You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndị uweojii anwụchiela onye a na-enyo enyo na-ekesa ozi iyi egwu ụgha n’Imo Steeti

    Ndị uweojii Imo steeti anwụchila otu nwoke a sị na aka ya dị na-ikesa ozi iyi egwu n’ Umuoba dị n’Irete nke steeti ahụ.

    Ozi si n’aka ọnu na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Okoye Henry kwuru na ozi ụgha a nke kwuru na ndị ọchịehi ga-awakpo obodo ahụ nwetara ọgbaghara n'etiti ndị obodo ma mee ka ndị uweojii malite ime nnyocha.

    Nwoke ahụ aha ya bụ Chidi Emma Azonibe gbara afọ iri atọ na ise (35) bụ nwaamala Umuelele dị n’Irete, kwetara na ọ bụ ya na-ekesa ozi ahụ.

    Azonibe kwuru na ọ bụ onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ijeoma nke ụlọụka Assembly Church Irete depụtara ozi ahụ ma gwa ya na nwanne ya nwoke bụ Amanea ka ha kesaara ya ndị obodo.

    Azonibe kọwara na onye amụma nwaanyị ahụ gwara ya na ọ natara ozi nkpuhe site n’aka Chineke na ndị ọchịehi na-achọ ịwakpo Irete nke mere o jiri dee ozi iji mee ka ndị mmadụ mara.

    Henry kwuru na ndị uweojii na-agba mbọ ka ha nwụchie onye amụma nwaanyị ahụ na ndị ọzọ a na-enyo enyo gbara ọsọ.

    O kwuru na ndị uweojii ka na-enyocha nwoke ahụ ma kwuo na a ga-akpọpụ ya ụlọikpe ngwangwa ha mechara nnyocha.

  2. Nkwụsị enyemaka mba Amerịka emetụtala ọrụ enyemaka mmadụ na DR Kongo - UN

    Onyeisi ụlọọrụ United Nations na DR Kongo bụ Bruno Lemarquis, ekwuola na nkwusị mba Amerịka kwụsịrị inyere mbaụwa aka emetụtala ọrụ enyemaka na mba Kongo ebe a na-anụ ọgụ.

    Bruno Lemarquis gwara ndị ntaakụkọ na DR Kongo bụ ndị kachasị nweta enyemaka mba Amerịka n'afọ garaaga dịka ha nwetara enyemaka ruru pasenti 70 n'enyemaka mba Afrika sitere n'isi obodo Amerịka bụ Washington.

    O kwuru na atụmatụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ịkwụsị enyemaka mba Amerịka na-enye mbaụwa bụzi nnukwu ihe nchegbu.

    Nkwụsị enyemaka mmadụ a na-abịa dịka ọgbaghara dị n’etiti otu nnupụisi M23 nke a sị na mba Rwanda na-akwado na ndịagha DR Kongo na-akawanye njọ ugbua.

    E kwuru na ọgụ achụpụla ihe ruru mmadụ narị puku asaa ndị ọzọ (700,000) n’ụlọ ha ebe ọtutụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

  3. A malitela atụmatụ ịnwụchi onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego na Gana maka ebubo nrụrụaka ego

    Ụlọọrụ Ghanaian Special Prosecutor's Office, ekwuola na ha amalitela atụmatụ ịnwụchi Ken Ofori-Atta bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego maka ebubo nrụrụaka ego na mba Gana.

    E kwuru na a na-eme nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere ebubo kwuru na Ken Ofori-Atta mefuru ego ruru nde dọla iri ise na asatọ ($50 million) iji rụọ ụlọokpukperechi alakụba kachsị na Gana nke ụfọdụ kwuru na enweghị uru ọbụla ọ bara.

    Onyeisi ndị na-eme nnyocha ahụ bụ Kissi Agyabeng kwuru Ken Ofori-Atta gbara ọsọ gbaga mba ọzọ iji gbanarị nwụchi ma kwuo na a gwala ụbọchị o kwesịrị ilaghachita mba Gana bịa zara ọnụ ya n’ebubo ndị ahụ e boro ya.

    O kwuru na ọ bụrụ na ọ laghachitaghị, na gọọmenti ga-aga n’ihu malite atụmatụ ije nwụchie ya ebe ọbụla ọ nọ.

    Ebubo a bụ nke kachsị a na-ebo ọchịchị Akụfọ-Addo nyefere ọchịchị ọkwa ọchịchị n’aka Onyeisiala John Mahama.

  4. Ụjọ ejidela ezinaụlọ ndị a nwuchiri dịka Izrel yiri egwu ịmalite ịkwa mgbọ na Gaza

    Ụjọ ejidela ezinaụlọ ndị Izrel na Gaza e ji eji maka na-ewere ike ịmaliteghachi ịkwa mgbọ na Gaza dịka ndị nchekwa nke mba Izrel kwadoro atụmatụ Onyeisiala mba Amerịka ka atọhapụ ndị eji n’agbụ n’ụbọchị Satọde.

    Ndị Palestine na ezinaụlọ ndị Izrel eji n’agbụ kwuru na ha na-atụ ụjọ na nkwekọrịta ndị Izrel na Hamas nwere maka ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza nwere ike ịda dịka otu nwoke gwara BBC na esemokwu juru na Gaza ugbu a.

    Na nzụkọ nke Onyeisiala Donald Trump kwuru na ọ chọrọ ka mba Amerịka weghaara Gaza, Eze Jordan bụ Abdullah kwupụtara megide ya banyere atụmatụ onyeisiala mba Amerịka ịchụpụ ndị Palestine n’obodo ha.

    Otu nwoke bụ Lotfy Abu Taha kwuru na "obi na-amapụ ha", mgbe ọ pụtara na ọgụ nwere ike ịmaliteghachi na Gaza n'oge na-adịghị anya.

    “Ndị mmadụ na-ata ahụhụ; ndị mmadụ bụ ndị ihe a metụtara”, mana akụkọ si n’aka Onyeisiala Trump, Prịam Mịnịsta Netanyahụ na ndị Hamas emela ka ihe ka njọ.

    Otu nwoke onye Palestine bụ Abdulrahman Al-Habibi kwuru na mba Izrel na Hamas kwesịrị irube isi na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ.

    O kwuru na "Ndị mmadụ na-enwe ihe mgbu na ọrịa, ike a gwụla ndị mmadụ kpamkpam. Ọ dịghị mba nọ n'ụwa nke na-echebe ndị a," nwoke ahụ kwuru.

  5. Ndị nnupụisi awakpola ndịagha DR Kongo abalị abụọ a kwụsịrị ọgụ

    Ndị nnupụisi M23 a sị mba Rụwanda na-akwado, awakpola ndịagha DR Kongo na mpaghara ọdịda Kivu dịka o mere mkpụrụ abalị abụọ a kwụsịrị ịlụ ọgụ.

    Ịtụ mgbọ ogbunigwe malitere n'ụtụtụ Tuzde, abalị atọ ndị ọchịchị ọwụwa na ọdịda anyanwụ kpọrọ oku ka akwụsị ọgụ.

    Ndị nnupụisi weghaara nnukwu ala n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo nke gụnyere isi obodo Goma.

    Ndị nnupụisi ahụ na-aga ugbua na Bukavu, obodo dị n’ọdịda anyanwụ Kivu bụ obodo ọzọ dị mkpa na mpaghara ahụ.

    Ọnụọgụ ụlọọrụ United Nations wepụtara gosiri na e gbuola ihe ruru mmadụ puku abụọ na narị itoolu (2,900), kemgbe ọgụ ahụ bidoro na Jenụwarị 2025.

    E kwuru na a chụpụla ihe ruru mmadụ narị puku asaa ndị ọzọ (700,000) n’ụlọ ha ebe ọtutụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

  6. Ụgwọ oku ekwentị e buliri elu akpaliela iwe na Naịjirịa

    Ndị Naịjirịa na-egosi iwe ha n’ihi ụgwọ oku ekwentị na nke ‘data’ ụfọdụ ụlọorụ ndị na-arọpụta ikuku nziritaozi buliri elu na mba ahụ.

    Ụlọorụ kachasị nwee ndị na-agba ha aka ahịa bụ MTN jiri ogogo atọ bulie ụgwọ a na-akwụ maka data ha na-enye ndị ahịa ha kwa izu. Ụlọorụ nke ọzọ a ma ama bụ Airtel bulikwara nke ha.

    A tụrụ anya na ha ga-ebuli ọnụego ha oge ụlọorụ na-ahụ maka nziritaozi kwadoro ka ha gbakwunye ego n’ụgwọ ndị ha na-ana.

    Mana ozi ụlọorụ ahụ wepụtara izuụka atọ gara aga kwuru na ọ bụ mgbakwunye 50% ka ha kwadoro.

    Ụlọorụ ndị ahụ chọrọ ibugolite ego ha na-akpatara onwe ha iji nwee ike zute ihe ịmaaka nke ngwaahịa na-arị elu.

    Ụmụafọ Naịjirịa na-agabiga ọnọdụ ihe isiike ahụtụbeghị ụdị ya mbụ kemgbe afọ iri dịka mgbakwunye na ngwaahịa ọbụla na-eme ka ọnọdụ ahụ kakwuoro ha njọ.

    Na nzaghachi, MTN depụtara n’akara ọbaozi X ha sị na ọnụego ahụ ha buliri elu dị ezigbo mkpa iji nye ndị na-agba ha aka ahịa ihe niile ha chọrọ.

  7. Izrel sị ha ga-amalite ịkwa mgbọ ma Hamas atọpụghị ndị ha ji n’agbụ n’ụbọchị Satọde

    Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu adọọla Hamas aka na ntị na ha ga-amalite ibu agha kpụ ọkụ n’ọnụ ọ bụrụ ma ha ahapụghị ndị ha ji eji n’etiti ụbọchị Satọde.

    Netanyahu sị na ya enyela iwu ka ndịagha Izrel were ọnọdụ n’ime Gaza nakwa n’akụkụ obodo ahụ niile iji zasoo okwu ahụ Hamas kwuru na ha eyigharịala ụbọchị a ga-atọhapụ ndị Izrel fọrọ afọ ha ji n’agbụ.

    Benjamin Netanyahu emeghị ka a mara ma ọ na-akpọ oku ka a tọhapụ ozugbo mmadụ iri asaa na isii (76) fọrọ ndị Hamas n’aka ka ọ bụ naanị mmadụ atọ ndị otu ahụ kwere nkwa ịtọhapụ n’ụbọchị Satọde.

    Hamas azaghachila ma kwuo na ha dị njikere irube isi na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ mana ọ bụ Izrel mere “ha ji adọghachi aka elekere azụ”.

    Otu ndị Palestine ahụ boro Izrel ebubo ịmetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ ga-adị izuụka atọ site n’igbochiri ha enyemaka ndị dị oke mkpa, mana Izrel kwuru na nke ahụ bụ asị.

  8. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi, Ka Afọ taa fọtara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji ezigbo ọṅụ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke ụbọchị taa bụ Wenezde 12 Febụwarị 2025.

    Adline Okere na Chinonso Ugorji eburula oche iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche taa. Mana echefula na Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  9. Ndị uweojii n’Enugwu steeti agọọla na ọbụghị ha tigburu Nnaemeka Ugwu

    Ndị uweojii n’Enugwu steeti agọọla agụgọ sị na ọbụghị ha tigburu nwata nwoke a na-akpọ Nnaemeka Ugwu bụ onye Umuezejor n’Obollo-Afor, n’okpruruọchịchị Udenu n’Enugwu steeti.

    N’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe weputara ka ha nọ kọwaa etu Nnaemeka Ugwu si nwụọ.

    N’akwụkwọ ọzị ahụ ndị uweojii kwuru na “enweghị mgbe a wuchiri Nnaemeka maọbụ tie ya ihe, maọbụ gbuo ya n’ụlọọrụ ndị uweojii”.

    Ha kọwara na etu ihe ahụ si bido bụ na “ndị uweojii jidere nwoke aha ya bụ Jerry Uche dị afọ iri abụọ na asaa maka ebubo izu ohi na ire ọgbatumtum e zuru n’ohi”.

    “Nyocha ndị uweojii mere ka e ji nwuchie mmadụ atọ ndị ọzọ aha ha bụ Emenike Ezugwu, Omeje Chidera na Omeje Obinna”.

    “Ọ bụ oge ahụ ka e nwetere egbe, mgbọ egbe nakwa ọgwụike dịka mkpụrụ mmiri na ihe ndị ọzọ”.

    “Ha sị na ọ bụ mgbe ndị uweojii jidere onye a na-akpọ Uroko Ifeanyi Moses bụ onye kwetere na aka ya dị n’izu ohi ọgbatumtum ndị ahụ. Nke ahụ mere ha ji wuchie nwunye Nnaemeka bụ Ngozi Nnaemeka maka okwu ahụ”.

    “N'ọnwa Febuwarị 7, 2025 ka Nnaemeka Ugwu na nwoke aha ya bụ Onyemaechi bịara n’ụlọọrụ ndịuweoji maka ịgbapụta nwunye ya”. Mana ọ bụ oge ahụ ka Nnaemeka dara n’ala, e buru ya gaa n’ụlọọgwụ bụ ebe dọkịnta nọ sị na ọ nwụọla. E bugara ozu ya n’ọba ozu nakwa ebe a ga-eme nyocha mara ihe gburu ya”.

    Kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu zigara ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ Nnaemeka ma gwa ndị obodo ya nakwa ụmụ ntorobịa ka ha hara ibute ọgbaaghara na mpaghara ahụ.

  10. Onyeisi ndị uweojii adọọla ndị uweojii aka na nti maka ịmetọ ikike ụmụ Naịjirịa

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun adọọla ndị uweojii na Naịjirịa gbaa gburu gburu aka na nti banyere ịmetọ ikike ọhanaeze nakwa itinye aka na mpụ ọbụla.

    Egbetokun kwuru na o nwetela ọtụtụ mkpesa banyere etu ndị uweojii si emetọ ikike ma kwuo na ntaramaahụhụ ga-adịrị onye uweojii ọbụla e jidere na-emetọ ikike mmadụ maọbụ tinye aka na mpụ ọbụla.

    N’akwụkwọozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi wepụtara, Egbetokun gwara ndị uweojii ka na-enyi uwe ndị uweojii oge ọbụla ha nọ ọrụ ma kwuo na iwu megidere onye uweojii ọbụla iyi uwe na-abụghị uwe ndị uweojii rụọ ọrụ.

    O kwuru mkpa ọ dị ka ndị uweojii jikọọ aka ọnụ iji gbochie ihe ọbụla nwereike inweta ajọ aha nye ndị uweojii.

  11. Etu e si nwụchie mmadụ atọ maka ohi mmanụ agbịdị

    Otu ọrụ nchekwa 'Nigeria Security and Civil Defence Corps'(NSCDC) n' Abia Steeti anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo maka izu mmanụ agbịdị Umuowaga Umuelechi Obuzo Asa dị n'Okpuru Ọchịchị Ukwa West n'Abịa Steeti.

    Ndị aka kpaara gụnyere otu nwoke a kpọrọ Oscar Eteobong gbara afọ 37,onye Okpuru Ọchịchị Abak , Issac Aniete Edemba Udoh gbara afọ 40, onye Okpuru Ọchịchị Obot Akara dị n'n Akwa Ibom Steeti nakwa Emmanuel Uzoma Sunday (M) gbara afọ 20, onye Isiala-Ngwa North dị n' Abia Steeti. team.

    Ngalaba ụlọọrụ ahụ na-ebu agha mmegide ohi mmanụ agbịdị kwuru na ọ bụ ama gbaara ha mere ha jiri maa imi n'ala ma chọpụta mmanụ agbịdị ha zur n'ebe ọ dị ukwuu.

    Onyeisi NSCDC ngalaba nke Abia Steeti bụ Akinsola Aderemi kwuru na ha na-eme nnyocha ịmata ndị ọzọ aka ha dị na mpụ itinyere Naijiria aja na garị.

  12. Ndị uweojii anwụchiela nwaagbọghọ a sị na-ere ụmụaka n’Imo steeti

    Ụlọọrụ ndị uweojii n’Imo steeti anwụchiela onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye na-atọ ma na-erekwa ụmụaka.

    Nwaagbọghọ ahụ gbara afọ iri anọ (40) aha ya bụ Onyinyechi Emeka bụ nwaafọ Umuokwu Mbutu dị n’Okpuru ọchịchị Isiala Ngwa South n’Abịa steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Mọnde 10 Febụwarị 2025.

    Okoye sịrị na ndị uweojii nwụchiri nwaada ahụ n’Okigwe oge ọ kpọ nwata gbara afọ ise o zuru n’ohi na-aga Ebonyi steeti.

    “Na mbụ, nwaagbọghọ ahụ kwuru na ya bụ nwata nwoke bụ nwa nwanne ya nwaanyị mana anyị malitere inyo ya enyo oge o bidoro na-atagheri ọnụ,” ka Okoye kwuru.

    Ọ sịrị na nwata ahụ nyere ha akara ekwentị nna ya bụ nke mere e ji chọpụta na ọ bụ nwata na-efu efu n’Abịa steeti.

    Ozi ahụ kwuru na nnyocha ndị uweojii chọpụtara na a kwụrụ ya bụ nwaagbọghọ puku naịra iri atọ (30,000) iji kpọgaa nwata ahụ na nke onye chọrọ ịzụ ya n’Ebonyi steeti.

    Ka o sinadị, e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka ndị omekome maka ime nnyocha miri emi nakwa inwụchi ndị nke ọzọ aka ha dị n’arụ ahụ.

  13. Agadị nwaanyị agbaala ọnụ ụbọchị 134 iji kpọọ oku ka a tọhapụ nwa ya nwoke n’Ijipt

    Otu onye nne dowere onwe ya agụụ kemgbe ụbọchị otu narị na iri atọ na anọ (134) iji kpọo oku ka a tọhapụ nwa ya nwoke e ji eji n’ụlọmkpọrọ Ijipt agwala Praịm Minista Briten bụ Keir Starmer ka ọ gaa n’ihu na-akpọ oku maka ntọhapụ nwa ya nwoke ọ bụrụ ma ya nwụọ “n’ime ụbọchị ndị na-abịa abịa”.

    Nwaokorobịa ahụ na-akpọ oku maka ọchịchị onye kwuo uche ya bụ Alaa Abdel Fattah, onye bụ nwaafọ Briten na Ijipt anọzuola oge ya n’ụlọmkpọrọ kemgbe ọnwa Septemba 2024 mana a ka ji ya eji.

    Nne ya bụ Laila Soueif enwebeghị ihe ọbụla o riri kemgbe ụbọchị otu narị na iri atọ na anọ (134) ewezuga mmiri mgbọrọgwụ, kọfị ojii na mmiri nnu.

    Oge ọ na-ekwu okwu na Downing Street, agadị nwaanyị ahụ gbara afọ iri isii na asatọ (68) kwuru na ụjọ na-atụ ya na ya enweghịzi oge iji hụ na a tọhapụrụ nwa ya nwoke.

    Ọ kpọkuru Praịm Minister UK bụ Keir Starmer ka o nyere ya aka.

    Ka o sinadị, ọnụ na-ekwuru gọọmenti sịrị na ndị minista “na-agbasi mbọ ike gbasara okwu nwaamadị ahụ”.

  14. Anyị ga-eyigharị ụbọchị a ga-atọhapụ ndị Izrel e ji eji - Hamas

    Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Hamas ekwuola na ndị otu ahụ ga-agbatị oge ha ga-eji tọhapụ ndị Izrel ha ji eji ma kwuo na nke ahụ bụ n’ihi na Izrel nupụrụ isi na nkekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    E kwesịrị ịtọhapụ mmadụ atọ e ji eji na Gaza n’ụbọchị Satọde iji gbanwerịta ọtụtụ ndị Palestine a tụrụ mkpọrọ n’Izrel.

    Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel bụ Israel Katz ekwuola na ozi ahụ si n’aka ndị Hamas bụ ‘mmetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ”.

    Otu onye a ma ama na-akwado Izrel bụ Donald Trump ekwuola ka akagbuo nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ ọ bụrụ na “agaghị atọhapụ mmadụ niile e ji eji na Gaza n’ụbọchị Satọde”.

    “Aga m asị na e kwesịrị ịtọhapụ ha n’elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị na Satọde... ha niile, ọ bụghị a tọhapụ ụfọdụ a ghara ụfọdụ maọbụ a tọhapụ otu taa, echi a tohapụ abụọ maọbụ atọ,” ka Trump kwuru.

    Ka o sinadị, ọ sịrị “Ana m ekwu maka onwe m. Izrel nwere ikike ime ihe dị ha mma.”

    Ụmụafọ Izrel iri asaa na atọ (73) e jichiri oge Hamas wakporo Izrel n’abalị 7 Ọktoba 2023 tinyere atọ ndị nke ọzọ ha jichiri afọ iri gara aga ka nọ na Gaza.

  15. Ụnụ asaala chi, ụmụ Igbo, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke taa bụ Tuzde 11 Febụwarị 2025.

    Adline Okere na Chinonso Ugorji awuchiela iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị!

  16. Ndịagha mba Sudan amalitela atụmatụ ihiwe gọọmenti ọhụrụ

    Ndịagha mba Sudan ekwuola na ha amalitela ịkpọ oku maka nkwado maka gọọmenti ọhụrụ ha chọrọ ihiwe ngwangwa ha napụrụ ndịagha nnupuisi ikike n’isi obodo ha bụ Khartoum.

    Cheta na ndịagha Sudan kwuru na ha na-enweta mmeri n’aka ndịagha nnupuisi Rapid Support Forces (RSF) n’ime izuụka ole na ole gara aga.

    Onyeisi ndịagha bụ Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan gwara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ndịagha na ya na praịm mịnịsta ọ chọrọ ihiwe gọọmenti ọ kpọrọ ‘technacratic’.

    Ọgụ adịla n’etiti ndịagha mba Sudan na ndịagha RFS kemgbe afọ abụọ nke mere ka mmadụ ruru nde iri na abụọ (12million) gbapụ n’ụlọ ha ma ghara inwe nri oriri.

    Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan mere ka o doo anya na ha na ndịagha RSF agahị enwe nkwekọrịta ọbụla

  17. Donald Trump ga-etinye ụtụisi na ngwaahịa steel na aluminium

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya ga-ekwuputa ụtụisi 25% maka akụrụngwa steel na aluminium a ga-atụbata n’Amerịka.

    Dịka e siri kwuo, atụmatụ a bụ nke ga-akachasị emetụta mba Kanada.

    Trump sịkwara na ya ga-ekwuputa gbasara itinye ụtụisi iji megwara mba ndị tinyere ụtụisi na ngwaahịa ha si Amerịka tụbata na mba ha.

    “Ọ bụrụ ma ha tinyere anyị ego, anyị e tinyekwara ha ego,” ka Trump kwuru.

    Kanada na Meziko bụ mba abụọ kachasị atụbata steel n’Amerịka ebe Kanada kachasị atụbata aluminium na mba ahụ.

    N’oge ọchịchị nke mbụ ya, Trump tinyere ụtụisi 25% maka steel ndị a tụbatara n’Amerịka ma tinyekwa ụtụisi 10% maka aluminium e si Kanada, Meziko na mba ndị European Union tụbata n’Amerịka.

  18. A chọtala ozu ndị mbịarambịa n’ime nnukwu ili e gwuru na Lybia

    Nnukwu Ọkaikpe mba Libịa ekwuola na a chọtara opekatampe ozu ndị mbịarambịa iri abụọ na asatọ (28) n’ime nnukwu ili e liri ọtutụ mmadụ n’ime ya n’okeọhịa dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    A chọpụtara ili ahụ na mpaghara ugwu nke obodo Kufra n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole a chọpụtachara nnukwu ili ozu mmadụ iri na itoolu (19) dị n’ime ya n’otu ugbo dịkwa n’obodo ahụ.

    Ụlọorụ Nnukwu Ọkaikpe Libịa depụtara n’ọbaozi Facebook ha sị na ndị ọchịchị chọpụtara ili ọhụrụ ahụ n’isochi mwakpo ha mere ebe e ji mmadụ atụ mgbere bụkwanụ ebe a nọọrọ tọghapụ ndị mbịarambịa iri asaa na isii (76) e jichiri ma na-akpagbu.

    Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na a nwụchiela otu nwaafọ Libịa na ndị mbịarambịa abụọ gbasara arụ ahụ.

  19. Igbo bụ Igbo ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ nke onye chiri, ya zere!

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị maka akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche taa.

  20. Sam Nujoma bụ Onyeisiala mbụ na mba Namibia anwụọla ka ọ gbara afọ 95

    Onyeisiala nke mbụ na mba Namibia bụ Sam Nujoma anwụọla. Sam Nuhoma nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri itoolu na ise.

    SAm Nujoma nwụrụ n’isi obodo Windhoek, dị na Namibia.

    Sam Nujoma bụ onye ndu otu a na-akpọ Namibia's liberation movement a makwara n’afọ 1960 dịka South West Peoples' Organisation (Swapo).

    Ọ bụ otu ahụ zọtara ị si na mba Saụt Afrịka kewapụta mba Namibia n’afọ 1990.

    Ozi Onyeisiala mba Namibia bụ Bangolo Mbumba zipuru mere ka a mata na Nujoma dara n’ọrịa n'izu ụka atọ garaaga bụ nke e jiri buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ.

    Bangolo sị na mgbe mba Namibia zọtara nwere onwe ha n’afọ 1990, Nujoma chiri mba Namibia bido n’afọ 1990 ruo n’afọ 2005 dịka Onyeisiala.

    Onyeisiala Mbumba kwuru na “Nujoma bụ onye bunitere mmụọ ha ị bụ ndị amaala mba Namibia”.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kọwara Nujoma dịka “onye a maa ama na-azọ nwere onwe pụrụiche” ma bụrụkwa onye so lụọ ọgụ ka ọchịchị ndị ọcha kwụsị na mba Saụt Afrịka.