Amerịka akwadola Rọshịa na mkpebi ụlọọrụ UN banyere mba Yukren
O meela ogboro abụọ mba Amerịka dọnyere mba Rọshịa ukwu mgbe ulọọrụ UN na-eme emume ncheta afọ atọ Rọshịa wakporo mba Yukren nke na-egosi ebe ọchịchị Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump guzoro.
Na mbụ, mba abụọ ahụ katọrọ mkpebi mba dị na mpaghara Yurop kpebiri nke katọrọ ihe Rọshịa mere ma kwado iguzosi ike nke okeala Yukren nke ọgbakọ UN General Assembly (UNGA) kwadoro.
Mba Amerịka kwadoro mkpebi mba Amerịka depụtara na-ọgbakọ ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke ulọọrụ ahụ bụ UN Security Council nke kpọrọ oku ka akwụsị ọgụ, mana Amerịka katọghị mba Rọshịa.
E nwere mkpebi nke kansụl na-ahụ maka nchekwa na UN mana mba abụọ ha mba Amerịka jikọrọ aka bụ UK na Fransị, ekweghị ịtụ votu ahụ mgbe ha gbalịchara imezigharị ihe e depụtara na mkpebi ahụ.
Ihe a na-eme mgbe Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron bịara Amerịka eleta Onyeisiala Trump ka ha nwee mkparịtaụka banyere ndịiche ha nwere gbasara agha Yukren.
N’ụbọchị Tọzde 27 Febụwarị 2025, Praịm Mịnịsta Breten bụ Sir Keir Starmer ga-abịakwa Amerịka ịhụ Onyeisiala Trump.
Cheta na Onyeisiala Trump atụgharịla njikọ aka mba ndị dị na transatlantic, iji nweta ihu ọma ebe mba Rọshịa nọ. Nke a mere ka mba ụwa na-enwe obi abụọ banyere ntinye aka ogologo oge mba Amerịka nwere banyere nchekwa na Yurop.