You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Amerịka akwadola Rọshịa na mkpebi ụlọọrụ UN banyere mba Yukren

    O meela ogboro abụọ mba Amerịka dọnyere mba Rọshịa ukwu mgbe ulọọrụ UN na-eme emume ncheta afọ atọ Rọshịa wakporo mba Yukren nke na-egosi ebe ọchịchị Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump guzoro.

    Na mbụ, mba abụọ ahụ katọrọ mkpebi mba dị na mpaghara Yurop kpebiri nke katọrọ ihe Rọshịa mere ma kwado iguzosi ike nke okeala Yukren nke ọgbakọ UN General Assembly (UNGA) kwadoro.

    Mba Amerịka kwadoro mkpebi mba Amerịka depụtara na-ọgbakọ ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke ulọọrụ ahụ bụ UN Security Council nke kpọrọ oku ka akwụsị ọgụ, mana Amerịka katọghị mba Rọshịa.

    E nwere mkpebi nke kansụl na-ahụ maka nchekwa na UN mana mba abụọ ha mba Amerịka jikọrọ aka bụ UK na Fransị, ekweghị ịtụ votu ahụ mgbe ha gbalịchara imezigharị ihe e depụtara na mkpebi ahụ.

    Ihe a na-eme mgbe Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron bịara Amerịka eleta Onyeisiala Trump ka ha nwee mkparịtaụka banyere ndịiche ha nwere gbasara agha Yukren.

    N’ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị 2025, Praịm Mịnịsta Breten bụ Sir Keir Starmer ga-abịakwa Amerịka ịhụ Onyeisiala Trump.

    Cheta na Onyeisiala Trump atụgharịla njikọ aka mba ndị dị na transatlantic, iji nweta ihu ọma ebe mba Rọshịa nọ. Nke a mere ka mba ụwa na-enwe obi abụọ banyere ntinye aka ogologo oge mba Amerịka nwere banyere nchekwa na Yurop.

  2. Anyị chọrọ ịkwụsị agha a n'afọ a - Onyeisiala Zelensky

    Onyeisiala Volodymyr Zelensky na-achị Yukren ekwuola na ha na-atụ anya ịkwụsị agha dị n’etiti ha na mba Rọshịa n’afọ a.

    Mana ọ dọrọ aka na ntị na Yukren kwesịrị inweta ezi nchekwa iji gbochie Mosko ịwakpo ha ọzọ ma kwuo na enyemaka EU na Nato ga-enyere ha aka iji mee nke a.

    Cheta na Rọshịa akatọọla atụmatụ Yukren isonye n’otu Nato.

    Zelensky kwuru nke a oge ọ nabatara ndị isi mba Yurop na Praịm mịnịsta Kanada bụ Justin Trudeau ndị bịara inye ya nkwado na Kyiv.

    Ọ gbara ama na nkwekọrịta udo n’etiti ha na mba Rọshịa ga-amalite ma ọ bụrụ na Rọshịa tọhapụ ndị ha ji eji.

    Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Frans bụ Emmanuel Macron agawala Amerịka iji maka mkparịtaụka n’etiti ya na Onyeisiala Trump iji gozi nkwado ya nye mba Yukren.

  3. Ndị uweojii amalitela ime nnyocha banyere ozu mmadụ 30 a hụrụ n’ime mmiri n'Abia steeti

    Kemgbe akụkọ pụtara na a hụrụ ozu mmadụ 30 n’ime mmiri a na-akpọ Imo Rịva dị n’Oriendu n’okpuru ọchịchị Umuahia Nọt dị n’Abịa steeti, ndị uweojii etinyela ọnụ n’okwu ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abịa steeti bụ Maureen Chinaka gwara ndị ntaakụkọ BBC Igbo na ‘ọ bụ eziokwu na a hụrụ ọtụtụ ozu mmadụ na mmiri ahụ”.

    Chinaka gara n’ihu kwuo sị na “ndị uweojii amalitela ime nnyocha banyere ihe mere”.

    O kwuru na mgbe ha nụrụ ihe mere ka ha zigara ndị uwuojii n’ebe ahụ na-kwa gburu ya.

    Ọ sị na nyocha ha mere gosiri na nke a abụghị nke mbụ a hụrụ ozu mmadụ n'ime mmiri ahụ ma kwuo na ndị uweojii dị njikere ịchọpụta ihe mere ma jidekwa ndị kpara mkpamkpa ahụ.

  4. Ndịagha Sudan anapụtala isi obodo el-Obeid n’aka ndị nnupụisi RSF

    Ndịagha Sudan kwuru na ha emebiela nnọchibido ma napụta isi obodo steeti ndịda el-Obeid nke ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) wakporo.

    Ọganihu a bịara awa ole na ole nke ndị RSF binyere aka n'akwụkwọ nkwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi obodo Kenya bụ Nairobi, iji guzobe ọchịchị nke nkewapụ n'ebe ndị ha na-achị.

    Ndị nnupụisi RSF na ndịagha nọ n'ọgụ maka onye ga-achị kemgbe Eprel 2023, ebe e gburu ọtụtụ iri puku kwuru iri puku mmadụ ma chụpụ ọtụtụ nde mmadụ n'ụlọ ha.

    Agha a kewara mba ahụ, dịka ndịagha na-achịkwa ugwu na ọwụwa anyanwụ, ebe ndị RSF jidere ọtụtụ mpaghara Darfur na ọdịda anyanwụ na akụkụ ndịda.

    El-Obeid bụ isi obodo North Kordofan steeti, bụkwa ebe jikọtara isi obodo Khartoum na Darfur.

  5. Ndị omekome egbuola otu onye uweojii si mba Kenya na Haiti

    E gbuola otu onye uweojii bụ nwaamala mba Kenya mgbe ndị ọrụ nchekwa mba ụwa nọ na Haiti na ndị otu nọ na-akwa mgbọ.

    Onye uweojii ahụ bụ onye mbụ nwụrụ kemgbe ndị ọrụ nkwado Multinational Security Support mission (MSS) nke ndị Kenya na-akwado malitere ọrụ na Haiti.

    E zigara ndịagha na Haiti n'ọnwa Juun nke afọ 2024 ka ha nyere aka weghachi usoro udo n'obodo ahụ, ebe ndị omempụ weghaara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isi obodo Port-au-Prince niile, ya na nnukwu ime obodo.

    E gbuola ihe karịrị mmadụ puku ise na narị ise (5,500) n’ime ihe ike ndị otu malitere ime na Haiti na 2024. Ihe karịrị otu nde mmadụ agbapụla n'ụlọ ha na mba ahụ.

  6. Onyeisiala Trump ahọpụtala Dan Bongino dịka osote onyeisi ụlọọrụ FBI

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ahọpụtala Dan Bongino dịka osote onyeisi ụlọọrụ FBI.

    Onyeisiala Trump wepụtara ozi n’akara soshal midia ma kọwaa Bongino dịka onye hụrụ mba Amerịka n’anya ma bụrụ onye chọrọ ọ dị mma mba Amerịka..

    Bongino gbara afọ 50 arụọla ọrụ dịka onye uweojii na New York nakwa ụlọọrụ Secret Service. Ọ bụ onye nkwado Onyeisiala Trump.

    Ụlọọmeiwu Sineti agaghị enyocha nhọpụta ya. Ihe ọ pụtara ugbua bụ na mmadụ abụọ nọ n’isi ụlọọrụ FBI abụghị ndị rụgoro ọrụ na FBI n’oge gara aga.

    Akụkọ kwuru na ọkwa osote onyeisi FBI bụ onye naahụ maka ọrụ ha n’Amerịka nakwa mba ofesi. Ọ bụ onye nwere nghọta ọtụtụ afọ etu ọrụ ha si aga.

    Cheta na Onyeisiala Trump họpụtara Kash Patel dịka onyeisi FBI. Ụlọomeiwu Sineti gakwara n’ihu kwado nhọpụta ya.

    Dan Bongino bụ onye na-eme ihe mkparịtaụka pọdkast, kwuru na onyeisi FBI bụ Kash Patel bụ onye chọrọ iwulite ọnọdụ FBI n’odịnihu.

  7. Nafdac amachiela ọdụ ahịa ọgwụ 11,000 ma nwụchie mmadụ 40

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ na nri adigboroja bụ Nigerian Food and Drug Administration and Control Agency (Nafdac) ekwuola na ha amachiela ọdụ ahịa ọgwụ ruru 11,000 ma nwụchie mmadụ 40 na mbọ ha na-agba iji gbochie nkesa ọgwụ ike na Naịjirịa.

    Onyeisioche ụlọọrụ Nafdac bụ Ọkankụzi Mojisola Adeyeye kwuru ha mepụtara nke a site na-mbọ ha gbara n’afọ gara aga.

    Ka ọ dị ugbua, Nafdac kwuru na ha amachiela ọdụ ahịa ọgwụ Idumota Legọs, ahịa Ariaria dị n’Aba Abia steeti nakwa ọdụ ahịa ọgwụ dị n’Onitsha ụbọchị Mọnde 10 Febụwarị, 2025.

    Adeyeye kwuru na ọdụ ahịa atọ a ha machiri bụ nke akụkọ kwuru na ọ bụ ha na-ekesa ọgwụ adịgboroja ruru pasenti 80 na Naịjirịa.

    Ihe ndị Nafdac nwetara gụnyere nnukwu ụgbọala ọgwụ adịgboroja 20 n’Aba, 30 n’Onitsha ebe ha nwetara 27 n’Idumota.

    Onyeisioche Nafdac kwuru na ha kwụrụ na ha amalitela inyocha ma chọpụta ndị aka ha dị na-nkesa ọgwụ adịgboroja.

  8. Friedrich Merz eturula ugo mmeri na ntụliaka Chanselọ nke mba Germany

    Nwamadị bụ Friedrich Merz onye ji otu ‘conservative’ pati were zọọ ọkwa chanselọ nke mba Jamini, eturula ugo dịka o meriri na ntụliaka ahụ emere n’ụbọchị Sọnde 23 Febụwarị 2025.

    Mana votu ya erughị 30 pacetị votu otu pati ya tụrụ anya inweta na ntụliaka ahụ.

    Mgbe Merz na-ekele ndị mmadụ tụrụ ya votu, ọ gwara ndị otu pati conservative ka ha malite inwe anụrị n’ihi na ọrụ ga-amalite n’ụtụtụ taa bụ Monde 24 Febụwarị 2025

    O kwukwara na ọrụ chere ya n’ihu doro ya anya nke ọma.

    Onye bụ onye nke abụọ na ntụliaka ahụ bụ Alice Weidel onye jiri otu pati ‘Alternative for Germany (AfD) were zọọ ọkwa chanselọ.

    Weidel jiri 20.8 paceti were nweta ọnọdụ nke onye abụọ na ntụliaka ahụ ebe ndị otu pati ya na-atụ anya na ọ ga-enweta ihe karịrị nke a.

    Alice Weidel kwuru na ntụliaka e mere gosiri na ụmụamaala Jamini chọrọ mgbanwe ọchịchị.

    O kwuru na ọ bụrụ na Friedrich Merz gbara mbọ ime ka pati ya na pati Weidel nwee njikọ, na ọ gaghị enwe isi dịka Weidel kwuru na a ga-enwe ntụliaka ọhụrụ maka na ndị Jamini agaghị eche ka afọ anọ ọzọ bia.

  9. Liverpool fc agaala n’ama egwuregwu Etihad merie Manchester city

    Ndị otu egwu bọọlụ Liverpool fc emeriela Manchester City ma gba ha ọkpụ abụọ asataghị otu.

    N’asọmpị ahụ a gbara n’ama egwuregwu Etihad bụ nke ndị Man city, Mohamed Salah na ogbo ya bụ Dominik Szoboszlai nyere goolu Liverpool ji merie.

    Mohamed Salah nyere goolu nke mbụ n’elekere 14’ ebe Dominik Szoboszlai nyere nke abụọ n’elekere 37’.

    Mbọ niile Manchester city gbara ka ha nye goolu amitaghị mkpụrụ.

    Etu ọnọdụ si dị ugbua, Liverpool bụ ndị nke mbụ na tebulu egwuregwu English Premier League ma jiri akara (point) iri na otu nwere na-aga ndị otu egwu bọọlụ Arsenal bụ ndị nke abụọ.

  10. Agha Rọshịa na Yukren: Lee ihe ise Onyeisiala Volodymyr Zelensky kwuru ọhụrụ maka udo

    Kemgbe izu ụka a maọbụ abalị ole ma ole garaaga, ọtụtụ ihe na-eme banyere agha dị n’etiti mba Rọshịa na Yukren.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nke Yukren bụ Volodymyr Zelensky nwere nghọtafe.

    Ihe butere nghọtafe ahụ bụ mgbe Onyeisiala mba Amerịka kwuputere usoro ha ga-esi kwado mba Yukren ma kwuo na ha chọrọ ka Yukren jiri ihe ọnatarachi ha nke a na-akpọ ‘rare earth’ kwụọ mba Amerịka ụgwọ ego ha mefuru n’isi mba Yukren kemgbe agha ha na Rọshịa bidoro.

    Na mbụ Onyeisiala mba Yukren jụrụajụ, mana ugbua, ọ gbanwere obi ya ma dị njikere ka mba Amerịka na Yurope nyere ha aka kwụsị agha ahụ.

    Dịka ndị ndu Yurope ga-enwe nzụkọ na Yukren echi, Onyeisiala Volodymyr Zelensky kwuru ihe ise banyere nzukọ ahụ nakwa ihe gbasara udo:

    • Volodymyr Zelensky kwuru na ya nwereike nwezuga onwe ya ịbụ Onyeisiala mba Yukren ọzọ ma ọ bụrụ na “Ọ ga-enwetere ha udo” maọbụ “mee ka mba Yukren soro n’otu NATO”.
    • N’okwu gbasara mba Yukren inye mba Amerịka ọnatarachi ‘Rare Earth”; Volodymyr Zelensky sị na “nke ahụ abụghị ihe mba Yukren chọrọ ugbua” mana ha adịla njikere “ikesasị ya”.
    • Ọ sị na ya abụghị ‘onye ọchịchị aka ike” dika Onyeisiala Donald Trump si kwuo ma kwukwa na ya chọrọ ka Onyeisiala mba Amerịka kwe ya nkwa na Onyeisiala mba Rọshịa agaghị anwakpo mba Yukren ọzọ.
    • Dịka ndị ndu Yurope ga-enwe nzụkọ n’ime mba Yukren echi, Volodymyr Zelensky kwuru na ya nwere orilaanya na nke ahụ ga-enwete ezigbo mgbanwe.
    • Ọ sị na mba Yukren kwesiri ịnọ n’ebe a na-akpa maka ihe gbasara agha ya na mba Rọshịa.
  11. NDLEA ejidela nwaanyị mba Thailand bụ Pattaphi Wimonnat maka ịbubata ọgwụike na Naịjirịa

    Ndị ọrụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA, ejidela nwaanyị mba Thailand bụ Pattaphi Wimonnat maka ebubo ị bubata ọgwụike na Naịjirịa.

    NDLEA jidere Pattaphi Wimonnat n’ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed dị na Ikeja, Legos steeti, Naịjirịa.

    N’oge ndị NDLEA na-agba Pattaphi dị afọ iri abụọ na anọ ajuju ọnụ ka ọ kwetere na ebubo ahụ e boro ya bụ eziokwu ma kọwaa na ọgwụike ahụ si Thainland banye Doha bụ isi obodo Qater nwere bata na Legos, Naịjirịa.

    Pattaphi sị na ndị zipuru ya kwere ya nkwa na ha ga-enye ya $3,000 ma ọ bụrụ na o zịga ọgwụike ahụ n'ebe ha chọrọ ịzịga ya na Naịjirịa.

  12. Otu onye nwụrụ ebe ndị uweojii abụọ merụrụ na mwakpo ịsụ mma mere na Fransị

    E gbuola otu onye ma merụọ ndị uweojii atọ ahụ mgbe e ji mma wakpoo ndị mmadụ n’obodo Mulhouse dị na mpaghara ndịda Fransị.

    A nwụchiri otu nwafọ mba Ọlgerịa dị afọ iri atọ na asaa, dịka a malitere ime ya nnyocha iyi ndụ egwu maka na a nụrụ ka tiri o mkpu ‘Allahu Akbar’.

    Nwoke a merụrụ ndị uweojii abụọ ahụ ebe ọ dị ukwuu, otu onye bụ n’olu ebe onye ọzọ bụ n’obi.

    Ebe otu nwoke bụ onye Pọtugaal dị afọ iri isii na itoolu chọrọ ikulite nwoke ahụ nwụrụ site na mma onye mere mwkpo ahụ sụrụ ya.

    Onye a na-enyo enyo nwereike ịbụ onye ga-agbara ụgbọ nwamkpi site na mba Fransị maka na aha ya dị na ndị we chere na-eyi ndụ egwu, ka ọkaiwu ọchịchị obodo si kwuo.

    Onyeisiala Emmanuel Macron etiela ezinaụlo nwoke ahụ e gburu aka n’obi ma keleekwa ndị merụrụ ahụ, ma kwuo na o doro anya na nke a bụ mwakpo ndị na-eyi ndụ egwu.

    Ọ ṅụrụ iyi na ọchịchị ya agaghị ezu ike ruo mgbe e kpochapụrụ ndị na-esi ndụ egwu n amba ha.

    Mwakpo a mere n’ụbọchị Satọde n’elekere anọ nke mgbede n’akụkụ ahịa a maara ọfụma n’obodo Mulhouse, nke dị nso n’okeala Germany na Swiss.

  13. “Pope Francis hiri ụra ọfụma n’abalị na-agbanyeghi na ọ ka nọ n’ute ọrịa”

    Isiụlọụka Katọlik na mbaụwa bụ Vatican ekwuola na onyeisi ha bụ Pope Francis hiri ụra ọfụma n’abalị bọtara taa na-agbanyeghi na ọ ka nọ n’ute ọrịa.

    N’ụbọchị Satọde, a kọwaara ahụike Pope dịka ihe “kawanyere njọ” nke mere e jiri gbanye ya ọbara n’ahụ n’ihi ọrịa asthma butere nsogbu iku ume na-arịa ya.

    A na-agwọ Pope dị afọ iri asatọ na asatọ ọrịa oyi nke banyere ya na ngụgụ n’ụlọọgwụ Gemelli dị n’obodo Rome.

    Ọbara ahụ a gbanyere Pope n’ahụ dịka oke mkpa n’ihi ọbara kọrọ ya n’ahụ nke na-eso ọrịa anaemia dịka isiụlọọrụ Vatican si kwuo.

    A sị na onyendu Ụka Katọlik a mụ anya ma nọrọ n’oche ndalazụ, mana ọ chọrọ ka nnukwu ikuku na-abanye ya n’imi.

    Pope nyere iwu sị ka ezokwala ihe ọbụla banyere ahụike ya ezo nke mere Vatican jiri na-ewepụta ozi kwa ụbọchị banyere ahụike ya.

    E bugara Pope n’ụlọọgwụ n’ụbọchị 14 Febụwarị dịka o nwere nsogbu iku ume ọtụtụ ụbọchị.

    O nwere nsogbu ọrịa ngụgụ n’ihi akpụ na-ekopụta n’akụkụ ngụngụ ya – nke a na-esote nwepụ e wepụrụ otu akụkụ ngụngụ ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ na out (21yrs).

  14. Ntuliaka ịhọpụta Chanselọ ọhụrụ na mba Germany amalitela

    Ụmụafọ mba Jamịnị amalitela ịtụ vootu iji họpụta onye ga-abụ chanselọ ọhụrụ ha na-agbanyeghi ọnọdụ ọjọọ akụnaụba ha nakwa mwakpo na nso nso a mere ka nchekwa bụrụ ihe a kpụụ n’ọnụ.

    Nwamadị bụ Friedrich Merz dị afọ iri isii na itoolu (69yrs), onyendu otu ‘conservative’ na-azọ ọkwa ịbụ chanselọ ọhụrụ nke mba Jamini.

    O kwere nkwa igbo ọtụtụ nsogbu cheere mba ha aka n’ime afọ anọ ma ọ bụru na o merie na ntuliaka a anya mba Amerịka na Yurope dị na ya.

    Ọ bụrụ na pati Merz bụ ‘Christian Democrats merie (CDU), ọ ga-achọ otu ọzụ ya na ha ga-agbakọta aka, nke nwereike ịbụ pati ‘Social Democrats nke Olaf Scholz bụ ndị ọchịchị ha kụrụ afọ n’ala n’afọ gara aga.

    Na ntuliaka ahụ, mmadụ nde 59.2 tozuruoke ịtụ vootu dịka ọtụtụ nde ezigaala vootu ha site n’igwe ozi nke gosiri na mmadụ pasentị 20% enwebeghi mkpebi banyere ntuliaka a tupuu ụbọchị ntuliaka.

    Ntuliaka a malitere n’ụtụtụ a, ebe ọ ga-akụrụ ọnụ ma ọ kụọ elekere isii nke mgbede, dịka a na-atụ anya na mpụtara ga-egosi na mgbede.

    Ọtụtụ ndị na-atụ vootu nwere ọnụnụ ọkụ n’obi site n’ọtụtụ achụmnta vootu nakwa nrụtịtaụka ndị na-azọ ọkwa nwere kamgbe ọtụtụ ọnwa, ruo na mgbede ụbọchị Satọde.

    Ntuliaka a dị oke mkpa dịka mba Jamini ga-eme mkpebi gbara ọkpụrụkpụ n’ọgbọ ụwa nakwa n’ụlọ ha.

    Otu n’ime ndị na-azọsi Merz ọchịchị bụ Alice Weidel nke pati ‘Alternative for Germany (AfD) bụ pati kpụụ ọkụ n’ọnụ na nso nso a.

  15. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!

    Anyị sị nke onye chiri ya zere n'izuụka ọhụrụ anyị na-abanye.

    Biko echefukwala ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo maka akụkọ ndị dị mkpa na Naịjirịa nakwa n'ụwa.

    Ndewo nụ!

  16. Etu otu egwu bọọlụ West Ham siri gbagbuo Arsenal n'ụlọ ha

    Ndị otu egwu bọọlụ West Ham ejirila otu ọkpọ goolu a na-asaghị asa were merie otu egwu bọọlụ Arsenal n’egwuregwu bọọlụ ha gbara n’ụbọchị Satọde 22 Febụwarị 2025.

    Mmeri a wegharịrị ọnọdụ otu egwu bọọlụ Arsenal ma mee ka ndị otu egwu bọọlụ Liverpool nọ isi were ọtụtụ ọnụọgụgụ karị ha ugbu a.

    Dịka o siri dị, meriri emeriri otu egwu bọọlụ Arsenal emela ka otu egwu Liverpool were ọnụọgụgụ asatọ gafee ha.

  17. Iwe e jidela ndị ọrụ enyemaka na DR Kongo n’ihi ọnwụ onye ọrụ ibe ha

    Iwe e jidela ndị ọrụ enyemaka na DR Kongo n’ihi ọnwụ onye ọrụ ibe ha mgbọ tụgburu n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo ebe ndịagha nnupụisi a sị Rwanda na-akwado weghaara obodo abụọ n’izu na-adịbeghị anya ma na-achọ iweghaara obodo ndị ọzọ.

    Mgbọ tụrụ onye ọrụ enyemaka bụ Jerry Muhindo Kavali nke gbara afọ iri anọ na itoolu (49) abalị abụọ garaga ebe ọ nọ na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ ya bụ Médecins Sans Frontières (MSF) dị na Masisi.

    E buru ya gawa ụlọọgwụ dị na Goma iji zọpụta ndụ ya mana ọ nwụrụ ụbọchị Satọde 22 Febụwarị 2025, n’ihi ọnya ahụ.

    Ndị ọrụ ibe ya na-ekwu na ọ na-ewepụta onwe ya mgbe niile enyere ndị mmadụ aka mgbe ọ na-arụ ọrụ enyemaka mmadụ.

    Ọnwụ Kavali kpalitere iwe n’ebe ndị ọrụ enyemaka mmadụ dị, bụ ndị na-agba mbọ inyere ọtụtụ puku iri ụmụamaala Kongo bụ ndị agha mebiri ndụ ha.

  18. Onyeisiala Macron na Praịm Mịnịsta UK ga-aga mba Amerịka izuụka n’abịa

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron na Praịm Mịnịsta UK bụ Sir Keir Starmer na-akwado ịwụchị na mba Amerịka n’izuụka na-abịa abịa ebe ha na Onyeisiala Donald Trump ga-enwe mkparịtaụka maka nkwụsị ọgụ na Yukren.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Macron ga-abịa mba Amerịka n’ụbọchị Monde 24 Febụwarị 2025 ebe Praịm Mịnịsta Starmer ga-abịa ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị 2025.

    Dịka ha na-akwado njem a, Onyeisiala Trump ekwuola na o nwebeghị ihe ha abụọ mere iji kwụsị agha Yukren.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Trump kwuru na Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky enweghị okwu na mkparịtaụka udo ma kwukwa na ya echeghị na ọ dị ezigbo mkpa ka Onyeisiala Zelensky nọrọ na nzukọ ahụ.

    Cheta na, kemgbe mba Rọshịa wakporo mba Yukren n’afọ 2022, ọ bụ UK, Fransị na ndị ọzọ jikọrọ aka na-enye mba Yukren ngwaagha na enyemaka ndị ọzọ.

    N’ụbọchị Monde garaaga, ndị ọchịchị mpaghara Yurop nwere ọgbakọ na Fransị tupu mba Amerịka na Rọshịa were nwee mkparịtaụka na Saụdi Arebia.

  19. Ezinaụlọ Shiri Bibas ekwuola na e bulatala ozu ya

    Ezinaulọ Shiri Bibas bụ nwaanyị mba Izrel ahụ e gburu mgbe ndị Hamas jidere ya, ekwuola na ozu ọhụrụ ndị Hamas butere n’ụbọchị Fraịde, 21 Febụwarị, 2025 bụ ozu nwaanyị ahụ.

    “E gburu Shiri mgbe a tọọrọ ya, mana ugbu a e bulatara ozu ya n'ụlọ anyị” ezinaụlọ ya kwuru.

    Mana ndị ọchịchị Izrel na-eme nyocha maka ozu ndị ahụ e bulatara ekwubeghị maọbụ eziokwu na ọ bụ ozu ya ka ebutere.

    Cheta na ozu ndị Hamas bulatara na mba Izrel n’ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị 2025, abụghị ozu Shiri Bibas dịka ndịagha Izrel kwuru na Hamas tinyere ozu otu nwaanyị amaghị onye ọ bụ n’ime akpatị ozu.

    N’aka nke ọzọ, mba Hamas ga-atọhapụ mmadụ isii ndị Izrel ha ji eji n’ụbọchị Satọde 22 Febụwarị iji agbanwe ndị mkpọrọ Palestine narị isii (600) ndị Izrel ga-atọhapụ.

  20. Onyeisiala Yukren Zelensky ga-awụchị na Saụt Afrịka n'oge adịghị anya

    Saụt Afrịka na-akwado ịnabata Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky dịka ha kpọrọ ya ka ọ bịa nleta steeti.

    Onyeisiala Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kwupụtara nke a n’akara X sọshịa midia ya, mana o kwughị ụbọchị ọ ga-abịa.

    Ịkpọ oku a bịara na ngwụcha izu ahụ mba Amerịka na mba Rọshịa nwere mkparịtaụka otu a ga-esi akwụsị agha na-aga n’ihu na Yukren, mana akpọghị mba Yukrem ka ọ bịa nzukọ ahụ.

    Ozi si n’aka Onyeisiala mba Saụt Afrịka kwuru na, Onyeisiala Ramaphosa na Onyeisiala Zelensky kwekọrịtara na mkparịntaụka ha nwere n’ekwentị, na ọ dị mkpa ịmalite ịchọ udo.

    Mana Onyeisiala Zelensky ekwuola ya ọtụtụ oge na o nweghị mkparịtaụka banyere mba Yukren a ga-eme na ọ bụrụ na Yukren anọghị ya.

    Cheta na a na-ebo mba Saụt Afrịka ebubo na ya na Rọshịa na-enwe mmekọrịta n’oge garaaga, mana ugbu a Saụt Afrịka na-agba mbọ ịhụ na-aka ya dị na-inweta udo n’etiti mba Rọshịa na mba Yukren na-anụ agha.