You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ọkụ agbagbuola ụmụakwkwọ 17 na Zamfara Steeti

    Ihe ruru ụmụakwụkwọ 17 anwụọla n’ọkụ gbara ụlọakwụkwọ alakụba dị na Zamfara steeti.

    Ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ ka akụkọ kwuru na e bugara ụlọọgwụ dị n’obodo Kauran Namoda maka nleta.

    A na-ekwu na ọkụ ahụ malitere n’otu ụlọ dị n’akụkụ ụlọakwụkwọ n’abalị Tozde 4 Febụwarị ma gbagbuo ụmụakwụkwọ ahụ oge ha na-arahụ ụra.

    E zigara ọtụtụ ndị ọrụ gbatagbata n’ụlọakwụkwọ ahụ ngwangwa e wetara ozi banyere ọdachi.

    Otu onye hụrụ oge ihe ahụ mere bụ Yahaya Mahi gwara BBC na ebe ụlọakwụkwọ ahụ dị gbochiri ndị gbatara ọsọ ịgbanyụ ọkụ ahụ.

    O kwuru na “ Ọ bụrụ na ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ bịara, ha agaghị enweike ịgbanyụ ọkụ ahụ maka na ụzọ adịghị ebe ụlọakwụkwọ ahụ dị.

    Onye ọchịchị ime obodo bụ Mannir Haidara kwuru na ha ga-eme nnyocha iji hụ na ụlọakwụkwọ alakụba ndị ọzọ dị na steeti agaghị enwee ụdịrị ọdachi a.

    Otu nna nwa ya gbara ọkụ kwuru na obi gbawara ya ma kwuo na ọ bụ naanị chukwu ka ọ tụkwasịrị obi.

  2. Mba UK enyela ndị Yukren gbara ọsọ ndụ ohere itinye akwụkwọ maka ịgbatị oge visa ha

    Mba UK enyela ihe ruru mmadụ narị atọ (300) gbara ọsọ ndụ mgbe agha malitere na Yukren ohere itinye akwụkwọ maka ịgbatị oge visa ha.

    Ọkwa ndị ọchịchị mara kwuru na, ndị Yukren bi n’UK gbara ọsọ ndụ nwere ike ịmalite itinye akwụkwọ ha n’ụlọọrụ a na-akpọ Ukrainian Permission Extension (UPE).

    Swindon Borough Council kwuru na ọ ga-akpọtụrụ ndị a ma ama bi n’UK bụ ndị ruru ogo irita uru atụmatụ a, ka e nwee nyere ha aka ịgbatị oge obibi ha n’UK.

    E kwuru na mgbatị oge visa a ga-eme ka ndị Yukren gbara ọsọ ndụ nwere nweta ọnwa iri na asatọ ọzọ, mana ha ga-etinyerịrị akwụkwọ n'ime mkpụrụ abalị iri abụọ na asatọ nke visa ha ugbu a gwụrụ.

    O kwukwara na a ga-akpọ ihe ruru ndị Yukren mmadụ otu narị na iri asaa na abụọ (172) bi n’ulọ nke ha na Swindon maka ịgbatị obibi ha, ya na mmadụ otu narị na iri na abụọ ndị ọzọ bi na Homes for Ukraine Scheme.

  3. Ndị Palestine, Ijigpt, UK, Saudi na mba ndị ọzọ akatọla atụmatụ Trump ka mba Amerịka weghara Gaza

    Ndị Palestine, Ijigpt, UK, Saudi Arabia na mba ndị ọzọ akatọla atụmatụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ime ka Amerịka weghara ọnọdụ na Gaza.

    Donald Trump kwuru na ya chọrọ ka US were ọnọdụ ogologo oge na Gaza ma tụgharịa ya ka ọ bụrụ "Riviera nke mpaghara Middle East".

    O kwuru na mba Amerịka ga-ahụ na ebigharịrị ndị Gaza ebe ọzọ ma na ndị ọchịchị ha kwuru mba.

    Ndị Hamas kwuru na-atụmatụ a bụ “ihe na-ekwesighị ekwesi” ebe ndị ọchịchị Palestine kwuru na ha agaghị ebigharị ebe ndị nkịtị nọ na Gaza gwara BBC na ebe ahụ bụ ala ha.

    N’aka nke ọzọ, mba UK kwuru ka a hapụ ndị Palestine ka ha “biri ma na-eme nke ọma” n’obodo ha, ebe ndị Ijigpt kwuru na e kwesịrị ịrụgharịa Gaza na-achọpụghị ndị ya.

    Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer kwuru na “a ga-ahapụ ndị Palestine ka ha wughachi obodo ha mana anyị kwesịkwara inyere ha aka na nrụgharị ahụ.

  4. Ụgbọala tanka mmanụ abụọ agbaala ọkụ n’Adamawa steeti

    Ụgbọala tanka abụọ bu mmanụ baara ọkụ n’ọdọ mmanụ MRS dị n’okporoụzọ Numan na ncherịtaihu ọdọ mmanụ Jezco dị n’akụkụ ọdọụgbọelu Yola International Airport.

    Ndị njem ahụghị okporoụzọ ha si abanye isi obodo steeti ahụ bụ Yola n’ihi ya bụ njinji jiri n’ụbọchị Tuzde 4 Febụwarị 2025.

    Ozi anyị nwetara kwuru na ọkụ agbariela ha bụ ụgbọala tanka abụọ tupu ndị ọrụ mgbanyụọkụ steeti ahụ awuchie.

    Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbatagbata wụchikwara iji hụ na a gbanyụrụ ya bụ ọkụ ma chekwaa mpaghara ahụ.

  5. A maala mmadụ ise ikpe ọnwụ maka igbu nwaanyị ha boro ebubo ịta amosu

    Ụlọikpe ekwuola ka e were ụdọ kwụgbuo ụmụnwoke ise maka igbu otu agadị nwaanyị ha boro ebubo ịta amosu na Kano steeti n’afọ 2023.

    Ụmụnwoke ahụ a mara ikpe wakporo ma sụgbuo Dahare Abubakar gbara afọ iri isii na asaa (67) oge ọ nọ n’ime ugbo ya.

    Oge ọ na-achabi ikpe ahụ, Ọkaikpe Usman Na’abba kwuru na ụlọikpe chọpụtara na ebubo e boro mmadụ ise ahụ bụ eziokwu.

    Ka o sinadị, Ọkaiwu na-ekwuchitere mmadụ ise ahụ bụ Ma’aruf sịrị na ndị ọ na-anọchite anya ha nwere mkpebi ịga Ụlọikpe Mkpegharị.

  6. A malitela ịnwale ọgwụ mgbochi Ebola na Uganda

    Mba Yuganda amalitela ịnwale ọgwụ mgbochi maka nje ụdịrị ọrịa Ebola si mba Sụdan.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ọrịa Ebola tiwapụrụ na mba ahụ, gbuo otu onye ma fere mmadụ abụọ ndị ọzọ. Onye mbụ butere ya bụ ọrịa ma nwụọ bụ nọọsụ nwoke gbara afọ iri atọ na abụọ (32).

    N’ụbọchị Mọnde 3 Febụwarị 2025 ka a gbara onye mbụ a chọrọ iji nwalee ọgwụ mgbochi ahụ ọnụọgwụ nke mbụ ya.

    Ka ọ dị ugbua, enwebeghị ọgwụ mgbochi a kwadoro maka iji buo agha megide ụdịrị ọrịa Ebola si Sụdan mana ka o sinadị, e nwere otu nke a kwadoro maka ụdịrị Ebola nke si Zaịre bụ nke kachasị kpaa ike na DR Kongo n’oge gara aga.

    Njirimara Ebola gụnyere ahụọkụ, ike ọgwụgwụ, ahụ mgbu, isi ọwụwa na olu mgbu ebe ihe ndị ọzọ na-esochi ha bụ ịgbọ agbọọ, otoro, arụbara na ọbara ịgba mmadụ n’ime ahụ maọbụ n’elu ahụ.

    Mmadụ nwereike ibute ya site na mmekọ ahụ.

  7. Trump chọrọ ka Amerịka were ọnọdụ na Gaza ma nye ndị Palestine ebe ọzọ

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emeela ihe tụrụ ndị Palestine n’anya site n’atụmatụ banyere ọdịnihu obodo Gaza, nke o kwuru na mba Amerịka ga-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ iji nwogharịa ya.

    Nke a bụ atụmatụ kachasị ukwuu mba Amerịka na-enwe banyere mpaghara Middle East kamgbe ọtụtụ afọ.

    Trump kwuru nke a mgbe ya na Praịm Minista mba Isreal bụ Isreal Netanyahu na-eme mgbasaozi n’obi ọchịchị ‘White House’.

    “Amerịka ga-ewere ọnọdụ na Gaza, na-achịkọta ebe ahụ ma kpochapụ ogbunigwe niile e liri ebe ahụ ma mezie ebe niile agha mebiri,” ka Trum kwuru.

    Praịm Minista mba Isrel, Benjamin Netanyahu na nzaghachị gosiri mmasị ya n’ihe Trump kwuru, ma kwuo na ọ ga-agbanwe akụkọ banyere mpaghara ahụ.

    N’okwu ya, “Dịka m si kwuo na mbụ, anyị chọrọ ụzọ ihe atọ, nke atọ bụ ịhụ na obodo Gaza agaghị abụ ihe iyi egwu nye mba Isrel.”

    Mba Saudi Arabia, ngwa ngwa saghachịrị Trump n’atụmatụ ya iwere ọnọdụ na Gaza, ma jụụ atụmatụ ọbụla ga-eme ka e kposaa ụmụafọ Palestine n’ala ha.

    Saudi Arabia kwuru na ha na mba Isrel agaghị enwe mmekọ ọbụla ruo mgbe e hiwere ọchịchị ndị Palestine na Gaza.

    Ọnụ na-ekwuru otu Hamas kọwaara atụmatụ ahụ dịka ihe ga-ebute ọgbaghara na enweghi udo na mpaghara ahụ.

    N’otu aka ahụ, mba Ijipt na Jodan ajụkwala ịnabata atụmatụ Trump nwere bụ inye ndị Palestine ebe obibi na mba ha.

    Onyeisiala mba Amerịka gakwara n’ihu kwuo uche ya banyere ọdịnihu mpaghara West Bank na Osimmiri Jodan, ma kwuo na ọ na-atụle ịkwado Isrel ka ha were ọnọdụ na West Bank.

    Netanyahu bụ onyeisi obodo nke mbụ ga-eme njem na White House kamgbe Trump banyere ọchịchị nke ugboro abụọ.

  8. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ

    Anyị bu ụkpa ekele anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị Taa.

    Biko gbaa mbọ na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị hiri odo n'ụwa.

    Ndewo!

  9. Mbappe na Bellingham agaghị eso n’asọmpi Copa del Rel dị n’etiti Real Madrid na Laganas

    Onye nkụzi otu egwu bọọlụ Real Madrid bụ Carlo Ancelotti, ekwuola na Kylian Mbappe na Jude Bellingham agaghị eso n’asọmpi Copa del Rey agba na-esote nke na-esote nke ịkpeazụ dị n’etiti ha na otu egwu bọọlụ Laganas.

    Kylian Mbappe na Jude Bellingham esonyela Eduardo Camavinga, David Alaba, Antonio Rudiger, Eder Militao na Dani Carvajal bụ ndị meruru ahụ kemgbe.

    Mbappe gbara 26 bụ nwaafọ mba Fransị enyela gọọlụ 21 nime asọmpi 31 o sonyere na ya kemgbe o si PSG bata Real Madrid ebe Bellingham bụ naanị gọọlụ 10 nime asọmpi 31 ya na Real Madrid.

  10. Ndị uweojii anapụtala mmadụ atọ a tọọrọ n’Edo Steeti

    Ndị uweojii Edo steeti azọpụtala mmadụ atọ a tọọrọ na steeti ahụ ma nweta akụrụngwa agha dị iche iche.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Moses Yamu, kwuru na a tọọrọ mmadụ atọ ahụ n’ọnwa Jenụwarị 2025 dịka ha si Onitsha eme njem aga Abuja..

    Yamu kọwara na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbara mbọ iji zọpụta mmadụ atọ ahụ ma mweta egbe AK-47 na ihe ndị ọzọ.

  11. Ihe ruru mmadụ 10 anwụọla oge e nwere nkwakọrịta mgbọ n’ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị na Sweden

    Ndị uweojii ekwuola na ihe ruru mmadụ iri nwụrụ n'oge e nwere nkwakọrịta mgbọ n’ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị na mba Sweden.

    Ha sị na ha nwere nkwenye na onye bidoro mkpamkpa ahụ so n'ime mmadụ iri ahụ nwụrụ.

    Ha na-akọwa na ọ dịka ọ bụ naanị otu onye kparankata ịkpa mkpamkpa ahụ mana ihe mere o jiri kpaa udịrị nkata ahụ edobeghị anya ugbua.

    Nkwakọrịta mgbọ ahụ mere n'ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị n’obodo a na-akpọ Orebro na mba Sweden.

    Onyeisi ndị uweojii n’Orebro aha ya bụ Roberto Eid Forest kọwara na ha ezigala ọtụtụ ndị uweojii n’ime ụlọakwụkwụ ebe ọgbaaghara ahụ dara.

    Roberto kwuru na n’ime mmadụ ise mgbọegbe tụrụ na ọ dịka otu onye n’ime ha bụ ya bidoro ịgba ndị ọzọ egbe.

    Ọ sị na ugbua, ndị uweojii amalitela ime nyocha ihe na-eme ebe ahụ ma gwa ndị mmadụ ka ha hara ịga na gburugburu mahadum ahụ.

    Mana Jonas Claesson na-anọchịta anya ndị ụlọọgwụ sị na e bugara ndị ahụ niile mgbọ tụrụ n’ụlọọgwụ ha, mana otu onye n’ime ndị ahụ meruru ahụ nke ukwuu.

    Praim mịnịsta mba Sweden bụ Ulf Kristersson katọrọ ọgbaaghara kpatara nkwakọrịta mgbọ na mahadum ahụ ma kọwaa ihe mere dịka “ihe ụfụ dịaara ụmụamaala mba Sweden”.

    Praịm Mịnịsta kwuru na ndị uweojii ka na-eme nyocha banyere ihe mere ma dụọ ohanaeze aka na ntị ka ha rube isi na ndụmọdụ ndị uweojii nyere ha na gburugburu ebe ahụ.

    Ugbua anyị na-enweta ozi na mmadụ isii nọ n’ụlọọgwụ ugbua mana mmadụ anọ n’ime ha ka a wagoro ahụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ ka a na-asị na ha meruru obere ahụ.

  12. A họpụtala Sịnetọ Orji Uzor Kalu dịka onyeisioche kọmitii ụlọomeiwe sịneti na-ahụ maka South East Development Commission.

    Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa ekwuputala Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-anọchiteanya Abịa Nọt dịka onyeisioche kọmịtii ụlọomeiwu sịneti na-ahụ maka South East Development Commission (SEDC).

    South East Development Commission (SEDC) bụ otu n’ime ụlọọrụ na-ahụ maka mmepe mpaghara Naịjirịa dị iche iche Onyeisiala Bola Tinubu binyereaka ka ọ bụrụ iwu.

    A họpụtakwara Sịnetọ Ken Eze si Ebonyi steeti dịka osote onyeisioche kọmitii ahụ, ebe onyeisi ụlọomeiwu Sịneti bụ Godswil Akpabio kwuru na ọ ga-akpọpụta aha ndị ọzọ so na kọmitii ahụ n’oge na-adịghị anya.

    Nhọpụta a pụtara na Sịnetọ Kalu na ndị kọmitii ahụ ga-arụ ọrụ iji hụ na South East Development Commission mịtara mkpụrụ e ji maka ya hiwe ya nke gụnyere inweta ezi nchekwa, igbochi mbuze, iwulite nrụpụta nakwa ihe ndị ọzọ.

  13. Ndị agha nnupụisi ekwuputala na ha ga-akwụsị ịkwa mgbọ na DR Kongo

    Otu jikọtara ndịagha nnupụisi n’ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo a kpọrọ Congo River Alliance ekwuputala nkwụsị ịkwa mgbọ malite n’ụbọchị Tuzde 4 Febụwarị 2025.

    N’ozi ndị otu ahụ gụnyere M23 wepụtara, ha kọwara na ọ bụ n’ihi ọnọdụ ụmụ mmadụ mere ha ji nwee mkpebi ahụ oge ha kpachichara mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo.

    Otu mbaụwa bụ UN sị na e gburu opekatampe mmadụ narị itoolu (900) n’agha ahụ dị na Goma ebe mmadụ puku abụo narị asatọ na iri asatọ (2,880) merụrụ ahụ.

    Mba ndị so n’otu G7 nakwa EU akatọọla mwakpo ahụ ma kọwaa ya dịka nke megidere nkwụrụnankeonwe mba DR Kongo.

  14. China ekwuola na ha ga-etinye ụtụisi na ngwaahịa nke ha iji megwara Amerịka

    Chaịna ekwuola na ha ga-emegwara dịka ụtụisi ọhụrụ Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gbakwunyere na ngwaahịa malitere dịwa ire.

    Ihe ndị Chaịna ga-agbakwunye ụtụisi bụ ngwaahịa ndị e si Amerịka tụbata na mba ahụ, ndị gụnyere kool, ụgbọala ndị nwere nnukwu njini nakwa gaasị.

    Ụlọọrụ mba Chaịna na-ahụ na onye niile nwere ikike ịmaaka azụmaahịa amalitela ime nnyocha gbasara ụlọọrụ Google.

    Ego ọhụrụ dị 10% Trump gbakwunyere na ngwaahịa si mba Chaịna amalitela dịwa ire dịka ọ kwụsịtụrụ 25% ọ gbakwunyere na ngwaahịa ndị si mba Kanada na Meziko ruo otu ọnwa.

  15. Igbo nwe mmadụ, ụnụ asaala chi, Ka Afọ taa fọtara anyị ihe ọma ooo

    Anyị na-ekele gị maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji awụchiela iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche. Ka o sinadị, Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  16. Ụlọikpe atụọla onye agha mba Briten bụ Khalife nga maka ịrụrụ ndị Iran ọrụ nzuzo

    Ụlọikpe atụọla onye agha mba Briten a na-akpọ Daniel Khalife nga afọ iri na anọ (14) na ọnwa atọ maka ịrụrụ ndị mba Iran ọrụ dịka onye na-agbara ha ama ihe nzuzo.

    Ihe dịka ọnwa iri na asatọ garaaga ka gọọmenti mba UK jidere Daniel Khalife n’abalị atọ ka o sịchara n’ụlọ mkpọrọ dị na Wandsworth gbaa ọsọ.

    N’oge okaikpe Cheema-Grubb tụrụ Khalife nga ka ọ kọwara Khalife dịka mmadụ bụ “nnukwu onukwu na-enyi egwu”.

    Khalife dị afọ 23 ugbua mana ọ banyere n’ọrụ agha mba Briten tupuu ọ dịrị afọ 17 nwere mechaa ya na ndị ọrụ nzuzo mba Iran enwee mmkpakọrịta.

    Khalife bụ onye nne ya bụ nwaamaala mba Briten-Iran. O jị maka agbụrụ nne ya nwere bido ịgbara ndị Iran ama nzuzo.

    Ihe o mere tinyere ọtụtụ ndịagha mba Briten n’ọnọdụ ịzọ ndụ ha.

    Ụlọikpe kwuru na ndị Iran nyere Khalife ego ma kwuo n’otu mgbe ka ọ natara ego ruru £ 1,000.

  17. Ogbunigwe egbuola ndị ọrụ ugbo 15 na Syria

    Opekatampe mmadụ iri na ise (15) gụnyere ụmụnwaanyị iri na anọ (14) anwụọla oge ọgbunigwe tiwara n’ụgbọala bu ndị ọrụ ugbo na mpaghara ugwu mba Sirịa.

    Ụlọorụ Syria Civil Defence kwuru na ụmụnwaanyị iri na ise (15) ndị ọzọ merụrụ ahụ site na ntiwa ogbunigwe ahụ mere n’obodo Manbij dị n’ọwụwa anyanwụ Aleppo.

    Ha sị na ụfọdụ ndị ahụ merụrụ ahụ nọ n’ezigbo ọnọdụ ọjọọ ma dọọ aka na ntị na ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịgbago.

    E nwebeghị otu ọbụla kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ a kọwara dịka nke kachasị njọ kemgbe ndịagha nnupụisi chụpụrụ Onyeisiala Bashar al-Assad n’ọchịchị n’ime ọnwa Disemba 2024.

    Nke a bụ ugboro abụọ ogbunigwe na-etiwa n’ime ụgbọala na Manbij n’ime naanị mkpụrụ ụbọchị atọ.

    Dịka ụlọọrụ Syria Civil Defence siri kwuo, ụmụaka abụọ na otu nwaanyị so n’ime mmadụ anọ nwụrụ mgbe ogbunigwe tiwara n’otu ogbe dị n’obodo mepere emepe.

  18. Trump eyiela egwu itinye ụtụisi na ngwaahịa ndị e si na Yurope ebubata n’Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nọọrọ n’ụbọchị Sọnde yie egwu na ọ ga-agbatịkwu aka n’ụtụisi ọ na-etinye na ngwaahịa e si mba ọzọ ebubata n’Amerịka, ma kwuo na ọ ga-eme ka nke a rutu mba nọ n’otu European Union (EU) nakwa mba Briten.

    N’okwu ya “ụtụisi n’elu ngwaahịa ndị si EU abata Amerịka ga-eme “n’oge na-adịghị anya”, dịka ọ rụtụrụ aka na ụfọdụ mba ndị a anaghị azụ ngwaahịa ndị si Amerịka.

    “Mba UK emefeela ya oke mana ọnọdụ ahụ bụ ihe “e nwereike ịhazivọfụma”, ma kwuo na ya na Praịm minista mba UK Keir Starmer na-akpa ọfụma banyere nke a.

    Ọnụ na-ekwuru otu European Union kwuru na ha ga-azaghachị n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na Trump tinye ụtụisi na ngwaahịa ọbụla si na mba ha dịka o si kwuo.

    O kwuru na otu katọkwara ụtụisi e tinyere n’isi mba Kanada, Meziko na Chaịna, ma kwuo na ụtụisi ndị a na-emebi usoro akụnaụba ma na-ewute ebe ọ dị ukwuu.

    Azụmaahịa na mba ndị nọ n’Esia adaala ebe a hụrụ anya dịka ha bụ ndị mbu bu uzo mepee ahịa kamgbe Trump kwuru okwu itinye ụtụisi nz ngwụcha izuụka.

    Mba Kanada ekwuola na ha ga-etinyekwa ụtụisi na ngwaahịa ndị si n’Amerịka ebubata na mba ha.

    Ebe Chaịna na-akwado imegwara nke ha ma na-achị ịgba mkpesa n’otu World Health Organization (WHO). Azụmaahịa ha ka mechiri emechi dịka ha na-eme emume afọ ọhụrụ ha.

  19. Tems emeriela Burna Boy, Davido na ndị ọzọ ma turu ugo n’emume nrite Grammy 2025

    Otiegwu a ma ama bụ Tems eturula ugo n’ihe nrite Grammy nke afọ 2025.

    Tems tuuru ugo na ngalaba egwu kachasị mma n’Afrịka a kpọro ‘Best African Music Performance’ nke o ji egwu ya a kpọrọ “Love Me Jeje” rite.

    O meriri ndị ogbo ya dịka Burna Boy, Davido, Chris Brown, Asake, Wizkid, Yemi Alade, na ndị ọzọ.

    O kelere Chineke maka ime ka o merie, keleekwa ndị otu ya maka nkwado ha na-enye ya dịka ọ na-anata onyinye ya.

    N’otu aka ahụ, Tems kelekwara nne ya bụ onye so ya bịa emume Grammy ahụ dịka o kwuru na Mọnde bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ nne ya.

    Nke a bụ ugboro abụọ Tems ga-eturu ugo n’emume ihe nrite Grammy. N’afọ 2023 o ritere nke mbụ site n’egwu ya na ụmụafọ mba Amerịka bụ Future na Drake tiri, aha egwu ahụ bụ ‘Wait For You’.

    A họpụtala Tems ọtụtụ ugboro maka irite ihe n’emume Grammy.

    Tems dị afọ iri abụọ na itoolu, ezi aha ya bụ Temilade Openiyi.

  20. Igbo ndị ọma mma nụ ooo!

    Obi dị ọcha na ihu ọchị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'izuụka ọhụrụ a.

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.