nke Yukren bụ Volodymyr Zelensky aka
maka ikwu na akpọghị ha oku isonye na mkparịtaụka mere na Saụdị Arebịa maka ịkwụsị
agha ha na Rọshịa.
O kwuru na ọ
tụrụ ya n’anya n’ihe Yukren kwuru ma taa ha ụta maka ịmalite agha ahụ, sị na ha
kaara enwe nkwekọrịta n’oge ahụ.
Mwakpo
zuruoke mba Rọshịa wakporo Yukren bụ ihe malitere agha ahụ kamgbe afọ atọ gara
aga.
N’ụbọchị Tuzde, Sergei Lavrov bụ minister mba Rọshịa na-ahụ
maka mmekọrịta ha na mba ọzọ na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio nwere
mkparịtaụka n’ihu n’ihu n amba Saụdi Arebịa.
Ha kwekọrịtara ịhọpụ otu ga-enwe mkparịtaụka banyere etu a ga-esi
kwụsị agha ahụ.
Lavrov kwuru na ha agaghị anabata ka enwee ndịagha udo si n’otu
Nato ga-agba ụkwụ na mba Yukren n’oge a na-akpa nkata ime udo, dịka ndị ndu mba
Yurope si kwuo site n’ọgbakọ pụrụiche ha nwere.
Ndị ndu mba Yurope na-akwado Yukren n’agha ahụ na-ahụta na
Amerịka gbahapụrụ n’isonye na mkparịtaụka ụdọ ahụ ya na Rọshịa na-enwe banyere
agha a.
Mgbe a jụrụ Trump ebumnobi banyere Yukren kwuru na a gbahapụrụ
ha na mkparịtaụka ahụ, o kwuru sị “ m nụrụ na obi adịghị ha mma maka na e
nyeghi ha oche, e nyere oche kamgbe afọ atọ ma karịa. A kaara ikwubi okwu ahụ na-egbughi
oge ọbụla.
“Ị garaghị ebido ya, ị kaara ịnabata nkwekọrịta udo, nke
gaara enyeghachị ha ọtụtụ ala ndị ahụ.
Na ngwụcha mkparịtaụka ahụ, Trump kwuru na obi juru ya afọ
na o nwereike ịkwụsị agha ahụ.