Ndị uweojii anwụchiela onye a na-enyo enyo na-ekesa ozi iyi egwu ụgha n’Imo Steeti
Ndị uweojii Imo steeti anwụchila otu nwoke a sị na aka ya dị na-ikesa ozi iyi egwu n’ Umuoba dị n’Irete nke steeti ahụ.
Ozi si n’aka ọnu na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Okoye Henry kwuru na ozi ụgha a nke kwuru na ndị ọchịehi ga-awakpo obodo ahụ nwetara ọgbaghara n'etiti ndị obodo ma mee ka ndị uweojii malite ime nnyocha.
Nwoke ahụ aha ya bụ Chidi Emma Azonibe gbara afọ iri atọ na ise (35) bụ nwaamala Umuelele dị n’Irete, kwetara na ọ bụ ya na-ekesa ozi ahụ.
Azonibe kwuru na ọ bụ onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ijeoma nke ụlọụka Assembly Church Irete depụtara ozi ahụ ma gwa ya na nwanne ya nwoke bụ Amanea ka ha kesaara ya ndị obodo.
Azonibe kọwara na onye amụma nwaanyị ahụ gwara ya na ọ natara ozi nkpuhe site n’aka Chineke na ndị ọchịehi na-achọ ịwakpo Irete nke mere o jiri dee ozi iji mee ka ndị mmadụ mara.
Henry kwuru na ndị uweojii na-agba mbọ ka ha nwụchie onye amụma nwaanyị ahụ na ndị ọzọ a na-enyo enyo gbara ọsọ.
O kwuru na ndị uweojii ka na-enyocha nwoke ahụ ma kwuo na a ga-akpọpụ ya ụlọikpe ngwangwa ha mechara nnyocha.