You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Mmadụ 18 anwụọla na nzọgbu nzọgbu mere n’ọdọụgbọoloko dị na mba India

    Nzọgbu nzọgbu mere n’ọdọụgbọoloko dọ na New Delhi nke mba India egbuola mmadụ iri na asatọ ebe ihe karịrị mmadụ iri merụrụ ahụ.

    Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n’ọdọụgbọoloko ahụ n’otu ugboro dịka ha na-azọ ịbanye n’ụgbọoloko ime njem n’abalị Satọde maka na ụgbọoloko ahụ abịaghị n’oge.

    Mmadụ anọ n’ime ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụaka, iri bụ ụmụnwaanyị dịka akwụkwọ ndị ọrụ gọọmentị wepụtara si kwuo.

    Praịm Minista mba India bụ Narendra Modi sị na “ọ na-eti ezinaụlọ ndị o metụtara aka n’obi” n’ozi o wepụtara na soshal media X.

    Ụdịrị nzọgbu ndị mmadụ a na-emekaarị n’India, ebe e nwere ọtụtụ igwe mmadụ na-agbakọta n’emume dị iche iche gụnyere okpukperechi nakwa ebe ọzọ.

    Nke a na-abịa n’ime izuụka ole ma ole mmadụ iri atọ nwụrụ site na nzọgbu nzọgbu mere n’ọgbakọ okpukperechi na Kumbh Mela ebe ọtụtụ ndị Hindu na-agbakọta asa ahụ na mmiri nsọ.

    Na Delhi, anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Hindi na “igwe mmadụ” gbakọtara n’ọdọụgbọoloko ahụ e ji eme njem aga Kumbh Mela nke a na-eme n’obodo Prayagraj dị nso na steetị Uttar Pradesh. Ọtụtụ narị mmadụ nọ ebe ahụ na-eche ụgbọoloko ha ji aga ebe ndị ọzọ.

    Dịka ndị ọrụ si kwuo, ụgbọoloko abụọ adịla mbụ gbuo oge n’ịbịa mgbe ha kwesịrị, ebe nke atọ na-aga na Prayagraj na-eche ka ọ pụọ.

    Otu onye kwuru na ndị mmadụ karịrị n’ọdọụgbọoloko ahụ nke mere na ọ banyenwughi n’ime ya.

    Otu nwoke nwunye ya nwụrụ na nzọgbu ahụ kwuru na igwe mmadụ “enwehi nchịkọta” dịka ha na-achọ ịbanye n’ụgbọoloko ahụ.

    KPS Malhotra bụ osote kọmishọna uweojii na njem ụgbọoloko kwuru na ha na-eme nnyocha banyere ihe butere nzọgbu nzọgbu ahụ.

    "Nke a mere maka na ụgbọoloko abụọ abịaghị n’oge nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọta n’ọdọụgbọoloko a,” ka o kwuru.

    Ndị na-ama gọọmentị aka akatọọla gọọmentị maka ọdachi a ma kwuo na ha kụrụ afọ n’ala n’ọchịchị ha.

  2. Ndị ndu Yurope ga-enwe ọgbakọ pụrụiche banyere ọnọdụ Yukren

    Ndị ndụ mba Yurope ga-enwe ọgbakọ pụrụiche banyere agha na-eme na mba Yukren n’izuụka na-abịa abịa, maka na mba Amerịka na Rọshịa chọrọ inwe mkparịtaụka udo nke nwereike igbochi ndị Yorupe esola.

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer kwuru na ọgbakọ a bụ nke na-abịa naanị otu mgbe dị oke mkpa maka nchekwa mpaghara ụwa ahụ, ma kwuo na Yurope kwesịrị iwere ọnọdụ n’otu Nato.

    Nke a na-abịa dịka ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Yukren kwuru na a ga-eme ka ndị Yurope maara maka mkparịtaụka Amerịka na Rọshịa mana ha agaghị eso na ya.

    Ndị ndu n amba Amerịka gụnyere odeakwụkwọ mba ha bụ Marco Rubio na ndị nnọchịteanya mba Rọshịa ga-enwe mkparịtaụka na mba Saụdi Arebịa. Ndị ọrụ Amerịka kwuru na a kpọkwara mba Yukren oku isonye n’ọgbakọ ahụ mana Onyeisiala ha bụ Volodymyr Zelensky kwuru na mba ha anataghị ozi dị etu ahụ.

    Praịm minister Starmer hụtara ọrụ ya dịka ịgba mbọ hụụ na Amerịka na Yurope nwere nkwekọrịta banyere udo n amba Yukren.

    Ọ ga-eme ka mba Amerịka mata ebumnobi ndị Yurope mgbe ọ ga-eme njem izute Onyeisiala Donald Trump na ngwụcha ọnwa a.

    N’otu aka ahụ ndị ndu Yurope na Zelensky ga-enwe ọgbakọ maọbụrụ na Praịm minister Starmer si mba Amerịka lọta.

  3. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Anyị ji aka na i hiri ma teta ụra ọfụma n'ụbọchị ụka a?

    Anyị na-asị ka ụbọchị a maara gị mma nke ukwuu.

    Biko jisie ike na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Daalụ!

  4. Mgbe ndị Izrel tọhapụrụ ndị mkpọrọ Palestine

    Mba Izrel atọhapụla ndị mkpọrọ Palestine e ji eji dịka ndị Hamas tọhapụrụ ndị Izrel eji na Gaza.

    E kwuru na ndị Izrel na-ahapụ ndị mkpọrọ Palestine narị atọ na iri isii na itoolu (369) iji gbanwee ndị Izrel mmadụ atọ ndị Hamas tọhapụrụ.

    Ọtụtụ n’ime ha aloghachitela na Gaza ebe ụfọdụ n’ime ha gawara West Bank.

    Ọtụtụ mmadụ gbakọtara n’obodo Khan Younis nke ndịda Gaza, ebe ụgbọala juputara na ọtụtụ narị ndị ejidere a tọhapụrụ bịarutere n’obodo ahụ.

    N'ime igwe mmadụ ahụ bụ ndị ikwu na ezinaụlọ ndị na-alọghachi na Gaza bụ ndị ejidere n'ụlọmkpọrọ Izrel.

    A hụrụ ndị mmadụ ka ha si na windo ụgbọala ahụ na-efere ịgwe mmadụ gbakọtara ịnabata ha aka.

    Otu nwaanyị aha ya bụ Suha Abu Nada nke na-eche nlọghachi nke nna ya bụ onye ejidere ihe dịka ọnwa isii garaaga, gwara BBC n'ekwentị na "Ọ bụ onye m hụrụ n'anya. Ụwa m dum”.

    O kwuru sị na “Mama m nwụrụ mgbe m bụ nwata, n’ihi ya, ọ zụlitere m, ụmụ Izrel wee kpụrụ ya n’aka m.

  5. Ụlọọrụ NAFDAC achọpụtala nnukwu ọdọ ebe a na-edobe ọgwụ mebiri emebi n'Aba

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara nri na ọgwụ akpọrọ Nafdac ekwuola na ọ chọpụtala nnukwu ọdọ ebe a na-edobe ọgwụ mebiriemebi ma edegharị ụbọchị ọgwụ ga-emebi n’obodo Umumeje dị n’okporo ọchịchị Osisioma Ngwa n’Abia Steeti.

    Ogige ebe ahụ dị nso n’ahịa Ariaria Aba nwere ọtụtụ ụlọ n’ime ya ma bụrụ ebe a na-arụgharị ma na-emezigharị ọgwụ mebiriemebi maka irebe ya ndị mmadụ.

    Ihe ndị ụlọọrụ Nafdac na ndị ọrụ nchekwa ha na ya gara ọrụ ahụ jidere n’ọdọ ahụ gụnyere potassium chloride mebiri emebi, ọgwụ dị iche iche, igwe eji emegharị aha ma na-agbanwe ụbọchị mmebi ọgwụ.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na onye a na-enyo enyo na ọ bụ ya na-eme ihe ọjọọ ahụ gbara ọsọ mana ha nwụchiri ụfọdụ mmadụ nke gụnyere ndị ezinaụlọ onye ahụ.

    O kwuru na ha na-emegharị iwu ha iji manye ntaramahụhụ siri ike na ndị mmadụ maọbụ ụlọọrụ aka ha dị na-imepụta maọbụ ikesa ọgwụ adegboroja.

  6. Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky akpọọla oku ka ekepụta ndịagha Yurop

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky akpọọla oku ka ekepụta ndịagha Yurop ka ha na-eche nche megide mba Rọshịa dịka mba Amerịka nwere ike ịkwụsị nyere kọntinentị ahụ aka.

    Onyeisiala Zelensky kwuru nke a na nzukọ nchekwa na-aga n’ihu na Munich, mba Jamini.

    O kwuru na ya kwenyere n'ezie n’oge eruola ikepụta ndịagha nke Yurop.

    O kwukwara okwu banyere nzukọ ebe Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin kwetara ịmalite mkparịtaụka udo.

    Ọ sị na Yukren "agaghị anabata nkwekọrịta e mere n'azụ ya ma ọ bụrụ na anyị etinyeghị aka na ya".

    N’aka nke ọzọ, osote onyeisiala mba Amerịka bụ JD Vance kwupụtara n’ụbọchị Fraịde 14 Febụwarị 2025, na ọ dị mkpa ka Europe hibe nchekwa n'ụzọ dị ukwuu.

  7. Hamas atọhapụla ndị Izrel mmadụ atọ ọzọ

    Ndị Hamas atọhapụla ndị Izrel mmadụ atọ ha tọọrọ n’abalị asaa nke ọnwa ọktọba, afọ 2023.

    Otu onye Hamas na onye ọrụ gbatagbata a na-akpọ Red Cross binyere aka n’akwụkwọ e ji atọhapụ ndị mba Izrel mmadụ atọ ahụ.

    Ndị ọrụ Red Cross akpọrụla mmadụ atọ ndị Izrel nyefee ha n’aka ndịagha na gọọmentị mba Izrel.

    Mmadụ atọ ndị ahụ bụ:

    • Alexander Troufanov, dị afọ 29 nwa afọ mba Rọshịa-Izrel
    • Yair Horn, dị afọ 46 nwa afọ Ajentịna-Izreli
    • Sagui Dekel-Chen, dị afọ 36 nwa afọ Amerịka-Izrel

    Kemgbe mba Izrel na Hamas kwụsịrị ọgụ, ndị Hamas atọhapụla ndị Izrel mmadụ iri na isii nakwa ndị mba Thai mmadụ ise ha tọọrọ.

    Mana n’aka nke ọzọ mba Izrel atọhapụla ndị Palestine mmadụ 766 bụ ndị ha tụrụ nga.

  8. Ndịagha nnupụisi DR Kongo ewegharaala ọdọụgbọelu Bukavu

    Ndịagha nnupụisi M23 nọ n’ọwụwa anyanwụ Democratic Republic of Kongo ewegharala ọdọụgbọelu isi obodo Bukavu.

    Ndịagha nnupụisi na-eme nke a mgbe mbaụwa na-akpọ oku ka a kwụsị ọgụ ma malite mkparịtaụka udo.

    A chụpụla imirikiti mmadụ n’ụlọ ha n'izuụka ndị na-adịbeghị anya dịka ndịagha nnupụisi na-aga n’ihu na-akpa ike.

    N'ọnwa gara aga, M23 nke mba Rụwanda ha na DR Kongo gbara agbataobi na-akwado, weghaara Goma bụ isi obodo dị n’ọwụwa anyanwụ nke nwere ihe ọnatarachi dị n’ime ala nke ukwuu.

    Ndịagha Kongo na ndịagha ha na ha jikọrọ aka wepụrụ aka ha n'alụghị ọgụ nnukwu maka ọdọụgbọelu ahụ nke dị n'obodo Kavumu.

    Ndị nnupụisi a nọrọla ihe dịka kilomita 30 (maịlị 19) site na Bukavu, nke bụ obodo nọ na mpaghara ọdịda Kivu.

    Osote aka na-achị steeti ahụ bụ Jean Elekano gwara BBC na ọgụ dị n'etiti ndịagha na ndị M23 siri ike na mpụga obodo ahụ.

  9. Egwu ejidela mba UK maka mbuli ụtụisi nke Onyeisiala Trump

    Dịka onyeisiala Donald Trump kwupụtara na ọ ga-ebuli ụtụisi Value Added Tax, egwu ejidela mba United Kingdom na nke a ga-emetụta ha ebe ọ dị ukwuu.

    Onyeisiala Trump agwala ndị ọrụ ya ka ha mepụta ọnụahịa maka mba ọbụla ha na Amerịka nwere nkwekọrịta azụmaahịa, gụnyere mbubata na mbupụ.

    Mmekọrịta azụmahịa nke UK na mba Amerịka na-egosi na mbuli ụtụisi agaghị emetụta ha etu ọ ga-esi emetụta ndị ọzọ mana ihe banyere itinye ụtụisi VAT nwereike bulite ọnụahịa azụmaahịa Amerịka na mba Biritenụ.

    Ndị nyocha kwuru na e nwere ike itinyere UK na European Union ụtụisi pacentị iri abụọ (20%) maọbụ karịa, mana o dobeghị anya ihe o nwereike ịbụ.

  10. Hamas ewepụtala aha ndị Izrel atọ a ga-atọhapụ na Satọde

    Dịka egwu jidere ndị mmadụ ọtụtụ ụbọchị maka ọdịnihu nke nkwụsị ọgụ na Gaza, ndị Hamas ewepụtala aha ndị Izrel atọ a ga-atọhapụ n'ụbọchị Satọde iji gbanwee ndị mkpọrọ Palestine.

    Mmadụ atọ a gụnyere nwaamala Rọshịa na Izrel bụ Alexander Troufanov, nwaamala Argentina na Izrel bụ Yair Horn ya na nwaamala Amerịka na Izrel bụ Sagui Dekel-Chen.

    Cheta na mba Izrel dọrọ aka na ntị na ha ga-amalite ịkwa mgbọ na Gaza ọ bụrụ na a tọhapụghị mmadụ atọ ndị a n’oge.

    Ha dọrọ aka na ntị a mgbe ndị Hamas kwuru na ha ga-eyigharị ntọhapụ ahụ dịka ha boro ndị Izrel ebubo imebi ihe dị na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na a ga-emebi nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ ọ bụrụ na Hamas atọhapụghị ndị ha ji eji n’ehihie Satọde.

  11. E gbuola otiegwu Delcat Idengo ebe ọ na-eme ihe onyonyo na Goma

    E gbuola otu onye a maama na-eti egwu na mba DR Kongo bụ Delphin Katembo Vinywasiki dịka ọ na-eme ihe onyonyo n’obodo ọgba aghara dị n’ọwụwa anyanwụ nke Goma.

    A hụrụ ozu nwoke a bụ Vinywasiki nke a mara dịka Delcat Idengo n’okporoụzọ n’ubọchị Tọzde 13 Febụwarị 2025, mana ọbara kpuchiri isi ya.

    Akụkọ a chọpụtabeghị na ọ bụ eziokwu kwuru na a gbagburu nwoke ahụ na-etiegwu agbagbu.

    Idengo, bụ onye a maama maka ewgu ya na-akatọ ndị gọọmentị na ndị nnupụisi, so na ọtụtụ narị ndị mkpọrọ gbapụrụ n'ụlọmkpọrọ dị na Goma, mgbe ndịagha nnupụisi M23 weghaara obodo ahụ n'ọnwa garaaga.

    Ọgụ na-ada n’ọwụwa anyanwụ nke DR Kongo dịka ndịagha na-ebuso ndịagha nnupụisi agha maka ịchịkwa mpaghara ahụ nwere nnukwu ihe ọ natara chi dị n’ime ala.

    Amabeghị onye gburu onye otiegwu ahụ ka wepụtara egwu a na-akpọ Bunduki (nke pụtara "ngwa agha" na Swahili), na-akatọ ọrụ nnupụisi na Goma.

    Mana ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị bụ Patrick Muyaya kwuru n’akara sọshịa midia X na "a ga-eme ka ikpe ziri ezi nwere ọnọdụ," ma kwuo na ogbugbu onye otiegwu ahụ bụ "ihe arụ". Ọ tara ndị M23 ụta.

  12. Zelensky na osote Onyeisiala mba Amerịka bụ Vance ga-ezute maka amụma udo n’etiti mba Yukren na Rọshịa

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-ezute osote Onyeisiala mba Amerịka bụ JD Vance maka nkata etu a ga-esi mee ka agha kwụsị n’etiti mba Yukren na mba Rọshịa.

    Nke na-eme ka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-ekwu na ndị ọchịchị si na mba Rọshịa nakwa nke mba Yukren ga-enwe ọgbakọ bụ ebe a ga-akpa nkata etu agha ahụ ga-esi kwụsị ma mee ka udo dị.

    Ọtụtụ ndị ọchịchị na mba ụwa kwuru na ọ bụ ihe ịtụnaanya na Onyeisiala mba Amerịka na nke mba Rọshịa nwere nkwekọrịta banyere etu a ga-esi nwee udo n’etiti Rọshịa na Yukren.

    Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwuru na “usoro udo ọbụla gbadoro ụkwụ n’imere mba Rọshịa ihe ha chọrọ ga-abụ ajọ akụkọ dịaara onye ọbụla”

    Macron kwukwara na mmeri Donald Trump meriri na ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Amerịka ‘ka bụ ihe mgbagwoju anya” ma gwa mba niile dị na Yurop ka ha jịkọ aka ọnụ kwalite ngaraba akụnụba na nchekwa ha.

    Onyeisiala Zelensky na-ekwu na usoro ọbụla a ga-esi nwete udo n’etiti ha na Rọshịa bụ nke ndị mba ya kwesiri iso nweputa ya, mana ndị na-ahazị ọgbakọ ahụ mba Amerịka kpọrọ maka udo n’etiti mba abụọ ahụ na-anụ agha sị na enwebeghị ndị mba Rọshịa ha hụrụ n’Munich, dị na mba Jamịnị bụ ebe e nyibere ọgbọka maka udo ahụ.

  13. Ụmụ Igbo ndị ọma anyị abịala ọzọ taa iwetere unu akụkọ na-akpọtụ na mba ụwa

    Ka ụbọchị taa maara anyị niile mma.

    Adline Okere na Michael Ilediagu bụ ndị unu na ha ga-anọrị n'ụtụtụ a mana Uzoamaka Ewuzie ga-emecha sonyere ha n’ehihe.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  14. Ụlọomeiwu mba Amerịka akwadola Robert Kennedy Jr dika odeakwụkwọ ahụike

    Ndị omeiwu Sịnetị mba Amerịka akwadola Robert F Kennedy Jr odeakwụkwọ ahụike mba Amerịka.

    Nke a mere ka ọ bụrụ onye ọhurụ Onyeisiala Donald Trump họpụtara nwetara nkwado ndị omeiwu mba Amerịka maka ọkwa e nyere ya.

    Ọ bụ ndị Sịnetị mmadụ iri ise na abụọ kwadoro ya ebe mmadụ iri anọ na asatọ ndị ọzọ akwadoghị ya.

    Kennedy Jr kwere mba Amerịka nkwa ime ọtụtu ihe nke gụnyere ịlụso oke ibu ọgụ na ibelata nri emepụtara emepụta.

    Onye ọzọ Onyeisiala Trump họpụtara nke ndị omeiwu kwadoro bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrụugbo bụ Brooke Rollins, ebe ọ họpụtara Kash Patel ka ọ bụrụ onyeisi ụlọọrụ FBI mana ndị omeiwu na-aga n'ihu inwe ntuliaka maka nhọputa ya.

    Onyeisiala Trump họputara Linda McMahon, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgba ka ọ bụrụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ, mana ndị omeiwu ka na-agba ya ajụjụ ọnụ.

  15. Rọshịa ekwuola na Yukren ga-esonye na mkparịtaụka udo

    Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky adọọla ndị isiala mbaụwa ka ha ghara ịtụkwasiobi maọbụ kwenye na onyeisiala mba Rọshịa dị njikere ịkwụsị agha dị n’etiti mba abụọ ahụ.

    Nke a na-abịa dịka obi ọchịchị Kremlin kwuru na ọ bụ iwu na Yukren ga-esonye na mkparịtaụka udo ọbụla ha chọrọ ime.

    Onyeisiala Donald Trump na-achị mba Amerịka na Onyeisiala Vladimir Putin nwere mkparịtaụka ụbọchị Wenezde 12 Febụwarị, 2025 tupu o kwuputa na ha abụọ kwenyere ka e nwee nkwekọrịta ga-enweta udo ma kwụsị agha ahụ.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na o nwere olileanya na agha ahụ ga-abịa na njedebe.

  16. Hamas ekwuola na ha ga-aga n’ihu na-atọhapụ ndị Izrel e ji eji

    Ndị Hamas kwuru na ha ga-emezu ihe dị na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza ha na mba Izrel nwere site na ịga n’ihu tọhapụ ndị e ji eji ma mee ka e nwee olileanya na a ga-egbochi ịmaliteghachi ọgụ.

    Otu ndịagha nnupụisi nke Palestine kwuru na ndị ogbugbo si Ijipt na Katar ekwenyela na ha "ga-ewepụ ihe mgbochi" mgbe ha nwere mkparịtaụka na Kaịro isi obodo Ijipt.

    Mba Izrel ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a, mana akụkọ kwuru na mba Ijipt na Katar kwukwara na ndị ogbugbo emechiela ohere dị n'etiti akụkụ abụọ ahụ ma kpebie ị ga n'ihu na-eme ihe dị na nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ.

    Cheta na mba Izrel kwuru n’ụbọchị Tuzde 11 Febụwarị 2025 na-ịkwụsị ịkwa mgbọ ga-akwụsị ma ọ bụrụ na Hamas atọhapụghị ndị ha ji eji na Satọde 15 Febụwarị, 2025.

    Hamas kwuru na ọ na-eyigharị imezu ihe dị na nkwekọrịta ahụ dịka ọ na-ebọ mba Izrel ebubo mmebi ihe dị na nkwekọrita ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    Hamas kwuru na Izrel jụrụ imezu nkwa enyemaka ha kwere ndị Palestine nke gụnyere ịrụ ogige ebe obibi, mana mba Izrel gọnarịrị ebubo a.

  17. PDP ekwupụtala Udeh-Okoye dịka odeakwụkwọ ọhụrụ ha

    Kọmitii ọrụ otu People's Democratic Party (PDP) ekwupụtala onye bụbu onye ndu ndị ntorobịa otu ahụ bụ Sunday Udeh-Okoye dịka odeakwụkwọ ha.

    PDP kwuputara nke a n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde 12 Febrụwarị, 2025.

    Ozi ahụ odeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Debo Ologunagba wepụtara kwuru na ndị kọmitii ahụ nwere ya bụ mkpebi iji rube isi na nchabiikpe Ụlọikpe mkpegharị nyere gbasara okwu ahụ.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, PDP ga-ezigara ụlọọrụ INEC mkpebi ha jiri kwuputa Udeh-Okoye dịka odeakwụkwọ ọhụrụ ha.

    Ha gara n'ihu kelee ndị ndu ha, ndị otu ha nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu ahụ maka nkwudosiike na nsọpụrụ ha nwere maka iwu n'usoro iwu tinyekwara nkwado ha niile.

  18. Mmadụ 20 merụrụ ahụ mgbe ọkwọụgbọala gbabara n’igwe mmadụ na Jamini - Ndị uweojii

    Ndị uweojii kwuru na ihe ruru mmadụ iri abụọ (20) emerụọla ahụ na Munich nke mba Jamini mgbe ọkwọụgbọala gbabara ebe ọtụtụ mmadụ jụrụ.

    Ha kwuru na ọtụtụ n’ime ndị ahụ merụrụ ahụ nke ukwuu mana a mabeghị ma onye ọkwọụgbọala ahụ ọ kpachara anya mee ya ka ọ bụ ihe mberede.

    Onyeisi obodo Munich bụ Dieter Reiter gwara akwụkwọ akụkọ Bild nke Jamini na ndị uweojii kwuru na umụaka so na ndị merụrụ ahụ.

    “O juru m anya nke ukwuu. Echiche m dị na ndị merụrụ ahụ," ka ọ na-ekwu.

    Cheta na nzụkọ nchekwa Munich ga-amalite na Fraịde, dịka osote onyeisiala mba Amerịka bụ JD Vance na onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ga-abata n'ehihie a.

  19. Agaghị enwe mkparịtaụka maka Yukren ọ bụrụ ma Yukren esoghị na ya – Odeakwụkwọ nchekwa UK

    Odeakwụkwọ nchekwa United Kingdom bụ John Healey ekwuola na agaghị enwe mkparịtaụka maka Yukren ọ bụrụ ma Yukren esoghị na ya.

    Healey gbakwunyere na UK dị nkwadobe ịhụ na Kyiv gbasiri ike na mkparịtaụka dịka ọ sịrị na “udo ga-adịgide adịgide” bụ ebumnobi ha.

    Mba ndị Yurọp asaa ekwuola na ha dị njikere itinye Yukren “n’ọnọdụ ike” na mkparịtaụka ha na Rọshịa.

    Ha wepụtara ozi ha oge Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ya na Onyeisiala Rọshịa bụ Vladmir Putin nwere nkwekọrịta ịmalite mkparịtaụka iji kwụsị agha dị n’etiti ha na Yukren “ozugbo ozugbo”.

    Ọzọkwa, n’ụbọchị Wenezde, Odeakwụkwọ nchekwa Amerịka bụ Pete Hegseth dọrọ aka na ntị na “ọ dịghị” ka Yukren ga-alaghachi n’okeala ya dịka ọ dị tupu afọ 2014.

    Ka o sinadị, a tụrụ anya na odeakwụkwọ NATO bụ Mark Rutte ga-etinye ọnụ n'ihe ahụ Trump kwuru oge Hegseth na ndị ntaakụkọ ga-enwe mkparịtaụka n’ụtụtụ a.

  20. Igbo nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Anyị abịala ọzọ taa iwetere gị akụkọ ndị ahụ na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche.

    Adline Okere na Chinonso Ugorji bụ ndị gị na ha ga-anọrị n'ụtụtụ a mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị n'ọgbakọ nke taa.