You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. EFCC enyela ndị mba ofesi nnukwu ego a napụrụ ha na wayo

    Ụlọọrụ Economic and financial crime commission (EFCC) enwerela ego ruru $132,362.43 e gwuru ndị mba ofesi na wayo nyeghachị ha.

    Ndị e gwuru wayo ahụ sị na mba Amerịka, Spain na Swiss.

    Onyeisi ụlọọrụ EFCC bụ Ola Olukoyede mere nke a n’abalị garaaga n’isi ụlọọrụ ha dị na Jabi, Abuja.

    Ola Olukoyede kwuru na nke a bụ ka ha gosi na Naịjirịa abụghị mba ndị na-egwu wayo ga-anọ.

    Onye nnọchịtaanya mba Spain na Naịjirịa bụ Maria Higon Velasco ka EFCC nyere ego ruru $100,011.43 ka o nwere ya nye onye e gwuru wayo bụ Chantai Helene Lavancy, a maara na mbụ dịka Chantai Helene Maeder.

    Charles Smith bụ onye ọrụ na ngaraba ọkaiwu n’ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation, FBI, nke mba Amerịka ka EFCC nyere ego nke onye mba ahụ e gwuru wayo bụ Maria Jesus Brockell.

    Ọzọkwa bụ EFCC nyere Charles Smith ego ruru $7,527 e gwuru Michael Smith na wayọ, ma nyekwa ya ego nke Marva Marrow ruru N32,639,358.11.

  2. Hamas ebidola ịtọhapụ ndị Izrel mmadụ 6

    Hamas ebidola ịtọhapụ ndị Izrel mmadụ 6 nke ga-eme ka mba Izrel nweike ịtọhapụ ndị Palestine mmadụ 600.

    Nke a na-eme dịka mba Izrel na ndị Hamas nwere nkwekọrịta ịtọhapụ ndị nga nakwa ndị a atọọrọ n’oge ha abụọ na-anụ agha.

    Ugbua, Hamas atọhapụla mmadụ abụọ n’ime mmadụ isii ha kwesiri ịtọhapụ taata.

    Mmadụ abụọ ndị ahụ bụ Avera Mengistu bụ onye ndị Hamas tọọrọ kemgbe afọ 2014 nakwa Tal Shoham dị afọ 40 bụ onye nke Hamas tọọrọ na mpaghara Kibbutz Be'eri n’abalị 7 nke ọnwa Ọktoba, 2023.

    Mmadụ anọ ndị ọzọ a na-atụanya na Hamas ga-atọhapụ gunyere Eliya Cohen, Omer Shem Tov, Omer Wenkert, na Hisham al-Sayed.

  3. Ụmụigbo ndị ọma, anyị sị unu ụtụtụ ọma.

    Ka chi foro taata nwetere ndị na-esonyere anyị ogologo ndụ na ahụ isi ike.

    Mara na ndị ga-enwetere unu akụkọ taata gunyere Michael Ilediagu na Uzoamaka Ewuzie.

    Biko, buru oche gi nonyere anyị.

  4. Rwanda akatọọla mkpebi mba Amerịka banyere ndị ọchịchị ya maka agha DR Kongo

    Ndị ọchịchị mba Rwanda akatọọla mkpebi mba Amerịka ịda James Kabarebe bụ mịnịsta na-ahụ maka maka njikọ mpaghara nha maka ebubo ịkwado agha na-aga n’ihu n’ọwụwa anyanwụ agbata obi ha bụ Demọkratik Repụblik ọf Kongo.

    Ozi US Treasury Department wepụtara n’ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị, kwuru na aka James Kabarebe bụbu onyeisi ndịagha mba Rwanda, dị na-nkwado ndịagha nnupụisi M23.

    Onye ọzọ mba Amerịka dara nha bụ Lawrence Kanyuka, bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị M23 ya na ụlọọrụ abụọ ọ na-achịkwa na mba Briten na Fransi

    N’ụbọchị Fraịde 21 Febụwarị, 2025, mba UK kwuru na Rwanda ga-enweta ụgwọ maka ihe a sị na ha mere banyere agha dị na DR Kongo.

    Na nzaghachi, mịnịstri na-ahụ maka mba ofesị na Rwanda kwuru na nha ahụ bụ ihe na-ezighị ezi, ma gaa n’ihu kwuo na ọ gaghị akwụsị ọgụ dị na DR Kongo.

    Ndịagha nnupụisi bụ ndị agbụrụ Tutsis, weghaara obodo Goma na Bukavu nke kpalitere nnukwu nsogbu enyemaka mmadụ nke mmebiri ọtụtụ ezinaụlọ.

  5. Onye nnọchiteanya Trump ekwuola na Zelensky bụ onye ndu kara aka n’agbanyeghị nkatọ si obi ọchịchị White House

    Onye nnọchiteanya Onyeisiala Donald Trump na Yukren bụ Keith Kellogg ekwuola na ekwuola na onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky bụ onye ndu kara aka n’agbanyeghị nkatọ si obi ọchịchị White House.

    Kellogg kwuru nke a ka ya na Zelensky nwere mkparịtaụka. O toro Zelensky na ndị ọrụ nchekwa ya ma kwuo na ọ na-atụanya na mkparịtaụka ahụ ga-amịta ezi mkpụrụ.

    N’aka nke ọzọ, onyeisiala Poland bụ Andrzej Duda enyela Volodymyr Zelensky ndụmọdụ ka ọ gaa n’ihu na mmekọ ya na Onyeisiala Trump na-achị Amerịka.

    Onyeisiala Duda kwuru na ya na Zelensky nwere mkparịtaụka n’ekwenti banyere mkparịtaụka ya na Kellogg nwere.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ mmekọ Yukren na Amerịka bụ ụzọ a ga-esi nweta udo ma kwụsị agha dị n’etiti ha na mba Rọshịa.

  6. Ozu e si Gaza bulata abụghị ozu Shiri Bibas - Ndịagha Izrel

    Ndịagha Izrel ebola ndị Hamas ebubo mmebi ihe dị na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ dịka nnyocha emere gosiri na ozu e bulatara na mba Izrel n’ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị 2025, abụghị ozu Shiri Bibas.

    Ndịagha Izrel kwuru na ozu atọ ndị ọzọ e bunyere ha bụ ụmụaka Shiri Bibas nke gụnyere Ariel na Kfir, ndị kara ịgba afọ ise na afọ abụọ.

    Ozu nke anọ bụ ozu otu onye na-akwado udo bụ Oded Lifschitz gbara afọ iri asatọ na anọ. (84)

    Ha kwuru na ozu nke anọ ahụ abụghị Shiri maọbụ onye Izrel dịka Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu na-ebo ebubo na ndị Hamas tinyere ozu otu nwaanyị Gaza n’ime akpatị ozu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Hamas bụ Ismail al-Thwabta wepụtara ozi n’akara X ya ụbọchị Fraịde 21 Febụwarị 2025 ma kwuo na ọ dịka agwakọrịtara ozu Shiri na ozu ndị ọzọ n’okpuru ebe mkpọmkpọ ihe dị mgbe ndị Izrel tụrụ ha ogbunigwe.

  7. Etu ndị Red Cross si lie ozu mmadụ 18 nwụrụ n’agha na mba DR Kongo

    Ndị Red Cross eliela ozu mmadụ iri na asatọ (18) ndị nwụrụ n’agha na-aga n’ihu na mba DR Kongo nke ekwuru na mba Rwandan na-akwado.

    Ha butere ozu ndị ahụ n’okporoụzọ dị n’obodo Bukavu nke DR Kongo ma lie ha ebe a na-eli ozu dị na Musigiko n’ime obodo Bagira, na Bukavu nke ndịda Kivu.

  8. Yukren chọrọ nkwa anyị ga-atụkwasịobi n’aka mba Amerịka – Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymr Zelensky ekwuola na ha na-achọ ka e kwe ha nkwa ha ga-atụkwasịnwuobi n’aka mba Amerịka banyere ịkwụsị agha dị n’etiti ha na mba Rọshịa.

    Zelensky kwuru nke a mgbe ọ nabatara onye nnọchita anya mba Amerịka bụ Keith Kellogg n’abalị garaaga.

    Zelensky kwuru na naanị ihe mba Yukren na-achọ n’aka mba Amerịka bụ ka ha nwe ‘nkwekọrịta a ga-atụkwasịnwu obi’.

    Ọ sị na mba Yukren na Amerịka kwesiri inwe nkwekọrịta n’ihe gbasara akụnụba nakwa nchekwa ugbua.

    Zelensky kwuru na ya gwara Kellogg ihe na-eme n’ihu agha nakwa mkpa ọ dị ịtọhapụ ndị nga e jidere n’agha dị n’etiti mba Yukren na Rọshịa.

    Mana ka nghọtafe dị n’etiti Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ogbo ya nke mba Yukren bụ Volodymr Zelensky na-akanwanye njọ; Keith Kellogg na Zellensky kagburu ịjịkọ aka ọnụ gwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha kpachara nkata n’ime obi.

  9. Apple ewepụtala ekwentị iPhone ọhụrụ nwere atụmatụ AI ma dị ọnụ ala

    Ụlọọrụ na-emepụ ekwentị bụ Apple ewepụtala iPhone ọhụrụ nke na-eweta atụmatụ ọgụgụ isi (AI) ma dị ọnụ ala karịa ekwentị e jiri mara ya.

    Dịka Apple si kwuo, ekwentị ahụ akpọrọ IPhone 16e dịkwa ka iPhone 16 dị ọnụ karịa. O nwere nhọrọ nchekwa yiri nke oke ọnụ ahụ, n'agbanyeghị obere nkọwa o nwere n'ebe ọzọ nke gụnyere obere igwefoto.

    Apple na-agbasi mbọ ike ịchọta ngwaahịa ọhụrụ na-amasị ndị na-azụ ya ahịa dịka ire ekwentị iPhone dara na njedebe nke afọ gara aga.

    O nwere olile anya na iweta arụmọrụ AI emelitere na ekwentị dị ọnụ ala ga-enyere ya aka - agbanyeghị na ndị nyocha ekwechaghị na ọ ga-ebuli ire ahịa ụdị ngwaọrụ a.

  10. Ụgbọelu Delta Air enyela ndị njem nọ n'ụgbọelu kpọkara na Toronto $30,000 dọla

    Ụgbọelụ Delta Air Lines enyela mmadụ niile nọ n’ụgbọelu ahụ kpọkara na Toronto n’ụbọchị Monde 17 Febụwarị 2025, $30,000 dọla.

    Dịka ugbọelu ahụ dara n’obodo Kanada, ọ gbapurụ n'okporoụzọ awara awa ma bara ọkụ tupu ya atụgharị ma kwụsị. Mana otu ihe tụrụ ndị mmadụ n’anya bụ na mmadụ niile nọ na ya jiri ndụ ha pụta.

    Ndị njem kwuru na ọ tụrụ ha n’anya ka ọtụtụ n’ime ha si pụta n’ụgbọelu ahụ kpọkara n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla.

    A mabeghị ihe kpatara ihe mberede ahụ mere ụgbọelu ahụ bu ndị njem iri asaa na isii (76) na ndị ọrụ anọ, bụ ndị si n'obodo Minneapolis nke dị na mba Amerịka tupu ha erute na Kanada.

    Onye na-ekwuchitere Delta kwuru na onyinye ego ahụ emetụtaghị ikike ndị njem.

    Onye ọkaiwu Vincent Genova nke ụlọọrụ iwu Rochon Genova kwuru na ndị njem ahụ tụrụ anya inweta "mkpebi ziri ezi n'oge", na-akọwapụta na ndị njem ahụ "nwere mmerụ ahụ nke onwe nke kwesịrị inwe nlekọta n’ụlọọgwụ".

    N'ime ozi o zigara BBC, Genova kwuru na nkwụghachi ụgwọ $30,000 dọla bụ iji nyere ndị ihe mberede ụgbọelu ahụ metụtara aka, ndị nwere nsogbu ego nke obere oge.

    Mana ụlọọrụ ụgbọelu ahụ ga-ewepụ ya n’ụgwọ ọ bụla ha ga-achọ ịgwụ ha na-ikpeazụ.

  11. Ihe mere e ji chụpụ Sinetọ Natasha n'ụlọ omeiwu n'oge ọgbakọ ndị omeiwu Sinetị

    Ndị omeiwu Sineti chụpụrụ onye omeiwu na-anọchite Kogi Sentralụ bụ Natasha Akpoti-Uduaghan n’ulọ omeiwu Sinetị oge ọgbakọ ndị omeiwu na-aga n’ihu n’ụbọchị Wenezde 19 Febụwarị 2025.

    Akụkọ kwuru na nsogbu a malitere mgbe e bugharịrị oche onye omeiwu Natasha dịka ndị omeiwu malitere inwe ọgbakọ ọhurụ, mana Natasha ekwenyeghị na nke ahụ.

    Onye nhazi usoro n’ụlọ omeiwu bụ Mohammed Ali Monguno mere ka onyeisi ndị omeiwu bụ Godswill Akpabio mara na Natasha anọghị n’oche ya. Nke mere ka Natasha were olu ike zaghachi ya ma sị ka akọwara ya ihe kpatara eji mgbanwe oche ya na-emeghị ka ọ mara.

    Onyeisi ndị Sinetị Akpabio jụrụ na Natasha agaghị ekwu ihe ọbụla maọbụrụ na ọ nọghị n’oche ya.

    Nke a mere ka ọ malite itikpu n’oke olu, nwere mee ka Onyeisi ndị Sinetị Akpabio nye iwu ka achụpụ ya n’ụlọ omeiwu.

  12. Ozu mmadụ anọ Hamas ji eji nwụrụ na Gaza abatala Izrel

    Ozu mmadụ anọ Hamas ji eji nwụrụ na Gaza abatala Izrel

    Hamas enyefeela ozu mmadụ anọ mba Izrel ha ji

    Nke a bụ ozu mbụ Hamas na-enyefe kemgbe e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    Hamas kwuru na ndị ahụ nwụrụ gụnyere mmadụ atọ si ezinaụlọ Bibas – Nne ha Shiri na ụmụaka ya abụọ bụ Kfir na Ariel dị ọnwa itoolu na afọ anọ oge a tọọrọ.

    Onyeisiala mba Izrel bụ Isaac Herzog kwuru na ha na-eru uju ugbua.

    Hamas na-ekwu na ọ bụ ogbunigwe Izrel tụrụ n’ọnwa Nọvemba 2023 bụ ihe gburu ndị ezinaụlọ Bibas. Mana Izrel ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a. Ha mere ka a mata na ha ga-eme nnyocha ozu nd ahụ tupu ha ekwuo ihe ọbụla.

    Ozu nke anọ e bulatara bụ Oded Lifschitz gbara afọ 84. Ọ bụ onye na-agbasaozi maka udo.

  13. Ọ dị Rọshịa n'aka inweta udo n'agha dị na mba Yukren – Onyeisiala Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ dị mba Rọshịa n’aka inweta udo n’agha dị n’etiti ha na mba Yukren.

    Onyeisiala Trump gwara onye ntaakụkọ BBC na nke a dị mkpa dịka a na-amalite mkparịtaụka udo n’ihi na mba Rọshịa weghaara nnukwu okeala.

    N’aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru Kremlin bụ Dmitry Peskov kwuru na Rọshịa na mba Amerịka ga-amalite mkparịtaụka n’ihu niile.

    Mana ndị ọchịchị ọdịda anyanwụ kwuru na ọ bụrụ na enwere nkwụsị ọgụ, enwereike iziga "ike mmesi obi ike" na Yukren iji nyere ndị mmadụ aka.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky na onye nnọchiteanya Onyeisiala Trump bụ Keith Kellogg ga-enwe nzukọ ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị, 2025.

    Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ndị mịnịsta bụ Lisa Nandy si kwuo, Praịm Mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer na Onyeisiala Trump ga-enwe nzukọ n’izu iji kparịtaụka maka oke ọrụ ndị Yurop na nkwụsị ọgụ ahụ.

    Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ afọ atọ kemgbe Rọshịa malitere ibuso mba Yukren agha, ndị Yuropu gbakọtara ọnụ ma kwado Yukren iji gosipụta obi ha dịka ha na mba Amerịka na-enwe mmekọrịta.

  14. O nweghị mgbe anyị jiri sị ka a nwuchie ndị na-eyighị akpa ara - Law Mefor

    Ozi ndị mmadụ na-agbasa n'igwe soshịal midịa na Gọọmenti Anambra steeti si na ha ga-anuchi ndị niile bu isi dada, maọbụ yie uwe ogologo ụkwụ na-akpụ n'ala, maọbụ ụmụnwaanyị eyighị uwe akpa ara maọbụ ọbante.

    Ọ gara n'ihu kwuo si na "o nweghị mgbe anyị kwuru nke a, maka na o nweghị ebe ọ dị n'iwu Naịjirịa."

    "Ọ bụ ndị omekome na-enweghị ihe ha na-eme mere nke a."

    "Kedụ ka a ga-esikwanụ ma onye eyighị ọbante maọbụ akpa ara?"

    Mefor dụkwara ndị mmadụ ndụmọdụ si, "Biko nu o nweghị mgbe anyị jiri kwuo nke a."

  15. Yuganda agwala mmadụ asatọ ka ha lawa maka na ha ebughị ọrịa Ebola

    Ndị ọrụ ahụike na mba Yuganda agwala mmadụ asatọ weere onwe ha n’ọrịa Ebola ka lawa n’ụlọ ha dịka nnyocha gosiri na ha ebughịzi ọrịa ahụ.

    Ọrịa ahụ egbuola otu onye ebe mmadụ asatọ butere ya kemgbe o tiwapụrụ n’ọnwa Jenụwarị 2025 ebe mmadụ 265 e enyo na ha bu ọrịa ahụ ka n’ọnọdụ mgbochi.

    Nke a bụ nke ugboro asatọ ọrịa Ebola na-etiwapụ na Yuganda kemgbe afọ 2000.Ọrịa Sudan Ebola Virus Disease (SUDV) bụ ọrị ahụ ọkụ na-efe efe site na mmekọ ahụ onye bu ya.

  16. Hamas amalitela ibulata ozu ndị ha ji na Gaza

    Hamas enyefeela ozu mmadụ anọ ha ji nwụrụ n’aka ndị ọrụ Red Cross na Gaza. Nke a bụ ozu mbụ ndị ha ji ha na-enyeghachi kemgbe nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ malitere.

    Akụkọ kwuru na ndị ọrụ Red Cross na-ebuga ozu ndị ahụ na mba Izrel.

    Hamas kwuru na ndị ahụ nwụrụ gụnyere mmadụ atọ si ezinaụlọ Bibas – Nne ha Shiri na ụmụaka ya abụọ bụ Kfir na Ariel dị ọnwa itoolu na afọ anọ oge a tọọrọ.

    Hamas na-ekwu na ọ bụ ogbunigwe Izrel tụrụ n’ọnwa Nọvemba 2023 bụ ihe gburu ndị ezinaụlọ Bibas. Mana Izrel ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a. Ha mere ka a mata na ha ga-eme nnyocha ozu nd ahụ tupu ha ekwuo ihe ọbụla.

    Ozu nke anọ e bulatara bụ Oded Lifschitz gbara afọ 84. Ọ bụ onye na-agbasaozi maka udo.

  17. Igbọ mụrụ nze mụọ ọzọ unu abọọla chi?

    Obi dị ọcha ka anyị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Anyị na-asị unu, ihe niile unu ga-ebi aka taa ga-amịta mkpụrụ n'aha onye nwe anyị.

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Ndewo!

  18. Praịm Mịnịsta Ịtali kwuru na Popu mụ anya ma na-egwuregwu n'ụlọọgwụ

    Praịm Mịnịsta mba Ịtali bụ Georgia Meloni gara leta onyeisi ụka Katọlik n'ụwa nile bụ Popu Francis n’ụlọọgwụ ebe a chọpụtara na o nwere ọrịa oyi bara na ngụgụ ya abụọ.

    A nabatara onyeisi ụka Katọliki ahụ dị afọ iri asatọ na asatọ (88) n'ụlọọgwụ Rome Gemelli na Fraịde 15 Febụwarị 2025 maka ọrịa iku ume.

    Meloni kwuru n’akwụkwọ ozi o wepụtara na “obi dị ya ụtọ ịhụ na Popu mụrụ anya ma nabata ya. Anyị nọ na-achị ọchị dịka ọ na-adị mgbe niile. Ọ tụfughị ilu ọchị ya.”

    O kwuru na ọ gwara ya ka ọ mgbake ngwa ngwa, n'aha gọọmentị Ịtali na mba ụwa dum.

  19. Onyeisiala Trump akpọọla Onyeisiala Zelensky 'onye ọchịchị aka ike' na nzaghachi nkatọ mgbasa ozi ụgha

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump amalitela ebuso onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ọgụ ọhụrụ, ma akpọ ya "onye ọchịchị aka ike" na-ekwu na ọ rụrụ ọrụ ndị njọ.

    Onyeisiala Trump kwuru nke a, na nzaghachi nkatọ mgbasa ozi ụgha Onyeisiala Zelensky katọrọ ya.

    Cheta na Mana Onyeisiala Zelensky kwuru na Onyeisiala Trump bi n’ime mgbasa ozi ụgha nke ndị Rọshịa kere.

    O kwupụtara nke a dịka Rọshịa na mba Amerịka nwere nzukọ na Saudi Arabia nke Kyiv esonyeghị, bụ ebe ha kwenyere ka amalite mkparịtaụka nkwekọrịta udo.

    Mgbe onye ntaakụkọ BBC gbara onyeisiala Donald Trump ajụjụ ọnụ ihe ọ ga-ekwu banyere okwu mba Yukren kwuru na a ‘raara ha nye’ maka na-akpọghị ha nzukọ ahụ, o kwuru na Yukren kwesịrị ime nkwekọrịta ahụ na mbụ.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwuola na ọ dịghị onye ga-ewepu Yukren na mkparịntaụka ịkwụsị ọgụ nke ọdịnihu.

  20. Onye otiegwu Portable enyefeela onwe n'aka ndị uweojii

    Otiegwu Habeeb Okikiola a mara dịka Portable enyefela onwe ya n'aka ndị uweojii dịka ọ garachara abalị ole na ole ekwupụtara na a na-achọ ya achọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara ndị ntaakụkọ na nwamadị ahụ nyefere onwe ya n'aka ngalaba ndị uweojii Criminal Investigation Department (CID), Panti, Legọs.

    O kwuru na ha akpọọla ndị uweojii nke Ogun steeti ka ha nwụchi Portable.

    Ka ọ dị ugbua, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ogun steeti bụ Omolola Odutola kwupụtara na Portable rutere na ngalaba CID steeti ahụ dị n'Eleweran, Abeokuta oge ọ kụrụ elekere mbụ nke ụtụtụ ụbọchị Wenezde 19 Febụwarị, 2025.

    Ndị uweojii na ebo Portable ebubo na ọ wakporo ndị ọrụ gọọmentị Ogun steeti oge ha gara ọrụ na mpaghara Sango nke steeti ahụ.